Isi 13
Ụzọ I Si Ele Mmekọahụ Anya—Olee Ihe O Mere?
1-3. (a) Olee otú Bible si egosi na mmekọahụ n’etiti nwoke na nwanyị nwere nkwado Chineke? (b) Ọ̀ ga-abụ maka ọdịmma mmadụ itinye onwe ya n’iji ike nke mmekọahụ ya mee ihe n’ụzọ a na-akparaghị ókè?
ỤFỌDỤ ndị nwere echiche nke bụ na Bible megidere ihe ọ bụla metụtara mmekọahụ. Otú ọ dị, nnyocha nke Bible n’onwe ya na-ekpughe na nke a abụghị eziokwu. Mgbe ọ kọsịrị banyere okike Chineke kere nwoke na nwanyị mbụ, ọ gara n’ihu ikwu: “Chineke wee gọzie ha: Chineke wee sị ha, Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa.”—Jenesis 1:27, 28.
2 Ya mere o doro anya na mmekọahụ n’etiti nwoke na nwanyị nwere nkwado nke Chineke. Ma Chineke ọ̀ kwadoro mmekọahụ nke a na-akparaghị ókè? Nke a ọ̀ ga-eweta ọṅụ kasị ukwuu ná ndụ? Ọ̀ ga-ewetara anyị na ndị nọ anyị gburugburu ezi udo na ntụkwasị obi?
3 A pụrụ nnọọ iji mmekọahụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi dị ka ọ dị n’ihe omume ndị ọzọ nke mmadụ. Iri ihe oriri dị mma dịkwa mkpa maka ịdị ndụ. Ma iribiga nri ókè nwere ike imebi ahụ ike, meekwa ka ndụ dị mkpirikpi. Ụra dịkwa mkpa n’otu aka ahụ. Ma ihibiga ya ókè na-eme ka a ghara inwe ihe a rụpụtara ná ndụ, nweekwa ike ime ka ike gwụ anụ ahụ. Dị nnọọ ka ezi ọṅụ nke ndụ na-adịghị esite n’iribiga nri ókè, ịṅụbiga mmanya ókè, na ume ngwụ, otú ahụkwa ka ọ na-adịghị esite ná mmadụ iji ike inwe mmekọahụ eme ihe n’ụzọ a na-akparaghị ókè. Ahụmahụ ụmụ mmadụ eri ọtụtụ puku afọ na-agba àmà nke a. Ọ̀ bụ iwu na anyị aghaghị ịmụta nke a nanị site n’ahụmahụ ihe ilu nke onwe onye? E nwere ụzọ ka mma.
4. Gịnị ga-akpali anyị ịnakwere ụkpụrụ Chineke banyere mmekọahụ?
4 Okwu Chineke na-enye ụzọ ile ihe anya ziri ezi banyere mmekọahụ nke ga-echebe obi ụtọ anyị ugbu a na n’ọdịnihu. Ma, ọ bụghị nanị n’ihi udo na nchebe nke onwe anyị ka anyị ga-eji mụta ma nakwere ụkpụrụ Chineke banyere iji ikike ndị a mee ihe. Nke ka mkpa, anyị ga-eme otú ahụ site ná nsọpụrụ nye Onye Okike anyị. Ọ bụrụ n’ezie na anyị ewere ọnọdụ n’akụkụ ya n’ihe iseokwu nke ọkaaka ya, anyị ga-eji ọṅụ nọrọ n’okpuru amamihe ya kasị elu na ikike ya kasị ukwuu n’okwu a n’otu aka ahụ.—Jeremaịa 10:10, 23.
Ime Ka Alụmdi na Nwunye Bụrụ Ihe A Na-asọpụrụ n’Etiti Mmadụ Nile
5. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere inwe mmekọahụ na-abụghị n’ime alụmdi na nwunye?
5 Bible dụrụ ọdụ, sị: “Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti unu nile, ka ihe ndina unu bụrụkwa ihe a dịghị emerụ emerụ: n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.” (Ndị Hibru 13:4) Ya mere, Chineke megidere inwe mmekọahụ na-abụghị n’ime alụmdi na nwunye. Nke a kwekọrọ n’eziokwu ahụ bụ na mgbe a na-enye nwoke mbụ ahụ nwunye, Chineke gosiri na ihe bụ nzube ya bụ ka mmadụ abụọ ahụ ghọọ “otu anụ ahụ” ná nkekọ nke ịdị n’otu na-adịgide adịgide. Puku afọ anọ mgbe nke a gasịrị, Ọkpara Chineke gosiri na Nna ya ahapụbeghị ụkpụrụ nke a. (Jenesis 2:22-24; Matiu 19:4-6) Ma ụdị ụkpụrụ a ò tinyere ihe mgbochi na-enweghị isi? Ọ̀ dị ihe dị mma nke ọ na-anapụ anyị?
6. Olee ihe na-egosi na iwu Chineke megide ịkwa iko n’etiti ndị lụrụ di na nwunye bụ maka ọdịmma anyị?
6 Ịkwa iko nke ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye na-emebi ụkpụrụ Chineke, Jehova Chineke na-ekwekwa nkwa ịghọ “onyeàmà dị ngwa” n’ikpe megide ndị na-akwa iko. (Malakaị 3:5) Mkpụrụ ọjọọ nile nke inwe mmekọahụ na-abụghị ná njikọ alụmdi na nwunye na-emesi amamihe nke iwu Chineke ike. Ịkwa iko na-arụpụta ndakpọ nke nchekwube na ntụkwasị obi. Ọ na-ebute anọghị ná nchebe, na-emebikwa udo nke alụmdi na nwunye. Ihe ilu na obi mgbawa ọ na-akpata na-edubakarị n’ịgba alụkwaghịm. Ụmụ na-ata ahụhụ mgbe ha na-ahụ ka a gbaghasịrị ezinụlọ ha. N’ụzọ doro anya, mmachibido Chineke machibidoro ịkwa iko bụ maka ọdịmma anyị. Okwu ya na-egosi na onye ọ bụla lụworo di ma ọ bụ nwunye nke nwere ezi ịhụnanya maka onye agbata obi ya agaghị akwa iko.—Ndị Rom 13:8-10.
7. Kọwaa ihe ịkwa iko pụtara, dị ka e zoro aka na ya n’ime Bible.
7 Dị ka anyị hụworo, Bible na-akọwakwa ikpe Chineke megide ndị na-akwa iko. Gịnị ka ịkwa iko bụ n’ezie? Ọ bụ ezie na otú Bible si eji okwu a eme ihe pụrụ ịgụnye mmekọahụ n’etiti ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye dịkwa ka ọ na-agụnye nke ndị lụrụ di na nwunye, ọ na-emetụtakarị ihe ka ukwuu karị. Okwu e ji eme ihe maka “ịkwa iko” mgbe a na-edekọ okwu Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya bụ okwu Grik bụ por·nei΄a. E si n’otu ebe weta ya na okwu ọgbara ọhụrụ ahụ bụ “pornography.” N’oge Bible e jiri por·nei΄a mee ihe n’izo aka n’ọtụtụ ụdị mmekọahụ na-abụghị n’alụmdi na nwunye ndị iwu na-akwadoghị. Por·nei΄a gụnyere iji akụkụ ahụ nke ma ọ dịkarịa ala otu onye mee ihe n’ụzọ omume rụrụ arụ (ma ọ bụ dị ka okike si dị, ma ọ bụ n’ụzọ megidere okike). Ọzọkwa, a ga-enwekwa onye ọzọ e soro mee omume ahụ rụrụ arụ—ma ọ bụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị, ọ bụrụ anụmanụ.
8. N’ihi ihe ndị dị ike dị aṅaa mere Pọl onyeozi ji gbaa ndị Kraịst ume ka ha “ghara ịkwa iko”?
8 Mgbe ọ na-agba ndị Kraịst ume ka ha “ghara ịkwa iko,” onyeozi bụ Pọl nyere ezi ihe kpatara nke ahụ, na-asị: “Ka onye ọ bụla ghara ịghọgbu na irigbu nwanna ya n’ihe a: n’ihi na [Jehova, NW] bụ onye na-abọ ọ́bò banyere ihe ndị a nile . . . N’ihi na Chineke akpọghị anyị ka anyị bụrụ ndị na-adịghị ọcha . . . Ya mere onye na-ajụ, ọ bụghị mmadụ ka ọ na-ajụ, kama ọ bụ Chineke.”—1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-8.
9, 10. (a) N’ihi gịnị ka ndị ụfọdụ ji na-ajụ alụmdi na nwunye nke iwu kwadoro n’agbanyeghị na ha na-ebinyere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha? (b) Ọbụna ma a sị na ịkwa iko bụ site ná nkwekọrịta nke mmadụ abụọ ahụ, è si aṅaa ‘na-aghọgbu ma na-erigbu ihe ruuru ndị ọzọ’?
9 Onye na-akwa iko ‘na-aghọgbu, na-erigbukwa ndị ọzọ’ n’ezie. Dị ka ihe atụ, nke a bụ eziokwu banyere ndị abụọ bi dị ka di na nwunye n’enweghị nkwado iwu. Gịnị mere ha ji eme ya? Ọtụtụ mgbe ha na-eme otú ahụ ka ha wee nwee ike gbahapụ ihe nkekọ ahụ mgbe ọ bụla ha chọrọ. Ha adịghị enye onye òtù ha nchebe nke alụmdi na nwunye nwere nzube kwesịrị iweta. Ma ọ bụrụ na mmadụ abụọ ahụ abanye ná mmekọrịta ahụ site n’ọchịchọ onwe ha, hà ka ga ‘na-aghọgbu onwe ha, ma na-erigbukwa ndị ọzọ’? Ee, otú ahụ ka ọ dị.
10 E nwere ọtụtụ mmetụta nke ‘irigbu ndị ọzọ’ n’ihi omume ndị na-akwa iko. Otu ihe bụ na onye ọ bụla na-etinye aka n’ịkwa iko na-ekere òkè n’imebi akọ na uche nke onye ọzọ nakwa ezi nguzo ọ bụla nke onye ahụ pụrụ inweworị n’ebe Chineke nọ. Onye ahụ na-akwa iko na-emebi ohere onye nke ọzọ nwere ịbanye n’alụmdi na nwunye ná mmalite dị ọcha. Ọ na-ewetakarị enweghị nsọpụrụ, nkọcha, na ihe mgbu nye ndị òtù ezinụlọ nke onye nke ọzọ, tinyekwara nke ya onwe ya. Ọ pụkwara itinye ahụ ike nke ụbụrụ, mmetụta uche, na nke anụ ahụ nke onye nke ọzọ n’ihe ize ndụ. Ọrịa ndị jọgburu onwe ha bụ ndị a na-enweta site ná mmekọahụ, ndị dị ka AIDS (Ọrịa Na-Emebi Usoro Ahụ Ji Azọrọ Onwe Ya) nke na-akpata ọnwụ bụ nke a na-ejikọkarị ya na mmekọahụ rụrụ arụ.
11. Gịnị mere na ọ dịghị ihe mere mmadụ ga-eji kwere na Chineke ga-anagide ịkwa iko?
11 Ọtụtụ na-ahọrọ ime ka ọ̀ bụ na ha adịghị ahụ mmerụ ahụ ndị a. Ma ì kwere na Chineke, n’ezi omume ya, ga-elefuru ụdị enweghị mmetụta nke a maka ihe ruuru ndị ọzọ anya? Okwu Chineke na-akpọ òkù maka ‘ịsọpụrụ’ ọ bụghị imerụ ma ọ bụ ịjụ ndokwa ya nke dị nsọ nke alụmdi na nwunye.—Ndị Hibru 13:4; Matiu 22:39.
12. (a) Chineke si aṅaa ele mmekọahụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị anya? (b) Megide gịnị ka iwu Chineke nke megidere mmekọahụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị na-echebe anyị?
12 Gịnị banyere mmekọahụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị? Dị ka anyị hụworo, a gụnyere omume a n’okwu ahụ bụ por·nei΄a (“ịkwa iko”) nke Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ji mee ihe. Onyeozi bụ Jud jiri okwu ahụ mee ihe mgbe ọ na-ezo aka n’omume na-adịghị ka e si kee mmadụ nke mmekọahụ ndị Sọdọm na Gọmọra. (Jud 7) Mmekọahụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị n’ebe ahụ kpatara mweda n’ala nke rụpụtara ‘iti mkpu ákwá nke mkpesa’ dara ụda. O dubakwara ná mbibi Chineke bibiri obodo ndị ahụ na ndị bi n’ime ha. (Jenesis 18:20; 19:23, 24) Ụzọ Chineke si ele ihe anya ọ̀ gbanwewo kemgbe ahụ? Ee e. Dị ka ihe atụ, Ndị Kọrint nke Mbụ 6:9, 10 gụnyere “ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom” n’etiti ndị na-agaghị eketa Alaeze Chineke ma ọ bụrụ na ha anọgide n’ụdị omume ahụ. Ọzọkwa, n’ịkọwa ihe ọ na-apụtara mmadụ ndị ‘na-eme ahụ ha ihe ihere n’ime adịghị ọcha,’ wee pụọ soo “anụ ahụ dị iche,” Bible kwuru na ha ‘rere ọkụ n’agụụ na-agụ ha n’ahụ ndị ikom ibe ha, ndị ikom na-arụpụta ihe na-adịghị mma n’anya n’ahụ ndị ikom, na-anarakwa n’ime onwe ha ụgwọ ọrụ ahụ nke njehie ha nke ha na-aghaghị ịnara.’ (Ndị Rom 1:24, 27) Ọ bụghị nanị na ndị dị otú ahụ dabara n’ikpe ọmụma Chineke, kama ha na-anatakwa “ụgwọ ọrụ” nke mmerụ nke echiche na anụ ahụ. Dị ka ihe atụ, taa, e nwere ịrị elu dị ukwuu nke ọrịa syphilis, AIDS, na ọrịa ndị ọzọ a na-ebute site ná mmekọahụ n’etiti ndị na-edina nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha. Ụkpụrụ omume dị elu nke Okwu Chineke na-echebe anyị pụọ n’ụdị ihe mmerụ ahụ ndị dị otú ahụ, kama ịnapụ anyị ihe ndị dị mma.
Ịnakwere Ụzọ Chineke Si Ele Ịgba Alụkwaghịm Anya
13. Olee otú okwu metụtara ikwesị ntụkwasị obi nye onye mmadụ lụrụ si dị ike?
13 “Akpọrọ m ịgba alụkwaghịm asị.” Nke ahụ bụ otú Chineke si kọwaa onwe ya mgbe ọ na-atụ ndị mesoro nwunye ha omume ‘n’ụzọ aghụghọ’ mmehie ha n’anya. (Malakaị 2:14-16, Revised Standard Version) Okwu ya na-enye ndụmọdụ dị ukwuu iji nyere di na nwunye aka ime ka alụmdi na nwunye ha gaa nke ọma na iji zere ihe ilu nke ịgba alụkwaghịm. Ọ na-emekwa ka o doo anya na Chineke na-ele ikwesị ntụkwasị obi nye nkwa alụmdi na nwunye anya dị ka ibu ọrụ dị nsọ.
14, 15. (a) Gịnị bụ nanị ihe mgbakwasị ụkwụ kwesịrị ekwesị e nwere maka ịgba alụkwaghịm? (b) Ịkwa iko ọ̀ na-egbubi njikọ alụmdi na nwunye ozugbo? (ch) N’ọnọdụ dịgasị aṅaa ka a pụrụ ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye?
14 E mesiri nke a ike site n’eziokwu bụ na ọ na-anakwere nanị otu ihe mgbakwasị ụkwụ maka ịgba alụkwaghịm. Jisọs gosiri ihe nke a bụ: “Onye ọ bụla nke ga-ahapụ nwunye ya, ma ọ bụghị n’ihi ịkwa iko [por·nei΄a], lụrụkwa nwunye ọzọ, ọ na-akwa iko.” (Matiu 19:9; 5:32) Por·nei΄a dị ka anyị hụworo na-ezo aka n’inwe mmekọahụ nke na-abụghị n’ime alụmdi na nwunye, ma ọ bụ n’ụzọ okike si dị ma ọ bụ na ọ bụghị.
15 Ọ bụrụ na onye mmadụ lụrụ akwaa iko, nke a ọ̀ ga-egbubi njikọ alụmdi na nwunye ahụ ozugbo? Ee e, ọ dịghị egbubi ya. Onye nke aka ya dị ọcha pụrụ ikpebi ma ọ̀ ga-agbaghara ma ọ bụ na ọ gaghị agbaghara. Ebe ịgba alụkwaghịm bụ ihe e kpebiri, nrubeisi nke onye Kraịst nwere n’ebe ndị ọchịchị nọ ga-akpali ya imebi alụmdi na nwunye ahụ dị ka iwu kwadoro, na-eme otú ahụ n’ụzọ eziokwu. (Ndị Rom 13:1, 2) Mgbe ikpe ahụ gasịrị, a na-enye ohere maka ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye. Ma Akwụkwọ nsọ dụrụ ọdụ na alụmdi na nwunye dị otú ahụ ga-abụ nanị n’ebe onye Kraịst ọzọ nọ, bụ́ onye nọ n’ezie “n’ime Onyenwe anyị.”—1 Ndị Kọrint 7:39.
16. N’ala ebe iwu e nwere na-enyeghị ohere maka ịgba alụkwaghịm n’agbanyeghị ihe ọ bụla e mere, Ndịàmà Jehova si aṅaa egosi nsọpụrụ nye iwu Chineke n’okwu a?
16 Gịnị ma ọ bụrụ na iwu nke obodo enyeghị ohere ọ bụla maka ịgba alụkwaghịm, ọbụna ná ndabere nke mmekọahụ na-adịghị ọcha? Onye nke aka ya dị ọcha n’ọnọdụ nke a nwere ike inweta ịgba alụkwaghịm ná mba ọzọ ebe a na-ekwere ịgba alụkwaghịm. N’ezie, ọnọdụ nwere ike ọ gaghị enye ohere maka nke a. Ma a pụrụ inwe iwu nkewa ụfọdụ ná mba onye ahụ, a pụkwara inweta nke a. Otú ọbụna o si dị, onye ahụ nke aka ya dị ọcha pụrụ ikewapụ n’ebe onye ahụ ikpe mara nọ ma nyekwa ndị nlekọta nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova ihe ndabere doro anya nke Akwụkwọ nsọ kwadoro maka ịgba alụkwaghịm. Gịnị ma ọ bụrụ na mgbe e mesịrị, onye ahụ ekpebie ịlụrụ onye ọzọ? Ọgbakọ agaghị eme ihe ịchụpụ ya dị ka onye na-akwa iko ma ọ bụru na o gosiri ọgbakọ ihe odide na-egosi nkwa nke ikwesị ntụkwasị obi n’ebe onye òtù ọhụrụ ahụ nọ na nkwa ịnata akwụkwọ iwu maka alụmdi na nwunye ma ọ bụrụ na e mebie nke ochie ahụ site n’iwu ma ọ bụ site n’ọnwụ. Otú o sina dị, onye a ga-eche ihe ọ bụla ga-esi na ya pụta ihu n’ihe banyere ụwa nke na-adịghị n’ọgbakọ ndị Kraịst. N’ihi na ụwa n’ozuzu ya amataghị na iwu Chineke dị elu karịa iwu nke mmadụ nakwa na iwu mmadụ bụ nke nwere ikike a kpaara ókè.—Tụlee Ọrụ 5:29.
Iji Amamihe Na-ezere Adịghị Ọcha Nile na Inwe Anya Ukwu ná Mmekọahụ
17. Site n’Akwụkwọ nsọ, kọwaa ọnọdụ kwesịrị ekwesị nke mmekọahụ nwere ná ndụ nke ndị lụrụ di na nwunye.
17 O doro anya na mmekọahụ nwere ọnọdụ ya kwesịrị ekwesị ná ndụ nke ndị lụrụ di na nwunye. Chineke nyere nke a dị ka ụzọ a pụrụ isi mụpụta ụmụ, nakwa dị ka isi iyi nke obi ụtọ nye ndị mụrụ ụmụ. (Jenesis 9:1; Ilu 5:18, 19; 1 Ndị Kọrint 7:3-5) Otú ọ dị, ọ dọrọ aka ná ntị megide iji onyinye nke a mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.—Ndị Efesọs 5:5.
18, 19. (a) N’ihi gịnị ka omume nke imetọ onwe onye, ma ọ bụ imeso onwe onye ihe na-adịghị mma, ekwesịghị ekwesị nye onye Kraịst? (b) Gịnị pụrụ inyere mmadụ aka ịhapụ omume dị otú ahụ?
18 N’ihi otú e si emesi mmekọahụ ike taa, ọtụtụ ndị na-eto eto ahụwo na ọchịchọ ha maka inwe mmekọahụ bụ nke a na-akpali ọbụna tupu ha anọrọ n’ọnọdụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye. N’ihi ya, ụfọdụ n’ime ha na-achọ obi ụtọ site ná mkpali onwe onye nke akụkụ ahụ ha. Nke ahụ bụ imetọ onwe onye ma ọ bụ imeso onwe onye ihe na-adịghị mma. Ọ̀ bụ omume kwesịrị ekwesị ma ọ bụ nke amamihe dị na ya?
19 Akwụkwọ nsọ na-adụ ọdụ, sị: “Ya mere, meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjọọ, na anya ukwu ahụ.” (Ndị Kọlọsi 3:5) Onye na-emeto onwe ya ọ̀ na-eme ka ‘ihe nile dị ya n’ahụ metụta agụụ mmekọahụ nwụọ’? N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ na-akpali agụụ mmekọahụ. Bible na-agba ume ka mmadụ hapụ echiche na omume nke ga-eduba ná nsogbu ndị dị otú ahụ, na-eji ihe omume ndị na-ewuli elu dochie ha nakwa ka mmadụ zụlite njide onwe onye. (Ndị Filipaị 4:8; Ndị Galetia 5:22, 23) Mgbe e tinyere mgbalị ime nke a, a pụrụ izere imeso onwe onye ihe na-adịghị mma, na-enwe abamuru nke echiche, mmetụta uche, na nke ime mmụọ.
20. Olee ihe na-egosi na ọ gaghị ekwesị ekwesị ka di na nwunye tụfuo njide onwe onye nile n’isoro onwe ha nwee mmekọahụ?
20 Ihe Bible na-ekwu banyere “adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, na agụụ ihe ọjọọ” metụtara ndị Kraịst nile, ma ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ndị na-alụghị. Ọ bụ eziokwu na di na nwunye nwere ikike nke Akwụkwọ nsọ kwadoro isoro onwe ha nwee mmekọahụ. Ma nke a ọ̀ pụtara na ha ga-atụfu njide onwe onye nile? Eziokwu bụ na Okwu Chineke na-agba ndị Kraịst nile ume ka ha zụlite njide onwe onye na-arụ ụka megide ụdị echiche ahụ. (2 Pita 1:5-8) Ọ dịghị mkpa na onye ahụ ji ike mmụọ nsọ soro dee Bible ga-akọwa ụzọ akụkụ ahụ mmekọahụ nke di na nwunye si kwesị ibe ha dị ka okike si dị. Mmekọahụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị n’ụzọ doro anya apụghị iso ụzọ nke a dị ka okike si dị. Ya mere ndị nwoke na ndị nwanyị na-edina ibe ha na-enwe ụdị ọzọ nke mmekọahụ nke onyeozi kpọtụrụ uche dị ka “agụụ ihe ihere” na omume “na-adịghị mma n’anya.” (Ndị Rom 1:24-32) Ndị lụrụ di na nwunye hà pụrụ iṅomi mmekọahụ dị otú ahụ nke nwoke na nwoke na nwanyị na nwanyị n’ime alụmdi na nwunye nke ha ma ikpe a ghara ịma ha n’ihu Chineke n’ihi inwe “agụụ ihe ihere” ma ọ bụ “ọchịchọ ọjọọ”?
21. N’agbanyeghị ihe ụzọ mmadụ pụrụ ịbụworị na mbụ, ohere dị aṅaa ghere oghe nye ya ugbu a?
21 Mgbe a tụlere ihe Akwụkwọ nsọ kwuru, mmadụ pụrụ ịchọpụta na echiche ya na mbụ n’okwu ndị a bụ nke ndị ahụ, dị ka Bible kwuru, “mmehie ha na-adịghị ewute ha ọzọ” chịkwara. Ma, site n’enyemaka Chineke, mmadụ pụrụ ‘iyikwasị mmadụ ọhụrụ’ nke a kpụrụ n’ikwekọ n’ụkpụrụ ezi omume nke Chineke. (Ndị Efesọs 4:17-24) N’ụzọ dị otú a, mmadụ na-egosi n’eziokwu na o ji ya kpọrọ ihe mgbe ọ na-ekwu na ya chọrọ ime uche Chineke.
Ụzọ I Si Ele Ihe Anya Na-emetụta Udo na Nchebe Gị n’Ụzọ Dị Mkpa
22. Uru dịgasị aṅaa na-abịara ndị na-etinye ndụmọdụ nke Okwu Chineke metụta ịdị ọcha nke mmekọahụ n’ọrụ ugbu a?
22 Itinye ndụmọdụ nke Okwu Chineke metụta ịdị ọcha mmekọahụ n’ọrụ abụghị oké ibu ọrụ. Were mkpụrụ nke ịgbaso ụzọ Bible wepụtara tụnyere oké ịrị elu nke ịgba alụkwaghịm, ezinụlọ ndị dakpọrọ adakpọ, ụmụ na-enupụ isi, ịgba akwụna, ọrịa, na ime ihe ike na igbu mmadụ ndị e meworo n’ihi ahụ ụtọ nke inwe mmekọahụ. (Ilu 7:10, 25-27) Lee otú amamihe nke Okwu Chineke si pụta ìhè! Mgbe ị jụrụ echiche ụwa nke dabeere n’ọchịchọ onwe onye ma mee ka echiche gị kwekọọ ná ndụmọdụ Jehova, a na-eji ọchịchọ ndị ziri ezi wusie obi gị ike. Kama inwe ihe ụtọ na-agafe ngwa ngwa nke mmekọahụ rụrụ arụ, ị na-enwe akọ na uche dị ọcha na udo nke obi nke na-adịgide adịgide. A na-ewusi njikọ nke alụmdi na nwunye na ezinụlọ ike site ná ntụkwasị obi dị omimi n’etiti ndị lụrụ di na nwunye nakwa site ná nsọpụrụ n’aka ụmụ.
23. Olee otú ụzọ mmadụ si ele mmekọahụ anya si bụrụ ihe ga-eme ka a ‘kaa’ ya akara maka nlanarị banye “n’ụwa ọhụrụ” nke Chineke?
23 Ma elegharakwala eziokwu ahụ anya nke bụ na nke a metụtara olileanya gị nke ndụ ebighị ebi. Ya mere, omume ziri ezi nke Akwụkwọ nsọ ga-etinye ihe n’ihe karịrị ahụ ike gị nke ugbu a. (Ilu 5:3-11) Ọ ga-abụ otu akụkụ nke ihe àmà na ihe arụ nile nke ndị mmadụ na-adig̣hị asọpụrụ Chineke na-eme na-ewute gị n’ezie, na ‘a kawokwa gị akara’ maka nlanarị baa n’ime “ụwa ọhụrụ” Chineke, ebe, ọ bụghị omume rụrụ arụ, kama ezi omume ga-ebi n’ime ya. Ya mere, lee otú o si dị mkpa na ‘ị ga-anwa ike gị nile ugbu a ịbụ onye Chineke na-agaghị achọta ntụpọ n’ahụ ya, na-enweghịkwa ịta ụta, bụrụ onye nọ n’udo.’—Ezikiel 9:4-6; 2 Pita 3:11-14.