Isi nke Iri
Nkwa Maka Onyeisi Udo
1. Gịnị meworo ihe a kpọrọ mmadụ eri oge Ken?
IHE dị ka puku afọ isii gara aga, a mụrụ nwatakịrị mbụ bụ́ mmadụ. Aha ya bụ Ken, ọmụmụ ya pụkwara iche. Ma ndị mụrụ ya, ma ndị mmụọ ozi, ọbụna Onye Okike ahụtụbeghị nwa ọhụrụ bụ́ mmadụ. Nwatakịrị a a mụrụ ọhụrụ gaara ewetara agbụrụ mmadụ a mara ikpe ọnwụ olileanya. Lee ndakpọ olileanya ọ bụ mgbe ọ ghọrọ ogbu mmadụ ka o torusịrị ogo mmadụ! (1 Jọn 3:12) Kemgbe ahụ ihe a kpọrọ mmadụ ahụwo ọtụtụ igbu ọchụ ndị ọzọ. N’ịbụ ndị nwere ọchịchọ ime ihe ọjọọ, ụmụ mmadụ na ibe ha ma ọ bụ ha na Chineke adịghị n’udo.—Jenesis 6:5; Aịsaịa 48:22.
2, 3. Atụmanya dịgasị aṅaa ka Jisọs Kraịst meghere, gịnịkwa ka anyị na-aghaghị ime iji nweta ngọzi ndị dị otú ahụ?
2 Ihe dị ka narị afọ iri anọ mgbe a mụsịrị Ken, a mụrụ nwa ọhụrụ ọzọ. Aha ya bụ Jisọs, ọmụmụ ya pụkwara iche. Ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mụrụ ya, site n’ike mmụọ nsọ—nanị ụdị ịmụ nwa dị otú ahụ e nwetụrụla. Mgbe a mụrụ ya, ìgwè ndị mmụọ ozi ọṅụ juru obi bụkuru Chineke abụ otuto, na-asị: “Otuto dịrị Chineke n’ebe kachasị ihe nile elu, udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti mmadụ ndị ihe ha dị Ya ezi mma.” (Luk 2:13, 14) Kama ịbụ ogbu mmadụ, Jisọs meghere ụzọ ka ụmụ mmadụ na Chineke dị n’udo ma nweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16; 1 Ndị Kọrint 15:55.
3 Aịsaịa buru amụma na a ga-akpọ Jisọs “Onyeisi Udo.” (Aịsaịa 9:6) Ọ ga-enye ndụ ya n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ, si otú a mee ka mgbaghara mmehie kwe omume. (Aịsaịa 53:11) Taa, a pụrụ iso Chineke dị n’udo ma nweta mgbaghara mmehie dabere n’okwukwe e nwere na Jisọs Kraịst. Ma ngọzi ndị dị otú ahụ adịghị abịa n’onwe ha. (Ndị Kọlọsi 1:21-23) Ndị chọrọ ha aghaghị ịmụta ịdị na-erubere Jehova Chineke isi. (1 Pita 3:11; tụlee Ndị Hibru 5:8, 9.) N’oge Aịsaịa, Israel na Juda mere nnọọ ihe dị iche na nke ahụ.
Ichigharịkwuru Ndị Mmụọ Ọjọọ
4, 5. Gịnị bụ ọnọdụ dịnụ n’oge Aịsaịa, ònyekwa ka ụfọdụ ndị chigharịkwuuru?
4 N’ihi nnupụisi ha, omume nke ndị ha na Aịsaịa dịkọrọ ndụ jọgburu onwe ya, nke bụ́ n’ezie olulu nke ọchịchịrị ime mmụọ. Udo adịghị ọbụna n’alaeze ebe ndịda nke Juda, bụ́ ebe ụlọukwu Chineke dị. N’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ha, ndị Juda nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị Asiria wakporo, oge ndị dị njọ na-abịakwa. Ònye ka ha gakwuuru maka enyemaka? N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ gakwuuru Setan, ọ bụghị Jehova. Ee e, ha akpọghị Setan aha kpọmkwem. Kama, dị ka Eze Sọl oge ochie mere, ha tinyere aka ná mgbaasị, na-achọ ihe ngwọta nye nsogbu ha site n’ịgbalị iso ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu.—1 Samuel 28:1-20.
5 Ụfọdụ ọbụna na-akwalite omume a. Aịsaịa na-ezo aka ná ndapụ n’ezi ofufe dị otú ahụ mgbe ọ sịrị: “Mgbe ha ga-asị unu, Jụọnụ ndị na-ajụ mmụọ ihe ase, jụọkwanụ ndị dibịa afa, ndị na-ebe ka ụmụ nnụnụ, na-atamukwa ntamu: ndị ọ bụla ágaghị ajụ Chineke ya ase? ọ̀ bụ n’ihi ndị dị ndụ ka a ga-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase?” (Aịsaịa 8:19) Ndị na-ajụ ndị mmụọ ase pụrụ ịghọgbu ndị mmadụ, “na-ebe ka ụmụ nnụnụ, na-atamukwa ntamu.” Onye dị ndụ nke na-ajụ ndị mmụọ ase pụrụ imepụta ụda dị otú ahụ a na-asị na ọ bụ ndị nwụrụ anwụ na-eme site n’ịgbanwe ụda olu ya. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ndị mmụọ ọjọọ pụrụ itinye aka kpọmkwem ma mee ka ha bụ ndị nwụrụ anwụ, dị ka o mere n’ụzọ doro anya mgbe Sọl jere jụọ nwanyị mgbaasị nọ na Endoa ase.—1 Samuel 28:8-19.
6. N’ihi gịnị ka e kwesịrị iji taa ndị Israel tinyere aka ná mgbaasị ụta karịsịa?
6 Ihe a nile na-eme na Juda n’agbanyeghị eziokwu ahụ bụ́ na Jehova machibidoro ime mgbaasị. N’okpuru Iwu Mosis, ọ bụ mmehie na-eweta ọnwụ. (Levitikọs 19:31; 20:6, 27; Deuterọnọmi 18:9-12) N’ihi gịnị ka ndị bụ́ ihe nketa pụrụ iche nke Jehova ji na-eme mmehie dị oké njọ otú ahụ? N’ihi na ha agbakụtawo Iwu na ndụmọdụ Jehova azụ, ha aghọwokwa ndị ‘obi ha mere etili site n’aghụghọ nke mmehie.’ (Ndị Hibru 3:13) “Obi ha bụ nanị abụba dị ka abụba,” ha aghọwokwa ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke ha nọ.—Abụ Ọma 119:70.a
7. Olee otú ọtụtụ ndị taa si eṅomi ndị Israel nke oge Aịsaịa, gịnịkwa ga-abịakwasị ndị dị otú ahụ n’ọdịnihu ma ọ bụrụ na ha echegharịghị?
7 Ma eleghị anya ha na-eche, sị, ‘Olee uru Iwu Jehova bara ebe ndị Asiria na-aga ịwakpo anyị n’oge na-adịghị anya?’ Ha chọrọ ihe ngwọta ga-abịa ozugbo, nke dịkwa mfe, nye nsogbu ha, ha adịghịkwa njikere ichere ka Jehova mee uche ya. N’oge anyị kwa, ọtụtụ ndị na-eleghara iwu Jehova anya ma na-achọ ndị na-ajụ ndị mmụọ ase, na-enyocha nkọwa akara eluigwe, ma na-etinye aka n’ụdị anwansi ndị ọzọ iji gwọta nsogbu ha. Otú ọ dị, ezi uche adịghị nnọọ ná ndị dị ndụ ije chọwa azịza site n’aka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ka ọ na-adịghị na ya n’oge ahụ. Ihe ga-abịakwasị “ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na . . . ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha nile” n’ọdịnihu bụ ihe ga-abịakwasịkwa onye ọ bụla jụrụ ichegharị ma nọgide na-eme ihe ndị dị otú ahụ. Ha enweghị olileanya ọ bụla nke ịdị ndụ n’ọdịnihu.—Mkpughe 21:8.
‘Iwu na Ihe Àmà’ Chineke
8. Gịnị bụ “iwu” na “ihe àmà” ahụ anyị kwesịrị ịdị na-echigharịkwuru taa maka nduzi?
8 E zochighị iwu Jehova nke machibidoro mgbaasị nakwa iwu ya ndị ọzọ ezochi na Juda. E deturu ya edetu. Taa a pụrụ inweta Okwu ya n’ozuzu ya n’akwụkwọ e dere ede. Ọ bụ Bible, bụ́ nke na-agụnye ọ bụghị nanị nchịkọta nke iwu na nduzi ndị Chineke nyere kamakwa ihe ndekọ banyere mmeso Chineke mesoro ndị ya. Ihe ndekọ a dị na Bible banyere mmeso nke Jehova bụ ihe àmà, ma ọ bụ ihe akaebe, nke na-akụziri anyị ụdị onye Jehova bụ na àgwà ya. Kama ije jụwa ndị nwụrụ anwụ ase, olee ebe ndị Israel kwesịrị ịdị na-aga maka nduzi? Aịsaịa na-aza, sị: ‘N’iwu na n’ihe àmà!’ (Aịsaịa 8:20a) Ee, ndị na-achọ ezi nghọta kwesịrị ịga n’Okwu Chineke e dere ede.
9. Ihota Bible site n’oge ruo n’oge ọ̀ bara uru ọ bụla nye ndị mmehie na-enweghị nchegharị?
9 Ụfọdụ ndị Israel, bụ́ ndị na-etinye aka ná mgbaasị, pụrụ ịdị na-ekwu na ha na-akwanyere Okwu Chineke e dere ede ùgwù. Ma nzọrọ ndị dị otú ahụ bụ n’elu ọnụ, bụrụkwa omume ihu abụọ. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ha adịghị ekwu dị ka okwu a si dị, n’ezie ọ dịghị [ìhè nke] chi ọbụbọ dịịrị ha.” (Aịsaịa 8:20b) N’okwu dị aṅaa ka Aịsaịa na-ezo aka n’ebe a? Ikekwe ọ bụ n’okwu bụ́: ‘N’iwu na n’ihe àmà!’ Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị Israel si n’ezi ofufe dapụ na-ezo aka n’Okwu Chineke, dịkwa ka ndị si n’ezi ofufe dapụ na ndị ọzọ taa pụrụ isi na-ehota Akwụkwọ Nsọ. Ma ndị a bụ okwu ọnụ efu. Ihota Akwụkwọ Nsọ agaghị eduga n’inweta “ìhè nke chi ọbụbọ,” ma ọ bụ nghọta site n’aka Jehova, ma ọ bụrụ na e jikọtaghị ya na ime uche Jehova na ịjụ omume ndị na-adịghị ọcha.b
‘Oké Ụnwụ, Ọ Bụghị Oké Ụnwụ nke Nri’
10. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Juda si na-ata ahụhụ n’ihi ịjụ Jehova?
10 Inupụrụ Jehova isi na-akpata ịnọ n’ọchịchịrị nke uche. (Ndị Efesọs 4:17, 18) N’ụzọ ime mmụọ, ndị Juda ekpuwo ìsì, bụrụ ndị na-enweghị nghọta. (1 Ndị Kọrint 2:14) Aịsaịa kọwara ọnọdụ ha: “Ha ga-agabigakwa n’etiti ya, ná mkpa na agụụ.” (Aịsaịa 8:21a) N’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi nke mba ahụ—karịsịa n’oge ọchịchị Eze Ehaz—Juda ịdịgide dị ka alaeze kwụụrụ onwe ya dị n’ihe ize ndụ. Ndị iro gbara mba ahụ gburugburu. Ndị agha Asiria na-awakpo obodo dị iche iche nke Juda otu otu. Ndị iro ahụ bibiri ala na-emepụta ihe, wee mee ka nri dị ụkọ. Ọtụtụ nọ “ná mkpa na agụụ.” Ma ụdị agụụ ọzọ jikwa ala ahụ aka. Iri afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, Emọs buru amụma, sị: “Lee, ụbọchị na-abịa, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Onyenwe anyị Jehova pụta), mgbe M ga-ezite oké ụnwụ n’ala, ọ bụghị oké ụnwụ nke nri, ọ bụghịkwa akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ nke ịnụ okwu nile nke Jehova.” (Emọs 8:11) Juda nọ n’ụnwụ ime mmụọ dị otú ahụ ugbu a!
11. Juda ọ̀ ga-amụta ihe site n’ịdọ aka ná ntị o nwetara?
11 Juda ọ̀ ga-amụta ihe ma laghachikwuru Jehova? Ndị ya hà ga-esi ná mgbaasị na ikpere arụsị wezụga onwe ha ma laghachi ‘n’iwu na n’ihe àmà’ ahụ? Jehova buru ụzọ hụ ihe ga-abụ mmeghachi omume ha: “Ọ ga-erukwa, mgbe agụụ na-agụ ha, na ha ga-akpasu onwe ha iwe, [jiri] eze ha, [jirikwa] Chineke ha, kọchaa nkọcha, ha ga-eche ihu n’elu.” (Aịsaịa 8:21b) Ee, ọtụtụ ga-ata eze ha bụ́ mmadụ ụta maka iduba ha n’ọnọdụ a. Ụfọdụ ọbụna ga-eji n’ihi nzuzu taa Jehova ụta maka ọdachi ha! (Tụlee Jeremaịa 44:15-18.) Taa, ọtụtụ ndị na-emeghachi omume n’otu ụzọ ahụ, na-ata Chineke ụta maka ọdachi ndị ajọ omume ụmụ mmadụ kpatara.
12. (a) Na gịnị ka isi n’ebe Chineke nọ wezụga onwe ha dugaworo Juda? (b) Olee ajụjụ ndị dị mkpa na-ebilite?
12 Ịkọcha Chineke ọ̀ ga-eme ka udo dịrị ndị bi na Juda? Ee e. Aịsaịa na-ebu amụma, sị: “Ala ka ha ga-elegidekwa anya, ma, lee, ahụhụ na ọchịchịrị, bụ́ mgbachi nke mkpa; ọ bụkwa oké ọchịchịrị ka a ga na-enupụ ha baa.” (Aịsaịa 8:22) Mgbe ha lelisịrị anya ha elu n’eluigwe iji taa Chineke ụta, ha ga-eledaghachi anya n’ala, laghachi n’enweghị olileanya ha. Mwezụga ha wezụgara onwe ha n’ebe Chineke nọ akpatawo ọdachi. (Ilu 19:3) Ma, gịnị banyere nkwa Chineke kwere Abraham, Aịsak, na Jekọb? (Jenesis 22:15-18; 28:14, 15) Jehova ọ̀ ga-ahapụ imezu ya? Ndị Asiria ma ọ bụ ndị agha ọzọ dị ike hà ga-ebibi usoro ndị eze ahụ e kwere Juda na Devid ná nkwa? (Jenesis 49:8-10; 2 Samuel 7:11-16) À ga-ahapụ ndị Israel n’ọchịchịrị ruo mgbe ebighị ebi?
Ala ‘E Lelịrị’
13. Gịnị bụ “Galili nke mba nile,” oleekwa otú e si “lelịa” ya?
13 Aịsaịa zoro aka ugbu a n’otu n’ime ọdachi ndị kasị njọ na-abịakwasị ụmụ Abraham: “Ọ dịghị mgbachi ga-adịrị nwanyị nke mkpa kpara. Na mgbe mbụ O mere ka e lelịa ala Zebulun na ala Naftali, ma na mgbe ikpeazụ ka O meworo ka a sọpụrụ ya, n’ụzọ oké osimiri, n’ofe Jọdan, Galili nke mba nile.” (Aịsaịa 9:1) Galili bụ ókèala dị n’alaeze ebe ugwu nke Israel. N’amụma Aịsaịa ọ na-agụnye “ala Zebulun na ala Naftali” nakwa ‘ụzọ oké osimiri,’ bụ́ ụzọ oge ochie nke gafere n’akụkụ Oké Osimiri Galili ma dịrị ruo n’Oké Osimiri Mediterranean. N’oge Aịsaịa, a na-akpọ ógbè ahụ “Galili nke mba nile,” ma eleghị anya n’ihi na ọ bụ ndị na-abụghị ndị Israel bi n’ọtụtụ n’ime obodo ya.c Olee otú e si “lelịa” ala a? Ndị Asiria na-ekpere arụsị meriri ya, kpụrụ ndị Israel gaa n’ala ọzọ, ma kpọrọ ndị na-ekpere arụsị, ndị na-abụghị ụmụ Abraham, kpọjuo n’ógbè ahụ dum. Alaeze ebo iri ahụ nke ebe ugwu si otú a pụọ n’akụkọ ihe mere eme dị ka mba dị iche!—2 Ndị Eze 17:5, 6, 18, 23, 24.
14. N’echiche dị aṅaa ka “mgbachi” nke Juda na-agaghị esi ruo ka nke alaeze ebo iri ahụ?
14 Ndị Asiria nọ na-arụgidekwa Juda. Ọ̀ ga-aghọ nke ‘gbachiri agbachi’ ruo mgbe ebighị ebi dị ka alaeze ebo iri ahụ nke Zebulun na Naftali nọchitere anya ya? Ee e. “Na mgbe ikpeazụ” Jehova ga-eweta ngọzi n’ógbè nke alaeze ebe ndịda nke Juda na ọbụna n’ala ahụ nke alaeze ebe ugwu chịrị na mbụ. N’ụzọ dị aṅaa?
15, 16. (a) Olee mgbe bụ́ “mgbe ikpeazụ” mgbe ọnọdụ ga-agbanwere “ala Zebulun na ala Naftali”? (b) Olee otú e si mesịa sọpụrụ ala ahụ e lelịrị?
15 Matiu onyeozi zara ajụjụ a n’ihe o dekọrọ site n’ike mmụọ nsọ banyere ozi elu ala Jisọs. N’ịkọwa mmalite nke ozi ahụ, Matiu kwuru, sị: “O [Jisọs] wee hapụ Nazaret, bịa biri na Kapanaum, nke dị n’ụsọ osimiri, n’ókèala Zebulun na Naftali: ka okwu e kwuru site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma wee mezuo, sị, Ala Zebulun na ala Naftali, n’ụzọ oké osimiri, n’ofe Jọdan, Galili nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ nke na-anọdụ n’ọchịchịrị hụrụ oké ìhè, ndị na-anọdụkwa n’ala na onyinyo ọnwụ, ndị a ka ìhè waliteere.”—Matiu 4:13-16.
16 Ee, “mgbe ikpeazụ” ahụ Aịsaịa buru n’amụma bụ oge ije ozi Kraịst n’elu ala. Jisọs biri ihe ka ukwuu ná ndụ ya n’elu ala na Galili. Ọ bụ n’ógbè Galili ka ọ malitere ozi ya ma malite ikwusa, sị: “Alaeze eluigwe dị nso.” (Matiu 4:17) Na Galili, o ziri Ozizi Elu Ugwu ya ahụ a ma ama, họrọ ndị ozi ya, rụọ ọrụ ebube ya mbụ, ma gosi ihe dị ka ụmụazụ dị 500 onwe ya mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ. (Matiu 5:1–7:27; 28:16-20; Mak 3:13, 14; Jọn 2:8-11; 1 Ndị Kọrint 15:6) N’ụzọ dị otú a Jisọs mezuru amụma Aịsaịa site n’ịsọpụrụ “ala Zebulun na ala Naftali.” Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ndị bi na Galili ka Jisọs ziri ozi ya. Site n’ikwusa ozi ọma n’ala ahụ nile, Jisọs ‘mere ka a sọpụrụ’ mba Israel dum, gụnyere Juda.
“Oké Ìhè” Ahụ
17. Olee otú “oké ìhè” si chaa na Galili?
17 Otú ọ dị, gịnị banyere nhota Matiu hotara “oké ìhè” n’ime Galili? Nke a bụkwa ihota ihe e kwuru n’amụma Aịsaịa. Aịsaịa dere, sị: “Ndị na-ejegharị n’ọchịchịrị hụrụ ìhè ukwu: ndị bi n’ala onyinyo ọnwụ, ìhè amụkwasịwo ha.” (Aịsaịa 9:2) Ka ọ na-erule na narị afọ mbụ O.A., ụgha dị iche iche nke ndị na-ekpere arụsị ekpuchiwo ìhè nke eziokwu ahụ. Ndị ndú okpukpe ndị Juu emewo ka nsogbu ahụ ka njọ site n’ijigidesi ọdịnala okpukpe ha ike bụ́ nke ha jiworo ‘mee okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu.’ (Matiu 15:6) E megburu ndị dị umeala n’obi, ha nọkwa ná mgbagwoju anya, ka ha nọ na-agbaso “ndị ndú [kpuru] ìsì.” (Matiu 23:2-4, 16) Mgbe Jisọs, bụ́ Mesaịa ahụ, bịara, e mepere anya nke ọtụtụ ndị dị umeala n’obi n’ụzọ na-atụ n’anya. (Jọn 1:9, 12) A kọwara ọrụ Jisọs rụrụ mgbe ọ nọ n’elu ala na ngọzi ndị si n’àjà ya pụta nke ọma n’amụma Aịsaịa dị ka “ìhè ukwu.”—Jọn 8:12.
18, 19. N’ihi gịnị ka ndị nabatara ìhè ahụ ga-eji ṅụrịa oké ọṅụ?
18 Ndị nabatara ìhè ahụ nwere ihe dị ukwuu mere ha ga-eji na-aṅụrị ọṅụ. Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “I mewo ka mba ahụ baa ụba, I mewo ka ọṅụ dịịrị ya ukwuu: ha aṅụrịwo n’ihu Gị dị ka ọṅụ nke dị n’owuwe ihe ubi, dị ka mmadụ si etegharị egwú ọṅụ mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara n’agha.” (Aịsaịa 9:3) N’ihi ọrụ nkwusa nke Jisọs na ụmụazụ ya, ndị nwere obi eziokwu pụtara, na-egosi na ọ na-agụ ha agụụ ife Jehova n’ime mmụọ na eziokwu. (Jọn 4:24) N’ihe na-erughị afọ anọ, ọtụtụ ìgwè mmadụ nakweere Iso Ụzọ Kraịst. E mere mmadụ 3,000 baptism n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A. Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, “ọnụ ọgụgụ ndị ikom ahụ wee ruo ihe ha ka [puku mmadụ ise].” (Ọrụ 2:41; 4:4) Ka ndị na-eso ụzọ ya ji ịnụ ọkụ n’obi na-egbukepụ ìhè ahụ, “ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ Jisọs na-abakwa ụba na Jerusalem hie nne; oké ìgwè ndị nchụàjà na-aṅakwa okwukwe ahụ ntị.”—Ọrụ 6:7.
19 Dị ka ndị na-aṅụrị ọṅụ n’owuwe ihe ubi bara ụba ma ọ bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ikesa ihe ndị bara uru a kwatara n’agha mgbe e nwesịrị oké mmeri, ụmụazụ Jisọs ṅụrịrị ọṅụ n’ihi mmụba ahụ. (Ọrụ 2:46, 47) Ka oge na-aga, Jehova mere ka ìhè chakwasị ndị mba ọzọ. (Ọrụ 14:27) Ya mere ndị si n’agbụrụ nile ṅụrịrị ọṅụ na e megheworo ha ụzọ ịbịakwute Jehova.—Ọrụ 13:48.
“Dị Ka n’Ụbọchị nke Midian”
20. (a) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ndị Midian si gosi na ha bụ ndị iro nke Israel, oleekwa otú Jehova si weta iyi egwu ha ná njedebe? (b) Olee otú Jisọs ga-esi weta iyi egwu nke ndị iro nke ndị Chineke ná njedebe “n’ụbọchị nke Midian” na-abịa n’ọdịnihu?
20 Ihe ndị si n’ọrụ Mesaịa ahụ pụta ga-adịgide adịgide, dị ka anyị na-ahụ site n’ihe ndị Aịsaịa kwuziri: “Yoke nke ibu ya, na mkpanaka nke ubu ya, bụ́ ndele nke onye na-achị ya n’ihe ike, Ị nyajiwo ha, dị ka n’ụbọchị nke Midian.” (Aịsaịa 9:4) Ihe karịrị otu narị afọ tupu oge Aịsaịa, ndị Midian na ndị Moab gbara izu ịraba ndị Israel ná mmehie. (Ọnụ Ọgụgụ 25:1-9, 14-18; 31:15, 16) Ka e mesịrị, ndị Midian menyere ndị Israel ụjọ site n’ịdị na-awakpo na ịkwakọrọ ihe n’ime ime obodo ha na n’ubi ha ruo afọ asaa. (Ndị Ikpe 6:1-6) Ma Jehova, site n’aka ohu ya bụ́ Gideọn, meriri ndị agha Midian ajọ mmeri. Mgbe ‘ụbọchị nke Midian’ ahụ gasịrị, e nweghị ihe àmà na-egosi na ndị Midian nyere ndị Jehova nsogbu ọzọ. (Ndị Ikpe 6:7-16; 8:28) N’ọdịnihu dị nso, Jisọs Kraịst, bụ́ Gideọn ka ukwuu, ga-eti ndị iro nke oge a nke ndị Jehova ihe otiti na-eweta ọnwụ. (Mkpughe 17:14; 19:11-21) Mgbe ahụ “dị ka n’ụbọchị nke Midian,” a ga-enwe mmeri zuru ezu, nke na-adịgidekwa adịgide, ọ bụghị site n’ike agha nke mmadụ, kama site n’ike Jehova. (Ndị Ikpe 7:2-22) Ndị Chineke agaghị atakwa ahụhụ ọzọ n’okpuru yoke nke mmegbu!
21. Gịnị ka amụma Aịsaịa na-egosi banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu?
21 Ngosipụta nke ike Chineke abụghị iji too agha. Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie bụ Onyeisi Udo, sitekwa n’ibibi ndị iro ya, ọ ga-eweta udo ebighị ebi. Aịsaịa kwuziri okwu ugbu a banyere ejiji agha ịbụ ndị ọkụ repịara kpam kpam: “Akpụkpọ ụkwụ ọ bụla nke ndị agha na-eyi akpụkpọ ụkwụ n’ụzụ agha, na uwe a tụrụrụ n’ọbara, ha nile ga-abụ ihe isure ọkụ, ọbụna nri ọkụ.” (Aịsaịa 9:5) A gakwaghị enwe ịma jijiji nke akpụkpọ ụkwụ nke ndị agha na-azọ ije na-akpata. A gakwaghị ahụ uwe agha nke ndị bụ́ dike n’ịlụ agha bụ́ ndị jupụtara n’ọbara. Agha agaghị adịkwa ọzọ!—Abụ Ọma 46:9.
“Onye Ndụmọdụ Dị Ebube”
22. Olee aha amụma nke nwere ọtụtụ akụkụ nke e nyere Jisọs n’akwụkwọ Aịsaịa?
22 N’oge a mụrụ ya n’ụzọ ọrụ ebube, onye ahụ a mụrụ ịbụ Mesaịa nwetara aha bụ́ Jisọs, nke pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.” Ma o nwere aha ndị ọzọ, aha amụma ndị na-akọwapụta ọrụ ya bụ́ isi na ọkwá ya dị elu. Otu n’ime aha dị otú ahụ bụ Immanuel, nke pụtara “Chineke Nọnyeere Anyị.” (Aịsaịa 7:14, nkọwa ala ala peji nke NW) Aịsaịa kọwaziri aha amụma ọzọ: “A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onyeisi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya [Onye Ndụmọdụ Dị Ebube, NW], Chineke Nke bụ́ Dike, Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi, Onyeisi Udo.” (Aịsaịa 9:6) Cheedị echiche ihe buru ibu aha amụma a nke nwere ọtụtụ akụkụ pụtara.
23, 24. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si bụrụ “Onye Ndụmọdụ Dị Ebube”? (b) Olee otú ndị Kraịst na-enye ndụmọdụ taa pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Jisọs?
23 Onye ndụmọdụ bụ onye na-adụ ọdụ, ma ọ bụ na-adọ aka ná ntị. Mgbe ọ nọ n’elu ala, Jisọs Kraịst nyere ndụmọdụ magburu onwe ya. N’ime Bible anyị na-agụ na “ibobo ozizi Ya nwụrụ ìgwè mmadụ nile n’ahụ.” (Matiu 7:28) Ọ bụ Onye Ndụmọdụ nwere amamihe, nke nwekwara ọmịiko, onye ghọtara ọdịdị mmadụ n’ụzọ na-enweghị atụ. Ndụmọdụ ya adịghị abụ nanị ịba mba ma ọ bụ inye ahụhụ. Ọtụtụ mgbe karị, ọ na-abụ n’ụdị ntụziaka na ndụmọdụ ịhụnanya. Ndụmọdụ Jisọs magburu onwe ya n’ihi na ọ na-abụ nke amamihe dị na ya mgbe nile, nke zuru okè, na nke na-adịghị ada ada. Mgbe e ji ya mee ihe, ọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Jọn 6:68.
24 Ndụmọdụ Jisọs adịghị esite nanị n’inwe uche dị nkọ. Kama nke ahụ, ọ na-asị: “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke Onye zitere m.” (Jọn 7:16) Dị ka ọ dị n’ihe banyere Solomọn, Jehova Chineke bụ Isi Iyi nke amamihe Jisọs. (1 Ndị Eze 3:7-14; Matiu 12:42) Ihe nlereanya nke Jisọs kwesịrị ịkpali ndị na-ezi ihe na ndị na-enye ndụmọdụ n’ọgbakọ ndị Kraịst ime mgbe nile ka ntụziaka ha dabere n’Okwu Chineke.—Ilu 21:30.
“Chineke Nke Bụ́ Dike” na “Nna Nke Bụ́ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi”
25. Gịnị ka aha bụ́ “Chineke Nke bụ́ Dike” na-agwa anyị banyere Jisọs ahụ nọ n’eluigwe?
25 Jisọs bụkwa “Chineke Nke bụ́ Dike” na “Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi.” Nke a apụtaghị na ọ na-eweghara ikike na ọkwá Jehova, onye bụ́ “Chineke, bụ́ Nna anyị.” (2 Ndị Kọrint 1:2) “Ọ [Jisọs] gụghị ya n’ihe Ọ ga-ejidesi ike, bụ́ ịha ka Chineke.” (Ndị Filipaị 2:6) A kpọrọ ya Chineke Nke bụ́ Dike, ọ bụghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. Ọ dịtụbeghị mgbe Jisọs chere echiche na ya bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, n’ihi na o kwuru banyere Nna ya dị ka ‘nanị ezi Chineke ahụ,’ ya bụ, nanị Chineke e kwesịrị ife ofufe. (Jọn 17:3; Mkpughe 4:11) N’ime Akwụkwọ Nsọ, okwu bụ́ “chi” pụrụ ịpụta “onye bụ́ dike” ma ọ bụ “onye siri ike.” (Ọpụpụ 12:12; Abụ Ọma 8:5; 2 Ndị Kọrint 4:4) Tupu Jisọs abịa n’ụwa, ọ bụ “chi,” onye “dịrị n’ụdị Chineke.” Mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, ọ laghachiri ọbụna n’ọkwá ka elu n’eluigwe. (Jọn 1:1; Ndị Filipaị 2:6-11) Ọzọkwa, utu aha ahụ bụ́ “chi” nwere ihe ọzọ ọ pụtara. A kpọrọ ndị ikpe nọ n’Israel “chi”—Jisọs n’onwe ya kpọrọ ha ya otu ugboro. (Abụ Ọma 82:6; Jọn 10:35) Jisọs bụ Ọkàikpe Jehova họpụtara, “Onye gaje ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.” (2 Timoti 4:1; Jọn 5:30) N’ụzọ doro anya, a kpọrọ ya n’ụzọ dabara adaba Chineke Nke bụ́ Dike.
26. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpọọ Jisọs “Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi”?
26 Utu aha bụ́ “Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi” na-ezo aka n’ikike Eze Mesaịa ahụ nwere inye ụmụ mmadụ olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ala. (Jọn 11:25, 26) Ihe nketa nke nna anyị mbụ, bụ́ Adam, hapụrụ bụ ọnwụ. Jisọs, bụ́ Adam ikpeazụ, “ghọrọ mmụọ nke na-enye ndụ.” (1 Ndị Kọrint 15:22, 45; Ndị Rom 5:12, 18) Dị nnọọ ka Jisọs, bụ́ Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi, ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, otú a ka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga na-erite uru nke ịbụ nna ya ruo mgbe ebighị ebi.—Ndị Rom 6:9.
“Onyeisi Udo”
27, 28. Uru dịgasị aṅaa magburu onwe ha na-abịara ndị “Onyeisi Udo” ahụ na-achị ma ugbu a ma n’ọdịnihu?
27 E wezụga ndụ ebighị ebi, udo dịkwa mmadụ mkpa, ma n’etiti ya na Chineke ma n’etiti ya na mmadụ ibe ya. Ọbụna taa, ndị na-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi nke “Onyeisi Udo” ahụ ‘akpụgharịwo mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.’ (Aịsaịa 2:2-4) Ha adịghị anọgide na-enwe ịkpọasị n’ihi esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nke ókèala, nke agbụrụ, ma ọ bụ nke akụ̀ na ụba. Ha dị n’otu n’ofufe nke nanị otu ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ha na-arụkwa ọrụ ka ha na ndị agbata obi ha nọgide na-adị n’udo, ma n’ime ọgbakọ ma n’èzí.—Ndị Galetia 6:10; Ndị Efesọs 4:2, 3; 2 Timoti 2:24.
28 N’oge nke Chineke, Kraịst ga-eme ka e nwee udo n’ụwa, bụ́ nke ga-ezu ụwa nile, nke siri ike, nke ga-adịgide adịgide. (Ọrụ 1:7) “Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ, n’elu ocheeze Devid, na n’elu alaeze ya, ime ka o guzosie ike, na ịkwagide ya n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume, site n’ugbu a wee ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịsaịa 9:7a) N’iji ikike ya mee ihe dị ka Onyeisi Udo, Jisọs agaghị achị n’aka ike ma ọlị. A gaghị anapụ ndị ọ na-achị ikike ha nwere ime nhọrọ ma chịa ha n’aka ike. Kama nke ahụ, ihe nile ọ ga-arụzu ga-abụ “n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume.” Lee mgbanwe na-akpali akpali ọ ga-abụ!
29. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ngọzi nke udo ebighị ebi?
29 N’ihi ihe ndị magburu onwe ha aha amụma Jisọs pụtara, okwu ndị Aịsaịa jiri mechie akụkụ a nke amụma ya na-akpali akpali n’ezie. Ọ na-ede, sị: “Ekworo Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-eme nke a.” (Aịsaịa 9:7b) Ee, Jehova ga-eji ekworo mee ihe. Ọ dịghị ihe ọ na-eme n’ejighị obi ya nile. Anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-emezu kpam kpam ihe ọ bụla o kwere nkwa ya. Mgbe ahụ, ọ bụrụ na ọ na-agụ onye ọ bụla agụụ inwe udo na-adịru ebighị ebi, ya jiri obi ya dum fee Jehova ofufe. Dị ka Jehova Chineke na Jisọs, bụ́ Onyeisi Udo ahụ, ka ndị ohu Chineke nile ‘na-anụrụ ọrụ ọma ọkụ n’obi.’—Taịtọs 2:14.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọtụtụ ndị kwenyere na ọ bụ Hezekaịa dere Abụ Ọma nke 119 tupu ọ ghọọ eze. Ọ bụrụ otú ahụ, o yiri ka e dere ya mgbe Aịsaịa nọ na-ebu amụma.
b Nkebi ahịrịokwu bụ́ “okwu a,” nke dị n’Aịsaịa 8:20, pụrụ izo aka n’ihe e kwuru banyere mgbaasị, bụ́ nke e hotara n’Aịsaịa 8:19. Ya bụrụ otú ahụ, Aịsaịa na-ekwu na ndị na-akwalite mgbaasị n’ime Juda ga-anọgide na-agba ndị ọzọ ume ịgakwuru ndị na-ajụ ndị mmụọ ase, n’ụzọ dị otú a kwa ha agaghị enweta nghọta site n’aka Jehova.
c Ụfọdụ ndị atụwo aro na ikekwe ọ bụ ndị na-abụghị ndị Israel bi n’obodo 20 ahụ dị na Galili bụ́ ndị Eze Solomọn nyere Haịram bụ́ eze Taịa.—1 Ndị Eze 9:10-13.
[Map/Foto dị na peeji nke 122]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Korazin
Betsaịda
Kapanaum
Ọzara Genesaret
Oké Osimiri Galili
Magadan
Taibirias
Osimiri Jọdan
GADARA
Gadara
[Foto ndị dị na peeji nke 119]
Ọmụmụ nke Ken na Jisọs pụchara nnọọ iche. Ọ bụ nanị nke Jisọs rụpụtara ihe na-enye obi ụtọ
[Foto dị na peeji nke 121]
A ga-enwe ụnwụ nke dị njọ karịa ụnwụ nri na akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri
[Foto dị na peeji nke 127]
Jisọs bụ ìhè n’ala ahụ