Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 5/1 p. 8-13
  • “Ihe Ndị A Aghaghị Ịpụta”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ihe Ndị A Aghaghị Ịpụta”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmezu Na-eweta Ọdachi Dị Nso
  • Ndị Dị Ndụ Mgbe ahụ Ga-ahụ Ya
  • Mmezu Ọzọ nke Na-abịa
  • Ikpe Dị n’Ihu!
  • À Ga-azọpụta Gị Mgbe Chineke Mere Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • “Gịnị Ga-abụkwa Ihe Ịrịba Ama nke Ọnụnọ Gị?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ndị A Zọpụtara n’Aka “Ajọ Ọgbọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • “Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-eme?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 5/1 p. 8-13

“Ihe Ndị A Aghaghị Ịpụta”

“Jisọs wee zaa, sị ha, . . . Ihe ndị a aghaghị ịpụta; ma ọgwụgwụ ihe nile aka-erughị.”—MATIU 24:4-6.

1. Isiokwu dị aṅaa kwesịrị ịdọrọ mmasị anyị?

OBI abụọ adịghị ya na i nwere mmasị ná ndụ gị nakwa n’ọdịnihu gị. Mgbe ahụ i kwesịkwara inwe mmasị n’otu isiokwu nke dọọrọ uche C. T. Russell laa azụ na 1877. Russell, bụ́ onye mesịrị guzobe Watch Tower Society, dere akwụkwọ bụ́ The Object and Manner of Our Lord’s Return. Akwụkwọ nta a nke dị peji 64 tụlere nlọghachi Jisọs, ma ọ bụ ọbịbịa ya n’ọdịnihu. (Jọn 14:3) N’otu oge mgbe ha nọ n’Ugwu Olive, ndị ozi ya jụrụ banyere nlọghachi ya: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ [ma ọ bụ, “ọbịbịa,” King James Version] gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?”—Matiu 24:3, NW.

2. Gịnị mere e ji nwee ọtụtụ echiche ndị na-emegiderịta onwe ha banyere ihe Jisọs bụrụ n’amụma?

2 Ị̀ maara ma ghọta ihe Jisọs zara? A na-achọta ya n’atọ n’ime Oziọma ndị ahụ. Prọfesọ D. A. Carson na-asị: “Ọ bụ isiakwụkwọ ole na ole nke Bible kpaliworo enweghị nkwekọrịta ka ukwuu n’etiti ndị ntụgharị karịa Matiu isi 24 na akụkọ ndị ha na ya bụ otu ihe dị na Mak isi 13 na Luk isi 21.” O kwuziri echiche nke ya—nanị echiche ọzọ n’ime echiche ụmụ mmadụ nke na-emegiderịta onwe ya. Ihe dị ka na narị afọ gara aga, ọtụtụ echiche dị otú ahụ gosipụtara enweghị okwukwe. Ndị na-ekwupụta ha kwetara na ọ dịghị mgbe Jisọs kwuru ihe anyị na-agụ n’Oziọma ndị ahụ, na e mesịrị gbanwee ihe ndị o kwuru, ma ọ bụ na amụma ya emezughị—echiche sitere n’oké nkatọ Bible. Ọbụna otu onye na-enye nkọwa lere Oziọma Mak anya ‘site n’echiche nkà ihe ọmụma ndị Buddha nke Mahayana’!

3. Olee otú Ndịàmà Jehova si ele amụma Jisọs anya?

3 N’ụzọ dị iche, Ndịàmà Jehova na-anakwere ịbụ eziokwu na ikwesị ndabere nke Bible, gụnyere ihe Jisọs gwara ndị ozi anọ ahụ ya na ha nọ n’Ugwu Olive ụbọchị atọ tupu ọnwụ ya. Kemgbe oge C. T. Russell, ndị Chineke ejiriwo ụzọ na-aga n’ihu n’ihu na-enweta nghọta kakwu doo anya banyere amụma ahụ Jisọs buru n’ebe ahụ. N’afọ ole na ole gara aga, Ụlọ Nche emewo ọbụna ka echiche ha banyere amụma a dokwuo anya. Ị̀ nabatawo ihe ọmụma ahụ, na-ahụ mmetụta ya ná ndụ gị?a Ka anyị tụleghachi ya.

Mmezu Na-eweta Ọdachi Dị Nso

4. N’ihi gịnị ka ndị ozi ahụ pụrụ ijiworị jụọ Jisọs banyere ọdịnihu?

4 Ndị ozi ahụ maara na Jisọs bụ Mesaịa ahụ. Ya mere mgbe ha nụrụ ka o kwuru banyere ọnwụ, mbilite n’ọnwụ, na nlọghachi ya, ha aghaghị icheworị echiche, sị, ‘Ọ bụrụ na Jisọs anwụọ ma pụọ, olee otú ọ pụrụ isi mezuo ihe ndị dị ebube a na-atụ anya na Mesaịa ahụ ga-eme?’ Ọzọkwa, Jisọs kwuru banyere ọgwụgwụ nke Jerusalem na ụlọ nsọ ya. Ndị ozi ahụ pụrụ icheworị echiche, sị, ‘Ole mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka nke ahụ ga-esi mee?’ N’ịgbalị ịghọta ihe ndị a, ndị ozi ahụ jụrụ, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ? gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama mgbe ọ bụla a gaje imezu ihe ndị a nile?”—Mak 13:4; Matiu 16:21, 27, 28; 23:37–24:2.

5. Olee otú ihe Jisọs kwuru si mezuo na narị afọ mbụ?

5 Jisọs buru n’amụma na a ga-enwe agha, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, ịkpọasị na mkpagbu nke ndị Kraịst, ndị Mesaịa ụgha, na nkwusa nke ozi ọma Alaeze ahụ n’ọtụtụ ebe. Mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-eru. (Matiu 24:4-14; Mak 13:5-13; Luk 21:8-19) Jisọs kwuru nke a ná mmalite afọ 33 O.A. N’ime iri afọ ndị sochirinụ, ndị na-eso ụzọ ya bụ́ ndị nọ na nche pụrụ ịmata na ihe ndị ahụ e buru n’amụma na-eme n’ezie n’ụzọ dị ịrịba ama. Ee, akụkọ ihe mere eme na-egosi na ihe ịrịba ama ahụ mezuru n’oge ahụ, na-eduga n’ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu site n’aka ndị Rom n’afọ 66-70 O.A. Olee otú nke ahụ si mee?

6. Gịnị bilitere n’etiti ndị Rom na ndị Juu na 66 O.A.?

6 N’oge okpomọkụ Judia nke 66 O.A., ndị Zealot bụ́ ndị Juu wakporo ndị nche Rom nọ n’ebe e wusiri ike dị nso n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem, na-akpalite ime ihe ike n’ebe ndị ọzọ n’ala ahụ. N’akwụkwọ bụ́ History of the Jews, Prọfesọ Heinrich Graetz na-akọ, sị: “Cestius Gallus, onye ọrụ ya dị ka Gọvanọ Siria bụ ichebe ùgwù ndị agha Rom, . . . apụghịzi ịnọ na-ekiri nnupụisi nke na-agbasa gburugburu ya n’emeghị mgbalị ọ bụla iji gbochie ya ka ọ ghara ịga n’ihu. Ọ kpọkọtara ndị agha ya, ndị na-achị obodo ndị ya na ha gbara agbata obi zitekwara ndị agha ha n’afọ ofufo.” Usuu ndị agha a dị 30,000 gbara Jerusalem gburugburu. Mgbe ha lụtụrụ ọgụ, ndị Juu gbabara n’azụ mgbidi ndị dị ụlọ nsọ ahụ nso. “N’ime ụbọchị ise sochiri ibe ha, ndị Rom wakporo mgbidi ndị ahụ, ma a manyere ha mgbe mgbe ịlaghachi azụ n’ihi akụ́ ụta ndị Judia. Ọ bụ nanị n’ụbọchị nke isii ka ha nwere ihe ịga nke ọma n’igwu ala n’okpuru otu akụkụ nke mgbidi ebe ugwu nke dị n’ihu Ụlọ Nsọ ahụ.”

7. N’ihi gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs pụrụ iji lee ihe anya n’ụzọ dị iche n’otú ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu si lee ya?

7 Cheedị otú ọ ga-esiworị gbagwojuo ndị Juu anya, ebe ha nọworo na-eche na Chineke ga-echebe ha na obodo nsọ ha! Otú ọ dị, e burularị ụzọ dọọ ndị na-eso ụzọ Jisọs aka ná ntị na ọdachi na-echere Jerusalem. Jisọs ebuwo n’amụma, sị: “Ụbọchị ga-abịakwasị gị, mgbe ndị iro gị ga-egwu ékpè na ị̀gá imegide gị, nọgidekwa gị gburugburu, jigidekwa gị n’akụkụ nile, tụdaakwa gị n’ala, na ụmụ gị bi n’ime gị; ha agaghị ahapụkwa n’ime gị otu nkume n’elu nkume ibe ya.” (Luk 19:43, 44) Ma nke ahụ ọ̀ ga-apụtara ndị Kraịst nọ n’ime Jerusalem na 66 O.A. ọnwụ?

8. Ọdachi dị aṅaa ka Jisọs buru n’amụma, olee ndị bụkwa “ndị a họpụtara” bụ́ ndị a ga-eji maka ha mee ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi?

8 Mgbe ọ na-aza ndị ozi ya ajụjụ n’Ugwu Olive, Jisọs buru amụma, sị: “Mgbe ahụ ga-abụ mkpagbu, nke aha mkpagbu dị otú a aka-adịghị site ná mmalite okike ụwa nke Chineke kere ruo mgbe a, ọ gaghị adịkwa ma ọlị. Ọ bụrụkwa na Onyenwe anyị emeghị ụbọchị ahụ ka ha dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta mmadụ ọ bụla: ma n’ihi ndị a họpụtara, ndị Ọ họpụtara, O mere ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi.” (Mak 13:19, 20; Matiu 24:21, 22) Ya mere a ga-eme ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi, a ga-azọpụtakwa “ndị a họpụtara.” Olee ndị ha bụ? N’ezie ha abụghị ndị Juu na-enupụ isi bụ́ ndị zọọrọ na ha na-efe Jehova ma bụrụ ndị jụworo Ọkpara ya. (Jọn 19:1-7; Ọrụ 2:22, 23, 36) Ezi ndị a họpụtara laa azụ n’oge ahụ bụ ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu bụ́ ndị gosipụtara okwukwe n’ebe Jisọs nọ dị ka Mesaịa na Onye Nzọpụta. Chineke ahọpụtawo ndị dị otú ahụ, na Pentikọst 33 O.A. kwa, o guzobewo ha ịbụ mba ime mmụọ ọhụrụ, bụ́ “Israel nke Chineke.”—Ndị Galetia 6:16; Luk 18:7; Ọrụ 10:34-45; 1 Pita 2:9.

9, 10. E si aṅaa mee ka ụbọchị mwakpo nke ndị Rom “dị mkpirikpi,” gịnịkwa si na ya pụta?

9 È mere ka ụbọchị ndị ahụ “dị mkpirikpi” ma zọpụta ndị ahụ e tere mmanụ a họpụtara na Jerusalem? Prọfesọ Graetz na-atụ aro, sị: “[Cestius Gallus] eleghị ya anya dị ka ihe amamihe dị na ya ịnọgide n’ọgụ ahụ ọ na-alụso ndị obi ha kpọrọ nkụ ma malite agha dị ogologo n’oge ahụ, bụ́ mgbe mmiri ozuzo nke oge mgbụsị akwụkwọ ga-amalite n’oge na-adịghị anya . . . nke pụkwara igbochi ndị agha ahụ inweta ihe ndị na-akpa ha. Ikekwe n’ihi nke ahụ o chere na ọ bụ ihe amamihe ka dịrị na ya ịlaghachi azụ.” N’agbanyeghị ihe Cestius Gallus nọ na-eche, usuu ndị agha Rom si n’obodo ahụ laghachi, na-enwe mfu dị ukwuu nke ndị Juu ahụ na-achụ ha ọsọ kpataara ha.

10 Nlaghachị ahụ dị ịtụnanya nke ndị Rom laghachiri nyere ohere maka ịzọpụta “mmadụ”—ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ́ ndị nọ n’ihe ize ndụ n’ime Jerusalem. Akụkọ ihe mere eme dekọrọ na mgbe ohere ọma a dapụtara, ndị Kraịst si n’ógbè ahụ gbapụ. Lee nnọọ ngosipụta nke ikike Chineke nwere ibu ụzọ mara ọdịnihu na ijide n’aka na a zọpụtara ndị na-efe ya ofufe nke a bụ! Ma, gịnị banyere ndị Juu na-ekweghị ekwe bụ́ ndị nọgidere n’ime Jerusalem na Judia?

Ndị Dị Ndụ Mgbe ahụ Ga-ahụ Ya

11. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere “ọgbọ a”?

11 Ọtụtụ ndị Juu chere na usoro ofufe ha, nke hiwere isi n’ụlọ nsọ ahụ, ga-adịgide ruo oge dị anya. Ma Jisọs sịrị: “Site n’ahụ osisi fig mụtanụ . . . ya: mgbe ọ bụla alaka ya dịwara nro ugbu a, putekwa akwụkwọ ndụ ya, unu mara na mgbe okpomọkụ dị nso; otú a unu onwe unu kwa, mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a nile, maranụ na Ọ nọ nso, n’ọnụ ụzọ. N’ezie asị m unu, Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme. Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu nile nke m agaghị agabiga ma ọlị.”—Matiu 24:32-35, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.

12, 13. Olee otú ndị na-eso ụzọ Jisọs ga-esiworị ghọta aka o zoro n’ebe “ọgbọ a” dị?

12 N’afọ ndị bu 66 O.A. ụzọ, ndị Kraịst ga-ahụworị ọtụtụ n’ime akụkụ ndị bu ụzọ nke ihe ịrịba ama ahụ ọtụtụ ihe mejupụtara ka ha na-emezu—agha, ụnwụ nri, ọbụna nkwusa sara mbara nke ozi ọma Alaeze ahụ. (Ọrụ 11:28; Ndị Kọlọsi 1:23) Otú ọ dị, olee mgbe ọgwụgwụ ihe nile ga-eru? Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Ọgbọ a [Grik, ge·ne·aʹ] agaghị agabiga”? Mgbe mgbe Jisọs akpọwo ọgbọ ndị Juu na-emegide ya, gụnyere ndị ndú okpukpe, “ajọ ọgbọ nke na-akwakwa iko.” (Matiu 11:16; 12:39, 45; 16:4; 17:17; 23:36) Ya mere, mgbe o kwukwara ọzọ banyere “ọgbọ a” n’Ugwu Olive, ihe àmà na-egosi na o bughị n’uche agbụrụ ndị Juu dum n’akụkọ ihe mere eme nile; o bughịkwa ụmụazụ ya n’uche, ọ bụ ezie na ha bụ “ọgbọ ndị a họpụtaworo.” (1 Pita 2:9) Jisọs adịghịkwa ekwu na “ọgbọ a” bụ oge.

13 Kama nke ahụ, Jisọs bu ndị mmegide bụ́ ndị Juu n’uche bụ́ ndị ga-ahụ mmezu nke ihe ịrịba ama ahụ o nyere. Banyere izo aka e zoro ‘n’ọgbọ a’ na Luk 21:32, Prọfesọ Joel B. Green na-asị: “N’Oziọma nke Atọ ahụ, ‘ọgbọ a’ (na nkebi ahịrịokwu ndị yiri ya) egosipụtawo mgbe nile otu ìgwè ndị mmadụ bụ́ ndị na-eguzogide nzube Chineke. . . . [Ọ na-ezo aka] n’ebe ndị ji isi ike gbakụta nzube Chineke azụ nọ.”b

14. Ahụmahụ dị aṅaa ka “ọgbọ” ahụ nwere, ma olee otú ihe ọ pụtaara ndị Kraịst si dị iche?

14 Ajọ ọgbọ nke ndị mmegide bụ́ ndị Juu bụ́ ndị pụrụ ịhụ ihe ịrịba ama ahụ ka ọ na-emezu ga-ahụkwa ọgwụgwụ ahụ. (Matiu 24:6, 13, 14) Ha mekwara otú ahụ! Na 70 O.A., ndị agha Rom lọghachiri, n’okpuru idu ndú Titus, bụ́ nwa Eze Ukwu Vespasian. Ahụhụ ndị Juu ndị a nọchibigidere ọzọ n’obodo ahụ tara fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe a na-agaghị ekwere ekwere.c Onye ji anya ya hụ ihe merenụ bụ́ Flavius Josephus na-akọ na ka ọ na-erule mgbe ndị Rom bibiri obodo ahụ, ihe dị ka 1,100,000 ndị Juu anwụọlarị, a dọkwaara ihe dị ka 100,000 n’agha, nke ihe ka ukwuu n’ime ha ga-anwụ n’ụzọ dị egwu n’oge na-adịghị anya n’agụụ ma ọ bụ n’ebe ndị a na-ekiri ihe na Rom. N’ezie, mkpagbu nke 66-70 O.A. bụ nke kasịnụ Jerusalem na usoro ihe ndị Juu hụtụworo ma ọ bụ nke ha ga-ahụ. Lee ka nke ahụ si dị iche n’ihe ọ pụtaara ndị Kraịst bụ́ ndị ṅara ntị n’amụma ịdọ aka ná ntị Jisọs ma si na Jerusalem pụọ mgbe ndị agha Rom laghachisịrị azụ na 66 O.A.! A ‘zọpụtara,’ ma ọ bụ chebe ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ “ndị a họpụtara,” na 70 O.A.—Matiu 24:16, 22.

Mmezu Ọzọ nke Na-abịa

15. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na amụma Jisọs ga-enwe mmezu ka ukwuu mgbe 70 O.A. gasịrị?

15 Otú ọ dị, nke ahụ abụghị ebe ọ gwụrụ. Ná mmalite, Jisọs egosiwo na mgbe e bibisịrị obodo ahụ, na ya ga-abịa n’aha Jehova. (Matiu 23:38, 39; 24:2) O meziri ka nke a dokwuo anya n’amụma o buru n’Ugwu Olive. Mgbe o hotasịworo “mkpagbu ukwu” ahụ na-abịanụ, o kwuru na mgbe nke a gasịrị na Kraịst ụgha dị iche iche ga-apụta, na ndị mba ọzọ ga-azọda Jerusalem n’ala ruo ogologo oge. (Matiu 24:21, 23-28; Luk 21:24) Ọ̀ pụrụ ịbụ na mmezu ọzọ, nke ka ukwuu, na-abịa? Ihe ndị na-emenụ na-aza ee. Mgbe anyị ji Mkpughe 6:2-8 (nke e dere mgbe mkpagbu ahụ bịakwasịrị Jerusalem na 70 O.A. gasịrị) tụnyere Matiu 24:6-8 na Luk 21:10, 11, anyị ga-ahụ na agha, ụnwụ nri, na ihe otiti ndị dị n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu dị n’ihu. Mmezu a ka ukwuu nke okwu Jisọs anọworị na-eme kemgbe Agha Ụwa Mbụ tiwapụrụ na 1914.

16-18. Gịnị ka anyị na-atụ anya na ọ ka ga-eme?

16 Ruo ọtụtụ iri afọ ugbu a, Ndịàmà Jehova akụziwo na mmezu a na-enwe ugbu a nke ihe ịrịba ama ahụ na-egosi na “mkpagbu ukwu” ka na-abịa. Ajọ “ọgbọ” dị ugbu a ga-ahụ mkpagbu ukwu ahụ. O yiri ka a ga-enwe akụkụ mbụ (mwakpo a ga-awakpo okpukpe ụgha dum), dị nnọọ ka mwakpo Gallus mere na 66 O.A. kpalitere mkpagbu ahụ dakwasịrị Jerusalem.d E mesịa, mgbe oge a a na-ekwughị otú ọ ga-adịru n’ogologo gasịrị, ọgwụgwụ ihe nile ga-eru—mbibi n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ, na-eyi nke ahụ mere na 70 O.A.

17 N’izo aka ná mkpagbu ahụ dị anyị nnọọ n’ihu, Jisọs sịrị: “Ma ngwa ngwa, mgbe mkpagbu mgbe ahụ [mbibi nke okpukpe ụgha] gasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya, kpakpando nile ga-adakwa site n’eluigwe, a ga-emekwa ka ike nile nke eluigwe mee mkpatụ: mgbe ahụ ka ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụtakwa ìhè n’eluigwe: mgbe ahụ ka ebo nile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe n’ike na oké ebube.”—Matiu 24:29, 30.

18 N’ihi ya, Jisọs n’onwe ya na-ekwu na “mgbe mkpagbu mgbe ahụ gasịrị,” na ihe omume ụfọdụ dị aṅaa nke eluigwe ga-eme. (Tụlee Joel 2:28-32; 3:15.) Nke a ga-eyi ụmụ mmadụ na-enupụ isi egwu, meekwa ka ha kụjaa nke na ha ‘ga-eti aka n’obi.’ Ọtụtụ ndị “[ga-atụbọ] site n’egwu, sitekwa n’ile anya ihe na-abịakwasị n’elu ụwa dum mmadụ bi.” Ma ọ gaghị adịrị ezi ndị Kraịst otú a! Ndị a ‘ga-eweli isi ha; n’ihi na mgbapụta ha na-eru nso.’—Luk 21:25, 26, 28.

Ikpe Dị n’Ihu!

19. Ànyị pụrụ isi aṅaa mara mgbe a ga-emezu ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ?

19 Rịba ama na Matiu 24:29-31 na-ebu amụma na (1) Nwa nke mmadụ na-abịa, (2) ọbịbịa a ga-abụ n’oké ebube, (3) ndị mmụọ ozi ga-eso ya, nakwa (4) ebo nile nke ụwa ga-ahụ ya. Jisọs kwughachiri ihe ndị a n’ilu atụrụ na ụmụ ewu. (Matiu 25:31-46) N’ihi ya, anyị pụrụ ikwubi na ilu a na-ekwu banyere oge, mgbe ntiwapụ mbụ nke mkpagbu ahụ gasịrị, bụ́ mgbe Jisọs na ndị mmụọ ozi ya ga-abịa ma nọdụ n’ocheeze ya ikpe ikpe. (Jọn 5:22; Ọrụ 17:31; tụlee 1 Ndị Eze 7:7; Daniel 7:10, 13, 14, 22, 26; Matiu 19:28.) Ole ndị ka a ga-ekpe ikpe, gịnịkwa ga-esi na ya pụta? Ilu ahụ na-egosi na Jisọs ga-elebara mba nile anya, dị ka a ga-asị na ha gbakọtara kpọmkwem n’ihu ocheeze eluigwe ya.

20, 21. Gịnị ga-eme atụrụ nke ilu Jisọs? (b) Ahụmahụ dị aṅaa ka ụmụ ewu ahụ ga-enwe n’ọdịnihu?

20 A ga-ekewapụta ndị ikom na ndị inyom yiri atụrụ gaa n’aka nri nke ihu ọma Jisọs. N’ihi gịnị? N’ihi na ha ji ohere ndị ha nwere meere ụmụnna ya ihe ọma—ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị ga-ekere òkè n’Alaeze eluigwe nke Kraịst. (Daniel 7:27; Ndị Hibru 2:9–3:1) N’ikwekọ n’ilu ahụ, ọtụtụ nde ndị Kraịst yiri atụrụ amatawo ụmụnna ime mmụọ Jisọs ma na-arụ ọrụ n’ịkwado ha. N’ihi ya, “oké ìgwè mmadụ” ahụ nwere olileanya dabeere na Bible nke ịlanarị ‘oké mkpagbu ahụ’ ma dịzie ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs, bụ́ ógbè elu ala nke Alaeze Chineke.—Mkpughe 7:9, 14; 21:3, 4; Jọn 10:16.

21 Lee ihe dị iche ọ ga-apụtara ụmụ ewu ahụ! A kọwara ha na Matiu 24:30 dị ka ndị ‘ga-eti aka n’obi’ mgbe Jisọs ga-abịa. Ha kwesịkwara nnọọ ime otú ahụ, n’ihi na ha ga-enweworị ihe ndekọ nke ịbụ ndị jụrụ ozi ọma Alaeze ahụ, ndị megidere ndị na-eso ụzọ Jisọs, nakwa ndị họọrọ ụwa nke na-agabiga agabiga. (Matiu 10:16-18; 1 Jọn 2:15-17) Ọ bụ Jisọs—ọ bụghị onye ọ bụla n’etiti ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụwa—na-ekpebi ndị ụmụ ewu ahụ bụ. Ọ na-ekwu banyere ha, sị: “Ndị a ga-apụ jee baa [ná mbibi, NW] ebighị ebi.”—Matiu 25:46.

22. Olee akụkụ nke amụma Jisọs nke anyị kwesịrị ilebakwuru anya?

22 Ọganihu anyị nwere n’ịghọta amụma ahụ dị na Matiu isi nke 24 na 25 abụrụwo ihe na-akpali akpali. Otú ọ dị, e nwere otu akụkụ nke amụma Jisọs nke anyị kwesịrị ilebakwuru anya—‘ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu nke na-eguzo n’ebe nsọ.’ Jisọs gbara ụmụazụ ya ume ịtụgharị uche na nke a nakwa ịdị njikere ime ihe. (Matiu 24:15, 16) Gịnị bụ “ihe arụ” a? Olee mgbe ọ na-eguzo n’ebe nsọ? Ò sikwa aṅaa emetụta atụmanya ndị anyị nwere maka ndụ ugbu a na nke ọdịnihu? Isiokwu na-esonụ ga-atụle nke a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee isiokwu ndị dịịrị ọmụmụ ná mbipụta Ụlọ Nche nke February 15, 1994; October 15 na November 1, 1995; na August 15, 1996.

b Ọkà mmụta bụ́ onye Britain bụ́ G. R. Beasley-Murray na-ekwu, sị: “Nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ ‘ọgbọ a’ ekwesịghị ịbụrụ ndị ntụgharị ihe isi ike. Ọ bụ ezie na genea n’asụrụ Grik mbụ pụtara ọmụmụ, ụmụ, n’ihi ya kwa pụta agbụrụ, . . . na [Septuagint nke Grik] a kasị jiri ya sụgharịa okwu Hibru bụ dôr, bụ́ nke pụtara afọ ndụ, oge ndụ nke ihe a kpọrọ mmadụ, ma ọ bụ ọgbọ n’echiche nke ndị dị ndụ mgbe ahụ. . . . N’okwu ndị a sịrị na Jisọs kwuru, okwu ahụ yiri ka o nwere ụzọ ihe abụọ ọ pụtara: n’otu akụkụ ọ na-ezo aka mgbe nile n’ebe ndị oge ya nọ, n’akụkụ nke ọzọ kwa ọ na-apụta nkatọ a na-ekwughị hoo haa mgbe nile.”

c N’akwụkwọ bụ́ History of the Jews, Prọfesọ Graetz na-ekwu na mgbe ụfọdụ, ndị Rom kpọgburu ndị mkpọrọ dị 500 n’otu ụbọchị. E gbupụrụ aka ndị Juu ndị ọzọ e jidere ejide ma zighachizie ha n’obodo ahụ. Olee ọnọdụ jupụtara n’ebe ahụ? “Ego adịghịzi uru ọ bara, n’ihi na ọ pụghị ịzụtanwu bred. Ndị mmadụ lụrụ ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ n’okporo ámá n’ihi nri ndị kasị asọ oyi ma rụọ arụọ, otu njuaka okporo ọka, otu iberibe akpụkpọ anụ, ma ọ bụ ụrụghụrụ anụ a tụpụụrụ nkịta. . . . Oké ịrị elu n’ọnụ ọgụgụ nke ozu ndị a na-elighị eli mere ka ikuku nke oge okpomọkụ ahụ dị oké ọkụ na-akpata ọrịa na-efe efe, ọha mmadụ rịakwara ọrịa, nwee ụnwụ nri, nwụọkwa ná mma agha.”

d Isiokwu na-esonụ na-atụle akụkụ a nke mkpagbu ahụ na-abịanụ.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Mmezu dị aṅaa ka Matiu 24:4-14 nwere na narị afọ mbụ?

◻ N’oge ndị ozi, e si aṅaa mee ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi, zọpụtakwa mmadụ, dị ka e buru n’amụma na Matiu 24:21, 22?

◻ Gịnị ka e ji mara “ọgbọ” ahụ e hotara na Matiu 24:34?

◻ Olee otú anyị si mara na amụma ahụ e buru n’Ugwu Olive ga-enwe mmezu ọzọ, nke ka ukwuu?

◻ Olee mgbe ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ ga-emezu, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?

[Foto dị na peeji nke 12]

Nkọwa zuru ezu banyere Ogidi Titus dị na Rom, na-egosi ihe ndị a kwatara n’agha mgbe e bibiri Jerusalem

[Ebe E Si Nweta Foto]

Soprintendenza Archeologica di Roma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya