Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 5/1 p. 18-23
  • A Kpọọ Ndị Ozi nke Udo Chineke Ndị Obi Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Kpọọ Ndị Ozi nke Udo Chineke Ndị Obi Ụtọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmata Ndị Bụ Ndị Ozi Chineke Taa
  • Obi Ụtọ nke Ndị Ozi Chineke
  • Nzukọ Jehova Na-aga n’Ihu
  • Ime Ka A Mata Ụdị Onye Ozi Bụ nke Ọma Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezikiel—Akụkụ nke Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Otú Jehova Si Enyere Anyị Aka Ijezu Ozi Anyị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Jehova Na-enye Udo na Eziokwu n’Ụba
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 5/1 p. 18-23

A Kpọọ Ndị Ozi nke Udo Chineke Ndị Obi Ụtọ

“Ndị Jehova a gbapụtara agbapụta ga-alọtakwa, were iti mkpu ọṅụ bata n’ime Zaịọn; ọṅụ ebighị ebi ga-adịkwa n’isi ha.”—AỊSAỊA 35:10.

1. Gịnị dị ụwa oké mkpa?

TAA n’adịghị ka mgbe ọ bụla ọzọ, onye ozi nke ozi ọma dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa. E nwere mkpa dị ngwa ka mmadụ kwuo eziokwu banyere Chineke na nzube ya, maka onye àmà na-adịghị atụ egwu nke ga-adọ ndị ajọ omume aka ná ntị banyere mbibi na-abịanụ ma nyere ndị obi ha ziri ezi aka ịchọta udo Chineke.

2, 3. N’ihe banyere Israel, olee otú Jehova siri mezuo nkwa ya e dekọrọ n’Emọs 3:7?

2 N’oge Israel, Jehova kwere nkwa inye ụdị ndị ozi dị otú ahụ. Ná ngwụsị nke narị afọ nke itoolu T.O.A., Emọs onye amụma sịrị: “Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na O kpugheghị izu nzuzo Ya nye ndị ohu Ya, bụ́ ndị amụma Ya.” (Emọs 3:7) N’ọtụtụ narị afọ ndị sochiri mkpọsa a, Jehova rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ike. Dị ka ihe atụ, na 607 T.O.A., o nyere ndị ya ọ họpụtara ahọpụta ahụhụ n’ihi na ha na-enupụ isi ma bụrụ ndị ikpe ọbara mara. O nyekwara mba ndị nọ gburugburu ahụhụ bụ́ ndị ṅụrịrị ọṅụ n’ihi nhụjuanya nke Israel. (Jeremaịa, isi nke 46-49) Mgbe ahụ, na 539 T.O.A., Jehova mere ka ike ụwa dị ike bụ́ Babilọn daa, n’ihi ya kwa, na 537 T.O.A., ihe fọdụrụ nke Israel laghachiri n’ala nke aka ha iwughachi ụlọ nsọ ahụ.—2 Ihe Emere 36:22, 23.

3 Ndị a bụ ihe omume na-ama ala jijiji, n’ikwekọkwa n’okwu Emọs, Jehova buru ụzọ kpughee ha nye ndị amụma bụ́ ndị jere ozi dị ka ndị ozi, na-adọ Israel aka ná ntị banyere ihe gaje ịbịa. N’etiti narị afọ nke asatọ T.O.A., ọ kpọlitere Aịsaịa. N’etiti narị afọ nke asaa T.O.A., ọ kpọlitere Jeremaịa. Mgbe ahụ, ka ọ na-eru ngwụsị nke narị afọ ahụ, ọ kpọlitere Ezikiel. Ndị a na ndị amụma ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi gbara àmà dị ike banyere nzube Jehova.

Ịmata Ndị Bụ Ndị Ozi Chineke Taa

4. Gịnị na-egosi mkpa ihe a kpọrọ mmadụ nwere maka ndị ozi nke udo?

4 Gịnị banyere taa? Ọtụtụ ndị nọ n’ụwa na-anọ n’egwu maka ihe ọjọọ mgbe ha na-ahụ nretọ nke ọha mmadụ. Ọ na-egbu ndị hụrụ ezi omume n’anya mgbu n’obi mgbe ha na-ahụ ihu abụọ na oké ajọ omume nke Krisendọm. Dị ka Jehova buru n’amụma site n’ọnụ Ezikiel, ha “na-eze ume . . . na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile nke a na-eme n’etiti ya.” (Ezikiel 9:4) Otú ọ dị, ọtụtụ adịghị aghọta ihe bụ nzube Jehova. Ọ dị mkpa ịgwa ha.

5. Olee otú Jisọs siri gosi na a ga-enwe ndị ozi n’ụbọchị anyị?

5 Ọ̀ dị onye ọ bụla nke na-eji mmụọ atụghị egwu nke Aịsaịa, Jeremaịa, na Ezikiel ekwuwa okwu taa? Jisọs gosiri na ọ dị onye ga-eme otú ahụ. Mgbe ọ na-ebu amụma ihe ndị ga-eme n’ụbọchị anyị, ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Ònye na-emezu amụma ahụ taa, na-eje ozi dị ka onye ozi, onye nkwusa nke ozi ọma? Myirịta dị n’etiti ụbọchị anyị na oge Israel oge ochie ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ.

6. (a) Kọwaa ahụmahụ “Israel nke Chineke” nwere n’oge Agha Ụwa Mbụ. (b) Olee otú Ezikiel 11:17 si mezuo n’ahụ Israel oge ochie?

6 N’ụbọchị ndị jọgburu onwe ha nke Agha Ụwa Mbụ, ndị Jehova nke oge a, ihe fọdụrụ nke “Israel nke Chineke” e tere mmanụ, gara ná ndọta n’agha yiri nke ndị Israel gara na Babilọn. (Ndị Galetia 6:16) Ha nọrọ ná ndọta n’agha ime mmụọ na Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ njikọ ụwa nke okpukpe ụgha nile, nke Krisendọm bụ akụkụ ya bụ isi na nke a ga-ata ụta karịsịa. Otú o sina dị, okwu Jehova gwara Ezikiel gosiri na a gbahapụghị ha. Ọ sịrị: “M ga-achịkọpụta unu n’ime ndị nile dị iche iche, meekwa ka unu si n’ala nile ebe a chụsaworo unu zukọta, M ga-enyekwa unu ala Israel.” (Ezikiel 11:17) Iji mezuo nkwa ahụ o kwere Israel oge ochie, Jehova kpọlitere Saịrọs onye Peasia, onye kwaturu Ike Ụwa Babilọn ma meghee ụzọ maka ihe fọdụrụ nke Israel ịlaghachi n’ala ha. Ma gịnị banyere taa?

7. Ihe omume dị aṅaa na 1919 gosiri na Jisọs emewo ihe megide Babilọn Ukwu ahụ? Kọwaa.

7 Ná mmalite nke narị afọ a, e nwere ihe àmà dị ike na Saịrọs Ka Ukwuu nọ n’ọrụ. Ònye ka ọ bụ? Ọ bụghị onye ọzọ karịa Jisọs Kraịst, onye e chiri eze eri 1914 n’Alaeze eluigwe. Eze ukwu a gosiri ụmụnna ya e tere mmanụ nọ n’ụwa ihu ọma mgbe, n’afọ 1919, a tọhapụrụ ndị Kraịst e tere mmanụ site ná ndọrọ n’agha ime mmụọ, ha ewee laghachi ‘n’ala’ ha, bụ́ ógbè ime mmụọ ha. (Aịsaịa 66:8; Mkpughe 18:4) Ezikiel 11:17 si otú a nwee mmezu nke oge a. N’oge ochie o were ọdịda nke Babilọn iji meghee ụzọ maka ndị Israel ịlaghachi n’ala ha. Mweghachi nke Israel nke Chineke n’oge a bụ ihe àmà na Babilọn Ukwu ahụ adawo n’aka Saịrọs Ka Ukwuu. Mmụọ ozi nke abụọ nke Mkpughe isi nke 14 mara ọkwa ọdịda nke a, mgbe o tiri mkpu, sị: “Ọ dawo, ọ dawo, bụ́ Babilọn ukwu ahụ, nke meworo ka mba nile ṅụọ n’ime mmanya nke ọnụma nke ịkwa iko ya.” (Mkpughe 14:8) Lee mgbanwe ọ bụụrụ Babilọn Ukwu ahụ, karịsịa Krisendọm! Leekwa ngọzi ọ bụụrụ ezi ndị Kraịst!

8. Olee otú akwụkwọ Ezikiel si akọwa obi ụtọ nke ndị Chineke mgbe a tọhapụsịrị ha na 1919?

8 N’Ezikiel 11:18-20, anyị na-agụ nkọwa onye amụma ahụ nyere obi ụtọ ndị Chineke nwere mgbe mweghachi ha gasịrị. Mmezu mbụ nke okwu ya pụtara ime ka Israel dị ọcha n’ụbọchị Ezra na Nehemaịa. Mmezu nke oge a pụtara ihe yiri nke ahụ. Ka anyị hụ ka o si bụrụ otú ahụ. Jehova na-ekwu, sị: “Ha ga-abakwa [n’ala ha], ha ga-esikwa na ya wezụga ihe ya nile jọgburu onwe ha, na ihe arụ ya nile.” Dị nnọọ ka e buru n’amụma, malite na 1919, Jehova mere ka ndị ya dị ọcha ma nyeghachi ha ume ijere ya ozi. Ha malitere iwepụsị n’ógbè ime mmụọ ha omume na ozizi nile nke Babilọn bụ́ ndị merụrụ ha n’anya ya.

9. Ngọzi ndị dị aṅaa dị ịrịba ama ka Jehova nyere ndị ya, na-amalite na 1919?

9 Mgbe ahụ, dị ka amaokwu nke 19 na-egosi, Jehova na-aga n’ihu ịsị: “M ga-enyekwa ha otu obi, ọ bụkwa mmụọ ọhụrụ ka M ga-etinye n’ime unu; M ga-ewezụgakwa obi nkume n’anụ ahụ ha, nye ha obi anụ ahụ.” N’ikwekọ n’okwu ndị a, na 1919, Jehova mere ka ndị ohu ya e tere mmanụ dị n’otu, nye ha “otu obi,” dị ka a pụrụ ikwu ya, ka ha wee jeere ya ozi “n’otu ubu.” (Zefanaịa 3:9) Ọzọkwa, Jehova nyere ndị ya mmụọ nsọ iji nye ha ume n’ọrụ ịgba àmà na ịmịpụta n’ime ha mkpụrụ dị mma nke a kọwara ná Ndị Galetia 5:22, 23. Kama ịbụkwa obi yiri nkume, nke na-adịghị anabata ihe, Jehova nyere ha obi dị nro, na-ekwenye ekwenye, na-erube isi, obi nke ga-azaghachi ime uche ya.

10. Olee otú Jehova siworo gọzie ndị ya e weghachiri eweghachi malite na 1919 gaa n’ihu?

10 N’ihi gịnị ka o ji mee nke a? Jehova n’onwe ya na-akọwa. Anyị na-agụ n’Ezikiel 11:20: “Ka ha wee jegharịa n’ụkpụrụ m nile, debekwa ikpe m nile, mee ha: ha ga-abụkwara m otu ndị, Mụ onwe m ga-abụkwara ha Chineke.” Israel nke Chineke mụtara irubere iwu Jehova isi, kama ịgbaso echiche nke aka ha. Ha mụtara ime uche Chineke n’atụghị mmadụ egwu. Otú a, ha pụtara ìhè dị ka ndị dị iche n’ebe ndị Kraịst adịgboroja nke Krisendọm nọ. Ha bụ ndị Jehova. N’ihi ya, Jehova dị njikere iji ha mee ihe dị ka onye ozi ya, ‘ohu ya kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.’—Matiu 24:45-47.

Obi Ụtọ nke Ndị Ozi Chineke

11. Olee otú akwụkwọ Aịsaịa si akọwa obi ụtọ nke ndị Jehova?

11 Ị̀ pụrụ iji anya nke uche hụ obi ụtọ ha mgbe ha ghọtara ọnọdụ ihe ùgwù ha nwere? Dị ka otu ìgwè, ha na-ekwughachi okwu nke Aịsaịa 61:10: “Obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu n’ime Jehova, mkpụrụ obi m ga-etegharị egwú ọṅụ n’ime Chineke m.” E mezuru nkwa Aịsaịa 35:10 n’isi ha: “Ndị Jehova a gbapụtara agbapụta ga-alọtakwa, were iti mkpu ọṅụ bata n’ime Zaịọn; ọṅụ ebighị ebi ga-adịkwa n’isi ha: obi ụtọ na ọṅụ ka ha ga-abịarute, iru újú na ize ume ewee gbalaga.” Nke ahụ bụ ụdị obi ụtọ nke ndị ozi udo Chineke nke Jehova laa azụ na 1919 ka ha malitere ikwusara ihe nile a kpọrọ mmadụ ozi ọma. Site n’oge ahụ ruo n’ụbọchị taa, ha akwụsịbeghị ịrụ ọrụ a, obi ụtọ ha amụbawokwa. N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo, ebe a ga-akpọ ha ‘ụmụ Chineke.’” (Matiu 5:9, nkọwa ala ala peji, NW) Ihe ahụ fọdụrụ nke “ụmụ Chineke” e tere mmanụ ahụwo izi ezi nke mkpọsa ahụ malite na 1919 ruo taa.

12, 13. (a) Olee ndị sonyeere Israel nke Chineke n’ijere Jehova ozi, na gịnịkwa ka ha tinyemiri onwe ha? (b) Oké ọṅụ dị aṅaa ka ndị ohu Jehova e tere mmanụ nweworo?

12 Ka ọtụtụ afọ na-agafe, ọnụ ọgụgụ Israel nke Chineke mụbara ruo n’afọ ndị 1930 mgbe nchịkọta nke ihe fọdụrụ nke ndị e tere mmanụ fọrọ nke nta ka o zuo. Mmụba n’ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa ozi ọma ahụ ọ̀ kwụsịrị mgbe ahụ? Ọ dịghị ma ọlị. Oké ìgwè nke ndị Kraịst nwere olileanya elu ala amaliteworị ịpụta, ndị a na-esonyekwara ụmụnna ha e tere mmanụ n’ọrụ ime nkwusa ahụ. Jọn onyeozi hụrụ oké ìgwè mmadụ a n’ọhụụ, ụzọ o sikwa akọwa ha kwesịrị ịrịba ama: “Ha nọ n’ihu ocheeze Chineke; ha na-efekwa Ya ofufe ehihie na abalị.” (Mkpughe 7:15) Ee, oké ìgwè mmadụ ahụ banyere n’ọrụ na-ejere Chineke ozi. N’ihi ya, mgbe ọnụ ọgụgụ ndị e tere mmanụ malitere ịdalata, mgbe 1935 gasịrị, ndị a ji ikwesị ntụkwasị obi na-esonyere ha ejiriwo nkwali rịrị elu were ọrụ ịgba àmà ahụ gaa n’ihu.

13 N’ụzọ dị otú a e mezuru Aịsaịa 60:3, 4: “Mba nile ga-ejerukwa ìhè gị, ndị eze ejeruo onwu maramara nke ọwụwa gị. Welie anya gị abụọ lee gburugburu, hụ: ha nile achịkọtawo onwe ha, ha abịakwutewo gị: ụmụ gị ndị ikom ga-esi n’ebe dị anya bịa, a ga-ekukwa ụmụ gị ndị inyom n’akụkụ gị.” A kọwara obi ụtọ ihe omume ndị a wetaara Israel nke Chineke n’ụzọ mara mma n’Aịsaịa 60:5, ebe anyị na-agụ, sị: “Mgbe ahụ ị ga-ahụ wee nwuo enwuo, obi gị ga-atụkwa oké egwu, saa mbara; n’ihi na a ga-echigharịkwute gị ihe bara ụba nke oké osimiri, akụ̀ nke mba dị iche iche ga-abịakwute gị.”

Nzukọ Jehova Na-aga n’Ihu

14. (a) Ọhụụ dị aṅaa nke ihe ndị dị n’eluigwe ka Ezikiel hụrụ, iwu dịkwa aṅaa ka ọ natara? (b) Gịnị ka ndị Jehova n’oge a ghọtara, ibu ọrụ dịkwa aṅaa ka ha nwere?

14 Na 613 T.O.A., Ezikiel hụrụ ọhụụ nke nzukọ eluigwe Jehova, nke yiri ụgbọ ịnyịnya na-aga n’ihu. (Ezikiel 1:4-28) Ka e mesịrị, Jehova sịrị ya: “Nwa nke mmadụ, jee, baa n’ụlọ Israel, were okwu m nile gwa ha.” (Ezikiel 3:4) N’afọ a bụ 1997, anyị na-aghọta na nzukọ Jehova ka na-aga n’ihu n’akwụsịghị akwụsị iji mezuo nzube Chineke nile. N’ihi ya, anyị ka na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a kpaliri ịgwa ndị ọzọ banyere nzube ndị ahụ. N’ụbọchị ya, Ezikiel kwuru okwu ndị sitere kpọmkwem n’ike mmụọ nsọ Jehova. Taa, anyị na-ekwu okwu sitere n’Okwu Jehova, bụ́ Bible, e dere n’ike mmụọ nsọ. Leekwa aha ozi akwụkwọ ahụ nwere maka ihe a kpọrọ mmadụ! Ọ bụ ezie na ọtụtụ na-echegbu onwe ha banyere ọdịnihu, Bible na-egosi na ọnọdụ dị njọ nke ukwuu karị—n’otu oge ahụkwa, dị mma nke ukwuu—karịa ka ha na-eche.

15. N’ihi gịnị ka ọnọdụ ji dị njọ karịa ka ọtụtụ ndị na-eche taa?

15 Ihe ka njọ n’ihi na, dị ka anyị mụtara n’isiokwu ndị gara aga, a ga-ebibi Krisendọm na okpukpe ụgha ndị ọzọ nile n’oge na-adịghị anya, n’ụzọ zuru ezu dị ka e bibiri Jerusalem na 607 T.O.A. Ọzọkwa, a na-aga ikpochapụ usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị dum nke ụwa, bụ́ nke e sere onyinyo ya n’akwụkwọ Mkpughe dị ka anụ ọhịa nwere isi asaa na mpi iri, dị ka e kpochapụrụ ọtụtụ n’ime ndị agbata obi Jerusalem na-ekpere arụsị. (Mkpughe 13:1, 2; 19:19-21) N’ụbọchị Ezikiel Jehova kọwara n’ụzọ doro anya oké ụjọ nke mbibi Jerusalem na-eru nso kpalitere. Ma okwu ya ga-enwe ihe ka nnọọ ukwuu ọ pụtara mgbe ndị mmadụ ghọtara mbibi dị nso nke ụwa a. Jehova gwara Ezikiel, sị: “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, zee ume; ná mgbaji úkwù na n’ilu obi ka ị ga-eze ume n’anya ha. Ma ọ ga-eru, mgbe ha ga-asị gị, N’ihi gịnị ka gị onwe gị na-eze ume? na ị ga-asị, Ọ bụ n’ihi akụkọ, n’ihi na ọ na-abịa: obi nile ọ bụla ga-alọkwa mmiri, aka nile ga-akụda, ike ga-agwụ mmụọ mmadụ nile ọ bụla, ikpere ụkwụ nile ga-aghọ mmiri mmiri: lee, ọ na-abịa, o ruwokwa, ọ bụ ihe si n’ọnụ Onyenwe anyị Jehova pụta.” (Ezikiel 21:6, 7; Matiu 24:30) Ihe omume ndị na-akpali egwu dị nnọọ n’ihu. Nchegbu dị omimi anyị nwere maka ụmụ mmadụ ibe anyị na-akwali anyị ịkpọsa ịdọ aka ná ntị ahụ, ịkọ “akụkọ” nke iwe Jehova na-abịanụ.

16. Nye ndị dị umeala n’obi, n’ihi gịnị ka ọnọdụ ji dị mma karịa ka ọtụtụ ndị na-eche?

16 N’otu oge ahụ, nye ndị nwere obi eziokwu, ihe dị mma nke ukwuu karịa otú ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-eche. N’ụzọ dị aṅaa? N’ihi na Jisọs Kraịst anwụwo n’ihi mmehie anyị ma na-achị ugbu a dị ka Eze nke Alaeze Chineke. (1 Timoti 1:15; Mkpughe 11:15) Nsogbu ihe a kpọrọ mmadụ ndị yiri ka a pụghị ịgwọta ha ga-abụ ihe a ga-eji Alaeze eluigwe ahụ merie n’isi nso. Ọnwụ, ọrịa, àgwà arụrụala, agụụ, na mpụ ga-aghọ ihe gara aga, Alaeze Chineke ga-achịkwa paradaịs elu ala n’enweghị mgbochi. (Mkpughe 21:3, 4) Ihe a kpọrọ mmadụ ga-enwe udo Chineke—mmekọrịta udo n’ebe Jehova Chineke nọ na n’ebe ibe ha nọ.—Abụ Ọma 72:7.

17. Mmụba ndị dị aṅaa na-eweta ọṅụ n’obi nke ndị ozi nke udo Chineke?

17 N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ìgwè ndị dị umeala n’obi na-azaghachi n’ozi nke udo Chineke nke a. N’ịkpọtụ nanị ihe atụ ole na ole, n’afọ gara aga Ukraine nyere akụkọ nke mmụba dị 17 pasent ná ndị nkwusa. Mozambique nyere akụkọ nke mmụba dị 17 pasent, Lithuania mmụba dị 29 pasent. Russia nwere mmụba dị 31 pasent, ebe Albania nwere mmụba dị 52 pasent ná ndị nkwusa. Mmụba ndị a na-anọchi anya ọtụtụ puku nke ndị nwere obi eziokwu bụ ndị chọrọ inweta udo Chineke, ndị werewokwara nguzo ha maka ezi omume. Uto dị ngwa dị otú ahụ na-ewetara òtù ụmụnna ndị Kraịst dum ọṅụ.

18. Ma ndị mmadụ hà gere ntị ma ọ bụ na ha egeghị, gịnị ga-abụ àgwà anyị?

18 Ndị mmadụ hà na-azaghachi ngwa ngwa otú ahụ n’ókèala ebe i bi? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị so gị na-aṅụrị ọṅụ. Ma, n’ókèala ụfọdụ, ọ na-ewe ọtụtụ hour nke ịrụsi ọrụ ike tupu a chọta ọbụna otu onye nwere mmasị. Ndị na-eje ozi n’ókèala ndị dị otú ahụ hà na-adị umengwụ ma ọ bụ na-enwe obi nkoropụ? Ee e. Ndịàmà Jehova na-echeta okwu Chineke gwara Ezikiel mgbe O bu ụzọ nye onye amụma ahụ na-eto eto ọrụ ikwusara ndị Juu ibe ya, sị: “Ma ha onwe ha, ma ha ga-anụ, ma ha ga-aghara, (n’ihi na ụlọ nnupụisi ka ha bụ,) ha ga-amara na onye amụma anọwo n’etiti ha.” (Ezikiel 2:5) Dị ka Ezikiel, anyị nọgidere na-agwa ndị mmadụ banyere udo Chineke, ma hà ga-anụ ma ọ bụ na ha agaghị anụ. Ọ bụrụ na ha egee ntị, anyị na-enwe oké mkpali. Ọ bụrụ na ha agbakụta anyị azụ, mee anyị akaje, ọbụna kpagbuo anyị, anyị ga-anọgidesi ike. Anyị hụrụ Jehova n’anya, Bible na-ekwukwa, sị: “Ịhụnanya . . . na-anagide ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 13:4, 7) N’ihi na anyị ji ntachi obi eme nkwusa, ndị mmadụ na-amata ndị Ndịàmà Jehova bụ. Ha maara ozi anyị. Mgbe ọgwụgwụ bịara, ha ga-amara na Ndịàmà Jehova gbalịrị inyere ha aka inweta udo Chineke.

19. Dị ka ndị ohu nke ezi Chineke, oké ihe ùgwù dị aṅaa ka anyị na-ewere dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa?

19 È nwere ihe ùgwù karịrị ijere Jehova ozi? Ee e! Obi ụtọ anyị kasị ukwuu na-abịa site ná mmekọrịta anyị n’ebe Chineke nọ na ịmara na anyị na-eme uche ya. “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị ahụ bụ nke maara olu iti mkpu ahụ: Jehova, n’ìhè nke ihu Gị ka ha na-eje ije.” (Abụ Ọma 89:15) Ka anyị were ọṅụ nke ịbụrụ ihe a kpọrọ mmadụ ndị ozi nke udo Chineke dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Ka anyị jiri ịdị uchu na-eme òkè nke anyị n’ọrụ a ruo mgbe Jehova ga-asị na a rụzuwo ya.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Olee ndị bụ ndị ozi nke udo Chineke taa?

◻ Olee otú anyị si mara na Babilọn Ukwu ahụ dara na 1919?

◻ Gịnị bụ nchegbu bụ isi nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ?

◻ N’ihi gịnị ka ọdịnihu ji na-akụda mmụọ karịa ka ọtụtụ mmadụ taa na-eche?

◻ Nye ndị nwere obi ziri ezi, n’ihi gịnị ka ọdịnihu pụrụ iji dị mma karịa ka ha na-eche?

[Foto dị na peeji nke 21]

Mgbe ha na-ahụ nretọ nke ọha mmadụ, ọtụtụ ndị na-anọ n’egwu maka ihe ọjọọ ime

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị ozi nke udo Chineke bụ ndị kasị nwee obi ụtọ n’elu ụwa taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya