ISI NKE 47
Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Mata na Amagedọn Dị Nso
Ị MANỤ ihe bụ́ ihe ịrịba ama, ọ̀ bụ na ị maghị?— N’Isi nke 46 anyị gụrụ banyere ihe ịrịba ama ahụ Chineke nyere na ya agaghị eji iju mmiri bibie ụwa ọzọ. Ndịozi rịọkwara ka e nye ha ihe ịrịba ama ka ha wee nwee ike ịmata mgbe Jizọs lọghachiri nakwa mgbe ọgwụgwụ ụwa, ma ọ bụ ọgwụgwụ usoro ihe ochie, dị nso.—Matiu 24:3.
Ebe Jizọs ga-anọ n’eluigwe, bụrụkwa onye a na-apụghị ịhụ anya, ihe ịrịba ama ndị mmadụ pụrụ ịhụ anya dị mkpa iji gosi na ọ malitewo ịchị. Ya mere, Jizọs kwuru ihe ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịdị na-ele anya ha n’ụwa ebe a. Mgbe ihe ndị a mere, ọ ga-apụta na ọ lọghachiwo, na ọ malitewokwa ịchị n’eluigwe dị ka Eze.
Iji kụziere ndị na-eso ụzọ ya mkpa ọ dị ịnọ na nche, Jizọs sịrị ha: “Rịbanụ osisi fig na osisi ọzọ nile ama: Mgbe ha mawororị ifuru, site n’ileru ya anya, unu na-amara n’onwe unu na oge okpomọkụ adịla nso.” Ị manụ otú a pụrụ isi mata na oge okpomọkụ dị nso. I nwekwara ike ịmata mgbe Amagedọn dị nso mgbe ị hụrụ ka ihe ndị ahụ Jizọs kwuru na-eme.—Luk 21:29, 30.
Gịnị ka Jizọs na-akụzi mgbe o kwuru okwu banyere osisi fig?
Na peeji a nakwa na peeji na-eso ya, anyị ga-ahụ ihe osise nke ihe ndị ahụ Jizọs kwuru na ha ga-eso n’ihe ịrịba ama na-egosi na Alaeze Chineke dị nso. Mgbe ihe ndị a nile mere, Alaeze Chineke nke Kraịst ga-abụ Onye Ọchịchị ya ga-etipịa ọchịchị ndị ọzọ nile, dị ka anyị gụrụ n’Isi nke 46.
Ya mere, leruo anya nke ọma n’ihe osise ndị dị na peeji abụọ bu nke a ụzọ, anyị ga-ekwurịtakwa banyere ha. I nwere ike ịgụ ihe banyere ihe ndị ị na-ahụ na foto ndị a na Matiu 24:6-14 nakwa na Luk 21:9-11. Rịbakwa ama ntakịrị nọmba nke dị n’ihe osise nke ọ bụla. Nọmba ahụ dịkwa ná mmalite nke paragraf na-akọwa ihe osise ahụ. Ugbu a ka anyị lee ma ọtụtụ n’ime akụkụ nke ihe ịrịba ama ahụ Jizọs nyere, hà na-emezu taa.
(1) Jizọs sịrị: “Unu gaje ịnụ banyere agha na akụkọ agha; . . . mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze.” Ị̀ nụtụwo akụkọ banyere agha?— A lụrụ Agha Ụwa Mbụ malite na 1914 ruo 1918, a lụkwara Agha Ụwa nke Abụọ malite na 1939 ruo 1945. A lụtụbeghị agha zuru ụwa ọnụ tupu mgbe ahụ! Ugbu a a na-alụ agha n’ụwa nile. O yiri ka anyị na-anụ ma ọ bụ na-agụ akụkọ banyere agha kwa ụbọchị na TV, na redio, nakwa n’akwụkwọ akụkọ.
(2) Jizọs sịkwara: “A ga-enwekwa ụkọ nri . . . site n’otu ebe ruo ebe ọzọ.” Dị ka ị maara, ọ bụghị mmadụ nile nwere ihe oriri na-ezuru ha. Kwa ụbọchị ọtụtụ puku mmadụ na-anwụ n’ihi na ha enweghị ihe oriri na-ezuru ha.
(3) Jizọs kwukwasịrị: “Ọrịa na-efe efe . . . ga-adịkwa site n’otu ebe ruo ebe ọzọ.” Ị̀ ma ihe bụ́ ọrịa na-efe efe?— Ọ bụ ọrịa na-egbu ọtụtụ mmadụ. Otu ajọ ọrịa na-efe efe nke a kpọrọ ahụ́ ọkụ Spen, gburu ihe dị ka nde mmadụ 20 nanị n’ime ihe dị ka otu afọ. N’oge anyị a ọnụ ọgụgụ mmadụ buru ibu karị ga-anwụ n’ihi ọrịa AIDS ma eleghị anya. E nwekwara ọrịa cancer, ọrịa obi, na ọrịa ndị ọzọ, bụ́ ndị na-egbu ọtụtụ puku mmadụ kwa afọ.
(4) Jizọs kwuru akụkụ ọzọ nke ihe ịrịba ama ahụ, na-asị: “A ga-enwekwa . . . ala ọma jijiji site n’otu ebe ruo ebe ọzọ.” Ị̀ ma ihe bụ́ ala ọma jijiji?— Ala ọma jijiji na-eme ka ala ebe ị zọkwasịrị ụkwụ na-ama jijiji. Ụlọ na-ada, ọtụtụ mgbekwa, ọ na-egbu ndị mmadụ. Kemgbe afọ 1914, a nọwo na-enwe ọtụtụ ala ọma jijiji kwa afọ. Ị̀ nụtụwo banyere ala ọma jijiji?—
(5) Jizọs kwuru na akụkụ ọzọ nke ihe ịrịba ama ahụ ga-abụ ‘ịba ụba nke ihe ọjọọ.’ Ọ bụ ya mere izu ohi na ime ihe ike ji jupụta ebe nile. Ndị mmadụ, n’ebe nile, na-atụ egwu na mmadụ nwere ike ịkpaka ụlọ ha zuo ohi. Ọ dịbeghị mgbe e nwere mpụ na ime ihe ike n’akụkụ nile nke ụwa dị ka e nwere ya ugbu a.
(6) Jizọs kwuru otu akụkụ dị mkpa nke ihe ịrịba ama ahụ mgbe ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ọ bụrụ na i kwenyere ‘n’ozi ọma a,’ mgbe ahụ i kwesịrị ịdị na-agwa ndị ọzọ banyere ya. N’ụzọ dị otú a, ị pụrụ ịdị na-ekere òkè ná mmezu nke akụkụ a nke ihe ịrịba ama ahụ.
Ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na ihe ndị ahụ Jizọs buru n’amụma na-emebu eme. Ma ọ dịtụbeghị mgbe ihe ndị ahụ nile mere n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, n’otu oge ahụkwa. Ya mere, ị̀ ghọtara ihe ihe ịrịba ama ahụ pụtara?— Ọ pụtara na mgbe anyị hụrụ ka ihe ndị a nile na-eme na ụwa ọhụrụ Chineke ga-anọchi anya ajọ ụwa a n’isi nso.
Mgbe Jizọs nyere ihe ịrịba ama a, o kwukwara okwu banyere oge pụrụ iche n’afọ. Ọ sịrị: “Nọgidenụ na-ekpe ekpere ka mgbapụ unu ghara iwere ọnọdụ n’oge oyi.” (Matiu 24:20) Gịnị ka i chere ihe ahụ o kwuru pụtara?—
Ọ dị mma, ọ bụrụ na mmadụ ga-agbanahụ otu ọdachi n’oge oyi, n’oge ihu igwe na-eme ka o sie ike ma ọ bụ ọbụna mee ka ọ dị ize ndụ ime njem, gịnị nwere ike ime?— Ọ bụrụgodị na o nwee ike ịgbapụ, ọ ga-esiri ya ezigbo ike. Ọ́ gaghị abụ ihe mwute bụ́ mmadụ ịnwụ n’ifufe nke oge oyi nanị n’ihi na ọ nọ na-eme ihe ndị ọzọ nke na ọ maliteghị njem ya tupu mgbe ahụ?—
Mgbe Jizọs kwuru okwu banyere ịgbalị ịgba ọsọ n’oge oyi, gịnị ka ọ na-akụzi?
Ị̀ hụrụ isi ihe dị n’okwu Jizọs mgbe o kwuru okwu banyere ịghara ichere ruo mgbe o ruru oge oyi tupu mmadụ amalite ịgbapụ?— Ọ na-agwa anyị na ebe anyị ma na Amagedọn dị nso na anyị ekwesịghị igbu oge n’ime ihe iji gosi na anyị hụrụ Chineke n’anya site n’ijere ya ozi. Ọ bụrụ na anyị egbuo oge, ọ pụrụ ịbụ na oge ga-aganahụ anyị. Ya mere, anyị ga-adị ka ndị ahụ nọ n’oge oké Iju Mmiri ahụ, ndị nụrụ ihe Noa kwuru ma ghara ịbanye n’ime ụgbọ ahụ.
Ka anyị kwuzie otú ọnọdụ ga-adị mgbe agha ukwu nke Amagedọn gasịrị. Anyị ga-amụta ihe Chineke kwadebeere anyị nile, bụ́ ndị hụrụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi ugbu a.
Ndị a bụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ na-egosi na Amagedọn dị nso: 2 Timoti 3:1-5 nakwa 2 Pita 3:3, 4.