ISI NKE IRI NA ATỌ
“Kpọsaanụ n’Etiti Mba Dị Iche Iche”
Gịnị ka ị ga-eme ma ị nụ ka ọdụm na-ebigbọ?
1. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji jiri Jehova ịgwa onye amụma ya okwu tụnyere mbigbọ ọdụm?
Ị̀ NỤTỤLA ebe ọdụm na-ebigbọ? Mbigbọ ọdụm na-emenye ụjọ. A pụrụ ịnọ ebe dị ihe karịrị kilomita asatọ nụ ya. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị nụ ka ọdụm nọ ebe dị nso na-ebigbọ n’ime abalị? Ma eleghị anya, ị ga-eme ihe ozugbo. Emọs, bụ́ otu n’ime ndị amụma iri na abụọ ahụ anyị na-atụle ihe ha dere, ji ihe atụ a mee ihe: “Ọdụm ebigbọwo! Olee onye na-agaghị atụ egwu? Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ekwuwo okwu! Olee onye na-agaghị ebu amụma?” (Emọs 3:3-8) Ọ bụrụ na ị nụ ka Jehova n’onwe ya na-ekwu okwu, ọ̀ bụ na ị gaghị eme ihe dị ka Emọs mere? O mere ihe ozugbo ma buo amụma ihe a ga-eme ebo iri nke mba Izrel.
2. (a) Olee otú ị pụrụ isi ṅomie Emọs n’ịrụzu ọrụ ibu amụma ahụ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?
2 Ị pụrụ ikwu, sị, ‘Abụghịnụ m onye amụma!’ Ọ pụrụ ịdị gị ka i rughị eru ịbụ onye amụma n’ihi na e nyeghị gị ọzụzụ ịbụ ya. Ma, cheta Emọs. Mgbe Amazaya, bụ́ onye nchụàjà nke na-efe chi nwa ehi, gakwuuru Emọs, Emọs sịrị ya: “Abụghị m onye amụma, abụghịkwa m nwa onye amụma; kama abụ m onye na-azụ ìgwè anụ nakwa onye na-arụpusị mkpụrụ fig nke osisi sịkamọ.” (Emọs 7:14) Ọ bụ ezie na Emọs si n’ezinụlọ na-abaghị ọgaranya, ọ dị njikere ịrụ ọrụ e nyere ya dị ka onye amụma Jehova. Olee banyere gị? Ị̀ ma na ọ dị ọrụ e kenyere gị nke nwere otú o si yie ọrụ e nyere ndị amụma iri na abụọ ahụ? I ketawo ọrụ ikwusa ozi nke Chineke chọrọ ka e kwusaa taa nakwa izi ihe na ime ndị na-eso ụzọ. Olee otú i si ele ọrụ ahụ dị oké mkpa anya? Olee ozi a chọrọ ka i kwusaara mba dị iche iche? Ruo ókè há aṅaa ka ị na-atọ anya n’ala na-arụ ọrụ ahụ? Gịnị na-ekpebi ma ị̀ ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ọrụ gị? Ka anyị tụlee azịza ha.
‘ỤMỤ EHI BỤ́ MKPỤRỤ EGBUGBERE ỌNỤ GỊ’
3. Olee otú ị pụrụ isi soro rụọ ọrụ yiri nke ndị amụma ahụ bụ́ ndị anyị na-amụ ihe ha dere?
3 Ị̀ na-arụ ọrụ yiri ọrụ ndị amụma ahụ n’ezie? Ma eleghị anya, ị nụbeghị mbigbọ ọdụm ahụ, ebe ọ bụ na Jehova esibeghị n’ike mmụọ nsọ gwa gị okwu kpọmkwem. Otú ọ dị, i siwo n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl, nụ ozi ahụ e kwesịrị izisa ngwa ngwa banyere ụbọchị Jehova nke na-abịa. Dị ka anyị hụrụ n’Isi Mbụ n’akwụkwọ a, okwu bụ́ “onye amụma” na “amụma” nwere ihe dịgasị iche iche ha pụtara. Ọ bụ ezie na e nwere ike ị bụghị onye amụma otú Emọs ma ọ bụ ndị amụma ndị ọzọ e nwere n’oge ochie bụ, ị ka pụrụ ikwu banyere ọdịnihu. N’ụzọ dị aṅaa? Ị pụrụ ikwusa ozi amụma ndị ị mụrụ banyere ha n’Akwụkwọ Nsọ, tinyere ozi ndị amụma iri na abụọ ahụ ziri. Ugbu a bụ oge ime nke ahụ.
Bido ná mmalite narị afọ nke iri abụọ ruo n’oge anyị a, ndị Chineke anọwo ‘na-ebu amụma’
4. Olee otú amụma ahụ e dekọrọ na Joel 2:28-32 si na-emezu taa?
4 Si n’akụkụ ọzọ lee okwu ahụ anya. Jehova Chineke gwara Joel onye amụma banyere mgbe ndị niile dị iche iche ga-ebu amụma, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, sị: “Ọ ga-erukwa na mgbe e mesịrị, m ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla, ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma. Ndị agadi unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụụ.” (Joel 2:28-32) N’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 O.A., Pita onyeozi kwuru na akụkụ Akwụkwọ Nsọ a mezuru mgbe a wụsara ndị zukọrọ n’ọnụ ụlọ nke dị n’otu ụlọ elu dị na Jeruselem mmụọ nsọ, ha wee malite ikwusa ozi ọma banyere “ihe ndị dị ebube nke Chineke.” (Ọrụ 1:12-14; 2:1-4, 11, 14-21) Tụlezie banyere oge anyị a. Amụma Joel anọworị na-emezu n’ụzọ bụ́ isi kemgbe mmalite narị afọ nke iri abụọ. Ndị Kraịst e tere mmanụ—ndị ikom na ndị inyom, ndị kataworo ahụ́ na ndị na-akatabeghị ahụ́—malitere ‘ibu amụma,’ ya bụ, ikwusa “ihe ndị dị ebube nke Chineke,” tinyere ozi ọma banyere Alaeze ahụ nke e guzobeworo n’eluigwe ugbu a.
5. (a) Olee ihe ùgwù anyị niile nwere? (b) Gịnị ka iji “ụmụ ehi bụ́ mkpụrụ egbugbere ọnụ [gị]” chụọ àjà pụtara, gịnịkwa ka ọ bụụrụ gị?
5 Ọ bụ ezie na e jighị mmụọ nsọ mụọ “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ ịbụ ụmụ Chineke, ha na-agwa ndị ahụ e tere mmanụ na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, sị: “Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16; Zekaraya 8:23) Ma ì nwere olileanya ị dị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, i nwere ihe ùgwù nke ịchụ “ụmụ ehi bụ́ mkpụrụ egbugbere ọnụ [gị]” dị ka àjà. (Hosia 14:2) Gịnị ka ihe ahụ e kwuru n’amụma Hosia pụtara? Ọkà mmụta Baịbụl, bụ́ C. F. Keil, kwuru, sị: “Nwa oké ehi . . . bụ anụ kasị mma e ji achụ àjà ekele.” Pọl onyeozi rụtụrụ aka na Hosia 14:2 mgbe o dere, sị: “Ka anyị . . . na-achụrụ Chineke àjà otuto mgbe niile, ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha ya n’ihu ọha.” (Ndị Hibru 13:15) Ee, okwu bụ́ “ụmụ ehi bụ́ mkpụrụ egbugbere ọnụ anyị” na-arụtụ aka n’ihe kasị mma na-esi n’ọnụ anyị apụta, nke bụ́ ihe ndị anyị na-ekwu iji too Jehova.
6. Gịnị mere anyị kwesịrị iji nyochaa otú àjà otuto anyị na-achụ dị?
6 Ị na-achụrụ Jehova àjà otuto mgbe i si n’ala ala obi gị na-ekpeku ya ekpere, mgbe i ji obi ekele na-ekwu okwu banyere ya ná nzukọ Ndị Kraịst, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-agwa ndị ọzọ okwu mgbe ị na-aga ozi ọma. Otú ọ dị, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ, sị, ‘Mgbe m na-ekere òkè n’ihe ndị ahụ, olee otú àjà otuto m na-achụ dị?’ Site n’ihe ị mụworo, o doro anya na ị na-asọ ndị nchụàjà nke oge Malakaị oyi, bụ́ ndị na-eweta anụ ndị nwere nkwarụ n’ebe ịchụàjà Chineke n’asọghị anya. Jehova si n’ọnụ Malakaị gwasie ha ike na anụ ndị ha ji na-achụ àjà adịghị mma, ebe ọ bụ na ha echeghị na ha na-elelị tebụl Jehova. (Malakaị 1:8) N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị inyocha àjà anyị na-achụ iji jide n’aka na ọ bụ nke kasị mma nakwa na o nweghị nkwarụ ọ bụla.
OZI A GA-AKPỌSA
7. Mgbe anyị na-ezisa ozi anyị nke nwere akụkụ abụọ, olee akụkụ nke chọrọ obi ike?
7 Ịchụ “ụmụ ehi bụ́ mkpụrụ egbugbere ọnụ anyị” n’àjà mgbe anyị nọ n’ozi chọrọ obi ike, ka ọ̀ bụ na ọ chọghị? Ọ bụ n’ihi na ozi anyị na-ezisara ndị mmadụ nwere akụkụ abụọ, otu n’ime ha kwa adịghị atọ ndị mmadụ ụtọ. Joel onye amụma gwara ndị Chineke, sị: “Kpọsaanụ n’etiti mba dị iche iche, sị, ‘Jikerenụ agha! Kpalienụ ndị dị ike! Ka ha bịa nso! Ka ha gbagote, ya bụ, ndị ikom niile na-aga agha!’” (Joel 3:9) A bịa n’otu o si metụta oge anyị, lee otú o si na-ama mba niile aka! Jehova na-ekwu na ya ga-ebuso ndị na-enupụrụ ya isi agha n’ezi omume. Ọ bụ ezie na Jehova na-agwa ndị ya ka ha ‘kpụgharịa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi,’ ọ gwara mba ndị na-emegide ha ka ha ‘kpụgharịa mma ogè ha ka ha bụrụ mma agha, kpụgharịakwa mma ha ji akwa osisi ka ha bụrụ ube.’ (Maịka 4:3; Joel 3:10) Ee, ndị iro Chineke kwesịrị ijikere ka ha na Onye kere eluigwe na ụwa lụọ agha. Nke ahụ abụghị ozi na-atọ ndị mmadụ ụtọ nke anyị ga-ezisa.
8. N’ihi gịnị ka e ji were “ndị fọdụrụ n’ụlọ Jekọb” tụnyere ọdụm?
8 N’ozi ahụ Maịka onye amụma ziri, e ji ndị na-achụ ‘ụmụ ehi bụ́ mkpụrụ egbugbere ọnụ ha’ n’àjà tụnyere ọdụm. O dere, sị: “Ndị fọdụrụ n’ụlọ Jekọb ga-adị n’etiti mba dị iche iche . . . dị ka ọdụm nke nọ n’etiti anụ ọhịa, ha ga-adịkwa ka nwa ọdụm tojuru etoju nke nọ n’etiti ìgwè atụrụ, nke ọ na-abụ ọ na-agafe, ya ana-azọpịa ma na-adọri anụ; e nweghịkwa onye nnapụta ọ bụla.” (Maịka 5:8) N’ihi gịnị ka ihe atụ a ji daba adaba? N’oge anyị, ndị Chineke aghaghị igosi obi ike yiri nke ọdụm mgbe ha na-ezi mba niile ozi ịdọ aka ná ntị ahụ. Ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ na-ebutekwa ụzọ.a
Ị̀ na-ekwusa banyere ụbọchị Jehova n’atụghị egwu?
9. (a) Olee mgbe ọ ga-adị mkpa ka i nwee obi ike yiri nke ọdụm? (b) Olee otú ị pụrụ isi nweta obi ike mgbe a na-emegide gị ma ọ bụ mgbe ndị mmadụ na-egosighị mmasị n’ozi gị?
9 Ị̀ na-enwe obi ike yiri nke ọdụm mgbe ị na-ekwusa ịdọ aka ná ntị nke dị n’ozi ahụ? Ị pụrụ ịchọ ụdị obi ike ahụ, ọ bụghị naanị mgbe ị nọ n’ihu ndị isi, kamakwa mgbe ị na-agwa ụmụ akwụkwọ ibe gị okwu n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ndị ọrụ ibe gị ma ọ bụ mgbe ị na-agwa ndị ikwu gị na-ekweghị ekwe okwu. (Maịka 7:5-7; Matiu 10:17-21) Olee otú ị pụrụ isi nweta obi ike mgbe a na-emegide gị ma ọ bụ mgbe ndị mmadụ na-egosighị mmasị n’ozi gị? Gee ntị n’otú Maịka si nwee ike ịrụzu nnukwu ọrụ nke bụ́ ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere mbibi nke Sameria na Jeruselem: “Mmụọ Jehova emewo ka m jupụta n’ike, jupụtakwa n’ikpe ziri ezi na ịdị ike, ka m wee gwa Jekọb nnupụisi ya, gwakwa Izrel mmehie ya.” (Maịka 1:1, 6; 3:8) Gị onwe gị kwa pụrụ ‘ijupụta n’ike’ n’ihi na gị onwe gị pụrụ inweta n’ụzọ dị ukwuu mmụọ Chineke nke na-enye ike. (Zekaraya 4:6) Site n’iji ekpere dabere n’ebe Chineke nọ, ị ga-enwe ike ikwusa okwu ahụ nke pụrụ ime ka ntị zụọ wuruwuru.—2 Ndị Eze 21:10-15.
10. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Zefanaya n’ikwusa ozi banyere “ụbọchị Jehova”?
10 I kwesịrị inwe obi ike, ma i kwesịkwara ịdị akọ mgbe ị na-ezi ndị mmadụ ozi ịdọ aka ná ntị ahụ. Anyị kwesịrị ịdị “na-emeso mmadụ niile n’ụzọ dị nwayọọ” ọbụna mgbe ozi ahụ bụ maka “ụbọchị Jehova” nke na-abịanụ. (2 Timoti 2:24; Joel 2:1, 11; Zefanaya 1:14) Ọzọkwa, anyị pụrụ ịmụta ihe n’aka ndị amụma iri na abụọ ahụ. Ha kwusara ozi amamikpe si n’aka Jehova n’atụghị egwu. N’agbanyeghị nke ahụ, ha chebaara ndị na-ege ha ntị echiche. Dị ka ihe atụ, Zefanaya onye amụma ezoghị ọnụ mgbe ọ na-agwa ndị isi (ma ọ bụ ndị a ma ama) nke oge ya, bụ́ ndị kpọrọ ekwo nkụ, okwu. Ma Eze Josaya nke kwesịrị ntụkwasị obi esoghị ná ndị ọ katọrọ. (Zefanaya 1:8) Mgbe anyị na-ekwusa ozi ịdọ aka ná ntị ahụ, ànyị pụrụ inyere ndị mmadụ aka site n’ile ha anya dị ka ndị pụrụ ịbụ atụrụ, ọ bụghị ile ha anya n’ụzọ na-adịghị mma?—Matiu 25:32-34.
11. (a) Gịnị bụ akụkụ nke abụọ nke ozi nwere akụkụ abụọ nke anyị na-ekwusa? (b) Olee otú ị pụrụ isi ṅomie ndị amụma iri na abụọ ahụ mgbe ị na-ekwusa banyere ụbọchị Jehova?
11 Gịnị bụ akụkụ nke ọzọ nke ozi ahụ nwere akụkụ abụọ nke anyị na-ekwusa? E mere ka akụkụ ahụ pụta ìhè na Maịka isi ise. “Ndị fọdụrụ n’ụlọ Jekọb ga-adị ka igirigi nke si n’ebe Jehova nọ n’etiti ọtụtụ ndị, dị ka mmiri na-ezosi ike n’elu ahịhịa, bụ́ nke na-adịghị adabere n’ebe mmadụ nọ, nke na-adịghịkwa echere ụmụ mmadụ.” (Maịka 4:1; 5:7) N’ihi ozi ọma ahụ ha na-ezi “ọtụtụ ndị” taa, “ndị fọdụrụ” n’ụlọ Jekọb, ma ọ bụ Izrel, ime mmụọ, na ndị ibe ha dị ka “igirigi nke si n’ebe Jehova nọ” nke na-enye ume. Ha dịkwa ka “mmiri na-ezosi ike n’elu ahịhịa.” Ebe ọ bụ na ihe ndị amụma ahụ kwusara abụghị naanị banyere mbibi, kamakwa, banyere ime ka ihe niile dị otú ha dị na mbụ, anyị kwesịrị ịmụta ọtụtụ ihe n’akwụkwọ iri na abụọ ikpeazụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru banyere akụkụ nke abụọ nke ozi anyị na-ekwusa. N’ozi gị, ị̀ na-eme ka akụkụ na-agba ume nke ozi banyere ụbọchị Jehova pụta ìhè?
OLEE OTÚ I SI EKWUSA OZI A?
12, 13. (a) Gịnị ka ojiji e ji ndị Chineke tụnyere ụmụ ahụhụ pụtara? (b) Olee otú obi dị gị banyere ihe ị gụtara na Joel 2:7, 8?
12 Oleezi otú i si ekwusa ozi a nwere akụkụ abụọ? Joel onye amụma ji ọrụ ndị nke Chineke na-arụ tụnyere ihe otiti dị iche iche nke e ji ụmụ ahụhụ tie, tinyere igurube. (Joel 1:4) Ma, olee ihe mere anyị ji lechaa ihe anyị ga-eji tụnyere ndị Jehova, ya abụrụ ìgwè ụmụ ahụhụ? Ọ bụ n’ihi na, dị ka e kwuru na Joel 2:11, Chineke kpọrọ ụmụ ahụhụ ndị a “ụsụụ ndị agha ya.” (E jikwa ndị Chineke tụnyere igurube n’akwụkwọ Mkpughe. Lee Mkpughe 9:3, 4.) Joel kọwara ọrụ ụmụ ahụhụ a na-arụ dị ka ọkụ na-erepịa ihe, ha mekwara ka ala yiri “ogige Iden” nke ha gafere ghọọ “ala ịkpa nke tọgbọrọ n’efu.” (Joel 2:2, 3) Olee otú ị pụrụ isi gosi na ị ma ihe amụma Joel pụtara?
13 Cheedị echiche otú ụmụ obere ahụhụ ndị a si arụzu ọrụ ha nke ọma. Joel kọwara ya, sị: “Ha na-agba ọsọ dị ka ndị dị ike. Ha na-arịgo mgbidi dị ka ndị agha. Ha na-agakwa, onye ọ bụla n’ụzọ nke ya, ha adịghị ahapụ ụzọ ha. Ha adịghịkwa enupụ ibe ha. Ha na-aga dị ka dimkpa nke na-aga ebe ọ na-aga n’eleghị anya n’azụ; ọ bụrụgodị na akụ́ ụta atụta ụfọdụ, ndị nke ọzọ adịghị akwụsị ịga ebe ha na-aga.” (Joel 2:7, 8) Ọ dịghị mmegide yiri “mgbidi” nke pụrụ igbochi ha na mbibi ha na-akpata. “Ọ bụrụgodị na akụ́ ụta atụta ụfọdụ,” dị ka ọ tụtara ụfọdụ Ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe, bụ́ ndị ndị iro na-emegide ha gburu, ndị ọzọ na-aga n’ihu n’ọrụ ahụ, na-arụzu ọrụ Jehova nyere ha. Ì kpebisiwo ike ịnọgide na-arụ ọrụ ikwusa banyere ụbọchị Jehova ruo mgbe Chineke kpebiri na a rụzuwo ya? Ị pụrụ ọbụna ịdị na-arụ ọrụ ahụ n’ọnọdụ Ndị Kraịst ụfọdụ kwesịrị ntụkwasị obi, ndị nwụworo anwụ, nọrọ.
Ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ozi gị n’agbanyeghị ihe ndị mmadụ na-eme
14. Olee ụzọ ị pụrụ isi kere òkè n’ịrụzu ọrụ nkwusa ahụ nke ọma?
14 Isi ihe a na-ekwu bụ ịrụzu ya nke ọma. Olee otú ị pụrụ isi kere òkè n’ịrụzu ọrụ nkwusa ahụ nke ọma dị ka a kọwara n’amụma Joel? Ọ bụ site n’ikere òkè n’ozi ụlọ n’ụlọ nakwa ịgaghachi kụziere ndị gosiri mmasị ihe. Ụzọ ọzọkwa bụ ịgaghachi kpọtụrụ ndị na-anọbughị n’ụlọ. N’ụzọ dị otú a, ị na-egosi na ị ghọtara ihe onye amụma a kọwara. Mgbe ị na-agbara ndị mmadụ àmà n’okporo ámá, ị pụrụ izute ndị ị na-agaraghị enweta n’ụlọ. Ụzọ ọzọ bụ: Ị pụrụ inyere ndị si mba ndị ọzọ kwabata n’ógbè gị aka.b Ị̀ dị ngwa ịchọpụta ohere ndị dị otú ahụ wee na-ekere òkè n’ịrụzu ọrụ nkwusa ahụ nke ọma taa?
GỊNỊ GA-EME KA I NWEE IHE ỊGA NKE ỌMA?
15. Olee ihe pụrụ iche banyere ihe ndị mmadụ mere n’ihi ozi ndị amụma iri na abụọ ahụ kwusara?
15 Olee ihe ndị mmadụ na-eme mgbe e ziri ha ozi banyere ụbọchị dị oké egwu nke Jehova? O kwesịghị iju gị anya ma ọ bụrụ na ndị mmadụ emegide gị ma ọ bụ ghara igosi mmasị. Otú ahụ ka e mere ọtụtụ n’ime ndị amụma Chineke, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha nwere ozi ịdọ aka ná ntị siri ike ha ga-ezi. (Jeremaya 1:17-19; 7:27; 29:19) N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ n’ime ndị amụma ahụ rụpụtara ihe ndị dị mma! Ọ dịkarịa ala mmadụ ise n’ime ha—Jona, Maịka, Zefanaya, Hagaị, na Zekaraya—kpaliri ụfọdụ ndị ichegharị ná mmehie ndị ha mere n’oge gara aga ma gbanwee omume ha.
16. Gịnị si ná mgbalị Maịka tinyere dị ka onye amụma pụta?
16 O yiri ka ọ̀ bụ ọrụ Zefanaya rụrụ dị ka onye amụma kpaliri Eze Josaya ime ihe iji hụ na a maliteghachiri ofufe dị ọcha. Maịka kwusaara ndị isi Juda ozi amamikpe n’atụghị egwu. Eze Hezekaya mekwara ihe Maịka kwuru. (Maịka 3:1-3) Ọ dị mma ịmara na ụfọdụ ndị okenye ndị nọ n’oge Jeremaya kwuru na ihe Hezekaya mere bụ ezi ihe nlereanya, mgbe ha kwuru na eze ahụ ‘tụrụ egwu Jehova wee mee ka obi Jehova jụrụ.’ (Jeremaya 26:18, 19; 2 Ndị Eze 18:1-4) N’oge Hezekaya na-achị, ndị Juda na ndị si n’alaeze ebe ugwu, bụ́ ndị dị njikere isonye, mere Ememme Ngabiga na Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko. Ha gbatịrị ememme ahụ ọbụna ruo otu izu ọzọ. Gịnị ka nlaghachi ha laghachiri n’ezi ofufe rụpụtara? “E wee ṅụrịa oké ọṅụ na Jeruselem.” (2 Ihe E Mere 30:23-26) Maịka malitere izi mba ahụ si n’ezi ofufe dapụ, nke Eze Ehaz na-achị, ozi mbibi nke Chineke ziri ya. Ma, onye amụma ahụ hụrụ ihe ọma si ná mgbalị o tinyere pụta mgbe nwa Ehaz, bụ́ Hezekaya, ṅara ntị.
17. Gịnị ka Hagaị na Zekaraya rụrụ?
17 Cheekwa echiche banyere ndị amụma bụ́ Hagaị na Zekaraya. Ha jere ozi dị ka ndị amụma maka ndị Juu ahụ si mba ọzọ lọta, bụ́ ndị nwere omume ọ̀ gbasara m, ndị na-echekwa naanị banyere onwe ha. (Hagaị 1:1, 2; Zekaraya 1:1-3) Mgbe ndị amụma abụọ ahụ malitere ije ozi ha, afọ iri na isii agafeela kemgbe a tọsịrị ntọala ụlọ nsọ ahụ. Ndị mmadụ nọ “na-agbagharị, onye ọ bụla n’ihi ụlọ nke ya,” ma ụlọ Jehova bụ “mkpọmkpọ ebe.” Hagaị gwara ndị Juu, sị: “‘Dịkwanụ ike, unu niile bụ́ ndị bi n’ala a,’ ka Jehova kwuru, ‘rụọkwanụ ọrụ.’” Gịnị meziri? Jehova wee “kpalie mmụọ” Gọvanọ Zerọbabel, Jọshụa bụ́ nnukwu onye nchụàjà, na “ndị niile fọdụrụ n’ime ndị Izrel.” N’ihi ya, ha rụchara ọrụ ha na-arụ n’ụlọ nsọ ahụ.—Hagaị 1:9, 12, 14; 2:4.
18, 19. (a) Olee otú ndị nọ n’ala ụfọdụ si anabata nkwusa a na-ekwusa banyere ụbọchị Jehova? (b) Olee ihe ị ga-eme banyere mkpa e nwere maka ikwusara mmadụ niile ozi ịdọ aka ná ntị ahụ?
18 Ihe ka ọtụtụ ná ndị amụma iri na abụọ ahụ ziri mba ahụ raara onwe ya nye Jehova na mbụ ozi. Ọ pụrụ ịbụ na ndị anyị na-ekwusara ozi ọma bụ ndị ọ na-adịghị mgbe ha maara onye bụ́ ezi Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị pụrụ ịmụta ihe n’ihe si n’ọrụ ndị amụma ahụ rụrụ pụta. Taakwa, n’ọtụtụ ókèala, ndị mmadụ na-aṅa ntị n’ozi ahụ dị oké mkpa anyị na-ezisa banyere ụbọchị Jehova. Anyị na-ahụ ihe ndị ọ na-arụpụta, bụ́ ndị kwekọrọ n’ihe Zekaraya buru n’amụma, sị: “Ọtụtụ mba ga-esoro Jehova n’ụbọchị ahụ, ha ga-aghọkwa ndị m; m ga-ebikwa n’ime gị.” (Zekaraya 2:11) Ugbu a, “ọtụtụ mba,” n’ụzọ nkịtị, na-aṅa ntị n’ozi ndị Chineke na-ezisa. (Mkpughe 7:9) Zekaraya buru amụma, sị: “Ọtụtụ ndị nakwa mba ndị dị ike ga-abịa chọọ Jehova nke ụsụụ ndị agha n’ime Jeruselem, meekwa ka obi Jehova jụrụ.” A kọwara ha dị ka “ndị ikom iri ndị si n’asụsụ niile nke mba dị iche iche,” bụ́ ndị ga-ejide uwe mwụda nke onye Izrel ime mmụọ, sị: “Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”—Zekaraya 8:20-23.
19 Buru n’obi na e kwuru okwu banyere “asụsụ niile nke mba dị iche iche.” A na-asụgharị Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ. Ndịàmà Jehova na-enyekwa ndị ozi ọzụzụ ka ha gaa na-ezi ndị si “n’asụsụ niile nke mba dị iche iche” ihe. (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8) Ma eleghị anya, ị mụtawo asụsụ ọzọ iji nyere ndị bi n’ógbè unu aka, bụ́ ndị na-asụ asụsụ ahụ. Ọtụtụ ndị dịkwa njikere ịmụ otu asụsụ ọhụrụ ma ọ bụ abụọ nakwa ịkwaga ná mba ebe ọtụtụ ndị na-anabata ozi ọma ahụ ngwa ngwa. Ị̀ ga-enwe ike ịkwaga n’ebe ndị dị otú ahụ a na-arụpụta ihe ma si otú ahụ ‘na-akpọsa ya n’etiti mba dị iche iche’? Kpee ekpere ma chebara nke ahụ echiche. Ọ bụrụ na i nwere ụmụ na-etolite etolite, gị na ezinụlọ gị kwurịta ya ugboro ugboro ma ùnu ga-enwe ike ịkwaga ebe ọzọ, setịpụrụ ya ụmụ gị na-etolite etolite dị ka ihe mgbaru ọsọ.
20. Olee àgwà Jehova mere ka ọ pụta ìhè n’ihe banyere ndị Ninive?
20 Jona bụ onye amụma ọzọ nke ndị mmadụ gere ntị, ndị ọ na-eyighị ka hà ga-ege ya ntị. Ndị Ninive, ọbụnadị eze ha, gere ntị n’ozi Jona ziri ma nwee okwukwe n’ebe Jehova nọ. Chineke jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ na mụ onwe m ekwesịghị imere Ninive bụ́ obodo ukwu ebere, bụ́ ebe e nwere ihe karịrị narị puku mmadụ na puku iri abụọ, bụ́ ndị na-amaghị ma ọlị ihe dị iche n’aka nri ha na aka ekpe ha?” (Jona 4:11) Chebara okwu a echiche iji mata ihe na-akpali gị ịkpọsara ndị ọzọ banyere ụbọchị dị egwu nke Jehova. Ị̀ na-ekele Jehova ekele maka ịzọpụta gị site n’ihe mgbapụta ahụ? Ọ̀ na-adị gị ka ì nwere ọrụ dịịrị gị dị ka ohu Jehova nke raara onwe ya nye? (1 Ndị Kọrịnt 9:16, 17) Ihe ndị a bụ ezi ihe mere anyị ga-eji na-ekwusa banyere ụbọchị Jehova. Tụkwasị na nke ahụ, ị̀ na-emere ndị ị na-ekwusara banyere ụbọchị Jehova “ebere”? Lee ụdị obi ụtọ ị ga-enwe mgbe ebere nke yiri ebere Chineke kpaliri gị ịgwa ndị mmadụ okwu banyere ụbọchị ahụ!
21. Gịnị ka ị pụrụ ịmụta n’otú Emọs si merie egwu Amazaya gbalịrị iyi ya?
21 Anyị amachaghị otú e si gee Joel, Obedaya, Nehọm, Habakọk, na Malakaị ntị. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, anyị maara otu ihe e mere mgbe Emọs ziri ozi ya. Amazaya megidere Emọs ajọ mmegide ma bo onye amụma ahụ ebubo na ọ gbaara eze izu. Ọ nwakwara igbochi Emọs ikwusa ozi ọma na Betel. (Emọs 7:10-13) Emọs ji obi ike merie mmegide ahụ. Taakwa, ndị okpukpe pụrụ ịgbalị ka ha kpalie ụfọdụ ndị ọchịchị ka ha kpagbuo ndị Jehova ma ọ bụ ọbụna machibido ọrụ nkwusa ha iwu. Ị̀ ga-eṅomi Emọs site n’ikwusa ozi ọma ahụ n’atụghị egwu n’agbanyeghị mmegide?
22. N’ihi gịnị ka ị pụrụ iji kwuo na ozi ahụ na-enwe ihe ịga nke ọma n’ókèala gị?
22 Ọ bụ ezie na ihe ndị mmadụ mere mgbe ha nụrụ ozi ndị amụma iri na abụọ ahụ ziri dịgasị iche iche, ndị amụma ahụ niile rụzuru ọrụ ha. Ihe dị mkpa abụghị ka ndị mmadụ gee ntị n’ozi ahụ nwere akụkụ abụọ nke anyị na-ezisa, kama ka anyị chụọrọ Jehova “ụmụ ehi bụ́ mkpụrụ egbugbere ọnụ anyị” n’àjà, bụ́ “àjà otuto” kasị mma anyị pụrụ ịchụ. (Hosia 14:2; Ndị Hibru 13:15) Mgbe ahụ, anyị ga-ahapụrụ Chineke ihe ga-esi na ya pụta. Ọ ga-adọta ndị bụ́ atụrụ n’ezie. (Jọn 6:44) Ọzọkwa, ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịkpọsa ozi ahụ sitere n’aka Chineke n’agbanyeghị ihe ndị mmadụ na-eme. Ị pụrụ inwe obi ike na “ụkwụ onye na-eweta ozi ọma, bụ́ onye na-ekwusa udo,” mara mma n’anya ndị ji obi ekele nabata ozi ọma. Ma nke kasị mkpa bụ na ha mara mma n’anya Jehova. (Nehọm 1:15; Aịzaya 52:7) Ebe ụbọchị Jehova dị nnọọ nso, kpebisie ike ịnọgide na-eme ihe Joel buru n’amụma maka oge anyị, nke bụ́: “Kpọsaanụ n’etiti mba dị iche iche, sị, ‘Jikerenụ agha! Kpalienụ ndị dị ike!’” Nke ahụ pụtara agha Chineke ga-ebuso mba niile.—Joel 3:9.
a Ọ pụrụ ịbụ na amụma a mezuru nke mbụ ya n’oge ndị Maccabeus, mgbe ndị Juu chụpụrụ ndị iro ha na Juda site ná nduzi nke ndị Maccabeus ma raraghachi ụlọ nsọ ahụ nye. Nke a mere ka ndị fọdụrụ ná ndị Juu ahụ nwee ike ịnabata Mesaya ahụ mgbe ọ bịara.—Daniel 9:25; Luk 3:15-22.
b E jiriwo akwụkwọ nta bụ́ Good News for People of All Nations, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara, nyere ndị na-adịghị asụ asụsụ bụ́ isi nke a na-asụ n’ógbè gị aka.