Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Ọ Bụ Jehova Bụ́ Chineke Gị Ka I Kwesịrị Ife Ofufe”
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
    • 3, 4. (a) Olee ihe mbụ Setan kwuru n’ọnwụnwa nke mbụ na nke abụọ ọ nwara Jizọs? Oleekwa ihe ọ ga-abụ na ọ chọrọ ime ka Jizọs chewe? (b) Olee otú Setan si esiri ndị mmadụ ụdị ọnyà ahụ taa?

      3 Gụọ Matiu 4:1-7. Setan ji aghụghọ bịa n’ọnwụnwa nke mbụ na nke abụọ ọ nwara Jizọs. Ọ sịrị Jizọs: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke.” Ọ̀ bụ na o doghị Setan anya na Jizọs bụ Ọkpara Chineke? N’eziokwu, Setan a, onye bụ́bu otu n’ime ụmụ Chineke, ma na Jizọs bụ onye mbụ Chineke kere. (Kọl. 1:15) O dokwara anya na Setan ma na Jehova si n’eluigwe gwa Jizọs n’oge e mere ya baptizim, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m.” (Mat. 3:17) Ma, ọ ga-abụ na Setan chọrọ ime ka Jizọs chewe ma Nna ya ọ̀ hụkwara ya n’anya n’eziokwu ma ọ bụkwanụ ma ò kwesịrị ịtụkwasị Nna ya obi. N’ọnwụnwa nke mbụ ọ nwara Jizọs ka o mee ka nkume ghọọ achịcha, ihe ọ na-ajụ Jizọs bụ: ‘Ebe ị bụ Ọkpara Chineke, gịnị mere na Nna gị enyeghị gị nri n’ala ịkpa a?’ N’ọnwụnwa nke abụọ ọ nwara Jizọs ka o si n’elu ihe a rụbichiri n’elu ụlọ nsọ wụda, ihe ọ na-ajụ Jizọs bụ: ‘Ebe ị bụ Ọkpara Chineke, obi ọ̀ kara gị na Nna gị ga-echebe gị?’

  • “Ọ Bụ Jehova Bụ́ Chineke Gị Ka I Kwesịrị Ife Ofufe”
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
    • 5. Gịnị ka Jizọs mere mgbe a nwara ya ọnwụnwa nke mbụ na nke abụọ?

      5 Ka anyị leba anya n’ihe Jizọs mere mgbe a nwara ya ọnwụnwa nke mbụ na nke abụọ. Obi siri Jizọs ezigbo ike na Nna ya hụrụ ya n’anya, o jikwa obi ya niile tụkwasị Nna ya obi. Jizọs kwuru ihe dị n’Okwu Nna ya, jiri ya gosi Setan ozugbo na ya ekwetaghị ụgha ya. Ọ dabara nnọọ adaba na aha Chineke, bụ́ Jehova, dị n’amaokwu ndị Jizọs ji zaa Setan okwu. (Diut. 6:16; 8:3) Otú a Ọkpara Chineke si kpọọ ezigbo aha Nna ya gosiri n’eziokwu na ọ tụkwasịrị Nna ya obi n’ihi na aha ahụ na-egosi na Jehova ga-emezurịrị nkwa ọ bụla o kwere.a

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya