‘Werenụ Obi Dị Umeala Kee Onwe Unu Dị Ka Ákwà’
“Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.”—1 PITA 5:5.
1, 2. Olee ọnọdụ uche abụọ na-emegiderịta onwe ha bụ́ ndị na-enwe mmetụta dị ukwuu n’akparamàgwà mmadụ?
N’IME ọnọdụ uche ndị Okwu Chineke na-adọta uche anyị na ha bụ abụọ na-emegiderịta onwe ha. Ha abụọ na-enwe mmetụta dị ukwuu n’akparamàgwà mmadụ. A kọwara otu dị ka “obi dị umeala.” (1 Pita 5:5) Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa “ịdị umeala” dị ka “ịdị umeala n’obi n’àgwà ma ọ bụ ná mmụọ: enweghị nganga nke ime ka ndị ọzọ hụ mmadụ.” Obi dị umeala na ịdị umeala n’obi pụtara otu ihe, ọ bụkwa nnọọ àgwà a na-achọsi ike ma a bịa n’ụzọ Chineke si ele ihe anya.
2 Nke na-emegide ya bụ nganga. A kọwara nke a dị ka “ile onwe onye anya n’ụzọ gabigara ókè,” “ileda ihe anya.” Ọ na-eme mmadụ iche nanị banyere onwe ya, na-achọkwa uru ihe onwunwe, uru onwe onye nanị, na uru ndị ọzọ n’agbanyeghị mmetụta ọjọọ nke ahụ na-enwe n’ebe ndị ọzọ nọ. Bible na-ekwu otu ihe ọ na-arụpụta: “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” Ọ na-ekwu banyere ‘mmadụ ikwoso ibe ya ekworo’ dị ka “ịchọ ijide ifufe” n’ihi na mgbe ọ nwụrụ “ọ dịghị ihe ọ bụla ọ ga-eburu.” Nganga dị otú ahụ bụ nnọọ ihe dị njọ n’anya Chineke.—Eklisiastis 4:4; 5:15; 8:9.
Mmụọ A Na-ahụkarị n’Ụwa
3. Gịnị bụ mmụọ a na-ahụkarị n’ụwa?
3 Olee nke e ji mara ụwa taa n’ime ọnọdụ uche abụọ ahụ? Olee mmụọ a na-ahụkarị n’ụwa? Akwụkwọ bụ́ World Military and Social Expenditures 1996 na-ekwu, sị: “Ọ dịghị narị afọ ọzọ dị n’ihe ndekọ nke ya na narị afọ nke 20 hà nhata n’ajọ . . . ime ihe ike.” Asọmpi maka ikike ọchịchị na nke akụ̀ na ụba—nakwa asọmpi dị iche iche nke mba, okpukpe, ebo, na agbụrụ—egbuola ihe karịrị 100 nde mmadụ n’ime narị afọ a. Àgwà nke mmadụ iche nanị banyere onwe ya amụbawokwa. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Chicago Tribune kwuru, sị: “Nsogbu ọha mmadụ na-enwe gụnyere ime ihe ike na-enweghị isi, imetọ ụmụaka, ịgba alụkwaghịm, ịṅụbiga mmanya ókè, ọrịa AIDS, ndị nọ n’afọ iri na ụma igbu onwe ha, ọgwụ ọjọọ, ajọ òtù okporo ámá, ndina n’ike, ịkwata ụmụaka n’iko, isikwopụ afọ ime, ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, . . . ịgha ụgha, nrigbu, nrụrụ aka ndọrọ ndọrọ ọchịchị . . . E nweghịzi echiche omume banyere ihe ọma na ihe ọjọọ.” N’ihi ya, magazin bụ́ UN Chronicle dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọha mmadụ na-adakpọ adakpọ.”
4, 5. Olee otú e siworo kọwaa mmụọ nke ụwa n’amụma Bible banyere oge anyị n’ụzọ dabara adaba?
4 Ọnọdụ ndị a zuru ụwa ọnụ. Ọ dị nnọọ dị ka amụma Bible bu ụzọ kwuo banyere oge anyị: “Oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu.”—2 Timoti 3:1-4.
5 Nke ahụ bụ nkọwa ziri ezi nke mmụọ a na-ahụkarị n’ụwa a. Ọ bụ àgwà nke mụ onwe m tupu ndị ọzọ, nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Esemokwu dị n’etiti mba dị iche iche na-apụta ìhè n’esemokwu dị n’etiti mmadụ na ibe ya. Dị ka ihe atụ, n’egwuregwu asọmpi, ọtụtụ ndị na-eme egwuregwu na-enwe ọchịchọ ịbụ ndị mbụ n’agbanyeghị otú nke a si emerụ ndị ọzọ ahụ n’ụzọ mmetụta uche ma ọ bụ ọbụna n’ụzọ anụ ahụ. A na-akwalite mmụọ a nke iche nanị banyere onwe onye n’ime ụmụaka, ọ na-adịgidekwa n’ọtụtụ akụkụ nke ndụ ndị meworo okenye. Ọ na-akpata “ibu iro, esemokwu, ekworo, ọnụma, ịkpa iche iche, nkewa.”—Ndị Galetia 5:19-21.
6. Olee ndị na-akwalite ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, oleekwa otú Jehova si ele ọnọdụ uche a anya?
6 Bible na-egosi na mmụọ iche nanị banyere onwe onye nke ụwa a na-egosipụta nke “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” Banyere mmetụta Setan na-enwe n’ahụ ndị na-ebi na mgbe ikpeazụ ndị a dị oké egwu, Bible na-ebu amụma, si: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa . . . n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:9-12) Ya mere, ya na ndị òtù ya bụ́ ndị mmụọ ọjọọ etinyekwuola ihe ná mgbalị ha iji kwalite ọnọdụ uche nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị n’ezinụlọ nke mmadụ. Oleekwa otú Jehova si ele àgwà dị otú ahụ anya? Okwu ya na-asị: “Ihe arụ n’anya Jehova ka onye ọ bụla bụ nke obi ya dị elu.”—Ilu 16:5.
Jehova Na-anọnyere Ndị Nwere Obi Dị Umeala
7. Olee otú Jehova si ele ndị nwere obi dị umeala anya, gịnịkwa ka ọ na-akụziri ha?
7 N’aka nke ọzọ, Jehova na-agọzi ndị nwere obi dị umeala. N’abụ ọ bụkuru Jehova, Eze Devid kwuru, sị: “Ị ga-azọpụtakwa ndị e wedara n’ala: ma anya Gị abụọ dịkwasịrị ndị dị elu, ka I wee mee ka ha dị ala.” (2 Samuel 22:1, 28) N’ihi ya, Okwu Chineke na-adụ ọdụ, sị: “Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa . . . chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.” (Zefanaịa 2:3) Jehova na-akụziri ndị ji ịdị umeala n’obi na-achọ ya ịzụlite mmụọ dị nnọọ iche kpam kpam na nke ụwa a. “Ọ na-ezikwa ndị dị umeala n’obi ụzọ Ya.” (Abụ Ọma 25:9; Aịsaịa 54:13) Ụzọ ahụ bụ ụzọ ịhụnanya. Ọ dabeere n’ime ihe ziri ezi dị ka ụkpụrụ Chineke si dị. Dị ka Bible si kwuo, ịhụnanya a ụkpụrụ na-eduzi, “adịghị anya isi, ọ dịghị afụli onwe ya elu, . . . ọ dịghị achọ ihe nke aka ya.” (1 Ndị Kọrint 13:1-8) Ọ na-apụtakwa ìhè n’obi dị umeala.
8, 9. (a) Olee otú ịhụnanya ụkpụrụ na-eduzi si malite? (b) Olee otú iṅomi ịhụnanya na ịdị umeala n’obi nke Jisọs gosipụtara dịruru ná mkpa?
8 Pọl na ndị Kraịst ndị ọzọ na narị afọ mbụ mụtara ụdị ịhụnanya a site n’ihe ndị Jisọs kụziri. Jisọs mụtakwara ya site n’aka Nna ya, bụ́ Jehova, bụ́ onye Bible na-ekwu banyere ya, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Jisọs maara na ọ bụ uche Chineke ka ya bie ndụ kwekọrọ n’iwu nke ịhụnanya, o mekwara otú ahụ. (Jọn 6:38) Ọ bụ ya mere o ji nwee ọmịiko n’ebe ndị e wedara n’ala, ndị ogbenye, na ndị mmehie nọ. (Matiu 9:36) Ọ gwara ha, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Matiu 11:28, 29.
9 Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya ịdị mkpa nke iṅomi ịhụnanya na ịdị umeala n’obi ya mgbe ọ gwara ha, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Ha ga-anọpụ iche n’ụwa a nke na-eche nanị banyere onwe ya. Ọ bụ ya mere Jisọs ji nwee ike ikwu banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:14) Ee e, ha adịghị eṅomi mmụọ nganga, nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke ụwa Setan. Kama nke ahụ, ha na-eṅomi mmụọ ịhụnanya na ịdị umeala n’obi nke Jisọs gosipụtara.
10. Gịnị ka Jehova ji ndị nwere obi dị umeala eme n’oge anyị?
10 Okwu Chineke buru n’amụma na na mgbe ikpeazụ ndị a, a ga-achịkọbata ndị dị umeala n’obi n’ime ọha mmadụ zuru ụwa ọnụ nke dabeere n’ịhụnanya na ịdị umeala n’obi. N’ihi ya, n’ime ụwa nke na-adịwanye nganga, ndị Jehova na-egosipụta àgwà na-emegide nke ahụ—obi dị umeala. Ndị dị otú ahụ na-asị: “Ka anyị rịgoruo ugwu Jehova [ezi ofufe ya e buliri elu], . . . Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ Ya nile.” (Aịsaịa 2:2, 3) Ọ bụ Ndịàmà Jehova mejupụtara ọha mmadụ a zuru ụwa ọnụ nke na-eje ije n’okporo ụzọ Chineke. Ha gụnyere “oké igwe mmadụ [na-amụba amụba], nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” (Mkpughe 7:9) Ọtụtụ nde mmadụ mejupụtara oké igwe mmadụ a ugbu a. Olee otú Jehova si na-azụ ha ịdị umeala n’obi?
Ịmụta Inwe Obi Dị Umeala
11, 12. Olee otú ndị ohu Chineke si egosipụta obi dị umeala?
11 Mmụọ Chineke n’ịrụ ọrụ n’ahụ ndị ya wepụtara onwe ha, na-enyere ha aka ịmụta imeri mmụọ na-adịghị mma nke ụwa ma gosipụtazie mkpụrụ nke mmụọ Chineke. Nke a na-apụta ìhè ‘n’ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè.’ (Ndị Galetia 5:22, 23) Iji nyere ndị ohu Chineke aka ịzụlite àgwà ndị ahụ, e nyere ha ndụmọdụ ịghara ịghọ “ndị na-achọ otuto efu, na-achọrịta ibe [ha] okwu, na-akpọrịta ibe [ha] asị.” (Ndị Galetia 5:26) N’otu aka ahụ, Pọl onyeozi kwuru, sị: “[Asị m] onye ọ bụla nọ n’etiti unu, ka ọ ghara ịtụkwasị uche n’onwe ya karịa nke o kwesịrị ịtụkwasị uche; kama ịtụkwasị uche n’inwe uche zuru okè.”—Ndị Rom 12:3.
12 Okwu Chineke na-agwa ezi ndị Kraịst ka ha ghara ime “ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala na-agụrịtanụ [ndị ohu Chineke] ibe unu ná ndị ka unu onwe unu mma; unu nile n’otu n’otu elela ihe nke aka unu anya, kama unu nile n’otu n’otu leekwa ihe nke mmadụ ibe unu anya.” (Ndị Filipaị 2:3, 4) “Ka onye ọ bụla ghara ịchọ ọdịmma nke aka ya, kama ọdịmma nke mmadụ ibe ya.” (1 Ndị Kọrint 10:24) Ee, ‘ịhụnanya na-eji okwu na omume nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị ewuli ndị ọzọ elu.’ (1 Ndị Kọrint 8:1) Ọ na-akwalite imekọ ihe ọnụ, ọ bụghị ịsọ mpi. Mmụọ nke mụ onwe m tupu ndị ọzọ enweghị ọnọdụ ọ bụla n’etiti ndị ohu Jehova.
13. N’ihi gịnị ka a na-aghaghị iji mụta inwe obi dị umeala amụta, oleekwa otú mmadụ si amụta ya?
13 Otú ọ dị, n’ihi ezughị okè e ketara eketa, anyị adịghị enwe obi dị umeala site n’ọmụmụ. (Abụ Ọma 51:5) A ghaghị ịmụta àgwà a amụta. Nke a pụkwara isi ike nye ndị a na-akụzighịrị ụzọ Jehova site na mgbe ha bụ ụmụ ọhụrụ kama bụrụ ndị nakweere ha ka oge na-aga ná ndụ. Ha enweelarị àgwà ndị dabeere n’omume nke ụwa ochie a. Ya mere ha aghaghị ịmụta ‘ịtụpụ mmadụ ochie ha, dị ka ibi obi mbụ ha si dị’ na ‘iyikwasị mmadụ ọhụrụ, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.’ (Ndị Efesọs 4:22, 24) Site n’enyemaka Chineke, ndị nwere ezi obi pụrụ ime ihe ọ na-achọ n’aka ha: “Yikwasịnụ obi ebere, obiọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Ndị Kọlọsi 3:12.
14. Olee otú Jisọs si kwuo okwu megide mmadụ ịchọ ibuli onwe ya elu?
14 Ndị na-eso ụzọ Jisọs aghaghị ịmụta nke ahụ. Ha abụrụla ndị toro eto mgbe ha ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya, nweekwa ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke mmụọ ịsọ mpi nke ụwa. Mgbe nne nke mmadụ abụọ n’ime ha chọrọ ka ụmụ ya bụrụ ndị a ma ama, Jisọs sịrị: “Ndị bụ́ isi nke mba nile ọzọ na-eme [ndị mmadụ] dị ka [hà bụ] ndị nwe ha: ndị ukwu ha na-achịkwa ha. Ọ bụghị otú a ka ọ ga-adị n’etiti unu: kama onye ọ bụla nke na-achọ ka e mee ya onye ukwu n’etiti unu, ọ ga-abụ onye na-ejere unu ozi; ọzọ, onye ọ bụla nke na-achọ ka ọ bụrụ onyeisi n’etiti unu, ọ ga-abụ ohu unu: dị ka Nwa nke mmadụ [Jisọs] abịaghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi, ka O werekwa ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:20-28) Mgbe Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara inwe utu aha iji na-anwa ibuli onwe ha elu, ọ gbakwụnyere, sị: “Unu nile bụ ụmụnna.”—Matiu 23:8.
15. Olee àgwà ndị na-achọ ọnọdụ nlekọta kwesịrị inwe?
15 Ezi onye na-eso ụzọ Jisọs bụ onye na-eje ozi, ee, ohu nye ndị Kraịst ibe ya. (Ndị Galetia 5:13) Nke a dị otú a karịsịa n’ebe ndị na-achọ iru eru maka nlekọta n’ime ọgbakọ nọ. Ha ekwesịghị ịsọ mpi ma ọlị maka ịbụ ndị a ma ama ma ọ bụ maka ikike; ha agaghị eme ‘ndị bụ́ ihe nketa dị ka hà bụ ndị nwe ha, kama ha ga-eme onwe ha ihe atụ ha ga-eṅomi.’ (1 Pita 5:3) N’ezie, mmụọ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị bụ ihe na-egosi na mmadụ erughị eru maka nlekọta. Onye dị otú ahụ ga-abụ ihe mmerụ ahụ nye ọgbakọ. N’eziokwu, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ‘ịgbaso ọnọdụ onye na-elekọta nzukọ Kraịst anya,’ ma nke a kwesịrị isite n’ọchịchọ ijere ndị Kraịst ndị ọzọ ozi. Ọnọdụ a abụghị ọnọdụ nke ịbụ onye a ma ama ma ọ bụ nke ikike, n’ihi na ndị nlekọta kwesịrị iso ná ndị kasị dị umeala n’obi n’ime ọgbakọ.—1 Timoti 3:1, 6.
16. Gịnị mere e ji maa Dịọtrefis ikpe n’Okwu Chineke?
16 Jọn onyeozi na-adọrọ uche anyị gaa n’ebe otu onye nke nwere echiche na-ezighị ezi nọ, na-asị: “Edegaara m nzukọ unu ihe n’akwụkwọ: ma Dịọtrefis, onye ọ na-atọ ụtọ ịbụ onyeisi n’etiti ha, anaraghị anyị nke ọma.” Nwoke a mesoro ndị ozọ ihe n’ụzọ enweghị nkwanye ùgwù iji nwaa ibuli ọnọdụ ya. Ma, mmụọ Chineke kpaliri Jọn idetu okwu ọmụma ikpe a mara Dịọtrefis n’ime Bible n’ihi àgwà ya nke mụ onwe m tupu ndị ọzọ.—3 Jọn 9, 10.
Àgwà Ziri Ezi
17. Olee otú Pita, Pọl, na Banabas si gosipụta obi dị umeala?
17 E nwere ọtụtụ ihe atụ Bible banyere àgwà ziri ezi, nke obi dị umeala. Mgbe Pita banyere n’ụlọ Kọnilịọs, nwoke ahụ “[dara] n’ala n’ụkwụ [Pita], kpọọ isiala nye ya.” Ma kama ịnakwere otuto gabigara ókè, “Pita weliri ya elu, sị, Bilie; mụ onwe m bụkwa mmadụ.” (Ọrụ 10:25, 26) Mgbe Pọl na Banabas nọ na Listra, Pọl gwọrọ otu nwoke dara ngwụrọ site n’ọmụmụ. N’ihi ya, ìgwè mmadụ nọ n’ebe ahụ sịrị na ndị ozi a bụ chi. Otú ọ dị, Pọl na Banabas “[dọwara] uwe ha, wee pụọ gbaba n’etiti ìgwè mmadụ ahụ, na-eti mkpu, na-asị, Ndị ikom, gịnị mere unu na-eme ihe ndị a? Anyị onwe anyị bụkwa mmadụ yiri unu n’ahụ anyị.” (Ọrụ 14:8-15) Ndị Kraịst a dị umeala n’obi agaghị anara otuto site n’aka ụmụ mmadụ.
18. N’igosipụta ịdị umeala n’obi, gịnị ka otu mmụọ ozi dị ike gwara Jọn?
18 Mgbe e nyere Jọn onyeozi “mkpughe nke Jisọs Kraịst,” e si n’aka otu mmụọ ozi nye ya. (Mkpughe 1:1) N’ihi ike otu mmụọ ozi nwere, anyị pụrụ ịghọta ihe mere Jọn ji tụọ ụjọ, n’ihi na otu mmụọ ozi bibiri ndị Asiria dị 185,000 n’otu abalị. (2 Ndị Eze 19:35) Jọn na-akọ, sị: “Mgbe m nụrụ, hụkwa, m wee daa n’ala ịkpọ isiala n’ihu ụkwụ mmụọ ozi ahụ onye na-egosi m ihe ndị a. O wee sị m, Lezie anya ka ị ghara ime ya: abụ m ohu ibe gị, bụrụkwa ohu ibe nke ụmụnna gị . . . kpọọ isiala nye Chineke.” (Mkpughe 22:8, 9) Lee obi dị umeala nke a bụ n’akụkụ nke mmụọ ozi a dị ike!
19, 20. Kwuo ọdịiche dị n’etiti mpako nke ndị ọchịagha na-emeri emeri nke Rom na obi dị umeala nke Jisọs.
19 Jisọs bụ ihe nlereanya kasị mma nke onye nwere obi dị umeala. Ọ bụ Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya, onye gaje ịbụ Eze nke Alaeze eluigwe Chineke. Mgbe o gosiri ndị mmadụ onwe ya dị ka onye dị otú ahụ, o meghị dị ka ndị ọchịagha na-enwe mmeri nke oge ndị Rom mere. A na-emere ha oké ememe ịkwụ n’ahịrị—usoro njem a na-akwụ n’ahịrị—ha na-anọkwasịkwa n’ụgbọ ịnyịnya ndị e ji ọlaedo na ọdụ́ chọọ mma, bụ́ ndị ịnyịnya ọcha, ma ọ bụ ọbụna enyí, ọdụm, ma ọ bụ agụ, na-adọkpụ. Ndị na-eso n’usoro njem ahụ a na-akwụ n’ahịrị bụ ndị oti egwú na-abụ abụ mmeri, tinyere ụgbọ ndị e ji ịnyịnya adọkpụ bụ́ ndị a na-akwaju ihe ndị a kwatara n’agha na nnukwu ụgbọala ndị na-eme ihe atụ ọgbọ agha. A na-enwekwa ndị eze, ndị isi, na ndị ọchịagha, tinyere ndị ezinụlọ ha, bụ́ ndị a dọtara n’agha, ndị a na-agbakarị ọtọ iji menye ha ihere. Ihe omume ndị ahụ na-enye echiche nke nganga, mpako.
20 Jiri nke ahụ tụnyere ọdịiche dị n’ụzọ Jisọs si wepụta onwe ya. Ọ dị njikere iji ịdị umeala n’obi wetuo onwe ya ala imezu amụma ahụ e buru banyere ya, nke sịrị: “Lee, eze gị na-abịakwute gị: onye ezi omume na onye nwere nzọpụta ka ọ bụ; onye e wedara n’ala, nke na-anọkwasịkwa n’ịnyịnya ibu.” O ji obi umeala nọkwasị n’ịnyịnya ibu, ọ bụghị n’ụgbọ ịnyịnya nke nnukwu ụmụ anụmanụ e ji eme ememe ịkwụ n’ahịrị na-adọkpụ. (Zekaraịa 9:9; Matiu 21:4, 5) Lee ka obi si atọ ndị dị umeala n’obi ụtọ na Jisọs ga-abụ Eze nke Jehova họpụtara ịchị ụwa dum n’ime ụwa ọhụrụ, onye nwere obi dị umeala, na-ahụ n’anya, na-enwe ọmịiko, na obi ebere n’ezie!—Aịsaịa 9:6, 7; Ndị Filipaị 2:5-8.
21. Gịnị ka obi dị umeala na-adịghị egosi?
21 Eziokwu ahụ bụ́ na Jisọs, Pita, Pọl, na ndị ikom na ndị inyom ndị ọzọ nwere okwukwe n’oge Bible, nwere obi dị umeala na-akagbu echiche ahụ bụ́ na ịdị umeala n’obi bụ adịghị ike. Kama nke ahụ, ọ na-egosi ịdị ike n’akparamàgwà, n’ihi na ndị a nwere obi ike, na-anụkwa ọkụ n’obi. Ha ji ikike dị ukwuu nke uche na nke omume tachie obi n’ule ndị tara akpụ. (Ndị Hibru, isi nke 11) Taakwa, mgbe ndị ohu Jehova nwere obi dị umeala, ha na-enwe ikike yiri nke ahụ n’ihi na Chineke na-eji mmụọ nsọ ya dị ike akwado ndị nwere obi dị umeala. N’ihi ya, a na-agba anyị ume, sị: “Unu nile were obi dị umeala kee onwe unu dị ka ákwà, ijerịtara ibe unu ozi: n’ihi na Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara. Ya mere wedanụ onwe unu n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka O wee welie unu elu n’oge nke Ya.”—1 Pita 5:5, 6; 2 Ndị Kọrint 4:7.
22. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
22 E nwere akụkụ ọzọ dị mma nke obi dị umeala nke dị ndị ohu Chineke mkpa itinye n’ọrụ. Ọ bụ nke na-atụnye ụtụ dị ukwuu n’iwulite mmụọ ịhụnanya na imekọ ihe ọnụ n’ime ọgbakọ. N’ezie, ọ bụ akụkụ dị oké mkpa nke obi dị umeala. A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.
Ná Ntụleghachi
◻ Kọwaa mmụọ a na-ahụkarị n’ụwa a.
◻ Olee otú ndị ahụ nwere obi dị umeala si enweta ihu ọma Jehova?
◻ N’ihi gịnị ka a na-aghaghị iji mụta inwe obi dị umeala?
◻ Olee ihe atụ ụfọdụ nke Bible banyere mmadụ ndị gosipụtara obi dị umeala?
[Foto dị na peeji nke 15]
Mmụọ ozi ahụ gwara Jọn, sị: “[Emela] ya: abụ m ohu ibe gị”