Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 8/15 p. 15-20
  • À Ga-azọpụta Gị Mgbe Chineke Mere Ihe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • À Ga-azọpụta Gị Mgbe Chineke Mere Ihe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Jisọs Buru n’Amụma, na Ihe Merenụ
  • A Zọpụta Mmadụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
  • Gịnị Ka Ọdịnihu Gị Ga-abụ?
  • “Ihe Ndị A Aghaghị Ịpụta”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ndị E Chebere Ndụ Gabiga Mkpagbu Ukwu Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • “Gịnị Ga-abụkwa Ihe Ịrịba Ama nke Ọnụnọ Gị?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 8/15 p. 15-20

À Ga-azọpụta Gị Mgbe Chineke Mere Ihe?

“Ọ bụrụkwa na e meghị ụbọchị ahụ ka ha dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta mmadụ ọ bụla: ma n’ihi ndị a họpụtara a ga-eme ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi.”—MATIU 24:22.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị inwe mmasị n’ọdịnihu anyị? (b) Mmasị ebumpụta ụwa pụrụ ịbụ ihe kpatara ajụjụ ndị dị aṅaa dị mkpa?

RUO ókè hà aṅaa ka i nwere mmasị n’onwe gị? Ọtụtụ taa na-enwebiga mmasị ókè n’ọdịmma onwe onye, na-eche banyere onwe ha nanị. Ma, Bible adịghị akatọ mmasị kwesịrị ekwesị n’ihe na-emetụta anyị. (Ndị Efesọs 5:33) Nke ahụ gụnyere inwe mmasị n’ọdịnihu anyị. Ya mere ọ ga-abụrụ gị ihe kwesịrị ekwesị ịchọ ịmara ihe ọdịnihu gị ga-abụ. Ì nwere mmasị?

2 Anyị pụrụ ijide n’aka na ndị ozi Jisọs nwere ụdị mmasị ahụ n’ọdịnihu ha. (Matiu 19:27) O yiri ka nke ahụ bụ otu ihe kpatara ya mgbe anọ n’ime ha so Jisọs nọrọ n’elu Ugwu Olive. Ha jụrụ, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ? gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama mgbe ọ bụla a gaje imezu ihe ndị a nile?” (Mak 13:4) Jisọs elegharaghị mmasị kwesịrị ekwesị n’ọdịnihu anya—mmasị ha na nke anyị. Mgbe mgbe o mesiri ike otú ọ ga-esi nwee mmetụta n’ahụ ndị na-eso ụzọ ya na ihe ga-esi na ya pụta n’ikpeazụ.

3. N’ihi gịnị ka anyị ji na-ejikọ nzaghachi Jisọs na oge anyị?

3 Nzaghachi Jisọs setịpụrụ otu amụma nke nwere mmezu bụ isi n’oge anyị. Anyị pụrụ ịhụ nke a site n’agha ụwa ndị ahụ na agha ndị ọzọ na narị afọ anyị, ala ọma jijiji ndị na-ewepụ ndụ ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ n’ike, ụkọ nri ndị na-eweta ọrịa na ọnwụ, na ihe otiti—site n’ahụ ọkụ Spain zuru ebe nile nke 1918 gaa n’ihe otiti AIDS dị ugbu a. Otú ọ dị, ihe dị ukwuu n’azịza Jisọs nwekwara mmezu na-eduga na ma na-agụnye mbibi nke Jerusalem site n’aka ndị Rom na 70 O.A. Jisọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Lezie anya n’onwe unu: n’ihi na ha ga-arara unu nye n’aka nnọkọ ikpe dị iche iche; n’ụlọ nzukọ dị iche iche ka a ga-apịakwa unu ihe; n’ihu ndị isi na ndị eze ka unu ga-eguzokwa n’ihi m, ịbụrụ ha àmà.”—Mak 13:9.

Ihe Jisọs Buru n’Amụma, na Ihe Merenụ

4. Gịnị bụ ụfọdụ ịdọ aka ná ntị ndị a gụnyere ná nzaghachi Jisọs?

4 Jisọs buru amụma karịrị otú ndị ọzọ ga-esi emeso ndị na-eso ụzọ ya. Ọ dọrọ ha aka ná ntị otú ha onwe ha kwesịrị isi eme omume. Dị ka ihe atụ: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, ka ọ na-eguzo n’ebe ọ na-ekwesịghị (onye na-agụ, ya tụgharịa uche), mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu.” (Mak 13:14) Ihe ndekọ yiri ya nke dị na Luk 21:20 na-asị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu.” Olee otú nke ahụ si bụrụ eziokwu na mmezu mbụ?

5. Gịnị mere n’etiti ndị Juu nọ n’ime Judia na 66 O.A.?

5 Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia (1982) na-agwa anyị, sị: “Ndị Juu ghọwanyere ndị ahụ na-erughị ala n’okpuru nchịkwa ndị Rom, ndị ọchịchị ahụkwa ghọwanyere ndị na-eme ihe ike, ndị obi ọjọọ, na ndị na-adịghị akwụwa aka ọtọ. Nnupụisi pụtara ìhè tiwapụrụ na A.D. 66. . . . Agha ahụ malitere mgbe ndị Zealot jichiri Masada ma mesịa, n’okpuru Menahem, zọọrọ njem gaa Jerusalem. N’otu mgbe ahụ e gburu ndị Juu nile nọ n’obodo ukwu bụ́ Sizaria bụ́ isi ọchịchị, akụkọ nke ihe arụ a gbasakwara ná mba ahụ nile. A kanyere mkpụrụ ego ọhụrụ akara Afọ nke 1 ruo Afọ nke 5 nke nnupụisi ahụ.”

6. Nnupụisi ndị Juu mere ka ndị Rom meghachi omume dị aṅaa?

6 Usuu Ndị Agha nke Iri na Abụọ nke Rom nọ n’okpuru Cestius Gallus sitere Siria zọpụ njem, bibisie Galili na Judia, wee wakpozie isi obodo ahụ, ọbụna na-emeri mpaghara elu nke “Jerusalem, bụ́ obodo nsọ.” (Nehemaịa 11:1; Matiu 4:5; 5:35; 27:53) N’ịchịkọta ihe ndị merenụ, mpịakọta bụ́ The Roman Siege of Jerusalem na-asị: “Ruo ụbọchị ise ndị Rom nwara ịrịfere mgbidi ya, bụrụ ndị a chụlara azụ mgbe mgbe. N’ikpeazụ ndị ahụ na-azọ isi ha, n’ịbụ ndị mwụkwasị nke ìgwè àkụ́ karịrị ike, chịliri aka elu. N’imepụta usoro nchịkọta ọta—usoro nke ijikọta ọta ha n’elu isi ha iji chebe onwe ha—ndị agha Rom gwuru ala gburugburu mgbidi ahụ ma nwaa isunye ọnụ ụzọ àmà ahụ ọkụ. Oké ụjọ jidere ndị ahụ na-azọ isi ha.” Ndị Kraịst nọ n’ime obodo ahụ pụrụ icheta okwu Jisọs ma ghọta na ihe arụ na-eguzo n’ebe nsọ ahụ.a Ma ebe a gbara obodo ahụ gburugburu, olee otú ndị Kraịst dị otú ahụ pụrụ isi gbalaga, dị ka Jisọs dụworo n’ọdụ?

7. Mgbe ha pụrụ inwe mmeri na 66 O.A., gịnị ka ndị Rom mere?

7 Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Flavius Josephus na-akọ, sị: “Cestius [Gallus], n’ịbụ onye na-amaghị banyere obi nkoropụ nke ndị ahụ a gbara gburugburu ma ọ bụ mmetụta nke ndị ahụ, kpọghachiri ndị agha ya na mberede, gbahapụ olileanya inwe mmeri ọ bụ ezie na e merighị ya, sikwa n’Obodo ahụ gbapụ n’ụzọ megidere izu.” (The Jewish War, II, 540 [xix, 7]) N’ihi gịnị ka Gallus ji laghachi azụ? N’agbanyeghị ihe ọ bụla kpatara ya, nlaghachi azụ ya nyere ndị Kraịst ohere irube isi n’iwu Jisọs ma gbalaga n’ugwu nakwa n’ebe nchebe.

8. Gịnị bụ akụkụ nke abụọ nke mgbalị ndị Rom mere megide Jerusalem, gịnịkwa ka ndị ahụ lanarịrịnụ nwere ahụmahụ ya?

8 Nrubeisi zọrọ ndụ. N’oge na-adịghị anya ndị Rom gawara igwepịa nnupụisi ahụ. Obubu agha ahụ n’okpuru Ọchịagha Titus bịara ná njebebe n’ịgba Jerusalem gburugburu site n’April ruo n’August 70 O.A. Ọ na-awụ akpata oyi n’ahụ ịgụ nkọwa Josephus kọwara otú ndị Juu si taa ahụhụ. E wepụ ndị ahụ e gburu mgbe ha na-alụso ndị Rom ọgụ, òtù mmegide dị iche iche nke ndị Juu gburu ndị Juu ndị ọzọ, ịkwụ agụụ dujekwara n’iri anụ mmadụ. Ka ọ na-erule oge ndị Rom meriri, 1,100,000 ndị Juu anwụwo.b N’ime 97,000 dị ndụ, e gburu ụfọdụ n’egbughị oge; e mekwara ndị ọzọ ohu. Josephus na-asị: “A tụrụ ndị gafere afọ iri na asaa ịgà ma ziga ha ịrụ ọrụ ike n’Ijipt, ebe Titus zijere ọnụ ọgụgụ dị ukwuu n’ógbè dị iche iche ịnwụ n’ebe a na-eme egwuregwu site ná mma agha ma ọ bụ site n’anụ ọhịa.” Ọbụna ka usoro a nke ikpebi ihe a ga-eme ha na-ewere ọnọdụ, 11,000 ndị mkpọrọ nwụrụ n’agụụ.

9. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ji ghara inweta ihe ndị Juu nwetara, ma ajụjụ ndị dị aṅaa fọdụrụ?

9 Ndị Kraịst pụrụ inwe ekele na ha erubewo isi n’ịdọ aka ná ntị nke Onyenwe anyị wee si n’obodo ahụ gbalaga tupu ndị agha Rom alaghachi. N’ihi ya, a zọpụtara ha n’akụkụ nke ihe Jisọs kpọrọ ‘mkpagbu ukwu, nke ihe dị ka ya aka-adịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe ahụ, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị’ na Jerusalem. (Matiu 24:21) Jisọs kwukwasịrị: “Ọ bụrụkwa na e meghị ụbọchị ahụ ka ha dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta mmadụ ọ bụla: ma n’ihi ndị a họpụtara a ga-eme ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi.” (Matiu 24:22) Gịnị ka nke ahụ pụtara mgbe ahụ, gịnịkwa ka ọ pụtara ugbu a?

10. Olee otú anyị siburu kọwaa Matiu 24:22?

10 N’oge gara aga a kọwara na ‘mmadụ a ga-azọpụta’ zoro aka ná ndị Juu lanarịrị mkpagbu ahụ bịakwasịrị Jerusalem na 70 O.A. Ndị Kraịst agbalagala, ya mere Chineke pụrụ ikwe ka ndị Rom weta mbibi ngwa ngwa. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, n’ihi eziokwu bụ na “ndị a họpụtara” apụọla n’ihe ize ndụ, a pụrụ ime ka ụbọchị nke mkpagbu ahụ dị mkpirikpi, na-enye ohere ka a zọpụta ụfọdụ “mmadụ” bụ́ ndị Juu. E chere na ndị Juu ahụ lanarịrịnụ sere onyinyo ndị ga-alanarị oké mkpagbu ahụ na-abịa n’oge anyị.—Mkpugbe 7:14.

11. N’ihi gịnị ka o ji yie ka e kwesịrị ịtụleghachi nkọwa nke Matiu 24:22?

11 Ma nkọwa ahụ o kwekọrọ n’ihe merenụ na 70 O.A.? Jisọs sịrị na ‘a ga-azọpụta mmadụ’ pụọ ná mkpagbu ahụ. Ị̀ ga-eji okwu ahụ bụ́ ‘zọpụta’ eme ihe iji kọwaa 97,000 ahụ lanarịrịnụ, ebe ọ bụ na ọtụtụ puku n’ime ha nwụrụ n’oge na-adịghị anya n’ihi ịkwụ agụụ ma ọ bụ bụrụ ndị e gburu n’ebe a na-eme egwuregwu? Josephus na-ekwu banyere otu ebe a na-eme egwuregwu, na Sizaria, sị: “Ọnụ ọgụgụ nke ndị nwụrụ n’ọgụ ha na anụ ọhịa lụrụ ma ọ bụ n’ịlụsorịta onwe ha ọgụ ma ọ bụ site n’ịbụ ndị e suru ọkụ ná ndụ gafere 2,500.” Ọ bụ ezie na ha anwụghị ná mwakpo ahụ, a ‘zọpụtaghị’ ha ma ọlị. Jisọs ọ̀ ga-ewere ha dị ka ndị yiri ndị obi ụtọ lanarịrị “mkpagbu ukwu” ahụ na-abịanụ?

A Zọpụta Mmadụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?

12. Olee ndị bụ “ndị a họpụtaworo” nke narị afọ mbụ bụ́ ndị Chineke nwere mmasị na ha?

12 Ka ọ na-erule 70 O.A., Chineke elekwaghị ndị Juu anụ ahụ anya dị ka ndị ya ọ họọrọ. Jisọs gosiri na Chineke ajụwo mba ahụ, ọ ga-ekwekwa ka isi obodo ya, ụlọ nsọ, na usoro ofufe ya bịa ná njedebe. (Matiu 23:37–24:2) Chineke họọrọ mba ọhụrụ, Israel ime mmụọ. (Ọrụ 15:14; Ndị Rom 2:28, 29; Ndị Galetia 6:16) Ndị mejupụtara ya bụ ndị ikom na ndị inyom a họpụtara ná mba nile ma jiri mmụọ nsọ tee ha mmanụ. (Matiu 22:14; Jọn 15:19; Ọrụ 10:1, 2, 34, 35, 44, 45) Ụfọdụ afọ tupu mwakpo ahụ nke Cestius Gallus, Pita degaara “ndị a họpụtaworo dị ka ọmụma ihe Chineke buru ụzọ mara si dị, n’ime ido nsọ nke Mmụọ Nsọ” akwụkwọ. Ndị dị otú ahụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ bụ “ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ.” (1 Pita 1:1, 2; 2:9, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Chineke ga-akpọrọ ndị dị otú ahụ a họpụtaworo gaa n’eluigwe isoro Jisọs chịa.—Ndị Kọlọsi 1:1, 2; 3:12; Taịtọs 1:1; Mkpughe 17:14.

13. Echiche dị aṅaa ka okwu Jisọs na Matiu 24:22 pụrụ inweworị?

13 Mmata a a matara ndị ahụ a họpụtaworo na-enye aka, ebe Jisọs buru amụma na a ga-eme ka ụbọchị nke mkpagbu ahụ dị mkpirikpi “n’ihi ndị a họpụtara.” Okwu Grik nke a sụgharịrị “n’ihi” pụkwara ịbụ nke a sụgharịrị “maka.” (Mak 2:27; Jọn 12:30; 1 Ndị Kọrint 8:11; 9:10, 23; 11:9; 2 Timoti 2:10; Mkpughe 2:3, NW) Ya mere Jisọs pụrụ ịdị na-asị, ‘Ọ bụrụkwa na e meghị ụbọchị ahụ ka ha dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta mmadụ ọ bụla; ma maka ndị a họpụtara a ga-eme ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi.’c (Matiu 24:22) Ò nwere ihe merenụ nke bara uru nye ma ọ bụ bụ ‘maka’ ndị Kraịst a họpụtara bụ́ ndị e jichiri na Jerusalem?

14. Olee otú e si zọpụta “mmadụ” mgbe ndị agha Rom si na Jerusalem laghachi na 66 O.A. n’ụzọ a na-atụghị anya ya?

14 Cheta na na 66 O.A., ndị Rom gabigara ala ahụ, bichie elu elu Jerusalem, ma malite igwu ala n’okpuru mgbidi ya. Josephus na-ekwu, sị: “A sị nnọọ na ọ nọtụkwuru n’ịgba gburugburu ahụ ọ gaara emeri Obodo ahụ n’egbughị oge.” Jụọ onwe gị, sị, ‘N’ihi gịnị ka ndị agha Rom siri ike ji gbahapụ ibu agha ahụ na mberede, ma “n’ụzọ megidere izu” laghachi azụ?’ Rupert Furneaux, ọkà n’ịkọwa akụkọ ihe mere eme banyere agha, na-ekwu, sị: “O nweghị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke nyerela ihe zuru ezu kpatara mkpebi na-eju anya nke wetara ọdachi nke Gallus mere.” N’agbanyeghị ihe kpatara ya, mmetụta ya bụ na e mere ka mkpagbu ahụ dị mkpirikpi. Ndị Rom laghachiri azụ, ndị Juu ewee na-ebuso ha agha ka ha na-aga. Gịnị banyere ndị Kraịst e tere mmanụ “a họpụtaworo” bụ́ ndị e jibidoworo? Nkwụsị nke mwakpo ahụ pụtara na a zọpụtara ha pụọ n’ogbugbu ọ bụla nke yiri ha egwu n’oge mkpagbu ahụ. N’ihi ya, ndị Kraịst ahụ riteworo uru ná mkpagbu ahụ e mere ka ọ dị mkpirikpi na 66 O.A. bụ “mmadụ” ndị ahụ a zọpụtara ndị a kpọtụrụ aha na Matiu 24:22.

Gịnị Ka Ọdịnihu Gị Ga-abụ?

15. N’ihi gịnị ka ị pụrụ iji kwuo na Matiu isi nke 24 kwesịrị ịdọrọ mmasị anyị karịsịa n’oge anyị?

15 Mmadụ pụrụ ịjụ, sị, ‘N’ihi gịnị ka m kwesịrị iji nwee mmasị karịsịa ná nghọta nke okwu Jisọs a e mere ka o doo anya?’ E nwere ihe zuru ezu mere a ga-eji ekwubi na amụma Jisọs ga-enwe mmezu ka ukwuu, gabiga ihe mere n’oge dịrị ruo na ma gụnye 70 O.A.d (Tụlee Matiu 24:7; Luk 21:10, 11; Mkpughe 6:2-8.) Ruo ọtụtụ iri afọ, Ndịàmà Jehova ekwusawo na mmezu ya bụ isi nke na-eme n’oge anyị na-egosi na anyị pụrụ ịtụ anya “mkpagbu ukwu” buru ibu dị nnọọ n’ihu. N’oge ọ ga na-eme, olee otú a ga-esi emezu okwu amụma ndị ahụ dị na Matiu 24:22?

16. Eziokwu dị aṅaa na-agba ume ka Mkpughe na-enye banyere oké mkpagbu ahụ na-abịanụ?

16 Ihe dị ka iri afọ abụọ mgbe mkpagbu Jerusalem ahụ gasịrị, Jọn onyeozi dere akwụkwọ Mkpughe. Ọ kwadoro na oké mkpagbu ahụ dị n’ihu. Ọzọ, ịbụ ndị nwere mmasị n’ihe na-emetụta anyị n’onwe anyị, anyị pụrụ inwe ahụ efe ịmara na Mkpughe na-emesi anyị obi ike n’ụzọ amụma na mmadụ ga-adị ndụ gabiga oké mkpagbu a na-abịanụ. Jọn buru amụma “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” Hà bụ ndị ole? Otu olu sitere n’eluigwe na-aza, sị: “Ndị a bụ ndị na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta.” (Mkpughe 7:9, 14) Ee, ha ga-abụ ndị lanarịrịnụ! Mkpughe na-emekwa ka anyị ghọta otú ihe ga-esi mee n’oké mkpagbu ahụ na-abịanụ na otú Matiu 24:22 ga-esi mezuo.

17. Akụkụ mmalite nke mkpagbu ukwu ahụ ga-agụnye gịnị?

17 Akụkụ mmalite nke mkpagbu a ga-abụ ibuso akwụna ihe atụ nke a kpọrọ “Babilọn Ukwu ahụ” agha. (Mkpughe 14:8; 17:1, 2) Ọ na-anọchite anya alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, na-enwe Krisendọm dị ka nke a ga-ata ụta karịsịa. Dị ka okwu ndị dị ná Mkpughe 17:16-18 si kwuo, Chineke ga-etinye ya n’obi ndị ọchịchị ịwakpo nwanyị ihe atụ a na-akwa iko.e Cheedị echiche ihe ọ pụrụ ịdị ka ya nye “ndị a họpụtaworo” e tere mmanụ nke Chineke nakwa ndị òtù ha, bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ. Ka mwakpo a na-ebibi ihe a wakporo okpukpe na-aga n’ihu, ọ pụrụ iyi ka ọ ga-ekpochapụ nzukọ okpukpe nile, tinyere ndị Jehova.

18. N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji yie ka ọ dịghị “mmadụ” ọ bụla a ga-azọpụta gabiga akụkụ mmalite nke mkpagbu ukwu ahụ?

18 Nke a bụ mgbe okwu Jisọs dị na Matiu 24:22 ga-emezu n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu. Dị ka ndị a họpụtara na Jerusalem yiri ndị nọ n’ihe ize ndụ, ndị ohu Jehova pụrụ iyi ndị nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e kpochapụrụ n’oge mwakpo a ga-awakpo okpukpe, dị ka a ga-asị na mwakpo ahụ ga-ekpochapụ “mmadụ” bụ́ ndị Chineke. Ma, ka anyị buru n’uche ihe merenụ laa azụ na 66 O.A. E mere ka mkpagbu nke ndị Rom kpatara dị mkpirikpi, na-enye ndị Chineke e tere mmanụ bụ́ ndị a họpụtara ohere zuru ezu ịlanarị ma nọgide ndụ. Otú a, anyị pụrụ inwe obi ike na a gaghị ekwe ka mwakpo ahụ na-ebibi ihe nke a ga-awakpo okpukpe gbuchapụ ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke ndị na-efe ezi ofufe. Ọ ga-aga ngwa ngwa, dị ka ọ bụ “n’otu ụbọchị.” Otú ọ dị, n’ụzọ ụfọdụ, a ga-eme ka ọ dị mkpirikpi, a gaghị ekwe ka o mezuo nzube ya, ka e wee nwee ike ‘ịzọpụta’ ndị Chineke.—Mkpughe 18:8.

19. (a) Mgbe akụkụ mbụ nke mkpagbu ukwu ahụ gasịrị, gịnị ga-apụta ìhè? (b) Na gịnị ka nke a ga-eduje?

19 Akụkụ ndị ọzọ nke nzukọ elu ala nke Setan bụ́ Ekwensu ga-anọgide ruo nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị, na-eru újú mfu nke mmekọrịta ha na ndị okpukpe bụ enyi ha ochie. (Mkpughe 18:9-19) N’otu oge, ha ga-ahụta na ezi ndị ohu Chineke fọdụrụ, “ndị nọ ná ntụkwasị obi, ha nile bi n’ebe na-enweghị mgbidi” ma yie ndị a pụrụ ijide n’ụzọ dị mfe. Lee ihe ijuanya ha ga-enweta! N’imeghachi omume nye mwakpo e mere n’ezie ma ọ bụ nke e yiri egwu ime megide ndị ohu ya, Chineke ga-ebili n’ikpe megide ndị iro ya n’akụkụ ikpeazụ nke oké mkpagbu ahụ.—Ezikiel 38:10-12, 14, 18-23.

20. N’ihi gịnị ka akụkụ nke abụọ nke mkpagbu ukwu ahụ na-agaghị eji tinye ndị Chineke n’ihe ize ndụ?

20 Akụkụ nke abụọ a nke oké mkpagbu ahụ ga-eyi ihe mere Jerusalem na ndị bi n’ime ya ná mwakpo nke abụọ nke ndị Rom na 70 O.A. Ọ ga-abụ “mkpagbu ukwu . . . nke ihe dị ka ya aka-adịghị ná mmalite ụwa ruo [mgbe ahụ], ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” (Matiu 24:21) Otú ọ dị, obi pụrụ isi anyị ike na ndị Chineke họpụtara na ndị òtù ha agaghị anọ n’ógbè dị ize ndụ, n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e gburu. Oo, ha agaghị agbalaga n’otu ebe na mbara ala. Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ nọ na Jerusalem pụrụ ịgbalaga site n’obodo ahụ gaa n’akụkụ ebe ugwu, dị ka Pella n’ofe Jọdan. Otú ọ dị, n’ọdịnihu Ndịàmà Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi ga-anọ n’elu ụwa nile, ya mere nchebe agaghị adabere na mbara ala mmadụ nọ.

21. Ònye ga-alụ ọgụ n’ọgụ ikpeazụ ahụ, gịnịkwa ka ọ ga-arụpụta?

21 Mbibi ahụ agaghị abụ site n’aka ndị agha Rom ma ọ bụ òtù ọ bụla ọzọ nke ụmụ mmadụ. Kama nke ahụ, akwụkwọ Mkpughe na-akọwa ndị agha mbibi ahụ dị ka ndị si n’eluigwe. Ee, a ga-emezu akụkụ ikpeazụ nke mkpagbu ukwu ahụ, ọ bụghị site n’aka ndị agha ụmụ mmadụ, kama site ‘n’Okwu Chineke,’ Eze ahụ bụ́ Jisọs Kraịst, nke “usuu nile nke ndị agha ndị dị n’eluigwe” na-enyere aka, tinyere ndị Kraịst e tere mmanụ a kpọliteworo n’ọnwụ. “Eze kachasị ndị eze nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile” ga-emezu ihe e kpere n’ikpe dị nnọọ ukwuu karịa nke ndị Rom mere na 70 O.A. Ọ ga-ewepụ mmadụ nile na-emegide Chineke—ndị eze, ndị ọchịagha, ndị nweere onwe ha na ndị ohu, ndị nta ma ndị ukwu. Ọbụna nzukọ ụmụ mmadụ nke ụwa Setan ga-ezute ọgwụgwụ ha.—Mkpughe 2:26, 27; 17:14; 19:11-21; 1 Jọn 5:19.

22. N’echiche ọzọ dị aṅaa ka a ga-azọpụta “mmadụ”?

22 Cheta na “mmadụ,” ma ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ ma “oké ìgwè mmadụ” ahụ ga-abụworị ndị a zọpụtara mgbe Babilọn Ukwu ahụ ga-ada ngwa ngwa na kpam kpam n’akụkụ mbụ nke mkpagbu ahụ. N’otu aka ahụ n’akụkụ ikpeazụ nke mkpagbu ahụ, a ga-azọpụta “mmadụ” ndị gbalagara n’akụkụ Jehova. Lee otú nke a ga-esi dị iche n’ihe dabaara ndị Juu ahụ bụ́ ndị nnupụisi na 70 O.A.!

23. Na gịnị ka “mmadụ” ndị lanarịrịnụ pụrụ ilepụ anya?

23 Iche banyere ihe pụrụ ịbụ ọdịnihu gị na nke ndị ị hụrụ n’anya, rịba ama ihe e kwere ná nkwa ná Mkpughe 7:16, 17, sị: “Agụụ agaghị agụ ha ọzọ, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ ọzọ; anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ, ma ọ bụ okpomọkụ ọ bụla: n’ihi na Nwa atụrụ ahụ Nke nọ n’etiti ocheeze ahụ ga-azụ ha dị ka atụrụ, Ọ ga-edurukwa ha gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ: Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.” N’ezie, nke ahụ bụ ịbụ ndị ‘a zọpụtara’ n’echiche dị ebube, nke na-adịgide adịgide.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee Ụlọ Nche nke June 1, 1996, peji nke 14-19.

b Josephus na-asị: “Mgbe Titus banyere, ike obodo ahụ tụrụ ya n’anya . . . O tiri mkpu, sị: ‘Chineke anọnyeworo anyị; ọ bụ Chineke kwadara ndị Juu site n’ebe ndị a e wusiri ike; n’ihi na gịnị ka aka ma ọ bụ ngwá ọrụ mmadụ pụrụ ime megide ụdị ụlọ elu ndị ahụ?’”

c N’ụzọ na-akpali mmasị, ihe odide Shem-Tob nke Matiu 24:22 ji okwu Hibru ahụ bụ́ ʽa·vurʹ mee ihe, bụ́ nke pụtara “maka, n’ihi, iji mee ka.”—Lee isiokwu bu nke a ụzọ, peji nke 13.

d Lee Ụlọ Nche nke February 15, 1994, peji nke 11 na 12, na chaatị dị na peji nke 14 na 15, nke e depụtara na kọlụm nọdewere ibe ha nzaghachi amụma Jisọs dị na Matiu isi nke 24, Mak isi nke 13, na Luk isi nke 21.

e Lee Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, peji nke 235-258, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1994.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Akụkụ abụọ dị aṅaa ka e nwere banyere mwakpo ndị agha Rom wakporo Jerusalem?

◻ N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị yie ka 97,000 ndị Juu lanarịrịnụ na 70 O.A. mejupụtara “mmadụ” a kpọrọ aha na Matiu 24:22?

◻ Olee otú e si mee ka ụbọchị mkpagbu Jerusalem dị mkpirikpi, oleekwa otú e si si otú a zọpụta “mmadụ”?

◻ Ná mkpagbu ukwu na-abịanụ, olee otú a ga-esi mee ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi ma zọpụta “mmadụ”?

[Foto dị na peeji nke 16]

Mkpụrụ ego ndị Juu nke a kpụrụ mgbe nnupụisi ahụ gasịrị. Okwu Hibru e dere na ya na-asị “Afọ nke abụọ,” na-apụta 67 O.A., afọ nke abụọ nke inwere onwe ha

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Foto dị na peeji nke 17]

Mkpụrụ ego ndị Rom nke a kpụrụ na 71 O.A. N’aka ekpe bụ onye Rom ji ngwá agha; n’aka nri bụ nwanyị onye Juu na-eru újú. Okwu bụ́ “IVDAEA CAPTA” pụtara “Judia A Dọọrọ n’Agha”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya