Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 11/1 p. 8-13
  • Ntachi Obi nke Na-eweta Mmeri

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ntachi Obi nke Na-eweta Mmeri
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Inwe Ntachi Obi Ruo Ọgwụgwụ
  • Iru Eru nke Dị Mkpa
  • Iji Ntachi Obi nke Na-adịghị Ada Ada Na-echere
  • Ịhụ Chineke n’Anya Na-enyere Anyị Aka Inwe Ntachi Obi
  • Ntachi Obi—Dị Ndị Kraịst Oké Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Chesie Echiche Ike Banyere Onye Ahụ nke Tachiri Obi
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • “Ka Ntachi Obi Rụzuo Ọrụ Ya”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • ‘Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Tachiworo Obi’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 11/1 p. 8-13

Ntachi Obi nke Na-eweta Mmeri

“Ntachi obi dị unu mkpa, ka ọ ga-abụ, mgbe unu meworo ihe Chineke na-achọ, ka unu wee nata nkwa ahụ.”—NDỊ HIBRU 10:36.

1. N’ihi gịnị ka ntachi obi ji bụrụ ihe onye ọ bụla na-ejere Jehova Chineke ozi taa na-aghaghị inwe?

ỤWA nke a dum na-atọgbọ n’aka chi nke na-akpali nnupụisi. Onye ọchịchị ya a na-adịghị ahụ anya, Setan bụ́ Ekwensu, na-eme ka mgbalị ya nile lekwasị anya n’imegide Jehova na ịlụ ọgụ megide mwepụ nke ịbụ ọkaaka eluigwe na ala dum nke Jehova n’ụta site n’Alaeze Mesaịa ahụ. Nke a na-eme ka ọ bụrụ ihe a na-apụghị izere ezere na onye ọ bụla nke raara onwe ya nye Chineke, guzookwa n’akụkụ nke Ya n’ihe iseokwu ahụ banyere ịbụ ọkaaka ga-anọgide na-enweta mmegide site n’ụwa nke a. (Jọn 15:18-20; 1 Jọn 5:19) N’ihi nke a, onye ọ bụla n’ime anyị aghaghị ịkwadebe onwe ya inwe ntachi obi ruo mgbe a ga-emeri ụwa nke a kpam kpam n’Amagedọn. Iji wee soro ná ndị Chineke ndị na-enwe mmeri, ndị na-emeri ụwa site n’okwukwe na iguzosi ike n’ezi ihe ha, anyị aghaghị ijigidesi aka ike ruo ọgwụgwụ ihe nile. (1 Jọn 5:4) Olee ụzọ anyị pụrụ isi mee nke ahụ?

2, 3. Olee ụzọ Jehova Chineke na Jisọs Kraịst si bụrụ ihe nlereanya kasị ukwuu nke inwe ntachi obi?

2 Otu ihe bụ na anyị pụrụ ile anya agbamume site n’ihe nlereanya abụọ pụtara ìhè nke ntachi obi. Olee ndị bụ ndị a? Otu bụ Jisọs Kraịst, onye bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke,” onye jiworo ikwesị ntụkwasị obi nọgide n’ijere Chineke ozi kemgbe e mere ka ọ malite ịdị adị n’ogologo oge a na-amaghị ama n’oge gara aga. Ná nnọgidesi ike ya n’ijere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, Jisọs ghọrọ ihe nlereanya nye ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi ndị e mesịrị mee ka ha malite ịdị adị n’eluigwe na n’elu ala. (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) Otú ọ dị, ihe nlereanya kasị ukwuu nke inwe ntachi obi bụ Jehova Chineke, onye tachiworo obi ruo ogologo oge ná nnupụisi a na-enupụ megide ịbụ ọkaaka eluigwe na ala dum nke ya, onye ga-anọgidekwa na-eme otú ahụ ruo mgbe o mere ihe iji dozie ihe iseokwu ahụ metụtara ịbụ ọkaaka ya kpam kpam.

3 Jehova enwewo ntachi obi n’ụzọ kwesịrị nṅomi n’okwu ndị metụtara ùgwù ya na mmetụta onwe onye ndị kasị sie ike. O jidewo onwe ya n’agbanyeghị oké mkpasu iwe, o jighachiwokwa onwe ya azụ n’ime ihe megide ndị ahụ kwaworo ya emo—gụnyere Setan bụ Ekwensu. Anyị nwere obi ekele maka ntachi obi Chineke nakwa maka obi ebere ya. E wezụga ihe ndị a, anyị agaghị adịworị adị ọbụna ruo nwa mgbe. N’eziokwu, Jehova Chineke egosipụtawo onwe ya dị ka onye dị iche n’ụzọ na-enweghị atụ site ná ntachi obi ya.

4, 5. (a) Olee ụzọ ihe atụ Pọl banyere onye ọkpụite si gosipụta ntachi obi na obi ebere nke Chineke? (b) Olee ụzọ ọ ga-esi bụrụ na obi ebere Chineke efughị na nkịtị?

4 Pọl onyeozi zoro aka n’ebe ma ntachi obi ma obi ebere Chineke dị mgbe ọ na-asị: “Ma ọ bụ ọkpụite, ó nweghị ike n’ebe ụrọ dị, isite n’otu ọkpụkpụ ụrọ ahụ o doziri mee nke a ka ọ bụrụ ihe ga-anara nsọpụrụ, meekwa nke ọzọ ka ọ bụrụ ihe a ga-eme ihe ihere? Gịnịkwa, ma ọ bụrụ na Chineke, ọ bụ ezie na ọ na-achọ igosi iwe ya, na ime ka a mara ike ya, ma o weere ogologo ntachi obi hie nne nagide ihe iwe e doziworo ka ha baa n’ịla n’iyi: ka o wee meekwa ka a mara akụ nke ebube ya n’ahụ ihe dịịrị ebere, nke o buru ụzọ dozie ka ha baa n’ebube, bụ́ anyị onwe anyị, ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị site na nanị ndị Juu, kama sitekwa ná ndị mba ọzọ?”—Ndị Rom 9:21-24.

5 Dị ka okwu ndị a na-egosi, n’ime oge dị ugbu a nke ntachi obi ya, Jehova na-aga n’ihu ná nzube ya dị ebube, na-egosikwa ite ụrọ ụfọdụ bụ ụmụ mmadụ ebere. Ọ na-akwadebe ite ụrọ ndị a maka ebube ebighị ebi, wee si otú a na-emeri ajọ nzube nile nke onye ukwu ahụ na-emegide ya, Setan bụ Ekwensu, na ndị nile ha na Setan na-arụkọ ọrụ. Ọ bụghị ihe nile a kpọrọ mmadụ gosiworo onwe ha ịbụ ihe iwe, ndị kwesịrị mbibi. Nke ahụ na-agba àmà dị mma nye ntachi obi nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile jiworo ndidi tachie. Obi ebere ya agaghị abụ ihe efu. Ọ ga-arụputa (1) ezinụlọ Alaeze dị ebube n’eluigwe n’okpuru Ọkpara Jehova ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jisọs Kraịst, na (2) agbụrụ mmadụ nke bịaghachiworo n’ọnọdụ ha, ndị e meworo ka ha zuo okè n’ime paradaịs elu ala, nke ha nile bụ ndị ga-eketa ndụ ebighị ebi.

Inwe Ntachi Obi Ruo Ọgwụgwụ

6. (a) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-apụghị iji zere ule nke ntachi obi? (b) Gịnị ka okwu Grik ahụ dịịrị “ntachi obi” na-egosikarị?

6 N’inwe olileanya dị ebube otú a nke na-eche anyị n’ihu, okwu agbamume Jisọs kwesịrị ịnọgide na-ada ụda ná ntị anyị, bụ́: “Ma onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” (Matiu 24:13) Ọ bụ ihe dị mkpa ịmalite nke ọma n’ụzọ nke ịbụ onye na-eso ụzo Kraịst. Ma ihe na-adị mkpa n’ikpeazụ bụ ụzọ anyị si nwee ntachi obi, ụzọ anyị si gbaruo ọsọ ahụ n’isi. Pọl onyeozi mesiri nke a ike mgbe ọ sịrị: “Ntachi obi dị unu mkpa, ka ọ ga-abụ, mgbe unu meworo ihe Chineke na-achọ, ka unu wee nata nkwa ahụ.” (Ndị Hibru 10:36) Okwu Grik nke a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ntachi obi” bụ hy·po·mo·neʹ. Nke a na-egosikarị ntachi obi nke e ji obi ike, nguzosi ike, ma ọ bụ ndidi nwee, nke na-adịghị akwụsị inwe olileanya n’agbanyeghị ihe mgbochi, mkpagbu, ule, na ọnwụnwa. Ọ bụrụ na anyị nwere olileanya imesị nweta nzọpụta, anyị aghaghị ido onwe anyị n’okpuru ule nke ntachi obi dị ka otu akụkụ nke nkwadebe ndị dị mkpa maka nzọpụta ahụ.

7. Nghọgbu onwe onye dị aṅaa ka anyị na-aghaghị izere, ọ̀ bụkwa ihe nlereanya ònye ga-enyere anyị aka inwe ntachi obi?

7 Anyị ekwesịghị ịghọgbu onwe anyị site n’echiche ahụ na-amasị onwe onye nke bụ na anyị pụrụ ịgabiga ule ahụ ngwa ngwa. Ka e wee dozie okwu ndị ahụ metụtara ịbụ ọkaaka eluigwe na ala dum na nke nguzosi ike n’ezi ihe nke mmadụ n’ụzọ na-adịgide adịgide, Jehova ewepụghị onwe ya n’ebe ihe ọ bụla na-agaghị emetụta ya. O nwewo ntachi obi n’ihe ndị na-adịghị mma ọ bụ ezie na ọ pụrụ iwepụchasịworịị ha n’otu ntabi anya. Jisọs Kraịst bụkwa ihe nlereanya nke inwe ntachi obi. (1 Pita 2:21; tụlee Ndị Rom 15:3-5.) Ebe anyị nwere ezi ihe nlereanya ndị a n’ihu anyị, ọ bụ ihe e ji n’aka na anyị onwe anyị ga-adịkwa njikere inwe ntachi obi ruo ọgwụgwụ.—Ndị Hibru 12:2.

Iru Eru nke Dị Mkpa

8. Àgwà dị aṅaa nke dị anyị nile mkpa ka Pọl onyeozi gosipụtara?

8 Ọ dịbeghị ohu Chineke ọ bụla, ọbụna malite n’ogologo oge gara aga, nke a tọhapụworo site ná mkpa nke ịnwapụta nguzosi ike ya n’ezi ihe site n’inwe ntachi obi. Ọ dịrị mkpa ka ọtụtụ ndị a ma ama n’akụkọ ihe mere eme nke Bible ndị nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, ndị rukwara eru inweta ndụ ebighị ebi n’eluigwe nwapụta nguzosi ike ha. Dị ka ihe atụ, onye ahụ bụbu onye Farisii, Sọl onye Tasọs, gwara ndị Kọrint, sị: “Ọ dịghị ụzọ ọ bụla m na-erughị ndị kachasị elu n’etiti ndị ozi, a sị na ọ bụ ezie na abụghị m ihe ọ bụla. E weere ihe ịrịba ama dị iche iche na ọrụ ebube na ọrụ dị ike dị iche iche rụpụta ihe ịrịba ama nile nke onyeozi n’etiti unu ezie na ntachi obi nile.” (2 Ndị Kọrint 12:11, 12) N’agbanyeghị ibu arọ nile nke ọrụ ahụ, Pọl ji ije ozi ya kpọrọ ihe dị mkpa nke ukwuu nke na ọ tachiri obi nke ukwuu, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi gbalịa ịghara iwetara ya ịkwa emo ọ bụla.—2 Ndị Kọrint 6:3, 4, 9.

9. (a) Olee ụzọ ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ siworo gosi ntachi obi, gịnị siwokwara n’ime ya pụta? (b) Gịnị na-eje ozi dị ka ihe mkpali ka anyị wee nọgide n’ikwesị ntụkwasị obi n’ijere Chineke ozi?

9 N’oge ndị a, ndị Kraịst e tere mmanụ ndị na-ejere Chineke ozi tupu agha ụwa mbụ maara na 1914 ga-aka akara ọgwụgwụ nke Oge Ndị Jentaịl, ọtụtụ n’ime ha tụkwara anya ịnata ụgwọ ọrụ ha nke eluigwe n’afọ ahụ kwesịrị ncheta. Ma nke a emeghị. Dị ka ihe ndị mere eme na-egosi ugbu a, a tụkwasịịrị ha ọtụtụ iri afọ. N’oge mgbatịwanye nke a ha na-atụghị anya ya nke ndụ ha n’elu ala, ha gabigara nnụcha n’aka Jehova Chineke. (Zekaraịa 13:9; Malakaị 3:2, 3) Ịnọgide na-enwe ntachi obi rụpụtaara ha ezi ihe. Dị ka ndị ohu Jehova, ha ṅụrịrị ọṅụ ịbụ ndị a kpọkwasịrị aha ya. (Aịsaịa 43:10-12; Ọrụ 15:14) Taa, n’ịbụ ndị e meworo ka ha dị ndụ gabiga agha ụwa abụọ nakwa ọtụtụ mburịta agha ndị dị nta karị, ha na-enwe obi ụtọ dị ukwuu n’ịbụ ndị oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ nke na-amụbawanye amụbawanye nyeere aka n’ịgbasa ozi ọma ahụ, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha karịrị nde mmadụ anọ ugbu a. Paradaịs ime mmụọ nke ha na-enwe ọṅụ na ya agbasawo gazuo elu ala dum, ọbụna ruo n’agwaetiti ndị kasị dịrị anya nke oké osimiri. Mmeso ọma nke a, nke anyị na-enwewanye obi ụtọ banyere ya ka anyị na-adịkwu ndụ, anọwo dị ka ihe mkpali iji nọgide n’ikwesị ntụkwasị obi n’ijere Chineke ozi ruo mgbe e mezuru uche na nzube Jehova n’ụzọ zuru ezu.

10. Ka a ghara inwe ịda mbà ọ bụla n’etiti anyị, gịnị ka ọ dị mkpa ịdị na-enweta mgbe mgbe?

10 Ebe ọ bụ na ụgwọ ọrụ anyị na-adabere n’otú anyị si guzosie ike, ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-enweta agbamume n’okwu nke a dị oké mkpa. (1 Ndị Kọrint 15:58; Ndị Kọlọsi 1:23) Ka e wee ghara inwe ịda mbà ọ bụla n’etiti ndị Jehova, a ghaghị ịnọgide na-agba anyị ume mgbe nile ijigidesi eziokwu ahụ aka ike, jigidesiekwa ike ihe ùgwù ahụ dị oké ọnụ ahịa nke ịgbasa eziokwu ahụ, dị ka a gbara ọgbakọ ndị ahụ e guzobere ọhụrụ ume n’ime narị afọ mbụ site ná nletaghachi nke Pọl na Banabas letaghachiri ha. (Ọrụ 14:21, 22) Ka anyị kpebisie ike na, dị ka Jọn onyeozi si kwuo ya, eziokwu ahụ ga-anọgide n’ime anyị, ‘dịnyekwara anyị ruo mgbe ebighị ebi.’—2 Jọn 2.

Iji Ntachi Obi nke Na-adịghị Ada Ada Na-echere

11. Gịnị ka o yiri ka ọ bụ ụkpụrụ Chineke nye ndị ohu ya, oleekwa ụzọ e si mee ihe atụ nke a n’okwu banyere Josef?

11 Ọ na-ewe oge ka ule ahụ nke metụtara anyị wee zuo okè. (Jemes 1:2-4) Chere! Chere! Chere! yiri ka ọ̀ nọwo na-abụ ụkpụrụ Chineke n’ebe ndị ohu ya nke oge ochie nọ mgbe e lere ha ule n’ihe banyere mkpebisi ike ha ịnọgide n’okwukwe. Ma nchere ahụ na-emesịa bụrụ ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ nye ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Dị ka ihe atụ, ọ dịrị mkpa ka Josef chere ruo afọ 13 dị ka ohu na onye mkpọrọ, ma ahụmahụ ahụ nụchara ọdịdị mmadụ ya.—Abụ Ọma 105:17-19.

12, 13. (a) Olee ụzọ Abraham si bụrụ ihe nlereanya nke iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi? (b) Olee ụzọ e si debe okwukwe na ntachi obi nke Abraham dị ka ihe nlereanya nye anyị?

12 Abraham adịworị 75 afọ mgbe Chineke kpọpụtara ya site n’obodo Ua nke ndị Kaldea ka o jee n’Ala Nkwa ahụ. Ọ gbara ihe dị ka 125 afọ mgbe ọ natara nkwado e ji ọṅụṅụ iyi mee nke nkwa Chineke—bụ́ nke mere ozugbo Abraham gosipụtasịrị otú okwukwe ya siruru n’ike site n’iru n’ókè nke iji nwa ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Aịsak chụọ àjà, na-akwụsị nanị mgbe mmụọ ozi Jehova jighachiri aka ya azụ wee gbochie ọchụchụ àjà ahụ. (Jenesis 22:1-18) Iri afọ ise bụ ogologo oge nye Abraham ichere dị ka onye ọbịa n’ala na-abụghị nke ya, ma ọ nọgidere ruo 50 afọ ọzọ ruo mgbe ọ nwụrụ mgbe ọ dị 175 afọ. N’oge ahụ dum, Abraham bụ onyeàmà na onye amụma kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova Chineke.—Abụ Ọma 105:9-15.

13 A na-edebe okwukwe na ntachi obi nke Abraham dị ka ihe nlereanya nye ndị ohu Chineke nile ndị chọrọ ịnata ngọzi ndị ahụ e kwere ná nkwa site na Jisọs Kraịst, bụ́ Mkpụrụ nke Abraham. (Ndị Hibru 11:8-10, 17-19) N’ihe banyere ya, anyị na-agụ ná Ndị Hibru 6:11-15, sị: “Ọ na-agụ anyị agụụ ka unu nile n’otu n’otu wee na-egosi otu ịnụ ọkụ n’obi ahụ ka unu wee nwezuo olileanya anyị ruo ọgwụgwụ ihe nile: ka unu wee ghara ịghọ ndị umengwụ, kama ka unu wee bụrụ ndị na-eṅomi ndị ahụ ndị ji okwukwe na ogologo ntachi obi na-eketa nkwa ahụ. N’ihi na mgbe Chineke kwere Abraham nkwa, ebe ọ na-enweghị onye ọ bụla ka ya ukwuu iji ṅụọ iyi, o ji onwe ya ṅụọ iyi, sị, Mee elu mee ala n’ịgọzi m ga-agọzi gị, n’ime ka a baa ụba m ga-eme ka ị baa ụba. Otú a o wee nwee ogologo ntachi obi, wee natakwa nkwa ahụ.”

14. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iche na ule nke ntachi obi bụ ihe na-adịghị agwụ agwụ, na ụgwọ ọrụ ya bụkwa ihe na-apụghị iru aka?

14 Ka ọ dị ugbu a, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ ahụwo ka 77 afọ gabigara kemgbe ọgwụgwụ Oge Ndị Jentaịl na 1914, mgbe ụfọdụ n’ime ha tụrụ anya na a ga-ebugo ezi ọgbakọ ndị Kraịst n’ebube eluigwe. Anyị amaghị ogologo oge ihe ahụ fọdụrụ na-aghaghị icheru. N’ihi ya, ànyị kwesịrị ịla azụ wee na-eche na nchere ahụ bụ ihe na-adịghị agwụ agwụ, na nkwụghachi ụgwọ ahụ bụkwa ihe mgbaru ọsọ a na-apụghị iru eru? Ee e! Nke ahụ agaghị ewepụ ịbụ ọkaaka Chineke n’ụta ma ọ bụ wetara aha ya nsọpụrụ. Ọ gaghị abụ onye na-eme ihe n’ikpe ziri ezi n’anya ụwa mgbe ọ ga na-enye anyị mmeri ahụ nakwa ihe mgbata n’ọsọ ahụ si na ya pụta, bụ́ ndụ ebighị ebi. N’agbanyeghị ogologo oge o were, ihe ahụ fọdụrụ, ha na ndị ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi ndị yiri atụrụ na-eso ha, ekpebisiwo ike ichere ka Jehova mee ihe n’oge nke aka ya. N’igosi nnọgidesi ike dị otú ahụ nke kwesịrị nṅomi, ha na-agbaso ihe nlereanya nke Abraham.—Ndị Rom 8:23-25.

15. (a) Gịnị bụ okwu nduzi anyị, ọ̀ bụkwa n’ahụmahụ dịgasị aṅaa ka Chineke kwadoworo anyị n’ụzọ na-eme ka anyị nwee mmeri? (b) Agbamume dị aṅaa nke Pọl ka bụ ihe kwesịrị ekwesị maka oge anyị a?

15 Ya mere, okwu nduzi e nwere ka bụkwa ntachi obi na-adịghị ada ada n’ime uche Chineke. (Ndị Rom 2:6, 7) N’oge gara aga, ọ kwadowo anyị gabiga ihe isi ike ndị dị oké njọ, gụnyere ịtụ mkpọrọ na ịnọ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche, o mewokwa ka anyị nwee mmeri, bụ́ nke na-ewetara aha na nzube ya otuto.a N’ime oge fọdụrụ ka ule anyị wee zuo okè, Jehova ga-anọgide na-eme otu ihe ahụ. Agbamume Pọl ka bụkwa ihe kwesịrị ekwesị maka ụbọchị anyị a: “N’ihi na iji ịnọgidesi ike na-enwe ndidi na ntachi obi dị unu mkpa, ka unu wee nwee ike mezuo, rụzuokwa ihe bụ uche Chineke, wee si otú a nata, burukwa ihe e kweworo ná nkwa laa, nwetakwa ọṅụ na ya n’ụzọ zuru ezu.”—Ndị Hibru 10:36, The Amplified Bible; Ndị Rom 8:37.

16. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị ile nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova anya n’ụzọ a kpaara ókè?

16 Ya mere, ruo ogologo oge Jehova nwere ọrụ anyị ga na-arụ n’ime ụwa ajọ omume nke a, n’ịgbaso ihe nlereanya Jisọs, anyị chọrọ ịnọgide n’ọrụ ahụ ruo mgbe a rụsịrị ya. (Jọn 17:4) Nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova abụghị ná nghọta nke bụ na anyị ga-ejere ya ozi nanị ruo nwa mgbe nta, mgbe ahụ, Amagedọn ga-abịa. Nrara anyị raara onwe anyị nye ya bụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọrụ Chineke nwere anyị ga-arụrụ ya agaghị agwụsị n’agha Amagedọn. Otú ọ dị, ọ bụ nanị mgbe anyị rụzuworo ọrụ ahụ a gaje ịrụ tupu Amagedọn ka anỵi gaje ịhụ ihe ndị dị ebube ga-abịa mgbe oké agha ahụ gasịrị. Mgbe ahụ, tụkwasị n’ihe ùgwù obi ụtọ nke ịnọgide na-arụ ọrụ ya, a ga-eji ngọzi ndị ahụ o kwere ná nkwa, bụ́ ndị a nọworo na-ele anya ha eri ogologo oge kwụọ anyị ụgwọ ọrụ.—Ndị Rom 8:32.

Ịhụ Chineke n’Anya Na-enyere Anyị Aka Inwe Ntachi Obi

17, 18. (a) N’oge ihe isi ike, gịnị ga-enyere anyị aka inwe ntachi obi iji nweta nnwapụta nke Chineke? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka inwe mmeri, gịnịkwa ka anyị na-adịghị ekwu banyere oge fọdụrụnụ?

17 Ma eleghị anya, mgbe oge ihe isi ike bịara, anyị pụrụ ịjụ, sị: ‘Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe ntachi obi?’ Gịnị bụ azịza ya? Site n’ịhụ Chineke n’anya site n’obi, uche, mkpụrụ obi, na ike anyị dum. “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi, o nwekwara obi ọma; ịhụnanya adịghị ekwo ekworo; ịhụnanya adịghị anya isi, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ na-anagide ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-ele anya ihe nile, na-enwe ntachi obi n’ihe nile, ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:4, 7, 8) Ọ gwụlakwa ma anyị nwere ntachi obi site n’ịhụnanya anyị nwere maka Chineke, ntachi obi anyị abaghị uru ọ bụla. Ọ bụrụ na anyị anagide ibu arọ dị iche iche n’ihi nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova, mgbe ahụ, ntachi obi anyị na-enwe mmetụta nke ime ka ịhụnanya anyị hụrụ ya dịwanye omimi. Ịhụnanya maka Chineke, bụ́ Nna ya, mere ka Jisọs nwee ike inwe ntachi obi. (Jọn 14:30, 31; Ndị Hibru 12:2) Ọ bụrụ na ihe na-akpali anyị n’ezie bụ ịhụnanya anyị nwere maka Chineke, bụ́ Nna anyị, gịnị bụ ihe ahụ nke anyị na-apụghị inwe ntachi obi na ya?

18 Ọ bụ ịhụnanya na-adịghị ada ada anyị nwere n’ebe Jehova Chineke nọ meworo ka anyị nwee ike ịnọgide na-emeri ụwa n’ime oge ule nke a kasị dịrị egwu. Jehova, site na Jisọs Kraịst, ga-anọgidekwa na-enyere anyị aka ebe ọ dị anyị mkpa n’agbanyeghị ogologo oge a ga-ekwe ka usoro ihe dị iche iche nke ụwa ochie nke a nọgide na-adị. (1 Pita 5:10) Otú ọ dị, anyị adịghị ebu amụma ọ bụla banyere otú oge fọdụrụnụ hà, anyị adịghị akakwa ụbọchị ọ bụla akara. Anyị na-ahapụ nke ahụ n’aka Onye Ukwu ahụ Na-edebe Oge, bụ́ Jehova Chineke.—Abụ Ọma 31:15.

19, 20. (a) Olee ụzọ anyị kwesịrị isi lee ụbọchị ọ bụla nke na-agafenụ anya, bụ́ nke anyị nwere ntachi obi na ya? (b) Ihe nzuzu dị aṅaa ka anyị kwesịrị izere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

19 Otú ọ dị, ọgbọ ahụ nke e buru n’amụma na ọ ga-ahụ “ọgwụgwụ usoro ihe nke a” agamiwo n’afọ ndụ ugbu a. (Matiu 24:3, 32-35, NW) Ya mere, ka anyị ghara ichefu mgbe ọ bụla na ụbọchị ọ bụla na-agabiganụ nke anyị na-enwe ntachi obi na ya na-ewepụ otu ụbọchị n’oge Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya nwere imetọ eluigwe na ala site n’ịdị adị ha, meekwa ka anyị bịakwuo nso otu ụbọchị n’oge ahu mgbe Jehova na-agaghị anagidekwa ịdị adị nke “ihe iwe e doziworo ka ha baa n’ịla n’iyi.” (Ndị Rom 9:22) N’oge na-adịghị anya, mgbe ogologo ntachi obi nke Jehova gwụsịrị, ọ ga-awụpụ oké iwe ya n’ahụ ndị ikom na ndị inyom ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Otú a, ọ ga-egosipụta na ụzọ ha gbasoworo amasịghị ya, ọ bụ ezie na o kwere ka ha nọgide ruo ogologo oge a dum.

20 Ọ ga-abụ nnọọ ihe nzuzu anyị ịkwụsị ime mgbalị anyị ji ịhụnanya na-eme iji nweta ihe mgbata n’ọsọ ahụ dị ebube nke a na-eche anyị n’ihu site n’aka Jisọs Kraịst. Kama nke ahụ, anyị ekpebisiwo ike ịnọgide na-aga n’ihu n’ikwesị ntụkwasi obi dị ka Ndịàmà nke Jehova n’oge nke a dị oké mkpa mgbe Jehova dị njikere iwepụ onwe ya n’ụta dị ka Ọkaaka Eluigwe na Ala dum.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Dị ka ihe atụ, Christine Elizabeth King dere, sị: “Ọ bụ nanị n’ebe Ndịàmà ahụ nọ ka ọchịchị [ndị Nazi] na-enweghị ihe ịga nke ọma, n’ihi na ọ bụ ezie na e gbuwo ọtụtụ puku n’ime ha, ọrụ ha gara n’ihu, na May 1945, òtù Ndịàmà Jehova ahụ ka dịkwa adị ebe òtù National Socialism na-adịghị. Ọnụ ọgụgụ Ndịàmà ahụ amụbawo, ha emebibeghịkwa okwukwe ha. E nwewo ndị òtù ahụ e gburu n’ihi okwukwe ha, ha enwewokwa mmeri n’otu obubu agha ọzọ n’ime agha Jehova Chineke.”—The Nazi State and the New Religions: Five Case Studies in Non-Conformity, peji 193.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?

◻ N’ihi gịnị ka anyị na-apụghị izere ntinye a ga-etinye ntachi obi anyị n’ule?

◻ Nghọgbu onwe onye dị aṅaa ka anyị kwesịrị izere?

◻ Iji zere ịda mbà ọ bụla n’etiti anyị, gịnị dị mkpa?

◻ Gịnị bụ okwu nduzi anyị?

◻ N’oge ihe isi ike, gịnị ga-enyere anyị aka inwe ntachi obi?

[Foto dị na peeji nke 11]

Ndị Chineke, dị ka Ndịàmà ndị a nọ na Port of Spain, Trinidad, adịwo njikere mgbe nile ichere Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya