Ọbịbịa Jisọs Ka Ọ Bụ Ọnụnọ Jisọs—Ole Nke?
“Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?”—MATIU 24:3, NW.
1. Òkè dị aṅaa ka ajụjụ keere n’ozi Jisọs?
OJIJI Jisọs ji ajụjụ mee ihe n’ụzọ nkà mere ka ndị na-ege ya ntị chee echiche, ọbụna tụlee ihe site n’echiche ndị ọhụrụ. (Mak 12:35-37; Luk 6:9; 9:20; 20:3, 4) Anyị pụrụ inwe ekele na ọ zakwara ajụjụ. Azịza ya na-amụkwasị ìhè n’eziokwu ndị anyị na-agaraghị amata ma ọ bụ ghọta.—Mak 7:17-23; 9:11-13; 10:10-12; 12:18-27.
2. N’ajụjụ dị aṅaa ka anyị kwesịrị itinye uche anyị ugbu a?
2 Na Matiu 24:3, anyị na-ahụ otu n’ime ajụjụ Jisọs zatụworo. Ebe ngwụsị nke ndụ elu ala ya dị nso, Jisọs ka dọsịrị aka ná ntị na a ga-ebibi ụlọ nsọ Jerusalem, na-aka ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu akara. Ihe ndekọ Matiu na-agbakwụnye, sị: “Mgbe ọ na-anọdụ ala n’Ugwu Olive, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya nanị ha, na-asị: ‘Gwa anyị, Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ [“ọbịbịa,” King James Version] gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?’”—Matiu 24:3, NW.
3, 4. Ndịrịta iche dị aṅaa kwesịrị ịrịba ama dị n’otú Bible dị iche iche si sụgharịa otu okwu gbara ọkpụrụkpụ dị na Matiu 24:3?
3 Ọtụtụ nde ndị na-agụ Bible echewo, sị, ‘N’ihi gịnị ka ndị na-eso ụzọ ya ji jụọ ajụjụ ahụ, oleekwa otú nzaghachi Jisọs kwesịrị isi emetụta m?’ Ná nzaghachi ya Jisọs kwuru banyere mpụta nke akwụkwọ ndụ na-egosi na mgbe okpomọkụ “dị nso.” (Matiu 24:32, 33) N’ihi ya, ọtụtụ chọọchị na-akụzi na ndị ozi ahụ nọ na-ekwu ka e nye ha ihe ịrịba ama nke “ọbịbịa” Jisọs, ihe ịrịba ama na-egosi na nlọghachi ya dị nso. Ha kwenyere na “ọbịbịa” ahụ ga-abụ oge ọ ga-akpọrọ ndị Kraịst gaa n’eluigwe ma wetazie ọgwụgwụ ụwa. Ì kwere na nke a ziri ezi?
4 Kama nsụgharị ahụ bụ́ “ọbịbịa,” ụfọdụ nsụgharị Bible, tinyere New World Translation of the Holy Scriptures, ji okwu ahụ bụ́ “ọnụnọ” mee ihe. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ihe ndị na-eso ụzọ ya jụrụ banyere ya na ihe Jisọs zaghachiri dị iche n’ihe a na-akụzi na chọọchị? Gịnị n’ezie ka a jụrụ? Gịnịkwa ka Jisọs zara?
Gịnị Ka Ha Na-ajụ?
5, 6. Gịnị ka anyị pụrụ ikwubi banyere echiche ndị ozi ahụ mgbe ha jụrụ ajụjụ nke anyị na-agụ na Matiu 24:3?
5 N’ihi ihe Jisọs kwuru banyere ụlọ nsọ ahụ, o yiri ka ndị na-eso ụzọ ya nọ na-eche banyere ndokwa ndị Juu mgbe ha jụrụ maka ‘ihe ịrịba ama nke ọnụnọ [ma ọ bụ, “ọbịbịa”] ya na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a [n’ụzọ nkịtị, “ọgbọ a”].’—Tụlee “ụwa” ná 1 Ndị Kọrint 10:11 na Ndị Galetia 1:4, KJ.
6 N’oge a ndị ozi ahụ nwere nanị nghọta dị nta nke ozizi Jisọs. Ha echeelarị tupu mgbe ahụ na “alaeze Chineke gaje ịpụta ìhè ngwa ngwa.” (Luk 19:11; Matiu 16:21-23; Mak 10:35-40) Ọbụna mgbe e nwesịrị nkwurịta okwu ahụ n’elu Ugwu Olive, ma tupu e jiri mmụọ nsọ tee ha mmanụ, ha jụrụ ma Jisọs ọ̀ na-eweghachiri Israel Alaeze ahụ mgbe ahụ.—Ọrụ 1:6.
7. N’ihi gịnị ka ndị ozi ahụ ga-eji ajụ Jisọs banyere ọrụ ọ ga-arụ n’ọdịnihu?
7 Ma, ha maara na ọ ga-apụ, n’ihi na n’oge na-adịbeghị anya o kwuru, sị: “Nwa oge fọdụrụ ka Ìhè ahụ ga-adị n’etiti unu. Na-ejegharịnụ mgbe unu na-enwe Ìhè ahụ.” (Jọn 12:35; Luk 19:12-27) Ya mere ha pụrụ icheworị, sị, ‘Ọ bụrụ na Jisọs na-aga ịpụ, olee otú anyị ga-esi amata nlọghachi ya?’ Mgbe ọ pụtara dị ka Mesaịa ahụ, ihe ka ọtụtụ amataghị ya. Ihe karịkwara otu afọ n’ihu, a nọgidere na-ajụ ajụjụ banyere ma ọ ga-emezu ihe nile nke Mesaịa ahụ gaje ime. (Matiu 11:2, 3) Ya mere ndị ozi ahụ nwere ihe mere ha ga-eji jụọ ajụjụ banyere ọdịnihu. Ma, ọzọkwa, hà na-ajụ ajụjụ maka ihe àmà na ọ ga-abịa n’isi nso ka ọ̀ bụ maka ihe dị iche?
8. Ò yiri ka ndị ozi ahụ na Jisọs na-asụrịta asụsụ dị aṅaa?
8 Weredị ya na ị bụ nnụnụ na-ege ntị ná mkparịta ụka ahụ a na-enwe n’elu Ugwu Olive. (Tụlee Eklisiastis 10:20.) Ikekwe ị gaara anụ ka Jisọs na ndị ozi ya na-asụ Hibru. (Mak 14:70; Jọn 5:2; 19:17, 20; Ọrụ 21:40) Ma, o yiri ka ha makwaara asụsụ Grik.
Ihe Matiu Dere—Na Grik
9. Na gịnị ka ihe ka ukwuu ná nsụgharị Matiu ndị ọhụrụ dabeere?
9 Ihe ndekọ ndị dị laa azụ na narị afọ nke abụọ O.A. na-egosi na Matiu dere Oziọma ya na mbụ na Hibru. Dị ka ihe àmà na-egosi, o mesịrị dee ya na Grik. Ọtụtụ ihe odide dị na Grik adịruwo n’oge anyị, ha ejewokwa ozi dị ka ebe mgbakwasị ụkwụ maka ịsụgharị Oziọma ya gaa n’asụsụ ndị dị taa. Gịnị ka Matiu dere na Grik banyere mkparịta ụka ahụ e nwere n’elu Ugwu Olive? Gịnị ka o dere banyere “ọbịbịa” ma ọ bụ “ọnụnọ” ahụ nke ndị na-eso ụzọ ya jụrụ banyere ya nakwa nke Jisọs kwuru okwu banyere ya?
10. (a) Okwu Grik dị aṅaa maka “bịa” ka Matiu jiri mee ihe mgbe mgbe, gịnịkwa ka ọ pụrụ ịpụtacha? (b) Okwu Grik ọzọ dị aṅaa na-adọrọ mmasị?
10 N’isi 23 ndị mbụ nke Matiu, anyị na-achọta ngwaa Grik a na-ejikarị eme ihe maka “bịa,” bụ́ erʹkho·mai ihe karịrị ugboro 80. Ọ na-enyekarị echiche nke ịkpụdewe ma ọ bụ ịbịarute nso, dị ka ọ dị na Jọn 1:47: “Jisọs hụrụ Nataniel ka ọ na-abịakwute Ya.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Na-adabere n’otú e si jiri ya mee ihe, ngwaa bụ́ erʹkho·mai pụrụ ịpụta “bịarutere,” “gaa,” “garuo,” “ruo,” ma ọ bụ “gawa.” (Matiu 2:8, 11; 8:28; Jọn 4:25, 27, 45; 20:4, 8; Ọrụ 8:40; 13:51) Kama na Matiu 24:3, 27, 37, 39, Matiu jiri okwu dị iche mee ihe, mkpọaha na-adịghị ebe ọ bụla ọzọ n’Oziọma nile: pa·rou·siʹa. Ebe ọ bụ na Chineke nyere ike mmụọ nsọ e ji dee Bible, n’ihi gịnị ka o ji kpalie Matiu ịhọrọ okwu Grik a n’amaokwu ndị a mgbe ọ na-ede Oziọma ya na Grik? Gịnị ka ọ pụtara, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji chọọ ịma?
11. (a) Gịnị bụ echiche nke pa·rou·siʹa? (b) Olee otú ihe atụ ndị sitere n’ihe odide Josephus si kwadoo nghọta anyị nke pa·rou·siʹa? (Lee nkọwa ala ala peji.)
11 Pa·rou·siʹa pụtara kpọmkwem “ọnụnọ.” Akwụkwọ bụ́ An Expository Dictionary of New Testament Words nke Vine dere na-asị: “PAROUSIA, . . . n’ụzọ nkịtị, ọnụnọ, para, isoro, na ousia, ịnọ (site n’eimi, ịnọrọ), na-apụta ma mbịarute ma isorozi nọrọ. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ ozi e dere na papyrus, otu nwanyị na-ekwu banyere ịdị mkpa nke parousia ya n’otu ebe iji lekọta ihe ndị metụtara ihe onwunwe ya.” Akwụkwọ ọkọwa okwu ndị ọzọ na-akọwa na pa·rou·siʹa na-apụta ‘nleta nke onye ọchịchị.’ N’ihi ya, ọ bụghị nanị oge nke mbịarute, kama ọnụnọ nke na-agbatịpụ site ná mbịarute gaa n’ihu. N’ụzọ na-akpali mmasị, otú ahụ ka onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus, onye ya na ndị ozi bikwara ndụ n’otu mgbe, si jiri pa·rou·siʹa mee ihe.a
12. Olee otú Bible n’onwe ya si na-enyere anyị aka ịkwado ihe pa·rou·siʹa pụtara?
12 Akwụkwọ oge ochie mere ka “ọnụnọ” ahụ ọ pụtara pụta ìhè, ma ndị Kraịst nwere mmasị karịsịa n’otú Okwu Chineke si eji pa·rou·siʹa eme ihe. Azịza ya bụ otu ihe ahụ—ọnụnọ. Anyị na-ahụ nke ahụ site n’ihe atụ ndị dị n’akwụkwọ ozi Pọl. Dị ka ihe atụ, o degaara ndị Filipaị, sị: “Dị ka unu ṅara ntị mgbe nile, ọ bụghị nanị mgbe m nọ n’etiti unu, kama ugbu a mgbe m na-anọghị, werenụ egwu na ịma jijiji rụpụta karị nzọpụta nke onwe unu nke ukwuu.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) O kwukwara banyere isoro ha nọrọ ka ha wee nwee ike ṅụrịa ọṅụ “site n’ọnụnọ [pa·rou·siʹa] [ọ] ga-anọnyere [ha] ọzọ.” (Ndị Filipaị 1:25, 26, NW; 2:12) Nsụgharị ndị ọzọ na-agụ, sị, “mụ isoro unu nọrọ ọzọ” (Weymouth; New International Version); “mgbe m ga-anọnyere unu ọzọ” (Jerusalem Bible; New English Bible); na “mgbe m ga-anọkwa ọzọ n’etiti unu.” (Twentieth Century New Testament) Ná 2 Ndị Kọrint 10:10, 11, Pọl ji “ọnụnọ nke anụ ahụ ya” tụnyere ịbụ onye “na-anọghị.” N’ihe atụ ndị a o doro anya na ọ dịghị ekwu banyere nrute ma ọ bụ mbịarute ya; o ji pa·rou·siʹa mee ihe n’echiche nke ịnọ ya.b (Tụlee 1 Ndị Kọrint 16:17.) Otú ọ dị, gịnị banyere aka ndị e zoro n’ebe pa·rou·siʹa Jisọs dị? Hà bụ n’echiche nke “ọbịbịa” ya, ka ha na-egosi ọnụnọ gbatịpụrụ agbatịpụ?
13, 14. (a) N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji kwubie na pa·rou·siʹa na-agbatịpụ ruo oge ụfọdụ? (b) Gịnị ka a na-aghaghị ikwu banyere otú pa·rou·siʹa Jisọs hà n’ogologo?
13 Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ biri n’ụbọchị Pọl nwere mmasị na pa·rou·siʹa Jisọs. Ma Pọl dọrọ ha aka ná ntị ka ha ghara ịbụ ndị ‘e mere ka ha mee mkpatụ pụọ n’uche ha.’ “Onye ahụ na-emebi iwu” aghaghị ibu ụzọ pụta bụ́ onye mesịworo ghọọ ndị ụkọchukwu nke Krisendọm. Pọl dere na “[ọnụnọ, NW] ya dị ka ịrụsi ọrụ ike nke Setan n’ike nile ọ bụla na ihe ịrịba ama dị iche iche na ọrụ ebube dị iche iche nke ụgha.” (2 Ndị Tesalọnaịka 2:2, 3, 9) N’ụzọ doro anya, pa·rou·siʹa, ma ọ bụ ọnụnọ, nke “onye ahụ na-emebi iwu” abụghị nanị mbịarute mkpirikpi oge; ọ ga-agbatịpụ ruo ogologo oge, n’oge a ga-emepụta ọrụ ebube dị iche iche nke ụgha. N’ihi gịnị ka nke a ji dị mkpa?
14 Tụlee amaokwu butere nke ahụ ụzọ kpọmkwem: “A ga-ekpughekwa onye ahụ na-emebi iwu, onye Onyenwe anyị Jisọs ga-ewere iku ume nke si n’ọnụ Ya pụta gbuo, werekwa ngosi nke [ọnụnọ, NW] Ya mee ka ọ ghara ịdị irè.” Dị ka ọnụnọ nke “onye ahụ na-emebi iwu” ga-adịru oge ụfọdụ, ọnụnọ Jisọs ga-agbatịpụ ruo oge ụfọdụ, ọ ga-ejedebekwa ná mbibi nke “nwa nke ịla n’iyi” nke na-emebi iwu.—2 Ndị Tesalọnaịka 2:8.
Akụkụ Dị Iche Iche nke Asụsụ Hibru
15, 16. (a) Okwu dị aṅaa kpọmkwem ka e ji mee ihe n’ọtụtụ nsụgharị nke Matiu gaa na Hibru? (b) Olee otú e si jiri bohʼ mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ?
15 Dị ka e kwuru, ihe àmà gosiri na Matiu dere Oziọma ya na nke mbụ ya n’asụsụ Hibru. Ya mere, okwu Hibru dị aṅaa ka o ji mee ihe na Matiu 24:3, 27, 37, 39? Nsụgharị nke Matiu ndị a sụgharịrị gaa na Hibru ọgbara ọhụrụ nwere otu ụdị nke ngwaa bụ́ bohʼ, ma n’ajụjụ ndị ozi ma n’azịza Jisọs. Nke a pụrụ iduje ná nsụgharị ndị dị ka: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke [bohʼ] gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” na, “Dị nnọọ ka ọ dị n’ụbọchị Noa, otú ahụ ka [bohʼ] Nwa nke mmadụ ga-adị.” (NW) Gịnị ka bohʼ pụtara?
16 Ọ bụ ezie na o nwere ọtụtụ echiche, ngwaa Hibru ahụ bụ́ bohʼ pụtara n’ụzọ bụ isi “bịa.” Akwụkwọ bụ́ Theological Dictionary of the Old Testament na-asị: ‘N’ịbụ ihe pụtara 2,532 ugboro, bohʼ bụ otu n’ime ngwaa e jikarị mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ọ bụkwa ngwaa bụ isi e ji mee ihe n’igosipụta ngagharị.’ (Jenesis 7:1, 13; Ọpụpụ 12:25; 28:35; 2 Samuel 19:30; 2 Ndị Eze 10:21; Abụ Ọma 65:2; Aịsaịa 1:23; Ezikiel 11:16; Daniel 9:13; Emọs 8:11) A sị na Jisọs na ndị ozi ya jiri okwu dị otú ahụ nwere nnọọ ọtụtụ ihe ọ pụtara mee ihe, a pụrụ ịrụ echiche ya ụka. Ma hà mere otú ahụ?
17. (a) N’ihi gịnị ka nsụgharị Hibru ọgbara ọhụrụ nke Matiu na-agaghị ejicha gosi ihe Jisọs na ndị ozi ya kwuru? (b) Olee ebe ọzọ anyị pụrụ isi nweta ihe ọmụma banyere ihe nwere ike ịbụ ihe Jisọs na ndị ozi ya jiri mee ihe, n’ihi gịnị ọzọkwa ka isi iyi a ji na-adọrọ mmasị anyị? (Lee nkọwa ala ala peji.)
17 Buru n’uche na nsụgharị Hibru ndị ọgbara ọhụrụ bụcha nsụgharị nke nwere ike ọ gaghị enye kpọmkwem ihe Matiu dere na Hibru. Eziokwu dị na ya bụ na Jisọs pụrụ ijiworị okwu na-abụghị bohʼ mee ihe, nke dabara n’echiche nke pa·rou·siʹa. Anyị na-ahụ nke a site n’akwụkwọ e dere na 1995 bụ́ Hebrew Gospel of Matthew, nke Prọfesọ George Howard dere. Akwụkwọ ahụ lekwasịrị anya n’ịrụ ụka onye Juu bụ́ dibịa bụ́ Shem-Tob ben Isaac Ibn Shaprut rụrụ megide Iso Ụzọ Kraịst na narị afọ nke 14. Akwụkwọ ahụ nyere ihe odide Hibru nke Oziọma Matiu. E nwere ihe àmà na kama ịbụ nke a sụgharịrị site na Latin ma ọ bụ Grik n’oge Shem-Tob, ihe odide a nke Matiu emewo nnọọ ochie, e dekwara ya na mbụ na Hibru.c Ọ pụrụ isi otú a wetakwuo anyị nso n’ihe e kwuru n’elu Ugwu Olive.
18. Olee okwu Hibru na-akpali mmasị nke Shem-Tob ji mee ihe, gịnịkwa ka ọ pụtara?
18 Na Matiu 24:3, 27, 39, Matiu nke Shem-Tob ejighị ngwaa ahụ bụ́ bohʼ mee ihe. Kama nke ahụ, o jiri mkpọaha yiri ya bụ́ bi·ʼahʹ. Mkpọaha ahụ pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nanị n’Ezikiel 8:5, bụ́ ebe ọ pụtara “ụzọ mbata.” Kama ikwupụta ihe omume nke ịbịa, bi·ʼahʹ n’ebe ahụ na-ezo aka n’ọnụ ụzọ nke ụlọ; mgbe ị nọ n’ụzọ mbata ma ọ bụ n’ọnụ ámá, ị nọ n’ụlọ ahụ. Ọzọkwa, akwụkwọ okpukpe ndị na-adabereghị na Bible ndị so n’Akwụkwọ Mpịakọta Nile nke Osimiri Nwụrụ Anwụ na-ejikarị bi·ʼahʹ eme ihe banyere mbịarute ma ọ bụ mmalite nke ọkwá ndị nchụàjà. (Lee 1 Ihe Emere 24:3-19; Luk 1:5, 8, 23.) Nsụgharị nke a sụgharịkwara Peshitta nke Syriac (ma ọ bụ, Aramaic) oge ochie gaa na Hibru na 1986 ji bi·ʼahʹ mee ihe na Matiu 24:3, 27, 37, 39. Ya mere e nwere ihe àmà na n’oge ochie mkpọaha ahụ bụ́ bi·ʼahʹ pụrụ inweworị echiche nke dịtụ iche na ngwaa ahụ bụ́ bohʼ e ji mee ihe na Bible. N’ihi gịnị ka nke a ji na-akpali mmasị?
19. Ọ bụrụ na Jisọs na ndị ozi ya jiri bi·ʼahʹ mee ihe, gịnị ka anyị pụrụ ikwubi?
19 Ndị ozi ahụ n’ajụjụ ha na Jisọs n’azịza ya pụrụ ijiworị mkpọaha a bụ́ bi·ʼahʹ mee ihe. Ọbụna ọ bụrụ na ndị ozi ahụ bu n’uche nanị echiche nke mbịarute Jisọs nke dị n’ihu, Kraịst pụrụ ijiworị bi·ʼahʹ mee ihe iji nye ohere maka ihe karịrị ihe ha na-eche. Ọ pụrụ ịbụworị na Jisọs na-arụ aka ná mbịarute ya iji malite ọkwá ọhụrụ; mbịarute ya ga-abụ mmalite nke ọrụ ọhụrụ ya. Nke a ga-ekwekọ n’echiche nke pa·rou·siʹa, bụ́ nke Matiu mesịrị jiri mee ihe. N’ụzọ kwere nghọta, iji bi·ʼahʹ mee ihe n’ụzọ dị otú ahụ ga-akwadorịrị ihe Ndịàmà Jehova kụziworo eri ogologo oge, na “ihe ịrịba ama” ahụ ọtụtụ ihe mejupụtara nke Jisọs nyere gaje igosipụta na ọ nọ anọ.
Ichere Njedebe nke Ọnụnọ Ya
20, 21. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’okwu Jisọs kwuru banyere ụbọchị Noa?
20 Ọmụmụ anyị mụrụ ọnụnọ Jisọs kwesịrị imetụta ndụ anyị na atụmanya anyị kpọmkwem. Jisọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha mụrụ anya. O nyere ihe ịrịba ama ka e wee nwee ike ịmata ọnụnọ ya, ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ agaghị amata: “Dị nnọọ ka ọ dị n’ụbọchị Noa, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị. N’ihi na dị ka ha nọ n’ụbọchị ndị ahụ bu iju mmiri ahụ ụzọ, na-eri ma na-aṅụ, ndị ikom na-alụ nwunye, a na-enyekwa ndị inyom n’ọlụlụ di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ime ụgbọ ahụ; ha aṅaghịkwa ntị ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara ma kpochapụ ha nile, otú a ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.”—Matiu 24:37-39, NW.
21 N’ụbọchị Noa, ihe ka n’ọtụtụ mmadụ nke ọgbọ ahụ nọ nnọọ na-emere onwe ha ihe ha nwere ime. Jisọs buru amụma na ọ ga-adịkwa otú ahụ ‘n’ọnụnọ Nwa nke mmadụ.’ Ndị gbara Noa gburugburu pụrụ icheworị na o nweghị ihe ga-emenụ. Ị manụ ihe merenụ n’ezie. Ụbọchị ndị ahụ, bụ́ nke dịruru ogologo oge, dujere ná njedebe, “iju mmiri ahụ bịara ma kpochapụ ha nile.” Luk nyekwara ihe ndekọ yiri nke ahụ ebe Jisọs ji “ụbọchị Noa” tụnyere ‘ụbọchị Nwa nke mmadụ.’ Jisọs dụrụ ọdụ, sị: “N’otu aka ahụ ka ọ ga-adị n’ụbọchị a ga-ekpughe Nwa nke mmadụ.”—Luk 17:26-30.
22. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị karịsịa n’amụma Jisọs dị na Matiu isi nke 24?
22 Ihe a nile na-apụtara anyị ihe pụrụ iche n’ihi na anyị na-ebi n’oge mgbe anyị na-ahụta ihe omume ndị ahụ Jisọs buru n’amụma—agha, ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe, ụkọ nri, na mkpagbu nke ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 24:7-9; Luk 21:10-12) Ha apụtawo ìhè kemgbe agha ahụ gbanwere akụkọ ihe mere eme nke a kpọrọ n’ụzọ dị ịrịba ama Agha Ụwa Mbụ, ọ bụ ezie na ihe ka n’ọtụtụ mmadụ na-ewere ndị a dị ka akụkụ ndị na-emebu eme n’akụkọ ihe mere eme. Otú ọ dị, ezi ndị Kraịst na-aghọta ihe ihe omume ndị a dị mkpa pụtara, dị nnọọ ka ndị mụ anya na-aghọta site n’osisi fig ipu akwụkwọ ọhụrụ na oge okpomọkụ dị nso. Jisọs dụrụ ọdụ, sị: “Otú a unu onwe unu kwa, mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-apụta, maranụ na alaeze Chineke dị nso.”—Luk 21:31.
23. Ole ndị ka okwu Jisọs dị na Matiu isi nke 24 nwere ihe pụrụ iche ọ pụtaara, n’ihi gịnịkwa?
23 Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ihe ka ukwuu n’azịza ya n’Ugwu Olive. Ha bụ ndị ga-ekere òkè n’ọrụ na-azọpụta ndụ nke ikwusa ozi ọma ahụ n’elu ụwa nile tupu ọgwụgwụ ahụ abịa. Ha ga-abụ ndị pụrụ ịhụ “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu . . . ka ọ na-eguzo n’ebe nsọ.” Ha ga-abụ ndị ga-emeghachi omume site ‘n’ịgbapụ’ tupu mkpagbu ukwu ahụ abịa. Ha ga-abụkwa ndị okwu ahụ a gbakwụnyere metụtara karịsịa: “Ọ bụrụkwa na e meghị ụbọchị ahụ ka ha dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta mmadụ ọ bụla: ma n’ihi ndị a họpụtara a ga-eme ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi.” (Matiu 24:9, 14-22) Ma gịnị nnọọ ka okwu ndị ahụ na-akpali echiche pụtara, n’ihi gịnịkwa ka a pụrụ iji kwuo na ha nyere ebe mgbakwasị ụkwụ maka anyị inwe obi ụtọ, obi ike, na ịnụ ọkụ n’obi mụbara amụba ugbu a? Ọmụmụ ihe na-esonụ nke Matiu 24:22 ga-aza ha.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ihe atụ ndị sitere n’aka Josephus: N’Ugwu Saịnaị àmụ̀mà na égbè eluigwe “kwupụtara na Chineke nọ ebe ahụ [pa·rou·siʹa].” Ngosipụta ọrụ ebube n’ụlọikwuu ahụ “gosiri ọnụnọ [pa·rou·siʹa] nke Chineke.” Site n’igosi ohu Elaịsha ụgbọ ịnyịnya ndị ahụ na-agba gburugburu, Chineke “gosipụtaara onye ohu ya ike na ọnụnọ [pa·rou·siʹa] ya.” Mgbe onye ọchịchị Rom bụ́ Petronius nwara ime ka obi jụrụ ndị Juu, Josephus zọọrọ na ‘Chineke egosighị Petronius ọnụnọ [pa·rou·siʹa] ya’ site n’izite mmiri ozuzo. Josephus ejighị pa·rou·siʹa mee ihe nanị maka nrute ma ọ bụ mbịarute nwa mkpirikpi oge. Ọ pụtara ọnụnọ na-aga n’ihu, ọbụna nke a na-adịghị ahụ anya. (Ọpụpụ 20:18-21; 25:22; Levitikọs 16:2; 2 Ndị Eze 6:15-17)—Tụlee Antiquities of the Jews, Akwụkwọ nke 3, isi nke 5, paragraf nke 2 [80]; isi nke 8, paragraf nke 5 [202]; Akwụkwọ nke 9, isi nke 4, paragraf nke 3 [55]; Akwụkwọ nke 18, isi nke 8, paragraf nke 6 [284].
b N’akwụkwọ bụ́ A Critical Lexicon and Concordance to the English and Greek New Testament, E. W. Bullinger mere ka ọ pụta ìhè na pa·rou·siʹa pụtara ‘ịnọ ma ọ bụ ịghọ onye nọ anọ, ya mere, ọnụnọ, mbịarute; ọbịbịa nke na-agụnye echiche nke ibigide site n’ọbịbịa ahụ gaa n’ihu.’
c Otu ihe àmà bụ na o nwere n’ime ya okwu Hibru bụ́ “Aha Ahụ,” nke e depụtara edepụta ma ọ bụ nke e debiiri edebiri, ugboro 19. Prọfesọ Howard na-ede, sị: “Otú e si dee Aha Chineke n’akwụkwọ ndị Kraịst nke onye Juu na-arụ ụka hotara dị ịrịba ama. Ọ bụrụ na nke a bụ nsụgharị Hibru nke akwụkwọ ndị Kraịst nke Grik ma ọ bụ Latin, mmadụ ga-atụ anya ịhụ adonai [Onyenwe anyị] n’ihe odide ahụ, ọ bụghị ihe nnọchiteanya maka aha Chineke ahụ a na-asọ nsọ bụ́ YHWH. . . . Ya ịgbakwụnyeworị aha ahụ a na-asọ nsọ bụ nke a na-apụghị ịkọwa. Ihe àmà ahụ na-atụ aro n’ụzọ siri ike na Shem-Tob natara Matiu nke ya nke nwererị Aha Chineke n’ihe odide ahụ nakwa na ikekwe o chekwara ya kama ịdaba n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye ikpe iwepụ ya mara.” New World Translation of the Holy Scriptures—With References na-eji Matiu (J2) nke Shem-Tob eme ihe dị ka ihe nkwado maka iji aha Chineke eme ihe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịhụ ọdịiche dị n’otú Bible dị iche iche si sụgharịa Matiu 24:3?
◻ Gịnị ka pa·rou·siʹa pụtara, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji na-adọrọ mmasị?
◻ Myirịta dị aṅaa nwere ike ịdị na Matiu 24:3 na Grik nakwa na Hibru?
◻ Isi ihe dị aṅaa banyere oge ka ọ dị anyị mkpa ịmara n’ịghọta Matiu isi nke 24?
[Foto dị na peeji nke 10]
Ugwu Olive, nke chere ihu na Jerusalem