Isi nke Itoolu
Ònye Ga-achị Ụwa?
1-3. Kọwaa nrọ na ọhụụ ndị Daniel hụrụ n’afọ mbụ nke ọchịchị Belshaza.
AMỤMA Daniel na-adọrọ mmasị na-akpọghachi anyị azụ ugbu a n’afọ mbụ nke Eze Belshaza nke Babilọn. O tewo aka e mere ka Daniel jee biri na Babilọn, ma ọ dịbeghị mgbe o si n’iguzosi ike n’ezi ihe ya nye Jehova wezụga onwe ya. Ugbu a ọ nọ n’afọ 70 na ụma ya, onye amụma ahụ kwesịrị ntụkwasị obi hụrụ “nrọ na ọhụụ dị iche iche nke isi ya n’elu ihe ndina ya.” Leekwa otú ọhụụ ndị ahụ si tụọ ya egwu!—Daniel 7:1, 15.
2 “Lee,” ka Daniel ji oké olu kwuo. “Ifufe anọ nke eluigwe na-efekwasị oké osimiri ukwu sie ike. Anụ anọ nke dị ukwuu wee na-esi n’oké osimiri rịgopụta, ha dị iche n’otu n’ibe ya.” Lee anụ pụrụ iche ha bụ! Nke mbụ bụ ọdụm nwere nku, nke abụọ kwa yiri anụ ọhịa bear. Agụ nke nwere nku anọ na isi anọ sochiziri! Anụ nke anọ nke siri oké ike nwere eze ígwè buru ibu na mpi iri. Mpi “nta” nke nwere “anya dị iche iche dị ka anya mmadụ” na “otu ọnụ nke na-ekwu oké ihe dị iche iche” si n’etiti mpi iri ya pulite.—Daniel 7:2-8.
3 Mgbe nke ahụ gasịrị, ọhụụ Daniel lekwasịziri anya n’eluigwe. Onye Ochie ahụ na-anọkwasị n’ocheeze n’ụzọ dị ebube dị ka Onyeikpe n’Ogige dị n’eluigwe. ‘Ọtụtụ puku ndị ozi na-ejere Ya ozi, puku iri ụzọ puku iri, na-eguzokwa ọtọ n’ihu Ya.’ N’ịma anụ ndị ahụ ikpe, ọ napụrụ ha ịchịisi ma gbuo anụ nke anọ. E nyefere “otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ” ọchịchị na-adịgide adịgide n’isi “ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche.”—Daniel 7:9-14.
4. (a) Ònye ka Daniel gakwuuru maka ihe bụ eziokwu banyere ihe a nile? (b) N’ihi gịnị ka ihe Daniel hụrụ ma nụ n’abalị ahụ ji dị anyị mkpa?
4 “Ma mụ onwe m,” ka Daniel na-ekwu, “o wutere mmụọ m n’ime ọ́bọ́ ya, ọhụụ nile nke isi m na-emekwa ka m maa jijiji.” Ya mere ọ chọrọ inweta “ihe bụ eziokwu banyere ihe a nile” site n’aka otu mmụọ ozi. N’ezie mmụọ ozi ahụ kọwaara ya “isi ọhụụ ndị a.” (Daniel 7:15-28) Anyị nwere mmasị dị ukwuu n’ihe Daniel hụrụ ma nụ n’abalị ahụ, n’ihi na ọ kọwapụtara ihe ga-eme n’ụwa n’ọdịnihu bụ́ ndị ga-adịru n’oge anyị, mgbe e nyere “otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ” ọchịchị n’isi “ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche.” Site n’enyemaka nke Okwu na mmụọ Chineke, anyị onwe anyị kwa pụrụ ịghọta ihe ọhụụ amụma ndị a pụtara.a
ANỤ ANỌ ESI N’OKÉ OSIMIRI PỤTA
5. Gịnị ka oké osimiri ahụ ifufe na-efekwasị nọchiri anya ya?
5 “Anụ anọ nke dị ukwuu wee na-esi n’oké osimiri rịgopụta,” ka Daniel kwuru. (Daniel 7:3) Gịnị ka oké osimiri ahụ ifufe na-efekwasị na-anọchite anya ya? Ọtụtụ afọ n’ihu, Jọn onyeozi hụrụ anụ ọhịa nwere isi asaa ka o si “n’oké osimiri” rịgopụta. Oké osimiri ahụ nọchitere anya “ndị dị iche iche, na ìgwè mmadụ, na mba dị iche iche, na asụsụ dị iche iche”—ìgwè buru ibu nke ihe a kpọrọ mmadụ si n’ebe Chineke nọ wezụga onwe ha. Mgbe ahụ, oké osimiri ahụ bụ ihe nnọchianya kwesịrị ekwesị nke ìgwè ihe a kpọrọ mmadụ e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ.—Mkpughe 13:1, 2; 17:15; Aịsaịa 57:20.
6. Gịnị ka anụ anọ ahụ na-ese onyinyo ha?
6 “Anụ ukwu ndị a, nke dị anọ,” ka mmụọ ozi Chineke kwuru, “bụ eze anọ, ndị ga-esi n’ala bilie ọtọ.” (Daniel 7:17) N’ụzọ doro anya, mmụọ ozi ahụ kọwara anụ anọ ahụ Daniel hụrụ dị ka “eze anọ.” N’ihi ya, anụ ndị a pụtara ike ọchịchị ụwa. Ma hà bụ ole ndị?
7. (a) Gịnị ka ụfọdụ ndị na-akọwa Bible na-ekwu banyere nrọ ọhụụ nke Daniel banyere anụ anọ ahụ na nrọ Eze Nebukadneza banyere onyinyo ahụ dị ukwuu? (b) Gịnị ka nke ọ bụla n’ime akụkụ anọ nke onyinyo ahụ na-anọchite anya ya?
7 Ndị na-akọwa Bible na-ejikọkarị nrọ ọhụụ Daniel banyere anụ anọ ahụ na nrọ Nebukadneza banyere onyinyo ahụ dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, The Expositor’s Bible Commentary na-ekwu, sị: “Isi nke 7 [nke Daniel] na isi nke 2 bụ otu ihe.” The Wycliffe Bible Commentary na-ekwu, sị: “E kweere ebe nile na usoro ike ọchịchị nke mba ndị Jentaịl anọ . . . bụ otu ihe ahụ n’ebe a [na Daniel isi nke 7] dị ka nke ahụ a tụlere na [Daniel] isi nke 2.” Ike ọchịchị ụwa anọ nke ọla anọ ahụ dị ná nrọ Nebukadneza bụ Alaeze Ukwu Babilọn (isi ọlaedo), Medo-Peasia (obi na ogwe aka ọlaọcha), Gris (afọ na apata ụkwụ ọla copper), na Alaeze Ukwu Rom (ụkwụ ígwè).b (Daniel 2:32, 33) Ka anyị lee otú alaeze ndị a si kwekọọ n’anụ ukwu anọ ahụ Daniel hụrụ.
Ọ DỊ NJỌ KA ỌDỤM, DỊRỊ NGWA KA UGO
8. (a) Olee otú Daniel si kọwaa anụ nke mbụ? (b) Olee alaeze ukwu anụ mbụ ahụ na-anọchite anya ya, oleekwa otú o si kpaa àgwà ka ọdụm?
8 Lee anụ ndị dị egwu Daniel hụrụ! N’ịkọwa otu, ọ sịrị: “Nke mbụ dị ka ọdụm, o nwekwara nku abụọ nke ugo: anọ m na-ele ruo mgbe e kwopụrụ nku ya abụọ, e wee si n’ala bulie ya elu, ọ bụkwa n’ụkwụ abụọ ka e guzobere ya ọtọ dị ka mmadụ, ọ bụkwa obi mmadụ ka e nyere ya.” (Daniel 7:4) Anụ a sere onyinyo otu ọchịchị ahụ nke isi ọlaedo nke onyinyo ahụ dị ukwuu nọchiri anya ya, bụ́ Ike Ọchịchị Ụwa Babilọn (607-539 T.O.A.). Dị ka “ọdụm” na-eri anụ ibe ya, Babilọn ji obi ọjọọ bibie mba ndị ọzọ, tinyere ndị Chineke. (Jeremaịa 4:5-7; 50:17) Dị ka a ga-asị na o ji nku ugo, “ọdụm” a gara n’ihu ngwa ngwa n’inwe mmeri kpụ ọkụ n’ọnụ.—Abụ Ákwá 4:19; Habakuk 1:6-8.
9. Olee mgbanwe ndị anụ ahụ yiri ọdụm nwere, oleekwa otú ha si metụta ya?
9 Ka oge na-aga, “e kwopụrụ nku nke ọdụm ahụ pụrụ iche nke nwere nku. Ka ọgwụgwụ nke ọchịchị Eze Belshaza na-abịaru nso, Babilọn enwekwaghị ike ọsọ ya nke inwe mmeri na ịdị ike yiri nke ọdụm n’ebe mba ndị ọzọ dị. Ọ dịghị agbakarị onye ji ụkwụ aga n’ọsọ. N’ịbụ nke nwetara “obi mmadụ,” ọ ghọrọ nke na-adịghị ike. Ebe ọ na-enweghị “obi ọdụm,” Babilọn enwekwaghị ike ịkpa àgwà ka eze “n’etiti anụmanụ nke oké ọhịa.” (Tụlee 2 Samuel 17:10; Maịka 5:8.) Anụ ukwu ọzọ meriri ya.
IHE NA-ERI OKÉ NRI DỊ KA BEAR
10. Olee usoro ndị ọchịchị nke “bear” ahụ nọchiri anya ya?
10 “Lee,” ka Daniel kwuru, “anụ ọzọ, nke mere ha abụọ, nke yiri bear, ma n’otu akụkụ ka e mere ya ka o bilie, ọgịrịga atọ dịkwa n’ọnụ ya n’etiti ezé ya: ọ bụkwa otú a ka ha na-asị ya, Bilie, rie ọtụtụ anụ.” (Daniel 7:5) Eze nke “bear” ahụ nọchiri anya ya bụ otu eze ahụ nke obi na ogwe aka ọlaọcha nke nnukwu onyinyo ahụ nọchitere anya ya—usoro ndị ọchịchị Medo-Peasia (539-331 T.O.A.) na-amalite na Daraịọs onye Midia na Saịrọs Onye Ukwu ma na-akwụsị na Daraịọs nke Atọ.
11. Olee ihe ime ka bear ihe atụ ahụ bilie n’otu akụkụ na ya inwe ọgịrịga atọ n’ọnụ ya pụtara?
11 “Bear” ihe atụ ahụ bụ nke ‘e mere ka o bilie n’otu akụkụ,’ ma eleghị anya iji jikere ịwakpo na imeri mba dị iche iche wee si otú a jigide ike ọchịchị ụwa. Ma ọ bụ a pụrụ ibuworị n’obi ka ọnọdụ a gosi na usoro ndị ọchịchị Peasia ga-emeri otu onye nanị ya bụ eze Midia, bụ́ Daraịọs. Ọgịrịga atọ ahụ dị n’etiti ezé bear ahụ pụrụ ịpụta akụkụ atọ o ji mmeri ya jee. “Bear” Medo-Peasia ahụ gara n’ebe ugwu iji weghara Babilọn na 539 T.O.A. Mgbe o mesịrị nke ahụ, ọ gara n’ebe ọdịda anyanwụ site n’Asia Minor wee banye Thrace. N’ikpeazụ, “bear” ahụ gara n’ebe ndịda iji merie Ijipt. Ebe ọnụ ọgụgụ bụ́ atọ na-anọchi anya imesi ihe ike mgbe ụfọdụ, ọgịrịga atọ ahụ pụkwara ịbụ iji mesie anyaukwu nke bear ihe atụ ahụ nwere maka mmeri ike.
12. Gịnị si na bear ihe atụ ahụ irube isi n’iwu bụ́: “Bilie, rie ọtụtụ anụ” pụta?
12 “Bear” ahụ wakporo mba dị iche iche n’imezu okwu bụ́: “Bilie, rie ọtụtụ anụ.” Site n’iripịa Babilọn dị ka uche Chineke si dị, Medo-Peasia nọ n’ọnọdụ nke ije ozi ga-abara ndị Jehova uru. O mekwara otú ahụ! (Lee “Eze Kwere Ibe Nọrọ,” na peji nke 149.) Site n’aka Saịrọs Onye Ukwu, Daraịọs nke Mbụ (Daraịọs Onye Ukwu), na Ataksakses nke Mbụ, Medo-Peasia tọhapụrụ ndị Juu Babilọn dọọrọ n’agha ma nyere ha aka iwughachi ụlọukwu Jehova na ịrụzi mgbidi Jerusalem. Ka oge na-aga, Medo-Peasia malitere ịchị ihe karịrị ala a na-achị achị dị 127, di Eze Nwanyị Esta, bụ́ Ahasuerọs (Xerxes nke Mbụ), bụkwa eze “site n’India wee ruo Etiopia.” (Esta 1:1) Otú ọ dị, anụ ọzọ na-aga ibilite.
Ọ DỊ NGWA DỊ KA AGỤ NWERE NKU!
13. (a) Gịnị ka anụ nke atọ nọchiri anya ya? (b) Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ nke anụ nke atọ ahụ na ebe ọ chịrị?
13 Anụ nke atọ “dị ka agụ, ma o nwere nku anọ nke anụ ufe n’azụ ya; ọ bụkwa isi anọ ka anụ a nwere; a na-enyekwa ya ọchịchị.” (Daniel 7:6) Dị ka ogbo ya—afọ na apata ụkwụ ọla copper nke onyinyo dị ná nrọ Nebukadneza—agụ a nwere nku anọ na isi anọ nọchiri anya usoro ndị ọchịchị Masedonia, ma ọ bụ Gris, na-amalite n’Alexander Onye Ukwu. N’ịdị gara gara na ọsọ nke agụ, Alexander gabigara site n’Asia Minor, gaa n’ebe ndịda banye n’Ijipt, garakwa banye n’ókèala ọdịda anyanwụ nke India. (Tụlee Habakuk 1:8.) Ebe ndị ọ chịrị dị ukwuu karịa nke “bear” ahụ, n’ihi na ọ gụnyere Masedonia, Gris, na Alaeze Ukwu Peasia.—Lee “Otu Eze Bụ́ Okorobịa Emerie Ụwa,” na peji nke 153.
14. Olee otú “agụ” ahụ si nwee isi anọ?
14 “Agụ” ahụ ghọrọ nke nwere isi anọ mgbe Alexander nwụsịrị na 323 T.O.A. Anọ n’ime ndị ọchịagha ya mesịrị ghọọ ndị nọchiri ya ná mpaghara dị iche iche nke ebe ndị ọ chịrị. Seleucus chịrị Mesopotemia na Siria. Ptolemy chịrị Ijipt na Palestine. Lysimachus chịrị Asia Minor na Thrace, Cassander nwetakwara Masedonia na Gris. (Lee “E Kewaa Otu Alaeze Buru Ibu,” na peji nke 162.) Ihe ize ndụ ọhụrụ biliteziri.
ANỤ ỌHỊA DỊ EGWU AGHỌỌ NKE DỊ ICHE
15. (a) Kọwaa anụ nke anọ ahụ. (b) Gịnị ka anụ nke anọ ahụ nọchiri anya ya, oleekwa otú o si tapịa ma ripịa ihe nile nọchiiri ya ụzọ?
15 Daniel kọwara anụ ọhịa nke anọ dị ka “nke dị egwu, nwee ume, dịkarịsịrị ike.” Ọ gara n’ihu, sị: “O nwekwara ezé dị ukwuu nke ígwè: o ripịara ihe tapịakwa, ma nke fọdụrụ, o jiri ụkwụ ya zọtọọ ya: anụ ahụ dịkwa iche n’anụ nile buru ya ụzọ; o nwekwara mpi iri.” (Daniel 7:7) Anụ ọhịa a dị egwu malitere dị ka ike ọchịchị na nke agha Rom. O ji nwayọọ nwayọọ weghara mpaghara anọ nke Alaeze Ukwu Gris, ka ọ na-erulekwa afọ 30 T.O.A., Rom aghọwo ike ọchịchị ụwa ọzọ nke amụma Bible. N’iji ike agha na-emeri ihe nile nọchiiri ya ụzọ, Alaeze Ukwu Rom mesịrị mụbaa wee na-achị malite na British Isles ruo ihe ka ukwuu na Europe, ruorị Osimiri Mediterranean, gabigakwa Babilọn ruo Gulf nke Peasia.
16. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ kwuru banyere anụ nke anọ ahụ?
16 N’inwe ọchịchọ ịmata banyere anụ a “dịkarịsịrị egwu,” Daniel gere ntị nke ọma ka mmụọ ozi ahụ na-akọwa, sị: “Mpi iri [ya], ọ bụ n’alaeze ahụ ka eze iri ga-esi bilie: eze ọzọ ga-ebilikwa n’azụ ha; ma ya onwe ya ga-apụ iche n’ahụ ndị buru ya ụzọ, eze atọ ka ọ ga-emekwa ka ha dị ala.” (Daniel 7:19, 20, 24) Gịnị bụ “mpi iri,” ma ọ bụ “eze iri” a?
17. Gịnị ka “mpi iri” nke anụ nke anọ ahụ nọchiri anya ya?
17 Ka Rom na-abawanye ọgaranya ma na-arụwanye arụ n’ihi ibi ndụ ịla n’iyi nke ndị na-achị ya, ọ dalatara dị ka ike agha. Ka oge na-aga, mbelata nke ike agha Rom pụtara ìhè nke ọma. Alaeze ukwu ahụ dị ike mesịrị kewasịa ghọọ ọtụtụ alaeze. Ebe Bible na-ejikarị ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ iri eme ihe iji nye echiche izu ezu, “mpi iri” nke anụ nke anọ ahụ na-anọchite anya alaeze nile ndị sitere ná ndakpọ Rom pụta.—Tụlee Deuterọnọmi 4:13; Luk 15:8; 19:13, 16, 17.
18. Olee otú Rom si nọgide na-achị Europe ruo ọtụtụ narị afọ mgbe e wepụsịrị eze ukwu ikpeazụ ya?
18 Otú ọ dị, Ike Ọchịchị Ụwa Rom abịaghị ná njedebe mgbe e wepụrụ eze ukwu ikpeazụ ya na Rom na 476 O.A. Ruo ọtụtụ narị afọ, Rom nke ndị popu na-achị nọgidere na-achị Europe n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na karịsịa n’ụzọ okpukpe. O mere nke ahụ site n’usoro ọchịchị ndị nwe ala, ebe a na-eme ka ọtụtụ ndị bi na Europe nọrọ n’okpuru onye nwe ala, nọrọzie n’okpuru otu eze. Ndị eze nile nabatakwara ikike nke popu. N’ihi ya Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ nke nwere Rom nke popu na-achị dị ka ọnọdụ ya bụ́ isi chịkwara ihe omume ụwa n’ime ogologo oge ahụ dị n’akụkọ ihe mere eme nke a kpọrọ Oge Ụwa Nọ n’Ìsì.
19. Dị ka otu ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo, olee otú Rom dị ma e jiri ya tụnyere alaeze ukwu ndị bu ya ụzọ?
19 Ònye ga-ekwu na anụ nke anọ ahụ ‘adịghị iche n’alaeze ndị ọzọ ahụ nile’? (Daniel 7:19, 23) Banyere nke a, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ H. G. Wells dere, sị: “Ike ọchịchị ọhụrụ a nke Rom . . . dị nnọọ iche n’ọtụtụ ụzọ n’ebe alaeze ukwu ọ bụla nke dịtụworo n’ụwa mepere anya ruo mgbe ahụ dị. . . . [Ọ] gụnyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị Gris nile nọ n’ụwa, ụmụ Ham na ụmụ Shem bi n’ime ya dịkwa ala n’ọnụ ọgụgụ karịa n’alaeze ukwu ọ bụla bu ya ụzọ . . . Ruo mgbe ahụ ọ bụ usoro ọhụrụ n’akụkọ ihe mere eme . . . Alaeze Ukwu Rom bụ ihe topụtara etopụta, ihe topụtara ọhụrụ nke a na-emeghị atụmatụ ya; ndị Rom hụtara onwe ha ka ha na-etinye aka n’usoro ọchịchị ọhụrụ sara mbara.” Ma, anụ nke anọ ahụ na-aga itokwu.
MPI NTA ARỊGOPỤTA
20. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ kwuru banyere mpupụta nke otu mpi nta n’isi anụ nke anọ ahụ?
20 “Anọ m na-elegide mpi iri ahụ,” ka Daniel kwuru, “ma, lee, otu mpi ọzọ, nke dị nta, rịgotara n’etiti ha, e wee fopu mpi atọ n’ime mpi iri mbụ n’ihu ya.” (Daniel 7:8) Banyere mpupụta a, mmụọ ozi ahụ gwara Daniel, sị: “Eze ọzọ ga-ebilikwa n’azụ ha [eze iri ahụ]; ma ya onwe ya ga-apụ iche n’ahụ ndị buru ya ụzọ, eze atọ ka ọ ga-emekwa ka ha dị ala.” (Daniel 7:24) Ònye bụ eze a, olee mgbe o bilitere, oleekwa eze atọ o mere ka ha dị ala?
21. Olee otú Britain si bịa bụrụ mpi nta ihe atụ nke anụ nke anọ ahụ?
21 Tụlee ihe ndị na-esonụ merenụ. Na 55 T.O.A., Ọchịagha Julius Caesar nke Rom wakporo Great Britain ma o guzobelighị ógbè na-adịgide adịgide. Na 43 O.A., Eze Ukwu Claudius malitere imeri ebe ndịda Britain n’ụzọ na-adịgide adịgide karị. Mgbe ahụ, na 122 O.A., Eze Ukwu Hadrian malitere iwu otu mgbidi site n’Osimiri Tyne ruo n’Ọwa Mmiri Solway, na-akpa ókè ebe ebe ugwu nke Alaeze Ukwu Rom jedebere. Ná mmalite nke narị afọ nke ise, usuu ndị agha Rom hapụrụ agwaetiti ahụ. “Na narị afọ nke iri na isii,” ka otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kọwara, “England aghọworị ike ọchịchị dị ala karị. Akụ̀ na ụba ya dị nta ma e jiri ya tụnyere nke Netherlands. Ndị bi na ya dị nnọọ ala karịa nke France. Usuu ndị agha ya (tinyere ndị agha mmiri ya) esirughị ike ka nke Spain.” Ihe àmà na-egosi na Britain bụ alaeze dị nta mgbe ahụ, na-aghọ mpi nta ihe atụ ahụ nke anụ nke anọ ahụ. Ma, nke ahụ gaje ịgbanwe.
22. (a) Olee mpi atọ ndị ọzọ nke anụ nke anọ ahụ ndị mpi “nta” ahụ meriri? (b) Gịnị ka Britain ghọziri?
22 Na 1588, Philip nke Abụọ nke Spain malitere ibu agha Ìgwè Ụgbọ Mmiri nke Ndị Spain megide Britain. Ìgwè ụgbọ mmiri 130 ndị a, bu ihe karịrị ndị ikom 24,000, gbaara ruo Ọwa Mmiri England ma bụrụ ndị ndị agha mmiri Britain meriri, bụrụkwa ndị ifufe dị ike na ajọ ifufe sitere n’Atlantic kpara aka ọjọọ. Ihe omume a “kara akara mgbe ịbụ ọkaibe n’agha mmiri sitere n’aka ndị Spain gafere n’aka ndị England,” ka otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru. Na narị afọ nke 17, ndị Netherlands mepụtara ụgbọ mmiri azụmahịa kasị ukwuu n’ụwa. Otú ọ dị, ebe o nwere ógbè ndị na-amụba n’ọnụ ọgụgụ bụ́ ndị ọ na-achị n’ala ndị ọzọ, Britain meriri alaeze ahụ. Na narị afọ nke 18, ndị Britain na France lụrụ ọgụ n’Ebe Ugwu America na n’India, na-eduga ná Nkwekọrịta nke Paris na 1763. Nkwekọrịta a, ka onye na-ede akwụkwọ bụ́ William B. Willcox kwuru, “nabatara ọkwá ọhụrụ nke Britain dị ka ike ọchịchị Europe kasịnụ n’akụkụ ụwa na-abụghị Europe.” E mere ka ịka ike nke Britain pụtakwuo ìhè ná mmeri o meriri Napoléon nke France n’ụzọ dị egwu na 1815 O.A. “Eze atọ” nke Britain si otú a ‘mee ka ha dị ala’ bụ Spain, Netherlands, na France. (Daniel 7:24) Dị ka ihe si na ya pụta, Britain ghọrọ ike ọchịchị na nke azụmahịa kasịnụ n’ụwa. Ee, mpi “nta” ahụ toro ghọọ ike ọchịchị ụwa!
23. N’ụzọ dị aṅaa ka mpi nta ihe atụ ahụ si ‘ripịa ụwa nke a nile’?
23 Mmụọ ozi ahụ gwara Daniel na anụ nke anọ, ma ọ bụ alaeze nke anọ ahụ, ‘ga-eripịa ụwa nke a nile.’ (Daniel 7:23) Nke ahụ ghọrọ eziokwu banyere ógbè Rom a mabu dị ka Great Britain. O mesịrị ghọọ Alaeze Ukwu Britain ma ‘ripịa ụwa nke a nile.’ N’otu oge, alaeze ukwu a gụnyere otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ala ụwa na otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi n’ime ya.
24. Gịnị ka otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru banyere Alaeze Ukwu Britain ịbụ nke dị iche?
24 Otú ahụ Alaeze Ukwu Rom si dị iche n’ebe ike ọchịchị ụwa ndị bu ya ụzọ dị, eze ahụ nke mpi “nta” ahụ na-ese onyinyo ya ga-apụkwa “iche n’ahụ ndị buru ya ụzọ.” (Daniel 7:24) Banyere Alaeze Ukwu Britain, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ H. G. Wells kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe dị otú ahụ dịtụworonụ. Nke mbụ na nke bụ́ isi nye usoro ihe ahụ nile bụ ‘ọchịchị praịm minista na eze’ nke Alaeze Britain Ndị Dị n’Otu . . . Ọ dịghị ngalaba ọchịchị ma ọ bụ onye ghọtatụworo Alaeze Ukwu Britain n’ozuzu ya. Ọ bụ ngwakọta nke topụtara etopụta na nkwakọba ihe nke dị nnọọ iche n’ihe ọ bụla nke a kpọtụworo alaeze ukwu.”
25. (a) N’ọdịdị ọhụrụ ya, gịnị mejupụtara mpi nta ihe atụ ahụ? (b) N’echiche dị aṅaa ka mpi “nta” ahụ nwere “anya dị iche iche, dị ka anya mmadụ” na “ọnụ nke na-ekwu oké ihe dị iche iche”?
25 Mpi “nta” ahụ gụnyere ihe karịrị Alaeze Ukwu Britain. Na 1783, Britain nabatara nnwere onwe nke ógbè 13 ọ na-achị n’America. United States of America mesịrị ghọọ ndị ha na Britain jikọrọ aka, na-aghọ mba kasị ike n’ụwa mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị. Ya na Britain ka nwekwara njikọ siri ike. Ike ọchịchị ụwa dị abụọ bụ́ Anglo-America nke si na ya pụta ghọrọ ‘mpi ahụ nwere anya dị iche iche.’ N’ezie, ike ọchịchị ụwa a na-eleru anya ala, dị akọ! Ọ “na-ekwu oké ihe dị iche iche,” na-atụrụ akụkụ dị ukwuu n’ụwa ụkpụrụ ma na-eje ozi dị ka ọnụ na-ekwuru ya, ma ọ bụ “onye amụma ụgha.”—Daniel 7:8, 11, 20; Mkpughe 16:13; 19:20.
MPI NTA AHỤ EMEGIDE CHINEKE NA NDỊ NSỌ YA
26. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ buru amụma ya banyere okwu na omume mpi ihe atụ ahụ n’ebe Jehova na ndị ohu ya nọ?
26 Daniel gara n’ihu na-akọwa ọhụụ ya, na-asị: “Anọ m na-ahụ, mpi ahụ wee na-ebuso ndị nsọ agha, nwee ike imegide ha.” (Daniel 7:21) Banyere “mpi,” ma ọ bụ eze a, mmụọ ozi Chineke buru amụma, sị: “Okwu dị iche iche megide Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu ka ọ ga-ekwu, ọ bụkwa ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu ka ọ ga-eme ka ha kaa nká: ọ ga-elekwa anya ịgbanwe mgbe dị iche iche a kara aka na iwu; a ga-enyekwa ha n’aka ya ruo otu oge na oge abụọ na nkera oge.” (Daniel 7:25) N’ụzọ dị aṅaa, ọ bụkwa olee mgbe ka akụkụ a nke amụma ahụ mezuru?
27. (a) Olee ndị bụ “ndị nsọ” ahụ nke mpi “nta” ahụ kpagburu? (b) Olee otú mpi ihe atụ ahụ si zube “ịgbanwe mgbe dị iche iche a kara aka na iwu”?
27 “Ndị nsọ” nke mpi “nta” ahụ—Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America—kpagburu bụ ụmụazụ Jisọs e ji mmụọ nsọ tee mmanụ nọ n’elu ụwa. (Ndị Rom 1:7; 1 Pita 2:9) Ruo ọtụtụ afọ tupu Agha Ụwa Mbụ, ihe fọdụrụ na ndị a e tere mmanụ dọrọ aka ná ntị n’ihu ọha na “oge nke mba ọzọ” ga-agwụsị na 1914. (Luk 21:24) Mgbe agha dara n’afọ ahụ, ọ pụtara ìhè na mpi “nta” ahụ elegharawo ịdọ aka ná ntị a anya, n’ihi na ọ nọgidere na-amaja “ndị nsọ” ahụ e tere mmanụ. Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America ahụ ọbụna megidere mgbalị ha imezu ọchịchọ (ma ọ bụ, “iwu”) Jehova bụ́ na ndịàmà ya ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze n’elu ụwa dum. (Matiu 24:14) N’ihi ya mpi “nta” ahụ nwara “ịgbanwe mgbe dị iche iche a kara aka na iwu.”
28. Olee otú “otu oge na oge abụọ na nkera oge” ahụ hà n’ogologo?
28 Mmụọ ozi Jehova zoro aka n’otu oge amụma nke “otu oge na oge abụọ na nkera oge.” Olee otú nke ahụ haruru n’ogologo? Ndị na-akọwa Bible kweere n’ozuzu ha na okwu a pụtara oge atọ na ọkara—mgbakọta nke otu oge, oge abụọ, na nkera oge. Ebe “oge asaa” Nebukadneza gbara ara bụ afọ asaa, oge atọ na ọkara ahụ bụ afọ atọ na ọkara.c (Daniel 4:16, 25) An American Translation na-agụ, sị: “A ga-arara ha nye n’aka ya ruo otu afọ, afọ abụọ, na ọkara otu afọ.” Nsụgharị nke James Moffatt na-asị: “Ruo afọ atọ na ọkara.” A kpọtụrụ otu oge ahụ uche ná Mkpughe 11:2-7, bụ́ nke na-ekwu na ndịàmà Chineke ga-eyi ákwà mkpe mee nkwusa ruo ọnwa 42, ma ọ bụ ụbọchị 1,260, e gbuzie ha. Olee mgbe oge a malitere ma jedebe?
29. Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka afọ atọ na ọkara ahụ e buru n’amụma malitere?
29 Nye ndị Kraịst e tere mmanụ, Agha Ụwa Mbụ pụtara oge ule. Ka ọ na-erule ngwụsị nke 1914, ha nọ na-atụ anya mkpagbu. N’ezie, isiokwu dịịrị afọ nke a họọrọ maka 1915 bụ ajụjụ Jisọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, “Ùnu pụrụ ịṅụ iko m?” Ọ dabeere na Matiu 20:22, King James Version. N’ihi ya, malite na December 1914, ìgwè ndịàmà ahụ dị nta mere nkwusa ‘n’ákwà mkpe.’
30. Olee otú Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America si majaa ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge Agha Ụwa Mbụ?
30 Ka ọgba aghara agha ahụ na-ebiri ọkụ, ndị Kraịst e tere mmanụ zutere mmegide na-arị elu. A tụrụ ụfọdụ n’ime ha mkpọrọ. Ndị ọchịchị obi kpọrọ nkụ mekpọrọ ụfọdụ ndị ọnụ, dị ka Frank Platt n’England na Robert Clegg na Canada. Na February 12, 1918, Gọọmentị Canada nke Nọ n’Okpuru Britain machibidoro mpịakọta nke asaa ahụ e bipụtara ọhụrụ nke Studies in the Scriptures, nke isiokwu ya bụ The Finished Mystery, nakwa traktị a kpọrọ The Bible Students Monthly. N’ọnwa na-esochi ya, Ngalaba Okwu Ikpe nke United States kwuru na nkesa nke mpịakọta nke asaa ahụ megidere iwu. Gịnị si na ya pụta? Leenụ, e mere nnyocha nke ebe obibi, jichie akwụkwọ, jidekwa ndị na-efe Jehova!
31. Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka “otu oge na oge abụọ na nkera oge” ahụ gwụsịrị?
31 Ịmaja ndị Chineke e tere mmanụ ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu na June 21, 1918, mgbe a mara onyeisi oche, J. F. Rutherford, na ndị òtù Watch Tower Bible and Tract Society a ma ama ikpe ịga mkpọrọ ruo ogologo oge n’ihi ebubo ụgha dị iche iche. N’izube “ịgbanwe mgbe dị iche iche a kara aka na iwu,” mpi “nta” ahụ egbuwo ọrụ nkwusa ahụ a haziri ahazi dị ka a pụrụ isi kwuo ya. (Mkpughe 11:7) Ya mere oge ahụ e buru amụma ya bụ́ “otu oge na oge abụọ na nkera oge” gwụsịrị na June 1918.
32. N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwuo na mpi “nta” ahụ ekpochapụghị “ndị nsọ” ahụ?
32 Ma mmaja nke mpi “nta” ahụ ekpochapụghị “ndị nsọ” ahụ. Dị ka e buru n’amụma n’akwụkwọ Mkpughe, mgbe nwa oge nke arụghị ọrụ gasịrị, ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ dịghachiri ndụ ma malitekwa ọrụ ọzọ. (Mkpughe 11:11-13) Na March 26, 1919, a tọhapụrụ onyeisi oche nke Watch Tower Bible and Tract Society na ndị òtù ya n’ụlọ mkpọrọ, e mesịkwara sị na aka ha dị ọcha n’ebubo ụgha ndị ahụ e boro ha. Ozugbo nke ahụ gasịrị, ndị ahụ fọdụrụ e tere mmanụ malitere imeghachi ndokwa maka ịrụkwu ọrụ. Ma, gịnị ga-echere mpi “nta” ahụ?
ONYE OCHIE AHỤ EGUZOBE IKPE
33. (a) Ònye bụ Onye Ochie ahụ? (b) Gịnị bụ ‘akwụkwọ dị iche iche ahụ a saghere’ n’Ogige eluigwe ahụ?
33 Mgbe ọ kọwasịrị anụ anọ ahụ, Daniel hapụrụ anụ nke anọ ahụ lewezie anya n’ihe na-eme n’eluigwe. Ọ hụrụ Onye Ochie ahụ ka ọ na-anọdụ ala n’ocheeze ya dị ebube dị ka Onyeikpe. Onye Ochie ahụ abụghị onye ọzọ karịa Jehova Chineke. (Abụ Ọma 90:2) Ka Ikpe eluigwe ahụ malitere, Daniel na-ahụ ka a ‘saghere akwụkwọ dị iche iche.’ (Daniel 7:9, 10) Ebe ịdị adị Jehova dịrị laa azụ n’oge na-enweghị mmalite, ọ maara akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ dị ka a ga-asị na e dere ya n’akwụkwọ. Ọ hụwo anụ ihe atụ anọ ahụ nile, ọ pụkwara ikpe ha ikpe n’ikwekọ n’ihe ọ maara n’onwe ya.
34, 35. Gịnị ga-eme mpi “nta” ahụ na ike ọchịchị ndị ọzọ yiri nke anụ ọhịa?
34 Daniel gara n’ihu na-asị: “Anọ m na-ahụ na mgbe ahụ n’ihi olu nke oké okwu nile nke mpi na-ekwu: anọ m na-ahụ ruo mgbe e gburu anụ ahụ, laa ahụ ya n’iyi, rara ya nye nsure ọkụ. Ma anụ atọ nke fọdụrụ, e mere ka ọchịchị ha gabiga: ma ogologo mgbe na ndụ ha ka e nyere ha ruo mgbe a kara aka na mgbe.” (Daniel 7:11, 12) Mmụọ ozi ahụ na-agwa Daniel, sị: “Onyeikpe ahụ ga-anọdụ ala, ọ bụkwa ọchịchị ya ka a ga-eme ka ọ gabiga, ikpochapụ ya na ịla ya n’iyi ruo ọgwụgwụ ihe nile.”—Daniel 7:26.
35 Site n’iwu nke Onyeikpe Ukwu ahụ, bụ́ Jehova Chineke, mpi ahụ nke kwutọrọ Chineke ma majaa “ndị nsọ” ya ga-enweta otu ahụmahụ ahụ nke Alaeze Ukwu Rom, bụ́ nke kpagburu ndị Kraịst oge mbụ, nwetara. Ịchịisi ya agaghị adịgide. Otú ahụ ka ọ dịkwa “eze” ndị ahụ dị ala yiri mpi bụ́ ndị si n’Alaeze Ukwu Rom pụta. Otú ọ dị, gịnị banyere ịchịisi nke e sitere n’ike ọchịchị ndị bu ụzọ, bụ́ ndị yiri anụ, nweta? Dị ka e buru n’amụma, e mere ka ndụ ha gbatịa “ruo mgbe a kara aka na mgbe.” Ókèala ha anọgidewo na-enwe ndị bi na ha ruo n’oge anyị. Dị ka ihe atụ, Iraq dị n’ókèala nke Babilọn oge ochie. Peasia (Iran) na Gris ka dị. Ndị fọdụrụ n’ike ọchịchị ụwa ndị a so ná Mba Ndị Dị n’Otu. Alaeze ndị a ga-alakwa n’iyi mgbe a ga-ebibi ike ọchịchị ụwa ikpeazụ. A ga-ekpochapụ ọchịchị nile nke mmadụ ‘n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile.’ (Mkpughe 16:14, 16) Ma, ònyezi ga-achị ụwa?
ỊCHỊISI NA-ADỊGIDE ADỊGIDE DỊ NNỌỌ NSO!
36, 37. (a) “Otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ” na-ezo aka n’ònye, olee mgbekwa, ọ bụkwa nzube dị aṅaa ka o ji bịa n’Ogige eluigwe ahụ? (b)Gịnị ka e guzobere na 1914 O.A?
36 “Anọ m na-ahụ n’ọhụụ nile nke abalị, ma, lee,” ka Daniel ji oké olu kwuo. “Otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ, nọ na-abịa n’igwe ojii nke eluigwe, ọ bụkwa Onye ochie ahụ ka ọ bịakwutere, ha wee mee ka ọ bịaruo nso n’ihu Ya.” (Daniel 7:13) Mgbe ọ nọ n’ụwa, Jisọs Kraịst kpọrọ onwe ya “Nwa nke mmadụ,” na-egosi na ya bụ onye ikwu ụmụ mmadụ. (Matiu 16:13; 25:31) Jisọs gwara ndị Sanhedrin, ma ọ bụ ụlọikpe ukwu ndị Juu, sị: “Unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka Ọ na-anọdụ n’aka nri nke ike, na-abịakwa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe.” (Matiu 26:64) Ya mere n’ọhụụ Daniel, onye ahụ na-abịanụ, nke anya mmadụ na-apụghị ịhụ, nke batara n’ihu Jehova Chineke bụ Jisọs Kraịst ahụ a kpọliteworo n’ọnwụ, onye e buliworo elu. Olee mgbe nke a mere?
37 Chineke esorowo Jisọs Kraịst gbaa ndụ maka otu Alaeze, dị nnọọ ka o sowooro Eze Devid gbaa. (2 Samuel 7:11-16; Luk 22:28-30) Mgbe “oge nke mba ọzọ” gwụsịrị na 1914 O.A., Jisọs Kraịst, dị ka onye nketa ocheeze Devid, pụrụ ịnata ịchịisi Alaeze n’ụzọ ziri ezi. Ihe ndekọ amụma Daniel na-agụ, sị: “Ọ bụkwa ya ka e nyere ọchịchị, na ebube, na alaeze, ka ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche wee fee Ya: ọchịchị Ya bụ ọchịchị ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga, ọ bụkwa alaeze Ya bụ nke a na-agaghị emebi.” (Daniel 7:14) Otú a, e guzobere Alaeze Mesaịa ahụ n’eluigwe na 1914. Otú ọ dị, a na-enyekwa ndị ọzọ ịchịisi ahụ.
38, 39. Ole ndị ga-anata ịchịisi ebighị ebi n’elu ụwa?
38 “Ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu ga-anata alaeze ahụ,” ka mmụọ ozi ahụ kwuru. (Daniel 7:18, 22, 27) Jisọs Kraịst bụ onye nsọ bụ́ isi. (Ọrụ 3:14; 4:27, 30) “Ndị nsọ” ndị ọzọ ahụ bụ́ ndị nwere òkè n’ịchịisi ahụ bụ 144,000 ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, bụ́ ndị ha na Kraịst na-eketakọ Alaeze ahụ. (Ndị Rom 1:7; 8:17; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:5; 1 Pita 2:9) A na-akpọlite ha n’ọnwụ dị ka ndị mmụọ na-apụghị ịnwụ anwụ isoro Kraịst chịa n’Ugwu Zaịọn nke eluigwe. (Mkpughe 2:10; 14:1; 20:6) N’ihi ya, Kraịst Jisọs na ndị Kraịst e tere mmanụ a kpọlitere n’ọnwụ ga-achị ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ.
39 Banyere ịchịisi nke Nwa nke mmadụ na “ndị nsọ” ndị ọzọ ahụ a kpọlitere n’ọnwụ, mmụọ ozi Chineke kwuru, sị: “Alaeze ahụ, na ọchịchị ahụ, na ịdị ukwuu nke alaeze nile n’okpuru eluigwe nile, ka a ga-enye ndị ahụ, bụ́ ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu: alaeze Ya bụ alaeze ebighị ebi, ọchịchị nile ga-efekwa Ya, nụ olu Ya.” (Daniel 7:27) Lee ngọzi ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-enweta n’okpuru Alaeze ahụ!
40. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ịṅa ntị ná nrọ na ọhụụ
40 Daniel amaghị banyere mmezu nile dị ebube nke ọhụụ Chineke nyere ya. Ọ sịrị: “N’ebe a ka ọgwụgwụ okwu a dị. Ma mụ onwe m, bụ́ Daniel, echiche m nile na-eme ka m maa jijiji nke ukwuu, igbu maramara nke ihu m na-agbanwekwa n’ahụ m: ma okwu ahụ ka m debere n’obi m.” (Daniel 7:28) Otú ọ dị, anyị onwe anyị na-ebi n’oge mgbe anyị pụrụ ịghọta mmezu nke ihe Daniel hụrụ. Ịṅa ntị n’amụma a ga-ewusi okwukwe anyị ike ma mee ka anyị jidekwuo n’aka na Eze Mesaịa nke Jehova ga-achị ụwa.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji mee ka o doo anya na iji zere ikwughachi ya, anyị ga-ejikọ amaokwu ebe ndị a kọwara ha ndị dị na Daniel 7:15-28 na ntụle amaokwu n’amaokwu nke ọhụụ ndị e dekọrọ na Daniel 7:1-14.
b Lee Isi nke 4 nke akwụkwọ a.
c Lee Isi nke 6 nke akwụkwọ a.
Gịnị Ka Ị Ghọtara?
• Gịnị ka nke ọ bụla n’ime ‘anụ anọ ahụ dị ukwuu si n’oké osimiri rịgopụta’ na-anọchi anya ya?
• Gịnị mejupụtara mpi “nta” ahụ?
• Olee otú mpi nta ihe atụ ahụ si majaa “ndị nsọ” ahụ n’oge Agha Ụwa Mbụ?
• Gịnị ga-eme mpi nta ihe atụ ahụ na ike ọchịchị ndị ọzọ yiri nke anụ ọhịa?
• Olee otú i si rite uru n’ịṅa ntị ná nrọ na ọhụụ Daniel banyere ‘anụ anọ ahụ nke dị ukwuu’?
Igbe dị na peeji nke 149-152]
Eze Kwere Ibe Nọrọ
OTU onye edemede nke narị afọ nke ise T.O.A. bụ́ onye Gris chetara ya dị ka ezigbo eze nke kwere ibe nọrọ. N’ime Bible a kpọrọ ya onye Chineke “e tere mmanụ” na “udele” nke “na-esi n’ọwụwa anyanwụ” bịa. (Aịsaịa 45:1; 46:11) Eze e kwuru ihe dị otú a banyere ya bụ Saịrọs Onye Ukwu, nke Peasia.
Saịrọs malitere ịbụ onye a ma ama n’ihe dị ka 560/ 559 T.O.A., mgbe ọ nọchiri nna ya bụ́ Cambyses nke Mbụ n’ocheeze nke Anshan, bụ́ obodo ma ọ bụ ógbè nke dị na Peasia oge ochie. N’oge ahụ, Anshan nọ n’okpuru ọchịchị Eze Astyages nke Midia. N’inupụ isi megide ọchịchị Midia, Saịrọs nwetara mmeri ngwa ngwa n’ihi na ndị agha Astyages gbahapụrụ ya. Mgbe ahụ, Saịrọs nwetara nkwado nke ndị Midia. Mgbe e mesịrị, ndị Midia na ndị Peasia jikọtara aka ọnụ lụọ ọgụ n’okpuru idu ndú ya. Otú a ka ọchịchị Medo-Peasia si malite bụ́ nke gbasapụrụ ebe ọ na-achị site n’Oké Osimiri Aegean ruo Osimiri Indus ka oge na-aga.—Lee map.
N’iji ndị agha Midia na Peasia mee ihe, Saịrọs bu ụzọ gaa ịchịkwa ebe jupụtara ná nsogbu—akụkụ ebe ọdịda anyanwụ nke Midia bụ́ ebe Eze Croesus nke Lidia nọworo na-agbasapụ ebe ọ na-achị banye n’ókèala ndị Midia. N’ịgbasa gaa n’ókèala ebe ọwụwa anyanwụ nke Alaeze Ukwu Lidia n’Asia Minor, Saịrọs meriri Croesus ma weghara isi obodo ya, bụ́ Sadis. Mgbe ahụ, Saịrọs meriri obodo ndị dị na Ionia, meekwa ka Asia Minor dum dịrị n’okpuru Alaeze Ukwu Medo-Peasia. O si otú a ghọọ onye bụ́ isi ya na Babilọn na eze ya, bụ́ Nabonidus na-asọrịta mpi.
Mgbe ahụ, Saịrọs jikeere maka izute Babilọn dị ike. Sitekwa n’oge a gaa n’ihu, o keere òkè ná mmezu amụma Bible. Site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma, n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ abụọ tupu mgbe ahụ, Jehova akpọwo Saịrọs aha dị ka onye ọchịchị nke ga-akwatu Babilọn ma tọpụ ndị Juu n’agbụ. Ọ bụ n’ihi nhọpụta a e bu ụzọ mee ka Akwụkwọ Nsọ ji na-ezo aka n’ebe Saịrọs nọ dị ka onye Jehova “e tere mmanụ.”—Aịsaịa 44:26-28.
Mgbe Saịrọs wakporo Babilọn na 539 T.O.A., o siiri ya oké ike. N’ịbụ nke nnukwu mgbidi na ékpè miri emi, saakwa mbara nke osimiri Yufretis wara gbara gburugburu, obodo ahụ yiri nke a na-apụghị imeri emeri. N’ebe Yufretis si na Babilọn gafee, mgbidi dị elu nke nwere nnukwu ọnụ ụzọ ámá e ji ọla copper mee dị n’ogologo ikperé mmiri ahụ. Olee otú Saịrọs ga-esi nwee ike imeri Babilọn?
Ihe karịrị otu narị afọ tupu mgbe ahụ, Jehova ebuwo amụma “ọkpụkpọ nkụ dị n’ebe mmiri ya nile dị,” kwuokwa na “ha ga-atakwa ata.” (Jeremaịa 50:38) Ná mmezu amụma ahụ, Saịrọs chigharịrị mmiri Osimiri Yufretis ihu gaa kilomita ole na ole n’ebe ugwu nke Babilọn. Mgbe ahụ ndị agha ya si n’ala mmiri ahụ gafee, rịgoro n’ebe na-eduga ná mgbidi ahụ wee banye n’obodo ahụ n’ụzọ dị mfe n’ihi na e meghewo ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ e ji ọla copper mee. Dị ka “udele” nke na-ejide anụ ngwa ngwa, onye ọchịchị a “na-esi n’ọwụwa anyanwụ” bịa weghaara Babilọn n’otu abalị!
Nye ndị Juu nọ na Babilọn, mmeri Saịrọs pụtara ọbịbịa nke ntọhapụ ná ndọrọ n’agha bụ́ nke ha nọworo na-echere kemgbe nakwa ọgwụgwụ nke afọ 70 nke ntọgbọrọ n’efu nke ala nna ha. Lee obi ụtọ ha na-aghaghị inweworị mgbe Saịrọs mere nkwupụta na-enye ha ikike ịlaghachi Jerusalem ma wughachi ụlọ nsọ ahụ! Saịrọs weghachikwaara ha arịa ndị dị oké ọnụ ahịa nke ụlọ nsọ ahụ bụ́ ndị Nebukadneza buuru gaa Babilọn, nye ha ikike eze ịtụbata osisi site na Lebanọn, nyekwa ikike isi n’ụlọ eze weta ego iji kwụọ ụgwọ mmefu maka ihe owuwu ahụ.—Ezra 1:1-11; 6:3-5.
N’ozuzu, Saịrọs gbasoro ụkpụrụ obi ebere na nke ikwe ibe nọrọ n’imeso ndị o meriri. Otu ihe kpatara omume a pụrụ ịbụworị okpukpe ya. Ikekwe, Saịrọs gbasoro ozizi nke onye amụma Peasia bụ́ Zoroaster ma fee Ahura Mazda—chi e chere na ọ bụ onye okike nke ihe nile dị mma. N’akwụkwọ ya bụ́ The Zoroastrian Tradition, Farhang Mehr na-ede, sị: “Zoroaster kọwara Chineke dị ka onye zuru okè n’omume. Ọ gwara ndị mmadụ na Ahura Mazda adịghị emegwara ihe kama na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, n’ihi ya kwa, na e kwesịghị ịtụ ya ụjọ kama e kwesịrị ịhụ ya n’anya.” Ikwere na chi nke nwere omume ọma ma na-ekpe ikpe ziri ezi, pụrụ imetụtaworị ụkpụrụ omume nke Saịrọs ma kwalite omume obiọma na ịkwụwa aka ọtọ.
Otú ọ dị, eze ahụ anabatachaghị ihu igwe dị na Babilọn. Ajọ oge okpomọkụ dị n’ebe ahụ karịrị ihe ọ chọrọ ịnagide. N’ihi ya, ọ bụ ezie na Babilọn nọgidere bụrụ obodo ọchịchị nke alaeze ukwu ahụ, nakwa ebe bụ́ isi maka okpukpe na ọdịbendị, o jere ozi nanị dị ka isi obodo ya n’oge oyi. N’ezie, mgbe o merisịrị Babilọn, Saịrọs laghachiri n’oge na-adịghị anya n’isi obodo ọ na-anọ n’oge okpomọkụ, bụ́ Akmeta, nke ji ihe dị ka mita 1,900 gafee ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri, n’ala ala nke Ugwu Alwand. N’ebe ahụ, oge oyi ndị ahụ nke oge okpomọkụ ndị dị ụtọ na-esokọ, masịrị ya karị. Saịrọs wukwara obí dị ebube n’isi obodo mbụ ya, bụ́ Pasargadae (na nso Persepolis), kilomita 650 n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke Akmeta. O ji ebe obibi nke ebe ahụ mere ebe mgbaba.
N’ụzọ dị otú a, a na-echeta Saịrọs dị ka onye mmeri nwere obi ike na eze kwere ibe nọrọ. Ọchịchị ya dịrụrụ afọ 30 gwụsịrị mgbe ọ nwụrụ na 530 T.O.A. mgbe ọ nọ na-aga agha. Nwa ya nwoke bụ́ Cambyses nke Abụọ nọchiri ya n’ocheeze Peasia.
[Igbe]
GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?
• Olee otú Saịrọs onye Peasia si gosipụta onwe ya ịbụ onye Jehova “e tere mmanụ”?
• Ozi dị aṅaa baara ndị Jehova uru ka Saịrọs jere?
• Olee otú Saịrọs si mesoo ndị o meriri?
[[Map]
ALAEZE UKWU MEDO-PEASIA
MASEDONIA
Memfis
IJIPT
ETIOPIA
Jerusalem
Babilọn
Akmeta
Susa
Persepolis
INDIA
[Foto]
Ili Saịrọs, nke dị na Pasargadae
[Foto]
Ihe a kpụkwasịrị n’ahụ ihe nke dị na Pasargadae, na-egosi Saịrọs
Igbe dị na peeji nke 153-161]
Otu Eze Bụ́ Okorobịa Emerie Ụwa
IHE dị ka afọ 2,300 gara aga, otu ọchịagha nke ntutu isi ya na-acha anwụ anwụ bụ́ onye nọ n’afọ 20 na ụma ya guzo n’ikperé mmiri nke Osimiri Mediterranean. O lekwasịrị anya n’otu obodo bụ́ àgwàetiti nke dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu kilomita site n’ebe ọ nọ. Ebe a na-ekweghị ka ọ banye na ya, ọchịagha a iwe ji kpebisiri ike imeri obodo ahụ. Gịnị bụ atụmatụ ọ ga-eji eme mwakpo? Ịrụ okporo ụzọ ruo n’àgwàetiti ahụ ma chịrị ndị agha ya wakwasị obodo ahụ. A maliteworị ịrụ okporo ụzọ ahụ.
Ma ozi sitere n’aka eze ukwu nke Alaeze Ukwu Peasia mere ka ọchịagha a bụ́ okorobịa kwụsị ihe ọ na-eme. N’ịbụ onye chọsiri ike ime udo, onye ahụ na-achị Peasia kwere nkwa inye onyinye pụrụ iche: talent 10,000 nke ọlaedo (ihe karịrị ijeri dollar abụọ n’ọnụ ahịa ugbu a), inye otu n’ime ụmụ eze ndị nwanyị n’ọlụlụ, na ịchị akụkụ ọdịda anyanwụ dum nke Alaeze Ukwu Peasia. E nyere ihe a nile iji gbapụta ezinụlọ eze, bụ́ ndị ọchịagha ahụ ji eji.
Ọchịagha nke ga-ekpebi ma ọ ga-anara ma ọ bụ jụ onyinye ahụ bụ Alexander nke Atọ nke Masedonia. Ò kwesịrị ịnara onyinye ahụ? “Ọ bụ oge ga-ekpebi ọdịnihu ụwa oge ochie,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Ulrich Wilcken na-ekwu. “Ihe ndị si ná mkpebi ya pụta n’ezie, dịịrị malite na Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya ruo n’oge anyị, n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ nakwa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ.” Tupu anyị atụlee nzaghachi Alexander, ka anyị hụ ihe omume ndị dujere n’oge a dị oké mkpa.
ỊGHỌ ONYE MMERI
A mụrụ Alexander na Pella, Masedonia, na 356 T.O.A. Nna ya bụ Eze Philip nke Abụọ, nne ya bụkwa Olympias. Nne Alexander kụziiri ya na ndị eze Masedonia sitere n’eriri Hercules, bụ́ nwa nwoke nke chi ndị Gris bụ́ Jupita. Dị ka Olympias si kwuo, nna nna Alexander bụ Achilles, bụ́ dike ahụ nọ n’uri Homer a kpọrọ Iliad. N’ịbụ onye ndị mụrụ ya si otú a kpụzie maka mmeri na ebube nke eze, Alexander na-eto eto enwechaghị mmasị ná nchuso ndị ọzọ. Mgbe a jụrụ ya ma ọ ga-agba ọsọ n’Egwuregwu Olympic, Alexander kwuru na ya ga-agba ma ọ bụrụ na ya ga-eso ndị eze gbaa. Ọchịchọ ya bụ ime ihe dị ukwuu karịa ihe nna ya mere na inweta otuto site n’ihe ndị ọ rụzuru.
Mgbe ọ dị afọ 13, Alexander bụ nwa akwụkwọ nke ọkà ihe ọmụma Gris bụ́ Aristotle, bụ́ onye nyeere ya aka ịzụlite mmasị na nkà ihe ọmụma, ọgwụ, na sayensị. A na-arụ ụka banyere ókè nkụzi nkà ihe ọmụma Aristotle kpụziruru ụzọ iche echiche Alexander. “O yiri ihe na-agaghị ebute arụmụka ikwu na ha ekwekọrịtaghị n’ọtụtụ ihe,” ka Bertrand Russell, bụ́ onye ọkà ihe ọmụma nke narị afọ nke 20, kwuru. “Echiche ọchịchị Aristotle dabeere n’ọchịchị obodo Gris bụ́ nke na-abịa ná njedebe ya.” Echiche nke ọchịchị obere obodo agaghị amasịworị ọkpara eze nke nwere oké ọchịchọ bụ́ onye na-achọ iwulite otu nnukwute alaeze ukwu nke nanị ya na-achị. Alexander aghaghịkwa inweworị obi abụọ banyere iwu Aristotle nke imeso ndị na-abụghị ndị Gris dị ka ndị ohu, n’ihi na ọ tụrụ anya inwe alaeze ukwu nke nwere mmekọrịta dị mma n’etiti ndị meriri emeri na ndị e meriri.
Otú ọ dị, ihe ịrụ ụka adịkebeghị ya na Aristotle wulitere mmasị Alexander n’ịgụ na ịmụ ihe. Alexander nọgidere bụrụ onye nwere oké mmasị n’ịgụ ihe ná ndụ ya nile, na-enwe mmasị pụrụ iche n’ihe odide Homer. A na-azọrọ na o bu Iliad—ahịrị 15,693 nile nke abụ uri—n’isi.
Izi ihe nke Aristotle na-ezi ya kwụsịrị na mberede na 340 T.O.A. mgbe ọkpara eze ahụ dị afọ 16 laghachiri Pella ije chịa Masedonia mgbe nna ya na-anọghị ya. Nwa eze a nke ga-anọchi n’ocheeze etufughị oge ọ bụla n’igosi ike agha ya. N’ụzọ tọrọ Philip ụtọ, ọ kwaturu ebo Thrace ahụ na-enupụ isi bụ́ Maedi ngwa ngwa, weghara obodo ha bụ́ isi n’atụfughị oge, ma gụọ ebe ahụ Alexandroúpolis, iji zaa aha ya.
ỊGA N’IHU NÁ MMERI
Ogbugbu e gburu Philip na 336 T.O.A. dugara n’Alexander dị afọ 20 inweta ocheeze Masedonia. N’isite na Hellespont (nke bụ́ Dardanelles ugbu a) banye Esia n’oge opupu ihe ubi nke 334 T.O.A., Alexander malitere njem mmeri na-eji usuu ndị agha dị nta ma dị ike bụ́ ndị soja 30,000 ji ụkwụ aga na ndị ikom 5,000 ji ụgbọ ịnyịnya. Ndị injinịa, ndị na-atụ ókèala, ndị na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ, ndị ọkà mmụta sayensị, na ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme, sonyeere usuu ndị agha ya.
N’Osimiri Granicus n’akụkụ ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Asia Minor (nke bụ́ Turkey ugbu a), Alexander meriri n’agha mbụ ya megide ndị Peasia. N’oge oyi ahụ o meriri ebe ọdịda anyanwụ nke Asia Minor. N’oge mgbụsị akwụkwọ sochirinụ, agha nke abụọ kpụ ọkụ n’ọnụ nke ya na ndị Peasia weere ọnọdụ n’Issus, n’akụkụ ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke Asia Minor. N’inwe usuu ndị agha dị ihe dị ka ọkara nde ndị ikom, Eze Ukwu nke Peasia bụ́ Daraịọs nke Atọ bịara ebe ahụ izute Alexander. Daraịọs nke nwebigara obi ike ókè kpọọrọ nne ya, nwunye ya, na ndị òtù ezinụlọ ya ndị ọzọ bịa ka ha nwee ike ịhụ ihe gaara abụworị mmeri dị ịrịba ama. Ma ndị Peasia adịghị njikere maka ịda mberede na ịkpụ ọkụ n’ọnụ nke mwakpo ndị Masedonia. Ndị agha Alexander chiri usuu ndị agha Peasia ọnụ n’ala, Daraịọs gbakwara ọsọ, na-agbahapụrụ Alexander ezinụlọ ya.
Kama ịchụso ndị Peasia ahụ na-agba ọsọ, Alexander zọọrọ njem gaa ebe ndịda n’Ụsọ Osimiri Mediterranean, na-emeri ebe ụgbọ mmiri agha nke ndị Peasia ji mere isi ọnọdụ. Ma obodo àgwàetiti bụ́ Taịa adaghị ná mwakpo ahụ. N’ịbụ onye kpebisiri ike imeri ya, Alexander malitere nnọchibido nke were ọnwa asaa. Ọ bụ n’oge nnọchibido ahụ ka Daraịọs kwere nkwa onyinye udo ahụ nke e hotara ná mmalite. Onyinye ndị ahụ bụ ihe na-adọrọ adọrọ nke ukwuu nke na a kọrọ na onye ndụmọdụ Alexander tụkwasịrị obi bụ́ Parmenio kwuru, sị: ‘A sị na m bụ Alexander, m ga-anara ya.’ Ma ọchịagha a bụ́ okorobịa zaghachiri, sị: ‘M gaara emekwa otú ahụ, ma a sị na m bụ Parmenio.’ N’ịjụ iso ya nwee mkparịta ụka, Alexander gara n’ihu ná nnọchibido ahụ ma bibie Taịa ahụ dị nganga na July 332 T.O.A.
N’ịhapụ Jerusalem, bụ́ nke chịliiri ya aka elu, Alexander tinyere isi n’ebe ndịda, merie Gaza. N’ịbụ ndị ọchịchị Peasia gwụrụ ike, Ijipt nabatara ya dị ka onye mgbapụta. Na Memfis ọ chụụrụ Apis àjà oké ehi, wee si otú a mee ka obi dị ndị nchụàjà Ijipt ụtọ. O guzobekwara obodo Alexandria, bụ́ nke mesịrị ghọọ nke ya na Atens hà nhata dị ka ebe bụ́ isi nke mmụta ma nọgidekwa na-aza aha ya.
Mgbe nke ahụ gasịrị, Alexander tinyere isi n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ, na-agafe Palestine ma na-eche ihu n’Osimiri Taịgris. N’afọ 331 T.O.A., ya na ndị Peasia lụrụ agha nke atọ kpụ ọkụ n’ọnụ na Gaugamela, nke na-adịghị anya site ná mkpọmkpọ ebe nke Nineve. N’ebe a, ndị agha Alexander dị 47,000 meriri usuu ndị agha Peasia a hazigharịrị ahazigharị nke dị ma ọ dịkarịa ala 250,000! Daraịọs gbara ọsọ ma ndị obodo ya mesịrị gbuo ya.
N’ịbụ onye nwere oké obi ụtọ ná mmeri, Alexander chere ihu n’ebe ndịda ma weghara isi obodo nke Peasia n’oge oyi bụ́ Babilọn. O weghakwaara isi obodo ndị dị na Susa na Persepolis, na-ejichi oké akụ̀ na ụba nke Peasia, na-agbakwa obí ukwu nke Xerxes ọkụ. N’ikpeazụ, o meriri isi obodo ahụ dị n’Akmeta. Onye a ji ọsọ na-enwe mmeri meriziri ebe ndị fọdụrụ n’ala ndị Peasia na-achị, ruchaa ebe ọwụwa anyanwụ n’Osimiri Indus, nke dị na Pakistan nke oge a.
Mgbe ọ gafere Indus, n’ógbè dị n’ókè Taxila nke Peasia, Alexander zutere onye iro siri ike, eze India bụ́ Porus. Alexander lụrụ agha nke anọ na nke ikpeazụ ya siri ike megide ya, na June 326 T.O.A. Usuu ndị agha Porus gụnyere ndị agha dị 35,000 na enyí dị 200, bụ́ ndị yiri ịnyịnya ndị Masedonia egwu. Agha ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ, bụrụkwa nke a kwafuru ọbara dị ukwuu na ya, ma ndị agha Alexander meriri. Porus chịliri aka elu ma ghọọ onye ya na ya jikọrọ aka.
Ihe karịrị afọ asatọ agafewo kemgbe usuu ndị agha Masedonia batara n’Esia, ike agwụwokwa ndị soja ahụ, ha chọkwara ịlaru ụlọ. N’ịbụ ndị agha ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ nke ha na Porus lụrụ gwụrụ ike, ha chọrọ ịlaghachi ụlọ. Ọ bụ ezie na ọ lara azụ ikweta na mbụ, Alexander mere ihe ha chọrọ. N’ezie, Gris aghọwo ike ọchịchị ụwa. Ebe e guzobeworo ógbè ndị Gris na-achị n’ala ndị ahụ e meriri emeri, asụsụ na ọdịbendị ndị Gris gbasapụrụ n’ógbè ahụ nile.
NWOKE NKE JI ỌTA AHỤ
Ihe jikọtara usuu ndị agha Masedonia ọnụ n’afọ ahụ nile ha nọ na-enwe mmeri bụ ụdị onye Alexander bụ. Mgbe a lụsịrị agha, Alexander na-eleta ndị merụrụ ahụ, nyochaa ebe ndị ha merụrụ ahụ, jaa ndị soja mma maka ọrụ obi ike ha, kwanyekwara ha ùgwù site n’inye ha onyinye n’ikwekọ n’ihe ndị ha rụzuru. Banyere ndị nwụrụ n’agha, Alexander na-eme ndokwa ka e lie ha n’ụzọ dị ebube. A na-agụpụ ndị nne na nna nakwa ụmụ ndị agha ahụ nwụrụ anwụ n’ịtụ ụtụ isi na ụdị ije ozi nile. Maka izurutụ ike mgbe a lụsịrị agha, Alexander haziri egwuregwu na asọmpi. N’otu oge, o mere ọbụna ndokwa maka oge nkwụsịtụ ọrụ nye ndị ikom lụrụ nwunye ọhụrụ, na-eme ka ha nwee ike isoro ndị nwunye ha nọrịa n’oge oyi na Masedonia. Omume ndị dị otú ahụ mere ka ndị ikom ya hụ ya n’anya ma nwee mmasị n’ebe ọ nọ.
Banyere ọlụlụ Alexander lụrụ Adaeze Roxana nke Bactria, onye Gris na-ede akụkọ ndụ mmadụ bụ́ Plutarch na-ede, sị: “N’ezie, ọ bụ ihe omume ịhụnanya, ma n’otu mgbe ahụ o yiri ka ọ dị mma maka ebumnobi ya. N’ihi na ọ tọrọ ndị ahụ e meriri emeri ụtọ ịhụ ka ọ họtara nwunye n’etiti ha, o mekwara ka ha hụ ya n’anya n’ụzọ kasị ukwuu, bụ́ ịchọpụta na n’ime otu ihe nanị ọ hụrụ n’anya nke ukwuu, nwoke a kasị ejide onwe ya, jidere onwe ya ruo mgbe ọ pụrụ inweta ya n’ụzọ iwu kwadoro na n’ụzọ dị nsọpụrụ.”
Alexander kwanyekwaara alụmdi na nwunye nke ndị ọzọ ùgwù. Ọ bụ ezie na nwunye Eze Daraịọs bụ onye ọ dọtara n’agha, ọ hụrụ na e mesoro ya ihe n’ụzọ nsọpụrụ. N’otu aka ahụ, mgbe ọ nụrụ na ndị soja Masedonia abụọ emetọwo ndị nwunye nke ụfọdụ ndị ọbịa, o nyere iwu ka e gbuo ha ma ọ bụrụ na a chọpụta na ikpe mara ha.
Dị ka nne ya, bụ́ Olympias, Alexander ji okpukpe kpọrọ ihe. Ọ ga-achụ àjà tupu na mgbe ọ lụsịrị agha ma jekwuru ndị o nwere na-ajụ mmụọ ase iji mara ihe ihe àmà ọdịnihu ụfọdụ pụtara. Ọ na-ejekwa n’arụsị Amọn, nke dị na Libia. Na Babilọn kwa, ọ gbasoro ntụziaka nke ndị Kaldea banyere ịchụàjà, karịsịa nye chi Babilọn bụ́ Bel (Marduk).
Ọ bụ ezie na Alexander adịghị eri ókè nri, o mesịrị na-aṅụbiga mmanya ókè. Ọ ga-ekwu ogologo okwu n’elu iko mmanya ọ bụla ma tuo ọnụ banyere ihe ndị ọ rụzuru. Otu n’ime ihe ndị kasị njọ Alexander mere bụ igbu enyi ya bụ́ Clitus n’iwe mgbe mmanya na-egbu ya. Ma Alexander tara nnọọ onwe ya ụta nke na o dinara n’àkwà ya ruo ụbọchị atọ, n’erighị nri ma ọ bụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ. N’ikpeazụ, ndị enyi ya jisiri ike rụgide ya ka o rie ihe.
Ka oge na-aga, ọchịchọ Alexander na-achọ otuto kpatara àgwà ndị ọzọ na-adịghị mma. Ọ malitere ikwere ebubo ụgha ngwa ngwa ma malite inye ntaramahụhụ n’ụzọ emeghị ebere ma ọlị. Dị ka ihe atụ, n’ịbụ onye e meworo ka o kwere na Philotas tinyere aka n’atụmatụ igbu ya, Alexander kwuru ka e gbuo ya na nna ya, bụ́ Parmenio, bụ́ onye ndụmọdụ ahụ ọ tụkwasịburu obi.
MMERI E MERIRI ALEXANDER
Ntakịrị oge mgbe ọ lọghachisịrị Babilọn, ịba jidere Alexander, bụ́ nke ọ na-agbakeghị na ya. Na June 13, 323 T.O.A., mgbe o bisịrị ndụ nanị afọ 32 na ọnwa 8, Alexander chịliiri onye iro kasị ike, bụ́ ọnwụ, aka elu.
Ọ bụ nnọọ dị ka ndị ikom India ụfọdụ maara ihe kwuworo: “Ewo Eze Alexander, nanị ihe mmadụ ọ bụla ketara n’ụwa bụ ebe a anyị guzo n’elu ya; gị onwe gị kwa n’ịbụ mmadụ dị ka mmadụ ndị ọzọ, e wezụga na ị rụrụ ọtụtụ ọrụ, ike agwụghịkwa gị, ị na-agagharịkwa n’elu ụwa a nile ebe ndị dị anya site n’ụlọ gị, nye onwe gị nsogbu, na-enyekwa ndị ọzọ nsogbu. Ma n’oge na-adịghị anya ị ga-anwụ, nanị ihe ị ga-enwetakwa n’ụwa bụ ihe ga-ezu maka olili gị.”
GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?
• Gịnị bụ akụkọ banyere nzụlite Alexander Onye Ukwu?
• Ngwa ngwa o nwetasịrị ocheeze Masedonia, mwakpo dị aṅaa ka Alexander malitere?
• Kọwaa ụfọdụ n’ime mmeri ndị Alexander nwere.
• Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ụdị onye Alexander bụ?
[Map]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
MMERI NDỊ ALEXANDER NWERE
MASEDONIA
IJIPT
Babilọn
Osimiri Indus
[Foto]
Alexander
[Foto]
Aristotle na nwa akwụkwọ ya bụ́ Alexander
[Foto dị na peeji nke]
[Foto]
Ọla a sịrị na ọ na-egosi Alexander Onye Ukwu
Igbe dị na peeji nke 162-163]
E Kewaa Otu Alaeze Buru Ibu
BANYERE alaeze Alexander Onye Ukwu, Bible buru amụma ntisasị na nkewa “ma ọ gaghị adịrị ụmụ ya ga-anọchi ya.” (Daniel 11:3, 4) N’ikwekọ na nke a, n’ime afọ 14 mgbe Alexander nwụsịrị na mberede na 323 T.O.A., e gburu nwa ya nwoke bụ́ Alexander nke Anọ nke ezigbo nwunye ya mụụrụ ya na nwa ya nwoke bụ́ Heracles nke nwanyị ọzọ mụụrụ ya.
Ka ọ na-erule afọ 301 T.O.A., anọ n’ime ndị ọchịagha Alexander ji aka ha banye n’ọchịchị n’elu alaeze ukwu ahụ sara mbara nke ọchịagha ha wuworo. Ọchịagha Cassander chịrị Masedonia na Gris. Ọchịagha Lysimachus nwetara Asia Minor na Thrace. Seleucus nke Mbụ Nicator nwetara Mesopotemia na Siria. Ptolemy Lagus kwa, ma ọ bụ Ptolemy nke Mbụ, chịrị Ijipt na Palestine. N’ụzọ dị otú a, alaeze Gris anọ pụtara site n’otu alaeze ukwu nke Alexander.
N’ime alaeze Gris anọ ahụ, ọchịchị Cassander kasị dị mkpirikpi. Afọ ole na ole mgbe Cassander batasịrị n’ọchịchị, ndị ikom nọ n’usoro ọmụmụ ya nwụchapụrụ, na 285 T.O.A. kwa, Lysimachus weghaara akụkụ Europe nke Alaeze Ukwu Gris. Afọ anọ mgbe e mesịrị, Lysimachus nwụrụ n’agha ya na Seleucus nke Mbụ Nicator, na-enye ya ohere ịchị akụkụ bụ́ isi nke ókèala ndị dị n’Esia. Seleucus ghọrọ onye mbụ n’usoro ndị eze Seleucid na Siria. O guzobere Antiọk nke dị na Siria ma mee ebe ahụ isi obodo ọhụrụ ya. E gburu Seleucus na 281 T.O.A., ma usoro ndị ọchịchị ahụ o guzobere nọgidere na-achị ruo afọ 64 T.O.A. bụ́ mgbe Ọchịagha Pompey nke Rom mere Siria ókèala Rom.
N’ime akụkụ anọ ahụ e kewara alaeze ukwu Alexander, alaeze Ptolemy kachasị dịtee anya. Ptolemy nke Mbụ malitere ịbụ eze na 305 T.O.A. wee ghọọ onye mbụ ná ndị eze Masedonia, ma ọ bụ ndị Fero, nke Ijipt. N’ime Alexandria isi obodo, ọ malitere usoro mmepe obodo ozugbo. Otu n’ime ọrụ ihe owuwu ya ndị kasị ukwuu bụ Ọbá Akwụkwọ Alexandria ahụ a ma ama. Iji lekọta ọrụ a dị oké mkpa, Ptolemy si Gris kpọta onye ọkà mmụta Atens a ma ama, bụ́ Demetrius Phalereus. Dị ka e si kọọ, ka ọ na-erule narị afọ nke mbụ O.A., ọbá akwụkwọ ahụ nwere otu nde akwụkwọ mpịakọta. Usoro ndị ọchịchị Ptolemy nọgidere na-achị n’Ijipt ruo mgbe ndị Rom kwaturu ya na 30 T.O.A. Mgbe ahụ, Rom nọchiri Gris dị ka ike ọchịchị ụwa.
GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?
• Olee otú e si kewaa alaeze ukwu Alexander?
• Ruo ole mgbe ka usoro ndị eze Seleucid nọgidere na-achị na Siria?
• Olee mgbe alaeze Ptolemy nke Ijipt bịara ná njedebe?
[Map]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
NTISASỊ NKE ALAEZE UKWU ALEXANDER
Cassander
Lysimachus
Ptolemy nke Mbụ
Seleucus nke Mbụ
[Foto]
Ptolemy nke Mbụ
Seleucus nke Mbụ
[Foto ndị dị na peeji nke 139]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
IKE ỌCHỊCHỊ ỤWA NKE AMỤMA DANIEL
Onyinyo ahụ dị ukwuu (Daniel 2:31-45)
Anụ anọ si n’oké osimiri ahụ pụta (Daniel 7:3-8, 17, 25)
BABILỌN malite na 607 T.O.A.
MEDO-PEASIA malite na 539 T.O.A.
GRIS malite na 331 T.O.A.
ROM malite na 30 T.O.A.
IKE ỌCHỊCHỊ ỤWA BRITAIN NA AMERICA malite na 1763 O.A.
ỤWA KEWARA EKEWA N’ỤZỌ ỌCHỊCHỊ na mgbe ọgwụgwụ
[Foto dị na peeji nke nke 128]
[Foto dị na peeji nke nke 147]