Isi nke Anọ
Mbili na Ọdịda nke Otu Onyinyo Dị Ukwuu
1. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’ọnọdụ biliterenụ afọ iri mgbe Eze Nebukadneza dọrọsịịrị Daniel na ndị ọzọ laa n’agha?
AFỌ iri agafewo kemgbe Eze Nebukadneza dọọrọ Daniel na ndị ọzọ bụ́ “ndị dike nke ala” Juda n’agha bịa Babilọn. (2 Ndị Eze 24:15) Daniel na-eto eto na-eje ozi n’obí eze mgbe otu ọnọdụ na-eyi ndụ egwu bilitere. N’ihi gịnị ka nke a kwesịrị iji dọrọ mmasị anyị? N’ihi na ọ bụghị nanị na otú Jehova Chineke si tinye aka n’okwu ahụ zọpụtara ndụ Daniel na ndị ọzọ kamakwa ọ na-egosi anyị mbili nke ike ọchịchị ụwa dị iche iche dị n’amụma Bible rute n’oge anyị.
OTU EZE ECHEE NSOGBU TARA AKPỤ IHU
2. Olee mgbe Nebukadneza rọrọ nrọ amụma mbụ ya?
2 “N’afọ nke abụọ nke ọbụbụeze nke Nebukadneza,” ka Daniel onye amụma dere, “Nebukadneza rọrọ nrọ dị iche iche; mmụọ ya wee gbasasịa, ụra ya wee gwụ n’anya ya.” (Daniel 2:1) Onye rọrọ nrọ ahụ bụ Nebukadneza, bụ́ eze nke Alaeze Ukwu Babilọn. Ọ ghọwo nnọọ onye na-achị ụwa na 607 T.O.A. mgbe Jehova Chineke kwere ka o bibie Jerusalem na ụlọ nsọ ya. N’afọ nke abụọ nke ọchịchị Nebukadneza dị ka onye na-achị ụwa (606/605 T.O.A.), Chineke ziteere ya nrọ na-atụ egwu.
3. Olee ndị na-enweghị ike ịkọwa isi nrọ eze ahụ, oleekwa otú Nebukadneza si meghachi omume?
3 Nrọ a sogburu Nebukadneza nke ukwuu nke na ụra gwụrụ ya n’anya. Dị ka o kwesịrị, ọ chọsiri ike ịmara ihe ọ pụtara. Ma eze ahụ dị ike echezọwo nrọ ahụ! Ya mere ọ kpọkọrọ ndị na-eme majik, ndị anwansi, na ndị mgbaasị nke Babilọn, ọ chọkwara ka ha zeere ya nrọ ahụ ma kọọ isi ya. Ọrụ ahụ karịrị ha. Emelighị nke ahụ were Nebukadneza iwe nke ukwuu nke na o nyere iwu “ka e mee ka ndị amamihe nile nke Babilọn laa n’iyi.” Iwu a ga-eme ka Daniel onye amụma zute onye ogbu ahụ a họpụtara ihu na ihu. N’ihi gịnị? N’ihi na a gụnyere ya na ndị enyi ya atọ bụ́ ndị Hibru—Hananaịa, Mishael, na Azaraịa—n’ime ndị amamihe nke Babilọn.—Daniel 2:2-14.
DANIEL ANAPỤTA HA
4. (a) Olee otú Daniel si mara ihe Nebukadneza rọrọ ná nrọ na ihe ọ pụtara? (b) Olee ihe Daniel kwuru iji kelee Jehova Chineke?
4 Mgbe ọ nụsịrị ihe mere Nebukadneza ji nye ajọ iwu a, “Daniel wee bata, kpeere eze ka o nye ya mgbe a kara aka, ka o wee kọọrọ eze isi nrọ ahụ.” Eze kwere. Daniel laghachiri n’ụlọ ya, ya na ndị enyi ya atọ bụ́ ndị Hibru kpere ekpere, na-arịọ maka “obi ebere nile n’aka Chineke nke eluigwe banyere ihe nzuzo ahụ.” N’otu ọhụụ n’abalị ahụ kpọmkwem, Jehova kpugheere Daniel ihe nzuzo nke nrọ ahụ. N’inwe obi ekele, Daniel sịrị: “Ka aha nke Chineke bụrụ ihe a gọziri agọzi site na mgbe ebighị ebi wee ruo mgbe ebighị ebi: n’ihi na amamihe na ịdị ike, nke Ya ka ha bụ: ọ bụ Ya onwe ya na-agbanwe mgbe na mgbe a kara aka: Ọ na-ewezụga ndị eze, na-emekwa ka ndị eze bilie: Ọ na-enye ndị maara ihe amamihe ha, Ọ na-enyekwa ndị maara nghọta ihe ọmụma: Ya onwe ya na-ekpughe ihe nile dị omimi dịkwa nzuzo: Ọ mawo ihe dị n’ọchịchịrị, ìhè na-ebikwa n’ebe Ọ nọ.” Maka nghọta dị otú ahụ, Daniel nyere Jehova otuto.—Daniel 2:15-23.
5. (a) Mgbe ọ nọ n’ihu eze, olee otú Daniel si nye Jehova otuto? (b) N’ihi gịnị ka nkọwa Daniel ji na-adọrọ mmasị anyị taa?
5 Echi ya, Daniel gakwuuru Ariọk, onyeisi ndị ogbu nke eze, bụ́ onye a họpụtaworo ịla ndị amamihe nke Babilọn n’iyi. Mgbe ọ nụrụ na Daniel pụrụ ịkọwa nrọ ahụ, Ariọk weere ọsọ kpọgara ya eze. N’enyeghị onwe ya otuto, Daniel gwara Nebukadneza, sị: “Chineke dị, Onye nọ n’eluigwe, Nke na-ekpughe ihe nzuzo nile, O mewokwa ka eze, bụ́ Nebukadneza, mara ihe aghaghị ịdị n’ikpeazụ ụbọchị ndị a.” Daniel dị njikere ikpughe ọ bụghị nanị ọdịnihu nke Alaeze Ukwu Babilọn kamakwa ihe ndị mere n’ụwa malite n’oge Nebukadneza ruo n’oge anyị ma gabiga ya.—Daniel 2:24-30.
NRỌ AHỤ—E CHETA YA
6, 7. Gịnị bụ nrọ ahụ Daniel chetaara eze?
6 Nebukadneza gere ntị nke ọma ka Daniel na-akọwa, sị: “Gị onwe gị, eze, nọ na-ahụ, ma lee, otu onyinyo mmadụ nke dị ukwuu. Onyinyo a, nke hiri nne, nke igbu maramara ya kachasị ihe nile, na-eguzo n’ihu gị; ọ dị egwu n’ile ya anya. Onyinyo ahụ, isi ya bụ ezi ọlaedo, obi ya na ogwe aka ya abụọ bụ ọlaọcha, afọ ya na apata ụkwụ ya abụọ bụ ọla, ogwe ụkwụ ya abụọ bụ ígwè, ụkwụ ya abụọ, ụfọdụ n’ime ha bụ ígwè ma ụfọdụ n’ime ha bụ ụrọ. Ị nọ na-ahụ ruo mgbe a wapụtara otu nkume nke a na-ejighị aka waa, o wee tie onyinyo ahụ n’ụkwụ ya abụọ nke bụ ígwè na ụrọ, tipịa ha. Mgbe ahụ ka e tipịara ígwè ahụ na ụrọ ahụ na ọla ahụ na ọlaọcha ahụ na ọlaedo ahụ n’otu, o wee dị ka igbogbo ọka sitere n’ebe nzọcha ọka nke mgbe okpomọkụ; ifufe wee fechapụ ha, e wee ghara [ịhụ] ha ebe ọ bụla: nkume ahụ nke tipịara onyinyo ahụ wee ghọọ oké ugwu, jupụta ụwa nke a nile.”—Daniel 2:31-35.
7 Lee ka Nebukadneza na-aghaghị isiworị nwee obi ụtọ ịnụ ka Daniel na-ekpughe nrọ ahụ! Ma cheredị! A gaghị egbu ndị amamihe Babilọn nanị ma Daniel kọwaakwa isi nrọ ahụ. N’ikwuchitere onwe ya na ndị enyi ya atọ bụ́ ndị Hibru, Daniel kwupụtara, sị: “Nke a bụ nrọ ahụ: isi ya ka anyị ga-akọkwa n’ihu eze.”—Daniel 2:36.
ALAEZE NKE DỊ NNỌỌ ICHE
8. (a) Ònye ma ọ bụ gịnị ka Daniel kọwara na isi ọlaedo ahụ bụ? (b) Olee mgbe isi ọlaedo ahụ malitere ịdị?
8 “Gị onwe gị, eze, bụ́ eze ndị eze, onye Chineke nke eluigwe nyeworo alaeze a na akụ̀ a na ike a na ebube a; ọzọ, n’ebe ọ bụla ụmụ nke mmadụ dị, anụ ọhịa na anụ ufe nke eluigwe ka O nyeworo n’aka gị, mee ka i nwee ike n’ahụ ha nile: gị onwe gị bụ isi ọlaedo ahụ.” (Daniel 2:37, 38) Okwu ndị a metụtara Nebukadneza mgbe Jehova jisịrị ya bibie Jerusalem, na 607 T.O.A. Ọ dị otú a n’ihi na ndị bụrụ eze na Jerusalem sitechara n’eriri Devid, bụ́ eze Jehova e tere mmanụ. Jerusalem bụ isi obodo Juda, alaeze ihe atụ nke Chineke nke na-anọchite anya ọbụbụeze Jehova n’elu ụwa. Mgbe e bibiri obodo ahụ na 607 T.O.A., alaeze ihe atụ a nke Chineke kwụsịrị ịdị. (1 Ihe E Mere 29:23; 2 Ihe E Mere 36:17-21) Ike ọchịchị ụwa ndị sochirinụ bụ́ ndị akụkụ bụ́ ọla nke onyinyo ahụ na-anọchite anya ha pụrụ ịchị ụwa ugbu a n’enweghị ntinye aka nke alaeze ihe atụ nke Chineke. Dị ka isi ọlaedo, bụ́ ọla kasị oké ọnụ ahịa a maara n’oge ochie, Nebukadneza enwewo ihe ùgwù nke ịkwatu alaeze ahụ site n’ibibi Jerusalem.—Lee “Eze Bụ́ Dike n’Agha Ewuo Otu Alaeze Ukwu,” na peji nke 63.
9. Olee ihe isi ọlaedo ahụ na-anọchite anya ya?
9 Nebukadneza, bụ́ onye chịrị ruo afọ 43, bụ onyeisi nke otu usoro ndị eze chịrị Alaeze Ukwu Babilọn. Ọ gụnyere ọgọ ya nwoke bụ́ Nabonidus na ọkpara ya, bụ́ Evil-merodak. Usoro ndị eze ahụ dịgidere ruo afọ 43 ọzọ, ruo mgbe nwa Nabonidus bụ́ Belshaza nwụrụ na 539 T.O.A. (2 Ndị Eze 25:27; Daniel 5:30) Ya mere isi ọlaedo dị n’onyinyo ahụ a hụrụ ná nrọ na-anọchite anya usoro ndị ọchịchị nile nke Babilọn ọ bụghị nanị Nebukadneza.
10. (a) Olee otú nrọ Nebukadneza si gosi na Ike Ọchịchị Ụwa bụ́ Babilọn agaghị adịte anya? (b) Gịnị ka Aịsaịa onye amụma buru n’amụma banyere onye ga-emeri Babilọn? (ch) N’echiche dị aṅaa ka Medo-Peasia dị ala karịa Babilọn?
10 Daniel gwara Nebukadneza, sị: “N’ọnọdụ gị ka alaeze ọzọ ga-ebili nke ga-adị ala karịa gị.” (Daniel 2:39) Otu alaeze nke obi na ogwe aka ọlaọcha onyinyo ahụ na-anọchi anya ya ga-anọchi usoro ndị eze Nebukadneza. Ihe dị ka afọ 200 tupu mgbe ahụ, Aịsaịa ebuwo amụma banyere alaeze a, ọbụna na-ekwu aha eze ya ga-enwe mmeri—Saịrọs. (Aịsaịa 13:1-17; 21:2-9; 44:24–45:7, 13) Nke a bụ Alaeze Ukwu Medo-Peasia. Ọ bụ ezie na Medo-Peasia wulitere mmepeanya dị ukwuu nke na-adịghị ala karịa nke Alaeze Ukwu Babilọn, e ji ọlaọcha, bụ́ ọla nke ọlaedo ka n’ịdị oké ọnụ ahịa, nọchite anya alaeze a pụtara ka oge na-aga. Ọ dị ala n’ebe Ike Ọchịchị Ụwa Babilọn dị n’echiche bụ na o nweghị ihe ùgwù nke ịkwatu Juda, bụ́ alaeze ihe atụ nke Chineke, ya na isi obodo ya dị na Jerusalem.
11. Olee mgbe usoro ndị eze Nebukadneza kwụsịrị ịdị?
11 Ihe dị ka afọ 60 mgbe ọ kọwasịrị isi nrọ ahụ, Daniel ji anya ya hụ ọgwụgwụ nke usoro ndị eze Nebukadneza. Daniel nọ ya n’abalị October 5/6, 539 T.O.A., mgbe ndị agha Medo-Peasia meriri Babilọn yiri ebe a na-apụghị ịbanye abanye ma gbuo Eze Belshaza. Ka Belshaza nwụsịrị, isi ọlaedo nke ihe onyinyo ahụ a hụrụ ná nrọ—Alaeze Ukwu Babilọn—kwụsịrị ịdị.
OTU ALAEZE ATỌHAPỤ NDỊ E MERE KA HA JEE BIRI N’ALA ỌZỌ
12. Olee otú iwu ahụ Saịrọs nyere na 537 T.O.A. si baara ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ uru?
12 Medo-Peasia nọchiri Alaeze Ukwu Babilọn dị ka ike ụwa na-achị achị na 539 T.O.A. Mgbe ọ dị afọ 62, Daraịọs onye Midia ghọrọ onye ọchịchị mbụ nke obodo Babilọn ahụ e meriworo. (Daniel 5:30, 31) Ruo nwa mkpirikpi oge, ya na Saịrọs onye Peasia jikọrọ aka ọnụ chịa Alaeze Ukwu Medo-Peasia. Mgbe Daraịọs nwụrụ, Saịrọs ghọrọ onye nanị ya na-achị Alaeze Ukwu Peasia. Nye ndị Juu nọ na Babilọn, ọchịchị Saịrọs pụtara ntọhapụ ná ndọrọ n’agha. Na 537 T.O.A., Saịrọs tiri iwu nke nyere ndị Juu e mere ka ha jee biri na Babilọn ohere ịlaghachi n’ala nna ha ma wughachi Jerusalem na ụlọ nsọ Jehova. Otú ọ dị, e weghachighị alaeze ihe atụ nke Chineke n’ime Juda na Jerusalem.—2 Ihe E Mere 36:22, 23; Ezra 1:1–2:2a.
13. Gịnị ka obi na ogwe aka ọlaọcha nke ihe onyinyo Nebukadneza hụrụ ná nrọ na-ese onyinyo ya?
13 Obi na ogwe aka ọlaọcha nke ihe onyinyo ahụ a hụrụ ná nrọ sere onyinyo usoro ndị eze Peasia na-amalite na Saịrọs Onye Ukwu. Usoro ndị eze ahụ chịrị ihe karịrị afọ 200. A na-eche na Saịrọs nwụrụ mgbe ọ na-alụ agha na 530 T.O.A. Banyere ihe dị ka eze 12 nọchiri ya dị ka ndị eze nke Alaeze Ukwu Peasia, ọ dịkarịa nta 2 n’ime ha mesoro ndị Jehova họpụtara ihe n’ụzọ dị mma. Otu bụ Daraịọs nke Mbụ (onye Peasia), nke ọzọ bụkwa Ataksakses nke Mbụ.
14, 15. Enyemaka dị aṅaa ka Daraịọs Onye Ukwu na Ataksakses Mbụ nyere ndị Juu?
14 Daraịọs nke Mbụ bụ onye nke atọ n’usoro ndị eze Peasia mgbe Saịrọs Onye Ukwu nwụsịrị. Abụọ ndị bu ya ụzọ bụ Cambyses nke Abụọ na nwanne ya nwoke bụ́ Bardiya (ma ọ bụ ma eleghị anya onye Magus mere ka ọ bụ onye ọzọ, onye aha ya bụ Gaumata). Mgbe ọ na-erule n’oge Daraịọs nke Mbụ, bụ́kwa onye a maara dị ka Daraịọs Onye Ukwu, rịgooro n’ocheeze na 521 T.O.A., a machibidoro ọrụ nke iwughachi ụlọ nsọ dị na Jerusalem. Mgbe ọ chọtara akwụkwọ e dere iwu Saịrọs n’ebe ndebe ihe ochie dị n’Akmeta, Daraịọs mere ihe karịrị iwepụ mmachibido iwu ahụ na 520 T.O.A. O nyekwara ego site n’ebe ndebe ego eze maka iwughachi ụlọ nsọ ahụ.—Ezra 6:1-12.
15 Onye ọchịchị Peasia ọzọ nyere aka ná mgbalị e mere iweghachi ndị Juu bụ Ataksakses nke Mbụ, bụ́ onye nọchiri nna ya bụ́ Ahasuerọs (Xerxes nke Mbụ) na 475 T.O.A. E nyere Ataksakses utu aha bụ́ Longimanus n’ihi na aka nri ya ka aka ekpe ya ogologo. N’afọ nke 20 nke ọchịchị ya, na 455 T.O.A., o nyere onye Juu bụ́ obu ihe ọṅụṅụ ya bụ́ Nehemaịa ọrụ ịbụ onye na-achị ala Juda na iwughachi mgbidi Jerusalem. Ihe omume a kara mmalite nke ‘izu asaa nke afọ’ e depụtara n’isi nke 9 nke akwụkwọ Daniel akara ma setịpụ ụbọchị maka mpụta na ọnwụ nke Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst, bụ́ Jisọs onye Nazaret.—Daniel 9:24-27; Nehemaịa 1:1; 2:1-18.
16. Olee mgbe, ọ bụkwa n’aka eze dị aṅaa ka Ike Ọchịchị Ụwa Medo-Peasia bịara ná njedebe?
16 Nke ikpeazụ n’ime eze isii sochiri Ataksakses nke Mbụ n’ocheeze nke Alaeze Ukwuu Peasia bụ Daraịọs nke Atọ. Ọchịchị ya kwụsịrị na mberede na 331 T.O.A. mgbe Alexander Onye Ukwu meriri ya mmeri ọjọọ na Gaugamela, na nso Nineve oge ochie. Mmeri a wetara Ike Ụwa Medo-Peasia ná njedebe dị ka akụkụ ọlaọcha nke ihe onyinyo ahụ Nebukadneza hụrụ ná nrọ sere onyinyo ya. Ọchịchị ga-abịanụ ka elu n’ụzọ ụfọdụ ma dị ala karị n’ụzọ ndị ọzọ. Nke a na-edo anya ka anyị na-ege ntị ná nkọwa ọzọ Daniel kọwara isi nrọ Nebukadneza.
OTU ALAEZE—NKE GBASARA AGBASA MA DỊ ALA
17-19. (a) Olee ike ọchịchị ụwa nke afọ na apata ụkwụ ọla copper ahụ na-anọchite anya ya, ruokwa ókè ha aṅaa ka ọchịchị ya gbasaruru? (b) Ònye bụ Alexander nke Atọ? (ch) Olee otú Grik si ghọọ asụsụ zuru ụwa ọnụ, oleekwa ihe ọ dị mma ya?
17 Daniel gwara Nebukadneza na afọ na apata ụkwụ nke ihe onyinyo ahụ dị ukwuu bụ “alaeze ọzọ nke mere ha atọ, nke bụ ọla [copper], nke ga-enwe ike n’ahụ ụwa nke a nile.” (Daniel 2:32, 39) Alaeze nke atọ a ga-esochi Babilọn na Medo-Peasia. Dị ka ọla copper dị ala karịa ọlaọcha, ike ọchịchị ụwa ọhụrụ a ga-adị ala karịa Medo-Peasia n’echiche nke na ọ gaghị enwe ihe ùgwù ọ bụla dị ka nke ịtọhapụ ndị Jehova. Otú ọ dị, alaeze a nke yiri ọla copper “ga-enwe ike n’ahụ ụwa nke a nile,” na-egosi na ọ ga-agbasa agbasa karịa ma Babilọn ma Medo-Peasia. Olee ihe eziokwu nke akụkọ ihe mere eme na-egosi banyere ike ọchịchị ụwa a?
18 Nwa oge mgbe o nwetasịrị ocheeze Masedonia na 336 T.O.A. mgbe ọ dị afọ 20, Alexander nke Atọ bụ́ onye nwere oké ọchịchọ malitere ịlụ agha mmeri. N’ihi mmeri nile o nwetara n’agha, a kpọwara ya Alexander Onye Ukwu. N’ịnọgide na-enwe mmeri, ọ gara n’ihu na-abanye n’ebe Peasia na-achị. Mgbe o meriri Daraịọs nke Atọ n’agha a lụrụ na Gaugamela na 331 T.O.A., Alaeze Ukwu Peasia malitere ịdakpọ, Alexander guzobekwara Gris dị ka ike ọchịchị ụwa ọhụrụ.
19 Mgbe o nwesịrị mmeri ahụ na Gaugamela, Alexander gara n’ihu iweghara isi obodo nke Peasia bụ́ Babilọn, Susa, Persepolis, na Akmeta. N’imeri ihe fọdụrụnụ n’Alaeze Ukwu Peasia, ọ gbasapụrụ mmeri ya banye n’ebe ọdịda anyanwụ nke India. E guzobere ógbè ndị Gris n’ala ndị ahụ e meriri. N’ihi ya, asụsụ ndị Gris na ọdịbendị ha gbasara n’ógbè ahụ nile. N’ezie, Alaeze Ukwu Gris dịrị ukwuu karịa nke ọ bụla ọzọ bu ya ụzọ. Dị ka Daniel buworo n’amụma, alaeze ahụ bụ́ ọla copper ‘nwere ike n’ahụ ụwa nke a nile.’ Otu ihe si na nke a pụta bụ na Grik (koine) ghọrọ asụsụ mba nile. Ebe e nwere ike iji ya ekwu ihe ziri ezi, ọ ghọrọ ihe kwesịrị nnọọ ekwesị iji dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nakwa ịgbasa ozi ọma nke Alaeze Chineke.
20. Gịnị mere Alaeze Ukwu Gris mgbe Alexander Onye Ukwu nwụsịrị?
20 Alexander Onye Ukwu dịrị ndụ nanị afọ asatọ dị ka onye ọchịchị ụwa. Ọ bụ ezie na ọ ka bụ nwa okorobịa, Alexander dị afọ 32 dara ọrịa mgbe e risịrị oké oriri ma nwụọ ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, na June 13, 323 T.O.A. Ka oge na-aga, alaeze ukwu ya kewara ghọọ ókèala anọ, otu n’ime ndị ọchịagha ya chịkwara nke ọ bụla. Otú a, e sitere n’otu nnukwu alaeze nweta alaeze anọ ndị mesịrị bụrụ nke Alaeze Ukwu Rom lomiri. Ike ọchịchị ụwa ahụ yiri ọla copper dịgidere nanị ruo afọ 30 T.O.A. mgbe nke ikpeazụ n’ime alaeze anọ a—usoro ndị eze Ptolemy na-achị n’Ijipt—mesịrị bụrụ nke Rom meriri.
ALAEZE NKE NA-ETIPỊA MA NA-ETIJISỊ
21. Olee otú Daniel si kọwaa “alaeze nke anọ”?
21 Daniel gara n’ihu ná nkọwa ọ na-akọwa ihe onyinyo ahụ a hụrụ ná nrọ: “Ma alaeze nke anọ [mgbe Babilọn, Medo-Peasia, na Gris gasịrị] ga-adị ike ka ígwè: n’ihi na ígwè na-etipịa tidakwa ihe nile: na dị ka ígwè nke na-etijisị ihe ndị a nile, otú a ka ọ ga-etipịa, tijisie.” (Daniel 2:40) N’ume na ikike ya itipịa ihe, ike ọchịchị ụwa a ga-adị ka ígwè—na-adị ike karịa alaeze ukwu ndị ọlaedo, ọlaọcha, ma ọ bụ ọla copper nọchitere anya ha. Alaeze Ukwu Rom bụ ụdị ike ahụ.
22. Olee otú Alaeze Ukwu Rom si dị ka ígwè?
22 Rom tipịara ma tijisie Alaeze Ukwu Gris ma lodaa ihe fọdụrụnụ n’ike ọchịchị ụwa Medo-Peasia na Babilọn. N’akwanyereghị Alaeze Chineke nke Jisọs Kraịst kwusara ùgwù ọ bụla, o gburu ya n’elu osisi ịta ahụhụ na 33 O.A. Ná mgbalị itiji ezi Iso Ụzọ Kraịst, Rom kpagburu ndị na-eso ụzọ Jisọs. Ọzọkwa, ndị Rom bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya na 70 O.A.
23, 24. Tụkwasị n’Alaeze Ukwu Rom, gịnị ka ụkwụ ihe onyinyo ahụ na-ese onyinyo ya?
23 Ọ bụghị nanị Alaeze Ukwu Rom ka ụkwụ ígwè nke ihe onyinyo Nebukadneza hụrụ ná nrọ na-ese onyinyo ya kamakwa ọchịchị ga-esi na ya topụta. Tụlee okwu ndị a e dekọrọ ná Mkpughe 17:10: “Ndị eze asaa dịkwa; ise n’ime ha adawo, otu n’ime ha na-adị adị, onye fọdụrụ aka-abịaghị; mgbe ọ ga-abịa ọ ghaghịkwa ịnọgide nwa oge.” Mgbe Jọn onyeozi dere okwu ndị a, ndị Rom ji ya eji n’àgwàetiti Patmọs. Eze, ma ọ bụ ike ọchịchị ụwa ise ndị daworonụ, bụ Ijipt, Asiria, Babilọn, Medo-Peasia, na Gris. Nke isii—Alaeze Ukwu Rom—ka na-achị. Ma ya onwe ya gajekwa ịda, eze nke asaa ga-ebilikwa site n’otu ókèala nke ndị Rom weghaara. Olee ike ọchịchị ụwa nke ahụ ga-abụ?
24 Britain bụbu akụkụ ugwu nke ebe ọdịda anyanwụ Alaeze Ukwu Rom. Ma ka ọ na-erule 1763, ọ ghọwo Alaeze Ukwu Britain—Great Britain nke chịrị osimiri asaa. Ka ọ na-erule 1776, ógbè 13 ọ na-achị n’America ekwuwo na ha enwerewo onwe ha iji guzobe United States of America. Otú ọ dị, n’afọ ndị sochiri ka e mesịrị, Britain na United States jikọrọ aka ọnụ ma n’oge agha ma n’oge udo. Otú a, njikọ Britain na America dịwara dị ka ike ọchịchị ụwa nke asaa nke amụma Bible. Dị ka Alaeze Ukwu Rom, ọ ghọwo ihe ‘dị ike dị ka ígwè,’ na-enwe ike ọchịchị yiri ígwè. N’ihi ya ụkwụ ígwè nke ihe onyinyo ahụ a hụrụ ná nrọ na-agụnye ma Alaeze Ukwu Rom ma ike ọchịchị ụwa ahụ jikọrọ aka bụ́ Britain na America.
NGWAKỌTA NA-ESIGHỊ IKE
25. Gịnị ka Daniel kwuru banyere ụkwụ na mkpịsị ụkwụ nke ihe onyinyo ahụ?
25 Ọzọ, Daniel gwara Nebukadneza, sị: “Ma ebe ị hụrụ ụkwụ ya abụọ na mkpịsị ụkwụ ya nile, na ụfọdụ n’ime ha bụ ụrọ ọkpụite, ma ụfọdụ n’ime ha bụ ígwè, alaeze e kewara ekewa ka ọ ga-abụ; ma nguzosi ike ụfọdụ nke ígwè ahụ aghaghị ịdị n’ime ya, n’ihi na ị hụrụ ígwè ahụ na a gwakọtara ya na ụrọ apịtị. Ma mkpịsị ụkwụ nile nke ụkwụ ya abụọ, ụfọdụ n’ime ha bụ ígwè, ma ụfọdụ n’ime ha bụ ụrọ, otú a ụfọdụ n’ime akụkụ alaeze ahụ ga-adị ike, ma ụfọdụ n’ime ya ga-abụ ihe na-adịghị ike ntiwa. Ma ebe ị hụrụ ígwè ahụ na a gwakọtara ya na ụrọ apịtị, ha ga na-eji mkpụrụ ndị ọzọ gwakọta onwe ha; ma ha agaghị adị na-arapara n’ahụ ibe ha n’otu n’otu, ọbụna otú ígwè na ụrọ na-adịghị agwakọta.”—Daniel 2:41-43.
26. Olee mgbe ọchịchị ahụ nke ụkwụ na mkpịsị ụkwụ ahụ sere onyinyo ya pụtara?
26 Nsochi nke ike ọchịchị ụwa nke akụkụ dị iche iche nke ihe onyinyo ahụ Nebukadneza hụrụ ná nrọ nọchiri anya ya malitere n’isi wee gbadaa n’ụkwụ. N’ụzọ ezi uche dị na ya, ụkwụ na mkpịsị ụkwụ nke ‘ígwè ahụ a gwakọtara ya na ụrọ apịtị’ ga-ese onyinyo mpụta ikpeazụ nke ọchịchị mmadụ nke ga-adị na “mgbe ọgwụgwụ.”—Daniel 12:4.
27. (a) Ọnọdụ dị aṅaa ka ụkwụ na mkpịsị ụkwụ ígwè a gwakọtara ya na ụrọ na-ese onyinyo ya? (b) Gịnị ka mkpịsị ụkwụ iri nke ihe onyinyo ahụ na-ese onyinyo ya?
27 Ná mmalite nke narị afọ nke 20, Alaeze Ukwu Britain chịrị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi n’ụwa. Alaeze ukwu ndị ọzọ nke Europe chịkwara ọtụtụ nde ndị ọzọ. Ma Agha Ụwa Mbụ mere ka e nwee ìgwè mba dị iche iche nọchiri anya alaeze ukwu dị iche iche. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ bisịrị, ihe a mụbara. Ka ịhụ mba n’anya na-apụtakwu, ọnụ ọgụgụ nke mba ndị dị n’ụwa mụbara n’ụzọ dị ịrịba ama. Mkpịsị ụkwụ iri nke ihe onyinyo ahụ na-anọchite anya ike ọchịchị na gọọmenti ndị dị otú ahụ na-adị n’otu mgbe ahụ, n’ihi na n’ime Bible ọnụ ọgụgụ bụ́ iri na-apụta izu ezu n’elu ụwa mgbe ụfọdụ.—Tụlee Ọpụpụ 34:28; Matiu 25:1; Mkpughe 2:10.
28, 29. (a) Dị ka Daniel si kwuo, gịnị ka ụrọ ahụ nọchitere anya ya? (b) Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ngwakọta nke ígwè na ụrọ ahụ?
28 Ugbu a anyị nọ na “mgbe ọgwụgwụ,” anyị eruwo n’ụkwụ nke ihe onyinyo ahụ. Ụfọdụ n’ime gọọmenti ndị ụkwụ na mkpịsị ụkwụ a bụ́ ígwè na ụrọ a gwakọtara agwakọta na-ese onyinyo ha yiri ígwè—nke aka ike ma ọ bụ ọchịchị nchịgbu. Ndị ọzọ yiri ụrọ. N’ụzọ dị aṅaa? Daniel jikọtara ụrọ na ‘ụmụ mmadụ.’ (Daniel 2:43, NW) N’agbanyeghị ọdịdị na-esighị ike nke ụrọ, bụ́ ebe e si mee ụmụ mmadụ, a manyewo ọchịchị ọkpụtọrọkpụ ndị yiri ígwè ka ha na-anụrụ olu ndị nkịtị karị, bụ́ ndị chọrọ ka ọnụ na-eru ha n’okwu na gọọmentị na-achị ha. (Job 10:9) Ma ọchịchị aka ike na ndị nkịtị adịghị agwakọta—dị ka ígwè na ụrọ apịtị na-apụghị ijikọta. N’oge ihe onyinyo ahụ ga-adakpọ, ụwa ga-ekewasị n’ezie n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị!
29 Ọnọdụ nkewasị nke ụkwụ na mkpịsị ụkwụ ahụ ọ̀ pụrụ ime ka onyinyo ahụ nile dakpọọ? Gịnị ga-eme onyinyo ahụ?
NJEDEBE DỊ ỊRỊBA AMA!
30. Kọwaa njedebe nke nrọ Nebukadneza.
30 Tụlee njedebe nke nrọ ahụ. Daniel gwara eze ahụ, sị: “Ị nọ na-ahụ ruo mgbe a wapụtara otu nkume nke a na-ejighị aka waa, o wee tie onyinyo ahụ n’ụkwụ ya abụọ nke bụ́ ígwè na ụrọ, tipịa ha. Mgbe ahụ ka e tipịara ígwè ahụ na ụrọ ahụ na ọla [copper] ahụ na ọlaọcha ahụ na ọlaedo ahụ n’otu, o wee dị ka igbogbo ọka sitere n’ebe nzọcha ọka nke mgbe okpomọkụ; ifufe wee fechapụ ha, e wee ghara [ịhụ] ha ebe ọ bụla: nkume ahụ nke tipịara onyinyo ahụ wee ghọọ oké ugwu, jupụta ụwa nke a nile.”—Daniel 2:34, 35.
31, 32. Gịnị ka e buru n’amụma banyere akụkụ ikpeazụ nke nrọ Nebukadneza?
31 N’ịkọwa ya, amụma ahụ gara n’ihu, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi na ị hụrụ na a wapụtara otu nkume n’ugwu ahụ nke a na-ejighị aka waa, na o tipịara ígwè ahụ na ọla [copper] ahụ na ụrọ ahụ na ọlaọcha ahụ na ọlaedo ahụ; Chineke dị ukwuu emewo ka eze mara ihe aghaghị ịdị mgbe nke a gasịrị: nrọ a na-eguzosikwa ike, ọ bụkwa ihe kwesịrị ntụkwasị obi ka akụkọ isi ya bụ.”—Daniel 2:44, 45.
32 N’ịghọta na e chetawo ma kọwaa isi nrọ ya, Nebukadneza kwetara na nanị Chineke nke Daniel bụ “Onyenwe ndị eze, na Onye na-ekpughe ihe nzuzo nile.” Eze nyekwara Daniel na ndị enyi ya atọ bụ́ ndị Hibru ọkwá nke ibu ọrụ dị ukwuu. (Daniel 2:46-49) Ma, gịnị ka ‘nkọwa kwesịrị ntụkwasị obi’ nke Daniel pụtara n’oge a?
‘OTU UGWU EJUPỤTA ỤWA NILE’
33. Site ‘n’ugwu’ dị aṅaa ka a ga-esi wapụta “nkume” ahụ, ole mgbe kwa, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka nke a si mee?
33 Mgbe “oge nke mba ọzọ” gwụsịrị n’October 1914, “Chineke nke eluigwe” guzobere Alaeze eluigwe site n’ime ka Ọkpara ya e tere mmanụ, bụ́ Jisọs Kraịst, nọkwasị n’ocheeze, dị ka “Eze kachasị ndị eze nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile.”a (Luk 21:24; Mkpughe 12:1-5; 19:16) Ya mere otú ahụ ka o si bụrụ na site n’ike Chineke, ọ bụghị site n’aka mmadụ, a wapụtara “nkume” Alaeze Mesaịa ahụ site ‘n’ugwu’ nke ọbụbụeze eluigwe na ala nke Jehova. Ọchịchị eluigwe a dị n’aka Jisọs Kraịst, bụ́ onye Chineke nyeworo anwụghị anwụ. (Ndị Rom 6:9; 1 Timoti 6:15, 16) Ya mere, “alaeze Onyenwe anyị [Chineke], na nke Kraịst ya” nke a—ngosipụta nke ọbụbụeze eluigwe na ala Jehova—agaghị abụ nke a ga-ahapụrụ onye ọzọ. Ọ ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 11:15.
34. Olee otú o si bụrụ na a mụrụ Alaeze Chineke “n’ụbọchi ha, bụ́ eze ndị a”?
34 Ọmụmụ nke Alaeze ahụ weere ọnọdụ “n’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a.” (Daniel 2:44) Ndị a abụghị nanị ndị eze nke mkpịsị ụkwụ ihe onyinyo ahụ sere onyinyo ha kamakwa ndị akụkụ ya bụ́ ígwè, ọla [copper], ọlaọcha, na ọlaedo nọchiri anya ya. Ọ bụ ezie na alaeze ukwu Babilọn, Peasia, Gris, na Rom agabigawo dị ka ike ọchịchị ụwa, ihe fọdụrụ n’ime ha ka dị na 1914. Mgbe ahụ Alaeze Ukwu Ottoman ndị Turkey bichiri ókèala Babylonia, gọọmenti mba na-achịkwa na Peasia (Iran) na Gris nakwa na Rom, Itali.
35. Olee mgbe “nkume” ahụ ga-etipịa onyinyo ahụ, ruo n’ókè ha aṅaa ka a ga-ebibiru onyinyo ahụ?
35 N’isi nso Alaeze eluigwe nke Chineke ga-eti onyinyo ihe atụ ahụ n’ụkwụ ya. N’ihi ya, a ga-etija alaeze nile nke o sere onyinyo ha, na-eme ka ha gwụsịa. N’ezie, ‘n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile,’ “nkume” ahụ ga-etipịa onyinyo ahụ nke na a ga-egweri ya ịghọ ntụ, ikuku nke oké ifufe Chineke ga-ekupụkwa ya dị ka igbogbo ọka nke ebe nzọcha ọka. (Mkpughe 16:14, 16) Mgbe ahụ, dị ka nkume ahụ nke toro ghọọ ugwu ma jupụta ụwa, Alaeze Chineke ga-aghọ ugwu ọchịchị nke ga-emetụta “ụwa nke a nile.”—Daniel 2:35.
36. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpọọ Alaeze Mesaịa ahụ ọchịchị guzosiri ike?
36 Ọ bụ ezie na Alaeze Mesaịa ahụ bụ nke eluigwe, ọ ga-eme ka ike ya ruo ụwa anyị maka ngọzi nke ndị nile na-erube isi bi n’ụwa. Gọọmenti a guzosiri ike bụ “nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi” ma ọ bụ nke “a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ.” N’adịghị ka alaeze nile nke ndị ọchịchị bụ́ mmadụ na-anwụ anwụ, “ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Ka ihe ùgwù nke ịbụ otu n’ime ndị ọ ga-achị ruo mgbe ebighị ebi bụrụ nke gị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Isi nke 6 nke akwụkwọ a.
GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?
• Ike ọchịchị ụwa ndị dịgasị aṅaa ka akụkụ dị iche iche nke ihe onyinyo ahụ dị ukwuu dị ná nrọ Nebukadneza na-ese onyinyo ya?
• Olee ọnọdụ ụwa nke ụkwụ na mkpịsị ụkwụ iri ígwè a gwakọtara ya na ụrọ na-anọchite anya ya?
• Olee mgbe, ọ bụkwa site ‘n’ugwu’ dị aṅaa ka e si wapụta “nkume” ahụ?
• Olee mgbe “nkume” ahụ ga-etipịa onyinyo ahụ?
Igbe dị na peeji nke 63-67]
Eze Bụ́ Dike n’Agha Ewuo Otu Alaeze Ukwu
NWA eze Babilọn na usuu ndị agha ya etipịa ndị agha Ijipt nke Fero Neko na Kakemish, dị na Siria. Ndị Ijipt ahụ e meriri emeri agbalaga ebe ndịda chee ihu n’Ijipt, ndị Babilọn achụsokwa ha. Ma otu ozi sitere Babilọn amanye nwa eze ahụ nweworo mmeri ịhapụ nchụso ahụ. Ozi ahụ bụ na nna ya, bụ́ Nabopolassar, anwụọla. N’inye ndị ọchịagha ya iwu ka ha kpọlata ndị a dọtara n’agha na ihe ndị ha lụtara n’agha, Nebukadneza alaghachi ụlọ ngwa ngwa wee weghara ocheeze nke nna ya hapụrụ.
Otú a ka Nebukadneza si rịgoro n’ocheeze Babilọn n’afọ 624 T.O.A. ma ghọọ onye ọchịchị nke abụọ nke Alaeze Ukwu Ọhụrụ Babilọn. N’oge ọchịchị ya dịruru afọ 43, o weghaara ókèala ndị Ike Ọchịchị Ụwa Asiria wegharabuuru wee gbasaa ebe ọ na-achị, na-eweghara Siria dị n’ebe ugwu nakwa Palestine dị n’ebe ọdịda anyanwụ gbadaa n’ókè ya na Ijipt.—Lee map.
N’afọ nke anọ nke ọchịchị ya (620 T.O.A.), Nebukadneza mere Juda alaeze nọ n’okpuru ya. (2 Ndị Eze 24:1) Afọ atọ mgbe nke ahụ gasịrị, nnupụisi Juda mere ka Babilọn nọchibido Jerusalem. Nebukadneza dọọrọ Jehoiakin, Daniel, na ndị ọzọ n’agha gaa Babilọn. Eze ahụ bukwaara ụfọdụ arịa nke ụlọ nsọ Jehova. O mere nwanne nna Jehoiakin, bụ́ Zedekaịa, eze Juda nọ ya n’okpuru.—2 Ndị Eze 24:2-17; Daniel 1:6, 7.
Oge ụfọdụ mgbe nke ahụ gasịrị, Zedekaịa n’onwe ya nupụkwara isi, na-ekekọ onwe ya n’ebe Ijipt dị. Nebukadneza nọchibidoro Jerusalem ọzọ, na 607 T.O.A. kwa ọ kwaturu mgbidi ya, gbaa ụlọ nsọ ya ọkụ, ma bibie obodo ahụ. O gburu ụmụ Zedekaịa nile wee rụkpọzie Zedekaịa anya ma kee ya agbụ, iji kpụrụ ya dị ka onye mkpọrọ gaa Babilọn. Nebukadneza dọọrọ ihe ka ọtụtụ ná ndị ala ahụ n’agha ma buru arịa ndị fọdụrụ n’ụlọ nsọ ahụ gaa Babilọn. “E wee mee ka Juda si n’ala ya jee biri n’ala ọzọ.”—2 Ndị Eze 24:18–25:21.
Nebukadneza merikwara Taịa site n’ịnọchibido obodo ahụ—nnọchibido nke dịruru afọ 13. N’oge nnọchibido ahụ, e mere ndị agha ya “isi nkwọcha” n’ihi nchihịa nke okpu ígwè ha, ubu ha “ka e chihịara echihịa” site n’iburu ihe ndị e ji wuo ihe e ji nọchibido ya. (Ezikiel 29:18) N’ikpeazụ, Taịa chịliirị usuu ndị agha Babilọn aka elu.
Ihe àmà na-egosi na eze Babilọn bụ onye ụbụrụ na-aghọ nkọ n’ịtụ ụkpụrụ agha. Ụfọdụ akwụkwọ ntụaka, karịsịa ndị sitere na Babilọn, na-akọwakwa ya dị ka eze na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ bụ ezie na Akwụkwọ Nsọ ekwughị hoo haa na Nebukadneza na-ekpe ikpe ziri ezi, Jeremaịa onye amụma kwuru na ọ bụ ezie na Zedekaịa nupụrụ isi, a ga-emeso ya n’ụzọ ziri ezi ma ‘ọ bụrụ na ọ ga-apụkwuru ndị isi eze Babilọn.’ (Jeremaịa 38:17, 18) Mgbe e bibisịkwara Jerusalem, Nebukadneza ji nkwanye ùgwù mesoo Jeremaịa ihe. Banyere Jeremaịa, eze ahụ nyere iwu, sị: “Were ya, ka anya gị abụọ dị n’ahụ ya, emekwala ya ihe ọjọọ ọ bụla; kama dị ka ọ ga-esi gwa gị, mee ya otú a.”—Jeremaịa 39:11, 12; 40:1-4.
Dị ka onye ọchịchị, Nebukadneza ghọtara ngwa ngwa àgwà na ikike Daniel na ndị enyi ya atọ—Shedrak, Mishak, na Abednego—ndị aha Hibru ha bụ Hananaịa, Mishael, na Azaraịa. N’ihi ya eze ahụ ji ha mee ihe n’ọkwá ndị gbagotere agbagote n’alaeze ya.—Daniel 1:6, 7, 19-21; 2:49.
Nsọpụrụ okpukpe Nebukadneza gara karịsịa n’ebe Marduk nọ, bụ́ chi bụ́ isi nke Babilọn. Eze ahụ toro Marduk maka mmeri ya nile. Na Babilọn, o wuru ụlọ nsọ Marduk na ọtụtụ chi Babilọn ndị ọzọ ma chọọ ha mma. Ọ pụrụ ịbụ na onyinyo ọlaedo ahụ e guzobere na ndagwurugwu Dura bụ nke a raara nye Marduk. O yikwara ka Nebukadneza ọ dabeere nke ukwuu n’ịjụ ndị mmụọ ase maka ime atụmatụ agha ya.
Nebukadneza nyakwara isi maka iwughachi Babilọn, bụ́ obodo kasị ukwuu nwere mgbidi n’oge ahụ. Site n’iwucha mgbidi dị abụọ buru ibu nke obodo ahụ nke nna ya maliteworo iwu, Nebukadneza mere ka isi obodo ahụ yie ihe a na-apụghị ịbanye abanye. Eze ahụ rụziri otu obí eze ochie dị n’etiti obodo ahụ ma wuo obí eze ntụrụndụ n’ebe dị ihe dị ka kilomita abụọ gaa n’ebe ugwu. Iji mejụọ ọchịchọ nke nwunye ya bụ́ onye Midia, bụ́ onye ugwu na oké ọhịa dị n’ala ya gụsiri agụụ ike, a kọrọ na Nebukadneza wuru ubi ndị koro n’elu—nke e weere dị ka otu n’ime ihe ịtụnanya asaa nke ụwa oge ochie.
“Ọ́ bụghị nke a bụ Babilọn ukwu a, nke mụ onwe m wuworo ịbụ ụlọ alaeze, site n’ike nke akụ̀ m na n’ihi ebube nke ịma mma m?” ka eze ahụ turu ọnụ ya otu ụbọchị ka ọ na-ejegharị n’obí eze Babilọn. “Mgbe eze kpụ okwu a n’ọnụ,” ara gbawara ya. N’ịbụ onye na-erughị eru ịchị ruo afọ asaa, ọ tara akụ́kụ́, dị nnọọ ka Daniel buru n’amụma. Mgbe oge ahụ gwụrụ, e weghachiiri Nebukadneza alaeze ahụ. Ọ chigidere ruo mgbe ọ nwụrụ na 582 T.O.A.—Daniel 4:30-36.
GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?
Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere Nebukadneza dị ka
• onye na-eme atụmatụ agha?
• onye ọchịchị?
• onye na-efe Marduk ofufe?
• onye na-ewu ihe?
[Map]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
ALAEZE UKWU BABILỌN
OSIMIRI UHIE
Jerusalem
Osimiri Yufretis
Osimiri Taịgris
Nineve
Susa
Babilọn
Ua
[Foto]
Babilọn, obodo kasị ukwuu nwere mgbidi n’oge ya
[Foto]
Dragọn bụ ihe nnọchianya nke Marduk
[Foto]
Ubi ndị koro n’elu a ma ama nke Babilọn
[Foto dị na peeji nke 56]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
IKE ỌCHỊCHỊ ỤWA NDỊ DỊ N’AMỤMA DANIEL
Onyinyo ahụ dị ukwuu (Daniel 2:31-45)
BABILỌN malite na 607 T.O.A.
MEDO-PEASIA malite na 539 T.O.A.
GRIS malite na 331 T.O.A.
ROM malite na 30 T.O.A.
IKE ỌCHỊCHỊ ỤWA BRITAIN NA AMERICA malite na 1763 O.A.
ỤWA KEWARA EKEWA N’ỤZỌ ỌCHỊCHỊ na mgbe ọgwụgwụ
[Foto dị na peeji nke nke 47]
[Foto dị na peeji nke nke 58]