Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • dp isi 2 p. 12-29
  • Daniel—Akwụkwọ A Na-ekpe Ikpe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Daniel—Akwụkwọ A Na-ekpe Ikpe
  • Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OKWU BANYERE EZE NA-EFU EFU
  • ÒNYE BỤ DARAỊỌS ONYE MIDIA?
  • ỌCHỊCHỊ JEHOIAKIM
  • IHE ỌMỤMA SARA MBARA NDỊ DỊ IRÈ
  • IHE NDỊ NA-ESITEGHỊ NA BIBLE HÀ NA-EGOSI NA E CHEPỤTARA DANIEL ECHEPỤTA?
  • AKAEBE SI EBE ỌZỌ NDỊ NA-AKWADO DANIEL
  • ONYE ÀMÀ KASỊ UKWUU
  • Gị na Akwụkwọ Daniel
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Daniel
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Jehova Ekwee Daniel Nkwa Ụgwọ Ọrụ Magburu Onwe Ya
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Ṅaa Ntị n’Okwu Amụma Chineke Maka Oge Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
dp isi 2 p. 12-29

Isi nke Abụọ

Daniel—Akwụkwọ A Na-ekpe Ikpe

1, 2. N’echiche dị aṅaa ka a na-ebo akwụkwọ Daniel ebubo, n’ihi gịnịkwa ka i ji chee na ọ dị mkpa ịtụle ihe àmà na-agbachitere ya?

WEREDỊ ya na ị nọ n’ụlọikpe, na-egere otu ikpe dị mkpa. E boro otu nwoke ebubo igwu wayo. Onye na-ekpechitere gọọmenti esie ọnwụ na ikpe mara nwoke ahụ. Ma, onye ahụ e boro ebubo bụ onye a maara ruo ogologo oge dị ka onye na-eguzosi ike n’ezi ihe. Ị́ gaghị enwe mmasị ịnụrụ ihe akaebe nke ndị na-ekpechitere ya?

2 Ị nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ mgbe a bịara n’ihe banyere akwụkwọ Bible bụ́ Daniel. A maara onye dere ya nke ọma maka iguzosi ike n’ezi ihe. E jiriwo akwụkwọ bu aha ya kpọrọ ihe nke ukwuu kemgbe ọtụtụ puku afọ. Ọ na-egosi onwe ya dị ka akụkọ mere eme n’eziokwu, nke Daniel, onye Hibru bụ́ onye amụma biri ndụ na narị afọ nke asaa na isii T.O.A., dere. Ọgụgụ oge ziri ezi nke Bible na-egosi na akwụkwọ ya dekọrọ ihe mere malite n’ihe dị ka 618 ruo 536 T.O.A., e dechakwara ya na 536 T.O.A. Ma a na-ebo akwụkwọ ahụ ebubo. Ụfọdụ akwụkwọ nkà ihe ọmụma na akwụkwọ ntụaka ndị ọzọ na-enye echiche bụ na ma ọ bụ na-ekwu hoo haa na ọ bụ wayo.

3. Gịnị ka The New Encyclopædia Britannica na-ekwu banyere ịbụ eziokwu nke akwụkwọ Daniel?

3 Dị ka ihe atụ, The New Encyclopædia Britannica na-ekweta na akwụkwọ Daniel bụ n’otu mgbe nke “e weere ebe nile dị ka akụkọ mere eme n’ezie, nke nwere ihe bụ ezigbo amụma.” Otú ọ dị, Britannica ahụ na-azọrọ na nke bụ eziokwu bụ na Daniel bụ nke “e dere n’oge nsogbu mba ahụ gamiworo—mgbe a na-akpagbu ndị Juu nke ukwuu n’okpuru [Eze Siria] bụ́ Antiochus nke Anọ Epiphanes.” Akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ na-ekwu na e dere akwụkwọ a n’agbata 167 na 164 T.O.A. Otu akwụkwọ a na-ekwukwa na onye dere akwụkwọ Daniel adịghị ebu amụma ihe ga-eme n’ọdịnihu kama nanị ihe o mere bụ ikpughe “akụkọ ihe ndị ọ maara na ha emewo dị ka amụma nke ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.”

4. Olee mgbe nkatọ nke akwụkwọ Daniel malitere, gịnịkwa kpasuru nkatọ yiri nke ahụ na narị afọ ndị na-adịbeghị anya?

4 Olee ebe echiche ndị ahụ si malite? Ịkatọ akwụkwọ Daniel abụghị ihe ọhụrụ. Ọ malitere laarị azụ na narị afọ nke atọ O.A. site n’aka ọkà ihe ọmụma aha ya bụ Porphyry. Dị ka ọtụtụ ndị nọ n’Alaeze Ukwu Rom, o chere na mmetụta nke Iso Ụzọ Kraịst bụụrụ ya ihe ize ndụ. O dere akwụkwọ 15 iji katọọ okpukpe “ọhụrụ” a. O dere akwụkwọ nke 12 megide akwụkwọ Daniel. Porphyry kwuru na akwụkwọ ahụ bụ ihe e chepụtara echepụta, nke onye Juu dere na narị afọ nke abụọ T.O.A. E mere ụdị nkatọ ndị yiri nke ahụ na narị afọ nke 18 na 19. N’echiche nke ndị na-akatọ Bible na ndị na-ekwenye n’echiche ọgụgụ isi, amụma—ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu—bụ ihe na-agaghị ekwe omume. Daniel ghọrọ onye a kasị nwee mmasị ịkatọ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, a malitere ikpe ya na akwụkwọ ya ikpe n’ụlọikpe. Ndị nkatọ zọọrọ na ha nwere ihe àmà buru ibu na-egosi na akwụkwọ ahụ abụghị nke Daniel dere n’oge a chụpụrụ ndị Juu n’ala ha gaa na Babilọn, kama na ọ bụ onye ọzọ dere ya ọtụtụ narị afọ mgbe nke ahụ gasịrị.a Nkatọ ndị dị otú ahụ jupụtara ebe nile nke na otu onye na-ede akwụkwọ dere akwụkwọ mgbachitere a kpọrọ Daniel in the Critics’ Den (Daniel n’Ime Olulu Ndị Nkatọ).

5. N’ihi gịnị ka ihe banyere ịbụ eziokwu nke Daniel ji dị mkpa?

5 È nwere ihe nnwapụta ọ bụla na-akwado nzọrọ obi ike ahụ nke ndị nkatọ na-eme? Ka ihe àmà e nwere ọ̀ na-akwado mgbachite ahụ a gbachiteere ya? O metụtara ọtụtụ ihe dị mkpa. Ọ bụghị nanị aha ọma nke akwụkwọ ochie a ka o metụtara kamakwa ọdịnihu anyị. Ọ bụrụ na akwụkwọ Daniel bụ wayo, nkwa ya nile maka ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ bụ nanị okwu efu. Ma ọ bụrụ na o nwere ezigbo amụma, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-agụsi gị agụụ ike ịmụta ihe ha pụtaara anyị taa. N’iburu nke ahụ n’uche, ka anyị nyochaa ụfọdụ n’ime nkatọ a katọrọ Daniel.

6. Ebubo dị aṅaa ka a na-ebo mgbe ụfọdụ banyere akụkọ ihe mere eme dị na Daniel?

6 Were, dị ka ihe atụ, ebubo dị na The Encyclopedia Americana: “A gwagbuwo nnọọ ọtụtụ ihe ọmụma sara mbara nke akụkọ ihe mere eme nke oge ndị mbụ [dị ka ije biri na Babilọn]” n’akwụkwọ Daniel. Nke a ọ dị otú ahụ n’ezie? Ka anyị tụlee ihie ụzọ atọ a sị na e mere, na-ewere ha otu otu.

OKWU BANYERE EZE NA-EFU EFU

7. (a) N’ihi gịnị ka aka Daniel zoro n’ebe Belshaza nọ jiworo tọọ ndị nkatọ Bible ụtọ eri ogologo oge? (b) Gịnị mere echiche ahụ bụ na Belshaza bụ nanị onye e chepụtara echepụta?

7 Daniel dere na Belshaza, bụ́ “nwa” Nebukadneza, nọ na-achị dị ka eze na Babilọn mgbe a kwaturu obodo ahụ. (Daniel 5:1, 11, 18, 22, 30) Ruo ogologo oge ndị nkatọ katọrọ nke a n’ihi na ọ dịghị ebe ọ bụla aha Belshaza dị ma ọ bụghị na Bible. Kama ya, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme oge ochie kwuru na ọ bụ Nabonidus, onye nọchiri Nebukadneza, bụ eze ikpeazụ nke Babilọn. N’ihi ya, na 1850, Ferdinand Hitzig sịrị na o doro anya na Belshaza bụ ihe onye dere ya chepụtara echepụta. Ma ọ̀ bụ na nkwubi okwu Hitzig adịghị gị ka e mere ya oké ngwa ngwa? E kwuwerị, aha a na-akpọtụghị eze a—karịsịa n’ime oge e kwetara na ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme e nwere banyere ya dị nnọọ nta—ọ̀ ga-egosi n’ezie na ọ dịghị mgbe ọ dịrị ndụ? Ka o sina dị, na 1854 e gwupụtara ụfọdụ ntakịrị mkpọ ájá ụrọ ná mkpọmkpọ ebe nke obodo Babilọn oge ochie bụ́ Ur n’ihe bụ ugbu a ndịda Iraq. Ihe odide cuneiform ndị a sitere n’aka Eze Nabonidus gụnyere ekpere o kpeere “Bel-sar-ussur, bụ́ ọkpara m.” Ọbụna ndị nkatọ aghaghị ikwere: Nke a bụ Belshaza nke akwụkwọ Daniel.

8. Olee otú e siworo gosipụta na nkọwa Daniel kọwara Belshaza dị ka eze na-achị achị bụ eziokwu?

8 Ma, afọ ejughị ndị nkatọ. “Nke a anwapụtaghị ihe ọ bụla,” ka otu n’ime ha aha ya bụ H. F. Talbot dere. Ọ na-azọrọ na nwa nwoke ahụ nke dị n’ihe odide ahụ pụrụ ịbụworị obere nwa, ebe Daniel na-ekwu banyere ya dị ka eze na-achị achị. Otú ọ dị, nanị otu afọ mgbe e bipụtasịrị okwu Talbot, e gwupụtara cuneiform ndị ọzọ ndị zoro aka n’ebe Belshaza nọ dị ka onye nwere ndị odeakwụkwọ na ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ya. Onye a abụghị obere nwa! N’ikpeazụ, nkume ndị ọzọ mere ka okwu ahụ bie, na-akọ na n’otu mgbe Nabonidus pụrụ na Babilọn ruo ọtụtụ afọ. Nkume ndị a gosikwara na n’oge a, o “nyefere ọbụbụeze” nke Babilọn n’aka ọkpara ya (Belshaza). N’oge ndị ahụ, Belshaza bụ, n’ezie, eze—onye so nna ya bụrụ eze.b

9. (a) Gịnị ka Daniel pụrụ ibuworị n’uche mgbe ọ sịrị na Belshaza bụ nwa Nebukadneza? (b) N’ihi gịnị ka ndị nkatọ jiworo hie ụzọ n’ikwu na Daniel ekwutụdịghị ihe ọ bụla banyere ịdị adị nke Nabonidus?

9 N’ịbụ ndị afọ na-ejughịkwa, ụfọdụ ndị nkatọ na-eme mkpesa na Bible na-akpọ Belshaza nwa Nebukadneza, ọ bụghị nwa Nabonidus. Ụfọdụ na-esi ọnwụ na Daniel ekwutụdịghị ihe ọ bụla banyere ịdị adị nke Nabonidus. Otú ọ dị, ịrụ ụka abụọ ahụ dawara afọ ma e nyochaa ha. O yiri ka Nabonidus ọ lụrụ ada Nebukadneza. Nke ahụ ga-eme Belshaza nwa nwa Nebukadneza. Ma asụsụ Hibru ma nke Aramaic adịghị nke nwere okwu maka “nna nna” ma ọ bụ “nwa nwa”; “nwa nke” pụrụ ịpụta “nwa nwa nke” ma ọ bụ ọbụna “onye si n’eriri nke.” (Tụlee Matiu 1:1.) Ọzọkwa, ihe ndekọ Bible adịghị enye ohere maka Belshaza ịbụ onye a matara dị ka nwa Nabonidus. Mgbe ihe ahụ e dere n’ahụ ájá menyere ya ụjọ, Belshaza na-amaghị ihe ọ ga-eme kwuru na ya ga-enye onye ọ bụla pụrụ ịkọwa okwu ndị ahụ ọkwá nke atọ n’alaeze ahụ. (Daniel 5:7) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nke atọ n’abụghị nke abụọ? Nke a na-enye echiche na a nọchiworị ọkwá nke mbụ na nke abụọ. N’ezie, a nọchiela ha—Nabonidus na nwa ya, bụ́ Belshaza nọchiri ha.

