‘Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Tachiworo Obi’
1. Kemgbe 1914, ọnọdụ dị aṅaa dị n’ụwa mezuworo Matiu 24:3-8, oleekwa ihe ndị a sị na òtù League of Nations na United Nations ga-emezu, bụ́ ndị daworonụ?
N’AKWỤKWỌ ya bụ The Present Age, Robert Nisbet na-ekwu banyere “Agha Iri Afọ Asaa na Ise ahụ nke nọworo na-aga n’ihu, nke a na-akwụsịtụbeghị, kemgbe 1914.” Ee, “agha dị iche iche na akụkọ agha dị iche iche,” gụnyere agha ụwa dị iche iche—nke ahụ bụ ihe Jisọs Kraịst buru n’amụma maka oge a nke ọgwụgwụ. (Matiu 24:3-8) E guzobere òtù League of Nations na 1920 “iji gbochie agha ruo mgbe ebighị ebi.” Lee nnọọ ka o si daa ajọ ọdịda! E guzobere òtù United Nations na 1945 “iji chebe ọgbọ ndị na-abịa n’ihu site n’ihe otiti nke agha.” Ma akwụkwọ Max Harrelson bụ́ Fires All Around the Horizon na-akọ, sị: “O siri nnọọ ike ịhụ otu ụbọchị kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ mgbe a na-anọghị na-alụ agha n’otu ebe.”
2. Gịnị ka ụfọdụ ndị na-ajụ banyere ọnọdụ ụwa dị iche iche, ma olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịdị na-ajụ?
2 Iyi ọha egwu na ime ihe ike, omume rụrụ arụ na ịda ogbenye, ọgwụ ọjọọ na ajọ ọrịa na-efe efe—ihe ndị a nile na-eme ka ọnọdụ dịkwuo njọ. Ụfọdụ ndị pụrụ ịjụ, sị: ‘Olee otú ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ isi nọgide na-anagide ọnọdụ ndị na-enye nsogbu otú a?’ Ma nke ka mkpa, anyị kwesịrị ịjụ, sị: ‘Olee otú Chineke si na-anagide mmetọ a na-emetọ ihe okike ya dị n’elu ala? Ruo ogologo oge hà aṅaa ka ọ ga-agbachi nkịtị ka ndị ajọ omume na-ebibi ụwa, na-ekpokwasịkwa aha ọma ya oké nkọcha?’
3. (a) Ajụjụ dị aṅaa ka Aịsaịa onye amụma jụrụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Azịza dị aṅaa ka Jehova nyere, gịnịkwa ka nke a na-egosi banyere ụbọchị anyị?
3 Aịsaịa onye amụma welitekwara ajụjụ yiri nke a. E kenyere ya ọrụ ikwusara ndị mba nke aka ya ozi sitere n’aka Jehova. Ma e buru ụzọ dọọ ya aka ná ntị na ha agaghị aṅa ma ya onwe ya ma Chineke ahụ nke zitere ya ntị. Ya mere, Aịsaịa jụrụ, sị: “Ruo ole mgbe, [Jehova, NW]?” Ee, ruo ogologo oge hà aṅaa ka Aịsaịa ga-anọgide na-ekwusara ndị isi ike ndị a ozi ọma, ọ̀ bụkwa ruo ogologo oge hà aṅaa ka Jehova ga-anọ na-anagide ọjụjụ ha ji mkparị jụ ịṅa ntị n’ozi ya? Jehova zaghachiri, sị: “Ruo mgbe obodo nile tọgbọọrọ n’efu n’enweghị onye obibi, ụlọ nile kwa, n’enweghị mmadụ; ruo mgbe e meworo ka ala ndị ahụ tọgbọrọ n’efu, ọbụna ebe tọgbọrọ n’efu.” (Aịsaịa 6:8-11) Otú ahụkwa taa, Chineke na-enwe ntachi obi n’ụdị nkwutọ ndị dị otú ahụ ruo mgbe oge ọ kara aka ruru maka imezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ụwa nke onye bụ isi nke na-eme ihe ọjọọ n’ime ya bụworo Krisendọm nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi.
4. Gịnị bụ ihe si ná ntachi obi nke Job pụta, mmesi obi ike dị aṅaa ka nke a na-enyekwa anyị taa?
4 Ọ dịwo anya Jehova malitere inwe ntachi obi n’ịkwa emo nile nke Setan. Ihe dị ka 3,600 afọ gara aga, Job onye kwesịrị ntụkwasị obi nwekwara ntachi obi, na-emeri ihe ịma aka Setan nke bụ na ọ pụghị ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi n’okpuru ule. Lee ka nke a si wetara obi Jehova ọṅụ! (Job 2:6-10; 27:5; Ilu 25:11) Dị ka onye ahụ otu nne ji ya na Jisọs bụ Jemes mesịrị kwuo: “Lee, anyị na-akpọ ha ndị [obi ụtọ, NW] dịịrị, bụ́ ndị tachiri obi: unu nụrụ ihe banyere ntachi obi nke Job, hụkwa ihe [Jehova, NW] zubere, na [Jehova, NW] bụ onye nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.” N’otu aka ahụ, ndị so Jehova na-enwe ntachi obi taa jikwa n’aka inweta obi ụtọ site na ya.—Jemes 5:11.
5. Olee ụzọ Jisọs si gosi na a ga-achọ ntachi obi n’aka ndị Chineke taa, ọ̀ bụkwa mgbe ha nọ na-arụ ọrụ dị aṅaa ka o ga-adị ha mkpa inwe ntachi obi?
5 Jisọs gosiri n’ụzọ pụtara ìhè na a ga-achọ ntachi obi n’aka ndị Chineke n’oge anyị a. N’ibu amụma banyere ihe ịrịba ama nke ‘ọgwụgwụ usoro ihe dị ugbu a,’ ọ sịrị: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” Ọ̀ bụ inwe ntachi obi mgbe a nọ na-eme gịnị? Ihe Jisọs kwuru mgbe nke ahụ gasịrị na-aza, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” (Matiu 24:3, 13, 14) Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka ‘ọgwụgwụ ihe nile ga-eru.’—Leekwa Mak 13:10, 13; Luk 21:17-19.
Ihe Mere Jehova Ji Na-atachi Obi
6. N’ihi gịnị ka Jehova ji bụrụ ihe nlereanya pụtara ìhè nke inwe ntachi obi, gịnị bụkwa otu ihe mere o jiworo nwee ntachi obi otú a?
6 Pọl onyeozi kọwara na “Chineke, ọ bụ ezie na ọ na-achọ igosi iwe ya, na ime ka a mara ike ya, ma o weere ogologo ntachi obi hie nne na-anagide ihe iwe e doziworo ka ha baa n’ịla n’iyi.” (Ndị Rom 9:22) N’ihi gịnị ka Jehova jiworo nwee ntachi obi ná nnọgide nke ndị mmebi iwu, bụ́ ihe ndị a dịịrị ịla n’ịyị? Otu ihe bụ nke a: iji gosi na ọchịchị mmadụ, n’adabereghị n’Onye Okike mmadụ, aghaghị ịda ada. (Jeremaịa 10:23) N’oge na-adịghị anya, a gaje iwepụ ịbụ ịchịisi Chineke n’ụta mgbe ọ na-egosipụta na ọ bụ nanị ya pụrụ iweta udo, inwe nkwekọrịta, na obi ụtọ nye ezinụlọ ihe a kpọrọ mmadụ, site n’ọchịchị Alaeze Jisọs.—Abụ Ọma 37:9-11; 45:1, 6, 7.
7. Olee ihe ọzọ mere Jehova jiworo nwee ntachi obi, abamuru dịkwa aṅaa ka nke a wetawooro ọtụtụ nde mmadụ kemgbe afọ ndị 1930?
7 N’ịga n’ihu, Jehova enwewo ntachi obi “ka o wee meekwa ka a mara akụ nke ebube ya n’ahụ ihe dịịrị ebere.” (Ndị Rom 9:23) Ihe ndị a dịịrị ebere bụ ndị e tere mmanụ na-anọgide n’ikwesị ntụkwasị obi, bụ́ ndị “a gbatara n’etiti mmadụ” iso Kraịst Jisọs chịa achị n’Alaeze eluigwe ya. Ịka 144,000 ahụ akara anọgidewo na-aga n’ihu eri mgbe oge ndị ozi. Ọ na-abịaru ná njedebe ya ugbu a. (Mkpughe 7:3; 14:1, 4) Leekwa! Kemgbe afọ ndị 1930, nnọgide Jehova nọgidere na-enwe ntachi obi emewo ka o kwe omume ịchịkọta ọtụtụ nde ndị ọzọ, bụ́ “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla,” bụ́ ndị na-enwe ọṅụ n’olileanya nke ịdị ndụ gabiga mkpagbu ikpeazụ ahụ iji wee keta ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs. (Mkpughe 7:4, 9, 10, 13-17) Ị̀ bụ otu n’ime oké ìgwè mmadụ ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, obi ọ́ dịghị gị ụtọ na Jehova enwewo ntachi obi ná ndịgide nke ihe iwe ruo ugbu a? Otú ọ dị, ị ghaghị ịnọgide na-enwe ntachi obi, dị ka Jehova nọgideworo na-enwe ntachi obi.
A Kwụghachiri Ntachi Obi Ụgwọ Ọrụ
8. N’ihi gịnị ka inwe ntachi obi ji dị anyị nile mkpa, ihe atụ dị aṅaa nke inwe ntachi obi ka anyị kwesịkwara ilegide anya?
8 Inwe ntachi obi dị anyị nile mkpa ka anyị wee nata mmezu nke nkwa ndị ahụ. Mgbe e kwupụtasịrị eziokwu nke a bụ isi ná Ndị Hibru 10:36, Pọl onyeozi kọwara nke ọma ezi okwukwe na ntachi obi nke “oké ìgwè ndịàmà” nke oge ochie. Mgbe ahụ, ọ dụrụ anyị ọdụ ka anyị “werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu, na-elegide Jisọs anya, bụ́ Onyendú na Onye Mmezu nke okwukwe anyị, . . . n’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya,” Jisọs nọgidere n’iji obi ya nile jee ozi, n’adịghị mgbe o wepụrụ anya ya n’ụgwọ ọrụ ahụ. Lee ka ihe nlereanya ya si ewusi anyị ike inwekwa ntachi obi!—Ndị Hibru 12:1, 2.
9. Gịnị ka ihe nlereanya ndị nke oge a nke inwe ntachi obi rụpụtaworo?
9 E nwekwara ọtụtụ ihe atụ ndị nke oge a nke inwe ntachi obi. Gị onwe gị pụrụ ịma, ma ọ bụ na ị mawo n’oge gara aga, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị pụtaworo ìhè ná ntachi obi ha. Lee ka ikwesị ntụkwasị obi ha siworo kpalie anyị! N’afọ ọ bụla, ka Ndịàmà Jehova na-enye Watch Tower Society akụkọ ọrụ ha zuru ụwa ọnụ, ha na-enwetakwa ihe ndekọ ndị ọzọ nke inwe ntachi obi na ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi. Chaatị nke dị na peji anọ na-esonụ na-achịkọta oké ọrụ a rụzuru n’ime 1989 ka Ndịàmà ndị a nọworo ‘na-enyezu ntachi obi n’okwukwe ha.’—2 Pita 1:5, 6.
Afọ Kasị Dịrị Anyị Mma
10. (a) Ala na ìgwè agwaetiti ole keere òkè n’ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’afọ 1989, ọ̀ bụkwa mmadụ ole keere òkè n’ọrụ a? (b) Ndị ọsụ ụzọ ole nyere akụkọ ozi n’ọnwa ahụ e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu, gịnị bụkwa ngụkọta awa e tinyere n’ozi ubi?
10 Dị ka chaatị nke anyị gafesịrị ugbu a na-egosi, 212 ala na ìgwè agwaetiti dị iche iche keere òkè n’ikwusa Alaeze Jehova nke na-abịanụ. Ezi onye na-agụ Ụlọ Nche, ì nwere ihe ùgwù nke ịbụ otu n’ime 3,787,188 mmadụ ndị keere òkè n’oké ọrụ nke a? Ị̀ bu otu n’ime 808,184 mmadụ ndị nyere akụkọ ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ n’ọnwa ahụ e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu maka ozi ahụ? N’agbanyeghị ihe ị tụnyere ná ngụkọta ụwa dum maka 1989 nke bụ́ 853,426,538 awa e tinyere n’ozi ubi, i nwere ihe mere ị ga-eji ṅụrịa ọṅụ.—Abụ Ọma 104:33, 34; Ndị Filipaị 4:4.
11. (a) Gịnị bụ ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta na March 22 afọ gara aga nke bụ́ ihe na-enye ọṅụ, ọ̀ bukwa n’ihi gịnị? (b) Mmadụ ole ka e mere baptism, oleekwa ala ndị pụtara ìhè na nke a?
11 Ṅụrịakwa ọṅụ ná ngụkọta ọma ahụ nke 9,479,064 ndị bịaranụ, na March 22 afọ gara aga n’ememe ahụ zuru ụwa ọnụ nke Ncheta Ọnwụ Jisọs! Nke a gosiri na a pụrụ inwekwu 5,691,876 ndị nkwusa Alaeze ndị ọzọ, a sị nnọọ na e nwere ike iji ịhụnanya duru ndị a yiri atụrụ, ndị nwere mmasị bata n’ime ogige atụrụ ahụ, ka ha wee na-ekere òkè mgbe nile n’ijere Jehova ozi. Ànyị pụrụ inyere ha aka na nke a? (Jọn 10:16; Mkpughe 7:9, 15) Ọtụtụ ndị amaliteworị ịzaghachi, dị ka e gosiri site ná ngụkọta nke 263,855 Ndịàmà ọhụrụ e mere baptism n’ime afọ ije ozi nke 1989.
12. Akụkụ ụfọdụ dịgasị aṅaa ka chaatị ahụ na-egosipụtaghị (a) banyere ebe obibi akwụkwọ dị iche iche nke Watch Tower Society? (b) banyere itinye magazin na ịnata ụtụ?
12 E nwere akụkọ ụfọdụ nke chaatị ahụ na-egosipụtaghị. A pụghị igbocha mkpa e nwere maka akwụkwọ ọgụgụ—Bible, akwụkwọ ukwu, akwụkwọ nta, magazin—n’ụzọ zuru ezu. N’ihi nke a, ebe obibi akwụkwọ Watchtower dị na New York jiri 25,999 ton akwụkwọ mee ihe n’ibipụta 35,811,000 Bible, akwụkwọ ukwu, na akwụkwọ nta dị iche iche, bụ́ mmụba 101 pasenti karị nke afọ 1988. Ebe obibi akwụkwọ ndị ọzọ buru ibu nke Watch Tower Society, nke ndị pụtara ìhè n’ime ha bụ Germany, Italy, na Japan, rụrụ ọrụ karịa ókè ha na-arụbu, na-akwado “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” n’ikesa ‘nri ime mmụọ n’oge ya.’ (Matiu 24:45) N’ime ọnwa April na May, e nyere akụkọ ọnụ ọgụgụ ndị hiri nnọọ nne nke magazin ndị e tinyere na ụtụ magazin ndị a natara n’ọtụtụ ala dị iche iche, na-elekwasị anya karịsịa n’ikesa mbipụta Ụlọ Nche ndị ahụ metụtara “Babịlọn Ukwu ahụ.” (Mkpughe 17:5) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na n’ọnwa April na-abịanụ, ndị ọsụ ụzọ inyeaka na Ndịàmà ndị ọzọ ga-enuba n’ubi zuru ụwa dum n’ihe kwesịrị ịbụkwa mkpọsa ịgba àmà anyị kasị mma maka afọ ije ozi nke 1990.—Tụlee Aịsaịa 40:31; Ndị Rom 12:11, 12.
13. Olee mba ndị e depụtara aha ha na chaatị ahụ ndị aha ha na-apụtaghị n’afọ gara aga? Kọwaa.
13 Leghachikwa anya na chaatị ahụ. Ị̀ hụrụ mba ụfọdụ ndị a na-edepụtaghị aha ha n’afọ gara aga? Eenụ! Hungary na Poland ebe a ka nyere ọrụ anyị nkwado iwu n’oge na-adịghị anya gara aga. Anyị na-ekele ndị ọchịchị n’ala ndị a na ha na-elezi Ndịàmà Jehova anya n’ụzọ dị otú a ugbu a. N’akụkụ nke a, a zawo ekpere nke òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ, “ka anyị wee biri obi udo na nke dị nwayọọ n’ime nsọpụrụ Chineke nile na ikwesị nsọpụrụ nile.”—1 Timoti 2:1, 2.
14. Kọọ isi ihe ụfọdụ metụtara Mgbakọ Distrikti “Nsọpụrụ Chineke” ndị e mere na Poland.
14 “Nsọpụrụ Chineke”! Ee, a pụrụ ime Mgbakọ Distrikti “Nsọpụrụ Chineke” ahụ ọbụna na Poland, n’ebe atọ dị iche iche, n’ime August! Lee nnọọ ndị na-ele ndị ọbịa anya nke ọma 91,024 ụmụnna anyị ndị Poland gosiri onwe ha ịbụ! (Ndị Hibru 13:1, 2, 16) Dị ka à ga-asị na ọ bụ site n’ọrụ ebube, ọtụtụ iri puku ụmụnna anyị—ndị Czechoslovakia, Germany, Russia, na ndị ọzọ—natara akwụkwọ njem visa ịji ụgbọ bọọsụ, ụgbọ okporo ígwè, na ọbụna ụkwụ, wee bịa. Ọtụtụ puku ndị ọzọ ji ụgbọ elu bịa site n’Ugwu na Ndịda America, Ọdịda Anyanwụ Europe, nakwa site n’ebe dị anya dị ka agwaetiti dị iche iche nke Pacific na Japan. Ọ fọrọ nnọọ ntakịrị ka nnukwute ámá egwuregwu ndị ahụ, ndị ụmụnna anyị mere ka ha na-enwu ọcha, ghara ịbata 65,710 ndị bịara na Katowice, 40,442 ndị bịara na Poznan, na 60,366 ndị bịara na Warsaw—bụ́ ngụkọta nke 166,518 ndị bịaranụ! N’ebe nke ọ bụla, ikiri ihe omume nke baptism kpaliri anya mmiri ákwá nke mmetụta ọṅụ. Na Poznan, e mikpuru otu onye dị afọ itoolu na onye ọzọ dị iri afọ itoolu ná mmiri, ngụkọta nke 6,093 ndị ahụ e mikpuru na mmiri ná mgbakọ atọ ndị ahụ gụnyekwara ọtụtụ ndị ka na-eto eto, ọtụtụ n’ime ndị a sitekwara n’ala ebe ndị e kwuburu na okpukpe ga-eso ndị agadi nwụchapụ. Ọ dịghị otú ahụ n’ihe banyere ezi okpukpe ahụ nke dabeere n’Okwu Chineke! (Tụlee Abụ Ọma 148:12, 13; Ọrụ 2:41; 4:4.) Lee ụzọ dị ebube e siworo kwụghachi ntachi obi nke ụmụnna anyị ndị nọ n’Ọwụwa Anyanwụ Europe ụgwọ ọrụ!
Ịnọgide n’Ikwesị Ntụkwasị Obi n’Okpuru Ule
15. Olee ụzọ Ndịàmà nọ na Lebanon siworo gosi ntachi obi na iguzosi ike, oleekwa ihe ọma ndị siworo na nke a pụta?
15 Dị ka Pọl onyeozi, a na-akpọku Ndịàmà Jehova ka ha gosipụta ntachi obi n’okpuru ọtụtụ ụdị ọnọdụ dị iche iche. (2 Ndị Kọrint 11:24-27) Na Lebanon, a ka na-alụ agha obodo ugbu a. Olee ụzọ ụmụnna anyị si emeghachi omume? Site n’iguzosi ike na ime mkpebi siri ike. N’afọ 1989, e nwere oké ịgba égbè na ịtụ bọmbụ, ma ọbụna n’ebe ndị a kasị sie ike, ụmụnna ahụ kpebisiri ike na ha agaghị eselata aka. Otu ọgbakọ dị na Beirut kọrọ, sị: “E dokwara ìgwè ndị na-eje ozi ubi n’uhuruchi nile dị n’izu. N’agbanyeghị ọnọdụ ọgba aghara ahụ, a kụdaghị ụmụnna ahụ aka. Anyị jezuru ozi n’ọtụtụ ókèala karịa ka anyị na-eme na mbụ. N’April, anyị nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị ọsụ ụzọ. A malitere ọmụmụ Bible ndị ọhụrụ, e tinyekwara magazin na akwụkwọ ukwu karịa otú a na-emebu.”
16. Olee ụzọ ụmụnna anyị nọ na Colombia siworo gosi inwe ntachi obi site n’iwere ozi ọma ahụ jee n’obodo ebe ndị a na-enweghị Ndịàmà?
16 A nọgidewo na-anụ akụkọ banyere Colombia n’ihi mbugharị ọgwụ ọjọọ na ime ihe ike. Ma ojiji ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ ji ikwesị ntụkwasị obi na-enwe ntachi obi bụkwa ihe akụkọ. N’oge na-adịghị anya gara aga, e zijere ndị ọsụ ụzọ oge nile na-anọ nwa oge na 31 obodo dị iche iche nke nwere puku mmadụ iri ma ọ bụ karị ndị bi na ha, bụ́ ebe a na-enweghị Ndịàmà ọ bụla. N’otu obodo, mgbe ndị nwere mmasị ọhụrụ chọpụtara na ndị ọsụ ụzọ ahụ gaje ịnọ ebe ahụ nanị ọnwa ole na ole, ha rịọrọ ndị ọsụ ụzọ ahụ ka ha nọrọ gaa n’ihu. N’otu obodo ọzọ, 18 mmadụ ndị nwere mmasị bịanyere aka n’otu akwụkwọ ozi e ji gosi ekele maka enyemaka ime mmụọ e nyere ha n’ime ọnwa atọ ndị ọsụ ụzọ ahụ nọrọ n’ebe ahụ, rịọkwa ka a bịa nyekwuoro ha aka. “Nke a bụ nnọọ ihe dị mkpa,” ka ha sịrị. Ọ dịghị mkpa ikwu ya ekwu na n’ebe abụọ ndị ahụ, e mere ndokwa ịnọgide na-azụlite mmasị ha. Ọ na-ewe ntachi obi iwulite ókèala ndị dị anya otú ahụ, ma a na-agọzi ọrụ nke ndị ọsụ ụzọ ahụ na-eme ya n’ụba.
17, 18. (a) N’okpuru ọnọdụ dịgasị aṅaa ka Ndịàmà Jehova nweworo ntachi obi n’Italy? (b) Olee otú ihe siworo gaara Ndịàmà ahụ n’agbanyeghị mgbasa nke okwu ụgha banyere ha?
17 N’Italy, Ndịàmà Jehova na-eche oké mmegide sitere n’aka ndị ndú okpukpe ihu, ma n’ike Jehova, ha enwewo ntachi obi. N’ógbè dị iche iche, ndị ụkọchukwu ekesawo akwụkwọ ndị a ga-amapawa n’ọnụ ụzọ ụlọ ndị chọọchị ha na-agwa Ndịàmà Jehova ka ha ghara ịpịtụ aka ná mgbịrịmgba ọnụ ụzọ ha. Ọtụtụ ndị ụkọchukwu kpọkọtara ìgwè ụmụ okorobịa ka ha jee mapawa akwụkwọ ndị ahụ n’ibo ọnụ ụzọ nile dị n’otu ógbè—ọbụna n’ụlọ nke ezinụlọ Ndịàmà! Otú ọ dị, Ndịàmà ahụ abụghị ndị ọ na-adị mfe iyi egwu, mgbe mgbe kwa, ha na-eji akwụkwọ ndị ahụ a mapawara na-eme ihe iji malite mkparịta ụka. N’ịga n’ihu, ndị mgbasa akụkọ na ụlọ ọrụ telivishọn nke mba ahụ kpọsara okwu ahụ nke ukwuu, na-akatọ omume ndị okpukpe dị otú a nke ekweghị ibe ha nọrọ, na-emesikwa ya ike na usoro ime ihe ndị yiri nke a bụ n’ezie ihe àmà nke adịghị ike n’akụkụ chọọchị ahụ. Akwụkwọ mmapawa ndị ahụ na-emegide Ndịàmà kpasuru otu onye prọfesọ na-ezi ihe na mahadum iwe nke ukwuu nke na ọ tụrụ ụtụ maka Ụlọ Nche na Teta!
18 Ọbụna na Chọọchị Katọlik dị n’Italy na-eji ndị dapụrụ n’ezi ofufe eme ihe ịgbasa okwu ụgha banyere ndị Jehova, ma nke a anaghị agakwa nke ọma n’ihi na a maara 172,382 ndị nkwusa nọ n’ebe ahụ nke ọma, na-asọpụrụkwa ha. Otu nwoke gwara Ndịàmà bịara na nke ya na ya agụwo ihe ọjọọ dị iche iche banyere anyị n’akwụkwọ ndị bụbu Ndịàmà bipụtara. N’ihi ya, o wetara mmegide dị ukwuu mgbe nwanne ya nwoke ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ma mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọ hụtara mmetụta dị mma mgbanwe okpukpe nke nwanne ya nwoke nweworo n’ebe ọ nọ. Ọ tụgharịrị uche, sị: ‘Olee otú o si kwe omume ihe dị njọ otú a ịrụpụta ihe ọma ndị dị otú a?’ N’ihi nke ahụ, ọ rịọrọ ka Ndịàmà ahụ bịara na nke ya malite iduziri ya ọmụmụ Bible.—Tụlee Ndị Kọlọsi 3:8-10.
Ịnagide Enweghị Mmasị
19, 20. (a) Ọnọdụ dị aṅaa chọworo ntachi obi n’aka Ndịàmà nọ na Finland, oleekwa ihe kwesịrị ịrịba ama banyere otu njụta echiche ọha nke chọọchị mere? (b) Ahụmahụ dị aṅaa na-egosipụta mkpa nke inwe ntachi obi n’ikwusa ozi ọma ahụ?
19 Ná mba ebe Ndịàmà ahụ na-abịa n’ụlọ ndị mmadụ mgbe mgbe, a na-ahụkarị enweghị mmasị gbasazuru ebe nile n’ebe ozi ọma ahụ dị. Ọ dị nnọọ otú ahụ na Finland. Chọọchị dị ná mba ahụ mere njụta echiche ọha wee chọpụta na 70 pasenti nke ndị mba ahụ enweghị mmasị Ndịàmà ahụ ịbịa n’ụlọ ha. Otú ọ dị, 30 pasenti enweghị oké ihe ha nwere megide ya, n’ime ndị a kwa, 4 pasenti kwuru na ha nwere mmasị n’ezie n’ebe Ndịàmà Jehova nọ. Ọnụ ọgụgụ nke a kwesịrị nnọọ ịrịba ama. Pasenti anọ nke ndị bi na Finland pụtara 200,000 mmadụ. Jiri nke ahụ tụnyere ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa e nwere ugbu a nke bụ 17,303!
20 A dọọrọ uche otu onye nkwusa nọ n’ozi ubi gaa ná njụta echiche ọha nke a, wee jụọ ya, sị: “Ị́ mataghị na 70 pasenti n’ime anyị na-ele unu anya dị ka ndị na-adịghị mma? Gịnị mere unu ji nọgide na-abịa n’ụlọ anyị?” Onye nkwusa ahụ zaghachiri, sị: “Ee, ma otu ihe ọmụmụ ahụ gosiri na 4 pasenti n’ime unu nwere mmasị n’ebe anyị nọ. Anyị na-eme mgbalị ịchọta ndị ahụ. Ọbụna ma a sị na ọ bụ nanị 1 pasenti, anyị ka ga-agakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ ná mgbalị anyị na-eme ịchọta ha.” Onye ahụ nwe ụlọ chere echiche nwa oge wee sị: “Ozi unu ji ọ̀ dị mkpa otú ahụ nye ha?” Onye nkwusa ahụ zaghachiri site n’ịjụ, sị: “Ọ̀ ga-amasị gị ịnụ ya?” N’oge na-adịghị anya, onye a nwe ụlọ gosiri mmasị n’ozi ọma ahụ.
Ihe Ọdịnihu Ga-abụ
21. (a) Ụdị mgba dị aṅaa ka anyị na-aghaghị ịgba n’ime usoro ihe nke a, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Gịnị ka ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị nwee ntachi obi na ya, ọ̀ bụkwa gịnị ka amụma Habakuk na-emesi anyị obi ike banyere ya?
21 Gịnị banyere anyị nile taa? Ànyị ekpebisiwo ike iso Jehova na Kraịst Jisọs na-enwe ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ? Ọ pụrụ ịbụ na ọ dịchakwaghị anya, ma anyị aghaghị inwe ntachi obi! N’ime usoro ihe nke Setan, anyị aghaghị ịgbasi mgba ike maka okwukwe anyị, ebe ọ bụ na ụkpụrụ omume ndị ụwa, omume rụrụ arụ, na ịkpọasị gbara anyị gburugburu n’akụkụ nile. (Jud 3, 20, 21) Ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị nwee ntachi obi n’otu ụdị mkpagbu ma ọ bụ ụdị ọzọ. Ọbụna ugbu a, ọtụtụ puku ụmụnna anyị na-ata ahụhụ n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche, a na-etikwa ụfọdụ ndị ihe n’ụzọ obi ọjọọ. Ndị a nwere ekele maka ekpere anyị nile. (2 Ndị Tesalọnaịka 3:1, 2) N’oge na-adịghị anya, usoro ihe dị ugbu a agaghị adịkwa ọzọ! Dị ka Habakuk kwuru: “Ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka, ọ na-ekusikwara ọgwụgwụ ya ume ike, ọ gaghị ekwukwa okwu ụgha: ọ bụrụ na ọ laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.”—Habakuk 2:3.
22. Gịnị ka anyị pụrụ iji obi ike na-atụ anya ya ma ọ bụrụ na anyị enwee ndidi yiri nke ndị amụma na ntachi obi yiri nke Job?
22 Jemes onye na-eso ụzọ ji ịhụnanya gwa anyị, sị: “Ụmụnna, natanụ ndị amụma ahụ, bụ́ ndị kwuru okwu n’aha [Jehova, NW] dị ka ihe ilereanya nke ịhụju anya na nke ogologo ntachi obi.” Anyị onwe anyị taa, bụ́ ndị na-ekwu okwu n’aha Jehova pụrụ ịbụ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi n’oge ule ndị dị ilu, dị ka Aịsaịa, Jeremaịa, Daniel, na ndị ọzọ mere. Dị ka Job, anyị pụrụ inwe ntachi obi. Lee ụzọ dị ebube e si kwụghachi ya ụgwọ ọrụ maka ntachi obi ya! Ebere na ezi ịhụnanya Jehova ga-ewetakwara anyị ụgwọ ọrụ ndị a pụrụ iji tụnyere nke ahụ—ma ọ bụrụ na anyị enwee ntachi obi ruo ọgwụgwụ. Ka okwu Jemes mezuokwa n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ: “Lee, anyị na-akpọ ha ndị [obi ụtọ, NW], bụ́ ndị tachiri obi.”—Jemes 5:10, 11; Job 42:10-13.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Mkpa dị aṅaa nke inwe ntachi obi ka Jisọs mesiri ike?
◻ Olee ihe ndị mere Jehova jiworo nwee ntachi obi?
◻ Gịnị bụ isi ihe ụfọdụ dị n’oké ọrụ nke a rụzuru n’afọ 1989?
◻ Olee ụzọ e siworo kwụghachi ntachi obi nke ụmụnna anyị nọ na Poland ụgwọ ọrụ?
◻ Olee ụzọ Ndịàmà nọ na Lebanon, Colombia, na Italy siworo gosi ikwesị ntụkwasị obi n’okpuru ule?
[Chaatị dị na peeji nke 20-23]
AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 1989 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE
(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)