Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 2/8 p. 12-15
  • Ọdụm—Nwamba Dị Ebube, Nwere Ọzà nke Africa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọdụm—Nwamba Dị Ebube, Nwere Ọzà nke Africa
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe E Kere Eke Na-akpali Mmasị ma Na-adọrọ Adọrọ
  • Simbaa—Nwamba nke Nwere Omume Enyi
  • Ọchụ Nta
  • Ihe A Na-achụ Nta Ya
  • Gịnị Mere Ha Ji Na-eme Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Daniel Nọ n’Olulu Ọdụm
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Teta!—1999
g99 2/8 p. 12-15

Ọdụm—Nwamba Dị Ebube, Nwere Ọzà nke Africa

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ “TETA!” NA KENYA

Ọ BỤ oge anyanwụ na-awa n’Ọzara Serengeti nke Africa. Anyị nọ n’ụgbọala Land Rover anyị ka ikuku ụtụtụ ahụ jụrụ oyi na-eku ma na-ekiri ìgwè nne ọdụm na ụmụ ha. Ajị ha nke na-achatụ nchara nchara dị larịị ma na-acha ọlaedo ọlaedo, na-ekwekọ nnọọ n’ụzọ mara mma n’ahịhịa ahụ toro ogo, nke kpọrọ nkụ. Ụmụ ọdụm ahụ na-egwukarị egwu ma nwee nnọọ ume. Ha na-amakwasị ma na-egwuri egwu n’ahụ buru ibu nke ndị nke nne, bụ́ ndị yiri ka ha ahụghị egwuregwu ha.

Na mberede ìgwè ọdụm ahụ deere duu. Ha nile atụgharịa, na-elepụ anya. Site n’ebe dị elu anyị nọ na-ele anya, anyị legara anya n’ebe ha na-ele anya ma hụ ihe dọọrọ uche ha. Ìhè chị ọbụbọ ahụ kpughere ọdịdị dị ebube nke nnukwu ọdụm nke oké. Anya anyị na ya kụkọtara ka ọ na-ele anyị anya. Ahụ mara anyị jijiji, ọ bụghị n’ihi oyi ụtụtụ ahụ, kama n’ihi ịghọta na ọ bụ anyị ka ọ na-elegide anya. Ọ na-emenye ụjọ, ma maa mma n’ile anya. Nnukwu ọzà na-acha ọlaedo ọlaedo nke tụrụ àgwà ojii gbara isi ukwu ya gburugburu. Nnukwu anya ya na-acha edo edo ma dị nkọ. Otú ọ dị, ezinụlọ ya dọọrọ uche ya, o jikwara nwayọọ nwayọọ lewazie ha anya ma gawa n’ebe ha nọ.

Ije ya dị egwu, ọbụna dị ebube. N’eleghị anyị anya ọzọ, o siri kpọmkwem n’ihu ụgbọala anyị gafere ma jekwuru ndị nke nne ahụ na ụmụ ha. Ha nile biliri izute ya ma bịatụ ihu ha n’otu n’otu n’imi ya gbara agba n’ụzọ yiri otú nwamba si eji ịdatụ ntì ekele onwe ha. N’ịbanye n’ime ìgwè ọdụm ahụ, nke oké ahụ dara nnọọ n’ala dị ka a ga-asị na ike gwụrụ ya n’ihi ije ọ gara ma na-atụrụgharị azụ ya n’ala. Oké iro ụra ya na-efe efe, n’oge na-adịghịkwa anya ìgwè ọdụm ahụ dum hiiri ụra na-emighị emi n’ìhè mbụ nke anyanwụ ụtụtụ ahụ na-ekpo ọkụ. Anyị hụrụ n’ihu anyị onyinyo nke udo na afọ ojuju e gosipụtara n’ime ahịhịa na-acha ọlaedo ọlaedo, nke ikuku na-efegharị dị n’ọzara nke osisi na-adịghị.

Ihe E Kere Eke Na-akpali Mmasị ma Na-adọrọ Adọrọ

Ikekwe ọ dịbeghị anụmanụ nke kpaliworo ike echiche mmadụ karịa ọdụm. Ogologo oge gara aga, ndị Africa na-ese ihe jiri ihe osise nke ọdụm ndị na-achụso anụ oriri ha chọọ ahụ okwute dị iche iche mma. E jiri nnukwu ihe a tụrụ atụ nke ọdụm ndị gbajuru ọzà bụ́ ndị e jiri okwute tụọ chọọ obí eze na ụlọ nsọ dị iche iche nke oge ochie mma. Taa, ndị mmadụ na-ekwoga n’ogige ndị a na-edebe anụ ọhịa ịhụ nwamba ndị a na-adọrọ mmasị. E gosiwo ọdụm dị ka ihe dị oké mkpa n’akwụkwọ na n’ihe nkiri, dị ka na Born Free, bụ́ akụkọ ihe mere eme banyere nwa ọdụm na-enweghị nne na nna a zụlitere n’ebe e wegara ya ma mesịa tọhapụ ya. E mewokwa ọdụm ajọ anụmanụ na-eri mmadụ n’akụkọ dị iche iche—ndị bụtụ akụkọ ifo, bụrụtụkwa eziokwu. Ka a sịkwa ihe mere ọdụm ji nọgide na-abụ ihe e kere eke na-akpali mmasị ma na-adọrọ adọrọ!

Ọdụm pụrụ ịdị oké njọ ma, mgbe ụfọdụ, dị nwayọọ ma na-egwuri egwu dị ka ụmụ nwamba. Ha na-eji nwayọọ ebe ubé dị ka nwamba ma afọ ju ha ma ha pụrụ ịgbọ oké ụja a pụrụ ịnọ na kilomita 8 nụ. Mgbe ụfọdụ ha na-eyi ka ha dị umengwụ ma na-ero ụra, ma ha nwere ikike nke ịgba ọsọ dị ịtụnanya. Mmadụ ajawo ọdụm mma n’ihi obi ike ya, a na-asịkwa na onye nwere obi ike nwere obi ọdụm.

Simbaa—Nwamba nke Nwere Omume Enyi

Ọdụm so n’ụdị nwamba ndị kasị enwe omume enyi. Ha na-eto n’otu ezinụlọ buru ibu a na-akpọ ìgwè ọdụm, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha pụrụ ịbụ site nanị n’ọdụm ole na ole ruo ihe karịrị 30 n’ọnụ ọgụgụ. Ìgwè ọdụm na-agụnye otu ìgwè nke nne ọdụm ndị pụrụ ịbụ ụmụnne. Ha na-ebikọ, na-achụkọ nta, ma na-amụkọ ụmụ. Nkekọ a chiri anya, nke pụrụ ịdịru ogologo ndụ ha nile, na-atọ ntọala nke ezinụlọ ọdụm ma na-eme ka ọ dịgide ndụ.

Ìgwè ọdụm nke ọ bụla na-enwe otu ọdụm nke oké ma ọ bụ karịa tozuru etozu na-agagharị ma jiri ísìsì na-arịba ókèala nke ìgwè ọdụm ahụ ama. Anụ ọhịa ndị a dị ebube pụrụ ịdị ihe karịrị mita atọ n’ogologo site n’ọnụ ọnụ imi ha na-eji oji ruo n’ọnụ ọnụ ajị ọdụ ha, ha pụkwara ịdị ihe karịrị kilogram 225 n’arọ. Ọ bụ ezie na ndị nke oké na-achị ìgwè ọdụm, ọ bụ ndị nke nne na-edu ndú. Ọ bụ ndị nke nne na-ebidokarị ihe omume, dị ka ịbanye na ndo ma ọ bụ ịmalite ịchụ nta.

Nne ọdụm na-amụkarị nwa kwa afọ abụọ. Mgbe a mụrụ ụmụ ọdụm, ha adịghị enwe ike ọ bụla iji mee ihe. Ịzụlite nwa ọdụm bụ ọrụ a na-agbakọta aka arụ, ndị nke nne nile ga-echebekwa ma zụọ ndị obere nọ n’ìgwè ọdụm ahụ. Ụmụ ọdụm na-eto ngwa ngwa; mgbe ha na-erule ọnwa abụọ, ha agbawala ọsọ ma na-egwuri egwu. N’ịtụrụgharị n’etiti onwe ha dị ka ụmụ nwamba, ha na-agba mgba, na-amagoro n’elu ndị ha na ha na-egwuri egwu, ma na-awụgharị n’ime ahịhịa toro ogo. Ihe ọ bụla na-emegharị ahụ na-adọrọ mmasị ha, ha ga-awụli elu ijide urukurubụba, na-achụ ahụhụ, ma na-ejiri osisi na osisi vine na-egwuri egwu. Ihe kasị adọrọ adọrọ bụ mmegharị nke ọdụ nne ha, nke ọ na-akpachara anya na-efegharị, na-adọta ha igwuri egwu.

Ìgwè ọdụm nke ọ bụla na-ebi n’ókèala a kpaara ókè nke ọma nke pụrụ ịgbasaru ọtụtụ hekta. Ọdụm na-enwe mmasị ibi n’ebe ndị dị elu nwere mmiri hiri nne nakwa ndo pụọ n’oké anyanwụ ehihie. N’ebe ahụ ha na-ebi n’etiti enyí, anịgọ, atụ, na anụmanụ ndị ọzọ nke ọzara ahụ. Ụzọ ndụ ọdụm kewara gaa n’ogologo awa nke ihi ụra na ntakịrị oge nke ịchụ nta na ịgbà onwe ha. Eziokwu dị na ya bụ, a pụrụ ịhụ ọdụm ka ọ na-ezu ike, na-ehi ụra, ma ọ bụ nọdụ nnọọ ala ruo awa 20 n’ụbọchị. Ha na-eyi anụ ndị dị nwayọọ na anụ ụlọ mgbe ha nọ n’ezigbo ụra. Otú ọ dị, ka a ghara ịghọgbu gị—ọdụm bụ otu n’ime anụ ọhịa ndị kasị anụ ọhịa nile njọ!

Ọchụ Nta

Mgbe chi ehihie gamiri, ala ahịhịa ahụ anyanwụ chakpọrọ malitere ịjụ oyi. Nne ọdụm atọ nke ìgwè ọdụm ahụ anyị nọ na-ekiri malitere iteta n’ụra ehihie ha. N’ịbụ ndị agụụ chụlitere, ụmụ nwamba ndị ahụ malitere ịgagharị, na-esigharị imi ka ha na-elepụ anya n’elu ala ahịhịa ahụ na-acha odo odo. Ọ bụ oge ele ji agafe n’uju, ọtụtụ iri puku ele ndị a jọrọ njọ na-ata nri n’udo n’ebe ndịda site n’ebe anyị nọ. Ugbu a ụmụ nwamba atọ ndị ahụ gawara n’ebe ahụ. N’ịgbasa ihu ha, ha jiri nwayọọ gafere ala ahụ na-adịghị larịị. Ọ fọrọ nke nta ka a ghara ịhụ ụmụ nwamba ndị ahụ na-achatụ nchara nchara n’ime ahịhịa ahụ dị ogologo, o kwekwara ha mee iru mita 30 site n’ebe ìgwè anụmanụ ahụ na-amaghị ihe na-aganụ nọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka ụmụ nwamba ndị ahụ kpebiri ime ihe. N’iji ọsọ àmụ̀mà, ha gbabara n’etiti ìgwè ele ahụ ụjọ bịakwasịrị. Ìgwè anụmanụ ahụ gbasasịrị n’eleghị anya n’azụ, anụ ọhịa ndị ahụ anya na-acha ọkụ agbaa ọsọ ndụ. Ọtụtụ narị nzọụkwụ gweriri ala, na-abọli uzuzu. Ka uzuzu ahụ kupusịrị, anyị hụrụ nne ọdụm atọ ahụ ka ha guzo nanị ha, na-ekusi ume ike. Ha ejideghị ihe ha na-achụ. Ikekwe ohere ịchụ nta ọzọ ga-abụ n’abalị, ikekwe ọ gaghị abụ. N’agbanyeghị otú ha dịruru na gara gara na n’ime ngwa ngwa, ọdụm na-enwe ihe ịga nke ọma nanị pasent 30 nke oge ha na-achụ nta. N’ihi ya, agụụ bụ otu n’ime ihe ize ndụ kasịnụ ọdụm na-eche ihu.

Ume ọdụm tozuru etozu dị ịrịba ama. N’ịchụ nta n’ìgwè, a marawo ha maka ịdọtu ma gbuo anụmanụ ndị dị ihe karịrị kilogram 1,300 n’arọ. Mgbe ha malitere ịchụ ihe ọsọ, ọdụm pụrụ ịgbaru ihe ruru kilomita 59 n’otu awa, ma ha apụghị ịnọgide n’ọsọ ahụ ruo ogologo oge. N’ihi nke a, ha na-eji usoro iji nwayọọ na nchechi eme ihe iji nweta nri ha. Nne ọdụm na-ahụ maka pasent 90 nke ịchụ nta ha, ma ọ bụ ndị nke oké ka ibu na-enwetakarị òkè kasị ibu ma e bido iri nri. Mgbe anụ oriri dị ụkọ, agụụ na-agụsi ọdụm ike mgbe ụfọdụ nke na ha na-egbochi ụmụ ha ikere òkè n’anụ ha gbutere.

Ihe A Na-achụ Nta Ya

Ogologo oge gara aga ọdụm dị ebube wagharịrị na kọntinent Africa dum na akụkụ ụfọdụ nke Esia, Europe, India, na Palestine. N’ịbụ ọchụ nta, ya na mmadụ na-ama aka. N’iyi anụ ụlọ egwu ma na-emerụ mmadụ ahụ, ọdụm ghọrọ anụ ọhịa a ga-agbagbu ozugbo a hụrụ ya. Ọnụ ọgụgụ mmadụ ji ike na-amụba ebelatawo ebe obibi ọdụm nke ukwuu. E wezụga Africa, e nwere nanị narị ọdụm ole na ole ka dị ndụ n’ọhịa taa. Ugbu a ọ bụ nanị n’ime ókèala ndị a na-echebe echebe na n’ogige anụ ọhịa ka ọdụm na-anọghị n’ihe ize ndụ n’aka mmadụ.

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, e nwere mgbanwe ndị na-echere anụ ọhịa a dị ebube. Bible na-akọwa oge na-abịa n’ihu mgbe ọdụm ga-esoro mmadụ biri n’udo. (Aịsaịa 11:6-9) N’oge na-adịghị anya Onye Okike anyị na-ahụ n’anya ga-eme ka nke a mee. N’oge ahụ nwamba dị ebube, nwere ọzà nke Africa ga-esoro ihe ọzọ nile e kere eke biri n’ịdị n’otu na n’udo.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Simba bụ “ọdụm” n’asụsụ Swahili.

[Igbe dị na peeji nke 15]

Mgbe Ọdụm GBỌRỌ ỤJA

A MAARA ọdụm maka ikike pụrụ iche ha nwere ịgbọ ụja na-ada ụda nke a pụrụ ịnọ ọtụtụ kilomita nụ. E lewo ụja ọdụm anya dị ka otu n’ime “ụda ndị na-abụghị ndị aka mere kasị akpali akpali.” Ọdụm na-agbọkarị ụja n’abalị na n’isi ụtụtụ. Ma ọdụm nke oké ma nke nne na-agbọ ụja, mgbe ụfọdụ ìgwè ọdụm dum na-ewelikwa olu ha n’otu oge iji gbọkọọ ụja.

Ndị ọkà mmụta sayensị na-amụ ihe banyere ọdụm na-atụ aro na ịgbọ ụja ha na-emezu ọtụtụ ihe. Ọdụm ndị nke oké na-agbọ ụja iji kpọsaa ókèala ha na, dị ka ngosipụta nke iwe, ịdọ ọdụm ndị ọzọ aka ná ntị bụ́ ndị pụrụ ịbata n’ókèala ha. N’ụzọ kwekọrọ ekwekọ, Bible zoro aka n’ebe ndị ọchịchị Asiria na Babilọn na-achọ okwu, dị mpako, nwekwara anya ukwu dị, dị ka “ọdụm” ndị megidere ma dọgbuo ndị Chineke n’ụzọ dị oké njọ.—Aịsaịa 5:29; Jeremaịa 50:17.

Ịgbọ ụja na-enyere ndị òtù nke ìgwè ọdụm aka ịchọta ibe ha mgbe ha nọ n’ebe dị anya ma ọ bụ mgbe ọchịchịrị kewara ha. Mgbe e gbutesịrị anụ oriri, ọgbụgbọ ụja a na-eme ka ndị òtù ndị ọzọ nke ìgwè ọdụm mata ebe nri ahụ dị. N’izo aka na njimara a, Bible na-ekwu, sị: “Nwa ọdụm, ọ̀ ga-eme ka olu ya si n’ebe obibi ya daa, ma ọ bụrụ na ọ nwụdeghị ihe?”—Emọs 3:4.

N’ụzọ na-eju anya, mgbe ọ na-achụ nta anụ ọhịa, ọdụm adịghị eji ịgbọ ụja eme ihe dị ka ụzọ ịchụ nta iji menye ihe ha na-achụ ụjọ. N’akwụkwọ ya bụ́ The Behavior Guide to African Mammals, Richard Estes na-ekwu na “e nweghị ihe na-egosi na ọdụm na-akpachara anya agbọ ụja iji chụba ihe ọ na-achụ n’ebe o zoro (dị ka ahụmahụ m si dị, ụdị ihe ndị ha na-achụ na-elegharakarị ịgbọ ụja ọdụm anya).”

N’ihi gịnịzi ka Bible ji na-ezo aka n’ebe Setan nọ dị ka ‘ọdụm na-agbọ ụja, na-achọ onye ọ ga-elomi’? (1 Pita 5:8) Ọ bụ ezie na ụmụ anụ ọhịa eyighị ka ha na-atụ ụja ọdụm ụjọ, ọ dịghị otú a n’ebe mmadụ na ìgwè anụ ụlọ ya dị. Ụda na-akpata ụjọ nke ụja ọdụm, nke na-adasi ike n’ọchịchịrị nke abalị, ga-emenye onye ọ bụla na-anọghị n’ime ụlọ mechiri emechi ụjọ. Ogologo oge gara aga, e kwuru n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ọdụm agbọwo ụja, ọ̀ bụ onye na-agaghị atụ egwu?”—Emọs 3:8.

Setan dị nkà n’iji egwu amaja ndị mmadụ ka ha wee doo onwe ha n’okpuru ya. Ọ bụ ihe obi ụtọ na ndị Chineke nwere onye nkwado siri ike. Site n’inwe okwukwe siri ike ná nkwado Jehova, ha pụrụ iguzogide ‘ọdụm a siri ike na-agbọ ụja’ n’ụzọ na-aga nke ọma. A na-agba ndị Kraịst ume ‘iguzogide ya, dị ike n’okwukwe ha.’—1 Pita 5:9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya