Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-ele Ndị Mmadụ Anya Ka Ụbọchị Jehova Na-eru Nso?
“Jehova adịghị egbu oge n’ihe banyere nkwa ya, . . . kama ọ na-enwe ndidi n’ebe unu nọ n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla kama ọ na-achọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.”—2 PITA 3:9.
1, 2. (a) Olee otú Jehova si ele ndị mmadụ anya taa? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịjụ onwe anyị?
E NYERE ndị Jehova ọrụ ‘ime ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.’ (Matiu 28:19) Ka anyị na-arụzụ ọrụ a ma na-echere “oké ụbọchị Jehova,” anyị kwesịrị ịdị na-ele ndị mmadụ anya dị ka o si ele ha. (Zefanaịa 1:14) Olee otú o si ele ha anya? Pita onyeozi na-ekwu, sị: “Jehova adịghị egbu oge n’ihe banyere nkwa ya, dị ka ụfọdụ ndị si ewere igbu oge, kama ọ na-enwe ndidi n’ebe unu nọ n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla kama ọ na-achọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Chineke na-ele ndị mmadụ anya dị ka ndị nwere ike ichegharị. “Uche ya [bụ] ka a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Leenụ, Jehova na-enwe obi ụtọ “mgbe onye na-emebi iwu si n’ụzọ ya chigharịa, wee dị ndụ”!—Ezikiel 33:11.
2 Ànyị na-ele ndị mmadụ anya n’onwe anyị dị ka Jehova si ele ha? Dị ka ya, ànyị na-ele ndị nke agbụrụ nile na mba nile anya dị ka ndị pụrụ ịghọ “ìgwè atụrụ nke ọzụzụ anụ Ya”? (Abụ Ọma 100:3; Ọrụ 10:34, 35) Ka anyị tụlee ihe atụ abụọ ndị na-egosi mkpa ọ dị ile ihe anya dị ka Chineke si ele ya. N’ihe atụ abụọ a, mbibi na-eru nso, e mekwara ka ndị ohu Jehova mara banyere nke a tupu oge eruo. Ihe atụ ndị a dị mkpa karịsịa ka anyị na-echere oké ụbọchị Jehova.
Ebreham Lere Ihe Anya Dị Ka Jehova Si Lee Ya
3. Olee otú Jehova si lee ndị bi na Sọdọm na Gọmọra anya?
3 Ihe atụ nke mbụ metụtara nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ebreham na ajọ obodo abụọ bụ́ Sọdọm na Gọmọra. Mgbe Jehova nụrụ “iti mkpu Sọdọm na Gọmọra,” o bibighị obodo ndị ahụ na ndị bi n’ime ha ozugbo. O bu ụzọ mee nchọpụta. (Jenesis 18:20, 21) E zigara ndị mmụọ ozi abụọ na Sọdọm, bụ́ ebe ha gara nọrọ n’ụlọ nwoke ezi omume ahụ bụ́ Lọt. N’abalị nke ụbọchị ndị mmụọ ozi ahụ rutere, “ndị ikom obodo ahụ . . . gbara ụlọ ahụ gburugburu, ma okorobịa ma agadi, ndị ala ahụ nile site n’akụkụ ọ bụla,” na-achọ iso ndị mmụọ ozi ahụ nwee mmekọahụ. N’ụzọ doro anya, otú ndị bi n’obodo ahụ si rụọ arụọ gosiri na o kwesịrị ka e bibie ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị mmụọ ozi ahụ gwara Lọt, sị: “Ọ̀ dị onye i nwere n’ebe a ọzọ? di nwa gị, na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom, na onye ọ bụla i nwere n’obodo a; mee ka ha si n’ebe a pụọ.” Jehova meghere ụzọ maka ịzọpụta ụfọdụ ndị bi n’obodo ahụ, ma n’ikpeazụ, ọ bụ nanị Lọt na ụmụ ya ndị inyom abụọ lanahụrụ mbibi ahụ.—Jenesis 19:4, 5, 12, 16, 23-26.
4, 5. N’ihi gịnị ka Ebreham ji rịọ arịrịọ banyere ndị bi na Sọdọm, otú o si lee ndị mmadụ anya ò kwekọrọ n’otú Jehova si ele ha?
4 Ọ dị mma, ka anyị laghachi n’oge Jehova kpughere nzube ya inyocha obodo Sọdọm na Gọmọra. Ọ bụ mgbe ahụ ka Ebreham rịọrọ, sị: “Eleghị anya [ndị ezi omume iri ise] dị n’obodo ahụ: ọ̀ ga-abụ ezie na ị ga-ekpochapụ ebe ahụ ghara ịgbaghara ya n’ihi [ndị ezi omume iri ise] nọ n’ime ya? Ya bụrụ Gị ihe arụ ime dị ka ihe a si dị, ime ka onye ezi omume so onye na-emebi iwu nwụọ, o wee bụrụ na dị ka ndị ezi omume si dị, otú a ka ndị na-emebi iwu dị; ya bụrụ Gị ihe arụ: Onyeikpe ụwa nile, Ọ́ gaghị eme ihe e kpere n’ikpe?” Ebreham jiri okwu ahụ bụ́ “ya bụrụ Gị ihe arụ” mee ihe ugboro abụọ. Site n’ahụmahụ o nweworo, Ebreham maara na Jehova agaghị ebibikọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume. Mgbe Jehova kwuru na ya agaghị ebibi Sọdọm ma ọ bụrụ na “[ndị ezi omume iri ise] dị n’obodo ahụ,” Ebreham gara n’ihu iwetulata ọnụ ọgụgụ ahụ ruo nanị iri.—Jenesis 18:22-33.
5 Jehova ọ̀ gaara egewo ntị n’arịrịọ Ebreham ma ọ bụrụ na ha ekwekọghị n’echiche ya? Ọ dịghị ma ọlị. Dị ka “enyi Jehova,” o doro anya na Ebreham maara otú O si ele ihe anya ma lee ihe anya otú ahụ. (Jems 2:23) Mgbe Jehova lekwasịrị Sọdọm na Gọmọra anya, ọ dị njikere ilebara arịrịọ Ebreham anya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Nna anyị nke eluigwe “[achọghị] ka e bibie onye ọ bụla kama ọ na-achọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.”
Otú Jona Si Lee Ndị Mmadụ Anya Dị Nnọọ Iche
6. Olee otú ndị Ninive si meghachi omume ná mkpọsa Jona mere?
6 Ugbu a tụlee ihe atụ nke abụọ—nke Jona. Na nke ugbu a, obodo a na-aga ibibi bụ Ninive. A gwara Jona onye amụma ka ọ kpọsaa na ihe ọjọọ nke obodo ahụ ‘arịgotawo n’ihu Jehova.’ (Jona 1:2) Ninive bụ nnukwu obodo ga-ewe “ije nke ụbọchị atọ” ma a gụnye ógbè ndị dịpụrụ adịpụ dị na ya. Mgbe Jona mesịrị rube isi ma banye na Ninive, ọ nọgidere na-akpọsa sị: “Ọ fọdụrụ [ụbọchị iri anọ], e wee kwatuo Ninive.” Mgbe ha nụrụ nke a, “ndị Ninive wee kwere na Chineke; ha wee kpọsaa obubu ọnụ, yiri ákwà mkpe.” Ọbụna eze Ninive chegharịrị.—Jona 3:1-6.
7. Olee otú Jehova si lee àgwà nchegharị nke ndị Ninive anya?
7 Nke ahụ dị nnọọ iche n’otú ndị Sọdọm si meghachi omume! Olee otú Jehova si lee ndị Ninive ahụ chegharịrịnụ anya? Jona 3:10 na-asị: “Chineke wee chegharịa uche banyere ihe ọjọọ ahụ, nke O kwuru, sị na Ọ ga-eme ha; O meghịkwa ya.” Jehova ‘chegharịrị uche’ n’echiche bụ́ na ọ gbanwere ihe ọ chọrọ ime ndị Ninive n’ihi na ha gbanwere ụzọ ha. Ụkpụrụ Chineke agbanweghị, ma Jehova gbanwere mkpebi ya mgbe ọ hụrụ na ndị Ninive chegharịrị.—Malakaị 3:6.
8. Gịnị mere ka obi ghara ịdị Jona mma?
8 Mgbe Jona chọpụtara na a gaghịzi ebibi Ninive, ò lere ihe anya dị ka Jehova si lee ya? Ee e, n’ihi na a gwara anyị, sị: “O wee jọọ Jona ajọ njọ nke ukwuu, iwe ya ewee dị ọkụ.” Gịnị ọzọ ka Jona mere? Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “O wee kpeere Jehova, sị, Biko, Jehova, Nke a [ọ́ bụghị] okwu m, mgbe m na-anọ n’ala m? N’ihi nke a ka m buru ụzọ gbalaga na Tashish: n’ihi na amaara m na Gị onwe gị bụ Chineke nke bụ́ onye amara, onye obi ebere, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Nke na-abakwa ụba n’ebere, Nke na-echegharịkwa uche banyere ihe ọjọọ ahụ Ị ga-eweta.” (Jona 4:1, 2) Jona maara àgwà Jehova. Otú ọ dị, n’oge ahụ, obi adịghị onye amụma ahụ mma, o leghịkwa ndị Ninive chegharịrịnụ anya dị ka Chineke si lee ha anya.
9, 10. (a) Gịnị ka Jehova kụziiri Jona? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji chee na Jona mesịrị lee ndị Ninive anya dị ka Jehova si lee ha?
9 Jona si na Ninive pụọ, wuo ụlọ ntu, ma nọdụ n’okpuru ndò ya “ruo mgbe ọ ga-ahụ ihe ga-eme n’obodo” ahụ. Jehova mere ka ogiri ụgba tolite ka o wee ghọọrọ Jona ndò. Otú ọ dị, n’echi ya, osisi ahụ kpọnwụrụ. Mgbe iwe were Jona n’ihi ya, Jehova sịrị: “Gị onwe gị meere ogiri ụgba nke a ebere . . . Mụ onwe m kwa, Ḿ gaghị emere Ninive ebere, bụ́ obodo ukwu ahụ; nke ihe karịrị [narị puku na iri puku mmadụ abụọ] nọ n’ime ya, bụ́ ndị na-amaghị nke bụ aka nri ha na aka ekpe ha; na ọtụtụ anụmanụ?” (Jona 4:5-11) Lee ihe nke a kụziiri Jona banyere otú Jehova si ele ndị mmadụ anya!
10 E dekọghị ihe Jona zaghachiri n’ihe Chineke kwuru banyere imere ndị Ninive ebere. Ma, o doro anya na onye amụma ahụ gbanwere otú o si lee ndị Ninive chegharịrịnụ anya. Ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na Jehova ji ya dekọọ ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ.
Àgwà Dị Aṅaa Ka I Nwere?
11. Olee otú o yiri ka Ebreham ọ̀ gaara esiwo ele ndị na-adị ndụ n’oge a anya?
11 Taa, anyị na-eche mbibi ọzọ ihu—nke ajọ usoro ihe dị ugbu a n’oké ụbọchị Jehova. (Luk 17:26-30; Ndị Galeshia 1:4; 2 Pita 3:10) Olee otú Ebreham gaara esi ele ndị bi n’ụwa a nke a na-aga ibibi n’isi nso anya? O yikarịrị ka ọ ga-enwe nchegbu banyere ndị na-anụbeghị ‘ozi ọma nke alaeze’ ahụ. (Matiu 24:14) Ebreham rịọrọ Chineke arịrịọ ugboro ugboro banyere ndị ọ pụrụ ịbụ na ha bụ ndị ezi omume na Sọdọm. Ànyị na-enwe nchegbu n’onwe anyị banyere ndị pụrụ ịjụ ụzọ nke ụwa a Setan na-achịkwa ma ọ bụrụ na e nyere ha ohere ichegharị ma bịa jeere Chineke ozi?—1 Jọn 5:19; Mkpughe 18:2-4.
12. N’ihi gịnị ka o ji dị mfe inwe àgwà yiri nke Jona n’ebe ndị anyị na-ezute n’ozi anyị nọ, gịnịkwa ka anyị pụrụ ime banyere nke a?
12 O kwesịrị ekwesị ịtụsi anya ọgwụgwụ nke ihe ọjọọ ike. (Habakuk 1:2, 3) Ma, ọ dị nnọọ mfe inwe àgwà yiri nke Jona, inwe àgwà ọ gbasaghị m banyere ọdịmma nke ndị pụrụ ichegharị. Nke a bụ eziokwu karịsịa ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-ezute ndị na-enweghị mmasị, ndị na-emegide anyị, ma ọ bụ ọbụna ndị na-esesa anyị okwu mgbe anyị ji ozi Alaeze ahụ bịa n’ebe obibi ha. Anyị nwere ike hapụ ilebara ndị Jehova ga-esi n’ajọ usoro ihe a kpọpụta anya. (Ndị Rom 2:4) Ọ bụrụ na anyị enyochaa onwe anyị nke ọma ma chọpụta na anyị nwere àgwà Jona nweburu n’ebe ndị Ninive nọ ọbụna nke nta, anyị pụrụ ikpe ekpere maka enyemaka iji na-ele ihe anya dị ka Jehova si ele ya.
13. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Jehova na-eche banyere ndị mmadụ taa?
13 Jehova na-enwe nchegbu banyere ndị na-amalitebeghị ijere ya ozi, ọ na-egekwa ntị n’ekpere nke ndị raara onwe ha nye ya. (Matiu 10:11) Dị ka ihe atụ, “ọ ga-eme ka e kpeere ha ikpe ziri ezi” ná nzaghachi nye ekpere ha. (Luk 18:7, 8) Ọzọkwa, Jehova ga-emezu nkwa na nzube ya nile n’oge nke ya. (Habakuk 2:3) Nke a ga-agụnye ikpochapụ ihe ọjọọ nile n’ụwa, ọbụna dị ka o bibiri Ninive mgbe ndị bi na ya maliteghachiri ime ihe ọjọọ.—Nehum 3:5-7.
14. Gịnị ka anyị kwesịrị ịdị na-eme ka anyị na-echere oké ụbọchị Jehova?
14 Ruo mgbe a ga-ewepụ usoro ihe a n’oké ụbọchị Jehova, ànyị ga-eji ndidi na-echere, na-arụsi ọrụ ike n’ime uche ya? Anyị amaghị ihe nile banyere otú a ka ga-arụru ọrụ nkwusa a tupu ụbọchị Jehova abịa, ma anyị maara na a ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’elu ụwa dum mmadụ bi ruo n’ókè ga-eju Chineke afọ tupu ọgwụgwụ abịa. N’eziekwa, anyị kwesịrị inwe nchegbu banyere “ihe a na-achọsi ike” ndị a ka ga-ewebata ka Jehova nọgidere na-eji ebube emeju ụlọ ya.—Hagaị 2:7.
Omume Anyị Na-egosipụta Otú Anyị Si Ele Ihe Anya
15. Gịnị pụrụ ime ka anyị ghọtakwuo ihe banyere ọrụ nkwusa ahụ?
15 Ikekwe anyị bi n’obodo ebe a na-adịghị anabata ọrụ nkwusa ahụ nke ọma, ya abụrụkwa na ọnọdụ anyị agaghị ekwe anyị ịkwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Ka e were ya na a pụrụ ịchọta mmadụ iri n’ókèala anyị tupu ọgwụgwụ abịa. Ànyị chere na mmadụ iri ahụ kwesịrị ka a chọpụta ha? Jizọs “nwere ọmịiko” n’ahụ́ otu ìgwè mmadụ “n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) Site n’ịmụ Bible na iji nlezianya na-agụ isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche na Teta!, anyị pụrụ ịghọtakwu nsogbu ụwa a. Nke a pụziri ime ka anyị ghọtakwuo mkpa ọ dị ikwusa ozi ọma ahụ. Ọzọkwa, iji ekele na-eji akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-enye eme ihe pụrụ ime ka anyị nwekwuo ike ime ka ndị mmadụ na-ekwere n’ozi ọma ahụ n’ókèala a na-ejekarị ozi na ya.—Matiu 24:45-47; 2 Timoti 3:14-17.
16. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ozi anyị dịkwuo irè?
16 Nchegbu anyị na-enwe banyere ndị na-anabatabeghị ozi Bible nke na-enye ndụ na-akpali anyị ịgbanwe oge anyị ji eme nkwusa na ụzọ anyị si eche ozi ahụ n’ihu ndị nwe ụlọ n’ozi anyị. Ànyị na-achọpụta na ọtụtụ ndị adịghị anọ n’ụlọ mgbe anyị gara na nke ha? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị pụrụ ime ka ozi anyị dịkwuo irè site n’ịdị na-agbanwe oge ndị anyị ji agba àmà na ebe ndị anyị na-eje agba àmà. Ndị ọkụ azụ̀ na-aga ịkụ azụ̀ mgbe ha ga-egbute azụ̀. Ànyị pụrụ ime ihe yiri nke ahụ n’ọrụ ịkụ azụ̀ ime mmụọ anyị? (Mak 1:16-18) Gịnị ma ị nwalee ịgba àmà n’oge uhuruchi na iji telifon agba àmà, n’ebe iwu kwadoro ya? Ụfọdụ ndị achọpụtawo na ọma ahịa, ebe a na-anọ abanye ụgbọala, okporo ámá na ụlọ ahịa bụ ‘ebe ịkụ azụ̀ ndị’ a na-akụta ihe na ha. Ọ na-apụtakwa ìhè na anyị nwere àgwà yiri nke Ebreham n’ebe ndị mmadụ nọ mgbe anyị ji ohere ọ bụla dapụtaranụ na-agba àmà mgbe anyị na-anọghị n’ozi.
17. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi na-agba ndị ozi ala ọzọ na ndị ọzọ na-eje ozi ná mba ọzọ ume?
17 Ọtụtụ nde mmadụ anụbeghị ozi Alaeze ahụ. Tụkwasị n’ọrụ nkwusa anyị, ànyị pụrụ igosi nchegbu n’ebe ndị dị otú ahụ nọ ọbụna n’esighị n’ebe obibi anyị pụọ? Ànyị maara ndị ozi ala ọzọ ma ọ bụ ndị ozi oge nile bụ́ ndị na-eje ozi ná mba ọzọ? Ọ bụrụ na anyị maara, ọ ga-adị mma ka anyị degara ha akwụkwọ ozi nke na-egosi na anyị nwere ekele maka ọrụ ha. Olee otú nke ahụ pụrụ isi gosi na anyị nwere nchegbu n’ebe ndị mmadụ n’ozuzu ha nọ? Akwụkwọ ozi agbamume na nke ịja mma anyị degaara ndị ozi ala ọzọ pụrụ iwusi ha ike ịnọgide n’ebe e kenyere ha ọrụ, si otú ahụ na-enyere ọtụtụ ndị ọzọ aka ịmara eziokwu ahụ. (Ndị Ikpe 11:40) Anyị pụkwara ikpe ekpere maka ndị ozi ala ọzọ na ndị agụụ nke eziokwu ahụ na-agụ n’ala ndị ọzọ. (Ndị Efesọs 6:18-20) Ụzọ ọzọ anyị si egosi nchegbu bụ site n’inye onyinye ego maka ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova.—2 Ndị Kọrint 8:13, 14; 9:6, 7.
Ị̀ Ga-enwe Ike Ịkwaga n’Ebe Ọzọ?
18. Gịnị ka ụfọdụ Ndị Kraịst meworo iji na-akwalite ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ná mba ha bi na ya?
18 A gọziwo ndị kwagaworo n’ebe ndị e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze n’ihi mgbalị ndị ha ji mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà na-eme. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova ndị ọzọ nọgidere n’ala nna ha, ha amụwo asụsụ ọzọ ka ha wee nwee ike inyere ndị kwabatara n’ala ha aka n’ụzọ ime mmụọ. Mgbalị ndị dị otú ahụ abụwo ihe na-akwụghachi ụgwọ n’ezie. Dị ka ihe atụ, Ndịàmà asaa, bụ́ ndị nọ na-enyere ndị China nọ n’otu obodo dị na Texas, U.S.A., aka, nabatara mmadụ 114 n’ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na 2001. Ndị na-enyere ìgwè ndị dị otú ahụ aka ahụwo na ubi ha achawo acha ka e were ihe ubi na ya.—Matiu 9:37, 38.
19. Olee ihe amamihe dị na ya ime ma ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ ịkwaga ná mba ọzọ iji mee ka ọrụ nkwusa ahụ gaa n’ihu n’ebe ahụ?
19 Ikekwe ọ dị gị na ezinụlọ gị ka ùnu nọ n’ọnọdụ ga-ekwe unu ịkwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. N’ezie, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ibu ụzọ “nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu.” (Luk 14:28) Nke a bụ eziokwu karịsịa mgbe mmadụ na-eme atụmatụ ịkwaga ná mba ọzọ. Onye ọ bụla na-eche echiche ime otú ahụ pụrụ ịjụ onwe ya ajụjụ ndị dị ka ndị a: ‘M̀ ga-enwe ike ịkwado ezinụlọ m? M̀ pụrụ inweta visa kwesịrị ekwesị? M̀ na-asụ asụsụ nke mba ahụ, ka m̀ dị njikere ịmụta ya? Èchewo m echiche banyere ihu igwe na ọdịbendị nke obodo ahụ? M̀ ga-aghọrọ ndị kwere ekwe ibe m nọ n’ala ahụ “onye enyemaka na-eme ka ha dị ike,” ọ bụghị ibu arọ?’ (Ndị Kọlọsi 4:10, 11) Iji chọpụta ókè mkpa e nwere ná mba ahụ ị na-achọ ịkwaga na ya ha, o kwesịrị ekwesị mgbe nile idegara alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova na-elekọta ọrụ nkwusa n’ebe ahụ akwụkwọ.a
20. Olee otú otu Onye Kraịst na-eto eto si rụsie ọrụ ike maka ọdịmma nke ndị kwere ekwe ibe ya na ndị ọzọ nọ ná mba ọzọ?
20 Otu Onye Kraịst nke soworo na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Japan chọpụtara na e nwere mkpa maka ndị ọrụ nwere nkà iwu ebe a na-anọ efe ofufe na Paraguay. Ebe ọ na-alụbeghị nwanyị ma nwee ume okorobịa, ọ kwagara ná mba ahụ ma rụọ ọrụ ruo ọnwa asatọ dị ka nanị onye ọrụ oge nile so na-arụ ọrụ ahụ. Mgbe ọ nọ n’ebe ahụ, ọ mụrụ asụsụ Spanish ma duzie ọtụtụ ọmụmụ Bible ebe obibi. Ọ hụrụ na e nwere mkpa maka ndị nkwusa Alaeze ná mba ahụ. Ọ bụ ezie na ọ laghachiri Japan, n’oge na-adịghị anya, ọ laghachiri Paraguay ma nye aka ịkpọbata ndị mmadụ kpọmkwem n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ.
21. Gịnị kwesịrị ịbụ nchegbu anyị bụ́ isi na otú anyị kwesịrị isi na-ele ihe anya ka anyị na-echere oké ụbọchị Jehova?
21 Chineke ga-ahụ na a rụzuru ọrụ nkwusa ahụ, n’ụzọ kwekọrọ n’uche ya. Taa, ọ na-eme ka owuwe ihe ubi ime mmụọ ikpeazụ ahụ gaa ọsọ ọsọ. (Aịsaịa 60:22) Ya mere, ka anyị na-echere ụbọchị Jehova, ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ iwe ihe ubi ahụ ma na-ele ndị mmadụ anya dị ka Chineke anyị na-ahụ n’anya si ele ha.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bachaghị uru ịkwaga n’onwe gị ná mba ebe a machibidoro ọrụ nkwusa anyị iwu ma ọ bụ kpaara ya ókè. Ime otú ahụ pụrụ ọbụna ibutere ndị nkwusa Alaeze ji ezi uche na-arụ ọrụ n’ọnọdụ dị otú ahụ nsogbu.
Ị̀ Na-echeta?
• Ka anyị na-echere ụbọchị Jehova, olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị mmadụ anya?
• Olee otú Ebreham si lee ndị ezi omume ọ pụrụ ịbụ na ha bi na Sọdọm anya?
• Olee otú Jona si lee ndị Ninive nwere nchegharị anya?
• Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-ele ndị na-anụbeghị ozi ọma ahụ anya dị ka Jehova si ele ha?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ebreham lere ndị mmadụ anya dị ka Jehova si lee ha
[Foto dị na peeji nke 17]
Jona bịara lee ndị Ninive chegharịrịnụ anya dị ka Jehova si lee ha
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Nchegbu anyị na-enwe maka ndị mmadụ na-akpali anyị ịtụle oge dịgasị iche iche anyị ga-eji na-ekwusa ozi ọma ahụ na ụzọ dịgasị iche iche anyị ga-esi na-eme ya