-
Jizọs Azaa Otu Onye Ọchịchị Ajụjụ Ọ Jụrụ YaJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Jizọs kwukwara, sị: “Ma ọtụtụ ndị bụ́ ndị mbụ ga-abụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị mbụ.” (Matiu 19:30) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?
Onye ọchịchị a bara ọgaranya so ná “ndị mbụ” ebe ọ bụ na o so ná ndị ndú ndị Juu. Ebe ọ bụ na ọ na-edebe iwu Chineke, e lere anya na o nweghị ihe ga-eme ka a ghara ịzọpụta ya, a na-elekwa ya anya ka onye ezi omume. Ma, o gosila na akụnụba bụ ihe kacha ya mkpa ná ndụ. Ma, ndị nkịtị ghọtara na ihe Jizọs na-akụzi bụ eziokwu, nakwa na ọ bụ ihe ahụ ọ na-akụzi ga-eme ka ha nweta ndụ. E nwere ike ikwu na ha bụ “ndị ikpeazụ.” Ma ugbu a, ọ bụzi ha bụ “ndị mbụ.” Ha nwere olileanya iso Jizọs nọrọ n’ocheeze n’eluigwe na-achị ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs.
-
-
Ihe Atụ Ndị Na-arụ Ọrụ n’Ubi VaịnJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị na Peria na “ọtụtụ ndị bụ́ ndị mbụ ga-abụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị mbụ.” (Matiu 19:30) O jizi otu ihe atụ gbasara ndị na-arụ ọrụ n’ubi vaịn mee ka ihe ahụ o kwuru dokwuo anya.
-