10. N’ihi gịnị ka ihe ndekọ Daniel banyere usoro ndị eze Babilọn jiri saa mbara karịa nke ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme oge ochie ndị ọzọ?

10 Ya mere aha Daniel kpọtụrụ Belshaza abụghị ihe àmà nke ‘ngwagbu’ nke akụkọ ihe mere eme. N’ụzọ megidere nke ahụ, Daniel—ọ bụ ezie na ọ dịghị ede akụkọ banyere Babilọn—na-akọrọ anyị ihe sara mbara banyere ndị eze Babilọn karịa ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme oge ochie dị ka Herodotus, Xenophon, na Berossus. N’ihi gịnị ka Daniel ji nwee ike idekọ ihe mere eme ndị ha na-edekọghị? N’ihi na ọ nọ n’ebe ahụ na Babilọn. Akwụkwọ ya bụ ọrụ nke onye ji anya ya hụ, ọ bụghị onye na-azọrọ ihe ọ na-abụghị nke narị afọ ndị sochirinụ.

ÒNYE BỤ DARAỊỌS ONYE MIDIA?

11. Dị ka Daniel si kwuo, ònye bụ Daraịọs onye Midia, ma gịnị ka e kwuworo banyere ya?

11 Daniel na-akọ na mgbe a kwaturu Babilọn, otu eze aha ya bụ “Daraịọs, bụ́ onye Midia” malitere ịchị. (Daniel 5:31) A hụbeghị ebe e dere aha Daraịọs onye Midia n’akwụkwọ na-abụghị Bible ma ọ bụ na nke nkà mmụta ihe mgbe ochie. N’ihi ya, The New Encyclopædia Britannica na-azọrọ na Daraịọs a bụ “onye e chepụtara echepụta.”

12. (a) N’ihi gịnị ka ndị nkatọ Bible kwesịrị iji mara na o zighị ezi ikwu hoo haa na ọ dịghị mgbe Daraịọs onye Midia dịrị adị? (b) Gịnị bụ otu ihe pụrụ ikwe omume banyere onye Daraịọs onye Midia bụ, oleekwa ihe àmà na-egosi nke a?

12 Ụfọdụ ndị ọkà mmụta akpacharawo anya karị. E kwuwerị, n’otu mgbe ndị nkatọ sịrị na Belshaza bụkwa “onye e chepụtara echepụta.” N’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya, ihe banyere Daraịọs ga-abụ otu ihe ahụ. Ka ọ dị ugbu a, nkume cuneiform ekpughewo na Saịrọs onye Peasia ewereghị utu aha ahụ bụ́ “Eze Babilọn” ozugbo ahụ o merisịrị. Otu onye nchọpụta na-atụ aro, sị: “Onye ọ bụla nwere utu aha bụ́ ‘Eze Babilọn’ bụ eze nọ n’okpuru Saịrọs, ọ bụghị Saịrọs n’onwe ya.” Ọ̀ pụrụ ịbụworị na Daraịọs bụ aha, ma ọ bụ utu aha nke onye ọchịchị dị ike bụ́ onye Midia a gwara ka ọ na-elekọta Babilọn? Ụfọdụ na-atụ aro na Daraịọs pụrụ ịbụwo nwoke aha ya bụ Gubaru. Saịrọs mere Gubaru gọvanọ na Babilọn, ihe ndekọ na-abụghị nke Bible na-akwadokwa na o ji ike dịtụ ukwuu chịa. Otu nkume cuneiform na-asị na ọ họpụtara ndị gọvanọ nọ n’okpuru ya ịchị Babilọn. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Daniel na-ekwu na Daraịọs họpụtara mmadụ 120 na-anọchi anya eze ịchị alaeze Babilọn.—Daniel 6:1.

13. Gịnị bụ ihe ezi uche dị na ya mere e ji kpọtụ Daraịọs onye Midia aha n’akwụkwọ Daniel ma ghara ịkpọtụ ya aha n’ihe ndekọ na-abụghị nke Bible?

13 Ka oge na-aga, ihe àmà nke ga-akọwa kpọmkwem karị onye eze a bụ pụrụ ịpụta. Ka o sina dị, ihe yiri ka ọ bụ ịgba nkịtị nke nkà mmụta ihe ochie gbara n’akụkụ a abụtụghị ihe mere a ga-eji sị na Daraịọs bụ “onye e chepụtara echepụta,” nke ọ ga-ejikwanụ bụrụ ihe a ga-eji sị na akwụkwọ Daniel nile bụ wayo. Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya nke ukwuu karị iwere ihe ndekọ Daniel dị ka akaebe nke onye ji anya ya hụ ihe bụ́ nke sara mbara karịa ihe ndekọ na-abụghị nke Bible ka dị adị.

ỌCHỊCHỊ JEHOIAKIM

14. N’ihi gịnị ka a na-ejighị nwee ọdịiche n’etiti Daniel na Jeremaịa banyere afọ ndị Eze Jehoiakim chịrị?

14 Daniel 1:1 na-agụ, sị: “N’afọ nke atọ nke ọbụbụeze nke Jehoiakim, bụ́ eze Juda, ka Nebukadneza, bụ́ eze Babilọn, bịara na Jerusalem, nọchigide ya n’agha.” Ndị nkatọ akatọwo akụkụ akwụkwọ nsọ a n’ihi na o yighị ka o kwekọrọ n’ihe Jeremaịa kwuru, bụ́ onye sịrị na afọ nke anọ nke Jehoiakim bụ afọ nke mbụ nke Nebukadneza. (Jeremaịa 25:1; 46:2) Daniel ọ̀ na-emegide Jeremaịa? E nwetakwuo ihe ọmụma, okwu ahụ ga-edokwu anya n’ụzọ dị mfe. Mgbe Fero Neko bu ụzọ mee ya eze na 628 T.O.A., Jehoiakim ghọrọ nanị ngwá ọrụ nke onye ahụ na-achị Ijipt. Nke a bụ ihe dị ka afọ atọ tupu Nebukadneza anọchie nna ya dị ka eze Babilọn, na 624 T.O.A. Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị (na 620 T.O.A.), Nebukadneza wakporo Juda ma mee Jehoiakim onye eze nọ n’okpuru Babilọn. (2 Ndị Eze 23:34; 24:1) Nye onye Juu bi na Babilọn, “afọ nke atọ” nke Jehoiakim gaara abụ afọ nke atọ nke eze ahụ nọ n’okpuru ijere Babilọn ozi. Daniel dere ihe site n’akụkụ ahụ. Otú ọ dị, Jeremaịa dere ihe site n’akụkụ nke ndị Juu bi kpọmkwem na Jerusalem. N’ihi ya o zoro aka n’ebe ọbụbụeze Jehoiakim dị dị ka nke malitere mgbe Fero Neko chiri ya eze.

15. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ arụmụka na-erijughị afọ ikwutọ oge ahụ dị na Daniel 1:1?

15 Mgbe ahụ, n’ezie, nanị ihe ihe a a sị na ọ bụ enweghị nkwekọrịta mere bụ ịkwado ihe àmà ahụ bụ́ na Daniel dere akwụkwọ ya na Babilọn ka ọ nọ n’etiti ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ. Ma e nwere oké ihie ụzọ ọzọ dị n’arụmụka a megide akwụkwọ Daniel. Cheta na n’ụzọ doro anya onye dere Daniel nwere akwụkwọ Jeremaịa ọbụnakwa zoo aka na ya. (Daniel 9:2) Ọ bụrụ na onye dere Daniel bụ onye dị nkọ n’ịchepụta ihe, dị ka ndị nkatọ na-azọrọ, ọ̀ ga-anwa imegide akwụkwọ a na-akwanyere ùgwù dị ka Jeremaịa—bụrụkwa nnọọ kpọmkwem n’amaokwu mbụ nke akwụkwọ ya ma ọ chọọdịrị ime otú ahụ? Ọ dịghị ma ọlị!

IHE ỌMỤMA SARA MBARA NDỊ DỊ IRÈ

16, 17. Olee otú ihe àmà nkà mmụta ihe mgbe ochie siworo kwadoo ihe ndekọ Daniel banyere (a) nguzobe Nebukadneza guzobere ihe onyinyo okpukpe ka mmadụ nile fee ya ofufe? (b) àgwà itu ọnụ Nebukadneza banyere ọrụ ihe owuwu ya na Babilọn?

16 Ugbu a ka anyị si n’akụkụ ndị na-adịghị mma gaa n’akụkụ ndị dị mma. Tụlee ụfọdụ ihe ọmụma ndị ọzọ sara mbara dị n’akwụkwọ Daniel nke na-egosi na onye dere ya maara kpọmkwem n’onwe ya ihe banyere oge o dere maka ha.

17 Ọmụma Daniel maara ihe ndị siri ike nghọta banyere Babilọn oge ochie bụ ihe àmà na-enweghị mgbagha nke ịbụ eziokwu nke ihe ndekọ ya. Dị ka ihe atụ, Daniel 3:1-6 na-akọ na Nebukadneza guzobere ihe onyinyo buru nnọọ ibu maka ndị nile ife ya ofufe. Ndị ọkà mmụta ihe ochie achọpụtawo ihe àmà ọzọ nke na-egosi na eze a chọrọ ime ka ndị ya tinyekwuo aka n’ihe omume ịhụ mba n’anya na nke okpukpe. N’otu aka ahụ, Daniel na-edekọ àgwà itu ọnụ nke Nebukadneza banyere ọtụtụ ọrụ ihe owuwu ya. (Daniel 4:30) Ọ bụ nanị n’oge a ka ndị ọka mmụta ihe ochie kwadoro na ọ bụ Nebukadneza mere ka e wuo ihe dị ukwuu n’ihe ndị e wuru na Babilọn. Banyere itu ọnụ—leenụ, nwoke ahụ mere ka a kanye aha ya kpọmkwem na blọkụ ha! Ndị na-akatọ Daniel apụghị ịkọwa otú onye ha sịrị na ọ bụ onye nchepụta ihe nke oge ndị Maccabee (167-163 T.O.A.) pụworo isi mara banyere ọrụ ihe owuwu ndị ahụ—ihe dị ka narị afọ anọ mgbe o mesịrị na ogologo oge tupu ndị ọkà mmụta ihe ochie emee ka ha pụta ìhè.

18. Olee otú ihe ndekọ Daniel banyere ụdị ntaramahụhụ dị iche iche n’okpuru ọchịchị Babilọn na ọchịchị Peasia si zie ezie?

18 Akwụkwọ Daniel na-ekpughekwa ụfọdụ ọdịiche gbara ọkpụrụkpụ ndị dị n’etiti iwu Babilọn na nke ndị Medo-Peasia. Dị ka ihe atụ, n’okpuru iwu Babilọn a tụbara ndị enyi Daniel atọ n’ime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu maka ịjụ irubere iwu eze isi. Ọtụtụ narị afọ mgbe nke ahụ gasịrị, a tụbara Daniel n’ime olulu ọdụm maka ịjụ irube isi n’iwu ndị Peasia nke megidere akọ na uche ya. (Daniel 3:6; 6:7-9) Ụfọdụ anwawo ikwu na akụkọ ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu bụ nanị akụkọ mgbe ochie, ma ndị ọkà mmụta ihe ochie achọpụtawo akwụkwọ ozi sitere na Babilọn oge ochie n’ezie nke kpọtụrụ ụdị ntaramahụhụ a aha kpọmkwem. Otú ọ dị, nye ndị Midia na ndị Peasia, ọkụ dị nsọ. Ya mere ha na-eji ụdị ntaramahụhụ ndị ọzọ dị njọ eme ihe. N’ihi ya, olulu ọdụm abụghị ihe ijuanya.

19. Ọdịiche dị aṅaa dị n’etiti usoro iwu ndị Babilọn na ndị Medo-Peasia ka akwụkwọ Daniel mere ka o doo anya?

19 E nwere ọdịiche ọzọ. Daniel na-egosi na Nebukadneza pụrụ ime na ịgbanwe iwu mgbe ọ masịrị ya. Daraịọs apụghị ime ihe ọ bụla iji gbanwee ‘iwu ndị Midia na Peasia’—ọbụna ndị ya onwe ya mere! (Daniel 2:5, 6, 24, 46-49; 3:10, 11, 29; 6:12-16) Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ John C. Whitecomb na-ede, sị: “Akụkọ ihe mere eme nke oge ochie na-akwado ọdịiche a dị n’etiti Babilọn, bụ́ ebe eze karịrị iwu, na Medo-Peasia, bụ́ ebe eze nọ n’okpuru iwu.”

20. Ihe ọmụma sara mbara dị aṅaa banyere oriri Belshaza gosiri na Daniel n’onwe ya maara banyere omenala Babilọn?

20 Akụkọ na-akpali akpali nke oriri Belshaza, bụ́ nke e dekọrọ na Daniel isi nke 5, jupụtara n’ihe ọmụma sara mbara. N’ụzọ doro anya, ọ malitere n’iritụ obere ihe na ịṅụ oké mmanya, n’ihi na e nwere ọtụtụ ebe e zoro aka ná mmanya. (Daniel 5:1, 2, 4) N’eziokwu, ihe ndị a kpụrụ akpụ banyere oriri ndị yiri nke ahụ na-egosi ka a na-aṅụ nanị mmanya. Ya mere, dị ka ihe àmà na-egosi, mmanya dị oké mkpa n’ụdị ememe ndị ahụ. Daniel na-ekwukwa na ndị inyom nọ n’oriri a—ndị nwunye ọzọ nke eze na ndị iko ya nwanyị. (Daniel 5:3, 23) Nkà mmụta ihe ochie na-akwado ihe ọmụma a sara mbara nke omenala Babilọn. Echiche nke ndị nwunye isonyere ndị ikom n’oriri dị njọ n’anya ndị Juu na ndị Gris n’oge ndị Maccabee. Eleghị anya ọ bụ ya mere nsụgharị ndị mbụ nke Septuagint Grik nke Daniel na-ejighị kwuo banyere ndị inyom ndị a.c Ma, onye ahụ a sị na o chepụtara Daniel aghaghị ibiworị ndụ n’otu ọdịbendị ahụ nakweere ụzọ ndụ ndị Gris, ma eleghịkwa anya ọbụna n’otu oge ahụ, nke mepụtara Septuagint!

21. Gịnị bụ nkọwa ezi uche dị na ya karịsịa banyere Daniel inwe ihe ọmụma miri emi nke oge na omenala nke ije biri na Babilọn?

21 N’ihi ihe ọmụma sara mbara ndị dị otú ahụ, o yiri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe siri nnọọ ike ikwere na Britannica pụrụ ịkọwa onye dere akwụkwọ Daniel dị ka onye nwere nanị ihe ọmụma “na-edoghị anya na nke na-ezighị ezi” banyere oge ije biri n’ala ọzọ ahụ. Olee otú onye nchepụta ihe nke narị afọ ndị sochirinụ mgbe ọ gasịrị si mara omenala nke Babilọn na Peasia oge ochie nke ọma otú a? Chetakwa na alaeze ukwu abụọ ahụ adakpọworị ogologo oge tupu narị afọ nke abụọ T.O.A. Ihe àmà na-egosi na e nweghị ndị ọkà mmụta ihe ochie mgbe ahụ; ndị Juu nke oge ahụ adịghịkwa enwe mmasị n’inwe ihe ọmụma nke ọdịnala na akụkọ ihe mere eme nke mba ndị ọzọ. Ọ bụ nanị Daniel onye amụma, onye ji anya ya hụ oge na ihe omume ndị ahụ ọ kọwara, pụrụ ideworị akwụkwọ Bible ahụ bu aha ya.

IHE NDỊ NA-ESITEGHỊ NA BIBLE HÀ NA-EGOSI NA E CHEPỤTARA DANIEL ECHEPỤTA?

22. Nzọrọ dị aṅaa ka ndị nkatọ na-eme banyere ebe a gụnyere Daniel ná ndepụta nke akwụkwọ ndị so n’Akwụkwọ Nsọ Hibru?

22 Otu n’ime arụmụka kasị zuo ebe nile megide akwụkwọ Daniel metụtara ọnọdụ ya ná ndepụta nke akwụkwọ ndị so n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ndị rabaị oge ochie haziri akwukwọ ndị so n’Akwụkwọ Nsọ Hibru n’ìgwè atọ: Iwu, Ndị Amụma, na Ihe Odide. Ha denyere Daniel n’Ihe Odide, ọ bụghị ná Ndị Amụma. Ndị nkatọ na-arụ ụka na nke a pụtara na ọ ghaghị ịbụ na a maghị akwụkwọ ahụ mgbe a na-achịkọta akwụkwọ nke ndị amụma ndị ọzọ. A gụnyekọrọ ya n’Ihe Odide n’ihi na e chere na a chịkọtara ha ka oge na-aga.

23. Olee otú ndị Juu oge ochie si were akwụkwọ Daniel, oleekwa otú anyị si mara nke a?

23 Ka o sina dị, ọ bụghị ndị nnyocha Bible nile kwenyere na ndị rabaị oge ochie kewara akwụkwọ Bible n’ụzọ a kapịrị ọnụ otú ahụ ma ọ bụ na ha gụpụrụ Daniel ná Ndị Amụma. Ma ọ bụrụgodị na ndị rabaị denyere Daniel n’Ihe Odide, nke a ọ̀ ga-egosi na e dere ya mgbe oge ụfọdụ gasịworo? Ee e. Ndị ọkà mmụta a na-akwanyere ùgwù atụwo aro ọtụtụ ihe mere ndị rabaị pụrụ ijiworị gụpụ Daniel ná Ndị Amụma. Dị ka ihe atụ, o nwere ike bụrụ na ha mere otú ahụ n’ihi na akwụkwọ ahụ kpasuru ha iwe ma ọ bụ n’ihi na ha lere Daniel n’onwe ya anya dị ka onye dị iche ná ndị amụma ndị ọzọ n’ihi na o nwere ọkwá ọchịchị n’ala ọzọ. Ihe ọ masịrị ya bụrụ, ihe dị mkpa bụ: Ndị Juu oge ochie kwanyeere akwụkwọ Daniel ùgwù nke ukwuu ma were ya dị ka otu n’ime akwụkwọ Bible. Ọzọkwa, ihe àmà na-atụ aro na e dezuru akwụkwọ ndị so n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ogologo oge tupu narị afọ nke abụọ T.O.A. E kweghị nnọọ ka a gbakwụnye ndị ọzọ ka oge na-aga, gụnyere akwụkwọ ụfọdụ e dere na narị afọ nke abụọ T.O.A.

24. Olee otú e siworo jiri akwụkwọ Ecclesiasticus ahụ so n’akwụkwọ apọkrịfa mee ihe imegide akwụkwọ Daniel, gịnị na-egosikwa na echiche a ezighị ezi?

24 N’ụzọ na-adabakọghị adabakọ, e jiriwo otu n’ime akwụkwọ ndị a a jụrụ ajụ e dere ka oge na-aga rụọ ụka megide akwụkwọ Daniel. Akwụkwọ so n’apọkrịfa bụ́ Ecclesiasticus, nke Jesus Ben Sirach dere, bụ nke ihe àmà na-egosi na e dere n’ihe dị ka na 180 T.O.A. Ndị nkatọ na-enwe mmasị ikwu na a gụnyeghị Daniel ná ndepụta dị ogologo nke akwụkwọ ahụ depụtara ndị ezi omume. Ha na-arụ ụka na ọ ghaghị ịbụ na a maghị Daniel n’oge ahụ. A na-anakwere arụmụka a n’ọtụtụ ebe n’etiti ndị ọkà mmụta. Ma tụlee nke a: Otu ndepụta ahụ etinyeghị aha Ezra na Mọdekaị (ndị bụcha dike n’anya ndị Juu nọ mgbe ije biri n’ala ọzọ gasịrị), ezi Eze Jehoshafat, na nwoke ziri ezi bụ́ Job; n’ime ndị ikpe nile, ọ kpọrọ nanị Samuel aha.d N’ihi na e denyeghị ndị ikom dị otú ahụ ná ndepụta nke na-adịghị azọrọ na o tinyechara aha mmadụ nile, nke pụtara n’akwụkwọ na-esoghị n’akwụkwọ Bible, ànyị ga-asị na ha nile bụcha ndị e chepụtara echepụta? Echiche ahụ n’onwe ya bụ nke ezi uche na-adịtụghị na ya.

AKAEBE SI EBE ỌZỌ NDỊ NA-AKWADO DANIEL

25. (a) Olee otú Josephus si kwadoo ịbụ eziokwu nke ihe ndekọ Daniel? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ihe ndekọ Josephus banyere Alexander Onye Ukwu na akwụkwọ Daniel si kwekọọ n’akụkọ ihe mere eme a ma ama? (Lee nkọwa ala ala peji nke abụọ.) (ch) Olee otú ihe àmà nke asụsụ e jiri mee ihe si akwado akwụkwọ Daniel. (Lee peji nke 26.)

25 Ka anyị gatụ ọzọ n’akụkụ dị mma. A tụwo aro na ọ dịghị akwụkwọ ọzọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru a nwapụtaworo nke ọma dị ka Daniel. Iji maa atụ: Onye Juu ahụ a ma ama na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus na-anwapụta ịbụ eziokwu ya. Ọ na-asị na Alexander Onye Ukwu, n’oge ọ na-alụ agha megide Peasia na narị afọ nke anọ T.O.A., bịara na Jerusalem, bụ́ ebe ndị nchụàjà gosiri ya otu akwụkwọ Daniel. Alexander n’onwe ya kwubiri na okwu dị n’amụma Daniel ndị a kọwapụtaara ya na-ezo aka n’ihe omume agha nke ya metụta Peasia.e Nke a ga-abụworị ihe dị ka otu narị afọ na ọkara tupu “nchepụta” ahụ dị ka ndị nkatọ na-ekwu. N’ezie, ndị nkatọ agwakasịwo Josephus ahụ maka ihe odide a. Ha na-agwakasị ya ahụ maka ikwu na ụfọdụ amụma ndị dị n’akwụkwọ Daniel emezuwo. Ma, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Joseph D. Wilson kwuru, “ikekwe [Josephus] maara okwu ahụ nke ọma karịa ndị nkatọ nile nọ n’ụwa.”

26. Olee otú Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ siworo kwadoo ịbụ eziokwu nke akwụkwọ Daniel?

26 Ịbụ eziokwu nke akwụkwọ Daniel nwetakwuru nkwado mgbe a chọtara Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ n’ọ́gbà nke Qumran, Israel. N’ụzọ na-eju anya, ọtụtụ ihe so n’ihe ndị a chọtara na 1952 bụ akwụkwọ mpịakọta na iberibe akwụkwọ sitere n’akwụkwọ Daniel. Nke kasị ochie bụ nke e dere laarị azụ ná ngwụsị narị afọ nke abụọ T.O.A. Ya mere, n’oge gboo ahụ, a maraworị akwụkwọ Daniel nke ọma ma na-akwanyekwara ya ùgwù n’ebe nile. The Zondervan Pictorial Encyclopedia of the Bible na-ekwu, sị: “A ga-akwụsịzi ikwu na e dere Daniel n’oge ndị Maccabee, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ihi na a pụghị inwe oge zuru ezu n’agbata mgbe e dere Daniel na mpụta ya n’ụdị nke akwụkwọ dị n’ọ́bá akwụkwọ nke otu ịrọ òtù okpukpe ndị Maccabee.”

27. Gịnị bụ ihe àmà kasị ochie e nwere na Daniel bụ onye dịrị adị n’ezie, bụ́ onye a maara nke ọma n’oge e mere ka ha jee biri na Babilọn?

27 Otú ọ dị, e nwere nnwapụta ka nnọọ ochie ma bụrụ ihe a pụrụ ịdabere na ya karị nye akwụkwọ Daniel. Otu onye ya na Daniel bikọrọ ndụ bụ Ezikiel onye amụma. Ya onwe ya kwa jere ozi dị ka onye amụma n’oge e mere ka ha jee biri na Babilọn. Ọtụtụ ugboro, akwụkwọ Ezikiel kpọtụrụ Daniel aha. (Ezikiel 14:14, 20; 28:3) Izo aka ndị a na-egosi na ọbụna n’oge ọ dị ndụ, na narị afọ nke isi T.O.A., a maraworị Daniel nke ọma dị ka nwoke ezi omume na onye maara ihe, onye ruru eru ka a kpọkọta aha ya na nke ndị na-atụ egwu Chineke bụ́ Noa na Job.

ONYE ÀMÀ KASỊ UKWUU

28, 29. (a) Gịnị bụ ihe àmà kasị eme ka e kweta na akwụkwọ Daniel bụ eziokwu? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nakwere akaebe Jisọs?

28 Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ka anyị tụlee onye kasị ukwuu n’ime ndị nile gbara àmà nye ịbụ eziokwu nke Daniel—ọ dịghị onye ọzọ ọ bụ karịa Jisọs Kraịst. N’okwu ya banyere mgbe ikpeazụ, Jisọs zoro aka na “Daniel onye amụma” na n’otu n’ime amụma Daniel.—Matiu 24:15; Daniel 11:31; 12:11.

29 Ugbu a ọ bụrụ na ozizi banyere oge ndị Maccabee nke ndị nkatọ ziri ezi, otu n’ime ihe abụọ ga-abụrịrị eziokwu. Ma ọ̀ bụghị na e ji ihe a e chepụtara echepụta ghọgbuo Jisọs ọ bụrụ na ọ dịghị mgbe o kwuru ihe Matiu sịrị na o kwuru. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime echiche ndị ahụ ziri ezi. Ọ bụrụ na anyị apụghị ịdabere n’ihe ndekọ Oziọma nke Matiu, olee otú anyị pụrụ isi dabere n’akụkụ ndị ọzọ nke Bible? Ọ bụrụ na anyị ewepụ ahịrịokwu ndị ahụ, olee okwu ga-afọzi n’Akwụkwọ Nsọ? Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, . . . na iji mee ka uche mmadụ guzozie.” (2 Timoti 3:16, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ya mere ọ bụrụ na Daniel bụ onye wayo, mgbe ahụ Pọl bụ onye wayo ọzọ! Ọ̀ pụrụ ịbụ na a ghọgburu Jisọs? Ọ dịghị ma ọlị. Ọ dị ndụ n’eluigwe mgbe e dere akwụkwọ Daniel. Jisọs ọbụna sịrị: “Mgbe a ka-amụghị Abraham Mụ onwe m dị.” (Jọn 8:58) N’ime mmadụ nile dịtụworo ndụ, Jisọs ga-abụ onye kasị mma a ga-ajụta banyere ịbụ eziokwu nke Daniel. Ma ọ dịghị anyị mkpa ịjụwa. Dị ka anyị hụworo, akaebe ya doro nnọọ anya.

30. Olee otú Jisọs siri gosipụtakwuo ịbụ eziokwu nke akwụkwọ Daniel?

30 Jisọs gosipụtakwuru ịbụ eziokwu nke akwụkwọ Daniel n’oge baptism ya kpọmkwem. Mgbe ahụ ọ ghọrọ Mesaịa, na-emezu amụma dị na Daniel banyere izu 69 nke afọ. (Daniel 9:25, 26; lee Isi 11 nke akwụkwọ a.) Ọ bụrụgodị na ihe a pụrụ ịkpọ ozizi ide Daniel mgbe oge gasịworo bụ eziokwu, onye dere Daniel ka maara ọdịnihu ihe dị ka afọ 200 tupu o mee. N’ezie, Chineke agaghị enye onye na-echepụta ihe mmụọ nsọ ya iji aha na-abụghị ezigbo aha ya buo amụma ndị bụ eziokwu. Ee e, ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke ji obi ha nile anakwere àmà Jisọs. Ọ bụrụ na ndị ọkachamara nile, ndị nkatọ nile nọ n’ụwa, ga-agbakọta ọnụ ịkatọ Daniel, akaebe nke Jisọs ga-eme ha ndị ụgha, n’ihi na ọ bụ “Onyeàmà ahụ Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke bụkwa Onye eziokwu.”—Mkpughe 3:14.

31. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị nkatọ Bible ji ka bụrụ ndị na-ekwetaghị n’ịbụ eziokwu nke Daniel?

31 Ọbụnadị akaebe a ezughịrị ọtụtụ ndị na-akatọ Bible. Mgbe a tụlesịrị isiokwu a nke ọma, mmadụ ga-echewezi ma o nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ihe àmà ọ bụla ga-ezu ezu iji mee ka ha kweta. Otu prọfesọ na Mahadum Oxford dere, sị: “Ọ dịghị uru ọ bụla a na-erite site nanị n’ịza ihe ndị a na-ekweghị na ha, ma ọ bụrụhaala na ajọ mbunobi mbụ ahụ, bụ́ na ‘a pụghị inwe amụma sitere n’ikike karịrị mmadụ,’ ka dịgidere.” N’ihi ya ajọ mbunobi ha na-ekpuchi ha anya. Ma nke ahụ bụ nhọrọ ha—na mfu ha.

32. Gịnị na-abịa n’ihu n’ọmụmụ ihe anyị nke akwụkwọ Daniel?

32 Gịnị banyere gị? Ọ bụrụ na ị pụrụ ịhụ na ọ dịghị ezi ihe mere ị ga-eji enwe obi abụọ banyere ịbụ eziokwu nke akwụkwọ Daniel, mgbe ahụ ị dịwo njikere maka njem nchọpụta na-akpali akpali. Ị ga-achọpụta na akụkọ dị na Daniel na-akpali mmasị, amụma ya na-adọrọ adọrọ. Nke ka mkpa, ị ga-ahụ ka okwukwe gị na-esiwanye ike ka a na-atụle isiakwụkwọ nke ọ bụla. Ọ dịghị mgbe ị ga-akwa ụta ịṅa ntị nke ọma n’amụma Daniel!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ụfọdụ ndị nkatọ na-anwa imelatatụ ebubo ahụ bụ́ na ọ bụ ihe e chepụtara echepụta site n’ịsị na onye dere ya jiri Daniel mee ihe dị ka aha ụgha, dị nnọọ ka ndị dere ụfọdụ akwụkwọ oge ochie ndị na-esoghị n’akwụkwọ Bible si zaa aha na-abụghị nke ha. Otú ọ dị, onye nkatọ Bible bụ́ Ferdinand Hitzig kwuru, sị: “Ihe banyere akwụkwọ Daniel dị iche, ma ọ bụrụ na a sị na ọ bụ [onye edemede] ọzọ dere ya. Mgbe ahụ ọ ga-aghọ ihe odide e chepụtara echepụta, nzube ya bụkwa ịghọgbu onye na-agụ ya, ọ bụ ezie na ọ bụ maka ọdịmma ha.”

b Nabonidus anọghị n’ụlọ mgbe Babilọn dara. N’ihi ya, a kọwara Belshaza n’ụzọ ziri ezi dị ka eze na-achị mgbe ahụ. Ndị nkatọ na-arụgharị ụka na ihe ndekọ na-abụghị nke Bible adịghị enye Belshaza utu aha bụ́ eze. Ka o sina dị, ihe àmà oge ochie na-atụ aro na ndị nọ n’oge ahụ nwere ike ịkpọ ọbụna gọvanọ eze.

c Ọkà mmụta Hibru bụ́ C. F. Keil na-ede banyere Daniel 5:3, sị: “LXX. ahụ n’ebe a, nakwa n’amaokwu nke 23, ekwughị banyere ndị inyom, dị ka omenala ndị Masedonia, ndị Gris, na ndị Rom si dị.”

d N’ụzọ dị iche, ndepụta Pọl onyeozi ji ike mmụọ nsọ depụta ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi a kpọrọ aha ha ná Ndị Hibru isi nke 11, yiri ka ọ na-ezo aka n’ihe ndị e dekọrọ na Daniel. (Daniel 6:16-24; Ndị Hibru 11:32, 33) Otú ọ dị, ndepụta nke onyeozi ahụ etinyeghị aha mmadụ nile. E nwere ọtụtụ ndị, gụnyere Aịsaịa, Jeremaịa, na Ezikiel, bụ́ ndị a na-akpọghị aha ná ndepụta ahụ, ma nke a adịtụghị egosi na ọ dịghị mgbe ha dịrị adị.

GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?

• Gịnị ka e boworo akwụkwọ Daniel ebuwo ya?

• N’ihi gịnị ka nkatọ ndị nkatọ katọrọ akwụkwọ Daniel ji bụrụ ihe na-enweghị ebe mgbakwasị ụkwụ?

• Ihe àmà dị aṅaa na-akwado ịbụ eziokwu nke ihe ndekọ Daniel?

• Gịnị bụ ihe àmà kasị eme ka e kweta na akwụkwọ Daniel bụ eziokwu?

e Ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ekwuwo na nke a ga-abụ ihe mere Alexander ji nwee obiọma nke ukwuu n’ahụ ndị Juu, bụ́ ndị bụworo enyi ndị Peasia ruo ogologo oge. N’oge ahụ, Alexander nọ na-eme ihe iji bibie ndị enyi Peasia nile.

Igbe dị na peeji nke 26]

Ihe Banyere Asụsụ

E DECHARA akwụkwọ Daniel n’ihe dị ka 536 T.O.A. E dere ya n’asụsụ Hibru na Aramaic, tinyere okwu Grik na Persian ole na ole. Ngwakọta asụsụ dị otú ahụ bụ ihe a na-adịghị ahụkebe ma o jupụtara n’Akwụkwọ Nsọ. E dekwara akwụkwọ Bible bụ́ Ezra n’asụsụ Hibru na Aramaic. Ma, ụfọdụ ndị nkatọ na-esi ọnwụ na onye dere Daniel jiri asụsụ ndị a mee ihe n’ụzọ na-egosi na o dere ihe mgbe 536 T.O.A gasịrị. A na-ehota otu onye nkatọ ebe nile dị ka onye na-ekwu na ojiji e ji okwu Grik mee ihe na Daniel kwesịrị ka e were ya na e dere ya mgbe ọtụtụ afọ gasịworo. Ọ na-ekwusi ike na asụsụ Hibru ya na-akwado nke ahụ nakwa ma ọ dịghị ihe ọzọ na Aramaic ya na-enye ohere maka oge dị otú ahụ—ọbụna oge na-adịbeghị anya dị ka na narị afọ nke abụọ T.O.A.

Otú ọ dị, ọ bụghị ndị ọkà mmụta asụsụ nile kwenyere. Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n’okwu ekwuwo na Hibru nke Daniel yiri nke Ezikiel na Ezra ma dịrị iche na nke ahụ dị n’akwụkwọ ndị so n’apọkrịfa e dere mgbe ogologo oge gafeworo dị ka Ecclesiasticus. Banyere ojiji Daniel ji Aramaic mee ihe, tụlee akwụkwọ abụọ a hụrụ n’etiti Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ. E jikwa asụsụ Aramaic dee ha, bụrụkwa ndị e dere laa azụ na narị afọ nke mbụ na nke abụọ T.O.A.—oge na-adịghị anya mgbe ihe ahụ a sịrị na ọ bụ nchepụta nke Daniel gasịrị. Ma ndị ọkà mmụta achọpụtawo ọdịiche dị ukwuu dị n’etiti Aramaic e ji dee akwụkwọ ndị a na nke e ji dee Daniel. N’ihi ya, ụfọdụ na-atụ aro na akwụkwọ Daniel aghaghị ịbụ nke e dere ọtụtụ narị afọ laa azụ karịa oge ndị nkatọ ya na-azọrọ.

Gịnị banyere okwu Grik dị na Daniel bụ́ ndị “na-enye nsogbu”? A chọpụtawo na ụfọdụ n’ime ndị a bụ asụsụ Persian, ọ bụtụghị Grik! Nanị okwu ndị a ka na-eche na ha bụ Grik bụ aha nke ngwá egwú atọ. Ịdị adị nke okwu atọ a hà kwesịrị n’ezie ime ka a sị na e dere Daniel mgbe ọtụtụ afọ gasịworo? Ee e. Ndị ọkà mmụta ihe ochie achọpụtawo na ọdịbendị ndị Gris zuru ebe nile ọtụtụ narị afọ tupu Gris aghọọ ike ụwa. Ọzọkwa, ọ bụrụ na e dere akwụkwọ Daniel na narị afọ nke abụọ T.O.A., mgbe ọdịbendị na asụsụ ndị Gris zuru ebe nile, ọ̀ ga-enwe nanị okwu Grik atọ? Ọ dịghị ma ọlị. O yikarịrị nnọọ ka ọ ga-enwe ihe karịrị nnọọ nke ahụ. Ya mere ihe àmà metụtara asụsụ na-akwado ịbụ eziokwu nke Daniel n’ezie.

[Foto dị na peeji nke nke 12]

[Foto dị na peeji nke 20]

(N’okpuru) Mkpọ dị n’ụlọ nsọ Babilọn kpọrọ Eze Nabonidus na nwa ya bụ́ Belshaza aha

(N’elu) Ihe odide a nwere itu ọnụ nke Nebukadneza banyere ọrụ owuwu ihe ya

[Foto dị na peeji nke 21]

Dị ka Ihe Ndekọ Nabonidus si kwuo, ndị agha Saịrọs banyere Babilọn n’alụghị ọgụ

[Foto dị na peeji nke 22]

(N’aka nri) “Akụkọ Dị Ogologo nke Nabonidus” na-akọ na Nabonidus nyefere ọkpara ya ọchịchị

(N’aka ekpe) Ihe ndekọ Babilọn banyere mwakpo Nebukadneza wakporo Juda

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya