Isi nke Ise
Okwukwe Ha Lanarịrị Ule Siri Ike
1. Gịnị ka ọtụtụ ndị na-eche banyere ife Chineke na ife ala nna ha?
Ị̀ GA-ENYE Chineke ka ọ bụ mba i bi na ya ofufe gị? Ọtụtụ ga-aza, sị, ‘M na-akwanyere ha abụọ ùgwù. M na-efe Chineke dị ka okpukpe m na-akụzi; n’otu mgbe ahụ, m na-erubere ala nna m isi.’
2. Olee otú eze Babilọn si bụrụ ma onye a ma ama n’okpukpe ma n’ọchịchị?
2 Ọdịiche dị n’etiti nsọpụrụ okpukpe na ịhụ mba n’anya pụrụ iyi nke na-edochaghị anya taa, ma ọ dịtụghị adị na Babilọn oge ochie. N’ezie, n’obodo ahụ e jikọtara ihe omume obodo na ihe ndị dị nsọ n’ụzọ chiri anya nke na mgbe ụfọdụ a dịghị ama ọdịiche ha. “Na Babilọn oge ochie,” ka Profesọ Charles F. Pfeiffer na-ekwu, “eze jere ozi dị ka ma Onyeisi Nchụàjà ma onye ọchịchị obodo. Ọ na-achụ àjà ma na-ekpebi ihe ndụ okpukpe nke ndị ọ na-achị ga-abụ.”
3. Gịnị na-egosi na Nebukadneza bụ nwoke ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu?
3 Tụlee Eze Nebukadneza. Aha ya pụtara “Biko Nebo, Chebe Onye Nketa!” Nebo bụ chi amamihe na ọrụ ubi nke Babilọn. Nebukadneza bụ nwoke ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu. Dị ka e kwuru na mbụ, o wuru ụlọ nsọ nke ọtụtụ chi Babilọn ma chọọ ha mma, ọ bụkwa onye raara onwe ya nye Marduk karịsịa, bụ́ onye o nyere otuto maka mmeri nile o meriri n’agha.a O yikwara ka Nebukadneza ọ dabeere nke ukwuu n’ịjụ ndị mmụọ ase iji mee atụmatụ agha ya.—Ezikiel 21:18-23.
4. Kọwaa mmụọ okpukpe nke Babilọn.
4 N’ezie, mmụọ ikpe okpukpe jupụtara Babilọn nile. Obodo ahụ nwere ihe karịrị ụlọ nsọ 50, bụ́ ebe a na-efe ọtụtụ chi na chi nwanyị, gụnyere chi atọ n’ime otu bụ́ Anu (chi igwe), Enlil (chi elu ụwa, ikuku, na oké ifufe), na Ea (chi mmiri). Ihe mejupụtara atọ n’ime otu ọzọ bụ Sin (chi ọnwa), Shamash (chi anyanwụ), na Ishtar (chi nwanyị ọmụmụ). Majik, ịgba afa, na ịgụ kpakpando keere òkè dị mkpa n’ofufe Babilọn.
5. Ihe ịma aka dị aṅaa ka ọnọdụ okpukpe dị na Babilọn bụụrụ ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ?
5 Ibi n’etiti ndị fere ọtụtụ chi ofufe bụụrụ ndị Juu ahụ bi n’ala ọzọ ihe ịma aka siri ike. Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Mosis adọwo ụmụ Israel aka ná ntị na a ga-enwe ihe dị njọ ga-esi na ya pụta ma ọ bụrụ na ha ahọrọ inupụrụ Onye Kasị Ukwu Na-enye Iwu isi. Mosis gwara ha, sị: “Jehova ga-eme ka gị na eze gị, nke ị ga-eguzo ka ọ bụrụ eze gị, jeruo otu mba nke ị na-amaghị, ma gị onwe gị ma nna gị ha; ị ga-efekwa chi dị iche iche ọzọ n’ebe ahụ, bụ́ osisi na nkume.”—Deuterọnọmi 28:15, 36.
6. N’ihi gịnị ka ibi na Babilọn ji bụrụ ihe ịma aka pụrụ iche nye Daniel, Hananaịa, Mishael, na Azaraịa?
6 Ugbu a ndị Juu hụtara onwe ha n’ọnọdụ ọjọọ ahụ kpọmkwem. Iguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova ga-esi ike, karịsịa nye Daniel, Hananaịa, Mishael, na Azaraịa. A họrọwo ndị Hibru anọ a na-eto eto n’ụzọ pụrụ iche ịnata ọzụzụ maka ozi gọọmenti. (Daniel 1:3-5) Cheta na a gụọdịla ha aha Babilọn bụ́—Belteshaza, Shedrak, Mishak, na Abednego—ma eleghị anya iji mee ka ha kwekọọ n’ebe ọhụrụ ha nọ.b Ọkwá ukwu ndị ikom a nwere ga-eme ka ọjụjụ ha ga-ajụ ife chi nile nke ala ahụ pụta ìhè—ọbụna yie ịkpa nkata ịkwatu ọchịchị.
OTU ONYINYO ỌLAEDO AGHỌỌ IHE IYI EGWU
7. (a) Kọwaa onyinyo ahụ Nebukadneza guzobere. (b) Gịnị bụ nzube nke onyinyo ahụ?
7 Dị ka ihe àmà na-egosi, ná mgbalị ime ka ịdị n’otu nke alaeze ya sie ike, Nebukadneza guzobere otu onyinyo ọlaedo na ndagwurugwu Dura. Ọ dị cubit 60 (mita 27) n’ịdị elu na cubit 6 (mita 2.7) n’ibu.c Ụfọdụ kwenyere na onyinyo ahụ bụ nanị otu idé. Ọ pụrụ ịbụ na o nwere ntọala dị nnọọ elu bụ́ ebe nnukwu ihe a kpụrụ akpụ yiri mmadụ guzo, eleghị anya na-anọchite anya Nebukadneza n’onwe ya ma ọ bụ chi bụ́ Nebo. N’agbanyeghị ihe ọ bụ, onyinyo a dị oké elu bụ ihe nnọchianya nke Alaeze Ukwu Babilọn. N’ihi nke ahụ, e mere ya ka a hụ ya ma fee ya.—Daniel 3:1.
8. (a) Olee ndị a kpọrọ maka mmepe nke onyinyo ahụ, gịnịkwa ka a chọrọ ka ndị nile bịaranụ mee? (b) Gịnị bụ ntaramahụhụ maka ịjụ ịkpọ isiala nye onyinyo ahụ?
8 N’ihi nke a, Nebukadneza mere ndokwa maka ememe imepe ya. Ọ kpọkọrọ ndị na-anọchi anya eze, ndị isi, ndị na-achị ala, ndị ndụmọdụ, ndị odozi akụ̀, ndị ikpe, ndị odozi okwu, na ndị nile na-achị ala a na-achị achị. Onye nkwusa kpọrọ mkpu, sị: “Ọ bụ unu ka a na-agwa okwu, unu ndị dị iche iche, na unu mba dị iche iche, na unu ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, sị, Na mgbe ahụ mgbe unu ga-anụ olu nke opi ike, na nke ọja, na nke ụbọ akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ụbọ na opi nile dị iche iche, unu ga-ada n’ala, kpọọ isiala nye onyinyo ọlaedo ahụ nke Nebukadneza, bụ́ eze, guzobeworo ọtọ: ma onye ọ bụla nke na-agaghị ada n’ala kpọọ isiala, n’otu mgbe ahụ ka a ga-atụba ya n’etiti oké ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.”—Daniel 3:2-6.
9. Gịnị ka o yiri ka ọ bụ ihe ịkpọ isiala nye onyinyo ahụ nke Nebukadneza guzobeworo pụtara?
9 Ụfọdụ kweere na Nebukadneza mere ndokwa maka ememe a iji gbalịa ịmanye ndị Juu imebi ofufe ha na-efe Jehova. Ma eleghị anya nke a abụghị eziokwu n’ihi na ihe àmà na-egosi na ọ bụ nanị ndị isi na gọọmenti ka a kpọrọ n’ememe ahụ. N’ihi ya, nanị ndị Juu bịaranụ ga-abụ ndị na-eje ozi n’ọkwá ụfọdụ na gọọmenti. Mgbe ahụ, o yiri ka ịkpọ isiala nye onyinyo ahụ ọ̀ bụ ememe e zubere ka o wusie ịdị n’otu nke ndị na-achị achị ike. Ọkà mmụta bụ́ John F. Walvoord na-ekwu, sị: “Ngosipụta dị otú ahụ nke ndị ọchịchị bụ n’otu akụkụ ngosipụta na-enye obi ụtọ nke ike alaeze ukwu Nebukadneza, n’aka nke ọzọkwa ọ bụ iji kwanyere chi dị iche iche ùgwù bụ́ ndị n’echiche ha mere ka ha nwee mmeri nile ha nwere.”
NDỊ OHU JEHOVA AJỤ IMEBI OKWUKWE HA
10. N’ihi gịnị ka ndị na-abụghị ndị Juu na-agaghị eji nwee nsogbu banyere irube isi n’iwu Nebukadneza?
10 N’agbanyeghị nrara ha raara onwe ha nye chi dị iche iche ndị na-akwado ha, ọ gaghị enye ihe ka ọtụtụ n’ime ndị gbakọrọnụ n’ihu onyinyo Nebukadneza nsogbu ọ bụla n’akọ na uche ife ya. “Ife arụsị maara ha nile ahụ, ife otu chi egbochighịkwa ha ịsọpụrụ chi ọzọ,” ka otu ọkà mmụta Bible kọwara. Ọ gara n’ihu, sị: “O kwekọrọ n’echiche dị mgbe ahụ nke ndị na-ekpere arụsị na e nwere ọtụtụ chi . . . nakwa na ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’ịsọpụrụ chi nke ndị ma ọ bụ mba ọ bụla.”
11. N’ihi gịnị ka Shedrak, Mishak, na Abednego ji jụ ịkpọ isiala nye onyinyo ahụ?
11 Otú ọ dị, nye ndị Juu ọ bụ ihe dị iche. Chineke ha, bụ́ Jehova, enyewo ha iwu, sị: “Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ oyiyi nke ụdị ọ bụla nke dị n’eluigwe n’elu, ma ọ bụ nke dị n’ụwa n’okpuru ya, ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa: gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe: n’ihi na Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, bụ Chineke ekworo.” (Ọpụpụ 20:4, 5) Ya mere, ka egwú ahụ malitere, ndị ahụ gbakọtaranụ akpọọkwa isiala nye onyinyo ahụ, ndị Hibru atọ ahụ na-eto eto—Shedrak, Mishak, na Abednego—nọgidere na-eguzo ọtọ.—Daniel 3:7.
12. Gịnị ka ụfọdụ ndị Kaldea boro ndị Hibru atọ ahụ ebubo ya, n’ihi gịnịkwa?
12 Ọjụjụ ndị Hibru atọ a bụ́ ndị ọchịchị jụrụ ife onyinyo ahụ were ụfọdụ ndị Kaldea iwe. Ozugbo ahụ, ha gakwuuru eze ma “boo ndị Juu ebubo.”d Ha achọghị ịnụ ihe mere ha ji mee otú ahụ. N’ịchọ ka a taa ndị Hibru ahụ ahụhụ maka nnupụisi na ịgba ọchịchị mgba okpuru, ndị ebubo ahụ kwuru, sị: “Ndị Juu ụfọdụ dị ndị i doworo ndị isi ọrụ nke ala ahụ a na-achị achị, bụ́ Babilọn, ha bụ Shedrak na Mishak na Abednego; ndị ikom ndị a anụghị olu gị, eze: chi gị nile ka ha na-adịghị efe, ọ bụkwa onyinyo ọlaedo nke i guzobeworo ọtọ ka ha na-adịghị akpọ isiala nye.”—Daniel 3:8-12.
13, 14. Olee otú Nebukadneza si meghachi omume n’ihe Shedrak, Mishak, na Abednego mere?
13 Lee otú ọ na-aghaghị isiworị wee Nebukadneza iwe na ndị Hibru atọ a nupụụrụ iwu ya isi! O doro anya na o nwebeghị ihe ịga nke ọma n’ime ka Shedrak, Mishak, na Abednego ghọọ ndị nkwado na-ekwenyere ihe nile nke Alaeze Ukwu Babilọn. Ọ̀ bụ na o nyebeghị ha ọzụzụ n’amamihe nke ndị Kaldea? Ọbụna ọ gbanwewo aha ha! Ma ọ bụrụ na Nebukadneza chere na oké agụmakwụkwọ ga-akụziri ha ụzọ ọhụrụ nke ife ofufe ma ọ bụ na ịgbanwe aha ha ga-agbanwe ndị ha bụ, o hiere ụzọ nke ukwuu. Shedrak, Mishak, na Abednego nọgidere na-abụ ndị ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe.
14 Ọnụma juru Eze Nebukadneza obi. Ozugbo, o nyere iwu ka Shedrak, Mishak, na Abednego bịa. Ọ jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ ihe unu zubeworo, unu Shedrak, na Mishak, na Abednego, na chi m ka unu na-adịghị efe, ọ̀ bụkwa onyinyo ọlaedo nke m guzobeworo ọtọ ka unu na-adịghị akpọ isiala nye?” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Nebukadneza kwuru okwu ndị a n’oké iju anya. E kwuwerị, ọ ghaghị icheworị, sị, ‘Olee otú ndị ikom atọ nwere ezi uche pụrụ isi leghara iwu doro anya otú a anya—nke a ga-enye onye nupụụrụ ya isi ntaramahụhụ siri ike?’—Daniel 3:13, 14.
15, 16. Olee ohere Nebukadneza nyere ndị Hibru atọ ahụ?
15 Nebukadneza dị njikere inye ndị Hibru atọ ahụ ohere ọzọ. “Ugbu a a sị na unu ejikerewo,” ka ọ sịrị, “na mgbe unu ga-anụ olu nke opi ike, na nke ọja, na nke ụbọ akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ụbọ na opi nile dị iche iche, unu ga-ada n’ala kpọọ isiala nye onyinyo ahụ nke m meworo, ọ dị mma: ma a sị na unu adịghị akpọ isiala, n’otu mgbe ahụ ka a ga-atụba unu n’etiti oké ọkụ na-enwu ajọ onwunwu; ònye bụkwa chi ahụ nke ga-anapụta unu n’aka m?”—Daniel 3:15.
16 O doro anya na ihe mmụta sitere n’onyinyo ahụ ọ hụrụ ná nrọ (nke e dekọrọ na Daniel isi nke 2) enweghị mmetụta dịtere aka n’uche na n’obi Nebukadneza. Ikekwe o chezọworị okwu ya onwe ya gwara Daniel: “Chineke unu bụ Chineke nke chi nile, na Onyenwe ndị eze.” (Daniel 2:47) Ugbu a Nebukadneza yiri ka ọ na-ama Jehova aka, na-ekwu na ọbụna Jehova apụghị ịzọpụta ndị Hibru ahụ site na ntaramahụhụ ahụ na-echere ha.
17. Olee otú Shedrak, Mishak, na Abednego si meghachi omume n’ohere ahụ eze nyere ha?
17 Ọ dịghị Shedrak, Mishak, na Abednego mkpa ịtụleghachi okwu ahụ. Ha zaghachiri ozugbo, sị: “Nebukadneza, ọ dịghị anyị onwe anyị mkpa ịzaghachi gị okwu banyere nke a. A sị na ọ dị ụzọ ọ bụla Chineke ahụ Onye anyị onwe anyị na-efe pụrụ ịnapụta anyị, ọ bụ n’oké ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu na n’aka gị, eze, ka Ọ ga-anapụta anyị. Ma a sị na Ọ pụghị ịnapụta anyị, ka ị mara, eze, na chi gị nile ka anyị na-agaghị adị na-efe, ọ bụkwa onyinyo ọlaedo ahụ nke i guzobeworo ọtọ ka anyị na-agaghị akpọ isiala nye.”—Daniel 3:16-18.
N’IME OKÉ ỌKỤ AHỤ NA-ENWU AJỌ ONWUNWU!
18, 19. Gịnị mere mgbe a tụbara ndị Hibru atọ ahụ n’oké ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu?
18 N’ịbụ onye a kpasuru iwe, Nebukadneza nyere ndị ohu ya iwu ka ha mee oké ọkụ ahụ ka ọ dị ọkụ ugboro asaa karịa otú ọ dịbu. Mgbe ahụ o nyere “ndị dike ụfọdụ bụ dimkpa” iwu ka ha kee Shedrak, Mishak, na Abednego agbụ ma tụba ha n’ime “oké ọkụ na-enwu ajọ onwunwu.” Ha mere ihe eze nyere n’iwu, na-atụkpu ndị Hibru atọ ahụ n’ime ọkụ n’agbụ na n’ịbụ ndị e yikwasịrị uwe—ikekwe ka ọkụ wee repịa ha ngwa ngwa karị. Otú ọ dị, ọ bụ ndị akpụ obi nke Nebukadneza n’onwe ha ka ire ọkụ ahụ gburu.—Daniel 3:19-22.
19 Ma, ihe dị nnọọ ịrịba ama nọ na-eme. Ọ bụ ezie na Shedrak, Mishak, na Abednego nọ n’etiti oké ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu, ọkụ ahụ adịghị ere ha. Cheedị ihe ijuanya Nebukadneza nwere! E kewo ha agbụ nke ọma tụba ha n’ime oké ọkụ, ma ha ka nọ ndụ. Leenụ, ha na-agagharịrị onwe ha n’ime ọkụ ahụ! Ma Nebukadneza hụkwara ihe ọzọ. “Ọ́ bụghị ndị ikom atọ e kere agbụ [ka] anyị tụbara n’etiti ọkụ ahụ?” ka ọ jụrụ ndị ndụmọdụ ya. “Ọ bụ ezie, eze,” ka ha zara. “Lee,” ka Nebukadneza tiri ná mkpu, “mụ onwe m na-ahụ ndị ikom anọ a tọpụrụ agbụ, na-ejegharị n’etiti ọkụ ahụ, ma e merụghị ha ahụ; onye ahụ nke mere ha anọ yiri nwa nke ndị bụ́ chi n’ile ya anya.”—Daniel 3:23-25.
20, 21. (a) Gịnị ka Nebukadneza chọpụtara banyere Shedrak, Mishak, na Abednego mgbe ha si n’oké ọkụ ahụ pụta? (b) Gịnị ka a manyere Nebukadneza ikweta?
20 Nebukadneza bịaruru nso ọnụ ụzọ nke oké ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu. “Shedrak na Mishak na Abednego, unu ndị ohu nke Chineke Nke kachasị ihe nile elu,” ka o ji olu dara ụda kpọọ, “pụtanụ, bịa.” Ndị Hibru atọ ahụ si n’etiti ọkụ ahụ pụta. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị nile ji anya ha hụ ọrụ ebube a—gụnyere ndị nọchiri anya eze, ndị isi, ndị na-achị achị, na ndị ndụmọdụ eze—enweghị ọnụ okwu. Ọ dị nnọọ ka a ga-asị na ụmụ okorobịa atọ a abanyeghị n’ime oké ọkụ ahụ ma ọlị! Ísì ọkụ adịghị ha n’ahụ, ọkụ aṅachaghịkwa agịrị isi nke isi ha.—Daniel 3:26, 27.
21 Ugbu a a manyere Eze Nebukadneza ikweta na Jehova bụ Chineke nke Kachasị Ihe Nile Elu. “Onye a gọziri agọzi ka Chineke nke Shedrak na Mishak na Abednego bụ,” ka o kwupụtara, “Onye ziteworo mmụọ ozi Ya, wee napụta ndị ohu Ya ndị tụkwasịrị Ya obi, ọ bụkwa okwu eze ka ha gbanweworo, wee rara ahụ ha nye, ka ha wee ghara ife ma ọ bụ ịkpọ isiala nye chi ọ bụla, ma ọ bụghị Chineke ha.” Mgbe ahụ, eze ahụ gbakwụnyere ịdọ aka ná ntị a siri ike: “A na-esite n’aka m nye iwu, sị, na ndị ọ bụla, ma ọ bụ mba ọ bụla, ma ọ bụ asụsụ ọ bụla, nke ga-ekwuhie megide Chineke nke Shedrak, na Mishak na Abednego, a ga-abọkasị ya, ọ bụkwa ụlọ ya ka a ga-eme ebe ikpofu ahịhịa: n’ihi na ọ dịghị chi ọzọ nke pụrụ ịnapụta otú a.” Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị Hibru atọ ahụ nwetaghachiri ihu ọma eze, e ‘mekwara ka ihe gaara ha nke ọma n’ala ahụ a na-achị achị, bụ́ Babilọn.’—Daniel 3:28-30.
OKWUKWE NA ULE SIRI IKE TAA
22. Olee otú ndị ohu Jehova nke oge a si eche ọnọdụ ndị yiri nke Shedrak, Mishak, na Abednego ihu?
22 Taa, ndị na-efe Jehova na-eche ọnọdụ ndị yiri nke Shedrak, Mishak, na Abednego ihu. N’eziokwu, ndị Chineke nwere ike ha agaghị abụ ndị e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ n’ụzọ nkịtị. Ma, Jisọs kwuru na ụmụazụ ya “esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:14) Ha bụ “ndị ala ọzọ” n’echiche nke na ha adịghị anakwere omenala, àgwà, na omume ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nke ndị gbara ha gburugburu. Dị ka Pọl onyeozi si dee, ndị Kraịst ‘agaghị ekwe ka e mee ka ha yie ajọ oge a.’—Ndị Rom 12:2.
23. Olee otú ndị Hibru atọ ahụ si gosipụta nguzosi ike, oleekwa otú ndị Kraịst taa pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya ha?
23 Ndị Hibru atọ ahụ ekweghị ka e mee ka ha yie usoro ihe Babilọn. Ọbụna ihe a kụziiri ha nke ọma n’amamihe ndị Kaldea emegharịghị ha anya. Ọ dịghị ihe pụrụ ime ka ha gbanwee echiche ha n’ihe banyere ofufe, nrubeisi ha bụkwa nye Jehova. Ọ dị ndị Kraịst taa mkpa inwe nguzosi ike dị nnọọ otú ahụ. Ha ekwesịghị ime ihere n’ihi na ha dị iche n’ebe ndị nọ n’ụwa nọ. N’ezie, “ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya.” (1 Jọn 2:17) Ya mere ọ ga-abụ ihe nzuzu na ihe efu ikwekọ n’usoro ihe a na-anwụ anwụ.
24. Olee otú nguzo nke ezi ndị Kraịst si yie nke ndị Hibru atọ ahụ?
24 Ọ dị ndị Kraịst mkpa ịnọ na nche megide ụdị ọ bụla nke ikpere arụsị, gụnyere ụdị ndị dị aghụghọ.e (1 Jọn 5:21) Shedrak, Mishak, na Abednego ji nrubeisi na nkwanye ùgwù guzoro n’ihu onyinyo ọlaedo ahụ, ma ha ghọtara na ịkpọ isiala nye ya abụghị nanị ịkwanyere ya ùgwù. Ọ bụ ife ya ofufe, ikerekwa òkè na ya ga-eweta iwe Jehova. (Deuterọnọmi 5:8-10) John F. Walvoord na-ede, sị: “Ọ bụ n’eziokwu ikele ọkọlọtọ, ọ bụ ezie na, n’ihi njikọ e jikọtara nguzosi ike okpukpe na ihe nke ọchịchị obodo, ọ pụkwara inweworị otú o si metụta okpukpe.” Taa, ezi ndị Kraịst na-ewerekwa nguzo kwụ chịm otú ahụ megide ikpere arụsị.
25. Olee ihe ị mụtaworo site n’akụkọ mere eme n’ezie nke Shedrak, Mishak, na Abednego?
25 Ihe ndekọ Bible banyere Shedrak, Mishak, na Abednego na-enye ndị nile kpebisiworo ike ife Jehova n’ụzọ a na-ekewaghị ekewa ihe mmụta magburu onwe ya. Ihe àmà na-egosi na Pọl onyeozi bu ndị Hibru atọ a n’uche mgbe o kwuru banyere ọtụtụ ndị gosipụtara okwukwe, gụnyere ndị ‘menyụrụ ike ọkụ.’ (Ndị Hibru 11:33, 34) Jehova ga-enye ndị nile na-eṅomi okwukwe dị otú ahụ ụgwọ ọrụ. A gbapụtara ndị Hibru atọ ahụ n’oké ọkụ na-enwu ajọ onwunwu, ma anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-akpọlite ndị nile na-eguzosi ike n’ihe bụ́ ndị nwụrụ dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ọnwụ, ọ ga-ejikwa ndụ ebighị ebi gọzie ha. Otú ọ bụla o si gaa, Jehova “na-edebe mkpụrụ obi ndị ebere Ya; Ọ na-anapụta ha n’aka ndị na-emebi iwu.”—Abụ Ọma 97:10.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ụfọdụ kweere na Marduk, bụ́ onye e weere dị ka onye malitere Alaeze Ukwu Babilọn, na-anọchite anya Nimrọd e mere chi. Otú ọ dị, e jighị nke a n’aka.
b “Belteshaza” pụtara “Chebe Ndụ Eze.” “Shedrak” nwere ike ịpụta “Iwu nke Aku,” bụ́ chi ọnwa ndị Sumer. Ikekwe “Mishak” na-ezo aka n’otu chi ndị Sumer, “Abednego” pụtakwara “Ohu Nego,” ma ọ bụ Nebo.
c N’ihi ịdị ukwuu nke onyinyo ahụ, ụfọdụ ndị ọkà mmụta Bible kwenyere na e ji osisi mee ya ma werezie ọlaedo machie ya.
d Okwu Aramaic a sụgharịrị ‘boo ebubo’ pụtara ‘iri iberibe’ mmadụ—ịtaja ya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, site n’ikwutọ ya.
e Dị ka ihe atụ, Bible na-asị na iribiga ihe ókè na anyaukwu bụ ikpere arụsị.—Ndị Filipaị 3:18, 19; Ndị Kọlọsi 3:5.
Gịnị Ka Ị Ghọtara?
• N’ihi gịnị ka Shedrak, Mishak, na Abednego ji jụ ịkpọ isiala nye onyinyo ahụ Nebukadneza guzobere?
• Olee otú Nebukadneza si meghachi omume ná nguzo nke ndị Hibru atọ ahụ?
• Olee otú Jehova si nye ndị Hibru atọ ahụ ụgwọ ọrụ maka okwukwe ha?
• Gịnị ka ị mụtaworo site n’ịṅa ntị n’akụkọ mere eme n’ezie nke Shedrak, Mishak, na Abednego?
[Foto dị na peeji nke nke 68]
[Foto ndị dị na peeji nke 70]
1. Ụlọ nsọ dị elu (ziggurat) dị na Babilọn
2. Ụlọ nsọ Marduk
3. Efere ọla nchara nke na-egosi chi bụ́ Marduk (n’aka ekpe) na chi bụ́ Nebo (n’aka nri) ebe ha guzo dị ka dragọn
4. Nkume ịchọ mma nke Nebukadneza, onye a maara nke ọma maka ihe owuwu ya
[Foto dị na peeji nke nke 76]
[Foto dị na peeji nke nke 78]