Amụma nke Mezurunụ
MGBE ndị na-eso ụzọ Kraịst Jisọs jụrụ ya maka ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya n’ike Alaeze, Jisọs buru amụma na “ihe na-emebi iwu ga-aba ụba.” (Matiu 24:3, 12) Amụma nke a ọ̀ na-emezu n’ụbọchi anyị?
N’ezie ọ na-emezu! Akwụkwọ ahụ bụ́ The United Nations and Crime Prevention, nke òtù UN bipụtara n’October 1991, na-ekwu, sị: “Mpụ nke dị oké njọ bụ nsogbu siri ike n’ụzọ pụrụ iche nye ihe ka ọtụtụ ná mba dị iche iche nke ụwa. Mpụ ndị a na-eme n’ime ha agabigawo nchịkwa nke e nwere n’ọtụtụ mba dị iche iche n’otu n’otu, mpụ n’etiti mba na mba arịwokwa elu nke ukwuu karịa ebe aka mba nile nke ụwa pụrụ irute ka ọ dịgodi ugbu a. . . . Imempụ nke òtù ndị omekome dị iche iche amụbawo ruo ọ̀tụ̀tụ̀ na-eyi egwu, na-akpata ihe isiike karịsịa n’ihe banyere imerụ mmadụ ahụ, iyi egwu na mmerụ nke ndị ọrụ ọchịchị. E jiriwo iyi ọha egwu gbuo ọtụtụ iri puku nke ndị ọ na-adịghị ihe ha mere. Azụmahịa nrigbu nke ọgwụ ndị na-egbu egbu aghọwo ọdachi zuru ụwa ọnụ. Iji mpụ na-ebibi gburugburu ebe obibi aghaghị ịbanyewo n’ọ̀tụ̀tụ̀ na ókè na-eyi egwu nke na ọ bụrụwo nke a matara dị ka mpụ megide ụwa n’onwe ya.”
Mwakpo: E nwere ịrị elu site na 150 mwakpo n’ime 100,000 ọ bụla nke ndị mmadụ na 1970 ruo n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 400 n’ime 100,000 ọ bụla na 1990.
Izu ohu: E nwere ịrị elu site n’ihe karịtụrụ 1,000 n’ime 100,000 ọ bụla na 1970 ruo 3,500 n’ime 100,000 ọ bụla na 1990.
Igbu ọchụ e leziri anya mee: Ná mba ndị ka na-emepe emepe, e nwere ịrị elu site na 1 ruo 2.5 n’ime 100,000 ọ bụla n’agbata 1975 na 1985. Ná mba ndị mepere anya, ịrị elu n’otu agbata oge ahụ bụ site n’ihe dị ala karịa 3 ruo n’ihe karịrị 3.5.
Imempụ nke metụtara ọgwụ ọjọọ: Akwụkwọ ahụ na-asị: “E jikọọ azụmahịa ndị bụ isi nke ọgwụ ọjọọ ọnụ, ọ pụrụ, n’ụzọ nkịtị, iwe ego na egbe dị ukwuu karịa otú Ọchịchị ụfọdụ nke mba ndị dị nta nwere, ruokwa ugbu a o nwewo ike ịbụ ihe mgbochi n’iwu mmachibido nke mba ndị mepere anya na mgbalị ha nile n’ịhụ na e tinyere iwu ndị ahụ n’ọrụ.”
Ngụkọta nke ọ̀tụ̀tụ̀ imempụ: A na-atụ anya na ọ ga-arị elu okpukpu abụọ, site na 4,000 n’ime 100,000 ọ bụla na 1985 ruo ihe fọrọ nke nta ka o ruo 8,000 n’afọ 2000.
Ịrị elu nke mpụ n’ụwa nile bụ nanị otu akụkụ nke amụma Jisọs nke na-egosi na anyị na-ebi na mgbe “ọgwụgwụ usoro ihe nke a.” (Matiu 24:3, NW) Jisọs sịrị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-apụta, maranụ na alaeze Chineke dị nso.”—Luk 21:31.