“Gịnị Ga-abụkwa Ihe Ịrịba Ama nke Ọnụnọ Gị?”
“Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe nke a?”—MATIU 24:3, NW.
1, 2. Gịnị na-egosi na ndị mmadụ nwere mmasị n’ọdịnihu?
IHE ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ nwere mmasị n’ọdịnihu. Ì nwere? N’akwụkwọ ya bụ́ Future Shock, Professor Alvin Toffler rịbara ama “oké ịrị elu n’ọnụ ọgụgụ nke òtù ndị tinyere onwe ha n’ịmụ banyere ọdịnihu.” O kwukwara, sị: ‘Anyị ahụwo nkepụta nke òtù akpa uche dị iche iche ndị tụkwasịrị uche n’ihe banyere ọdịnihu; mpụta nke akwụkwọ dị iche iche na-ekwu banyere ọdịnihu n’England, France, Itali, Germany, na United States; mgbasa nke agụmakwụkwọ mahadum n’ịkọ ọdịnihu.’ Toffler kwubiri, sị: “Ma, ọ dịghị onye pụrụ ‘ịmara’ ọdịnihu n’echiche nke ịmata ihe nile.”
2 Akwụkwọ bụ́ Signs of Things to Come na-asị: “Ịgụ akara aka, ilegide nkume crystal anya, ịgụ kpakpando, ịgụ kaadị, I Ching bụcha ụzọ dị iche iche dị mgbagwoju anya n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche isi nye anyị nghọta ụfọdụ banyere ihe ọdịnihu anyị pụrụ iweta kpọmkwem.” Ma kama ichigharịkwuru ụzọ mmadụ, ọ ga-akara anyị mma ilega anya n’isi iyi a nwapụtaworo—bụ́ Jehova.
3. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ilegara Chineke anya maka ihe ọmụma maka ọdịnihu?
3 Ezi Chineke ahụ kwuru, sị: “Dị ka m cheworo, otú a ka ọ ga-adị; na dị ka m zubeworo, nke ahụ ga-eguzosi ike.” (Aịsaịa 14:24, 27; 42:9) Ee, Jehova enwewo ike izubere ihe a kpọrọ mmadụ ihe ga-eme, ọtụtụ mgbe na-eme nke a site n’ụmụ mmadụ na-ekwuchitere ya ọnụ. Otu n’ime ndị amụma a dere, sị: “Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na o kpugheghị izu nzuzo ya nye ndị ohu ya, bụ́ ndị amụma ya.—Emọs 3:7, 8; 2 Pita 1:20, 21.
4, 5. (a) N’ihi gịnị ka Jisọs pụrụ iji nye aka n’ihe banyere ọdịnihu? (b) Arịrịọ dị aṅaa metụtara ọtụtụ ihe ka ndị ozi ya rịọrọ?
4 Jisọs Kraịst bụ onye amụma kasị pụta ìhè nke Chineke. (Ndị Hibru 1:1, 2) Ka anyị lekwasị anya n’otu n’ime amụma ndị bụ isi nke Jisọs nke na-ebu amụma ihe ndị na-eme gburugburu anyị ugbu a. Amụma nke a na-enyekwa anyị nghọta n’ihe ga-eme n’isi nso ka usoro ihe ọjọọ dị ugbu a na-agwụsị, Chineke ejirikwa ụwa paradaịs dochie ya.
5 Jisọs nwapụtara na ya bụ onye amụma. (Mak 6:4; Luk 13:33; 24:19; Jọn 4:19; 6:14; 9:17) N’ihi ya, o kwere nghọta ihe mere ndị na-eso ụzọ ya, ka ha na ya nọ ọdụ n’elu Ugwu Olive ná ncherịta ihu Jerusalem, ga-eji jụọ ya banyere ọdịnihu: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe nke a?”—Matiu 24:3, NW; Mak 13:4.
6. Gịnị jikọrọ Matiu 24, Mak 13, na Luk 21; ajụjụ dị aṅaa kwesịkwara ịmasị anyị nke ukwuu?
6 Ị ga-ahụ ajụjụ ha na nzaghachi Jisọs na Matiu isi 24, Mak isi 13, na Luk isi 21.a N’ọtụtụ akụkụ ihe ndekọ ndị ahụ na-akwado ibe ha, ma ha eyighị onwe ya. Dị ka ihe atụ, nanị Luk kpọtụrụ uche ‘ajọ ọrịa na-efe efe n’ebe dị iche iche.’ (Luk 21:10, 11; Matiu 24:7; Mak 13:8) N’ụzọ ezi uche dị na ya, anyị kwesịrị ịjụ, Jisọs ọ̀ na-ebu amụma ihe ndị ga-eme nanị n’oge ndụ ndị na-ege ya ntị, ka ọ̀ gụnyere oge anyị na ihe ọdịnihu ga-abụrụ anyị?
Ndị Ozi ahụ Chọrọ Ịmara
7. Gịnị kpọmkwem ka ndị ozi ahụ jụrụ banyere ya, ma olee ọ̀tụ̀tụ̀ nke nzaghachi Jisọs?
7 Nanị ụbọchị ole na ole tupu e gbuo ya, Jisọs kpọsara na Chineke ajụwo Jerusalem, isi obodo ndị Juu. A gaje ibibi obodo ukwu ahụ na ụlọ nsọ ya dị ebube. Mgbe ahụ ụfọdụ n’ime ndị ozi ya kwuru ka e nye ha ‘ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jisọs na nke ọgwụgwụ usoro ihe nke a.’ (Matiu 23:37–24:3) N’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya ha na-eche n’ụzọ bụ isi banyere usoro ihe ndị Juu na Jerusalem, n’ihi na ha aghọtaghị ọ̀tụ̀tụ̀ ihe dị n’ihu. Ma n’inye ha azịza, Jisọs lepụrụ anya gabiga ihe ndị mere ruo ma gụnyere afọ 70 O.A. mgbe ndị Rom bibiri Jerusalem.—Luk 19:11; Ọrụ 1:6, 7.
8. Gịnị bụ ụfọdụ n’ihe omume ndị Jisọs buru amụma ha?
8 Dị ka ị pụrụ ịgụ n’ihe ndekọ Oziọma atọ ahụ, Jisọs kwuru banyere mba ibili imegide mba ọzọ, alaeze ibili imegide alaeze ọzọ, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, ihe ndị dị egwu, na ihe ịrịba ama site n’eluigwe. N’afọ ndị dịrị n’agbata Jisọs inye ihe ịrịba ama ahụ (33 O.A.) na ime ka Jerusalem tọgbọrọ n’efu (66-70 O.A.), ndị amụma ụgha na Kraịst ụgha dị iche iche ga-ebili. Ndị Juu ga-akpagbu ndị Kraịst, bụ́ ndị na-ekwusa ozi Jisọs.
9. Olee otú amụma Jisọs si nwee mmezu na narị afọ mbụ O.A.?
9 Akụkụ ndị a nke ihe ịrịba ama ahụ mere n’ezie, ọbụna dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Flavius Josephus na-ekwu. Ọ na-ede na tupu ndị Rom awakpodị ha, ndị Mesaịa ụgha kpalitere nnupụisi. E nwere ala ọma jijiji ndị dị oké njọ na Judia na n’ebe ndị ọzọ. Agha tiwapụrụ n’akụkụ dị iche iche nke Alaeze Ukwu Rom. È nwere ụnwụ nri ndị buru ibu? Ee, n’ezie. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 11:27-30.) Gịnị banyere ọrụ nkwusa Alaeze ahụ? Ka ọ na-erule 60 ma ọ bụ 61 O.A., mgbe e dere akwụkwọ Ndị Kọlọsi, a nụwo ‘olileanya nke ozi ọma ahụ’ nke Alaeze Chineke n’ụzọ sara mbara n’Africa, Esia, na Europe.b—Ndị Kọlọsi 1:23.
“MGBE AHỤ” Ọgwụgwụ
10. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji rịba okwu Grik bụ́ toʹte ama, gịnịkwa ka ọ na-egosi?
10 N’akụkụ ụfọdụ, Jisọs kọrọ ihe ndị ga-eme dị ka ha na-eme n’usoro. Ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe . . . , mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” Bible ndị dị n’asụsụ Bekee na-ejikarị “mgbe ahụ” eme ihe inye nghọta dị mfe nke “ya mere” ma ọ bụ “ma.” (Mak 4:15, 17; 13:23) Otú ọ dị, na Matiu 24:14, “mgbe ahụ” dabeere ná nkọwa ngwaa Grik bụ́ toʹte.c Ndị ọkachamara n’asụsụ Grik na-akọwa na toʹte bụ “nkọwa ngwaa na-ekwu oge” e ji “ekwu ihe na-esote n’oge” ma ọ bụ “ekwu ihe ọzọ ga-eme.” Otú a, Jisọs buru amụma na a ga-enwe nkwusa nke Alaeze ahụ, mgbe ahụ kwa (‘nke ahụ gasịa’ ma ọ bụ ‘e mesịa’) “ọgwụgwụ” ahụ ga-abịa. Kedụ ọgwụgwụ a na-ekwu?
11. Olee otú Jisọs si lekwasị anya n’ihe omume ndị e jikọrọ kpọmkwem ha na mbibi Jerusalem?
11 A pụrụ ịhụ otu mmezu nke amụma Jisọs n’ihe omume ndị dugara n’ọgwụgwụ usoro ihe ndị Juu. Ọtụtụ agha, ala ọma jijiji, ụnwụ nri, na ihe ndị ọzọ, Jisọs buru amụma ha mere n’ime oge were iri afọ atọ. Ma na-amalite na Matiu 24:15, Mak 13:14, na Luk 21:20, anyị na-agụ banyere ihe metụtara kpọmkwem mbibi na-eru nso, mgbe ọgwụgwụ dị nnọọ n’ọnụ ụzọ.—Rịba ama ahịrị ahụ e suru kpọm kpọm na chaatị ahụ.
12. Olee otú e si gụnye ndị agha Rom ná mmezu nke Matiu 24:15?
12 N’ịzaghachị otu nnupụisi nke ndị Juu na 66 O.A., ndị Rom n’okpuru Cestius Gallus zọọrọ ije megide Jerusalem, na-agba obodo ukwu a nke ndị Juu lere anya dị ka nke dị nsọ, gburugburu. (Matiu 5:35) N’agbanyeghị na ndị Juu lụgwaara ọgụ, ndị Rom ji ike banye n’obodo ukwu ahụ. Ha si otú a malite ‘iguzo n’ebe nsọ,’ dị ka Jisọs buru ụzọ kwuo na Matiu 24:15 na Mak 13:14. Mgbe ahụ ihe ịtụnanya mere. Ọ bụ ezie na ha agbawo obodo ukwu ahụ gburugburu, ndị Rom lara azụ na mberede. Ndị Kraịst hụtara ozugbo mmezu nke amụma Jisọs, nlaghachi azụ ahụ nyekwara ha ohere ịgbapụ site na Judia gaa n’ugwu ndị dị n’ofe Jọdan. Akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ha mere otú ahụ.
13. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ji nwee ike ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Jisọs ka ha gbapụ?
13 Ma ọ bụrụ na ndị Rom lara azụ site na gburugburu Jerusalem, n’ihi gịnị ka ọ ga-eji dị onye ọ bụla mkpa ịgbapụ? Okwu ndị Jisọs kwuru gosiri na ihe meworo nwapụtara ‘na ịtọgbọrọ n’efu nke Jerusalem dị nsọ.’ (Luk 21:20) Ee, ịtọgbọrọ n’efu. O buru amụma ‘mkpagbu ukwu nke ihe dị ka ya a ka adịghị site ná mmalite, ọ gaghị adịkwa ọzọ.’ Ihe dị ka afọ atọ na ọkara n’ihu, na 70 O.A., Jerusalem n’ezie nwetara ahụmahụ “mkpagbu ukwu” site n’aka ndị agha Rom n’okpuru Ọchịagha Taịtọs. (Matiu 24:21; Mak 13:19) Ma, n’ihi gịnị ka Jisọs ga-eji kọwaa nke a dị ka mkpagbu ka nke ọ bụla bu ya ụzọ ma ọ bụ nke e nweworo ruo mgbe ahụ, ukwuu?
14. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ihe mere Jerusalem na 70 O.A. bụ “mkpagbu ukwu” nke ihe dị ka ya a ka adịghị tupu ya, o mebeghịkwa kemgbe ahụ?
14 Ndị Babilọn kụkpọsịrị Jerusalem na 607 T.O.A., obodo ukwu ahụ ahụwokwa ọgụ ndị dị ụjọ n’ime narị afọ anyị nke a. Ma ihe mere na 70 O.A. bụ mkpagbu ukwu pụrụ iche. N’agha were ihe dị ka ọnwa ise, ndị agha Rom meriri ndị Juu. Ha gburu ihe dị ka 1,100,000 mmadụ ma dọrọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 100,000 laa n’agha. Ọzọkwa, ndị Rom tikpọrọ Jerusalem. Nke a nwapụtara na usoro ihe ndị Juu nke ofufe a nwapụtara anwapụta na mbụ bụ́ nke nwere isi ọnọdụ ya n’ụlọ nsọ ahụ agwụwo kpam kpam. (Ndị Hibru 1:2) Ee, ile ihe ndị mere na 70 O.A. anya n’ụzọ ziri ezi dị ka ‘mkpagbu nke ihe dị ka ha a ka adịghị [n’obodo ukwu, mba, na usoro ihe ahụ] site ná mmalite ụwa, ee e, ọ gaghị adịkwa ọzọ.’—Matiu 24:21.d
Dị ka E Buru Amụma Ya, Ihe Kanụ Ka Ga-abịa
15. (a) Jisọs buru amụma ihe omume ndị dị aṅaa ịbịa mgbe mbibi Jerusalem gasịrị? (b) N’ihi Matiu 24:23-28, gịnị ka anyị na-aghaghị ikwubi banyere mmezu nke amụma Jisọs?
15 Otú ọ dị, Jisọs akparaghị amụma ya ókè nye mkpagbu nke narị afọ mbụ ahụ. Bible na-egosi na ihe kanụ gaje isochi mkpagbu ahụ, dị ka a tụrụ aro ya site n’iji toʹte, ma ọ bụ “mgbe ahụ,” mee ihe na Matiu 24:23 na Mak 13:21. Gịnị ga-ebilite n’oge na-esote 70 O.A.? Mgbe mkpagbu ahụ n’ahụ usoro ihe ndị Juu gasịrị, ọtụtụ kraịst ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta. (Jiri Mak 13:6 tụnyere 13:21-23.) Akụkọ ihe mere eme na-eme ka o doo anya na ndị dị otú ahụ ebilitewo n’ọtụtụ narị afọ na-agafenụ eri mbibi Jerusalem na 70 O.A., ọ bụ ezie na ha eduhiebeghị ndị nwere ọhụhụ ụzọ dị nkọ n’ụzọ ime mmụọ, ndị nọwokwara na-elepụ anya maka “ọnụnọ” Kraịst. (Matiu 24:27, 28) Ka o sina dị, ihe ndị a mere mgbe mkpagbu ukwu nke 70 O.A. gasịrị bụ otu ihe na-egosi na Jisọs na-ele anya gabiga mkpagbu ahụ, nke bụ nanị mmezu nke mbụ.
16. Luk 21:24 na-etinye akụkụ dị aṅaa n’amụma Jisọs, gịnịkwa ka nke ahụ pụtara?
16 Ọ bụrụ na anyị ejiri Matiu 24:15-28 na Mak 13:14-23 tụnyere Luk 21:20-24, anyị ga-ahụ ihe nke abụọ na-egosi na amụma Jisọs gabigara mbibi Jerusalem. Cheta na nanị Luk kpọtụrụ ọrịa dị iche iche na-efe efe aha. N’otu aka ahụ, nanị ya mechiri akụkụ nke a site n’okwu ndị a nke Jisọs: “Ndị mba ọzọ ga-azọda Jerusalem n’ala, ruo mgbe oge nke mba ọzọ [“oge ndị Jentaịl,” King James Version] ga-emezu.”e (Luk 21:24) Ndị Babilọn wepụrụ eze ikpeazụ nke ndị Juu na 607 T.O.A., mgbe nke ahụ gasịkwara, Jerusalem, nke na-anọchite anya Alaeze Chineke, bụ nke a zọdara n’ala. (2 Ndị Eze 25:1-26; 1 Ihe Emere 29:23; Ezikiel 21:25-27) Na Luk 21:24, Jisọs gosiri na ọnọdụ ahụ ga-adịgide banye n’ọdịnihu ruo mgbe oge ruru ka Chineke guzobeghachi Alaeze ọzọ.
17. Ihe nke atọ dị aṅaa nke na-egosi na amụma Jisọs ga-eru n’ọdịnihu dị anya ka anyị nwere?
17 Nke a bụ ihe nke atọ na-egosi na Jisọs na-atụkwa aka gaa ná mmezu dị anya. Dị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, Mesaịa ahụ gaje ịnwụ, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ, nke ọ ga-anọdụ ala n’aka nri Chineke ma nke ahụ gasịa ruo mgbe Nna ya zipụrụ ya ịga nwee mmeri. (Abụ Ọma 110:1, 2) Jisọs kpọtụrụ uche na ya ịbụ onye ga-anọdụ ala n’aka nri Nna ya. (Mak 14:62) Pọl onyeozi mesikwara ya ike na Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilite nọ n’aka nri Jehova na-echere oge mgbe ọ ga-aghọ Eze na Onye Na-emezu Ihe Chineke Kpere n’Ikpe.—Ndị Rom 8:34; Ndị Kọlọsi 3:1; Ndị Hibru 10:12, 13.
18, 19. Olee otú Mkpughe 6:2-8 si daba n’amụma dị ka ya n’Oziọma ndị ahụ?
18 Dị ka ihe nke anọ na nke ikpeazụ na-egosi na amụma Jisọs banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe a nwere mmetụta gabiga narị afọ mbụ ahụ, anyị pụrụ ịsapeta Mkpughe isi nke 6. Ka ọ na-ede ihe ọtụtụ iri afọ mgbe 70 O.A. gasịrị, Jọn onyeozi kọwara ọnọdụ na-adọrọ mmasị nke ndị ịnyịnya na-arụsi ọrụ ike. (Mkpughe 6:2-8) Nlepụ anya nke a n’ụzọ amụma gaa “n’ụbọchị Onyenwe anyị”—ụbọchị nke ọnụnọ ya—na-egosipụta narị afọ nke 20 anyị dị ka oge dị ịrịba ama nke ibu agha (amaokwu nke 4), ụnwụ nri gbasapụrụ agbasapụ (amaokwu nke 5 na 6), na “ọnwụ” (amaokwu nke 8). N’ụzọ doro anya, nke a kwekọrọ n’ihe Jisọs kwuru n’Oziọma ndị ahụ ma na-anwapụta na amụma ya nwere mmezu ka ukwuu “n’ụbọchị Onyenwe anyị” nke a.—Mkpughe 1:10.
19 Ndị maara ihe a na-akọ matara na ihe ịrịba ama ahụ ọtụtụ ihe mejupụtara nke e buru n’amụma na Matiu 24:7-14 na Mkpughe 6:2-8 apụtawo ìhè kemgbe ntiwapụ mbụ nke agha ụwa na 1914. Ndịàmà Jehova akpọsawo gburugburu ụwa na amụma Jisọs na-enwe ugbu a mmezu ya nke abụọ na nke ka ukwuu, dị ka agha obi ọjọọ dị iche iche, ala ọma jijiji ndị na-ebibisị ihe, ụnwụ nri ndị na-akpata ọdachi, na ọrịa jupụtara ebe nile, na-agba àmà ya. Na nke ikpeazụ a, akwụkwọ U.S.News & World Report (July 27, 1992) sịrị: “Ntiwapụ ọrịa AIDS . . . na-eduga ọtụtụ nde ndị o jidere n’ọnwụ ha, ọ pụkwara n’isi nso ịghọ ihe otiti na-akpata ọdachi nke kasị na-efu ihe ma na-akpatakarị ọdachi n’akụkọ ihe mere eme. Ọrịa Ọnwụ Ojii ahụ gburu ihe dị ka 25 nde mkpụrụ obi ndị tara ahụhụ ya na narị afọ nke 14. Ma ka ọ na-erule afọ 2000, 30 nde mmadụ ruo 110 nde ga-ebute HIV, bụ́ nje nke na-akpata AIDS, rịa elu site na nde 12 ndị bu ya taa. N’enweghị ihe ngwọta ọ bụla, ha nile na-eche ọnwụ ihu n’ụzọ e ji n’aka.”
20. Gịnị ka mmezu mbụ nke Matiu 24:4-22 ga-agụnye, ma mmezu ọzọ dị aṅaa doro anya?
20 Mgbe ahụ, gịnị ka anyị ga-ekwubi banyere ụzọ Jisọs si zaa ajụjụ ndị ozi ahụ? Amụma ya kwuru n’izi ezi ihe ndị ga-eduga na ndị ga-agụnye mbibi Jerusalem, ọ kpọtụkwara ihe ụfọdụ ga-esochi 70 O.A. Ma ihe ka ukwuu na nke a gaje inwe mmezu nke abụọ na nke ka ukwuu n’ọdịnihu, na-eduga ná mkpagbu ukwu nke ga-eweta ọgwụgwụ nke usoro ihe ọjọọ dị ugbu a. Nke a pụtara na e mezuru amụma Jisọs na Matiu 24:4-22, nakwa ndị dị ka ya na Mak na Luk, malite na 33 O.A. gabiga mkpagbu nke 70 O.A. Ma, otu amaokwu ndị ahụ ga-enwe mmezu nke abụọ, nke ga-agụnye mkpagbu ka ukwuu n’ọdịnihu. Anyị na mmezu ahụ ka ukwuu nọ ugbu a; anyị pụrụ ịhụ ya kwa ụbọchị.f
Na-eduga na Gịnị?
21, 22. Olee ebe anyị na-achọta ihe amụma ndị na-egosi na ihe omume ndị ọzọ gaje ịbịa?
21 Jisọs emechighị amụma ya site n’ịkpọtụ ndị amụma ụgha na-eme ihe ịrịba ama nghọgbu dị iche iche n’ogologo oge ahụ tupu “mgbe oge nke mba ọzọ ga-emezu” aha. (Luk 21:24; Matiu 24:23-26; Mak 13:21-23) Ọ gara n’ihu ikwu banyere ihe ndị ọzọ na-akpata ijuanya ga-eme, ihe ndị a ga-ahụ gburugburu ụwa. A ga-ejikọta ihe ndị a na ọbịbịa nke Nwa nke mmadụ n’ike na ebube. Mak 13:24-27 bụ ihe atụ nke amụma ya na-aga n’ihu:
22 “Ma na mgbe ahụ, mgbe mkpagbu ahụ gasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya, kpakpando nile ga na-adakwa site n’eluigwe, a ga-emekwa ka ike nile nke dị n’eluigwe mee mkpatụ. Mgbe ahụ ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’igwe ojii nile n’oké ike na ebube. Mgbe ahụ Ọ ga-ezipụkwa ndị mmụọ ozi Ya, mee ka ndị nke Ya a họpụtara si n’ifufe anọ zukọọ, site ná nsọtụ ụwa ruo nsọtụ eluigwe.”
23. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji tụọ anya maka mmezu nke Matiu 24:29-31 ogologo oge mgbe narị afọ mbụ O.A. gasịrị?
23 Nwa nke mmadụ, Jisọs Kraịst a kpọlitere n’ọnwụ, abịaghị n’ụzọ ahụ pụtara ìhè mgbe ọgwụgwụ mbibi nke usoro ihe ndị Juu gasịrị na 70 O.A. N’ezie ebo nile nke ụwa amataghị ya, dị ka Matiu 24:30 rịbara ama, ndị mmụọ ozi nke eluigwe achịkọtaghịkwa ndị Kraịst nile e tere mmanụ mgbe ahụ site n’ụwa dum. Ya mere olee mgbe a ga-emezu akụkụ ọzọ nke a nke amụma Jisọs na-akpata ijuanya? À na-emezu ya n’ihe ndị na-eme gburugburu anyị ugbu a, ka, kama nke ahụ, ọ̀ na-enye nghọta si n’aka Chineke gaa n’ihe ndị anyị pụrụ ịtụ anya ha n’ọdịnihu dị nso? N’ezie anyị kwesịrị ịchọ ịmata, n’ihi na Luk dekọrọ okwu ịdọ aka ná ntị Jisọs bụ́: “Mgbe ihe ndị a malitere ime, leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.”—Luk 21:28.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A pụrụ ịchọta akụkụ ụfọdụ nke isiakwụkwọ ndị a na chaatị dị na peji nke 14 na 15; akara ndị e suru kpọm kpọm na-egosi akụkụ ndị na-ekwu otu ihe.
b Maka ntụaka akụkọ ihe mere eme nke ihe ndị a merenụ, lee Ụlọ Nche nke February 1, 1971, peji nke 37-39.
c Toʹte pụtara ihe karịrị 80 ugboro na Matiu (ugboro 9 n’isi nke 24) na ugboro 15 n’akwụkwọ Luk. Mak jiri toʹte mee ihe nanị ugboro isii, ma anọ n’ime ndị a metụtara “ihe ịrịba ama” ahụ.
d Onye Britain na-ede akwụkwọ bụ́ Matthew Henry kwuru, sị: “Mbibi Jerusalem n’aka ndị Kaldea dị oké njọ, ma nke a karịrị ya. O yiri egwu ịbụ mgbukpọ nke . . . ndị Juu nile.”
e Ọtụtụ na-ahụ n’ihe ndekọ Luk nchegharị ihu mgbe Luk 21:24 gasịrị. Dr. Leon Morris na-arịba ama, sị: “Jisọs gara n’ihu ikwu banyere oge nke ndị Jentaịl. . . . N’echiche nke ọtụtụ ndị mmụta e chegharịrị ihu ugbu a gaa n’ọbịbịa nke Nwa nke mmadụ.” Professor R. Ginns na-ede, sị: “Ọbịbịa nke Nwa nke Mmadụ—(Mt 24:29-31; Mk 13:24-27). Ịkpọtụ ‘oge nke ndị Jentaịl’ aha na-enye okwu mmeghe maka isiokwu a; e mere ugbu a ka ihe [Luk] na-ele anya gabiga mkpọmkpọ ebe nke Jerusalem gaa n’ọdịnihu.”
f Professor Walter L. Liefeld na-ede, sị: “A pụrụ n’ezie iche na ihe ndị Jisọs buru amụma ha gụnyere akụkụ abụọ: (1) ihe ndị mere na A.D. 70 ndị metụtara ụlọ nsọ ahụ na (2) ndị ga-eme n’ọdịnihu dị anya, ndị a kọwara n’okwu ndị ka bụrụ nke apọkalips.” Okwu nkọwa ahụ nke J. R. Dummelow haziri na-asị: “Ọtụtụ n’ime oké ihe isi ike ndị e nwere n’oké nkwurịta okwu nke a na-apụ n’anya mgbe a ghọtara na Onyenwe anyị zoro aka n’ime ya ọ bụghị otu ihe omume kama abụọ, nakwa na nke mbụ bụ ihe atụ nke abụọ. . . . [Luk] 21:24 karịsịa, nke na-ekwu banyere ‘oge nke ndị Jentaịl,’ . . . na-eme ka e nwee oge doro anya n’etiti ọdịda Jerusalem na ọgwụgwụ nke ụwa.”
Ị̀ Na-echeta?
◻ Azịza Jisọs nye ajụjụ ahụ dị na Matiu 24:3 nwere mmezu dị aṅaa dugara na 70 O.A.?
◻ Olee otú ojiji e ji okwu ahụ bụ́ toʹte mee ihe si enyere anyị aka ịghọta amụma Jisọs?
◻ N’echiche dị aṅaa ka e nwere “mkpagbu ukwu” nke narị afọ mbụ, bụ́ nke ihe dị ka ya na-emebeghị na mbụ?
◻ Luk na-ezo aka n’akụkụ abụọ dị aṅaa nke amụma Jisọs, bụ́ ndị pụrụ iche na-emetụta anyị taa?
◻ Ihe ngosi ndị dị aṅaa na-atụ aka ná mmezu nke abụọ na nke ka ukwuu nke amụma ahụ dị na Matiu 24:4-22?
[Chaatị dị na peeji nke 14, 15]
4 “Jisọs wee zaa, sị ha, Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iduhie unu. 5 N’ihi na ọtụtụ mmadụ ga-abịa n’aha m, sị, Mụ onwe m bụ Kraịst ahụ; ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ. 6 Unu gaje ịnụ okwu agha dị iche iche na akụkọ agha dị iche iche: leenụ ka unu ghara ịtụ ụjọ: n’ihi na ihe ndị a aghaghị ịpụta; ma ọgwụgwụ ihe nile a ka-erughị.
7 “N’ihi na mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche. 8 Ma ihe ndị a nile bụ mmalite ihe mgbu.
9 “Mgbe ahụ ka ha ga-arara unu nye ná mkpagbu, ha ga-egbukwa unu: mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m. 10 Mgbe ahụ ka ọtụtụ mmadụ ga-amakwa n’ọnyà, rarakwa ibe ha nye, kpọọkwa ibe ha asị. 11 Ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-ebilikwa duhiekwa ọtụtụ mmadụ. 12 N’ihi na ihe na-emebi iwu ga-aba ụba, ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi. 13 Ma onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta. 14 A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.
------------------------------------------------------------------
15 “Ya mere, mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, nke e kwuru site n’ọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo n’ebe nsọ unu (onye na-agụ, ya tụgharịa uche), 16 mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu: 17 onye nọ n’elu ụlọ, ya ghara ịrịdata ịkwapụ ihe dị n’ụlọ ya: 18 onye nọkwa n’ubi, ya ghara ịlaghachi ịchịrị uwe ukwu ya. 19 Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime na ndị na-enye nwa ara na mgbe ahụ. 20 Ma kpeenụ ekpere ka mgbapụ unu ghara ịdị na mgbe oyi, ma ọ bụ n’ụbọchị izu ike: 21 n’ihi na mgbe ahụ ka mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya a ka adịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị. 22 Ọ bụrụkwa na e meghị ụbọchị ahụ ka ha dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta mmadụ ọ bụla: ma n’ihi ndị a họpụtara a ga-eme ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi.
------------------------------------------------------------------
23 “Mgbe ahụ ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-asị unu, Lee, Kraịst nọ n’ebe a, ma ọ bụ, N’ebe a; unu ekwela. 24 N’ihi na Kraịst ụgha dị iche iche na ndị amụma ụgha ga-ebili, gosikwa ihe ịrịba ama ukwu dị iche iche; iduhie ọbụna ndị a họpụtara, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. 25 Lee, agwawo m unu mgbe a ka emeghị ya. 26 Ya mere, ọ bụrụ na ha ga-asị unu, Lee, Ọ nọ n’ọhịa; unu apụla: Lee, Ọ nọ n’ime ụlọ; unu ekwela. 27 N’ihi na dị ka àmụ̀mà si n’Ọwụwa anyanwụ pụta, gosikwa onwe ya ruo Ọdịda anyanwụ; otú a ka [ọnụnọ, NW] Nwa nke mmadụ ga-adị. 28 Ebe ọ bụla ozu dị, n’ebe ahụ ka udele ga-ezukọ.
------------------------------------------------------------------
------------------------------------------------------------------
29 “Ma ngwa ngwa, mgbe mkpagbu mgbe ahụ gasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya, kpakpando nile ga-adakwa site n’eluigwe, a ga-emekwa ka ike nile nke eluigwe mee mkpatụ: 30 Mgbe ahụ ka ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụtakwa ìhè n’eluigwe: mgbe ahụ ka ebo nile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe n’ike na oké ebube. 31 Ọ ga-ewerekwa opì ukwu zipụ ndị mmụọ ozi Ya, ha ga-emekwa ka ndị nke Ya a họpụtara si n’ifufe anọ zukọọ, site n’otu nsọtụ eluigwe ruo nsọtụ ya ọzọ.”
5 “Ma Jisọs malitere ịsị ha, Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iduhie unu. 6 Ọtụtụ mmadụ ga-abịa n’aha m, sị, Mụ onwe m bụ Ya; ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ. 7 Ma mgbe ọ bụla unu ga-anụ okwu agha dị iche iche na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla ụjọ: ihe ndị a aghaghị ịpụta; ma ọgwụgwụ ihe nile a ka-erughị.
8 “N’ihi na mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: ala ọma jijiji ga-adị n’ebe dị iche iche; oké ụnwụ dị iche iche ga-adị: ihe ndị a bụ mmalite ihe mgbu.
9 “Ma unu onwe unu lezie anya n’onwe unu: n’ihi na ha ga-arara unu nye n’aka nnọkọ ikpe dị iche iche; n’ụlọ nzukọ dị iche iche ka a ga-apịakwa unu ihe; n’ihu ndị isi na ndị eze ka unu ga-eguzokwa n’ihi m, ịbụrụ ha àmà. 10 A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa ozi ọma nke m n’ihu mba nile. 11 Ma mgbe ọ bụla ha duuru unu jee ikpe, rarakwa unu nye, unu ebula ụzọ na-echegbu onwe unu okwu unu ga-ekwu: kama okwu ọ bụla a ga-enye unu n’oge hour ahụ, kwuenụ nke ahụ: n’ihi na ọ bụghị unu onwe unu na-ekwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ. 12 Nwanne ga-ararakwa nwanne ya nye n’aka ọnwụ, nna ga-ararakwa nwa ya nye; umụ ga-ebilikwa imegide ndị mụrụ ha, meekwa ka ha nwụọ ọnwụ. 13 Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m: ma onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.
------------------------------------------------------------------
14 “Ma mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, ka ọ na-eguzo n’ebe ọ na-ekwesịghị (onye na-agụ, ya tụgharịa uche), mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu: 15 Onye nọkwa n’elu ụlọ, ya ghara ịrịdata, ma ọ bụ ịba n’ime, ịkwapụ ihe ọ bụla n’ụlọ ya: 16 onye nọkwa n’ubi, ya ghara ịlaghachi ịchịrị uwe ya. 17 Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime na ndị na-enye nwa ara na mgbe ahụ. 18 Ma kpeenụ ekpere ka ọ ghara ịdị na mgbe oyi. 19 N’ihi na mgbe ahụ ga-abụ mkpagbu, nke aha mkpagbu dị otú a ka adịghị site ná mmalite okike ụwa nke Chineke kere ruo mgbe a, ọ gaghị adịkwa ma ọlị. 20 Ọ bụrụkwa na Onyenwe anyị emeghị ụbọchị ahụ ka ha dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta mmadụ ọ bụla: ma n’ihi ndị a họpụtara, ndị Ọ họpụtara, O mere ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi.
------------------------------------------------------------------
21 “Mgbe ahụ ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-asị unu, Lee, Kraịst nọ n’ebe a; ma ọ bụ, Lee, n’ebe ahụ; unu ekwela: 22 n’ihi na Kraịst ụgha dị iche iche na ndị amụma ụgha ga-ebili, gosikwa ihe ịrịba ama dị iche iche na ọrụ ebube dị iche iche, ka ha wee duhie ndị a họpụtara, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. 23 Ma unu onwe unu lezie anya: lee, agwawo m unu ihe nile mgbe a ka emeghị ha.
------------------------------------------------------------------
------------------------------------------------------------------
24 “Ma na mgbe ahụ, mgbe mkpagbu ahụ gasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwụ agaghị enyekwa ìhè ya, 25 kpakpando nile ga na-adakwa site n’eluigwe, a ga-emekwa ka ike nile nke dị n’eluigwe mee mkpatụ. 26 Mgbe ahụ ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’igwe ojii nile n’oké ike na ebube. 27 Mgbe ahụ Ọ ga-ezipụkwa ndị mmụọ ozi Ya, mee ka ndị nke Ya a họpụtara si n’ifufe anọ zukọọ, site ná nsọtụ ụwa ruo nsọtụ eluigwe.”
8 “O wee sị, Lezienụ anya ka a ghara iduhie unu: n’ihi na ọtụtụ mmadụ ga-abịa n’aha m, sị, Mụ onwe m bụ Ya; na, Oge ahụ dị nso: unu esola ha n’azụ. 9 Ma mgbe ọ bụla unu ga-anụ okwu agha dị iche iche na aghara dị iche iche, unu atụla ụjọ: n’ihi na ihe ndị a aghaghị ibu ụzọ pụta; ma ọgwụgwụ ihe nile adịghị eru ngwa ngwa.
10 “Mgbe ahụ Ọ sịrị ha, Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: 11 oké ala ọma jijiji ga-adịkwa, oké ụnwụ na ajọ ọrịa na efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche; ihe dị egwu na ihe ịrịba ama ukwu ga-adịkwa site n’eluigwe.
12 “Ma mgbe ihe ndị a nile a ka emeghị, ha ga-atụkwasị unu aka ha, sogbuokwa unu, na-arara unu nye n’aka ụlọ nzukọ na ụlọ mkpọrọ, n’ebe a na-edupụta unu gaa n’ihu ndị eze na ndị isi n’ihi aha m. 13 Ọ ga-aghọrọ unu àmà. 14 Ya mere, zubenụ n’obi unu, na unu agaghị ebu ụzọ tụgharịa uche otú unu ga-agọpụ onwe unu: 15 n’ihi na Mụ onwe m ga-enye unu ọnụ na amamihe, nke ndị nile na-emegide unu na-agaghị apụ iguzogide ma ọ bụ ikwugide okwu. 16 Ma ọbụna ndị mụrụ unu, na ụmụnne unu, na ndị ikwu unu, na ndị enyi unu, ga-arara unu nye; ha ga-emekwa ka ụfọdụ n’ime unu nwụọ ọnwụ. 17 Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m. 18 Ma otu agịrị isi agaghị esi n’isi unu laa n’iyi ma ọlị. 19 Ná ntachi obi unu unu ga-anata mkpụrụ obi unu.
------------------------------------------------------------------
20 “Ma mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso. 21 Mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu; ndị nọkwa n’etiti ya, ka ha si n’ime ya wezụga onwe ha; ndị nọkwa n’ala ọzọ, ka ha ghara ịba n’ime ya. 22 N’ihi na ndị a bụ ụbọchị mkpepụta, ka ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ wee mezuo. 23 Ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime na ndị na-enye nwa ara na mgbe ahụ; n’ihi na oké mkpa ga-adị n’ala nke a, iwe ga-adịkwara ndị Juu. 24 Ha ga-adakwa site n’ọnụ mmà agha, a ga-adọtakwa ha n’agha gaa ná mba nile:
------------------------------------------------------------------
ndị mba ọzọ ga-azọda Jerusalem n’ala, ruo mgbe oge nke mba ọzọ ga-emezu.
------------------------------------------------------------------
------------------------------------------------------------------
25 “Ihe ịrịba ama dị iche iche ga-adịkwa n’anyanwụ na ọnwa na kpakpando; n’elu ụwa ka mkpagbu nke mba dị iche iche ga-adịkwa, ndị nọ n’obi abụọ n’ihi mbigbọ nke oké osimiri na ebili mmiri; 26 mmadụ na-atụgbọ site n’egwu, sitekwa n’ile anya ihe na-abịakwasị n’elu ụwa dum mmadụ bi: n’ihi na a ga-eme ka ike nile nke eluigwe mee mkpatụ. 27 Mgbe ahụ ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’igwe ojii, Ya na ike na oké ebube. 28 Ma mgbe ihe ndị a malitere ime, leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.”
[Foto dị na peeji nke 10]
Mkpagbu e nwere na 70 O.A. bụ nke kasịnụ nke Jerusalem na usoro ihe ndị Juu nwetụworo ahụmahụ ya