Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Alaeze Ukwu Furu efu Nke Menyere Ndị Nkatọ Bible Ihere
    Ụlọ Nche—1993 | Jun 1
    • ONYE Grik na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Diodorus Siculus biri ndụ 2,000 afọ gara aga. O mere nzọrọ na Nineve bụ obodo nwere akụkụ anọ; akụkụ anọ ahụ gbakọtara 480 stadium n’ogologo. Ọ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị okirikiri dị 60 maịlụ (96 kilomita)! Bible sere onyinyo yiri nke ahụ, na-akọwa Nineve dị ka obodo ukwu ga-ewe “ije nke ụbọchị atọ.”​—⁠Jona 3:3.

      Ndị nkatọ Bible nke narị afọ nke 19 jụrụ ikwere na obodo a na-amaghị ama nke ụwa oge ochie gaara ebuwo ibu otú a. Ha kwukwara na ọ bụrụ na Nineve dịrị adị ma ọlị, ọ gaara abụwo akụkụ nke mmepeanya oge ochie nke bu Babilọn ụzọ.

  • Alaeze Ukwu Furu efu Nke Menyere Ndị Nkatọ Bible Ihere
    Ụlọ Nche—1993 | Jun 1
    • Ka ọ dị mgbe ahụ, onye ọkà ọzọ n’ihe mgbe ochie ndị e gwutere n’ala bụ́ Austen Henry Layard malitere igwulite mkpọmkpọ ebe n’ebe a kpọrọ Nimrud nke dị ihe dị ka 42 kilomita n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ nke Khorsabad. Mkpọmkpọ ebe ahụ ghọrọ Kala​—⁠otu n’ime obodo anọ ndị ahụ nke Asiria bụ́ ndị e hotara na Jenesis 10:11. E mesịa na 1849, Layard gwulitere mkpọmkpọ ebe nke obíeze buru oké ibu n’ebe a kpọrọ Kuyunjik, n’etiti Kala na Khorsabad. Ebe ahụ ghọrọ akụkụ Nineve. N’etiti Khorsabad na Kala ka e nwere mkpọmkpọ ebe nke ime obodo ndị ọzọ, gụnyere ugwu nta a kpọrọ Karamles. “Ọ bụrụ na anyị ewere nnukwute ugwu nta anọ ahụ nke Nimrúd [Kala], Koyunjik [Nineve], Khorsabad, na Karamles, dị ka isi nkuku nke ebe nwere akụkụ anọ hà nhata,” ka Layard kwuru, “a ga-ahụ na akụkụ anọ ya kwekọrọ nnọọ na 480 stadium ma ọ bụ 60 maịlụ nke onye ọkà n’ihe banyere ọdịdị ụwa, bụ́ nke mejupụtara njem ụbọchị atọ nke onye amụma bụ́ [Jona].”

      Mgbe ahụ, ihe àmà na-egosi na Jona gụnyere ime obodo ndị a dị ka otu “obodo ukwu,” na-akpọ ha aha nke obodo mbụ e depụtara na Jenesis 10:11, ya bụ, Nineve. A na-eme otu ihe ahụ taa. Dị ka ihe atụ, e nwere ọdịiche n’obodo bụ isi a na-akpọ London na ime obodo ya dị iche iche, bụ́ nke na-emejupụta ihe a na-akpọ mgbe ụfọdụ “London Ka Ukwuu.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya