Gịnị Ka Akwụkwọ Nsọ Na-ekwu Banyere “Ịbụ Chineke nke Kraịst”?
JISỌS KRAỊST enwewo mmetụta okpukpe dị ukwuu n’ahụ ụmụ mmadụ. Nke a dị otú a n’ihi na ọtụtụ nde mmadụ na-ekwu na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya. Otú ọ dị, ọ bụghị ha nile kwenyere n’ụdị onye ọ bụ.
Ụfọdụ ndị na-ekwu na ha nakwere ozizi Jisọs na-ele ya anya dị ka Ọkpara Chineke, ọ bụghị dị ka Onye Okike n’onwe ya. Ndị ọzọ kwenyere na “ịbụ Chineke nke Kraịst” ma chee na ọ bụ Chineke n’ezie. Ha kwere na Jisọs abụrụwo onye dị adị mgbe nile ma bụrụ onye karịrị mmadụ mgbe ọ nọ n’elu ala ebe a. Hà ziri ezi na nke a? Gịnị ka Akwụkwọ nsọ na-ekwu?
Ịdị Adị Jisọs Tupu Ọ Ghọọ Mmadụ
Jisọs kwupụtara na ya abụrụwo onye dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ. Ọ sịrị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla rịgoworo n’eluigwe, ma ọ bụghị onye siri n’eluigwe ridata, bụ Nwa nke mmadụ.” (Jọn 3:13) Jisọs kwukwara, sị: “Mụ onwe m bụ nri dị ndụ nke siri n’eluigwe ridata: ọ bụrụ na mmadụ erie ụfọdụ n’ime nri a, ọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi: ma nri nke mụ onwe m ga-enyekwa bụ anụ ahụ m, n’ihi ndụ nke ụwa.”—Jọn 6:51.
Na Jisọs dị ndụ tupu ọ bia n’elu ala doro anya site n’okwu ya: “Mgbe a kamụghị Abraham mụ onwe m dị.” (Jọn 8:58) Abraham biri ndụ site na 2018 ruo 1843 T.O.A., ebe ndụ mmadụ Jisọs sitere na 2 T.O.A ruo 33 O.A. Nwa mgbe nta tupu ọnwụ ya, Jisọs kpere ekpere, sị: “Nna, gị onwe gị werekwa otuto nke m nwere n’ebe ị nọ mgbe ụwa akadịghị nye m otuto ugbu a n’ebe gị onwe gị nọ.”—Jọn 17:5.
Ndị na-eso ụzọ Jisọs nyekwara ihe àmà yiri nke ahụ. Jọn onyeozi dere, si: “Na mbụ ka Okwu ahụ dịrị, Okwu ahụ na Chineke dịkwara, Okwu ahụ bụrụkwa Chineke. E kere ihe nile site n’aka ya; e keghịkwa otu ihe ọ bụla nke e keworo ma ọ nọghị ya. . . . Okwu ahụ wee ghọọ anụ ahụ, bụ́ mmadụ, o wee biri n’etiti anyị, (anyị kirikwara otuto ya, bụ́ otuto dị ka otu nwa nwoke a mụrụ nanị ya na-anata n’aka nna ya), o jupụtara n’amara na eziokwu.” (Jọn 1:1, 3, 14) Ee, “Okwu ahụ wee ghọọ anụ ahụ” dị ka nwoke ahụ bụ Jisọs Kraịst.
N’izo aka n’ịdị adị nke Jisọs tupu ọ ghọọ mmadụ, Pọl onyeozi dere, sị: “Nweenụ uche a n’ime onwe unu, nke dịkwa n’ime Kraịst Jisọs: onye, ọ bụ ezie na ọ dịrị n’ụdị nke Chineke na mbụ, ma ọ gụghị ya n’ihe ọ ga-ejidesi ike, bụ́ ịha ka Chineke, kama o mere onwe ya ihe efu, n’ịnara ụdị nke ohu, e wee mee ya n’oyiyi nke mmadụ.” (Ndị Filipaị 2:5-7) Pọl kpọrọ Jisọs “onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke; n’ihi na n’ime ya ka e kere ihe nile.”—Ndị Kọlọsị 1:13-16.
Ọ Bụghị Chineke n’Elu Ala
Akwụkwọ nsọ mere ya ka ọ pụta ìhè na Jisọs bụ nnọọ mmadụ n’ozuzu ya site n’ọmụmụ ya ruo ọnwụ ya. Jọn ekwughị na Okwu ahụ bụ nanị ihe e yikwasịrị anụ ahụ. Ọ ‘ghọrọ anụ ahụ,’ ọ bụghịkwa anụ ahụ n’otu akụkụ ma bụrụ Chineke n’otu akụkụ ọzọ. Ọ bụrụ na Jisọs bụrịị mmadụ na Chineke n’otu mgbe ahụ, a pụghị ikwu na “e mere ya ka ọ dị karị ndị mmụọ ozi ala nke nta.”—Ndị Hibru 2:9; Abụ Ọma 8:4, 5.
Ọ bụrụ na Jisọs bụ ma Chineke ma mmadụ mgbe ọ nọ n’elu ala, n’ihi gịnị mere o ji kpee ekpere mgbe mgbe nye Jehova? Pọl dere, sị: “Onye n’ụbọchị nke anụ ahụ ya, mgbe o weresịrị ịkwa ákwá siri ike na anya mmiri chee ekpere na arịrịọ n’ihu onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya n’ọnwụ, mgbe a nụsịkwara olu ya n’ihi na ọ tụrụ egwu Chineke.”—Ndị Hibru 5:7.
Na Jisọs abụghị mmụọ n’otu akụkụ mgbe ọ nọ n’elu ala bụ nke e gosipụtara site n’okwu Pita na Kraịst bụ onye “e mere ka ọ nwụọ anwụọ n’anụ ahụ ya, ma e mere ka ọ dị ndụ ná mmụọ ya.” (1 Pita 3:18) Nanị n’ihi na Jisọs bụ mmadụ n’ozuzu ya mere ka o nwee ike inwe ahụmahụ nke ndị na-ezughị okè na-enweta ma si otú ahụ bụrụ onye isi nchụàjà nwere ọmịiko. Pọl dere: “Anyị enweghị onye isi nchụàjà onye na-apụghị iji obi soo anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị; kama anyị nwere onye a nwaworo n’ihe nile n’otu ụzọ ahụ a na-anwa anyị, ma o mehieghị.”—Ndị Hibru 4:15.
Dị ka “Nwa Atụrụ Chineke, nke na-ebupụ mmehie nke ụwa,” Jisọs “nyere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ihi mmadụ nile.” (Jọn 1:29; 1 Timoti 2:6) N’ụzọ dị otú ahụ, Jisọs zụrụghachiri kpọmkwem ihe Adam tụfuworo—ndị mmadụ zuru okè nke na-adịru ebighị ebi. Ebe ikpe ziri ezi Chineke chọrọ ‘ndụ maka ndụ,’ Jisọs n’ụzọ dị otú ahụ aghaghị ịbụ ihe Adam bụ na mbụ—mmadụ zuru okè, ọ bụghị Chineke bụ mmadụ.—Deuterọnọmi 19:21; 1 Ndị Kọrint 15:22.
Aghọtala Akụkụ Bible n’Ụzọ Na-ekwesịghị Ekwesị
Ndị na-ekwu na Jisọs bụ Chineke bụ mmadụ na-eji ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ eme ihe ná mgbalị igosipụta na ọ bụ onye so n’Atọ n’Ime Otu nke Krisendọm, hà ka Chineke n’ọdịdị, ike, ebube, na ịdị adị. Ma mgbe anyị nyochara akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a nke ọma, anyị na-ahụta na ndị ahụ na-arụ ụka maka “ịbụ Chineke nke Kraịst” na-ele amaokwu ndị a anya dị ka ndị na-ekwụ karịa ihe ha na-ekwu n’ezie.
Ụfọdụ na-ekwu na akụkụ Bible ebe Chineke ji nnọchiaha ahụ bụ “anyị” eme ihe na-eme ka Jisọs ahụ dịrị tupu ọ ghọọ mmadụ (Okwu ahụ) na Jehova hara nhata. Ma ojiji e jiri nnọchiaha nke a eme ihe apụtaghị na Chineke na-agwa onye ya na ya hà okwu. Karịsia ọ na-egosi na n’etiti ihe nile e kere eke n’eluigwe, otu onye nwere ọnọdụ kasị mma n’ebe Chineke dị. N’ezie, Jisọs nke dịworo tupu ọ ghọọ mmadụ bụ onye ya na Chineke na-akpachi anya, Onye Ọkà na Ọnụ Na-ekwuru ya.—Jenesis 1:26; 11:7; Ilu 8:30, 31; Jọn 1:3.
Ọnọdụ nile metụtara baptism Jisọs adịghị egosi na Chineke, Kraịst, na mmụọ nsọ ahụ hà nhata. Dị ka mmadụ, Jisọs mere baptism ná ngosipụta nke iche onwe ya n’ihu Nna ya nke eluigwe. N’oge ahụ “e meghere eluigwe,” mmụọ nke Chineke wee fedata, na-abịakwasị Jisọs dị ka nduru. Ọzọkwa, ‘site n’eluigwe,’ a nụrụ olu Jehova ka ọ sịrị: “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ n’anya, onye ihe ya dị m ezi mma.”—Matiu 3:13-17.
Ya mere, olee ihe Jisọs bu n’uche mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee ndị na-eso ụzọ baptism “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ”? (Matiu 28:19, 20, NW) Jisọs ebughị n’uche ma ọ bụ na-ekwu na ya, Nna ya, na mmụọ nsọ ahụ hà nhata. Kama nke ahụ, ndị ahụ e mere baptism na-amata Jehova dị ka Onye Na-enye Ndụ na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, onye ha raara ndụ ha nye. Ha na-anakwere Jisọs dị ka Mesaịa ahụ na onye Chineke sitere n’aka ya wetara ihe a kpọrọ mmadụ kwere ekwe ihe mgbapụta. Ha na-aghọta na mmụọ nsọ bụ ike ọrụ nke Chineke, bụ́ nke ha ga-edo onwe ha n’okpuru ya. Otú ọ dị, ndị ahụ na-eme baptism ekwesịghị ile Jehova, Jisọs, na mmụọ nsọ ahụ anya dị ka otu chi Atọ n’Ime Otu.
Ma ọrụ ebube Jisọs ọ́ dịghị egosi na ọ bụ Chineke bụ mmadụ? Ee e, n’ihi na Mosis, Elaịja, Elaịsha, ndị ozi bụ Pita na Pọl, na ndị ọzọkwa rụrụ ọrụ ebube dị iche iche n’abụghị Chineke ndị bụ mmadụ. (Ọpụpụ 14:15-31; 1 Ndị Eze 18:18-40; 2 Ndị Eze 4:17-37; Ọrụ 9:36-42; 19:11, 12) Dị ka ha, Jisọs bụ mmadụ onye jiri ike nke Chineke nyere ya rụọ ọrụ ebube.—Luk 11:14-19.
Aịsaịa n’ụzọ amụma zoro aka n’ebe Jisọs bụ Mesaịa ahụ nọ dị ka “Chineke nke bụ Dike.” (Aịsaịa 9:6) N’Aịsaịa 10:21, otu onye amụma ahụkwa kwuru banyere Jehova dị ka “Chineke nke bụ Dike.” Ụfọdụ na-agbalị iji myirịta nke ahịrị okwu a mee ihe iji gosipụta na Jisọs bụ Chineke. Ma ọ dị anyị mkpa inwe nlezianya banyere ịghọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. Okwu Hibru e dere “Chineke nke bụ Dike” abụghị nanị maka Chineke dị ka ọ dị n’okwu ahụ bụ “Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile.” (Jenesis 17:1) N’eziokwu, e nwere ọdịiche dị n’etiti ịbụ dike na ịbụ onye pụrụ ime ihe nile, n’enweghị onye karịrị ya.
Dị ka Aịsaịa 43:10 si kwuo, Jehova sịrị: “Ọ dịghị chi ọzọ e buru mụ onwe m ụzọ kpụọ, ọ dịghịkwa nke ga-eso m n’azụ.” Ma okwu ndị ahụ adịghị egosi na Jisọs bụ Chineke. Isi ihe dị na ya bụ na Jehova enweghị onye bu ya ụzọ, na ọ dịghị chi dịworo tupu ya onwe ya, n’ihi na ọ na-adị ebighị ebi. A gaghị enwe chi ọ bụla na-eso Jehova n’azụ n’ihi na ọ ga-anọgide na-adị mgbe nile, ọ gaghị enwe ndị ga-anọchị ya dị Ọkaaka Kasị Elu. Ma, Jehova mepụtara ndị ọzọ nke ya onwe ya kpọrọ chi, dị ka Akwụkwọ nsọ na-egosi site n’ikwu banyere ụfọdụ ndị mmadụ, sị: “Mụ onwe m sịrị, Chi ka unu bụ, ọ bụkwa ụmụ nke Onye kachasị ihe nile elu ka unu bụ. Otú ọ dị, dị ka mmadụ ka unu ga-anwụ, ọ bụkwa dị ka otu n’ime ndị isi ka unu ga-ada.” (Abụ Ọma 82:6, 7) N’otu aka ahụ, Okwu ahụ bụ chi nke Jehova kere, ma nke ahụ emeghị ka Jisọs hara ka Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile n’oge ọ bụla.
Ezi Ọnọdụ nke Jisọs
Ndị na-ekwu na Chineke weere ọdịdị nke mmadụ dị ka Chineke bụ mmadụ kwesịrị ịrịba ama na Bible egositụghị na Jisọs lere onwe ya anya n’ụdị dị otú ahụ. Kama nke ahụ, ọ nọgidere na-egosi na Jisọs abụrụwo mgbe nile onye dị nta n’ebe Nna ya nọ. Mgbe ọ nọ n’elu ala, Jisọs ekwughị na ya bụ ihe karịrị Ọkpara Chineke. Tinyere nke a, Kraịst kwuru, sị: “Nna m ka mụ onwe m ukwuu.”—Jọn 14:28.
Pọl wepụtara ọdịiche dị n’etiti Jehova na Jisọs mgbe o sịrị: “Ma n’ebe anyị nọ otu Chineke dị, bụ Nna, onye ihe nile sitere na ya, onye anyị onwe anyị dịkwaara ya; otu Onyenwe anyị dịkwa, bụ́ Jisọs Kraịst, onye ihe nile sitere n’aka ya, anyị onwe anyị sitekwara n’aka ya.” (1 Ndị Kọrint 8:6) Pọl kwukwara, sị: “Unu onwe unu bụ ndị nke Kraịst; ma Kraịst bụ nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 3:23) N’ezie, ọbụna dị ka ndị Kraịst bụ nke Nna ha ukwuu, Jisọs Kraịst, otú a ka ọ bụ nke Onye Isi ya, Jehova Chineke.
N’iwepụta otu isi ihe ahụ, Pọl dere: “Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 11:3) Mmekọrịta nke a dị n’etiti Chineke na Kraịst ga-anọgide na-aga n’ihu, n’ihi na mgbe Ọchịchị Puku Afọ Jisọs gasịrị, “ọ ga-arara alaeze ya nye n’aka Chineke, onye bụkwa Nna,” “a [ga-edokwa] Ọkpara ahụ onwe ya n’okpuru Onye ahụ nke doro ihe nile n’okpuru ya, ka Chineke wee bụrụ ihe nile n’ime ihe nile.”—1 Ndị Kọrint 15:24, 28; Mkpughe 20:6.
Ịtụle Ihe Odide Ndị Ọzọ
Banyere ọmụmụ Jisọs, Matiu dere, sị: “Ma ihe a dum emewo, ka okwu Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] kwuru site n’ọnụ onye amụma ya [n’Aịsaịa 7:14] wee mezuo, sị, Lee, nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-adị ime, ọ ga-amụtakwa nwa nwoke, ha ga-akpọkwa aha ya Immanuel; nke bụ, ma a sụgharịa ya, Chineke Nọnyeere Anyị.” (Matiu 1:22, 23) E nyeghị Jisọs Immanuel dị ka aha ọ ga-aza, ma ọrụ ya dị ka mmadụ mezuru ihe ọ pụtara. Ọnụnọ Jisọs n’elu ala dị ka Mkpụrụ ahụ bụ Mesaịa na Onye Nketa nke ocheeze Devid gosipụtaara ndị na-efe Jehova na Chineke nọnyeere ha, n’akụkụ nke ha, na-akwado ha n’ihe nile ha na-eme.—Jenesis 28:15; Ọpụpụ 3:11, 12; Joshua 1:5, 9; Abụ Ọma 46:5-7; Jeremaia 1:19.
N’ịgwa Jisọs siworo n’ọnwụ bilite okwu, onyeozi bụ Tọmas tiri mkpu, sị: “Onyenwe m na Chineke m.” (Jọn 20:28) Ihe ndekọ a na ndị ọzọ bụ nke ‘e deworo n’akwụkwọ, ka anyị onwe anyị wee kwere na Jisọs bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke.’ Tọmas adịghịkwa ekwugide Jisọs, bụ́ onye zigaara ndị na-eso ụzọ Ya ozi ahụ: “Ana m arịgo lakwuru . . . Chineke m na Chineke unu.” (Jọn 20:17, 30, 31) Ya mere Tọmas echeghị na Jisọs bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. Ọ pụrụ ịbụ na Tọmas ekwuwo banyere Jisọs dị ka “Chineke m” n’echiche nke Kraịst ịbụ ‘chi,’ ọ bụ ezie na ọ bụghị ‘ezi Chineke ahụ.’ (Jọn 1:1; 17:1-3) Ma ọ bụ site n’ikwu “Chineke m,” Tọmas pụrụ ịdị na-ekwupụta banyere Jisọs dị ka Ọnụ Na-ekwuru Chineke na Onye Nnọchianya Ya, ọbụna dị ka ndị ọzọ gwara mmụọ ozi na-eje ozi okwu dị ka à ga-asị na ọ bụ Jehova.—Tụlee Jenesis 18:1-5, 22-33; 31:11-13; 32:24-30; Ndị Ikpe 2:1-5; 6:11-15; 13:20-22.
Mgbe ahụ, dị ka Bible si kwuo, Jisọs adịwo ndụ tupu ọ ghọọ mmadụ dị ka Okwu ahụ. Mgbe ọ nọ n’elu ala, ọ bụghị Chineke bụ mmadụ. Ọ bụ mmadụ kpam kpam, ọ bụ ezie na o zuru okè, dị ka Adam bụworo na mbụ. Kemgbe Jisọs bilitesịworo n’ọnwụ, ọ bụrụwo mmụọ na-adịghị anwụ anwụ e buliworo elu ịbụ onye nọ n’okpuru Chineke mgbe nile. N’ihi nke a, n’ụzọ pụtara ìhè, Akwụkwọ nsọ adịghị akwado echiche nke “ịbụ Chineke nke Kraịst.”
[Igbe dị na peeji nke 23]
Ndị Mmụọ Ozi Hà Na-efe Jisọs Ofufe?
ỤFỌDỤ nsụgharị nke Ndị Hibru 1:6 sịrị: “Ka mmụọ ozi nile nke Chineke fee ya [Jisọs] ofufe.” (King James Version; The Jerusalem Bible) O yiri ka Pọl onyeozi ọ hotara ihe dị na Septuagint, bụ́ nke sịrị n’Abụ Ọma 97:7: “Fee Ya [Chineke] unu nile bụ ndị mmụọ ozi Ya.”—C. Thomson.
Okwu Grik bụ pro·sky·neʹo, a sụgharịrị “ofufe” ná Ndị Hibru 1:6 bụ nke e ji mee ihe na Abụ Ọma 97:7 n’ime Septuagint ahụ maka okwu Hibru sha·chahʹ, nke pụtara “ịhulata isi ala.” Nke a pụrụ ịbụ ihe ụmụ mmadụ nakweere dị ka ihe nkwanye ùgwù. (Jenesis 23:7; 1 Samuel 24:8; 2 Ndị Eze 2:15) Ma ọ bụ ọ pụrụ imetụta ofufe nke ezi Chineke ahụ ma ọ bụ nke a na-enye chi ụgha dị iche iche n’ụzọ na-ezighi ezi.—Ọpụpụ 23:24: 24:1; 34:14; Deuterọnọmi 8:19.
Dị ka ọ na-adịkarị, pro·sky·neʹo e nyere Jisọs kwekọrọ ná nsọpụrụ nye ndị eze na ndị ọzọ. (Tụlee Matiu 2:2, 8; 8:2; 9:18; 15:25; 20:20 na 1 Samuel 25:23, 24; 2 Samuel 14:4-7; 1 Ndị Eze 1:16; 2 Ndị Eze 4:36, 37.) Mgbe mgbe ọ na-apụta ìhè na a na-asọpụrụ Jisọs ọ bụghị dị ka Chineke kama dị ka Ọkpara Chineke ma ọ bụ “Nwa nke mmadụ” bụ Mesaịa—Matiu 14:32, 33; Luk 24:50-52; Jọn 9:35, 38.
Ndị Hibru 1:6 na-ekwu banyere ọnọdụ Jisọs n’okpuru Chineke. (Ndị Filipaị 2:9-11) N’ebe a ụfọdụ nsụgharị na-ede pro·sky·neʹo “ịkwanye ùgwù” (The New English Bible), “ịsọpụrụ” (New World Translation), ma ọ bụ “ịhụlata isi n’ihu” (An American Translation). Ọ bụrụ na mmadụ họọrọ nsụgharị ahụ bụ “ofufe,” ụdị ofufe ahụ bụ nke a kpaara ókè,” n’ihi na Jisọs gwara Setan, sị: “Onyenwe anyị Chineke gị ka anyị ga-akpọ isiala [ụdị nke pro·sky·neʹo] nye, ọ bụkwa nanị ya ka ị ga-ekpere.”—Matiu 4:8-10.
Ọ bụ ezie na Abụ Ọma 97:7, bụ́ nke kwuru banyere ife Chineke ofufe, bụ nke e jiri mee ihe n’ihe banyere Kraịst na Ndị Hibru 1:6, Pọl egosiwo na Jisọs siworo n’ọnwụ bilie bụ “nnwupu nke ebube [Chineke] na onyinyo nke ụdị ya.” (Ndị Hibru 1:1-3) Ya mere “ofufe” ọ bụla ndị mmụọ ozi nyere Ọkpara Chineke bụ nke a kpaara ókè, ọ bụkwa nke e si n’aka ya nye Jehova.