Mgbapụ Maka Nchebe Tupu “Mkpagbu Ukwu” Ahụ
“Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu, . . . ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu.”—LUK 21:20, 21.
1. N’ihi gịnị ka mgbapụ ji dị ngwa nye ndị ka bụ akụkụ nke ụwa?
NYE mmadụ nile bụ akụkụ nke ụwa Setan, mgbapụ dị oké ngwa. Ọ bụrụ na a ga-ahapụ ha ndụ mgbe e hichapụrụ usoro ihe dị ugbu a n’elu ala, ha aghaghị inye ihe àmà doro anya na ha eguzosiwo ike n’akụkụ Jehova, na ha abụkwaghị akụkụ nke ụwa nke Setan bụ onye ọchịchị ya.—Jemes 4:4; 1 Jọn 2:17.
2, 3. Ajụjụ dịgasị aṅaa metụtara okwu Jisọs e dekọrọ na Matiu 24:15-22 ka anyị ga-atụle?
2 N’amụma ukwu ya banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a, Jisọs mesiri mkpa mgbapụ dị otú ahụ dị ike. Anyị na-atụle mgbe mgbe ihe e dekọrọ na Matiu 24:4-14; ma, ihe na-esochi ya dịkwa mkpa n’otu aka ahụ. Anyị na-agba gị ume imeghe Bible gị ugbu a ma gụọ amaokwu nke 15 ruo 22.
3 Gịnị ka amụma ahụ pụtara? Na narị afọ mbụ, gịnị bụ “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu”? Gịnị ka ọnụnọ ya “n’ebe nsọ” na-ese onyinyo ya? Gịnị ka ihe omume ahụ pụtara nye anyị?
“Onye Na-agụ, Ya Tụgharịa Uche”
4. (a) Gịnị ka Daniel 9:27 kwuru ga-esochi ọjụjụ ndị Juu jụrụ Mesaịa? (b) Mgbe a na-ezo aka na nke a, gịnị, ka ihe àmà na-egosi, mere Jisọs ji sị, “Onye na-agụ, ya tụgharịa uche”?
4 Rịba ama na Matiu 24:15 na Jisọs rụtụrụ aka n’ihe e dere n’akwụkwọ Daniel. N’isi nke 9 nke akwụkwọ ahụ bụ amụma nke kwuru maka ọbịbịa nke Mesaịa na ikpe a ga-emezu n’isi mba Juu ahụ n’ihi ịjụ ya. Akụkụ ikpeazụ nke amaokwu nke 27 na-asị: “Ọ bụkwa n’elu nku ihe arụ dị iche iche ka otu onye nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu ga-abịa.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọdịnala ndị Juu oge mbụ kọwara akụkụ ahụ nke amụma Daniel dị ka mmerụ Antiochus nke Anọ merụrụ ụlọ nsọ Jehova dị na Jerusalem na narị afọ nke abụọ T.O.A. Ma Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye na-agụ, ya tụgharịa uche.” Mmerụ Antiochus nke Anọ merụrụ ụlọ nsọ ahụ, n’agbanyeghị na ọ bụ ihe arụ n’ezie, arụpụtaghị ịtọgbọrọ n’efu—nke Jerusalem, nke ụlọ nsọ ahụ, ma ọ bụ nke mba Juu. Ya mere ihe àmà na-egosi na Jisọs na-adọ ndị na-ege ya ntị aka ná ntị na mmezu amụma a abụghị n’oge gara aga kama ọ ka dị n’ihu.
5. (a) Olee otú iji ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ tụnyere ibe ha si enyere anyị aka ịghọta “ihe arụ” nke narị afọ mbụ? (b) N’ihi gịnị ka Cestius Gallus ji chịrị usuu ndị agha Rom gbaga Jerusalem na 66 O.A.?
5 Gịnị bụ “ihe arụ” nke ha gaje ịtụ anya ya? O kwesịrị nrịba ama na ihe ndekọ Matiu na-asị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu . . . ka ọ na-eguzo n’ebe nsọ unu.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Otú ọ dị, ihe ndekọ ya na ya bụ otu na Luk 21:20 na-agụ, sị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Na 66 O.A., ndị Kraịst bi na Jerusalem hụrụ ihe Jisọs buru n’amụma. Ọtụtụ ihe omume gụnyere esemokwu n’etiti ndị Juu na ndị na-arụrụ ndị Rom ọrụ mere ka Jerusalem ghọọ ebe nnupụisi bara oké ụba megide Rom. Dị ka ihe si n’ime ya pụta, ime ihe ike tiwapụrụ na Judia nile, Sameria, Galili, Dekapọlis, na Finisia, ebe ugwu banye Siria, banye n’ebe ndịda Ijipt. Iji weghachitụ udo n’akụkụ ahụ nke Alaeze Ukwu Rom, Cestius Gallus si Siria chịrị ndị agha gbata na Jerusalem, bụ́ nke ndị Juu na-ekwu banyere ya dị ka “obodo nsọ” ha.—Nehemaịa 11:1; Aịsaịa 52:1.
6. Olee otú o si bụrụ eziokwu na “ihe arụ” nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu nọ “na-eguzo n’ebe nsọ”?
6 Ọ bụ omenala ka ndị agha Rom buru ọkọlọtọ, ma ọ bụ ákwà nkwụba, nke ha na-ewere dị ka ihe dị nsọ ma bụru nke ndị Juu na-ewere dị ka ihe ikpere arụsị. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, okwu Hibru a sụgharịrị “ihe arụ” n’akwụkwọ Daniel bụ ihe e ji mee ihe n’ụzọ bụ isi maka arụsị na ikpere arụsị.a (Deuterọnọmi 29:17) N’agbanyeghị mmegide site n’aka ndị Juu, ndị agha Rom bu ọkọlọtọ ikpere arụsị ha banye n’ime Jerusalem na November nke 66 O.A., ma malitezie igwu ala n’okpuru mgbidi ụlọ nsọ ahụ site n’ebe ugwu. E nweghị obi abụọ banyere ya—“ihe arụ” nke pụrụ ịkpata ịtọgbọrọ n’efu n’ụzọ zuru ezu nye Jerusalem “na-eguzo n’ebe nsọ”! Ma olee otú mmadụ ọ bụla pụrụ isi gbapụ?
Mgbapụ Dị Oké Ngwa!
7. Gịnị ka ndị agha Rom mere n’ụzọ a na-atụghị anya ya?
7 Na mberede, n’enweghịkwa nnọọ ihe ọ bụla kpatara ya dị ka mmadụ si ahụ ihe, mgbe o yiri ka ọ dị mfe imeri Jerusalem, ndị agha Rom laghachiri azụ. Ndị agha Juu na-emegide ọchịchị chụsoro ndị agha Rom ahụ na-alaghachi azụ nanị ruo Antipatris, ihe dị ka 50 kilomita site na Jerusalem. Mgbe ahụ ha laghachiri azụ. Mgbe ha laghachiri na Jerusalem, ha zukọtara n’ụlọ nsọ ahụ ime atụmatụ ụzọ ha ga-esi lụkwuo agha. E debara aha ndị ntorobịa iji mesikwuo ihe mgbochi ha ike nakwa maka ije ozi n’agha. Ndị Kraịst hà ga-etinye aka na nke a? Ọbụna ọ bụrụ na ha ezere ya, hà ka ga-anọ n’ógbè ahụ dị ize ndụ mgbe ndị Rom ga-alaghachi?
8. Ime ihe ngwa ngwa dị aṅaa ka ndị Kraịst mere ná nrubeisi nye okwu amụma nke Jisọs?
8 Ndị Kraịst nọ na Jerusalem nakwa na Judia nile mere ihe ozugbo n’ịdọ aka ná ntị amụma nke Jisọs Kraịst nyere wee gbapụ n’ógbè ahụ dị ize ndụ. Mgbapụ dị oké ngwa! Ka oge na-aga ha ruru n’ala ugwu ugwu, ebe ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ biri na Pella, n’ókèala Perea. Ndị naara ịdọ aka ná ntị Jisọs ejighị nzuzu laghachi azụ ịnwa ịzọpụta ihe onwunwe ha. (Tụlee Luk 14:33.) N’ịpụ n’okpuru ọnọdụ dị otú a, ndị inyom di ime na ndị na-enye nwa ara hụrụ ya n’ezie dị ka njem siri oké ike iji ụkwụ mee. Iwu mgbochi Ụbọchị Izu Ike egbochighị mgbapụ ha, ọ bụkwa ezie na oge oyi dị nso, ọ bịarutebeghị. N’oge na-adịghị anya ndị geworo ntị na ndụmọdụ Jisọs ịgbalaga ngwa ngwa nọ ná nchebe n’oge na-adịghị anya ná mpụga nke Jerusalem na Judia. Ndụ ha dabeere na nke a.—Tụlee Jemes 3:17.
9. Ruo ókè hà aṅaa ka ndị agha Rom laghachiri ọsọ ọsọ, gịnịkwa si n’ime ya pụta?
9 Kpọmkwem n’afọ na-esochi, na 67 O.A., ndị Rom maliteghachiri atụmatụ agha megide ndị Juu. E bu ụzọ merie Galili. N’afọ na-esonụ, e tisara Judia. Ka ọ na-erule 70 O.A., usuu ndị agha Rom gbara Jerusalem n’onwe ya gburugburu. (Luk 19:43) Ụkọ nri siwanyere oké ike. Ndị e jibidoro n’obodo ahụ busoro ibe ha iro. E gburu onye ọ bụla nwara ịgbapụ. Ahụmahụ ha nwere bụ, dị ka Jisọs kwuburu, “mkpagbu ukwu.”—Matiu 24:21.
10. Ọ bụrụ na anyị ejiri ntụgharị uche gụọ, gịnị ọzọ ka anyị ga-arịba ama?
10 Nke ahụ ò mezuru ihe Jisọs buworo n’amụma n’ụzọ zuru ezu? Ee e, ihe ndị ọzọ ka na-abịa. Ọ bụrụ na, dị ka Jisọs kwuru n’okwu ndụmọdụ, anyị ejiri ntụgharị uche gụọ Akwụkwọ Nsọ, anyị aghaghị ịrịba ama ihe ka dị n’ihu. Anyị ga-echemikwa echiche banyere ihe ọ pụtara ná ndụ anyị.
“Ihe Arụ” nke Oge A
11. N’akụkụ ihe odide abụọ ọzọ dị aṅaa ka Daniel zoro aka ‘n’ihe arụ,’ oge dịkwa aṅaa ka a na-atụle n’ebe ahụ?
11 Rịba ama na, tinyere ihe anyị hụworo na Daniel 9:27, e nwere, na Daniel 11:31 na 12:11, ntụaka n’ebe “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu” dị. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe atụ ikpeazụ ndị a ebe a na-ekwu banyere mbibi nke Jerusalem. N’ezie, ihe e kwuru na Daniel 12:11 pụtara nanị n’amaokwu abụọ mgbe a tụsịrị aka na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a.” (Daniel 12:9) Anyị anọwo na-ebi n’oge dị otú ahụ eri 1914. Ya mere ọ dị anyị mkpa ịmụrụ anya iji mata “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu” nke oge a, mgbe ahụkwa hụ na anyị si n’ógbè ahụ dị ize ndụ pụọ.
12, 13. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ịkọwa Njikọ Mba Nile dị ka “ihe arụ” nke oge a?
12 Gịnị bụ “ihe arụ” ahụ nke oge a? Ihe àmà na-atụ òtù Njikọ Mba Nile aka, nke malitere ọrụ na 1920, nwa oge mgbe ụwa banyesịrị n’oge ọgwụgwụ ya. Ma olee otú nke ahụ pụrụ isi bụrụ “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu”?
13 Cheta, e ji okwu Hibru maka “ihe arụ” mee ihe na Bible n’ụzọ bụ isi n’izo aka n’ebe arụsị na omume ikpere arụsị dị. È jiri Njikọ ahụ mere arụsị? N’ezie e ji ya! Ndị ụkọchukwu tinyere ya “n’ebe nsọ,” ndị na-eso ụzọ ha kwa gara n’ihu iji ịnụ ọkụ n’obi na-efe ya ofufe. Kansụl Mba Dum nke Chọọchị Nile nke Kraịst n’America kpọsara na Njikọ ahụ ga-abụ “ngosipụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Alaeze Chineke n’ụwa.” Nzukọ Ndị Ome Iwu nke United States natara ụba nke akwụkwọ ozi mberede site n’aka òtù okpukpe dị iche iche na-agwa ya ka ọ bịanye aka n’Ọgbụgba Ndụ nke Njikọ Mba Nile ahụ. Òtù izugbe nke ndị Baptist, Congregationalist, na Presbyterian na Britain toro ya dị ka “nanị ihe ọrụ e nwere nke a pụrụ iji weta [udo n’elu ala].”—Lee Mkpughe 13:14, 15.
14, 15. N’ụzọ dị aṅaa ka Njikọ ahụ na mgbe e mesịrị Mba Ndị Dị n’Otu si nọrọ “n’ebe nsọ”?
14 E guzobewo Alaeze Chineke nke Mesaịa ahụ n’eluigwe na 1914, ma mba nile agawo n’ihu ịlụ ọgụ maka ọbụbụeze nke onwe ha. (Abụ Ọma 2:1-6) Mgbe e mere atụmatụ maka Njikọ Mba Nile, mba ndị ka lụpụru ọgụ n’Agha Ụwa Mbụ, tinyere ndị ụkọchukwu gọziworo ndị agha ha, egosipụtaworị na ha ahapụwo iwu Chineke. Ha adịghị elegara Kraịst anya dị ka Eze. Ya mere ha kenyere òtù mmadụ ọrụ nke Alaeze Chineke; ha tinyere Njikọ Mba Nile “n’ebe nsọ,” ebe na-abụghị ọnọdụ ya.
15 Dị ka ihe nnọchianya nke Njikọ ahụ, Mba Ndị Dị n’Otu malitere ịdị n’October 24, 1945. Mgbe e mesịrị, ndị popu nke Rom toro Mba Ndị Dị n’Otu dị ka “olileanya ikpeazụ maka nkwekọrịta na udo” na “ebe kasị elu a pụrụ isi nweta udo na ikpe ziri ezi.” Ee, Njikọ Mba Nile, ya na ihe nnọchianya ya, bụ́ Mba Ndị Dị n’Otu, n’ezie ghọrọ arụsị, “ihe arụ” n’anya Chineke na n’anya ndị ya.
Gbapụ Site na Gịnị?
16. Site na gịnị ka ọ dị ndị hụrụ ezi omume n’anya mkpa ịgbapụ na ya taa?
16 Mgbe ‘a hụrụ’ nke a, mgbe a ghọtara ihe òtù mba nile ahụ bụ na ụzọ e si efe ya ofufe ka chi, ọ dị ndị hụrụ ezi omume n’anya mkpa ịgbapụ maka nchebe. Gbapụ site na gịnị? Site n’ihe ahụ nke Jerusalem na-ekwesịghị ntụkwasị obi sere onyinyo ya taa, ya bụ, Krisendọm, nakwa site na Babilọn Ukwu ahụ nile, usoro okpukpe ụgha nke zuru ụwa ọnụ.—Mkpughe 18:4.
17, 18. Ịtọgbọrọ n’efu dị aṅaa ka “ihe arụ” ahụ nke oge a ga-akpata?
17 Chetakwa na narị afọ mbụ, mgbe ndị agha Rom bu ọkọlọtọ ikpere arụsị ha banye n’ime obodo nsọ nke ndị Juu, ọ nọ n’ebe ahụ iweta ịtọgbọrọ n’efu n’isi Jerusalem na n’usoro ofufe ya. N’ụbọchị anyị ịtọgbọrọ n’efu ahụ ga-abịa, ọ bụghị nanị n’isi otu obodo, ma ọ bụ n’elu Krisendọm nanị, kama n’elu usoro okpukpe ụgha dum nke zuru ụwa ọnụ.—Mkpughe 18:5-8.
18 Dị ka e dekọrọ na Mkpughe 17:16, e buru n’amụma na otu anụ ọhịa ihe atụ nke na-acha uhie uhie, nke gosipụtaworo onwe ya ịbụ Mba Ndị Dị n’Otu, ga-echigharị megide Babilọn Ukwu ahụ nke dị ka nwanyị na-akwa iko ma jiri ime ihe ike bibie ya. N’iji okwu ndị doro anya mee ihe, ọ na-asị: “Mpi iri ahụ ị hụrụ, ha na anụ ọhịa ahụ, ndị a ga-akpọ nwanyị ahụ na-akwa iko asị, ha ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ.” Ihe nke a ga-apụta na-ebu isi ịtụgharị n’uche. Ọ ga-arụpụta ọgwụgwụ nke ụdị ọ bụla nke okpukpe ụgha n’akụkụ nile nke ụwa. Nke a ga-egosi n’ezie na mkpagbu ukwu ahụ amalitewo.
19. Ndị dị aṅaa ghọworo akụkụ nke Mba Ndị Dị n’Otu eri e guzobere ya, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji dị ịrịba ama?
19 Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na eri Mba Ndị Dị n’Otu malitere ọrụ na 1945, ndị na-ekweghị na Chineke, ndị na-emegide okpukpe abụwo ndị òtù ya pụtara ìhè. N’oge dị iche iche gbaa ụwa gburugburu, ndị òtù oké mgbanwe a abụrụwo ndị e ji mee ihe igbochi ihe omume okpukpe dị iche iche nke ukwuu ma ọ bụ machibido ha kpam kpam. Otú ọ dị, n’afọ ole na ole gara aga, e nwewo nkwụsịtụ n’ọtụtụ ebe ná nrụgide ọchịchị na-arụgide òtù okpukpe dị iche iche. Nye ụfọdụ ndị ọ pụrụ iyi ka ihe ize ndụ ọ bụla nye okpukpe adịkwaghị.
20. Ụdị aha dị aṅaa ka okpukpe nile nke ụwa mewooro onwe ha?
20 Okpukpe nile nke Babilọn Ukwu ahụ nọgidere na-abụ ike na-akpata oké mkpaghasị n’ụwa. Isiokwu akụkọ na-akọwapụta mgbe mgbe akụkụ dị iche iche na-alụ agha na òtù ndị na-eyi mmadụ egwu site n’ịkpọ aha okpukpe ha na-akwado. Ndị uwe ojii na-achịkwa ọgba aghara na ndị soja aghaghị ịchọ ụzọ banye n’ime ụlọ nsọ dị iche iche iji kwụsị ime ihe ike n’etiti òtù okpukpe ndị na-emegiderịta ibe ha. Òtù okpukpe dị iche iche akwadowo n’ụzọ ego oké mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ịkpọasị okpukpe emebiwo mgbalị Mba Ndị Dị n’Otu na-eme iji chebe mmekọrịta na-adịgide adịgide n’etiti ebo dị iche iche. N’ịchụso ihe mgbaru ọsọ nke udo na ịnọ ná ntụkwasị obi, ọ ga-amasị ndị ụfọdụ so ná Mba Ndị Dị n’Otu ịhụ ka e wepụrụ mmetụta ọ bụla nke okpukpe nke na-anọchiri ha ụzọ.
21. (a) Ònye ga-ekwu mgbe a ga-ebibi Babilọn Ukwu ahụ? (b) Gịnị ka ọ dị ngwa ime tupu mgbe ahụ?
21 E nwekwara ihe ọzọ dị mkpa a ga-atụle. Ọ bụ ezie na a ga-eji “mpi” ndị agha sitere ná Mba Ndị Dị n’Otu bibie Babilọn Ukwu ahụ, mbibi ahụ ga-abụ n’ezie ngosipụta nke ikpe Chineke. Mmezu ikpe ahụ ga-abịa n’oge Chineke kara aka. (Mkpughe 17:17) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ugbu a? “Sinụ n’ime ya pụta”—sinụ n’ime Babilọn Ukwu ahụ pụta—ka Bible na-aza.—Mkpughe 18:4.
22, 23. Gịnị ka mgbapụ dị otú ahụ gụnyere?
22 Mgbapụ nke a maka nchebe abụghị isi n’otu ebe kwaga n’ebe ọzọ, dị ka nke ahụ ndị Juu bụ́ ndị Kraịst mere mgbe ha gbahapụrụ Jerusalem. Ọ bụ mgbapụ site n’okpukpe ndị nke Krisendọm, ee, pụọ n’akụkụ ọ bụla nke Babilọn Ukwu ahụ. Ọ pụtara ikewapụ onwe onye kpam kpam, ọ bụghị nanị pụọ ná nzukọ okpukpe ụgha dị iche iche kamakwa site n’omenala na mmụọ ndị ha na-akwalite. Ọ bụ mgbapụ gaa n’ebe nchebe nke dị n’ime nzukọ ọchịchị Jehova.—Ndị Efesọs 5:7-11.
23 Mgbe mbụ ndị ohu Jehova e tere mmanụ chọpụtara ihe arụ nke oge a, Njikọ Mba Nile, mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, olee otú Ndịàmà ahụ si meghachi omume? Ha egbubiworị njikọ ha na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm. Ma ha ji nwayọọ nwayọọ chọpụta na ha ka na-arapara n’omenala na omume ụfọdụ nke Krisendọm, dị ka iji obe eme ihe na ime ememe Krismas na ụbọchị ezumike ndị ọzọ nke ndị ọgọ mmụọ. Mgbe ha mụtara eziokwu banyere ihe ndị a, ha mere ihe ngwa ngwa. Ha gere ntị na ndụmọdụ dị n’Aịsaịa 52:11: “Wezụganụ onwe unu, wezụganụ onwe unu, sinụ n’ebe ahụ pụọ, unu emetụla ihe rụrụ arụ [aka]: sinụ n’etiti ya pụọ: dịnụ ọcha, unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke Jehova.”
24. Karịsịa eri 1935, olee ndị sonyeworo ná mgbapụ ahụ?
24 Karịsịa site na 1935 gaa n’ihu, oké ìgwè na-aba ụba nke ndị ọzọ, ndị nakweere olileanya nke ibi ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala, malitere ime ihe yiri nke ahụ. Ha onwe ha kwa ‘ahụwo ihe arụ ahụ ka ọ na-eguzo n’ebe nsọ,’ ha ghọtakwara ihe ọ pụtara. Mgbe ha mere mkpebi ha ịgbapụ, ha emewo ka e wepụ aha ha n’akwụkwọ nsonye nke nzukọ ndị bụ akụkụ nke Babilọn Ukwu ahụ.—2 Ndị Kọrint 6:14-17.
25. Gịnị ka a chọrọ tụkwasị n’igbubi ihe ọ bụla nke pụrụ ijikọ mmadụ na okpukpe ụgha?
25 Otú ọ dị, isi na Krisendọm gbapụ gụnyere ihe karịrị nnọọ ịhapụ okpukpe ụgha. Ọ gụnyere ihe karịrị ịbịa nzukọ ole na ole n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ịpụta mee nkwusa nke ozi ọma ahụ otu ugbo ma ọ bụ abụọ kwa ọnwa n’ozi ubi. Mmadụ pụrụ ịnọ n’èzí Babilọn Ukwu ahụ n’ụzọ anụ ahụ, ma ọ̀ gbakụtawo ya azụ? Ò kewapụwo onwe ya n’ụwa nke Babilọn Ukwu ahụ bụ akụkụ ya gbara ọkpụrụkpụ? Ọ̀ ka na-arapara n’ihe ndị ahụ na-egosi mmụọ ya—mmụọ nke na-elelị ụkpụrụ ezi omume Chineke? Ọ̀ na-emeso ịdị ọcha nke mmekọahụ na ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye dị ka ihe na-adịghị mkpa? Ọ̀ na-emesi mmasị ndị nke onwe onye na nke ihe onwunwe ike karịa ihe ime mmụọ? Ọ gaghị ekwe ma ọlị ka e mee ka o yie ajọ usoro ihe a.—Matiu 6:24; 1 Pita 4:3, 4.
Ekwela Ihe Ọ Bụla Gbochie Mgbapụ Gị!
26. Gịnị ga-enyere anyị aka ọ bụghị nanị ịmalite mgbapụ ahụ kama inwe ihe ịga nke ọma n’iru n’ọgwụgwụ ya?
26 Ná mgbapụ anyị maka nchebe, ọ dị mkpa ka anyị ghara iji agụụ leghachi anya n’ihe ndị dị n’azụ. (Luk 9:62) Ọ dị anyị mkpa itinyesi uche na obi anyị ike n’Alaeze Chineke na ezi omume ya. Ànyị kpebisiri ike igosipụta okwukwe anyị site n’ibu ụzọ chọọ ihe ndị a, na-enwe obi ike na Jehova ga-agọzi ụdị ikwesị ntụkwasị obi dị otú ahụ? (Matiu 6:31-33) Obi ike anyị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ịkpali anyị ịgbaso ụzọ nke a ka anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-echere mpụta nke ihe omume ndị dị ịrịba ama n’ụwa.
27. Gịnị mere o ji dị mkpa ichesi echiche ike banyere ajụjụ ndị a jụrụ n’ebe a?
27 Mmezu nke ikpe Chineke ga-amalite ná mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ. A ga-ebibi alaeze nke okpukpe ụgha ahụ yiri nwanyị na-akwa iko. Oge ahụ dị oké nso! Gịnị ga-abụ ọnọdụ anyị n’otu n’otu mgbe oge ahụ dị oké mkpa rutere? Ná mmezu dị ebube nke mkpagbu ukwu ahụkwa, mgbe e bibisịrị ihe fọdụrụ n’ajọ usoro ihe Setan, olee akụkụ a ga-achọta anyị? Ọ bụrụ na anyị emee ihe a chọrọ ugbu a, nchebe anyị bụ ihe e ji n’aka. Jehova na-agwa anyị, sị: “Ma onye na-ege m ntị ga-ebi ná ntụkwasị obi.” (Ilu 1:33) Site n’iji ịnọgidesi ike n’ihe na ọṅụ na-ejere Jehova ozi n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a, anyị pụrụ iru eru ijere Jehova ozi ruo ebighị ebi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee Insight on the Scriptures, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, Mpịakọta 1, peji nke 634-635.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Gịnị bụ “ihe arụ” nke oge a?
◻ N’echiche dị aṅaa ka “ihe arụ . . . na-eguzo n’ebe nsọ”?
◻ Gịnị ka mgbapụ maka nchebe gụnyere ugbu a?
◻ Gịnị mere ime ihe dị otú ahụ ji dị oké ngwa?
[Foto dị na peeji nke 16]
Iji lanarị, ụmụazụ Jisọs aghaghị ịgbapụ n’egbughị oge