Ha Mere Uche Jehova
E Toro Jisọs Dị Ka Mesaịa na Eze!
ÌGWÈ na-eme mkpọtụ na-abanye Jerusalem na Nisan 9, 33 O.A., mere ihe juru ọtụtụ ndị Judia anya. Ọ bụ ezie na ọ bụghị ihe ijuanya ịhụ ka ndị mmadụ na-enuba n’ime obodo ukwu ahụ tupu Ememe Ngabiga, ndị ọbịa a dị iche. Onye e lekwasịrị anya n’etiti ha bụ nwoke na-anọkwasị n’elu nwa ịnyịnya ibu. Nwoke ahụ bụ Jisọs Kraịst, ndị mmadụ ahụ na-atụsakwa uwe na igu nkwụ n’ihu ya ka ha na-eti mkpu, sị: “Hosanna dịrị Nwa Devid: Onye a gọziri agọzi ka Onye ahụ bụ Nke na-abịa n’aha Onyenwe anyị; Hosanna n’ebe kachasị ihe nile elu.” Mgbe ha hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, a kpaliri ọtụtụ ndị nọrịị na Jerusalem isonye ahịrị ahụ.—Matiu 21:7-9; Jọn 12:12, 13.
Ọ bụ ezie na a na-eto ya ugbu a, Jisọs maara na ule chebiiri ya. Leenụ, na nanị ụbọchị ise, a ga-egbu ya n’otu obodo ukwu a! Ee, Jisọs maara na Jerusalem bụ ókèala na-ebu iro, ma o bu nke a n’uche dokwaa mbanye ya wuru ewu nke ọ banyere n’obodo ukwu ahụ.
E Mezuru Amụma Oge Ochie
Na 518 T.O.A., Zekaraịa buru amụma mbanye mmeri Jisọs n’ime Jerusalem. O dere, sị: “Tie mkpu, gị ada Jerusalem: lee, eze gị na-abịakwute gị: onye ezi omume na onye nwere nzọpụta ka ọ bụ; onye e wedara n’ala, nke na-anọkwasịkwa n’ịnyịnya ibu, ọbụna na nwa ịnyịnya, bụ́ nwa ịnyịnya ibu. . . . Ọ ga-agwakwa mba nile okwu udo: Ọ ga-achịkwa achị site n’otu oké osimiri ruo oké osimiri ọzọ, sitekwa n’Osimiri ruo nsọtụ nile nke ụwa.”—Zekaraịa 9:9, 10.
Ya mere mbanye Jisọs banyere n’ime Jerusalem na Nisan 9 mezuru amụma Bible. Ọ bụghị ihe omume mabanyere amabanye kama nke e ji nlezianya mee atụmatụ ya. N’oge bu ụzọ, mgbe ọ nọ kpọmkwem ná mpụga Jerusalem, Jisọs enyewo mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Gaanụ n’obodo nta nke dị ná ncherịta ihu unu, ngwa ngwa unu ga-ahụ ịnyịnya ibu e libeworo, ya na nwa ịnyịnya ibu: tọpụnụ ha, sekpụtara m ha. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla sị unu ihe ọ bụla, unu ga-asị, Ha dị Onyenwe anyị mkpa; ngwa ngwa ọ ga-ezite ha.” (Matiu 21:1-3) Ma n’ihi gịnị ka Jisọs ji chọọ ịgbara ịnyịnya ibu baa Jerusalem, gịnịkwa ka mmeghachi omume ìgwè ahụ pụtara?
Ozi Banyere Ọbụbụeze
Ihe ngosipụta a hụrụ anya na-adịkarị ike karịa okwu ọnụ. N’ihi ya, n’oge ụfọdụ Jehova mere ka ndị amụma ya gosipụta ozi ha iji mesie ozi amụma ha ike. (1 Ndị Eze 11:29-32; Jeremaịa 27:1-6; Ezikiel 4:1-17) Ụzọ nkwurịta okwu a nke ime ihe a na-ahụ nnọọ anya nwere mmetụta na-agaghị apụ apụ n’uche nke ọbụna onye nkiri obi kasị kpọọ nkụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, Jisọs gosipụtara ozi dị ike site n’ịgbara ịnyịnya ibu baa n’ime obodo ukwu Jerusalem. N’ụzọ dị aṅaa?
N’oge Bible e jiri ịnyịnya ibu mee ihe maka nzube ndị metụtara ndị eze. Dị ka ihe atụ, Solomọn gbara ‘ịnyịnya mule’ nna ya, bụ́ nke oké ịnyịnya ibu tụrụ ime ya, gaa n’otite mmanụ ya dị ka eze. (1 Ndị Eze 1:33-40) Ya mere Jisọs ịgbara ịnyịnya ibu baa n’ime Jerusalem ga-apụta na ọ na-egosipụta onwe ya dị ka eze.a Omume ìgwè mmadụ ahụ mesiri ozi a ike. Ìgwè mmadụ ahụ, nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ihe ka mejupụta ya bụ ndị Galili, tụsara uwe ha n’ihu Jisọs—omume na-echetara anyị maka ịma ọkwa ihu ọha nke ọbụbụeze Jihu. (2 Ndị Eze 9:13) Ha izo Jisọs aka dị ka “Nwa Devid” na-emesi ike ikike ịchịisi ya n’ụzọ iwu. (Luk 1:31-33) Ha iji igu nkwụ na-egosikwa dị ka o doro anya ha ido onwe ha n’okpuru ikike ịbụ eze ya.—Tụlee Mkpughe 7:9, 10.
Ya mere ndị kwụ n’ahịrị batara n’ime Jerusalem na Nisan 9 zipụrụ ozi doro anya na Jisọs bụ Mesaịa na Eze Chineke họpụtara. N’ezie, ọ bụghị mmadụ nile nwere obi ụtọ ịhụ ka e mere ka Jisọs pụta n’ụdị a. Ndị Farisii karịsịa chere na ọ bụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ma ọlị inye Jisọs ụdị nsọpụrụ ndị eze dị otú ahụ. “Onye ozizi,” ka ha kwuru, dị ka o doro anya n’olu iwe, “baara ndị na-eso ụzọ Gị mba.” Jisọs zara, sị: “Asị m unu na, ọ bụrụ na ndị a ekpuchie ọnụ ha, nkume ga-eti mkpu.” (Luk 19:39, 40) Ee, Alaeze Chineke bụ isiokwu nke nkwusa Jisọs. Ọ ga-eji anyaike kpọsaa ozi a ma ndị mmadụ hà nabatara ya ma ọ bụ na ha anabataghị ya.
Ihe Mmụta Nye Anyị
O were Jisọs obi ike dị ukwuu ịba Jerusalem otú ahụ Zekaraịa onye amụma buru ụzọ kwuo. Ọ maara na site n’ime otú ahụ na ya na-ekote iwe ndị iro ya. Tupu nrịgo ya n’eluigwe, Jisọs nyere ụmụazụ ya ọrụ ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke na ime “mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.” (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ịrụzu ọrụ a chọkwara obi ike. Ọ bụghị mmadụ nile na-enwe obi ụtọ ịnụ ozi ahụ. Ụfọdụ enweghị mmasị na ya, ebe ndị ọzọ na-emegide ya. Ọchịchị ụfọdụ etinyewo ihe mgbochi n’ọrụ nkwusa ahụ ma ọ bụ a machibidowo ya iwu kpam kpam.
Ma, Ndịàmà Jehova ghọtara na a ghaghị ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke e guzobeworo, ma ndị mmadụ hà gere ntị ma ọ bụ ha jụrụ ime otú ahụ. (Ezikiel 2:7) Ka ha nọgidere na-arụ ọrụ a na-azọpụta ndụ, nkwa Jisọs na-emesighachi ha obi ike: “Lee, Mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.”—Matiu 28:20.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ihe ndekọ Mak gbakwụnyere na nwa ịnyịnya ibu ahụ bụ nke “mmadụ ọ bụla aka-anọkwasịghị.” (Mak 11:2) Dị ka ihe àmà gosiri, anụmanụ a na-ejibeghị mee ihe kwesịrị ekwesị karịsịa maka nzube ndị dị nsọ.—Tụlee Ọnụ Ọgụgụ 19:2; Deuterọnọmi 21:3; 1 Samuel 6:7.