Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 10/1 p. 18
  • “Onye Ochie ahụ Wee Nọdụ Ọdụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Onye Ochie ahụ Wee Nọdụ Ọdụ”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Ekwee Daniel Nkwa Ụgwọ Ọrụ Magburu Onwe Ya
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Onye E Mere Ka Ọ Dị Ike Site n’Aka Onye Ozi Chineke Zitere
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Gị na Akwụkwọ Daniel
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Daniel
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 10/1 p. 18

Bịaruo Chineke Nso

“Onye Ochie ahụ Wee Nọdụ Ọdụ”

BAỊBỤL kwuru na “ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.” (Jọn 1:18) Chineke dị nnọọ ebube nke na ọ dịghị mmadụ ọ bụla nwere ike ịhụ ya ma dịrị ndụ. (Ọpụpụ 33:20) Ma Baịbụl kwuru na e nwere mgbe Jehova mere ka mmadụ ụfọdụ hụ otú eluigwe dị n’ọhụụ. Otu onye n’ime ha bụ Daniel onye amụma. Otú ihe ndị ọ hụrụ si dị ebube mere ka isi buo ya, o nwekwara ike ime anyị otú ahụ. Ka anyị leba anya n’otú Daniel si kọwaa ihe ndị ahụ ọ hụrụ.a—Gụọ Daniel 7:9, 10.

“Onye Ochie ahụ.” Ọ bụ naanị Daniel kpọrọ Chineke “Onye Ochie ahụ.” Ihe a ọ kpọrọ Chineke gosiri na Chineke “anọọla ndụ ogologo oge.” (Daniel 7:9, 13, 22) Olee mgbe Jehova malitere ịdị ndụ? Ebe ọ bụ na Jehova bụ “Eze mgbe ebighị ebi,” o nweghị mmalite, o nweghịkwa ọgwụgwụ. (1 Timoti 1:17; Jud 25) Ebe ọ bụkwa na Chineke anaghị anwụ anwụ, obi kwesịrị isi anyị ike na amamihe ya enweghị nsọtụ n’ihi na Baịbụl na-ekwukarị na onye nọrọ ogologo ndụ nwere amamihe. (Job 12:12) N’eziokwu, mgbe ọ bụla e kwuru na Chineke enweghị mmalite ma ọ bụ ọgwụgwụ, ọ na-esiri anyị ike ịghọta ya. Ma mmadụ ò kwesịdịrị iche na ya ga-aghọta ihe niile banyere Chineke, bụ́ onye amamihe ya na-enweghị atụ?—Ndị Rom 11:33, 34.

Ị̀ hụrụ na Onye Ochie ahụ ‘nọdụrụ ọdụ’? Gịnị mere o ji nọrọ ọdụ? Ihe ndị e kwuru n’amaokwu ndị ọzọ tụpenyere anyị azụ̀ n’ihi na amaokwu ndị ahụ kwuru banyere “Ụlọikpe” na “ikpe.” (Daniel 7:10, 22, 26) Nke a gosiri na n’ọhụụ ahụ, Jehova bụ Onyeikpe nke nọdụrụ ọdụ ka o kpee ikpe. Ole ndị ka ọ ga-ekpe ikpe? Ọ bụ mba dị iche iche dị n’ụwa. N’ọhụụ e gosiburu Daniel, anụ ọhịa dị iche iche nọchiri anya mba ndị ahụ.b (Daniel 7:1-8) Olee ụdị Onyeikpe Jehova bụ?

“Uwe ya na-acha ezigbo ọcha, ntutu dị ya n’isi dị ka owú dị ọcha.” N’ebe ụfọdụ na Baịbụl, e kwuo na ihe dị ọcha, ọ pụtara na ihe ahụ arụghị arụ ma ọ bụ na o nweghị mmerụ. Owú a na-abajighị abaji na-adị ọcha. N’ihi ya, ntutu e kwuru na ọ dị ka owú ga na-acha ọcha. Weregodị ya na i so Daniel na-ahụ ọhụụ ahụ. Gịnị ka ị na-ahụ? Ị̀ na-ahụ Onyeikpe ahụ nke ntutu ya dị ọcha, nke yikwa uwe mwụda na-enwu gbaa? Ihe ahụ ọ hụrụ n’ọhụụ na-eme ka o doo anyị anya na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi, nakwa na ọ maara ihe. Ọ bụ Onyeikpe nke anyị kwesịrị ịtụkwasị obi ma na-akwanyere ezigbo ùgwù.

“E nwere puku kwuru puku ndị nọ na-ejere ya ozi, nakwa iri puku kwuru iri puku ndị guzo n’ihu ya.” Ole ndị bụ ndị a na-ejere Chineke ozi n’eluigwe? Baịbụl kpọrọ ndị mmụọ ozi ‘ndị na-ejere Chineke ozi.’ (Abụ Ọma 104:4) Ndị mmụọ ozi ahụ ‘na-eme ihe Chineke kwuru, na-emekwa uche ya.’ O nwere ike ịbụ na ha dị ọtụtụ narị nde. (Abụ Ọma 103:20, 21) Nke a bụ ihe ọzọ na-egosi anyị na amamihe Chineke enweghị nsọtụ. Ọ bụ naanị Jehova bụ onye nwere ike inwe ọtụtụ narị nde ndị mmụọ ozi ma hazie ha ahazie ka ha na-ejere ya ozi kemgbe ogologo oge a na-amaghị ama.

Ihe Daniel hụrụ n’ọhụụ na-eme ka anyị tụkwasị Jehova, bụ́ Onye Ochie ahụ, obi. Ọ na-emekwa ka o doo anyị anya na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nakwa na amamihe ya enweghị atụ. Ọ́ gaghị adị mma ka ị mụtakwuo ihe ị ga-eme ka gị na Chineke, bụ́ onye amamihe ya na-enweghị nsọtụ, dịrịkwuo ná mma?

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Ọktoba:

◼ Daniel 4-12–Hosia 1-14

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’eziokwu, Daniel ahụghị Chineke. Ma Chineke mere ka ọ hụ ihe ụfọdụ ndị o nwere ike ịkọwali otú ha dị. Mgbe Daniel na-ekwu ihe ndị ọ hụrụ, o ji ihe ndị dị mmadụ n’ahụ́ kọwaa otú Chineke dị. Ihe ndị ahụ o ji kọwaa otú Chineke dị mere ka anyị nwee ike ịghọta ihe ndị o kwuru. Ma nke ahụ apụtaghị na ọ bụ otú ahụ ka Chineke dị kpọmkwem.

b Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọwara ọhụụ anụ ọhịa ndị ahụ Daniel hụrụ, gụọ isi nke 9 nke akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 18]

Ọ bụ Onyeikpe nke anyị kwesịrị ịtụkwasị obi ma na-akwanyere ezigbo ùgwù

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya