Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 5/1 p. 14-20
  • “Onye Na-agụ, Ya Tụgharịa Uche”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Onye Na-agụ, Ya Tụgharịa Uche”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ihe Arụ” nke Oge A
  • Mwakpo nke Ga-abịa n’Ọdịnihu
  • ‘Mgbalaga’—N’ụzọ Dị Aṅaa?
  • Mgbapụ Maka Nchebe Tupu “Mkpagbu Ukwu” Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • lhe Ịrịba Ama nke Mgbe lkpeazụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • “Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-eme?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 5/1 p. 14-20

“Onye Na-agụ, Ya Tụgharịa Uche”

“Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu . . . ka ọ na-eguzo n’ebe nsọ unu, . . . mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu.”—MATIU 24:15, 16.

1. Gịnị si n’ịdọ aka ná ntị ahụ Jisọs nyere nke a na-achọta na Luk 19:43, 44 pụta?

IME ka anyị mara banyere ọdachi na-abịanụ pụrụ ime ka anyị nwee ike izere ya. (Ilu 22:3) Ya mere chee banyere ọnọdụ ndị Kraịst nọ na ya n’ime Jerusalem mgbe mwakpo ndị Rom gasịrị na 66 O.A. Jisọs adọọla aka ná ntị na a ga-agba obodo ahụ gburugburu ma bibie ya. (Luk 19:43, 44) Ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu leghaara ya anya. Ma ndị na-eso ụzọ ya ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị ya. N’ihi ya, a zọpụtara ha site n’ọdachi nke 70 O.A.

2, 3. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’amụma Jisọs nke e dekọrọ na Matiu 24:15-21?

2 N’otu amụma nke metụtara anyị taa, Jisọs nyere ihe ịrịba ama ọtụtụ ihe mejupụtara nke gụnyere agha, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe, na mkpagbu nke ndị Kraịst na-ekwusa banyere Alaeze Chineke. (Matiu 24:4-14; Luk 21:10-19) Jisọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ga-enyere ha aka ịmara na ọgwụgwụ dị nso—‘ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu nke na-eguzo n’ebe nsọ.’ (Matiu 24:15) Ka anyị nyochaghachi okwu ndị ahụ bara uru iji hụ otú ha pụrụ isi metụta ndụ anyị ugbu a na n’ọdịnihu.

3 Mgbe o nyesịrị ihe ịrịba ama ahụ, Jisọs sịrị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, nke e kwuru site n’ọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo n’ebe nsọ unu (onye na-agụ, ya tụgharịa uche), mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu: onye nọ n’elu ụlọ, ya ghara ịrịdata ịkwapụ ihe dị n’ụlọ ya: onye nọkwa n’ubi, ya ghara ịlaghachi ịchịrị uwe ukwu ya. Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime na ndị na-enye nwa ara na mgbe ahụ. Ma kpeenụ ekpere ka mgbapụ unu ghara ịdị na mgbe oyi, ma ọ bụ n’ụbọchị izu ike: n’ihi na mgbe ahụ ka mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya aka-adịghị site ná mmalite ụwa.”—Matiu 24:15-21.

4. Gịnị na-egosi na Matiu 24:15 mezuru na narị afọ mbụ?

4 Ihe ndekọ Mak na Luk na-enye nkọwa ndị na-emejupụta ya. N’ebe Matiu ji “na-eguzo n’ebe nsọ unu” mee ihe, Mak 13:14 na-asị “na-eguzo n’ebe ọ na-ekwesịghị.” Luk 21:20 na-agbakwụnye okwu Jisọs bụ́: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso.” Nke a na-enyere anyị aka ịhụ na mmezu mbụ ya gụnyere mwakpo ndị Rom wakporo Jerusalem na ụlọ nsọ ya—ebe dị nsọ nye ndị Juu ma ọ bụghịzi ebe dị nsọ nye Jehova—nke malitere na 66 O.A. Ọ tọgbọọrọ n’efu kpam kpam mgbe ndị Rom bibiri ma obodo ahụ ma ụlọ nsọ ya na 70 O.A. Gịnị bụ “ihe arụ” ahụ laa azụ n’oge ahụ? Ò sikwa aṅaa ‘guzo n’ebe nsọ’? Azịza nye ajụjụ ndị a ga-enye aka ime ka mmezu ya nke oge a doo anya.

5, 6. (a) N’ihi gịnị ka ntụgharị uche ji dị ndị na-agụ Daniel isi 9 mkpa? (b) E si aṅaa mezuo amụma Jisọs buru banyere “ihe arụ” ahụ?

5 Jisọs gbara ndị na-agụ ihe ume ka ha tụgharịa uche. Ndị na-agụ gịnị? O yiri ka ọ bụ ndị na-agụ Daniel isi nke 9. N’ebe ahụ, anyị na-achọta amụma nke na-egosi mgbe Mesaịa ga-apụta, na-ebukwa amụma na a “ga-ebipụ” ya mgbe afọ atọ na nkera gasịrị. Amụma ahụ na-asị: “Ọ bụkwa n’elu nku ihe arụ dị iche iche ka otu onye nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu ga-abịa: ọ bụkwa ruo mgbe a ga-awụkwasị ngwụsị na ihe a kara aka n’ahụ onye ahụ na-akpata ịtọgbọrọ n’efu.”—Daniel 9:26, 27, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche; leekwa Daniel 11:31; 12:11.

6 Ndị Juu chere na nke a zoro aka ná mmerụ Antiochus nke Anọ merụrụ ụlọ nsọ ahụ n’ihe dị ka afọ 200 tupu mgbe ahụ. Otú ọ dị, Jisọs gosiri na ọ bụghị ya, na-agba ume ka a tụgharịa uche n’ihi na “ihe arụ” ahụ ka ga-apụta ma guzo “n’ebe nsọ.” Ihe àmà na-egosi na Jisọs na-ezo aka n’ebe usuu ndị agha Rom nọ bụ́ ndị ga-eji ọkọlọtọ e ji mara ha bịa na 66 O.A. Ọkọlọtọ dị otú ahụ, nke e ji na-eme ihe eri oge, fọrọ nke nta ka ha bụrụ arụsị, ha rụkwara arụ n’anya ndị Juu.a Ma, olee mgbe ha ‘ga-eguzo n’ebe nsọ’? Nke ahụ mere mgbe usuu ndị agha Rom ji ọkọlọtọ ha wakpoo Jerusalem na ụlọ nsọ ya, bụ́ nke ndị Juu weere dị ka ihe dị nsọ. Ndị Rom malitere ọbụna igwu ala n’okpuru mgbidi nke ógbè ụlọ nsọ ahụ. N’ezie, ihe bụworo ihe arụ eri oge guzo ugbu a n’ebe nsọ!—Aịsaịa 52:1; Matiu 4:5; 27:53; Ọrụ 6:13.

“Ihe Arụ” nke Oge A

7. Olee amụma Jisọs nke na-emezu n’oge anyị?

7 Kemgbe Agha Ụwa Mbụ, anyị ahụwo mmezu ka ukwuu nke ihe ịrịba ama Jisọs e dekọrọ na Matiu isi 24. Ma, cheta ihe ndị o kwuru: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu . . . ka ọ na-eguzo n’ebe nsọ unu, . . . mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu.” (Matiu 24:15, 16) Akụkụ a nke amụma ahụ aghaghị inwekwa mmezu n’oge anyị.

8. Ruo ọtụtụ afọ, gịnị ka Ndịàmà Jehova ghọtaworo ịbụ “ihe arụ” ahụ n’oge a?

8 N’igosipụta obi ike ndị ohu Jehova nwere na a ga-emezu amụma a, Ụlọ Nche (Bekee) nke January 1, 1921, lekwasịrị anya na ya n’ihe metụtara ihe ndị mere n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Mgbe nke ahụ gasịrị, ná mbipụta ya nke December 15, 1929, na peji nke 374, Ụlọ Nche (Bekee) kwuru hoo haa, sị: “Ọchịchọ nile nke Njikọ Mba Nile bụ ichigharị ndị mmadụ ihu pụọ n’ebe Chineke na Kraịst nọ, n’ihi ya kwa ọ bụ ihe na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, ihe sitere n’aka Setan, nakwa ihe arụ n’anya Chineke.” Ya mere na 1919 “ihe arụ” ahụ pụtara. Ka oge n’aga, Mba Ndị Dị n’Otu nọchiri Njikọ ahụ. Eri oge, Ndịàmà Jehova ekpughewo òtù udo nke ụmụ mmadụ a dị ka ihe arụ n’anya Chineke.

9, 10. Olee otú nghọta mbụ e nwere banyere mkpagbu ukwu ahụ si metụta echiche anyị nwere banyere oge mgbe “ihe arụ” ahụ ga-eguzo n’ebe nsọ?

9 Isiokwu bu ụzọ chịkọtara ụzọ ka doo anya anyị si ele akụkụ ka ukwuu nke Matiu isi nke 24 na 25 anya. È nwere nkọwa ụfọdụ kwesịrị ekwesị banyere ‘ihe arụ ahụ nke na-eguzo n’ebe nsọ’? Ihe àmà na-egosi na e nwere. N’ụzọ chiri anya, amụma Jisọs na-ejikọta ‘iguzo n’ebe nsọ’ na ntiwapụ nke “mkpagbu” ahụ e buru n’amụma. N’ihi ya, ọ bụ ezie na ọ dịwo anya “ihe arụ” ahụ malitere ịdị adị, njikọ dị n’etiti ya ‘iguzo n’ebe nsọ’ na mkpagbu ukwu ahụ kwesịrị imetụta echiche anyị. N’ụzọ dị aṅaa?

10 Ndị Chineke ghọtaburu na akụkụ mbụ nke mkpagbu ukwu ahụ malitere na 1914 nakwa na akụkụ ikpeazụ ya ga-abịa n’agha Amagedọn. (Mkpughe 16:14, 16; tụlee Ụlọ Nche (Bekee), April 1, 1939, peji nke 110.) Ya mere anyị pụrụ ịghọta ihe mere e jibu chee na “ihe arụ” nke oge ndị sochirinụ aghaghị iguzoworịị n’ebe nsọ n’oge na-adịghị anya mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị.

11, 12. Na 1969, echiche dị aṅaa dị iche banyere mkpagbu ukwu ahụ ka e wepụtara?

11 Otú ọ dị, n’afọ ndị sochirinụ, anyị ahụwo ihe n’ụzọ dị iche. Na Thursday, July 10, 1969, ná Mgbakọ Mba Nile nke “Udo n’Elu Ụwa” e nwere na New York City, F. W. Franz, bụ́ osote onyeisi oche nke Watch Tower Bible and Tract Society n’oge ahụ, kwuru okwu na-akpali akpali nke ukwuu. N’ịtụleghachi nghọta e nweburu banyere amụma Jisọs, Nwanna Franz kwuru, sị: “A kọwara na ‘mkpagbu ukwu’ ahụ amalitewo na 1914 O.A. nakwa na e kweghị ka o ruo ọgwụgwụ ya n’oge ahụ na kama nke ahụ, Chineke kwụsịrị Agha Ụwa Mbụ na November nke 1918. Site mgbe ahụ gaa n’ihu, Chineke nọ na-ahapụ oge maka ọrụ nke ihe fọdụrụ e tere mmanụ nke ndị Kraịst ọ họpụtara tupu ya ekwe ka akụkụ ikpeazụ nke ‘mkpagbu ukwu’ ahụ maliteghachi n’agha Amagedọn.”

12 Mgbe ahụ, e nyere nkọwa dị nnọọ iche: “Iji kwekọọ n’ihe ndị mere na narị afọ mbụ, . . . ‘mkpagbu ukwu’ ihe atụ ahụ amaliteghị na 1914 O.A. Kama nke ahụ, ihe weere ọnọdụ na Jerusalem ihe atụ nke oge a na 1914-1918 bụ nanị ‘mmalite ihe mgbu’ . . . ‘Mkpagbu ukwu’ nke ihe dị ka ya na-agaghị adịkwa ọzọ ka dị n’ihu, n’ihi na ọ pụtara mbibi nke alaeze ụwa nke okpukpe ụgha (gụnyere Krisendọm), nke ‘agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile’ n’Amagedọn, ga-esochi.” Nke a pụtara na mkpagbu ukwu ahụ dum ka dị n’ihu.

13. Gịnị mere o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya ikwu na “ihe arụ” ahụ ‘ga-eguzo n’ebe nsọ’ n’ọdịnihu?

13 Nke a na ịmata mgbe “ihe arụ” ahụ na-eguzo n’ebe nsọ, nwere nnọọ njikọ. Cheta ihe mere na narị afọ mbụ. Ndị Rom wakporo Jerusalem na 66 O.A., ma ha laghachiri azụ na mberede, nke mere ka a zọpụta “mmadụ” bụ́ ndị Kraịst. (Matiu 24:22) N’ihi ya, anyị na-atụkwa anya ka mkpagbu ukwu ahụ malite n’oge na-adịghị anya, ma a ga-eme ka ọ dị mkpirikpi n’ihi ndị Chineke họpụtara. Rịba isi ihe a ama: N’ihe atụ oge ochie ahụ, e jikọtara ‘ihe arụ ahụ nke na-eguzo n’ebe nsọ’ na mwakpo ndị Rom mere n’okpuru Ọchịagha Gallus na 66 O.A. Ihe yiri mwakpo ahụ n’oge a—ntiwapụ nke mkpagbu ukwu ahụ—ka dị n’ihu. Ya mere, ihe àmà na-egosi na “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu,” nke nọworo na-adị kemgbe 1919, ka ga-eguzo n’ebe nsọ.b Olee otú nke a ga-esi mee? Oleekwa otú ọ pụrụ isi metụta anyị?

Mwakpo nke Ga-abịa n’Ọdịnihu

14, 15. Olee otú Mkpughe isi 17 si enyere anyị aka ịghọta ihe omume ndị na-eduga n’Amagedọn?

14 Akwụkwọ Mkpughe na-akọwa mwakpo na-ebibi ihe nke a ga-awakpo okpukpe ụgha n’ọdịnihu. Isi nke 17 na-edepụta ikpe Chineke megide “Babilọn Ukwu ahụ, nne nke ndị na-akwa iko”—alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Krisendọm na-ekere òkè bụ́ isi ma na-azọrọ na ya na Chineke nwere mmekọrịta ọgbụgba ndụ. (Tụlee Jeremaịa 7:4.) Okpukpe ụgha dị iche iche, gụnyere Krisendọm, esorowo “ndị eze ụwa” nwee mmekọrịta rụrụ arụ eri oge, ma nke a ga-akwụsị mgbe okpukpe ndị ahụ ga-atọgbọrọ n’efu. (Mkpughe 17:2, 5) Site n’aka ònye?

15 Mkpughe na-egosi otu ‘anụ ọhịa na-acha uhie uhie’ nke dịrị ruo oge ụfọdụ, pụọ n’anya, mesịakwa lọghachi. (Mkpughe 17:3, 8) Ndị ọchịchị ụwa na-akwado anụ ọhịa a. Nkọwa zuru ezu e nyere n’amụma ahụ na-enyere anyị aka ịmata anụ ọhịa ihe atụ a dị ka òtù udo nke malitere ịdị adị na 1919 dị ka Njikọ Mba Nile (“ihe arụ”), ọ bụzikwa Mba Ndị Dị n’Otu ugbu a. Mkpughe 17:16, 17 na-egosi na Chineke ga-etinye ya n’obi ndị ọchịchị ụfọdụ a ma ama bụ́ mmadụ so “n’anụ ọhịa” a ime ka alaeze ụwa nke okpukpe ụgha tọgbọrọ n’efu. Mwakpo ahụ ga-aka akara ntiwapụ nke mkpagbu ukwu ahụ.

16. Ihe omume ndị dị aṅaa kwesịrị ịrịba ama nke metụtara okpukpe na-ewere ọnọdụ?

16 Ebe ọ bụ na mmalite nke mkpagbu ukwu ahụ ka dị n’ihu, ‘iguzo n’ebe nsọ’ ahụ ọ̀ ka dị anyị n’ihu? Ihe àmà na-egosi na ọ dị otú ahụ. Ọ bụ ezie na “ihe arụ” ahụ pụtara ná mmalite nke narị afọ a, si otú ahụ bụrụ nke nọruworo ọtụtụ iri afọ, ọ ga-eguzo “n’ebe nsọ” n’ụzọ pụrụ iche n’ọdịnihu dị nso. Dị ka ụmụazụ Kraịst nke narị afọ mbụ na-aghaghị ijiwo oké mmasị lepụ anya ịhụ otú ‘iguzo n’ebe nsọ’ ahụ ga-esi mee, otú ahụ ka ndị Kraịst nke oge a na-eme. N’eziokwu, anyị aghaghị ichere maka mmezu ahụ kpọmkwem iji mara nkọwa ya nile. Ma, ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na n’ala ụfọdụ, e nweworị ịkpọasị na-arị elu nke pụtatụrụ ìhè n’ebe okpukpe dị. Òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụfọdụ, bụ́ ndị so ndị Kraịst siworo n’ezi okpukpe pụọ jikọọ aka, na-akwalite ibu iro megide okpukpe n’ozuzu ya ma karịsịa, megide ezi ndị Kraịst. (Abụ Ọma 94:20, 21; 1 Timoti 6:20, 21) N’ihi ya, ọbụna ugbu a, ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche “[na-ebu] agha megide Nwa atụrụ ahụ,” dịkwa ka Mkpughe 17:14 na-egosi, ọgụ a ka ga-esikwu ike. Ọ bụ ezie na n’ụzọ nkịtị, ha apụghị ịhụ Nwa Atụrụ Chineke—Jisọs Kraịst nke nọ n’ọnọdụ ya dị elu, dịkwa ebube, iji busoo ya agha—ha ga-awụsakwu mmegide ha n’ahụ ezi ndị na-efe Chineke, karịsịa “ndị nsọ” ya. (Daniel 7:25; tụlee Ndị Rom 8:27; Ndị Kọlọsi 1:2; Mkpughe 12:17.) Chineke na-emesi anyị obi ike na Nwa Atụrụ ahụ na ndị ya na ha so ga-emeri.—Mkpughe 19:11-21.

17. N’ekwesighị olu ike, gịnị ka anyị pụrụ ikwu banyere otú “ihe arụ” ahụ ga-esi guzo n’ebe nsọ?

17 Anyị maara na ntọgbọrọ n’efu na-echere okpukpe ụgha. ‘Ọbara ndị nsọ abaala Babilọn Ukwu ahụ n’anya dị ka mmanya,’ ọ rụwokwa ọrụ dị ka eze nwanyị, ma mbibi ya bụ ihe e ji n’aka. Mmetụta ahụ na-adịghị ọcha o nweworo n’ebe ndị eze ụwa nọ ga-agbanwe n’ụzọ dị egwu ka mmekọrịta ahụ na-aghọ nke ịkpọasị na-akpata ime ihe ike n’ebe ‘mpi iri ahụ na anụ ọhịa ahụ’ nọ. (Mkpughe 17:6, 16; 18:7, 8) Mgbe ‘anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie’ ga-awakpo nwanyị akwụna okpukpe ahụ, “ihe arụ” ahụ ga na-eguzo n’ụzọ na-eyi egwu n’ebe Krisendọm sị na ọ bụ ebe nsọ ya.c Ya mere ntọgbọrọ n’efu ga-amalite n’ebe Krisendọm na-enweghị okwukwe nọ, bụ́ nke na-egosi onwe ya dị ka ihe dị nsọ.

‘Mgbalaga’—N’ụzọ Dị Aṅaa?

18, 19. Olee ihe ndị e kwuru iji gosi na ‘ịgbalaga n’ugwu’ agaghị apụta ịgbanwe okpukpe?

18 Mgbe o busịrị amụma banyere ‘nguzo nke ihe arụ ahụ n’ebe nsọ,’ Jisọs dọrọ ndị na-atụgharị uche aka ná ntị ime ihe. Ò bu n’uche na mgbe ahụ oge gabigarala—mgbe “ihe arụ” ahụ “na-eguzo n’ebe nsọ”—na ọtụtụ mmadụ ga-esi n’okpukpe ụgha gbalaga ma banye n’ezi ofufe? Ọ dịghị ma ọlị. Tụlee mmezu mbụ ya. Jisọs sịrị: “Ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu: onye nọkwa n’elu ụlọ, ya ghara ịrịdata, ma ọ bụ ịba n’ime, ịkwapụ ihe ọ bụla n’ụlọ ya: onye nọkwa n’ubi, ya ghara ịlaghachi ịchịrị uwe ya. Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime na ndị na-enye nwa ara na mgbe ahụ. Ma kpeenụ ekpere ka ọ ghara ịdị na mgbe oyi.”—Mak 13:14-18, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.

19 Jisọs ekwughị na ọ dị nanị ndị nọ na Jerusalem mkpa ịgbapụ, dị ka a ga-asị na isi ihe ọ na-ekwu bụ na ọ dị ha mkpa isi n’ebe ofufe ndị Juu hiwere isi pụọ; ịdọ aka ná ntị ya ehotaghịkwa ịgbanwe okpukpe—isi na nke ụgha gbapụ ma banye nke bụ́ ezie. N’ezie ịdọ aka ná ntị ọ bụla banyere isi n’otu okpukpe gbaba n’ọzọ adịghị ndị na-eso ụzọ Jisọs mkpa; ha aghọọlarị ezi ndị Kraịst. Mwakpo ahụ e mere na 66 O.A. akwalighịkwa ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu nọ na Jerusalem nakwa na Judia nile ịgbahapụ okpukpe ahụ ma nakwere Iso Ụzọ Kraịst. Prọfesọ Heinrich Graetz na-ekwu na ndị ahụ chụsoro ndị Rom ahụ na-agba ọsọ, laghachiri azụ n’obodo ahụ: “Ndị Zealot, bụ́ ndị ji oké ọṅụ na-abụ abụ agha, laghachiri na Jerusalem (October 8), obi ha jupụtara n’olileanya na-enye ọṅụ nke nnwere onwe. . . . Chineke ó jibeghị obi ebere nyere ha aka otú O siworo nyere ndị nna nna ha? Egwu maka ọdịnihu adịghị n’obi ndị Zealot.”

20. Olee otú ndị na-eso ụzọ oge mbụ si mee ihe banyere ịdọ aka ná ntị Jisọs banyere ịgbalaga n’ugwu?

20 Oleezi otú ọnụ ọgụgụ ahụ dị nnọọ nta nke ndị a họpụtara laa azụ n’oge ahụ si mee ihe banyere ndụmọdụ Jisọs? Site n’ịhapụ Judia na ịgbalaga n’ugwu ndị dị n’ofe Jọdan, ha gosipụtara na ha abụghị akụkụ nke usoro ihe ndị Juu, n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’ụzọ okpukpe. Ha hapụrụ ubi na ụlọ, ọbụnadị n’akwataghị ihe ndị ha nwere n’ụlọ. N’inwe obi ike na Jehova ga-echebe ma kwado ha, ha butere ofufe ya ụzọ karịa ihe ọ bụla ọzọ nke pụrụ iyi ihe dị mkpa.—Mak 10:29, 30; Luk 9:57-62.

21. Gịnị ka ọ na-adịghị anyị mkpa ịtụ anya ya mgbe “ihe arụ” ahụ wakporo?

21 Ugbu a, tụlee mmezu ya ka ukwuu. Ruo ọtụtụ iri afọ, anyị anọwo na-agba ndị mmadụ ume isi n’okpukpe ụgha pụta ma banye n’ezi ofufe. (Mkpughe 18:4, 5) Ọtụtụ nde emewo otú ahụ. Amụma Jisọs adịghị egosi na ozugbo mkpagbu ukwu ahụ tiwapụrụ, na ìgwè mmadụ ga-echigharịkwuru ofufe dị ọcha; n’ezie, a tọghataghị ndị Juu n’ìgwè na 66 O.A. Ma, ezi ndị Kraịst ga-enwe oké mkpali itinye ịdọ aka ná ntị Jisọs n’ọrụ ma gbalaga.

22. Gịnị ka anyị itinye ndụmọdụ Jisọs banyere ịgbalaga n’ugwu n’ọrụ pụrụ ịgụnye?

22 Ka ọ dị ugbu a anyị apụghị inwe nkọwa zuru ezu banyere mkpagbu ukwu ahụ, ma anyị pụrụ ikwubi n’ụzọ ezi uche dị na ya na, nye anyị, mgbalaga ahụ Jisọs kwuru okwu ya agaghị abụ n’echiche nke ịgbaga n’otu akụkụ nke ụwa. Ndị Chineke nọ gburugburu ụwa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’akụkụ nile. Otú ọ dị, anyị pụrụ ijide n’aka na mgbe mgbalaga dị mkpa, ndị Kraịst aghaghị ịnọgide na-egosi ọdịiche doro anya dị n’etiti ha na òtù okpukpe ụgha dị iche iche. Ọ dịkwa ịrịba ama na Jisọs dọrọ aka ná ntị banyere mmadụ ịlaghachi azụ n’ụlọ ya ịchịrị uwe ma ọ bụ ihe ndị ọzọ. (Matiu 24:17, 18) Ya mere a pụrụ inwe ule n’ọdịnihu n’ihe metụtara otú anyị si ele ihe onwunwe anya; hà bụ ihe ndị kasị mkpa, ka nzọpụta nke ga-abịara ndị nile nọ n’akụkụ Chineke ọ̀ dị mkpa karị? Ee, mgbalaga anyị pụrụ ịgụnye ụfọdụ ihe isi ike na ịnapụ onwe onye ihe. Anyị aghaghị ịdị njikere ime ihe ọ bụla dị mkpa, dị ka ndị ibe anyị na narị afọ mbụ mere bụ́ ndị si na Judia gbaga Peria, n’ofe Jọdan.

23, 24. (a) Olee nanị ebe anyị pụrụ ịchọta nchebe? (b) Mmetụta dị aṅaa ka ịdọ aka ná ntị Jisọs banyere ‘ihe arụ nke na-eguzo n’ebe nsọ’ kwesịrị inwe n’ebe anyị nọ?

23 Anyị aghaghị ijide n’aka na Jehova na nzukọ ya yiri ugwu nọgidere bụrụ ebe mgbaba anyị. (2 Samuel 22:2, 3; Abụ Ọma 18:2; Daniel 2:35, 44) Ọ bụ ebe ahụ ka anyị ga-achọta nchebe! Anyị agaghị eṅomi ọha mmadụ bụ́ ndị ga-agbaba “n’ime ọgbà” ma zoo “n’ime oké nkume nke ugwu”—nzukọ na òtù dị iche iche nke ụmụ mmadụ bụ́ ndị pụrụ ịdịgide ruo oge dị nnọọ mkpirikpi mgbe e bibisịrị Babilọn Ukwu ahụ. (Mkpughe 6:15; 18:9-11) N’ezie, ihe pụrụ isikwu ike—dị ka ọ ga-esiwo na 66 O.A. nye ndị dị ime si na Judia gbapụ ma ọ bụ nye onye ọ bụla nke na-aghaghị imeworị njem n’ọnọdụ ihu igwe jụrụ oyi mgbe mmiri na-ezo. Ma anyị pụrụ ijide n’aka na Chineke ga-eme ka nlanarị kwe omume. Ka anyị mee ọbụna ugbu a ka ndabere anyị dabeere n’ebe Jehova na Ọkpara ya nọ, bụ́ onye na-achị achị ugbu a dị ka Eze nke Alaeze ahụ, sie ike.

24 Ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji na-ebi n’egwu banyere ihe gaje ime. Jisọs achọghị ka ndị na-eso ụzọ ya n’oge ahụ tụọ egwu, ọ chọghịkwa ka anyị na-atụ egwu ma ugbu a ma ọ bụ n’ụbọchị ndị na-abịanụ. O mere ka anyị mụrụ anya ka anyị wee nwee ike idozi obi na uche anyị. E kwuwerị, a gaghị ata ndị Kraịst na-erube isi ahụhụ mgbe mbibi bịakwasịrị okpukpe ụgha na ihe fọdụrụ n’ajọ usoro ihe a. Ha ga na-atụgharị uche ma ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị banyere ‘ihe arụ nke na-eguzo n’ebe nsọ.’ Ha ga-emekwa ihe ozugbo n’okwukwe ha bụ a kwaa a kwụrụ. Ka anyị ghara ichefu ihe Jisọs kwere ná nkwa ma ọlị: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.”—Mak 13:13.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a “E ji ofufe okpukpe a na-efe n’ụlọ nsọ ndị dị na Rom na-echebe ọkọlọtọ ndị Rom; nsọpụrụ ofufe ha na-enye ọkọlọtọ ha na ọkịka ha ka mba ndị ọzọ hà nhata . . . [Nye ndị agha ọ] bụ ma eleghị anya, ihe kasị nsọ ụwa nwere. Onye agha Rom na-eji ọkọlọtọ ya aṅụ iyi.”—The Encyclopædia Britannica, Mbipụta nke 11.

b E kwesịrị ịrịba ama na ọ bụ ezie na mmezu nke okwu Jisọs na 66-70 O.A. pụrụ inyere anyị aka ịghọta otú ha ga-esi mezuo ná mkpagbu ukwu ahụ, mmezu abụọ ahụ apụghị iyirịta ibe ha kpọmkwem n’ihi na mmezu ndị ahụ ga-abụ n’ọnọdụ ndị dị iche.

c Lee Ụlọ Nche, June 15, 1976, peji nke 376-379.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Olee otú “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu” si pụta ìhè na narị afọ mbụ?

◻ Gịnị mere o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya iche na “ihe arụ” nke oge a ga-eguzo n’ebe nsọ n’ọdịnihu?

◻ Mwakpo dị aṅaa nke “ihe arụ” ahụ ga-eme ka e buru n’amụma ná Mkpughe?

◻ Ụdị ‘mgbalaga’ dị aṅaa ka a ka pụrụ ịchọ n’aka anyị?

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

A kpọrọ Babilọn Ukwu ahụ “nne nke ndị na-akwa iko”

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie nke Mkpughe isi 17 bụ “ihe arụ” ahụ Jisọs zoro aka na ya

[Foto dị na peeji nke 18]

Anụ ọhịa ahụ ga-eduzi mwakpo na-ebibi ihe megide okpukpe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya