Ị̀ Na-enwe Ekele Maka Nzukọ Jehova?
“Otú a ka Jehova sịrị, Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ihe mgbakwasị ụkwụ m.”—AỊSAỊA 66:1.
1, 2. (a) N’ihe àmà dị aṅaa a na-ahụ anya nke nzukọ Jehova ka ị pụrụ ịrụtụ aka? (b) Ebee ka Jehova bi?
Ì KWERE na Jehova nwere nzukọ? Ọ bụrụ otú ahụ, n’ihi gịnị ka i ji kwere ya? Ị pụrụ ịza, sị: ‘Anyị nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze. Anyị nwere ọgbakọ a haziri nke ọma nke nwere òtù ndị okenye. Anyị nwere onye nlekọta sekit a họpụtara nke ọma bụ́ onye na-eleta anyị mgbe nile. Anyị na-eje mgbakọ dị iche iche a haziri ahazi. Anyị nwere alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society ná mba anyị. N’ezie, ihe a nile na ọtụtụ ndị ọzọ na-anwapụta na Jehova nwere nzukọ na-arụ ọrụ.’
2 Ihe ndị dị otú ahụ bụ ihe àmà na e nwere nzukọ. Ma ọ bụrụ na ihe nile anyị na-ahụ ma ghọta bụ ihe dị nanị n’ụwa ebe a, anyị adịghị aghọtazu nzukọ Jehova. Jehova gwara Aịsaịa na ụwa bụ nanị ihe mgbakwasị ụkwụ Ya, ma eluigwe bụ ocheeze Ya. (Aịsaịa 66:1) Olee “eluigwe” nke Jehova na-ezo aka na ya? Ọ̀ bụ ná mbara ikuku anyị? Na mbara igwe? Ka ọ̀ bụ n’ụdị ndụ ọzọ? Aịsaịa na-ekwu banyere ‘ebe obibi nke ịdị nsọ na nke ịma mma’ nke Jehova, ọbụ abụ ahụ kọwakwara eluigwe ndị a dị ka ‘ọnọdụ ebe obibi Ya.’ N’ihi ya, “eluigwe” ahụ dị n’Aịsaịa 66:1 na-ezo aka n’ógbè ndị bụ́ mmụọ a na-adịghị ahụ anya bụ́ ebe Jehova nọ n’ọnọdụ kasị elu, ma ọ bụ nke kasịnụ.—Aịsaịa 63:15; Abụ Ọma 33:13, 14.
3. Olee otú anyị pụrụ isi merie obi abụọ?
3 Ya mere, ọ bụrụ na anyị chọrọ n’ezie ịghọta ma nwee ekele maka nzukọ Jehova, anyị aghaghị ilega anya n’eluigwe. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ụfọdụ na-enwe nsogbu. Ebe ọ bụ na a dịghị ahụ nzukọ eluigwe nke Jehova anya, olee otú anyị si mara na ọ dị adị n’ezie? Ụfọdụ pụrụ ọbụna ịdị na-enwe obi abụọ, na-eche, sị, ‘Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka?’ Olee otú okwukwe pụrụ isi merie obi abụọ? Ụzọ abụọ bụ́ isi bụ inwesi ọmụmụ ihe onwe onye nke Okwu Chineke ike nakwa ịga na ikere òkè ná nzukọ ndị Kraịst mgbe nile. Mgbe ahụ anyị na-ahụ ìhè nke eziokwu nke na-ewepụ obi abụọ anyị. E nwewo ndị ohu Chineke ndị ọzọ nweworo obi abụọ. Ka anyị tụlee ihe banyere ohu Elaịsha mgbe eze Siria na-awakpo Israel.—Tụlee Jọn 20:24-29; Jemes 1:5-8.
Onye Hụrụ Ìgwè Ndị Nọ n’Eluigwe
4, 5. (a) Nsogbu dị aṅaa ka ohu Elaịsha nwere? (b) Olee otú Jehova si zaghachi n’ekpere Elaịsha?
4 Eze Siria zigara usuu ndị agha dị nnọọ ukwuu na Dotan n’abalị ijide Elaịsha. Mgbe ohu Elaịsha tetara n’isi ụtụtụ ma pụọ n’èzí, ikekwe iji nara ikuku ndụ n’elu ụlọ dị larịị nke ebe obibi ha dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ, lee ihe na-awụ akpata oyi ọ hụrụ! Usuu ndị agha nile nke Siria ji ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya agha gbara obodo ahụ gburugburu, na-echere ijide onye amụma Chineke. Ohu ahụ tikuru Elaịsha, sị: “Ewo, onyenwe m! ànyị ga-eme aṅaa?” Dị ka ihe àmà na-egosi, n’ụzọ dị jụụ na nke onye obi siri ike, Elaịsha zaghachiri, sị: “Atụla egwu: n’ihi na ndị anyị na ha nọ dị ọtụtụ karịa ndị ha na ha nọ.” Ohu ahụ aghaghị icheworịị, ‘Olee ebe ha nọ? Apụghị m ịhụ ha!’ Mgbe ụfọdụ nke ahụ pụkwara ịbụ nsogbu anyị—enweghị ike iji anya nke nghọta na-ahụ, ma ọ bụ na-amata ìgwè ndị nọ n’eluigwe.—2 Ndị Eze 6:8-16; Ndị Efesọs 1:18.
5 Elaịsha kpere ekpere ka e meghee anya ohu ya. Gịnị meziri? “Jehova wee saghee anya nwa okorobịa ahụ; o wee hụ: ma, lee, ugwu ahụ jupụtara n’ịnyịnya na ụgbọala ọkụ gburugburu Elaịsha.” (2 Ndị Eze 6:17) Ee, ọ hụrụ ìgwè ndị nọ n’eluigwe, usuu ndị agha bụ́ ndị mmụọ ozi, na-echere iji chebe ohu Chineke. Ugbu a ọ pụrụ ịghọta ihe mere Elaịsha ji nwee obi ike.
6. Olee otú anyị pụrụ isi ghọta nzukọ eluigwe nke Jehova?
6 Ànyị na-enwe nsogbu ịghọta ihe mgbe ụfọdụ nke yiri nke ahụ ohu Elaịsha nwere? Ànyị na-ahụkarị nanị akụkụ a na-ahụ anya nke ọnọdụ ndị na-eyi anyị ma ọ bụ ọrụ ndị Kraịst n’ala ụfọdụ egwu? Ọ bụrụ otú ahụ, ànyị pụrụ ịtụ anya ọhụụ pụrụ iche iji nyekwuo anyị nghọta? Ee e, n’ihi na anyị nwere ihe ohu Elaịsha na-enweghị—otu akwụkwọ nwere ọtụtụ ọhụụ, bụ́ Bible, nke pụrụ ime ka anyị ghọta nzukọ eluigwe ahụ. Okwu ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-enyekwa ụkpụrụ nduzi dị iche iche iji mee ka echiche anyị na ụzọ ndụ anyị guzozie. Otú ọ dị, anyị aghaghị ime mgbalị iji chọọ nghọta ma zụlite ekele maka ndokwa Jehova. Nke ahụkwa ka anyị pụrụ ime site n’ọmụmụ ihe onwe onye, tinyere ekpere na ntụgharị uche.—Ndị Rom 12:12; Ndị Filipaị 4:6; 2 Timoti 3:15-17.
Ịmụ Ihe Iji Mata
7. (a) Nsogbu dị aṅaa ka ụfọdụ pụrụ inwe banyere ọmụmụ Bible onwe onye? (b) N’ihi gịnị ka ọmụmụ ihe onwe onye ji kwesị mgbalị ndị a na-etinye na ya?
7 Ọmụmụ ihe onwe onye abụchaghị atụmanya na-atọ ụtọ nye ọtụtụ ndị, dị ka ndị ahụ ọ na-adịghị mgbe ha nụrụ ụtọ ọmụmụ ihe n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ọ na-adịghị mgbe ha nwere ohere ịmụ ihe. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị chọrọ iji anya nke nghọta anyị mata ma nwee ekele maka nzukọ Jehova, anyị aghaghị ịzụlite ọchịchọ ịmụ ihe. Ị̀ pụrụ iri nri dị ụtọ n’akwadebeghị ya akwadebe? Dị ka osi ite ọ bụla ga-agwa gị, a na-arụ ọrụ dị ukwuu iji sie nri dị ụtọ. Ma, a pụrụ irichapụ ya n’ọkara hour ma ọ bụ n’oge dị nta karị. N’aka nke ọzọ, abamuru nke ọmụmụ ihe onwe onye pụrụ ịdịru oge nile a na-adị ndụ. Ọmụmụ ihe onwe onye pụrụ ịghọ ihe ga-adịwa ụtọ mgbe anyị hụrụ ọganihu anyị pụrụ inwe. Pọl onyeozi kwuru n’ụzọ ziri ezi na anyị kwesịrị ịrịba onwe anyị na ozizi anyị ama na ịnọgide n’ọgụgụ akwụkwọ anyị. A chọrọ mgbalị a nọgidere na-eme, ma abamuru ya pụrụ ịdịru ebighị ebi.—1 Timoti 4:13-16.
8. Àgwà dị aṅaa ka Ilu na-atụ aro ya?
8 Otu nwoke oge ochie maara ihe kwuru, sị: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; ịtọrọ amamihe ntị gị n’ala, wee wezụga obi gị inwe nghọta; ee, ọ bụrụ na ọ bụ mmata ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị; ọ bụrụ na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.”—Ilu 2:1-5.
9. (a) Olee otú uru ọlaedo hà n’iji ya atụnyere “ihe ọmụma Chineke”? (b) Ngwá ọrụ dị aṅaa dị anyị mkpa iji nweta ezi ihe ọmụma?
9 Ị̀ na-amata ebe ibu ọrụ ahụ dị? ‘Ọ bụrụ na ị’ bụ nkebi okwu e kwuru ugboro ugboro. Rịbakwa okwu ahụ bụ́, ‘Ọ bụrụ na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya,’ ama. Chee banyere ndị na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ala bụ́ ndị gwuru maka ọlaọcha na ọlaedo ruo ọtụtụ afọ na Bolivia, Mexico, South Africa, na mba ndị ọzọ. Ha rụsiri ọrụ ike, na-eji mbazụ na shọvel, iji gwupụta nkume ndị ha ga-esite na ya nweta ígwè ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa. Ha ji ọlaedo kpọrọ ihe nke ukwuu nke na n’otu ebe a na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ala na California, U.S.A, ha gwuru ọwa dị kilomita 591, na-eru ịdị omimi nke ihe dị ka kilomita 1.5—nanị iji nweta ọlaedo. Ma, ị̀ pụrụ iri ọlaedo? Ṅụọ ọlaedo? Ọ̀ ga-akwagide gị n’ọzara ma ọ bụrụ na ị na-anwụ n’ihi agụụ ma ọ bụ akpịrị ịkpọ nkụ? Ee e, abamuru ya na-adabere n’ụkpụrụ mmadụ mere na otú o si masị onye, na-agbanwe site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị dị ka e si ere ya n’ahịa mba nile. Otú o sina dị, ndị mmadụ anwụwo maka ya. Ugbu a mgbalị hà aṅaa ka e kwesịrị itinye iji nweta ọlaedo ime mmụọ, bụ́ “ihe ọmụma Chineke”? Cheedị banyere ya, ihe ọmụma nke Eze Onyenwe eluigwe na ala, nzukọ ya, na nzube ya! Banyere nke a, anyị pụrụ iji mbazụ na shọvel ime mmụọ mee ihe. Ihe ndị ahụ bụ mbipụta ndị dabeere na Bible nke na-enyere anyị aka igwuba n’Okwu Jehova ma ghọta ihe ọ pụtara.—Job 28:12-19.
Igwu Ala Maka Nghọta
10. Gịnị ka Daniel hụrụ n’ọhụụ?
10 Ka anyị gwutụ ala ime mmụọ iji malite inweta ihe ọmụma nke nzukọ eluigwe Jehova. Maka nghọta bụ́ isi, ka anyị gaa n’ọhụụ Daniel nke Onye Ochie ahụ n’ocheeze ya. Daniel na-ede, sị: “Anọ m na-ahụ ruo mgbe a tụdasịrị ocheeze dị iche iche, otu Onye ochie wee nọdụ ala: uwe Ya dị ọcha dị ka snow, agịrị isi nke isi Ya dịkwa ka ajị́ anụ nwupụrụ enwupụ; ocheeze Ya bụ ire ọkụ ire ọkụ, wheel Ya nile bụ ọkụ na-ere ere. Osimiri nke bụ́ ọkụ na-erupụta n’ihu Ya: [ọtụtụ puku] ndị ozi na-ejere Ya ozi, [puku iri ụzọ puku iri], na-eguzokwa ọtọ n’ihu Ya: Onyeikpe ahụ nọdụrụ ala, a saghekwara akwụkwọ dị iche iche.” (Daniel 7:9, 10) Ole ndị bụ ọtụtụ puku a na-ejere Jehova ozi? Ntụaka ndị dị n’etiti peji New World Translation, e ji mee ihe dị ka “mbazụ” na “shọvel,” na-eduga anyị na ntụaka ndị dị ka Abụ Ọma 68:17 na Ndị Hibru 1:14. Ee, ndị ahụ na-eje ozi bụ ndị mmụọ ozi nke eluigwe!
11. Olee otú ọhụụ Daniel pụrụ isi nyere anyị aka ịghọta okwu Elaịsha?
11 Ihe ndekọ Daniel anaghị ekwu na ọ hụrụ ndị mmụọ ozi dum kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’okpuru Chineke. A pụrụ inwe ọtụtụ nde ndị ọzọ. Ma n’ezie anyị pụrụ ịghọta ugbu a ihe mere Elaịsha pụrụ iji kwuo, sị: “Ndị anyị na ha nọ dị ọtụtụ karịa ndị ha na ha nọ.” N’agbanyeghị na ndị mmụọ ozi na-ekwesịghị ntụkwasị obi, bụ́ ndị mmụọ ọjọọ, na-akwado usuu ndị agha nke eze Siria, usuu ndị agha eluigwe nke Jehova karịrị ha!—Abụ Ọma 34:7; 91:11.
12. Olee otú ị pụrụ isi matakwuo banyere ndị mmụọ ozi?
12 Ikekwe ị ga-enwe mmasị ịmakwu banyere ndị mmụọ ozi a, dị ka òkè ha na-ekere n’ijere Jehova ozi. Site n’okwu Grik maka mmụọ ozi, anyị pụrụ ịhụ na ha bụ ndị ozi n’ihi na ọ pụtakwara “onye ozi.” Otú ọ dị, e nwekwuru ọtụtụ ihe ọrụ ha gụnyere. Otú ọ dị, iji chọpụta ihe ọ bụ, ị ghaghị igwu ala. Ọ bụrụ na i nwere Insight on the Scriptures, ị pụrụ ịmụ isiokwu bụ́ “Angels” (Ndị Mmụọ Ozi), ma ọ bụ ị pụrụ ịtụle isiokwu ndị gara aga n’Ụlọ Nche banyere ndị mmụọ ozi. Ọ ga-eju gị anya ịhụ ihe dị ukwuu ị pụrụ ịmụta banyere ndị ohu eluigwe a nke Chineke ma ghọta nkwado ha. (Mkpughe 14:6, 7) Otú ọ dị, ná nzukọ eluigwe nke Chineke, ụfọdụ ndị mmụọ e kere eke na-eje ozi maka nzube ndị pụrụ iche.
Ihe Aịsaịa Hụrụ
13, 14. Gịnị ka Aịsaịa hụrụ n’ọhụụ, oleekwa otú nke a si metụta ya?
13 Ugbu a ka anyị gwutụ ala n’ọhụụ Aịsaịa. Mgbe ị na-agụ isi nke 6, amaokwu nke 1 ruo nke 7, o kwesịrị imetụta gị. Aịsaịa na-asị na ya ‘hụrụ Onyenwe anyị ka Ọ na-anọkwasị n’ocheeze,’ ‘ndị seraph na-eguzokwa n’elu ya.’ Ha na-akpọsa ebube Jehova, na-eto ịdị nsọ ya. I kwesịrị inwe mmetụta ọbụna site n’ịgụ ihe ndekọ a. Gịnị bụ mmeghachi omume Aịsaịa? “M wee sị, Ahụhụ na-adịrị m, n’ihi na alawo m n’iyi; n’ihi na onye egbugbere ọnụ ya abụọ rụrụ arụ ka m bụ, ọ bụkwa n’etiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m na-ebi: n’ihi na ọ bụ Eze anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, ka anya m abụọ hụworo!” Lee otú ọhụụ ahụ si nwee mmetụta n’ahụ ya! Ọ̀ dị gị otú ahụ?
14 Ya mere olee otú Aịsaịa si nwee ike iguzogide ihe a dị ebube ọ na-ahụ? Ọ na-akọwa na otu seraph bịara nyere ya aka ma sị: ‘e wezụgawo ajọ omume gị, kpuchiekwa mmehie gị.’ (Aịsaịa 6:7) Aịsaịa pụrụ ịtụkwasị obi n’ebere Chineke ma gee ntị n’okwu Jehova. Ugbu a, ị́ gaghị achọ ịmakwu banyere ndị mmụọ a e kere eke nwere ọkwá dị elu? Mgbe ahụ gịnị ka ị na-aghaghị ime? Gwuo ala iji nwetakwuo ihe ọmụma. Otu ngwá ọrụ ị ga-eji eme ihe ga-abụ Watch Tower Publications Index, na-agbaso ntụaka ya gaa n’ọtụtụ ebe e si enweta ihe ọmụma na-eme ka ihe doo anya.
Gịnị Ka Ezikiel Hụrụ?
15. Gịnị na-egosi na ọhụụ Ezikiel bụ ihe a pụrụ ịdabere na ya?
15 Ka anyị gazie n’ụdị ọzọ nke mmụọ e kere eke. Ezikiel nwere ihe ùgwù ịhụ ọhụụ na-akpali akpali mgbe ọ ka bụ onye a dọtara n’agha na Babilọn. Meghee Bible gị n’Ezikiel isi nke 1, amaokwu atọ ndị bu ụzọ. Olee otú ihe ndekọ ahụ si malite? Ọ̀ na-asị, ‘O ruru otu mgbe, n’otu ala dị anya . . .’? Ee e, nke a abụghị akụkọ ifo dị n’akụkọ ọdịbendị na-enweghị oge na ebe o mere. Amaokwu nke 1 na-ekwu, sị: “O ruo, n’afọ nke [iri atọ], n’ọnwa nke anọ, n’ụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, mgbe mụ onwe m nọ n’etiti ndị e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ n’akụkụ osimiri Keba, na e meghere eluigwe, m wee hụ ọhụụ dị iche iche nke Chineke.” Gịnị ka ị rịbara ama banyere amaokwu a? Ọ na-enye ụbọchị na ebe o mere kpọmkwem. Nkọwa ndị a na-atụ aka n’afọ nke ise nke nchụpụ Eze Jehoiakim, n’afọ 613 T.O.A.
16. Gịnị ka Ezikiel hụrụ?
16 Aka Jehova dịkwasịrị Ezikiel, ọ malitekwara ịhụ ọhụụ na-akpata ụjọ banyere Jehova n’ocheeze dị n’ụgbọ ịnyịnya eluigwe dị ukwuu ndị nwere akatamkpo wheel ndị nwere anya gburugburu ha. Nkọwa na-amasị anyị n’ebe a bụ na e nwere ihe anọ e kere eke, otu na-eguzo na wheel nke ọ bụla. “Nke a bụ ka ha si dị n’ile ha anya; oyiyi mmadụ ka ha nwere. Ọzọ, ihu anọ ka onye ọ bụla n’ime ha nwere, ọ bụkwa nku anọ ka onye ọ bụla n’ime ha nwere. . . . Ma oyiyi ihu nile ha, ihu mmadụ ka ha nwere; ihu ọdụm ka ha anọ nwekwara n’aka nri; ihu ehi ka ha anọ nwekwara n’aka ekpe; ihu ugo ka ha anọ nwekwara.”—Ezikiel 1:5, 6, 10.
17. Gịnị ka ihu anọ nke ndị cherub ahụ na-anọchite anya ha?
17 Gịnị bụ ihe anọ ahụ e kere eke dị ndụ? Ezikiel n’onwe ya na-agwa anyị na ha bụ ndị cherub. (Ezikiel 10:1-3, 14) N’ihi gịnị ka ha ji nwee ihu anọ? Iji nọchite anya àgwà anọ kasị pụta ìhè nke Eze Onyenwe anyị Jehova. Ihu ugo ahụ bụ ihe nnọchiteanya nke amamihe nke na-ahụ ihe dị n’ebe dị anya. (Job 39:27-29) Gịnị ka ihu oké ehi ahụ na-anọchite anya ya? N’inwe ume dị egwu n’olu na n’ubu ya, a marawo oké ehi na-alụ ọgụ ịbụ nke na-ebuli ịnyịnya na onye na-anya ya elu. N’ezie, oké ehi ahụ bụ ihe nnọchiteanya nke ike Jehova na-enweghị nsọtụ. E ji ọdụm mee ihe dị ka ihe nnọchianya nke ikpe ziri ezi e ji obi ike kpee. N’ikpeazụ, ihu mmadụ na-anọchite anya ịhụnanya Chineke n’ụzọ ziri ezi, ebe ọ bụ nanị mmadụ bụ ihe e kere eke nọ n’ụwa nke pụrụ iji ọgụgụ isi gosipụta àgwà a.—Matiu 22:37, 39; 1 Jọn 4:8.
18. Olee otú Jọn onyeozi si na-etinye ihe ná nghọta anyị banyere nzukọ eluigwe ahụ?
18 E nwere ọhụụ ndị ọzọ pụrụ inyere anyị aka ịhụzu ihe a. Ndị a na-agụnye ọhụụ Jọn ndị a kọrọ n’akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe. Jọn, dị ka Ezikiel, na-ahụ Jehova n’ocheeze dị ebube nke ndị cherub na-esonyere. Gịni ka cherub ndị ahụ na-eme? Ha na-ekwughachi mkpọsa ndị seraph nke Aịsaịa isi nke 6, na-asị: “Nsọ, nsọ, nsọ, ka Onye ahụ dị, bụ́ Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile, Onye dịrịị, Onye na-adịkwa adị, Onye na-abịakwa.” (Mkpughe 4:6-8) Jọn na-ahụkwa otu nwa atụrụ n’akụkụ ocheeze ahụ. Ònye ka nke ahụ pụrụ ịnọchite anya ya? Ọ bụ nnọọ Atụrụ nke Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst.—Mkpughe 5:13, 14.
19. Site n’ọmụmụ ihe a, gịnị ka ị mataworo banyere nzukọ Jehova?
19 Ya mere site n’ọhụụ ndị a, gịnị ka anyị mataworo? Na Jehova Chineke n’ocheeze ya nọ n’isi nzukọ eluigwe ahụ, bụ́ onye Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, onye bụ́ Okwu ahụ, ma ọ bụ Logos, na-esonyere. Mgbe ahụ anyị ahụwo usuu ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe, na-agụnye ndị seraph na ndị cherub. Ha bụ akụkụ nke otu nzukọ buru ibu, dị n’otu, nke na-ejere nzube Jehova ozi. Otu n’ime nzube ndị ahụ bụkwa nkwusa nke ozi ọma ahụ gburugburu ụwa n’oge ọgwụgwụ a.—Mak 13:10; Jọn 1:1-3; Mkpughe 14:6, 7.
20. Ajụjụ dị aṅaa ka a ga-aza n’isiokwu na-esonụ?
20 N’ikpeazụ, anyị nwere Ndịàmà Jehova n’ụwa bụ́ ndị na-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha iji mụta otú ha ga-esi mee uche Eze Onyenwe anyị. N’ezie, ugbu a anyị pụrụ ịghọta na ndị anyị na ha nọ dị ọtụtụ karịa ndị ha na Setan na ndị iro nke eziokwu ahụ nọ. Ajụjụ fọdụrụnụ bụ, Gịnị jikọrọ nzukọ eluigwe ahụ na nkwusa nke ozi ọma Alaeze ahụ? Isiokwu na-esonụ ga-enyocha nke ahụ na ihe ndị ọzọ.
Ajụjụ Maka Ntụleghachi
◻ Iji nwee ekele maka nzukọ Jehova, gịnị ka anyị na-aghaghị ịmata?
◻ Ahụmahụ dị aṅaa ka ohu Elaịsha nwere, oleekwa otú onye amụma ahụ si gbaa ya ume?
◻ Olee otú anyị kwesịrị isi ele ọmụmụ ihe onwe onye anya?
◻ Olee otú Daniel, Aịsaịa, na Ezikiel si nye nkọwa zuru ezu banyere nzukọ eluigwe?
[Foto ndị dị na peeji nke 13]
Abamuru nke ọmụmụ ihe onwe onye na-adịte aka karịa ndị nke nri a kwadebere nke ọma
[Foto dị na peeji nke 15]
Ọhụụ nke usuu ndị nọ n’eluigwe bụ azịza Jehova nye ekpere Elaịsha