-
Ṅaa Ntị n’Okwu Amụma ChinekeỤlọ Nche—2000 | Eprel 1
-
-
6. (a) N’ihi gịnị ka Jisọs ji kpọọ nnwogha ahụ ọhụụ? (b) Gịnị ka nnwogha ahụ mere ka a hụpete?
6 Ihe omume a na-atụ ụjọ yiri ka o weere ọnọdụ n’otu mpaghara nke Ugwu Heamọn, bụ́ ebe Jisọs na ndị ozi atọ ahụ nọbọrọ chi. Ihe àmà na-egosi na nnwogha ahụ weere ọnọdụ n’abalị, na-eme ka a hụ ya nke ọma karịsịa. Otu ihe mere Jisọs ji kpọọ ya ọhụụ bụ na Mosis na Elaịja, bụ́ ndị nwụworo kemgbe, anọghị n’ebe ahụ n’anụ ahụ. Ọ bụ nanị Kraịst nọ n’ebe ahụ n’ezie. (Matiu 17:8, 9, NW) Oké mgbukepụ dị otú ahụ mere ka Pita, Jemes, na Jọn hụpete n’ụzọ dị ịrịba ama ọnụnọ dị ebube nke Jisọs n’ike Alaeze. Mosis na Elaịja nọchiri anya ndị e tere mmanụ ha na Jisọs ga-eketakọ ihe, ọhụụ ahụ mesikwara nnọọ akaebe Jisọs gbara banyere Alaeze ahụ na ọbụbụeze ya n’ọdịnihu ike.
-
-
Ṅaa Ntị n’Okwu Amụma ChinekeỤlọ Nche—2000 | Eprel 1
-
-
8. (a) Na gịnị ka nkwupụta Chineke mere banyere Ọkpara ya lekwasịrị anya? (b) Gịnị ka igwe ojii ahụ pụtara ná nnwogha ahụ na-egosi?
8 Ihe kasị mkpa bụ nkwupụta Chineke bụ́: “Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị m ezi mma; nụrụnụ okwu Ya.” Okwu a lekwasịrị anya n’ebe Jisọs nọ dị ka Eze Chineke mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze, onye ihe nile e kere eke na-aghaghị irubere isi. Igwe ojii ahụ kpuchiri ha gosiri na mmezu nke ọhụụ a ga-abụ nke anya na-agaghị ahụ. Ndị matara “ihe ịrịba ama” nke ọnụnọ a na-adịghị ahụ anya nke Jisọs n’ike Alaeze ga-eji nanị anya nke nghọta hụ ya. (Matiu 24:3) N’ezie, ntụziaka Jisọs nyere ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla banyere ọhụụ ahụ ruo mgbe o biliworo n’ọnwụ na-egosi na ibuli ya elu na ime ka ọ dị ebube ga-ewere ọnọdụ mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ.
-