Ụgbọ Ịnyịnya Eluigwe nke Jehova Na-aga n’Ihu
“Ma wheel anọ ahụ, ha ka a na-akpọ ná ntị m abụọ, Ihe na-akpọre.”—EZIKIEL 10:13.
1. Ụdị ụgbọ njem dị aṅaa ka Jehova nwere?
N’ỤBỌCHỊ ndị a, mgbe e nwere ụgbọ elu jet ndị mara oké mma, ndị ndú ụwa pụrụ iche na ha nwere ụgbọ njem ndị kasị dịrị irè. Ma, na 2,600 afọ gara aga, Jehova kpughere na ya nwere ihe ịga njem na-enweghị atụ, bụ́ nke ọ na-adịbeghị onye injinia hụtụworo ihe dị ka ya. Ọ bụ ụgbọ ịnyịnya buru oké ibu, nke dịkwa egwu! Ọ̀ bụ ihe dị mgbagwoju anya na Onye Okike nke eluigwe na ala na-anọkwasị n’ụgbọ nke yiri ụgbọ ịnyịnya? Ee e, n’ihi na ụgbọ eluigwe nke Jehova dị iche nke ukwuu site n’ihe ọ bụla ụmụ mmadụ pụrụ ichepụtaworị n’echiche.
2. Olee ụzọ Ezikiel isi 1 si egosi ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova, ọ̀ bụkwa n’ebe òle ndị nọ ka onye amụma ahụ bu ụzọ dọrọ uche anyị gaa?
2 N’isi 1 nke amụma Ezikiel, e sere onyinyo Jehova ka ọ na-anọkwasị n’otu nnukwute ụgbọ ịnyịnya nke eluigwe. Ụgbọ nke a dị egwu nke nwere ụkwụ anọ na-anyagharị onwe ya, ọ pụkwara ime ọtụtụ ihe dị ịtụnanya. Ezikiel hụrụ ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke a n’ọhụụ n’afọ 613 T.O.A., mgbe ọ nọ n’akụkụ otu n’ime ọwà mmiri ndị e nwere na Babilọn oge ochie. Onye amụma ahụ bu ụzọ dọrọ uche anyị gaa n’ebe ndị nọ gburugburu ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ nke Jehova nọ. Mgbe anyị na-agụ, ka anyị nwaa iji anya nke uche anyị hụ ihe Ezikiel hụrụ.
Ihe Anọ Ndị Dị Ndụ
3. Gịnị ka ihu anọ nke cherub anọ ndị ahụ na-egosi?
3 Ezikiel na-akọ, sị: “M wee hụ, ma lee, oké ifufe na-esi n’ugwu bịa, oké igwe ojii, na ọkụ nke na-anwụde onwe ya mgbe nile, onwunwu dịkwaara ya gburugburu . . . Ọzọ, n’etiti ya ka oyiyi nke ihe anọ dị ndụ si pụta.” (Ezikiel 1:4, 5) Nke ọ bụla n’ime ihe anọ ndị a dị ndụ, ma ọ bụ ndị cherub, nwere nkù anọ na ihu anọ. Ha nwere ihu ọdụm, nke na-egosipụta ikpe ziri ezi nke Jehova; ihu oké ehi, nke na-anọchi anya ike Chineke; na ihu ugo, nke na-egosipụta amamihe Ya. Ha nwekwara ihu mmadụ, bụ́ nke na-egosipụta ịhụnanya Jehova.—Deuterọnọmi 32:4; Job 12:13; Aịsaịa 40:26; Ezikiel 1:10; 1 Jọn 4:8.
4. N’ihi gịnị ka cherub ndị ahụ ji nwee ihu anọ, gịnị bụkwa ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ nke cherub ndị ahụ?
4 Cherub nke ọ bụla nwere ihu nke na-elepụ anya n’otu n’ime akụkụ anọ dị iche iche. N’ihi ya, ndị cherub ahụ pụrụ ịgbanwe ebe ha na-eje ozugbo ma gbasoo ihu nke lere anya n’ebe ha chọrọ ije. Ma gịnị bụ ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ cherub ndị ahụ? Ee, ha pụrụ ịga njem n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ nke àmụ̀mà! (Ezikiel 1:14) Ọ dịbeghị ụgbọ ọ bụla mmadụ mepụtara nke nwere ike ịgbaru ọsọ otú ahụ.
5. Olee ụzọ Ezikiel si kọwaa wheel nke ụgbọ ịnyịnya ahụ na azụ ha?
5 Na mberede, a hụrụ wheel ụgbọ ịnyịnya ahụ. Lee nnọọ ka ha si bụrụ ụdị ihe a na-adịghị ahụkebe! Amaokwu 16 na 18 na-asị: “Ka ha na otú e mere ha si dị n’ile ha anya, ha dị ka à ga-asị na ọ bụ wheel n’etiti wheel. Ma azụ wheel nile ha, ha dị elu, ha dịkwa egwu; azụ wheel nile ha jupụtara n’anya anya gburugburu ha anọ.” Inwe otu wheel n’akụkụ cherub nke ọ bụla ga-apụta inwe wheel anọ n’ebe anọ ndị nwere njikọ n’etiti onwe ha. Wheel ndị ahụ na-egbuke egbuke dị ka beryl, bụ́ nkume nke a pụrụ isi na ya lefee anya, nke na-acha edo edo ma ọ bụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. Nke a na-eme ka ọhụụ nke a dị ebube makwuo mma. Ebe ọ bụ na wheel ndị ahụ “jupụtara n’anya anya gburugburu,” ha adịghị asọrọ ìsì na-aga n’akụkụ ọ bụla dapụtaranụ. Wheel ndị ahụ dịkwa elu nke ukwuu, wee si otú a bụrụ nke nwere ike ịgate anya nanị n’otu mgbagharị. Dị ka ndị cherub anọ ahụ, ha pụrụ ịga n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ yiri nke àmụ̀mà.
Wheel n’Etiti Wheel
6. (a) Ò si aṅaa bụrụ na ụgbọ ịnyịnya ahụ nwere wheel n’ime wheel? (b) Wheel ndị ahụ hà mere ka ebe ha chere ihu kwekọọ na gịnị?
6 E nwekwara ihe ọzọ pụrụ iche. Wheel nke ọ bụla nwere wheel n’ime ya—bụ́ wheel nke ya na ya hà ma gabiga n’etiti wheel ahụ. Ọ bụ nanị n’ụzọ dị otú a ka a pụrụ isi kwuo na wheel ndị ahụ ‘na-aga n’akụkụ anọ ha mgbe ha na-aga.’ (Amaokwu 17) N’egbughị oge, wheel ndị ahụ pụrụ ịgbanwe ebe ha chere ihu n’ihi na e nwere akụkụ wheel ahụ nke na-eche ihu n’akụkụ nke ọ bụla. Wheel ndị ahụ na-eme ka ebe ha na-aga kwekọọ n’ụzọ cherub anọ ndị ahụ si aga. Ihe owuwu nke ụgbọ ịnyịnya Chineke pụrụ ịnọkwasị n’elu wheel anọ ndị a site n’ihe nkwado a na-adịghị ahụ anya n’ụzọ yiri nke ụgbọ dị oké ike nke ikuku na-akwado mgbe ọ na-agba n’elu mmiri.
7. Olee ebe wheel ndị ahụ si na-enweta ike ha?
7 Olee ebe wheel ndị ahụ si nweta ike a ha ji na-agala ebe ọ bụla cherub anọ ahụ galara? Ọ bụ site ná mmụọ nsọ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Amaokwu 20 na-ekwu, sị: “Ebe ọ bụla mmụọ Chineke nwere ije ka ha na-aga; . . . Mmụọ nke ihe ahụ dị ndụ dị n’ime wheel ha.” Otu ike ọrụ ahụ nke a na-adịghị ahụ anya nke Chineke, bụ́ nke dị n’ime cherub ndị ahụ, dịkwa n’ime wheel ndị ahụ.
8. Olee aha a kpọrọ wheel ndị ahụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
8 E ji okwu ahụ bụ “ihe na-akpọre” zoo aka n’ebe wheel ndị ahụ dị. (Ezikiel 10:13) O doro anya na ihe kpatara nke a bụ ihe wheel nke ọ bụla na-eme. Ọ na-akpọre akpọre, ma ọ bụ na-agbagharị agbagharị. Iji aha dị otú a kpọọ akụkụ nke a nke ụgbọ ịnyịnya ahụ dị n’eluigwe na-adọrọ uche gaa n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ nke ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ ji na-aga. Ọ bụ ezie na wheel ndị ahụ na-agbagharị n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ dị ukwuu, ha pụrụ ịhụ ebe ha na-eje mgbe nile n’ihi na ha jupụtara n’anya.
9. Olee ụzọ Ezikiel si kọwaa ihe dị n’elu wheel anọ na-agba oké ọsọ nke ụgbọ ịnyịnya ahụ?
9 Ma ugbu a, ka anyị lee anya ma hụ ihe dị n’elu wheel anọ ndị ahụ ịdị elu ha na-akpata egwu, ndị na-agbakwa oké ọsọ. Amaokwu 22 nke Ezikiel isi 1 na-asị: “Oyiyi nke mbara igwe dị n’elu isi ihe ahụ dị ndụ, dị ka igbu mara mara crystal dị egwu si dị, nke e setịrị esetị n’elu isi ha n’elu.” Mbara igwe ahụ, ọ bụ ezie na o siri ike, bụ nke a pụrụ isi na ya lefee anya, “dị ka igbu mara mara crystal dị egwu.” Ọ na-egbukepụ egbukepụ dị ka ọtụtụ puku nkume diamond mgbe anyanwụ na-etikwasị ha. Ọ dị egwu n’ezie!
Onye Dị Ebube nke Na-anọkwasị n’Elu Ụgbọ Ịnyịnya ahụ
10. (a) Olee ụzọ e si kọwaa ocheeze ahụ na Onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ? (b) Gịnị ka eziokwu ahụ gosiri nke bụ na e ji ebube kpuchite Onye na-anọkwasị n’elu ụgbọ ịnyịnya ahụ?
10 Ihe àmà na-egosi na ụgbọ ịnyịnya ahụ na-akwụsị ka Onye na-anọkwasị n’elu ya wee nwee ike ịgwa Ezikiel okwu. N’elu mbara igwe ahụ, e nwere ihe yiri ocheeze, nke yiri nkume sapphire, ma ọ bụ na-acha anụnụ anụnụ n’ile anya. E nwere Onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ nke ọdịdị ya yiri nke mmadụ. Ọdịdị mmadụ nke a bụ ihe kasị mma iji nyere Ezikiel aka ịghọta ngosipụta nke a nke Chineke. Ma e ji ebube kpuchie ihe ahụ yiri mmadụ, nke na ọ na-egbukepụ egbukepụ dị ka amber, bụ́ ngwakọta na-egbuke egbuke nke ọlaọcha na ọlaedo. Lee nnọọ oké ịma mma ọ bụ! Site n’úkwù nke onye a yiri mmadụ, oké ebube nke a gbagoro elu, gbadakwa ala. O si otú a bụrụ na e ji ebube kpuchikọta ihe oyiyi dum ahụ. Nke a na-egosi na Jehova dị ebube n’ụzọ a na-apụghị ịkọwa akọwa. E wezụgakwa nke ahụ, eke na egwurugwu mara nnọọ mma na-esokwa Onye ahụ na-anọkwasị n’ụgbọ ịnyịnya ahụ. Lee aha ịdị jụụ na udo eke na egwurugwu na-egosipụta mgbe e nwesịrị oké ifufe mmiri ozuzo! N’ihi inwe àgwà nke dị jụụ otú a, Jehova na-eme ka àgwà ya ndị bụ amamihe, ikpe ziri ezi, ike, na ịhụnanya nọrọ n’ịha nhata zuru okè.
11. Mmetụta dị aṅaa ka ọhụụ nke ụgbọ ịnyịnya na ocheeze Jehova nwere n’ahụ Ezikiel?
11 Ìhè na àgwà dị iche iche ndị mara mma gbara ụgbọ ịnyịnya na ocheeze Jehova gburugburu. Lee nnọọ ka nke a si dị iche n’ihe banyere Setan, bụ́ onye isi nke ọchịchịrị na nke ime anwansị! Oleekwa otú ihe a nile si metụta Ezikiel? Ọ na-asị, “M wee hụ ya, daa kpuo ihu m n’ala, m wee nụ olu nke otu onye na-ekwu okwu.”—Ezikiel 1:28.
Ihe Ụgbọ Ịnyịnya ahụ Sere Onyinyo Ya
12. Gịnị ka ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova sere onyinyo ya?
12 Gịnị ka ụgbọ ịnyịnya nke a dị ebube sere onyinyo ya? Ọ bụ nzukọ eluigwe nke Jehova Chineke. Ihe mejupụtara ya bụ ndị mmụọ ya dị nsọ e kere eke, ndị nọ n’ebe obibi a na-adịghị ahụ anya—ndị seraph, ndị cherub, na ndị mmụọ ozi. Ebe Jehova bụ Chineke Onye Kasị Ihe Nile Elu, ndị mmụọ nile o kere eke nọ n’okpuru ya, ọ na-anọkwasị n’elu ha n’echiche nke bụ na o ji obi ọma na-achị ha, jirikwa ha na-eme ihe dị ka nzube ya si dị.—Abụ Ọma 103:20.
13. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Jehova na-anọkwasị n’elu nzukọ ya? (b) Olee ụzọ ọhụụ nke ụgbọ ịnyịnya Jehova na-aga n’ihu nke nwere wheel anọ si emetụta gị?
13 Dị ka à ga-asị na ọ bụ n’elu ụgbọ ịnyịnya, Jehova na-anọkwasị n’elu nzukọ nke a, na-eme ka ọ na-aga n’ebe ọ bụla mmụọ ya kpaliri ya ịga. Ọ naghị agbagharị aghara aghara, n’enweghị nchịkwa ma ọ bụ nlekọta e ji ezi ọgụgụ isi na-elekọta ya. Chineke adịghị ekwe ka nzukọ nke a gaa n’ụzọ ọ bụla o nwere mkpali ịga. Kama nke ahụ, ọ na-agbaso nduzi ya. N’ịdị n’otu, ha nile na-agakọ n’ihu ruo ná mmezu nke nzube nile nke Chineke. Lee nnọọ nzukọ eluigwe dị ebube e kpughere site n’ọhụụ nke a nke ụgbọ ịnyịnya eluigwe Jehova nke nwere wheel anọ nke na-aga n’ihu! N’ikwekọ na nke a, e sere onyinyo nzukọ Jehova dị ka nke a nwere akụkụ anọ hà nhata, nọrọ ná nhazi zuru okè.
Onye A Họpụtara dị ka Onye Nche
14. Òle ndị ka Ezikiel onye amụma sere onyinyo ha?
14 Ma, ọ̀ bụ ole ndị ka onye amụma bụ Ezikiel sere onyinyo ha? Site n’ihe ndị meworo eme n’ezie, ọ pụtara ìhè na òtù Ndịàmà Jehova e ji mmụọ nsọ tee mmanụ abụwo ndị so ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke a na-emekọ ihe. Otú a, Ezikiel sere onyinyo dị mma nke ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ nke Ndịàmà Jehova kemgbe 1919. N’ụzọ ime mmụọ, nzukọ eluigwe nke Chineke mere ka ozi ruo ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ aka n’afọ ahụ iji tụteghachi ha dị ka Ndịàmà nke Jehova nye ụwa nile. (Tụlee Mkpughe 11:1-12.) Nzukọ ahụ nke yiri ụgbọ ịnyịnya nọ na-aga n’ihu n’oge ahụ, ọbụna dị ka ọ na-emekwa taa. N’eziokwu, wheel ya nile nke ọganihu ji oké ọsọ na-agbagharị karịa ka o meworo na mgbe ọ bụla ọzọ. Jehova ji oké ọsọ na-aga n’ihu n’ihu!
15. Gịnị ka olu Onye na-anọkwasị n’ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ kwuru, ọrụ dị aṅaa ka Ezikiel natakwara?
15 Ezikiel chọrọ ịmara ihe ụgbọ ịnyịnya nke a dị n’eluigwe ji bịa ya n’ihu ma kwụsị. Ọ matara nke a mgbe otu olu sitere n’ebe Onye na-anọkwasị n’ụgbọ ịnyịnya ahụ nọ bịarutere ná ntị ya. N’ịbụ onye ọhụụ nke a dị ebube riri ọnụ, Ezikiel dara kpuo ihu n’ala. Gee ntị ka olu nke Onye na-anọkwasị n’ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ na-asị: “Nwa nke mmadụ, guzo n’ụkwụ gị abụọ, m ga-agwakwa gị okwu.” (Ezikiel 2:1) Mgbe ahụ, Jehova nyere Ezikiel ọrụ ịbụ onye nche na ịdọ ụlọ Israel na-enupụ isi aka ná ntị. E nyere ya ikike ọbụna iji aha Chineke kwuo okwu. Aha Ezikiel pụtara “Chineke Na-enye Ume.” Otú ahụ ka o si bụrụ na Chineke enyewo òtù Ezikiel ahụ ume ma zipụ ha, na-ahọpụta ha dị ka onye nche nye Krisendọm.
16, 17. (a) Olee ụzọ ọhụụ nke ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ si baara Ezikiel uru? (b) N’oge anyị a, olee ụzọ nghọta nke ọhụụ ahụ nke ụgbọ ịnyịnya eluigwe siworo metụta òtù Ezikiel ahụ na oké ìgwè mmadụ ahụ?
16 Ọhụụ nke ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ bụụrụ Ezikiel ihe na-akpali iche echiche na ihe na-anwụ ibubo n’ahụ, ma ọ kwadebekwara ya maka ọrụ e nyere ya dị ka onye nche ịkpọsa ịdọ aka ná ntị banyere mbibi Jerusalem nke na-abịanụ. Ọ dịwo otú ahụ n’ihe banyere òtù onye nche ahụ n’oge a. Nghọta ha nwere banyere ọhụụ ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova nke na-aga n’ihu enwewo mmetụta dị ukwuu n’ahụ ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ. Na 1931, ha mụtakwuru ihe banyere ọhụụ Ezikiel, dị ka e kpughere ya n’Akwụkwọ nke Mbụ nke usoro akwụkwọ Vindication. N’oge ahụ, ha jupụtara n’ezi ekele nke na malite ná mbipụta October 15, 1931, ruo na nke August 1, 1950, ihe osise nke ihu akwụkwọ magazin Ụlọ Nche [Bekee] nwere n’elu akụkụ aka nri ya ihe ngosi nke ọhụụ Ezikiel nke ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ. Otú a, òtù Ezikiel ahụ emewo ihe kwekọrọ n’ọrụ e nyere ha, ha anọwokwa na-eje ozi dị ka onye nche, na-akpọsa ịdọ aka ná ntị Chineke. Oge a ga-ebibi Krisendọm kpam kpam site n’aka Chineke, bụ́ onye na-anọkwasị n’ocheeze n’elu ụgbọ ịnyịnya eluigwe ya, adịwo nso karịa ka ọ dịworo mgbe ọ bụla ọzọ!
17 Taa, “oké ìgwè mmadụ” nke ndị yiri atụrụ na-esonyere ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ. (Mkpughe 7:9) N’ịdị n’otu, ha na-akpọsa ịdọ aka ná ntị nke mbibi na-abịanụ nke ga-abịakwasị Krisendọm na usoro ihe Ekwensu nke a dum. Ọrụ ịdọ aka ná ntị ahụ na-aga nnọọ n’ihu n’ihu, dịkwa ka e gosiri ná Mkpughe 14:6, 7, ndị mmụọ ozi na-akwado ya.
Iso Ụgbọ Ịnyịnya Eluigwe ahụ Na-agakọ
18. Gịnị ka a na-aghaghị ime iji nọgide na-enweta nkwado nke ndị mmụọ ozi, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịdị ngwa ịhụta?
18 Ndị mmụọ ozi ndị ahụ na-edo onwe ha n’okpuru na-agakọ n’otu dị ka akụkụ nke nzukọ eluigwe nke Jehova mgbe ha nọkwa na-enyere ndị ohu Jehova nọ n’elu ala aka n’ịrụzu ọrụ e kenyere ha nke ịkpọsa ịdọ aka ná ntị nile nke Chineke. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide n’okpuru nchebe na nduzi nke mmụọ ozi Chineke ndị a dị ike, anyị onwe anyị aghaghịkwa ịdị na-emekọ ihe n’otu ma na-eso ihe mkpọre ihe atụ ahụ na-aga ụkwụ na ụkwụ. Tụkwasị na nke ahụ, dị ka akụkụ nke nzukọ Jehova a na-ahụ anya nke so ụgbọ ịnyịnya eluigwe ya ahụ na-agakọ ụkwụ na ụkwụ, anyị aghaghị ịmụrụ anya ịhụta nduzi nke mmụọ Chineke. (Tụlee Ndị Filipaị 2:13.) Ọ bụrụ na anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị aghaghị iche ihu n’ebe ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ chere ihu. O doro anya na anyị ekwesịghị inwe nzube ndị megidere nke ya. Mgbe e nyere anyị nduzi banyere ụzọ anyị ga-agbaso, anyị kwesịrị ịgbaso ya. Otú a, ọgbakọ abụghị ihe e kewara ekewa.—1 Ndị Kọrint 1:10.
19. (a) Dị nnọọ ka ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ nwere anya gburugburu ha, gịnị ka ndị Jehova na-aghaghị ịmụrụ anya banyere ya? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịdị na-eme n’ime oge ọgba aghara ndị a?
19 Anya ndị jupụtara gburugburu wheel ndị ahụ nke ụgbọ ịnyịnya Chineke na-egosi ịmụ anya. Dị nnọọ ka nzukọ eluigwe ahụ mụ anya, otú ahụkwa ka anyị na-aghaghị ịmụrụ anya iji kwado nzukọ elu ala nke Jehova. N’ọgbakọ anyị dị iche iche, anyị pụrụ igosi nkwado ahụ site n’ịdị na-ekwenyere ndị okenye nke ọgbakọ anyị. (Ndị Hibru 13:17) N’oge ọgba aghara ndị a kwa, ọ dị mkpa ka ndị Kraịst raparasie ike ná nzukọ Jehova. Anyị achọghị ịdị na-enye nkọwa nke onwe anyị banyere ihe ndị na-emenụ, n’ihi na mgbe ahụ, ọ ga-abụ na anyị adịghị eso ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova na-agakọ. Ka anyị na-ajụ onwe anyị mgbe nile, sị, ‘Olee ebe ụgbọ ịnyịnya ahụ chere ihu?’ Ọ bụrụ na anyị esoro nzukọ Chineke a na-ahụ anya na-aga n’ihu, ọ ga-abụkwa na anyị na-eso nzukọ ahụ a na-adịghị ahụ anya na-agakọ.
20. Ezi ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl onyeozi na-enye ná Ndị Filipaị 3:13-16?
20 N’ihe banyere nke a, Pọl dere, sị: “Ụmụnna m, mụ onwe m agụghị onwe m na ejidewo m [ya] ruo ugbu a: ma otu ihe ka m na-eme, ebe m na-echezọ ihe nile dị n’azụ, na-esetịpụkwa aka n’ebe ihe nile dị n’ihu dị, ana m agbakwuru ókè ịgba ọsọ ka m wee nata ihe a na-agbata n’ọsọ nke ọkpụkpọ dị n’elu [“eluigwe,” NW] nke Chineke n’ime Kraịst Jisọs. Ya mere, ka anyị hà, bụ́ ndị tozuru okè, ka anyị tụkwasị uche na nke a: ọ bụrụkwa na unu tụkwasị uche n’ihe ọ bụla n’ụzọ dị iche, ọbụna nke a ka Chineke ga-ekpughere unu: nanị nke a, n’ihe ahụ anyị gbaruru, ka anyị na-agazi dị ka ihe [“usoro,” NW] ahụ si dị.”—Ndị Filipaị 3:13-16.
21. Site n’ịgbaso usoro dị aṅaa ka ọ ga-ekwe omume iso nzukọ Chineke na-aga n’ihu n’ụzọ ime mmụọ?
21 N’ebe a, okwu ahụ bụ ‘usoro’ apụtaghị usoro mmeghachi ihe efu nke anyị na-apụghị isi na ya wepụta onwe anyị. Ndị ohu Jehova nwere usoro dị mma bụ́ nke ha na-esite na ya na-enwe ọganihu ime mmụọ. Ọ bụ usoro nke inwe ọmụmụ Bible onwe onye, ije nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ, ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ mgbe nile, na igosipụta àgwà nile nke nzukọ eluigwe nke Chineke. Usoro dị otú ahụ na-enyere ha aka ịgbaso nduzi nke nzukọ eluigwe Jehova nke yiri ụgbọ ịnyịnya. Site n’ịnọgide na-agbaso ụzọ nke a, anyị ga-eru ihe mgbaru ọsọ anyị, ma ọ bụ ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe ma ọ bụ ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs.
22. (a) Ka ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ wee bụrụ ndị a haziri ahazi n’ịdị n’otu, gịnị ka a na-aghaghị ime? (b) Olee ihe Jehova na-adịghị ahapụ ịhụta?
22 Dị ka Jọn 10:16 na-egosi, a ga-ahazi “atụrụ ọzọ” na òtù Ezikiel ahụ n’ụzọ dị n’otu. Otú a, ọ dị mkpa ka ndị nile nọ ná nzukọ Jehova ghọtazuo isi ihe na ịdị mkpa nke ọhụụ ahụ nke e dekọrọ n’Ezikiel isi 1 ma ọ bụrụ na ha ga-eso ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Chineke na-agakọ. Ọhụụ ahụ banyere ya na-enyere anyị aka ịghọta na anyị kwesịrị ịga n’ụzọ kwekọrọ ná nzukọ Chineke, ma nke a na-ahụ anya ma nke a na-adịghị ahụ anya. Burukwa n’uche na anya Jehova “na-ejegharị n’ụwa nile, igosi onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe ọ nọ.” (2 Ihe Emere 16:9) Ọ dịghị otu ihe ọ bụla Jehova na-adịghị ahụta, karịsịa ihe ọ bụla metụtara nzube ya nke iwepụ onwe ya n’ụta dị ka Eze Eluigwe na Ala.
23. Ebe ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova na-aga n’ihu, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?
23 Taa, o doro anya na ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova na-aga nnọọ n’ihu. N’oge na-adịghị anya a ga-eme ka ihe nile dị ebube n’ụzọ kwekọrọ n’Onye ahụ dị ebube nke na-anọkwasị n’elu ụgbọ ịnyịnya ahụ—ihe a nile bụkwa iji wepụ ya n’ụta dị ka Eze Onyenwe eluigwe na ala. Ndị seraph ya, ndị cherub, na ndị mmụọ ozi ya na-akwado anyị n’oké ọrụ nkwusa ozi ọma anyị zuru ụwa ọnụ. Ya mere ka anyị soro nzukọ eluigwe nke Jehova na-aga n’ihu. Ma olee ụzọ anyị pụrụ isi soro ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ nke na-aga oké ọsọ ọsọ na-agakọ ụkwụ na ụkwụ?
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Àgwà dịgasị aṅaa ka ihe anọ ndị ahụ dị ndụ Ezikiel hụrụ nọchiri anya ha?
◻ Gịnị ka ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova sere onyinyo ya?
◻ Òle ndị ka onye amụma Chineke bụ Ezikiel sere onyinyo ha?
◻ Olee ụzọ nghọta banyere ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke Jehova siworo metụta òtù Ezikiel na oké ìgwè mmadụ ahụ?