Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • cf isi 6 p. 56-65
  • “Ọ Mụtara Nrubeisi”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ọ Mụtara Nrubeisi”
  • ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Mere Jizọs Ji Rube Isi
  • “Ọ Dịghị Mmehie O Mere”
  • “M Na-eme Ihe Dị Ya Mma Mgbe Niile”
  • Ụgwọ Ọrụ A Na-enweta n’Irube Isi Dị Ka Kraịst Rubere
  • “Ndị Bụ́ Ụmụ, Na-eruberenụ Ndị Mụrụ Unu Isi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Jehova Ji Nrubeisi Gị Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Mụta Nrubeisi Site n’Ịnakwere Ịdọ Aka ná Ntị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Nrubeisi—Ọ̀ Bụ Ihe Dị Mkpa A Na-amụta n’Oge A Bụ Nwata?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
cf isi 6 p. 56-65

ISI NKE ISII

“Ọ Mụtara Nrubeisi”

1, 2. Gịnị mere obi ga-eji tọọ nna nke hụrụ nwa ya n’anya ụtọ mgbe ọ hụrụ ka nwa ya rubeere ya isi, oleekwa otú nke a si gosi otú obi dị Jehova?

OTU nna si na windo na-elepụ anya, na-ele ebe obere nwa ya na ndị enyi ya nọ na-agba bọl. Ụmụaka ahụ esi n’ogige ụlọ gbapụ bọl ha n’okporo ụzọ. Nwata ahụ anọrọ na-ele bọl ahụ anya. Otu n’ime ndị enyi ya agwa ya ka ọ gbaga n’okporo ụzọ gaa weta ya. Ma, nwata ahụ fufere isi, sị, “A gwara m agala n’okporo ụzọ.” Nna ya amụmụọ ọnụ ọchị.

2 Gịnị mere obi ji tọọ nna ya ụtọ otú a? Ọ bụ n’ihi na ọ gwara nwa ya ka ọ ghara ịga n’okporo ụzọ naanị ya. Mgbe nwata ahụ rubere isi—ọ bụ ezie na ọ maghị na nna ya na-ele ya anya—nna ya maara na nwa ya na-amụta nrubeisi, nke ga-eme ka ọ ghara inwe ihe ga-eme ya. Otú obi dị nna ahụ ka obi dị Nna anyị nke bi n’eluigwe bụ́ Jehova. Chineke maara na ọ bụrụ na anyị ga-ekwesị ntụkwasị obi wee dịrị ndụ hụ ọdịnihu magburu onwe ya nke o debeere anyị, anyị aghaghị ịmụta ịtụkwasị ya obi na irubere ya isi. (Ilu 3:5, 6) Ọ bụ ya mere o ji zitere anyị onye ozizi nke karịrị ndị nkụzi niile bụ́ mmadụ.

3, 4. Olee otú o si bụrụ na Jizọs “mụtara nrubeisi,” e meekwa “ka o zuo oké”? Nye ihe atụ.

3 Baịbụl kwuru ihe dị ịtụnanya banyere Jizọs, sị: “Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara, ọ mụtara nrubeisi site n’ahụhụ ndị ọ tara; mgbe e mesịrị ka o zuo okè, ọ ghọrọ onye ọ dị n’aka inye ndị niile na-erubere ya isi nzọpụta ebighị ebi.” (Ndị Hibru 5:8, 9) Ọkpara a adịwo ndụ ruo ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ n’eluigwe. Ọ hụrụ mgbe Setan na ndị mmụọ ozi ibe ya bụ́ ndị nnupụisi nupụrụ isi. Ma, Ọkpara ahụ e bu ụzọ mụọ esonyereghị ha. Amụma e buru site n’ike mmụọ nsọ kwuru banyere ya, sị: “Mụ onwe m enupụghịkwa isi.” (Aịzaya 50:5) Ma, olee otú o si bụrụ na Ọkpara a nke na-erube isi n’ụzọ zuru okè “mụtara nrubeisi”? Oleekwa otú e si mee ka onye a e kere eke nke zuru okè “zuo okè”?

4 Tụlee ihe atụ a: Otu onye agha nwere mma agha nke e ji ígwè kpụọ. Ọ bụ ezie na e jitụbeghị ya lụọ agha, a kpụziri ya akpụzi, chọọkwa ya mma. Ma, o ji mma agha ahụ gbanweta mma agha ọzọ e ji ígwè kpụọ nke bụ́ ọkpọka, nke sikwara ike karị. E jiriwo mma agha ọhụrụ a jee agha lọta. Ọ̀ bụ na mma agha a ọ gbanwetara egosighị na ọ maara ihe? N’otu aka ahụ, isi Jizọs rubere tupu ya abịa n’ụwa enweghị ntụpọ. Ma mgbe ọ bịachara n’ụwa, nrubeisi ya ghọrọ nke pụrụ nnọọ iche. Ugbu a, a nwaleela ya, ya abụrụ nke siri ike na nke ọnwụnwa ndị na-apụghị ịbịara Jizọs n’eluigwe nụchaworo, dị ka a pụrụ ikwu ya.

5. Gịnị mere isi Jizọs rubere ji dị nnọọ mkpa, gịnịkwa ka anyị ga-atụle n’Isi nke Isii a?

5 Nrubeisi dị Jizọs oké mkpa iji rụọ ọrụ ọ bịara ịrụ n’ụwa. Dị ka “Adam ikpeazụ,” Jizọs bịara n’ụwa ime ihe nne na nna mbụ anyị na-emelighị, ya bụ, irubere Jehova bụ́ Chineke isi ọbụna mgbe ule bịara. (1 Ndị Kọrịnt 15:45) Ma, Jizọs erubeghị isi iji mezuo iwu. Jizọs ji uche ya dum na obi ya dum na mkpụrụ obi ya dum rube isi. O jikwa ọṅụ rube isi. Ime uche Nna ya dị ya mkpa karịa iri ihe oriri! (Jọn 4:34) Gịnị ga-enyere anyị aka iṅomi nrubeisi Jizọs? Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe mere o ji rube isi. Ịmụta ụdị ihe ndị ahụ mere o ji rube isi ga-enyere anyị aka iguzosi ike mgbe ọnwụnwa bịara, nyekwara anyị aka ime uche Chineke. Anyị ga-atụlekwa ụgwọ ọrụ ụfọdụ a na-enweta n’irube isi dị ka Kraịst rubere.

Ihe Ndị Mere Jizọs Ji Rube Isi

6, 7. Olee ihe ụfọdụ mere Jizọs ji rube isi?

6 Ọ bụ àgwà ọma ndị dị Jizọs n’obi mere o ji rube isi. Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Atọ, Kraịst dị umeala n’obi. Mpako na-eme ka ndị mmadụ leghara nrubeisi anya. Ma ịdị umeala n’obi na-enyere anyị aka iji obi anyị na-erubere Jehova isi. (Ọpụpụ 5:1, 2; 1 Pita 5:5, 6) Jizọs rubekwara isi n’ihi ihe ọ hụrụ n’anya nakwa n’ihi ihe ọ kpọrọ asị.

7 Jizọs hụkwara Nna ya nke bi n’eluigwe, bụ́ Jehova, n’anya. Anyị ga-atụleru ịhụnanya ahụ ala n’Isi nke Iri na Atọ. Ịhụnanya ahụ mere ka Jizọs mụta ịtụ egwu Chineke. Ọ hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu, na-asọpụrụ ya nke ukwuu, nke na ọ tụrụ egwu ime ihe ga-ewute Nna ya. Egwu Chineke bụ otu n’ime ihe mere e ji nụ ekpere Jizọs. (Ndị Hibru 5:7) Egwu Jehova bụkwa ihe pụrụ iche a ga-eji mara ọchịchị Jizọs dị ka Eze bụ́ Mesaya.—Aịzaya 11:3.

Ihe Osise dị na peeji nke 58

Ntụrụndụ ị na-ahọrọ ọ̀ na-egosi na ị kpọrọ ihe ọjọọ asị?

8, 9. Dị ka e buru n’amụma, olee otú ezi omume na ajọ omume mere ka obi dị Jizọs, oleekwa otú o si mee ka a mara otú obi dị ya?

8 Ịhụ Jehova n’anya pụtakwara ịkpọ ihe Jehova kpọrọ asị asị. Dị ka ihe atụ, rịba ama okwu amụma a nke a gwara Eze bụ́ Mesaya, sị: “Ị hụrụ ezi omume n’anya, ị kpọkwara ajọ omume asị. Ọ bụ ya mere Chineke bụ́ Chineke gị ji were mmanụ aṅụrị tee gị karịa ndị ibe gị.” (Abụ Ọma 45:7) “Ndị ibe” Jizọs bụ ndị eze ndị ọzọ ndị si n’agbụrụ Eze Devid. Jizọs nwere ihe mere ọ ga-eji nwee aṅụrị ma ọ bụ oké ọṅụ karịa onye ọ bụla n’ime ha mgbe e tere ya mmanụ. N’ihi gịnị? Ụgwọ ọrụ ya karịrị nnọọ nke ha, ọchịchị ya bakwara uru nke ukwuu karị. E nyere ya ụgwọ ọrụ n’ihi na ọ bụ ịhụ ezi omume n’anya na ịkpọ ajọ omume asị mere ka o rubere Chineke isi n’ihe niile.

9 Olee otú Jizọs si mee ka a mara otú ezi omume na ajọ omume mere ka obi dị ya? Dị ka ihe atụ, mgbe ndị na-eso ụzọ ya rubere isi ná ntụziaka o nyere banyere ọrụ ikwusa ozi ọma, e wee gọzie ha, gịnị ka Jizọs mere? Ọ ṅụrịrị oké ọṅụ. (Luk 10:1, 17, 21) Mgbe ndị bi na Jeruselem gosiri mmụọ nnupụisi ugboro ugboro, jụkwa mgbalị Jizọs ji ịhụnanya gbalịa inyere ha aka, olee otú obi dị Jizọs? Ọ kwara ákwá n’ihi omume nnupụisi nke obodo ahụ. (Luk 19:41, 42) Àgwà ụmụ mmadụ ruru Jizọs n’ahụ́, ma àgwà ọma ma àgwà ọjọọ.

10. Olee otú ezi omume na omume ọjọọ kwesịrị ime ka obi dị anyị, oleekwa ihe ga-enyere anyị aka ime otú ahụ?

10 Ịtụgharị uche n’ụdị obi Jizọs nwere na-enyere anyị aka inyocha ihe mere anyị onwe anyị ji erubere Jehova isi. Ọ bụ ezie na anyị ezughị okè, anyị pụrụ ịmụta iji obi anyị dum hụ omume dị mma n’anya, mụtakwa iji obi kpọọ omume ọjọọ asị. Anyị kwesịrị ikpeku Jehova ekpere, rịọ ya ka o nyere anyị aka ịmụta inwe ụdị obi ya na Ọkpara ya nwere. (Abụ Ọma 51:10) Anyị kwesịkwara izere ihe ndị ga-eme ka anyị ghara inwekwa ụdị obi ahụ. Ọ dị mkpa ka anyị jiri nlezianya na-ahọrọ ntụrụndụ na ndị anyị na ha na-akpakọrịta. (Ilu 13:20; Ndị Filipaị 4:8) Ọ bụrụ na anyị amụta ihe ndị ahụ mere Kraịst ji rube isi, nrubeisi anyị agaghị abụ naanị iji mezuo iwu. Anyị ga na-eme ihe ziri ezi n’ihi na ọ dị anyị mma ime ya. Anyị ga-ezere omume ọjọọ, ọ bụghị n’ihi na anyị na-atụ ụjọ ka a ghara ijide anyị, kama n’ihi na anyị kpọrọ ụdị omume ahụ asị.

“Ọ Dịghị Mmehie O Mere”

11, 12. (a) Gịnị mere mgbe Jizọs ka malitere ozi ya amalite? (b) Olee ọnwụnwa mbụ Setan nwara Jizọs, oleekwa ụzọ aghụghọ o ji nwaa ya?

11 E lere Jizọs ule mgbe ọ ka malitere ozi ya amalite. Ule a metụtara asị ọ kpọrọ mmehie. Mgbe e mesịrị Jizọs baptizim, ọ nọrọ n’ala ịkpa ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị, n’erighị ihe oriri. Mgbe oge ahụ gwụrụ, Setan bịara ịnwa ya. Rịba ama otú Ekwensu si dị aghụghọ.—Matiu 4:1-11.

12 Ihe mbụ Setan kwuru bụ: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.” (Matiu 4:3) Olee otú ahụ́ dị Jizọs mgbe o busịrị ọnụ ruo ogologo oge? Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Agụụ gụwara ya.” (Matiu 4:2) Ya mere, Setan ji agụụ na-agụ Jizọs siere ya ọnyà. O yiri ka ọ ma ụma cheruo mgbe ike gwụrụ Jizọs n’anụ ahụ́. Rịbakwa ama okwu ịma aka Setan kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke.” Setan maara na Jizọs bụ “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke.” (Ndị Kọlọsi 1:15) N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs ekweghị ka Setan mee ka o nupụ isi. Jizọs maara na ọ bụghị uche Chineke ka o jiri ike ya rụọ ọrụ maka ọdịmma onwe ya naanị. Ọ jụrụ ime otú ahụ, wee gosi na ya ji ịdị umeala n’obi dabere n’ebe Jehova nọ ka o gbooro ya mkpa, nyekwa ya nduzi.—Matiu 4:4.

13-15. (a) Olee ọnwụnwa nke abụọ na nke atọ Setan nwara Jizọs, oleekwa ihe Jizọs mere? (b) Olee otú anyị si mara na Jizọs nọ na nche mgbe niile ka Setan ghara inweta ya?

13 N’ọnwụnwa nke abụọ Setan nwara Jizọs, ọ kpọọrọ Jizọs gaa n’ebe dị elu n’ihe a rụbichiri ná mgbidi ụlọ nsọ. Setan wee jiri akọ rọgharịa Okwu Chineke wee nwaa Jizọs ka o mee oké ihe ngosi site n’isi n’ebe ahụ dị elu wụda, ka ndị mmụọ ozi wee napụta ya. Ọ bụrụ na ìgwè mmadụ ndị nọ n’ụlọ nsọ ahụ ahụ ọrụ ebube ahụ, ò nwere onye ga-emesị nwaa ịrụ ụka wee sị na Jizọs abụghị Mesaya ahụ e kwere ná nkwa? Ọ bụrụ na ìgwè mmadụ ahụ anabata Jizọs dị ka Mesaya n’ihi oké ihe ngosi ahụ, ọ̀ bụ na Jizọs agaghị ezere ọtụtụ ihe isi ike na nsogbu? Ma eleghị anya, ọ pụrụ izere ihe ndị a. Ma, Jizọs maara na ọ bụ uche Jehova ka Mesaya jiri ịdị umeala n’obi rụọ ọrụ ya, ghara iji oké ihe ngosi mee ka ndị mmadụ kwere na ya. (Aịzaya 42:1, 2) Na nke a kwa, Jizọs enupụrụghị Jehova isi. A pụghị iji ịbụ onye a ma ama rata ya.

14 Ma, oleekwanụ ma ọ bụrụ na e jiri ọchịchọ ịbụ onye ọchịchị chọọ ịrata ya? N’ọnwụnwa nke atọ Setan nwara Jizọs, ọ gwara Jizọs na ya ga-enye ya alaeze niile nke ụwa ma ọ bụrụ na ọ daa n’ala otu ugboro fee ya ofufe. Ò chebaara ihe Setan chọrọ inye ya echiche? Ọ zara ya, sị, “Si ebe a pụọ, Setan!” Ọ sịkwara: “N’ihi na e dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.’” (Matiu 4:10) Ọ dịghị ihe ga-arata Jizọs ife chi ọzọ ofufe. Ọ dịghị ikike ọchịchị ọ bụla a pụrụ inye ya n’ụwa a nke ga-eme ka o nupụ isi.

15 Setan ọ̀ gara zuru ike? Ọ pụrụ mgbe ahụ Jizọs nyere ya iwu ka ọ pụọ. Otú ọ dị, Oziọma Luk kwuru na Ekwensu “si n’ebe ọ nọ pụọ ruo oge ọzọ ga-adaba adaba.” (Luk 4:13) N’ezie, Setan ga-achọta oge ndị ọzọ ọ ga-ele Jizọs ule ma nwaa ya ọnwụnwa ruo ọgwụgwụ. Baịbụl gwara anyị na ‘a nwalere Jizọs n’ụzọ niile.’ (Ndị Hibru 4:15) Ya mere, ọ dịghị mgbe Jizọs kwụsịrị ịnọ na nche; ọ dịghịkwa mgbe anyị kwesịrị ịhapụ ịnọ na nche.

16. Olee otú Setan si anwa ndị ohu Chineke taa, oleekwa otú anyị pụrụ isi jụ mgbalị ya?

16 Setan ka na-anwa ndị ohu Chineke taa. Ọ dị mwute na ezughị okè anyị na-emekarị ka ọ dịrị ya mfe ịnwa anyị. Setan na-eji aghụghọ ewere ịchọ ọdịmma onwe onye naanị, mpako, na oké ọchịchọ inweta ikike esiri anyị ọnyà. Setan pụkwara iji ịhụ ihe onwunwe n’anya siere anyị ọnyà nke jikọtara ihe a niile otu mgbe! Ọ dị mkpa mgbe ụfọdụ ka anyị kwụsịtụ wee jiri obi eziokwu nyochaa onwe anyị. Anyị kwesịrị ịtụgharị uche n’ihe e kwuru na 1 Jọn 2:15-17. Mgbe anyị na-eme nke ahụ, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị ma ò nweela otú ọchịchọ anụ ahụ́ nke usoro ihe a, agụụ ịkpata akụ̀, ọchịchọ ime ka ndị ọzọ na-aja anyị mma, si mebie ịhụnanya anyị nwere n’ebe Nna anyị nke bi n’eluigwe nọ. Anyị kwesịrị icheta na ụwa a na-agabiga. Onye na-achị ya bụ́ Setan ga-agabigakwa. Ka anyị jụ mgbalị o ji aghụghọ na-agbalị ka ọ raba anyị ná mmehie! Ka a kpalie anyị iṅomi Nna anyị ukwu, n’ihi na “ọ dịghị mmehie o mere.”—1 Pita 2:22.

“M Na-eme Ihe Dị Ya Mma Mgbe Niile”

17. Olee otú Jizọs si lee irubere Nna ya isi anya, ma olee ụka ụfọdụ ndị pụrụ ịrụ?

17 Ihe nrubeisi pụtara abụghị naanị ịghara ime mmehie; Kraịst ji ịnụ ọkụ n’obi debe iwu niile Nna ya nyere. Ọ sịrị: “M na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.” (Jọn 8:29) Nrubeisi a wetaara Jizọs ọṅụ dị ukwuu. Ma, ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka wee sị na irube isi esicharaghị Jizọs ike. Ha pụrụ iche na ọ bụ naanị Jehova, bụ́ onye zuru okè, ka ọ na-aghaghị irubere isi, ma anyị onwe anyị aghaghị irubere ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ndị nwere ikike, isi. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jizọs rubeere ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ndị nwere ikike, isi.

18. Mgbe Jizọs na-eto eto, olee ihe nlereanya o setịpụrụ n’ihe metụtara nrubeisi?

18 Mgbe Jizọs na-etolite, ọ nọ n’okpuru ndị mụrụ ya bụ́ Josef na Meri, ndị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ikekwe, ọ hụrụ ezughị okè nke ndị mụrụ ya karịa ka ọtụtụ ụmụaka pụrụ ịhụ. Ò nupụụrụ ha isi, rụwa ọrụ Chineke na-enyeghị ya ịrụ, na-agwa ha otú e si elekọta ezinụlọ? Rịba ama ihe e kwuru na Luk 2:51 banyere Jizọs mgbe ọ dị afọ iri na abụọ: “Ọ nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru ha.” Site n’irube isi, o setịpụụrụ ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst ihe nlereanya magburu onwe ya, bụ́ ndị na-agbalịsi ike irubere ndị mụrụ ha isi na ịsọpụrụ ha.—Ndị Efesọs 6:1, 2.

19, 20. (a) Olee ihe ịma aka pụrụ iche ndị bịaara Jizọs n’ihe metụtara irubere ụmụ mmadụ na-ezughị okè isi? (b) Gịnị mere ezi Ndị Kraịst taa kwesịrị iji na-erubere ndị na-edu ndú n’etiti ha isi?

19 A bịa n’irubere ụmụ mmadụ na-ezughị okè isi, ihe ịma aka ndị bịaara Jizọs bụ ndị na-agaghị abịara ezi Ndị Kraịst taa. Chee echiche banyere oge pụrụ iche o biri ndụ. N’oge na-adịghị anya, a ga-ajụ usoro okpukpe ndị Juu, ma ụlọ nsọ ya nke dị na Jeruselem ma ọrụ ndị nchụàjà na-arụ n’ime ya, ọ bụ ezie na ọ dịwo anya Jehova nọ na-anabata ihe ndị a. A ga-eji ọgbakọ Ndị Kraịst dochie ya. (Matiu 23:33-38) N’oge ahụ, ọtụtụ ndị ndú okpukpe nọ na-ezi ozizi ụgha ndị ha mụtara na nkà ihe ọmụma Grik. Nrụrụaka jupụtara nnọọ n’ụlọ nsọ ahụ nke na Jizọs kpọrọ ya “ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe.” (Mak 11:17) Jizọs ọ̀ jụrụ ịbanye n’ụlọ nsọ ahụ nakwa n’ụlọ nzukọ? Ee e! Jehova ahapụbeghị ndokwa ahụ. Jizọs rubere isi wee na-aga ememme niile a na-eme n’ụlọ nsọ ahụ, na-agakwa n’ụlọ nzukọ, ruo mgbe Chineke tinyere aka wee gbanwesịa ihe.—Luk 4:16; Jọn 5:1.

20 Ọ bụrụ na Jizọs rubere isi n’ọnọdụ ndị ahụ, ezi Ndị Kraịst kwesịkwara irube isi taa! N’ezie, oge anyị dị nnọọ iche n’oge ahụ n’ihi na ọ bụ oge anyị a ka e buru amụma mgbe dị anya gara aga na a ga-eweghachi ofufe dị ọcha. Chineke mesiri anyị obi ike na o nwekwaghị mgbe ọ ga-ekwe ka Setan merụọ ndị ya ọ kpọghachitere akpọghachite. (Aịzaya 2:1, 2; 54:17) N’ezie, anyị na-ahụ mmehie na ezughị okè n’ime ọgbakọ Ndị Kraịst. Ànyị kwesịrị inupụrụ Jehova isi n’ihi ezughị okè nke ndị ọzọ, ikekwe, hapụ ije nzukọ Ndị Kraịst ma ọ bụ katọwa ndị okenye? Anyị ekwesịghị ma ọlị! Kama nke ahụ, anyị ga-eji obi anyị na-akwado ndị na-edu ndú n’ọgbakọ. Anyị ga-erubekwa isi wee na-eje nzukọ Ndị Kraịst na mgbakọ dị iche iche, na-etinyekwa ndụmọdụ si n’Akwụkwọ Nsọ a na-enye anyị n’ebe ndị ahụ n’ọrụ.—Ndị Hibru 10:24, 25; 13:17.

Ihe Osise dị na peeji nke 63

Anyị na-erube isi wee na-eme ihe anyị na-amụta ná nzukọ Ndị Kraịst

21. Olee ihe Jizọs mere mgbe ndị mmadụ gbalịrị ime ka o nupụrụ Chineke isi, gịnị bụ ihe nlereanya o setịpụụrụ anyị?

21 Ọ dịghị mgbe Jizọs kwere ka ndị mmadụ, ọbụna ndị enyi na-ebughị ihe ọjọọ n’obi, mee ka ọ kwụsị irubere Jehova isi. Dị ka ihe atụ, Pita onyeozi gbalịrị ime ka Nna ya ukwu kweta na ọ dịghị mkpa ka ọ taa ahụhụ ma nwụọ. Jizọs jụrụ nnọọ ndụmọdụ hiere ụzọ Pita nyere ya ka o meere onwe ya ebere, ọ bụ ezie na Pita ebughị ihe ọjọọ n’obi. (Matiu 16:21-23) Ugboro ugboro, ndị na-eso ụzọ Jizọs taa na-edi ihe ndị ikwu ha ndị na-ebughị ihe ọjọọ n’obi na-eme, bụ́ ndị pụrụ ịnwa ịkụda ha obi ka ha ghara irube isi n’iwu Chineke nakwa n’ụkpụrụ ya. Dị ka ndị soro ụzọ Jizọs na narị afọ mbụ, anyị kwenyesiri ike na “anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

Ụgwọ Ọrụ A Na-enweta n’Irube Isi Dị Ka Kraịst Rubere

22. Olee ajụjụ Jizọs zara, olee otú o si zaa ya?

22 Mgbe Jizọs chere ọnwụ ihu, e lere nrubeisi ya ule siri oké ike. N’ụbọchị nsogbu ahụ, “ọ mụtara nrubeisi” n’ụzọ zuru ezu. O mere uche Nna ya, ọ bụghị nke ya. (Luk 22:42) O si otú a setịpụ ihe nlereanya zuru okè n’iguzosi ike n’ezi ihe. (1 Timoti 3:16) Ọ zara ajụjụ ahụ e welitere mgbe dị anya gara aga, ya bụ, Mmadụ zuru okè ọ̀ pụrụ ịnọgide na-erubere Jehova isi ọbụna mgbe ule bịaara ya? Ma Adam ma Iv emeghị otú ahụ. Ma, Jizọs bịara bie ndụ, nwụọkwa, wee gosi na mmadụ zuru okè pụrụ ime otú ahụ. Onye kasị ukwuu n’ime ndị niile Jehova kere zara ajụjụ ahụ n’ụzọ kasị mma. O rubere isi ọbụna mgbe o furu ya ihe dị ukwuu.

23-25. (a) Olee ihe jikọrọ nrubeisi na iguzosi ike n’ezi ihe? Nye ihe atụ. (b) Gịnị bụ ihe a ga-atụle n’Isi nke Asaa?

23 A na-egosi nrubeisi site n’iguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụ site n’iji obi dum na-asọpụrụ Jehova. N’ihi isi Jizọs rubere, ọ nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe, bụ́ nke baara mmadụ niile uru. (Ndị Rom 5:19) Jehova nyere Jizọs ụgwọ ọrụ dị ukwuu. Ọ bụrụ na anyị erubere Nna anyị ukwu bụ́ Kraịst isi, Jehova ga-enyekwa anyị ụgwọ ọrụ. Irubere Kraịst isi na-eduga ná “nzọpụta ebighị ebi”!—Ndị Hibru 5:9.

24 Iguzosi ike n’ezi ihe bụkwa ụgwọ ọrụ n’onwe ya. Ilu 10:9 na-asị: “Onye na-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe ga na-eje ije n’obi iru ala.” Ọ bụrụ na e were iguzosi ike n’ezi ihe tụnyere nnukwu ụlọ e ji blọk mara mma wuo, a pụrụ iji blọk nke ọ bụla n’ime ha tụnyere isi ọ bụla anyị rubere. Otu blọk pụrụ iyi ihe na-adịghị mkpa, ma nke ọ bụla n’ime ha nwere ọrụ ọ na-arụ, nke ọ bụla bakwara uru. Mgbe e dokọtara ọtụtụ blọk ọnụ, a na-ewu ihe bara uru karị. Mgbe e jikọtara isi niile anyị rubere, gụkọta ha otu otu, ma nke taa ma nke echi, ma nke afọ a ma nke afọ ọzọ, ọ na-aghọ ụlọ mara mma nke bụ́ iguzosi ike n’ezi ihe.

25 Ịnọgide na-erube isi ruo ogologo oge na-echetara anyị àgwà ọzọ dị mkpa, ya bụ, ntachi obi. Ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ na nke a bụ ihe a ga-atụle n’Isi nke Asaa.

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Soro Jizọs?

  • Olee ụfọdụ iwu Kraịst nyere, olee otú anyị pụrụ isi rube isi na ha, oleekwa ngọzi ndị ọ ga-eweta?—Jọn 15:8-19.

  • Olee otú ndị ikwu Jizọs si lee ozi ya anya ná mmalite, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta n’otú Jizọs si meso ha omume?—Mak 3:21, 31-35.

  • Gịnị mere o kwesịtụdịghị ka anyị chewe na irube isi pụrụ ime ka anyị ghara inwe obi ụtọ ná ndụ?—Luk 11:27, 28.

  • Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta ná mmasị Jizọs nwere irube isi n’iwu a na-enyeghị ya kpọmkwem?—Matiu 17:24-27.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya