-
Gịnị Bụ Alaeze Chineke?Ụlọ Nche—2011 | Mach 1
-
-
Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
“Ozi ọma nke a nke alaeze . . . ”—MATIU 24:14.
MGBE Jizọs na-ezi Ozizi Elu Ugwu ya ahụ a ma ama, ọ kụziri otu ekpere ihe atụ, bụ́ nke nwere arịrịọ ọ rịọrọ Chineke bụ́: “Ka alaeze gị bịa.” Ọtụtụ nde mmadụ bu ekpere ahụ n’isi ma na-ekpeghachi ya ugboro ugboro. Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma kwuru na ọ bụ “ekpere Ndị Kraịst niile na-ekpekarị n’ofufe ha.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị na-ekpe ya amaghị ihe Alaeze ahụ bụ ma ọ bụ ihe ọ ga-eme mgbe ọ bịara.—Matiu 6:9, 10.
Nke ahụ ejughị anyị anya. Ndị ndú okpukpe Krisendọm na-akọwa ihe Alaeze ahụ bụ n’ụzọ dị iche iche, bụ́ ndị na-agbagwoju anya ma na-esi ike nghọta. Otu onye dere na Alaeze Chineke bụ “ihe ime mmụọ . . . ihe a na-anaghị ahụ anya nke jikọrọ mmadụ na Chineke dị ndụ . . . , ihe dị n’etiti mmadụ na Chineke nke na-ewetara ndị ikom na ndị inyom nzọpụta.” Onye ọzọ kọwara na ozi ọma Alaeze bụ “ntụziaka metụtara chọọchị.” Akwụkwọ bụ́ Catechism of the Catholic Church kwukwara, sị: “Alaeze Chineke [bụ] ezi omume na udo na ọṅụ n’ime Mmụọ Nsọ.”
Ị ga-ahụ ebe a kọwara ya otú doro anya karịa na peeji nke 2 nke magazin a. O kwuru, sị: “Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị dị n’eluigwe, ga-eme ka ajọ omume niile kwụsị n’oge na-adịghị anya, meekwa ka ụwa ghọọ paradaịs.” Ka anyị hụ otú Baịbụl si kwado nkọwa a.
Ndị Ga-achị Ụwa Niile n’Ọdịnihu
Alaeze bụ ọchịchị nke eze na-achị. Eze nke Alaeze Chineke bụ Jizọs Kraịst a kpọlitere n’ọnwụ. A kọwara otú e si chie ya eze n’eluigwe n’otu ọhụụ e gosiri Daniel onye amụma, bụ́ onye dere, sị: “Anọ m na-ahụ n’ọhụụ m hụrụ n’abalị, ma, lee! onye yiri nwa nke mmadụ [Jizọs] nọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe; ọ banyere n’ebe Onye Ochie ahụ [Jehova Chineke] nọ, ha wee kpọrọ ya bịa nso n’ihu Onye ahụ. E wee nye ya ọchịchị na ùgwù na alaeze, ka ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi nke na-agaghị agabiga agabiga, alaeze ya bụkwa nke a na-agaghị ebibi ebibi.”—Daniel 7:13, 14.
Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Daniel gosikwara na Chineke ga-eme ka Alaeze ahụ guzosie ike, na Alaeze ahụ ga-ekpochapụ ọchịchị niile nke ụmụ mmadụ, a gaghịkwa ebibi ya ebibi. Isi nke 2 kọrọ banyere otu nrọ Chineke mere ka eze Babịlọn rọọ, bụ́ nke ọ nọ na ya hụ otu nnukwu ihe oyiyi nke nọchiri anya mba ndị chịrị ụwa. Daniel onye amụma kọwara nrọ ahụ. O dere, sị: “N’oge ikpeazụ . . . , Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:28, 44.
Eze nke Alaeze Chineke agaghị achị naanị ya. Mgbe Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, o mere ka obi sie ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ike na a ga-akpọlite ha na ndị ọzọ n’ọnwụ ịga eluigwe, nakwa na ha ga-anọdụ ala n’ocheeze. (Luk 22:28-30) Ocheeze o kwuru okwu ya abụghị ocheeze nkịtị, n’ihi na Jizọs kwuru na Alaeze ahụ ga-adị n’eluigwe. Baịbụl kwuru na ndị ahụ ha na Jizọs ga-eso achị si “n’ebo niile na asụsụ niile na ndị niile na mba niile.” Ha ga-abụrụ “Chineke anyị otu alaeze na ndị nchụàjà, ha ga-achịkwa ụwa dị ka ndị eze.”—Mkpughe 5:9, 10.
Ihe Mere Ozi Alaeze ahụ Ji Bụrụ Ozi Ọma
Ị̀ hụrụ na e nyere Kraịst Jizọs ikike ịchị “ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche” nakwa na ndị ha na ya ga-eso chịa ‘ga-achị ụwa dị ka ndị eze’? Oleezi ndị Alaeze a ga-achị? Ọ bụ ndị nabatara ozi ọma nke a na-ekwusa taa. Ndị ọzọ ọ ga-achịkwa bụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ibi n’elu ala, bụ́kwa ndị ga-enwe olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
Baịbụl kwuru hoo haa ngọzi ndị mmadụ ga-enweta mgbe Alaeze ahụ ga-achịwa. Lekwa ole na ole n’ime ha:
“Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa. Ọ na-agbaji ụta, na-egbujisịkwa ube; ọ na-agbakwa ụgbọ agha ọkụ.”—Abụ Ọma 46:9.
“Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie ya; ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ya.”—Aịzaya 65:21, 22.
“[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.
“Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, a ga-emeghekwa ntị nke ndị ntị chiri. Mgbe ahụ ka onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”—Aịzaya 35:5, 6.
“Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya [Jizọs] wee pụta, ndị mere ezi ihe ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ndụ.”—Jọn 5:28, 29.
“Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:11.
Nke ahụ bụ nnọọ ozi ọma! Amụma Baịbụl ndị mezurula emezu na-egosikwa na oge eruwela mgbe Alaeze ahụ ga-amalite ọchịchị ezi omume ya n’ụwa niile.
-
-
Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?Ụlọ Nche—2011 | Mach 1
-
-
Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?
“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a . . . ”—MATIU 24:14.
NDỊ KRAỊST ga-ekwusa “ozi ọma . . . nke alaeze” site n’ịgwa ndị ọzọ maka ya, na-akọwara ha na Alaeze ahụ bụ ọchịchị nke ga-achị ụwa dum n’ezi omume n’ọdịnihu. Ma, e kwukwara okwu banyere ụdị “ozi ọma” ndị ọzọ na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, e kwuru banyere “ozi ọma banyere nzọpụta” (Abụ Ọma 96:2); “ozi ọma banyere Chineke” (Ndị Rom 15:16); na “ozi ọma banyere Jizọs Kraịst.”—Mak 1:1.
Ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ihe ndị so n’ozi ọma ahụ bụ eziokwu niile Jizọs kwuru okwu ha na ndị ndị na-eso ụzọ ya dere banyere ha. Tupu Jizọs arịgoro eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ya mere, ọrụ ezi Ndị Kraịst abụghị naanị ịgwa ndị mmadụ banyere Alaeze ahụ; ha ga-agbarịrị mbọ ime ndị na-eso ụzọ.
Olee otú chọọchị dị iche iche na-eme na nke a? Ọtụtụ n’ime ha aghọtaghị ihe Alaeze ahụ bụ. N’ihi ya, ha enweghị ike ịkụziri ya ndị ọzọ nke ọma. Kama nke ahụ, ha na-ekwu okwuchukwu ire ụtọ banyere mgbaghara mmehie na inwe okwukwe na Jizọs. Ha na-agbakwa mbọ inweta ndị na-eso ụzọ ha site n’ịrụ ọrụ ebere ma ọ bụ ịrụ ụlọ ọgwụ, ụlọ akwụkwọ na ịrụrụ ndị ogbenye ụlọ. Ọ bụ ezie na ụdị mbọ ahụ nwere ike ime ka ọnụ ọgụgụ ndị na-aga chọọchị mụbaa, ha anaghị eme ka ndị mmadụ ghọọ ezi Ndị Kraịst ji obi ha dum na-achọ ibi ndụ kwekọrọ n’ihe Jizọs kụziri.
Otu ọkà mmụta okpukpe dere, sị: “Ọtụtụ ndị ọkà mmụta ma ọ bụ ndị ndú okpukpe Ndị Kraịst kweere na anyị kwesịrị imere Jizọs ndị na-eso ụzọ ma kụziere ha ime ihe niile Jizọs kwuru. . . . A sị ka e kwuwe, ntụziaka Jizọs nyere n’okwu a doro nnọọ anya. Ọ bụ naanị na anyị anaghị eme ihe o kwuru. Anyị anaghị eji obi anyị niile anwa ime ya. O dokwara anya na anyị amaghị otú e si eme ya.”
N’otu aka ahụ, ajụjụ a jụrụ ndị na-ekpe Katọlik n’Amerịka gosiri na ihe dị ka mmadụ itoolu n’ime mmadụ iri ọ bụla a jụrụ ajụjụ kwetara na chọọchị ha chọrọ ka ha na-ekwusa ozi ọma. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ chere na ụzọ kacha mma e kwesịrị isi mee nke a bụ ha ibi ndụ otú ga-abụrụ ndị ọzọ ihe nlereanya, ọ bụghị ikwu ya n’ọnụ. Otu n’ime ndị a jụrụ echiche ha kwuru, sị: “Ikwusa ozi ọma abụghị okwu ọnụ efu. Ndụ anyị kwesịrị ịbụ Ozi Ọma n’onwe ya.” Ụlọ ọrụ na-ebipụta magazin bụ́ U.S. Catholic, nke mere nchọpụta ahụ, kwuru na ọtụtụ ndị anaghị achọ ịkọrọ ndị ọzọ ihe ha kweere n’ihi “aha ọjọọ chọọchị ahụ nwere n’ihi akụkọ ndị a kọrọ n’oge na-adịbeghị anya banyere otú ndị isi chọọchị si emetọ ụmụaka nakwa n’ihi ozizi chọọchị ndị na-ese okwu.”
N’ebe ọzọ, otu bishọp Chọọchị Metọdist kwuru na chọọchị ya kewara ekewa ma nọrọ ná mgbagwoju anya, na obi anaghị aka ha ịrụ ọrụ ha, nakwa na àgwà ha adịchaghị iche n’àgwà mmadụ niile na-akpa. O ji mwute jụọ, sị: “Olee ndị ji ọrụ ikwusa ozi ọma nke Alaeze kpọrọ ihe?”
Bishọp ahụ azaghị ajụjụ ahụ ọ jụrụ. Ma, azịza ya dị adị. Ị ga-ahụ ya n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Ozi ọma ahụ bụ banyere ma Alaeze Chineke ma nzọpụta site n’inwe okwukwe na Jizọs Kraịst
-