Mgbe Jisọs Bịara n’Ebube Alaeze
“Ụfọdụ dị n’etiti ndị guzoro n’ebe a . . . [agaghị] edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’alaeze Ya.”—MATIU 16:28.
1, 2. Gịnị mere ntakịrị oge mgbe Pentikọst 32 O.A. gasịrị, gịnịkwa bụ nzube nke ihe omume ahụ?
N’OGE na-adịghị anya mgbe Pentikọst 32 O.A. gasịrị, atọ n’ime ndị ozi Jisọs Kraịst hụrụ ọhụụ kwesịrị ncheta. Dị ka ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ si kwuo, “Jisọs chịịrị Pita, na Jemes, na Jọn nwanne ya, tinyere Onwe ya, O kuru ha rịgoo n’ugwu dị elu wee pụọ iche: O wee nwoghaa n’ihu ha.”—Matiu 17:1, 2.
2 Ọhụụ nnwogha ahụ bịara n’oge dị oké mkpa. Jisọs amaliteworị ịgwa ụmụazụ ya na ya gaje ịta ahụhụ ma nwụọ na Jerusalem, ma okwu Jisọs siiri ha ike ịghọta. (Matiu 16:21-23) Ọhụụ ahụ wusiri okwukwe nke ndị ozi atọ nke Jisọs ike n’ịkwadebe ha maka ọnwụ ya na-abịanụ nakwa maka afọ nile nke ịrụsi ọrụ ike na ule nke ga-esochi maka ọgbakọ ndị Kraịst. Ànyị pụrụ ịmụta ihe site n’ọhụụ ahụ taa? Ee, n’ihi na ihe o sere onyinyo ya na-ewere ọnọdụ n’oge anyị n’ezie.
3, 4. (a) Gịnị ka Jisọs kwuru ụbọchị isii tupu nnwogha ahụ? (b) Kọwaa ihe mere n’oge nnwogha ahụ.
3 Ụbọchị isii tupu nnwogha ahụ, Jisọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Nwa nke mmadụ gaje ịbịa n’ebube nke Nna Ya, Ya na ndị mmụọ ozi Ya; mgbe ahụ ka Ọ ga-enyeghachikwa onye ọ bụla dị ka omume ya si dị.” Okwu ndị a ga-emezu ‘n’ọgwụgwụ oge a.’ Jisọs gara n’ihu kwuo, sị: “N’ezie asị m unu, Ụfọdụ dị n’etiti ndị guzoro n’ebe a, ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’alaeze Ya.” (Matiu 16:27, 28; 24:3; 25:31-34, 41; Daniel 12:4) Nnwogha ahụ weere ọnọdụ iji mezuo okwu ndị ikpeazụ a.
4 Gịnị ka ndị ozi atọ ahụ hụrụ kpọmkwem? Ihe na-esonụ bụ nkọwa Luk nyere ihe omume ahụ: “Mgbe [Jisọs] na-ekpe ekpere, oyiyi ihu Ya wee dị iche, uwe Ya wee na-acha ụcha na-egbukwa dị ka àmụ̀mà. Ma lee, Ya na ndị ikom abụọ na-ekwurịta okwu, ndị bụ Mosis na Elaịja; ndị e mere ka a hụ ha anya n’ebube, ndị na-ekwukwa okwu banyere ọlịla Ya, nke Ọ gaje imezu na Jerusalem.” Mgbe ahụ, “igwe ojii wee bịa, kpuchie [ndị ozi ahụ]: ha wee tụọ egwu mgbe ha na-aba n’igwe ojii ahụ. Olu wee si n’igwe ojii ahụ pụta, sị, Onye a bụ Ọkpara m, Onye M họpụtara: nụrụnụ okwu Ya.”—Luk 9:29-31, 34, 35.
E Wusie Okwukwe Ike
5. Mmetụta dị aṅaa ka nnwogha ahụ nwere n’ahụ Pita onyeozi?
5 Pita onyeozi ebuworị ụzọ kọwaa Jisọs dị ka “Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.” (Matiu 16:16) Okwu Jehova sitere n’eluigwe kwadoro nkọwa ahụ, ọhụụ nke nnwogha Jisọs bụkwa ihe ngosi nke ọbịbịa Kraịst n’ike na ebube Alaeze, ikpe ihe a kpọrọ mmadụ ikpe n’ikpeazụ. Ihe karịrị afọ 30 mgbe nnwogha ahụ gasịrị, Pita dere, sị: “Anyị esoghị akụkọ ifo nke e ji amamihe kọọ, mgbe anyị mere ka unu mara ike na ọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ma e mere anyị ka anyị bụrụ ndị hụrụ ịdị ukwuu nke Onye ahụ. N’ihi na Ọ natara nsọpụrụ na ebube n’aka Chineke, bụ́ Nna, mgbe Ebube ahụ nke kwesịrị ịdị ukwuu mere ka olu dị otú a daara Ya, sị, Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị Mụ onwe m ezi mma: olu a ka anyị [onwe] anyị nụkwara ka ọ na-esi n’eluigwe daa, mgbe anyị na Ya nọ n’ugwu ahụ dị nsọ.”—2 Pita 1:16-18; 1 Pita 4:17.
6. Olee otú ihe si gaa n’ihu mgbe nnwogha ahụ gasịrị?
6 Taa, ihe ndị ozi atọ ahụ hụrụ na-ewusikwa okwukwe anyị ike. N’ezie, ihe anọwo na-eme kemgbe 32 O.A. N’afọ sochiri ya, Jisọs nwụrụ, a kpọlitekwara ya n’ọnwụ, na-arịgo n’aka nri nke Nna ya. (Ọrụ 2:29-36) Na Pentikọst nke afọ ahụ, e wepụtara “Israel nke Chineke” nke ọhụrụ, ọrụ nkwusa malitekwara, na-ebido na Jerusalem ma mesịa na-agbasaru nsọtụ ụwa. (Ndị Galetia 6:16; Ọrụ 1:8) Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ e lere okwukwe nke ụmụazụ Jisọs ule. E jidere ndị ozi ahụ ma tirisie ha ahụ n’ihi na ha jụrụ ịkwụsị ime nkwusa. N’oge na-adịghị anya e gburu Stifen. E mesịa, e gburu Jemes, onye ji anya ya hụ nnwogha ahụ. (Ọrụ 5:17-40; 6:8–7:60; 12:1, 2) Otú ọ dị, Pita na Jọn lanarịrị wee jeere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ ọzọ. N’ezie, ka ọ na-eru n’ọgwụgwụ nke narị afọ mbụ O.A., Jọn dekọrọ ọhụụ ndị ọzọ sere onyinyo Jisọs n’ebube eluigwe.—Mkpughe 1:12-20; 14:14; 19:11-16.
7. (a) Olee mgbe ọhụụ nnwogha ahụ malitere imezu? (b) Olee mgbe Jisọs nyeghachiri ụfọdụ dị ka omume ha si dị?
7 Kemgbe mmalite nke ‘ụbọchị Onyenwe anyị’ na 1914, ọtụtụ n’ime ọhụụ ndị Jọn hụrụ emezuwo. (Mkpughe 1:10) Gịnị banyere Jisọs ‘ịbịa n’ebube Nna ya,’ dị ka nnwogha ahụ sere onyinyo ya? Ọhụụ a malitere imezu n’ọmụmụ nke Alaeze eluigwe Chineke na 1914. Mgbe Jisọs, dị ka kpakpando chi ọbụbọ, bilitere n’ihe omume eluigwe na ala dị ka Eze e chiri echichi ọhụrụ, nke ahụ bụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, ọbụbọ nke ụbọchị ọhụrụ. (2 Pita 1:19; Mkpughe 11:15; 22:16) N’oge ahụ Jisọs ò nyeghachiri ụfọdụ ụgwọ ọrụ dị ka omume ha si dị? Ee. E nwere ihe àmà siri ike na ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị, mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe nke ndị Kraịst e tere mmanụ malitere.—2 Timoti 4:8; Mkpughe 14:13.
8. Ihe omume ndị dị aṅaa ga-aka ngwụsị nke mmezu ọhụụ nnwogha ahụ akara?
8 Otú ọ dị, n’isi nso Jisọs ga-abịa “n’ebube Ya, Ya na ndị mmụọ ozi nile” iji kpee ihe a kpọrọ mmadụ dum ikpe. (Matiu 25:31) N’oge ahụ, ọ ga-ekpughe onwe ya n’ebube ya nile dị ukwuu ma nye “onye ọ bụla” ụgwọ ọrụ kwesịrị omume ya. Ndị yiri atụrụ ga-eketa ndụ ebighị ebi n’Alaeze a kwadebeere ha, ndị yiri ewu ga-abakwa “n’ahụhụ mmehie ebighị ebi.” Lee ngwụsị dị ebube nke ahụ ga-abụrụ mmezu nke ọhụụ nnwogha ahụ!—Matiu 25:34, 41, 46; Mak 8:38; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-10.
Ndị Enyi Jisọs E Mere Ebube
9. Ànyị kwesịrị ịtụ anya na Mosis na Elaịja ga-eso Jisọs nọrọ ná mmezu nke ọhụụ nnwogha ahụ? Kọwaa.
9 Jisọs anọghị nanị ya ná nnwogha ahụ. A hụrụ ka ya na Mosis na Elaịja nọ. (Matiu 17:2, 3) Hà nọ ebe ahụ n’ụzọ nkịtị? Ee e, n’ihi na ndị ikom abụọ ahụ anwụworị kemgbe, nọrọkwa n’ụra n’ájá na-echere mbilite n’ọnwụ. (Eklisiastis 9:5, 10; Ndị Hibru 11:35) Hà ga-eso Jisọs pụta mgbe ọ ga-abịa n’ebube eluigwe? Ee e, n’ihi na Mosis na Elaịja biri ndụ tupu olileanya eluigwe emeghepụrụ ụmụ mmadụ. Ha ga-abụ akụkụ nke “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume” n’elu ala. (Ọrụ 24:15) Ya mere mpụta ha n’ọhụụ nnwogha ahụ bụ n’ụzọ ihe atụ. Banyere gịnị?
10, 11. Ole ndị ka Elaịja na Mosis sere onyinyo ha n’ọnọdụ dị iche iche?
10 N’ọnọdụ ndị ọzọ, Mosis na Elaịja bụ ihe atụ amụma. Dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, Mosis sere onyinyo Jisọs, Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. (Deuterọnọmi 18:18; Ndị Galetia 3:19; Ndị Hibru 8:6) Elaịja sere onyinyo Jọn Baptist, onye obu ụzọ nke Mesaịa ahụ. (Matiu 17:11-13) Ọzọkwa, site n’okwu ndị gbara Mkpughe isi nke 11 gburugburu, Mosis na Elaịja sere onyinyo ihe fọdụrụ e tere mmanụ n’oge ọgwụgwụ. Olee otú anyị si mara nke ahụ?
11 Ọ dị mma, sapeta Mkpughe 11:1-6. N’amaokwu nke 3 anyị na-agụ: “M ga-enyekwa ndịàmà m abụọ ike, ha ga-ebukwa amụma [otu puku ụbọchị na narị abụọ na iri isii], e gbokwasịwokwa ha ákwà mkpe.” Amụma a mezuru n’isi ihe fọdụrụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge Agha Ụwa Mbụ.a N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ndịàmà abụọ? N’ihi na ihe fọdụrụ e tere mmanụ na-arụ ọrụ nke, n’ụzọ ime mmụọ, yiri nke Mosis na Elaịja rụrụ. Amaokwu nke 5 na 6 gara n’ihu, na-asị: “Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla chọrọ imejọ [ndịàmà abụọ ahụ], ọkụ na-esi n’ọnụ ha pụta, na-eripịakwa ndị iro ha; ọ bụrụkwa na onye ọ bụla ga-achọ imejọ ha, a ghaghị igbu ya otú a. Ndị a nwere ike imechi eluigwe, ka mmiri wee ghara izo n’ụbọchị nile nke amụma ha: ha nwekwara ike n’ebe mmiri nile dị, ime ka ha gbanwee ọbara, na iwere ihe otiti nile ọ bụla tie ụwa, ka mgbe ha ga-achọ hà.” Otú a, a na-echetara anyị ọrụ ebube nke Elaịja na Mosis rụrụ.—Ọnụ Ọgụgụ 16:31-34; 1 Ndị Eze 17:1; 2 Ndị Eze 1:9-12.
12. N’ọnọdụ nke nnwogha ahụ, ole ndị ka Mosis na Elaịja sere onyinyo ha?
12 Mgbe ahụ, ole ndị ka Mosis na Elaịja sere onyinyo ha n’ihe banyere nnwogha ahụ? Luk sịrị na ha na Jisọs pụtakọrọ “n’ebube.” (Luk 9:31) N’ụzọ doro anya, ha sere onyinyo ndị Kraịst e jiworo mmụọ nsọ tee mmanụ dị ka ‘ndị ha na Jisọs na-ekekọ’ nakwa ndị si otú a nata olileanya magburu onwe ya nke ịbụ ‘ndị e nyekọrọ ha na ya otuto.’ (Ndị Rom 8:17) Ndị e tere mmanụ a kpọlitere n’ọnwụ ga-esoro Jisọs mgbe ọ ga-abịa n’ebube nke Nna ya ‘inyeghachi onye ọ bụla dị ka omume ya si dị.’—Matiu 16:27.
Ndịàmà Dị Ka Mosis na Elaịja
13. Akụkụ ndị dị aṅaa kara Mosis na Elaịja akara dị ka ndị kwesịrị ekwesị ịbụ ihe atụ amụma nke ndị nketakọ Jisọs e tere mmanụ e nyekọtara ha na ya otuto?
13 E nwere akụkụ ndị dị ịrịba ama nke kara Mosis na Elaịja akara dị ka ndị kwesịrị ekwesị ịbụ ihe atụ amụma nke ndị nketakọ Jisọs e tere mmanụ. Ma Mosis ma Elaịja jere ozi dị ka ọnụ na-ekwuru Jehova ruo ọtụtụ afọ. Ha abụọ chere iwe nke onye ọchịchị ihu. N’oge mkpa, ezinụlọ si mba ọzọ kwadoro nke ọ bụla. Ha abụọ buuru ndị eze amụma ma guzosie ike megide ndị amụma ụgha. Ma Mosis ma Elaịja hụrụ ihe ngosi nke ike Jehova n’Ugwu Saịnaị (nke a na-akpọkwa Horeb). Ha abụọ họpụtara ndị ga-anọchi ha n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jodan. Oge nke Mosis (ya na Joshua) na Elaịja (ya na Elaịsha) hụkwara ọnụ ọgụgụ kasị ukwuu nke ọrụ ebube, e wezụga ndị weere ọnọdụ n’oge ndụ Jisọs.b
14. Olee otú ndị ahụ e tere mmanụ siworo jee ozi dị ka ọnụ na-ekwuru Jehova, dị ka Mosis na Elaịja?
14 Ọ̀ bụ na ihe ndị ahụ nile adịghị echetara anyị Israel nke Chineke? Ee, ọ na-eme otú ahụ n’ezie. Jisọs gwara ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu: ma lee, Mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 28:19, 20) N’irubere okwu ndị a isi, ndị Kraịst e tere mmanụ ejewo ozi dị ka ọnụ na-ekwuru Jehova malite na Pentikọst 33 O.A. ruo ugbu a. Dị ka Mosis na Elaịja, ndị ọchịchị ewesowo ha iwe, ha agbawokwara ha àmà. Jisọs gwara ndị ozi 12 ya, sị: “N’ihu ndị isi na ndị eze ka a ga-ekurukwa unu jee n’ihi m, ịbụrụ ha na ndị mba ọzọ àmà.” (Matiu 10:18) Okwu ya emezuwo ugboro ugboro n’oge akụkọ ihe mere eme nke ọgbakọ ndị Kraịst.—Ọrụ 25:6, 11, 12, 24-27; 26:3.
15, 16. Myirịta ndị dị aṅaa dị n’etiti ndị e tere mmanụ n’otu aka na Mosis na Elaịja n’aka nke ọzọ n’ihe banyere ha (a) iji atụghị egwu na-eguzo maka eziokwu? (b) inweta enyemaka site n’aka ndị na-abụghị ndị Israel?
15 Ọzọ, ndị Kraịst e tere mmanụ abụrụwo ndị na-adịghị atụ egwu dị ka Mosis na Elaịja n’iguzo maka eziokwu megide ụgha okpukpe. Cheta otú Pọl si katọọ onye amụma ụgha ndị Juu bụ́ Ba-Jisọs, jirikwa akọ ma n’ụzọ kwụrụ chịm gbaa ụgha nke chi ndị Atens ọtọ. (Ọrụ 13:6-12; 17:16, 22-31) Chetakwa na n’oge dị ugbu a ndị fọdụrụ e tere mmanụ ejiwo obi ike gbaa Krisendọm ọtọ, ịgba àmà dị otú ahụ etiwokwa ya ihe otiti.—Mkpughe 8:7-12.c
16 Mgbe Mosis gbalagara n’ihi iwe Fero, ọ gbabara n’ụlọ onye na-abụghị onye Israel, bụ́ Reuel, onye a na-akpọkwa Jetro. N’oge ọzọ mgbe nke a gasịrị, Mosis natara ndụmọdụ nhazi bara uru site n’aka Reuel, onye nwa ya, bụ́ Hobab duziri Israel gabiga ọzara ahụ.d (Ọpụpụ 2:15-22; 18:5-27; Ọnụ Ọgụgụ 10:29) Ndị na-abụghị ndị òtù e tere mmanụ nke Israel nke Chineke hà enyeworo ndị òtù Israel nke Chineke aka n’ụzọ yiri nke ahụ? Ee, “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ,” ndị pụtaworo ìhè na mgbe ikpeazụ a akwadowo ha. (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16; Aịsaịa 61:5) N’ikwu banyere nkwado na-ekpo ọkụ, nke ịhụnanya nke “atụrụ” ndị a ga-enye ụmụnna ya e tere mmanụ, Jisọs gwara ha n’ụzọ amụma, sị: “Agụụ gụrụ m, unu wee nye m ihe M ga-eri: akpịrị kpọrọ m nkụ, unu wee kuru mmiri nye m: abụ m ọbịa, unu wee kpọbata m; a gbara m ọtọ, unu wee gbokwasị m ákwà: ahụ adịghị m ike, unu wee leta m: anọ m n’ụlọ mkpọrọ, unu wee bịakwute m. . . . N’ezie asị m unu, Ka ọ hà, bụ́ otú unu si mee ya nye otu onye n’ime ụmụnna m ndị a, bụ́ ndị dịkarịsịrị nta, Mụ ka unu mere ya nye.”—Matiu 25:35-40.
17. Olee otú ndị e tere mmanụ siworo nwee ahụmahụ yiri nke Elaịja n’Ugwu Horeb?
17 Ọzọ, Israel nke Chineke nwere ahụmahụ yiri nke Elaịja n’Ugwu Horeb.e Dị ka Elaịja n’oge ọ na-agbara Eze Nwanyị Jezebel ọsọ, ndị fọdụrụ e tere mmanụ bụ́ ndị na-atụ egwu chere na ọrụ ha agwụsịwo ná ngwụsị nke Agha Ụwa Mbụ. Mgbe ahụ, dịkwa ka Elaịja, ha zutere Jehova, bụ́ onye bịaworo ikpe nzukọ ndị ahụ na-azọrọ ịbụ ‘ụlọ Chineke’ ikpe. (1 Pita 4:17; Malakaị 3:1-3) Ebe a chọpụtara na Krisendọm dara ada, a matara ihe fọdụrụ e tere mmanụ dị ka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” e mekwara ya onye isi ihe nile Jisọs nwere n’ụwa. (Matiu 24:45-47) Na Horeb, Elaịja nụrụ “olu nta nke dị ezi nwayọọ” nke mesịrị bụrụ nke Jehova, na-enyekwu ya ọrụ ọ ga-arụ. N’oge dị jụụ nke afọ ndị sochiri agha, ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ nụrụ olu ya site na peji nke Bible. Ha onwe ha kwa ghọtara na ha nwere ọrụ ịrụzu.—1 Ndị Eze 19:4, 9-18; Mkpughe 11:7-13.
18. Olee otú e siworo site n’Israel nke Chineke nye ngosipụta pụrụ iche nke ike Jehova?
18 N’ikpeazụ, è siwo n’Israel nke Chineke duzie ngosipụta dị ịtụnanya nke ike Jehova? Mgbe Jisọs nwụsịrị, ndị ozi ahụ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube, ma ndị a ji nwayọọ kwụsị. (1 Ndị Kọrint 13:8-13) N’oge a, anyị adịghị ahụ ọrụ ebube n’echiche nkịtị. N’aka nke ọzọ, Jisọs gwara ụmụazụ ya, sị: “N’ezie, n’ezie, asị m unu, Onye na-ekwere na Mụ, ọrụ Mụ onwe m na-arụ ka onye ahụ ga-arụkwa; ọrụ ka ndị a ukwuu ka ọ ga-arụkwa.” (Jọn 14:12) Nke a nwere mmezu mbụ ka ndị na-eso ụzọ Jisọs kwusara ozi ọma ahụ n’Alaeze Ukwu Rom nile na narị afọ mbụ. (Ndị Rom 10:18) A rụwo ọbụna ọrụ ka ukwuu taa ka ndị fọdụrụ e tere mmanụ na-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma ahụ “n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” (Matiu 24:14) Gịnị ka ọ rụpụtara? Narị afọ nke 20 ahụwo nchịkọbata nke ọnụ ọgụgụ kasị ukwuu nke ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, raara onwe ha nye n’akụkọ ihe mere eme. (Mkpughe 5:9, 10; 7:9, 10) Lee aha ihe àmà dị ebube nke ike Jehova ọ bụ!—Aịsaịa 60:22.
Ụmụnna Jisọs Abịa n’Ebube
19. Olee mgbe a na-ahụ ụmụnna Jisọs e tere mmanụ na ya n’ebube?
19 Ka ihe fọdụrụ n’ime ụmụnna Jisọs e tere mmanụ na-ejesị ozi elu ala ha, a na-enyekọta ha na ya ebube. (Ndị Rom 2:6, 7; 1 Ndị Kọrint 15:53; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:14, 17) Ha si otú a na-aghọ ndị eze na ndị nchụàjà na-adịghị anwụ anwụ n’Alaeze eluigwe. N’isonyere Jisọs, mgbe ahụ ha “ga-ewerekwa mkpanaka ígwè zụọ ha dị ka atụrụ, dị ka a na-akụjisi ite nke ọkpụ ite.” (Mkpughe 2:27; 20:4-6; Abụ Ọma 110:2, 5, 6) N’isonyere Jisọs, ha ga-anọdụ n’ocheeze na-ekpe “ebo iri na abụọ nke Israel” ikpe. (Matiu 19:28) Ihe e kere eke na-asụ ude echesiworị ihe omume ndị a ike, bụ́ akụkụ nke “mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke.”—Ndị Rom 8:19-21; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-8.
20. (a) Banyere olileanya dị aṅaa ka nnwogha ahụ wusiri okwukwe Pita ike? (b) Olee otú nnwogha ahụ si na-ewusi ndị Kraịst ike taa?
20 Pọl kwuru banyere mkpughe nke Jisọs n’oge “mkpagbu ukwu” ahụ mgbe o dere, sị: “Ọ ga-abịa ka e wee nye Ya otuto n’ime ndị nsọ Ya, ka ibobo Ya wee nwụọkwa ihe nile n’ahụ n’ime ndị kwererị ekwe.” (Matiu 24:21; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:10) Lee olileanya dị ebube ọ bụụrụ Pita, Jemes, Jọn, na ndị Kraịst nile e ji mmụọ nsọ tee mmanụ! Nnwogha ahụ wusiri okwukwe Pita ike. N’ezie, ịgụ banyere ya na-ewusikwa okwukwe anyị ike ma na-eme ka obi ike anyị na Jisọs “ga-enyeghachikwa onye ọ bụla dị ka omume ya si dị” n’isi nso sie ike. Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ dịworo ndụ ruo taa na-ahụ ka a na-ewusi obi ike ha ike na a ga-enyekọta ha na Jisọs ebube. A na-ewusi okwukwe atụrụ ọzọ ike n’ịmara na ọ ga-azọpụta ha gabiga ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a baa n’ụwa ọhụrụ dị ebube. (Mkpughe 7:14) Lee agbamume ọ bụ iguzosi ike ruo ọgwụgwụ! Ọhụụ a pụrụ ịkụziri anyị ihe ọzọ dị ukwuu, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee akwụkwọ ndị bụ́ “Ka Edo Ha-Gi Nsọ,” peji nke 310-311, na Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, peji nke 164-165, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Ọpụpụ 2:15-22; 3:1-6; 5:2; 7:8-13; 8:18; 19:16-19; Deuterọnọmi 31:23; 1 Ndị Eze 17:8-16; 18:21-40; 19:1, 2, 8-18; 2 Ndị Eze 2:1-14.
d Lee akwụkwọ You May Survive Armageddon Into God’s New World, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, peji nke 281-283.
e Lee “Ka Edo Aha-Gi Nsọ,” peji nke 314-317.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Ndị ole sooro Jisọs pụta ná nnwogha ahụ?
◻ Olee otú nnwogha ahụ si wusie okwukwe nke ndị ozi ahụ ike?
◻ Mgbe Mosis na Elaịja pụtara “n’ebube” ha na Jisọs ná nnwogha ahụ, ole ndị ka ha nọchiri anya ha?
◻ Myirịta ndị dị aṅaa dị n’etiti Mosis na Elaịja n’otu aka na Israel nke Chineke n’aka nke ọzọ?
[Foto dị na peeji nke 10]
Nnwogha ahụ ewusiwo okwukwe nke ndị Kraịst n’oge gara aga na n’oge a ike