Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wt isi 10 p. 90-100
  • Alaeze “nke A Gaghị Emebi Emebi”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Alaeze “nke A Gaghị Emebi Emebi”
  • Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ọchịchị nke Alaeze Chineke
  • Ihe Ndị Alaeze ahụ Ga-emezu —Ụzọ A Ga-esi Emezu Ha
  • Ihe Ndị Pụtara Ìhè A Rụzuworo
  • Alaeze nke Ga-adịru Otu Puku Afọ
  • Alaeze Chineke Na-achị
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Alaeze Chineke—Ịchịisi Ọhụrụ Nke Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
wt isi 10 p. 90-100

Isi nke iri

Alaeze “nke A Gaghị Emebi Emebi”

1. Eziokwu dị aṅaa ka ihe ndị meworo n’ụwa n’akụkọ ihe mere eme nile nke ihe a kpọrọ mmadụ meworo ka ọ pụta ìhè?

IHE ndị na-eme n’ụwa kwa ụbọchị na-emesi eziokwu ahụ bụ́ na ụmụ mmadụ enwebeghị obi ụtọ site n’ịjụ ọbụbụeze Jehova na ịnwa ịchị onwe ha ike. Ọ dịbeghị usoro ọchịchị ụmụ mmadụ nke wetawooro ihe a kpọrọ mmadụ uru n’ụzọ hà nhata. Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ amụbawo ihe ha maara banyere sayensị ruo n’ókè ọ na-erutụbeghị, ha enwebeghị ike imeri ọrịa ma ọ bụ ịkwụsị ọnwụ, ọbụna nye otu onye. Ọchịchị ụmụ mmadụ ekpochapụbeghị agha, ime ihe ike, mpụ, nrụrụ aka, ma ọ bụ ịda ogbenye. Ndị ọchịchị nchịgbu ka na-achị ndị mmadụ n’ọtụtụ ala. (Eklisiastis 8:9) Nkà na ụzụ, anyaukwu, na amaghị nke a na-akọ jikọrọ aka na-emetọ ala, mmiri, na ikuku. Ndị isi iji akụ̀ na ụba eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-eme ka o siere ọtụtụ ndị ike inweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ. Ọtụtụ puku afọ nke ịchịisi ụmụ mmadụ emewo ka eziokwu a doo anya: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23.

2. Nanị gịnị ga-agwọta nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ?

2 Gịnị bụ ihe ngwọta ya? Ọ bụ Alaeze Chineke, bụ́ nke Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere maka ya, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) A kọwara Alaeze eluigwe nke Chineke na 2 Pita 3:13 dị ka “eluigwe ọhụrụ,” bụ́ nke gaje ịchị “ụwa ọhụrụ,” ya bụ, ọha mmadụ bụ́ ndị ezi omume. Alaeze eluigwe nke Chineke dị oké mkpa nke na Jizọs mere ya isiokwu bụ́ isi nke nkwusa ya. (Matiu 4:17) O gosiri ọnọdụ anyị kwesịrị idebe ya ná ndụ anyị, na-agba ume, sị: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.”—Matiu 6:33.

3. N’ihi gịnị ka ịmụta banyere Alaeze Chineke ji dị oké mkpa ugbu a?

3 Ịmụta banyere Alaeze Chineke dị oké mkpa ugbu a karịsịa, ebe Alaeze ahụ ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya iji gbanwee ịchịisi nke ụwa nke a ruo mgbe ebighị ebi. Daniel 2:44 na-ebu amụma, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a [ọchịchị ndị na-achị ugbu a], ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie [n’eluigwe], nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ [ụmụ mmadụ agaghị achịkwa ụwa ọzọ]; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile [dị ugbu a] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” N’ụzọ dị otú a, Alaeze ahụ ga-eme ka ụbọchị ikpeazụ ndị a bịa ná njedebe site n’ibibi ajọ usoro ihe a dum. Mgbe ahụ, a gaghị agbagha ọchịchị Alaeze eluigwe ahụ ga na-achị n’ụwa. Lee ka anyị kwesịrị isi nwee ekele na ahụ́ efe nke a gaje iweta dị ezigbo nso!

4. N’ihe banyere Alaeze ahụ, gịnị weere ọnọdụ n’eluigwe na 1914, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ ji dị anyị mkpa?

4 Na 1914, e chiri Kraịst Jizọs Eze, e nyekwara ya ikike ‘inwe ike n’etiti ndị iro ya.’ (Abụ Ọma 110:1, 2) N’afọ ahụkwa, ‘ụbọchị ikpeazụ’ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a malitere. (2 Timoti 3:1-5, 13) N’otu oge ahụkwa, ihe omume ndị Daniel hụrụ n’ọhụụ amụma weere ọnọdụ n’ezie n’eluigwe. “Onye ochie ahụ,” bụ́ Jehova Chineke, nyere Nwa nke mmadụ, bụ́ Jizọs Kraịst, “ọchịchị, na ebube, na alaeze, ka ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche wee fee Ya.” N’ịkọ banyere ọhụụ ahụ, Daniel dere, sị: “Ọchịchị Ya bụ ọchịchị ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga, ọ bụkwa alaeze Ya bụ nke a na-agaghị emebi.” (Daniel 7:13, 14) Ọ bụ site n’Alaeze eluigwe a nke dị n’aka Kraịst Jizọs ka Chineke ga-eme ka ndị hụrụ ezi omume n’anya nwee ike ịnụ ụtọ ọtụtụ ihe ọma ndị o zubere mgbe o tinyere nne na nna anyị mbụ bụ́ mmadụ n’ime Paradaịs.

5. Ihe dịgasị aṅaa banyere Alaeze ahụ na-adọrọ mmasị anyị nke ukwuu, n’ihi gịnịkwa?

5 Ọ̀ bụ ọchịchọ gị ịbụ onye na-eguzosi ike n’ihe, onye Alaeze ahụ ga-achị? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-enwe mmasị dị ukwuu n’otú e si hazie ọchịchị eluigwe a na otú o si arụ ọrụ. Ị ga-achọ ịmata ihe ọ na-eme ugbu a, ihe ọ ga-arụzu n’ọdịnihu, nakwa ihe ọ chọrọ gị n’aka. Ka ị na-enyobamikwu anya n’Alaeze ahụ, ekele i nwere maka ya kwesịrị ịdị na-ebukwu ibu. Ọ bụrụ na i rubere ịchịisi ya isi, ị ga-abụ onye a kwadebere nke ọma karị ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ndị dị ebube Alaeze Chineke ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi.—Abụ Ọma 48:12, 13.

Ndị Ọchịchị nke Alaeze Chineke

6. (a) Olee otú Akwụkwọ Nsọ si egosi onye a na-egosipụta ọbụbụeze ya site n’Alaeze Mezaịa ahụ? (b) Olee otú ihe ndị anyị na-amụta banyere Alaeze ahụ kwesịrị isi metụta anyị?

6 Otu n’ime ihe mbụ nnyocha dị otú ahụ na-ekpughe bụ na Alaeze Mezaịa a bụ ngosipụta nke ọbụbụeze Jehova n’onwe ya. Ọ bụ Jehova nyere Ọkpara ya “ọchịchị, na ebube, na alaeze.” Mgbe e nyesịrị Ọkpara Chineke ike ịmalite ịchị dị ka Eze, olu ndị nọ n’eluigwe kwupụtara n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị [Jehova Chineke] na nke Kraịst ya, ọ [Jehova] ga-achịkwa dị ka eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Mkpughe 11:15) Ya mere, ihe nile anyị na-ahụ banyere Alaeze a na ihe ndị ọ na-arụzu pụrụ ime ka anyị bịarukwuo Jehova n’onwe ya nso. Ihe ndị anyị na-amụta kwesịrị ime ka anyị nwee ọchịchọ ido onwe anyị n’okpuru ọbụbụeze ya ruo mgbe ebighị ebi.

7. N’ihi gịnị ka o ji na-adọrọ mmasị anyị karịsịa na Jizọs Kraịst bụ Onye Ọchịchị Na-esote Jehova?

7 Tụleekwa eziokwu ahụ bụ́ na Jehova emewo ka Jizọs Kraịst nọkwasị n’ocheeze dị ka Onye Ọchịchị Na-esote Ya. Dị ka Onye Ọkà, bụ́ onye Chineke ji mee ihe n’ike ụwa na ụmụ mmadụ, Jizọs maara mkpa anyị karịa otú onye ọ bụla n’ime anyị maara. Ọzọkwa, site ná mmalite akụkọ ihe mere nke mmadụ, o gosipụtara na ‘ihe na-atọ ya ụtọ dị n’ebe ụmụ mmadụ nọ.’ (Ilu 8:30, 31; Ndị Kọlọsi 1:15-17) Ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ buru nnọọ ibu nke na ya onwe ya bịara n’ụwa ma nye ndụ ya dị ka ihe mgbapụta maka anyị. (Jọn 3:16) N’ụzọ dị otú a, o mere ka anyị nwee ụzọ isi tọhapụ anyị pụọ ná mmehie na ọnwụ nakwa ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi.—Matiu 20:28.

8. (a) N’adịghị ka ịchịisi ụmụ mmadụ, n’ihi gịnị ka ọchịchị Chineke ga-eji dịgide adịgide? (b) Olee ihe jikọtara “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na ọchịchị eluigwe ahụ?

8 Alaeze Chineke bụ ọchịchị na-adịghị agbanwe agbanwe, nke na-adịgide adịgide. Eziokwu ahụ bụ́ na Jehova n’onwe ya adịghị anwụ anwụ na-eme ka ọ bụrụ nke na-adịgide adịgide. (Habakuk 1:12) N’adịghị ka ndị eze bụ́ mmadụ, Jizọs Kraịst, bụ́ onye Chineke nyefeworo ịbụ eze n’aka, adịghịkwa anwụ anwụ. (Ndị Rom 6:9; 1 Timoti 6:15, 16) A ga-enwe 144,000 ndị ọzọ, bụ́ ndị ohu Chineke na-eguzosi ike n’ihe, ndị sitere “n’ebo na asụsụ na ndị na mba ọ bụla,” ndị ha na Kraịst ga-eso nọrọ n’ocheeze n’eluigwe. A ga-enyekwa ndị a ndụ anwụghị anwụ. (Mkpughe 5:9, 10; 14:1-4; 1 Ndị Kọrint 15:42-44, 53) Ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha anọrọworị n’eluigwe, ọ bụkwa ndị fọdụrụ n’ime ha, ndị ka nọ n’ụwa mejupụtara “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” n’oge a, nke ji iguzosi ike n’ihe na-akwalite ihe ndị metụtara Alaeze ahụ n’ebe a.—Matiu 24:45-47.

9, 10. (a) Ihe ndị dị aṅaa na-akpata nkewa, ndị na-akpatakwa mmerụ ka Alaeze ahụ ga-ewepụ? (b) Ọ bụrụ na anyị achọghị ịghọ ndị iro nke Alaeze Chineke, ihe nkekọ dịgasị aṅaa ka anyị ga-ezere?

9 N’oge na-adịghị anya ugbu a, n’oge ọ kara aka, Jehova ga-ezipụ ndị agha ya na-emezu ihe o kpere n’ikpe ime ka ụwa dị ọcha. Ha ga-ebibi ruo mgbe ebighị ebi, ụmụ mmadụ ji aka ha kpebie ịjụ ịnabata ọbụbụeze ya, ndị na-elelịkwa ndokwa ịhụnanya ndị ọ na-eme site n’aka Jizọs Kraịst. (2 Ndị Tesalonaịka 1:6-9) Nke ahụ ga-abụ ụbọchị Jehova, bụ́ oge ahụ a nọworo na-atụ anya ya mgbe a ga-egosi oruru o ruuru ya ịbụ Eze Eluigwe na Ala. “Lee, ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị na-enweghị obi ebere, na-abịa, ya na nrubiga ókè nke iwe na iwe dị ọkụ; . . . ikpochapụ ndị mmehie n’ime ya.” (Aịsaịa 13:9) “Ụbọchị nrubiga ókè nke iwe ka ụbọchị ahụ bụ, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nke ime mkpọmkpọ ebe na ịtọgbọrọ n’efu, ụbọchị ọchịchịrị na oké mgbachi, ụbọchị igwe ojii na oké ọchịchịrị.”—Zefanaịa 1:15.

10 A ga-ebibi okpukpe ụgha nile nakwa ọchịchị nile nke ụmụ mmadụ na usuu ndị agha ha, bụ́ ndị ajọ onye ọchịchị ahụ a na-adịghị ahụ anya nke na-achị ụwa a jiworo na-eme ihe, ruo mgbe ebighi ebi. A ga-ebibi ndị nile na-ekekọta onwe ha n’ụwa a site n’ịgbaso ụzọ ndụ nke iche nanị banyere onwe ha, akwụwaghị aka ọtọ, na omume rụrụ arụ. A ga-ewepụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ka ha na ndị bi n’ụwa ghara ịdị na-emekọrịta ihe, tụọ ha mkpọrọ ruo otu puku afọ. Mgbe ahụ, Alaeze Chineke ga na-eduzi ihe omume nile nke ụwa. Lee nnukwute ahụ́ efe nke ahụ ga-abụrụ ndị nile hụrụ ezi omume n’anya!—Mkpughe 18:21, 24; 19:11-16, 19-21; 20:1, 2.

Ihe Ndị Alaeze ahụ Ga-emezu —Ụzọ A Ga-esi Emezu Ha

11. (a) Olee otú Alaeze Mezaịa ahụ ga-esi mezuo nzube Jehova maka ụwa? (b) Gịnị ka ịchịisi Alaeze ahụ ga-apụtara ndị bi n’ụwa n’oge ahụ?

11 Alaeze Mezaịa ahụ ga-emezu n’ụzọ zuru ezu nzube mbụ nke Chineke maka ụwa. (Jenesis 1:28; 2:8, 9, 15) Ruo taa, ihe a kpọrọ mmadụ adịghị akwado nzube ahụ. Otú ọ dị, a ga-edo “elu ụwa mmadụ bi nke gaje ịbịa” n’okpuru Nwa nke mmadụ, bụ́ Jizọs Kraịst. Ndị nile ga-alanarị mmezu nke ihe Jehova kpere n’ikpe megide usoro ihe ochie a ga-arụ ọrụ n’ịdị n’otu n’okpuru Kraịst bụ́ Eze, jiri ọṅụ na-eme ihe ọ bụla ọ tụziri, ka ala wee ghọọ paradaịs zuru ụwa ọnụ. (Ndị Hibru 2:5-9) Ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-anụ ụtọ ọrụ aka ha ma rite uru zuru ezu site n’ihe bara ụba nke ala ga-emepụta.—Abụ Ọma 72:1, 7, 8, 16-19; Aịsaịa 65:21, 22.

12. Olee otú ndị Alaeze ahụ ga-achị ga-esi zuo okè n’uche nakwa n’ahụ́?

12 Mgbe e kere Adam na Iv, ha zuru okè, ọ bụkwa nzube Chineke ka ụmụ ha jupụta n’ụwa, ka ha nile zuo okè n’uche nakwa n’ahụ́. Nzube ahụ ga-emezu n’ụzọ dị ebube n’oge Alaeze ahụ ga na-achị. Nke a na-achọ ka e wepụ mmetụta nile nke mmehie, ijikwa mezuo nke ahụ, Kraịst na-eje ozi ọ bụghị nanị dị ka Eze kamakwa dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà. Ọ ga-eji ndidi nyere ndị ọ na-achị, bụ́ ndị na-erube isi, aka irite uru site n’uru mkpuchi mmehie nke àjà o ji ndụ ya dị ka mmadụ chụọ.

13. Abamuru anụ ahụ́ dịgasị aṅaa ka a ga-enweta n’oge Alaeze ahụ ga na-achị?

13 N’oge Alaeze ahụ ga na-achị, ndị bi n’ụwa ga-enweta uru ndị magburu onwe ha n’anụ ahụ́. “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.” (Aịsaịa 35:5, 6) Anụ ahụ́ ndị ịka nká ma ọ bụ ọrịa nyeworo nkwarụ ga-adị ọhụrụ karịa nke nwatakịrị, ezi ahụ́ ike ga-anọchikwa anya ike ọgwụgwụ nke na-adịghị akwụsị akwụsị. “Anụ ahụ́ ya ga-adị ọhụrụ karịa nke nwata; ọ na-alaghachiru ụbọchị okorobịa ya.” (Job 33:25) Oge ga-abịa mgbe ọ na-agaghị enwe onye ga-enwe ihe mere ọ ga-eji sị, “Ana m arịa ọrịa.” N’ihi gịnị? N’ihi na a ga-eme ka ụmụ mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke nwere onwe ha pụọ n’ibu arọ nke mmehie nakwa mmetụta ya ndị dị oké njọ. (Aịsaịa 33:24; Luk 13:11-13) Ee, Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”—Mkpughe 21:4.

14. Gịnị ka ụmụ mmadụ iru izu okè na-agụnye?

14 Otú ọ dị, iru izu okè na-agụnye ihe karịrị nnọọ inwe ezi ahụ́ ike na uche zuru okè. Ọ na-agụnye igosipụta àgwà Jehova n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ebe e mere anyị ‘n’onyinyo Chineke, dị ka oyiyi ya si dị.’ (Jenesis 1:26) Iji mee nke ahụ, a ga-achọ izi ihe dị ukwuu. N’ime ụwa ọhụrụ ahụ, “ezi omume gajekwa ibi.” Ya mere, dị ka Aịzaịa buru n’amụma, “ezi omume ka ndị bi n’elu ụwa dum mmadụ bi [ga-amụta].” (2 Pita 3:13; Aịsaịa 26:9) Àgwà a na-eme ka e nwee udo—n’etiti ndị si n’agbụrụ nile, n’etiti ezi ndị enyi, n’ime ezinụlọ mmadụ nakwa, karịsịa, n’etiti mmadụ na Chineke n’onwe ya. (Abụ Ọma 85:10-13; Aịsaịa 32:17) A ga-eji nwayọọ nwayọọ kụziere ndị na-amụta ezi omume ihe bụ́ uche Chineke maka ha. Ka ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova nọ na-agbamikwu mkpọrọgwụ n’obi ha, ha ga-agbaso ụzọ ya n’akụkụ nile nke ndụ ha. Ha ga-enwe ike ikwu ihe Jizọs kwuru, sị, ‘M na-eme ihe dị Nna m mma mgbe nile.’ (Jọn 8:29) Lee ka ndụ ga-esi na-atọ ụtọ mgbe ihe nile a kpọrọ mmadụ ga na-eme otú ahụ!

Ihe Ndị Pụtara Ìhè A Rụzuworo

15. N’iji ajụjụ ndị dị na paragraf a eme ihe, mee ka ihe ndị Alaeze ahụ rụzuworo pụta ìhè, gosikwa ihe anyị kwesịrị ịdị na-eme ugbu a.

15 Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ Alaeze Chineke na ndị ọ na-achị rụzuworo pụtara ìhè. Ajụjụ nakwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ ga-echetara gị ụfọdụ n’ime ihe ndị a a rụzuworo, tinyere ihe ndị nile Alaeze ahụ ga-achị pụrụ na ihe ndị ha kwesịrị ịdị na-eme ugbu a.

Megide ònye ka Alaeze ahụ bu ụzọ mee ihe, gịnịkwa si na ya pụta? (Mkpughe 12:7-10, 12)

Nchịkọta nke ndị fọdụrụnụ n’ìgwè dị aṅaa ka a na-elebara anya kemgbe e mesịrị ka Kraịst nọkwasị n’ocheeze? (Mkpughe 14:1-3)

Ọrụ dị aṅaa ka Jizọs buru amụma na ya ga-arụ mgbe oké mkpagbu ahụ tiwapụsịrị, dị ka e dekọrọ na Matiu 25:31-33?

Olee ọrụ a ga-ebu ụzọ rụọ nke a na-arụ taa? Olee ndị na-ekere òkè na ya? (Abụ Ọma 110:3; Matiu 24:14; Mkpughe 14:6, 7)

N’ihi gịnị ka ndị ọchịchị na ndị okpukpe bụ́ ndị mmegide na-enwebeghị ike ịkwụsị ọrụ nkwusa ahụ? (Zekaraịa 4:6; Ọrụ 5:38, 39)

Mgbanwe dịgasị aṅaa werewooro ọnọdụ ná ndụ nke ndị na-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi Alaeze ahụ? (Aịsaịa 2:4; 1 Ndị Kọrint 6:9-11)

Alaeze nke Ga-adịru Otu Puku Afọ

16. (a) Ogologo oge hà aṅaa ka Kraịst ga-achị? (b) Olee ihe ndị magburu onwe ha a ga-emezu n’oge ahụ nakwa mgbe ọ gasịrị?

16 Mgbe a tụbasịrị Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ime abis, Jizọs Kraịst na 144,000 ha na ya ga-eketakọ ihe ga-achị dị ka ndị eze na ndị nchụàjà ruo otu puku afọ. (Mkpughe 20:6) N’oge ahụ, a ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ zuo okè, na-ewepụ ruo mgbe ebighị ebi mmehie na ọnwụ nke sitere n’aka Adam. Mgbe Ọchịchị Puku Afọ ahụ bịara ná njedebe, Jizọs “ga-enyefe alaeze ahụ” n’aka Nna ya, ebe ọ rụsiworo n’ụzọ gara nke ọma, ọrụ e nyere ya dị ka Eze Mezaịa na Onye Nchụàjà, “ka Chineke wee bụrụ ihe nile n’ebe onye ọ bụla nọ.” (1 Ndị Kọrint 15:24-28) Mgbe ahụ, a ga-atọpụ Setan ruo nwa oge ka o lee ihe a kpọrọ mmadụ a gbapụtaworo ule ma hà na-akwado ọbụbụ Jehova bụ eze eluigwe na ala. Mgbe e lesịrị ule ikpeazụ ahụ, Jehova ga-ebibi Setan na ndị nnupụisi dụnyeere ya úkwù. (Mkpughe 20:7-10) Ndị kwadoro ọbụbụeze Jehova—oruru o ruuru ya ịchị achị—ga-egosipụtaworị iguzosi ike n’ihe ha nke kwụ chịm n’ụzọ zuru ezu. Mgbe ahụ a ga-eme ka ha na Jehova nwee mmekọrịta kwesịrị ekwesị, bụrụ ndị ọ nabatara dị ka ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, ndị Chineke nwapụtara ịdị ndụ ebighị ebi.—Ndị Rom 8:21.

17. (a) Gịnị ga-eme Alaeze ahụ ná ngwụsị nke otu puku afọ ahụ? (b) N’echiche dị aṅaa ka ọ bụ eziokwu na Alaeze ahụ bụ nke “a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi”?

17 Ya mere, ọrụ Jizọs n’onwe ya ga na-arụ nakwa ọrụ 144,000 ahụ ga na-arụ n’ihe metụtara ụwa ga-agbanwe. Gịnị ga-abụ ọrụ ha n’ọdịnihu? Bible ekwughị ya. Ma ọ bụrụ na anyị ejiri ikwesị ntụkwasị obi kwadoo ọbụbụeze Jehova, anyị ga-adị ndụ mgbe Ọchịchị Puku Afọ ahụ ga-achịsị ma hụ ihe Jehova zubeworo maka ha nakwa eluigwe na ala ya nke dị ebube. Ka o sina dị, ọchịchị puku afọ Kraịst ga-abụ ọchịchị “ebighị ebi,” Alaeze ya bụkwa “nke a na-agaghị emebi” emebi. (Daniel 7:14) N’echiche dị aṅaa? Otu ihe bụ na a gaghị enyefe ndị ọzọ bụ́ ndị nwere nzube dị iche ikike ịchị achị, ebe ọ bụ Jehova ga-abụ Onye Na-achị Achị. Ọzọkwa, Alaeze ahụ ga-abụ “nke a gaghị emebi emebi” n’ihi na ihe ndị ọ rụzuru ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. (Daniel 2:44) A ga na-asọpụrụkwa Mezaịa ahụ bụ́ Eze na Onye Nchụàjà na ndị eze bụkwa ndị nchụàjà ibe ya ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ozi ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova.

Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu

• N’ihi gịnị ka Alaeze Chineke ji bụrụ nanị ihe ngwọta nke nsogbu ihe a kpọrọ mmadụ? Olee mgbe Eze nke Alaeze Chineke malitere ịchị?

• Olee ihe kasị adọrọ mmasị gị banyere Alaeze Chineke na ihe ọ ga-arụzu?

• Ihe ndị dị aṅaa Alaeze ahụ rụzuru ka anyị pụrụ ịmaliteworị ịhụ, oleekwa òkè anyị na-ekere na ha?

[Foto dị na peeji nke 92, 93]

N’oge Alaeze Chineke ga na-achị, mmadụ nile ga-amụta ezi omume

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya