-
Ikwere n’Amụma Bible Na-echebe NdụỤlọ Nche—2007 | Eprel 1
-
-
N’ime ọnwa atọ, onye ọchịchị Rom nke na-achị Siria bụ́ Cestius Gallus, kpọọrọ iri puku ndị agha atọ gawa ebe ndịda iji kwụsị nnupụisi ndị Juu ahụ. Ndị agha ya rutere Jeruselem mgbe a na-eme Ememe Ụlọ Ntu ma banye n’ime ime obodo ndị dị na Jeruselem n’egbughị oge. Ndị nnupụisi ahụ gbabara n’ụlọ nsọ ịga zere isi ha mgbe ha hụrụ na ndị agha Rom akarịala ha. N’oge na-adịghị anya, ndị agha Rom malitere imebisị mgbidi ụlọ nsọ ahụ. Ụjọ bịara jide ndị Juu. Legodị, ndị agha na-ekpere arụsị amalitela imerụ ebe ndị Juu weere dị ka ebe kasị nsọ! Mgbe ahụ ka Ndị Kraịst nọ n’obodo ahụ chetara okwu Jizọs, bụ́: ‘Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, ka ọ na-eguzo n’ebe nsọ, mgbe ahụ ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu.’ (Matiu 24:15, 16) Hà ga-ekwere n’amụma Jizọs buru ma mee ihe ọ sịrị ha mee? Ihe ndị mesịrị mee gosiri na ndụ ha dabeere n’ịṅa ntị n’ihe Jizọs kwuru. Ma olee otú ha ga-esi gbapụ?
Ná mberede, n’enweghịkwa ihe e ji n’aka kpatara ya, Cestius Gallus kpọọrọ ndị agha ya si na Jeruselem pụọ ma ndị Juu ahụ na-enupụ isi siri ọnwụ chụrụ ha gawa. N’ụzọ dị ịtụnanya, oké mkpagbu ahụ e nwere n’obodo ahụ adịteghị aka. Ndị Kraịst gosiri na ha kweere n’okwu amụma ahụ Jizọs gwara ha ma si Jeruselem gbaga Pela bụ́ obodo nọ n’elu ugwu ma a gafee Osimiri Jọdan, nke na-esoghịkwa n’agha ahụ. Ha gbapụrụ nnọọ n’ezi oge. N’oge na-adịghị anya ndị nnupụisi ahụ lọghachiri Jeruselem ma manye ndị fọdụrụ n’obodo ahụ isonyere ha ná nnupụisi ha.a Ndị Kraịst ahụ gbagara Pela nọzi n’ebe ahụ dị nchebe na-eche ihe ọzọ ga-emenụ.
-
-
Ikwere n’Amụma Bible Na-echebe NdụỤlọ Nche—2007 | Eprel 1
-
-
a Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus kọrọ na ndị nnupụisi ahụ chụgidere ndị agha Rom ọsọ ruo abalị asaa tupu ha alọghachi Jeruselem.
-