Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 4/1 p. 3
  • Ònye Ka Jizọs Kraịst Bụ n’Ezie?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Ka Jizọs Kraịst Bụ n’Ezie?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nazaret—Obodo Nke Onye Amụma Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Jizọs Kraịst Ònye Ka Ọ Bụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 4/1 p. 3

Ònye Ka Jizọs Kraịst Bụ n’Ezie?

“Mgbe ọ banyere na Jeruselem, obodo ahụ dum malitere ịgba aghara, ha ana-asị: ‘Ònye bụ onye a?’ Ìgwè mmadụ ahụ nọ na-akọ, sị: ‘Onye a bụ Jizọs onye amụma, onye Nazaret nke Galili!’” —MATIU 21:10, 11.

OLEE ihe mere ọgba aghara ji dị na Jeruselem n’ụbọchị a Jizọs Kraịsta rutere ebe ahụ n’oge opupu ihe ubi nke afọ 33 Oge Anyị? Ọtụtụ ndị nọ n’obodo ahụ anụla banyere Jizọs na ihe ebube ndị o mere. Ha nọgidere na-akọrọ ndị ọzọ banyere ya. (Jọn 12:17-19) Ma, ìgwè mmadụ ahụ amaghị na onye ha na ya nọ bụ onye akụkọ ya ga-eru ebe niile n’ụwa ma ruo ọtụtụ narị afọ, rute n’oge anyị!

Legodị ihe atụ ole na ole gosiri otú ndụ Jizọs sirila metụta ọtụtụ ndị n’ụwa.

▪ Kalenda ọtụtụ ndị ji agụ oge n’ọtụtụ ebe n’ụwa dabeere n’afọ e chere na a mụrụ Jizọs.

▪ Ihe dị ka nde mmadụ abụọ, ya bụ, ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị bi n’ụwa, na-akpọ onwe ha Ndị Kraịst.

▪ Alakụba, bụ́ okpukpe ihe karịrị otu ijeri mmadụ na-ekpe n’ụwa niile, na-akụzi na Jizọs bụ “onye amụma karịrị Ebreham, Noa, na Mozis.”

▪ A na-ekwuzi ọtụtụ okwu amamihe Jizọs kwuru n’ụdị dị iche iche n’okwu ndị mmadụ na-ekwu kwa ụbọchị. Ụfọdụ n’ime ha bụ:

‘Tụgharịa ntì nke ọzọ.’—MATIU 5:39.

‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’—MATIU 22:39.

‘Mmadụ enweghị ike ịbụ ohu nna ukwu abụọ.’—MATIU 6:24.

‘Enyela nkịta ihe dị nsọ.’—MATIU 7:6.

‘Ihe niile ị chọrọ ka ndị mmadụ na-emere gị, na-emere ya ndị ọzọ.’—MATIU 7:12.

‘Ka ee gị bụrụ ee gị, ka ee e gị bụrụ ee e.’—MATIU 5:37.

O doro anya na ndụ Jizọs na-emetụta nnọọ ọtụtụ mmadụ. Ma, ndị mmadụ kweere ihe dị nnọọ iche iche banyere ya. N’ihi ya, i nwere ike ịnọ na-eche, sị, ‘Ònye ka Jizọs Kraịst bụ n’ezie?’ Ọ bụ naanị Baịbụl kọwaara anyị ebe Jizọs si bịa, otú o si bie ndụ, na ihe mere o ji nwụọ. Ịmata eziokwu ndị ahụ banyere ya ga-emetụta ndụ gị nke ukwuu—ma ugbu a ma n’ọdịnihu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a “Jizọs,” nke bụ́ aha onye amụma a si Nazaret, pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.” “Kraịst” bụ utu aha pụtara “Onye E Tere Mmanụ,” nke na-egosi na e tere Jizọs mmanụ, ma ọ bụ na Chineke họpụtara ya ịrụ ọrụ pụrụ iche.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya