Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ị̀ Ga-esi Aṅaa Guzo n’Ihu Oche Ikpe Ahụ?
    Ụlọ Nche—1995 | Ọktoba 15
    • 20, 21. Gịnị ka ndị ozi Jisọs jụrụ nke na-emetụta oge anyị, na-eduje n’ajụjụ dị aṅaa?

      20 Ntakịrị oge tupu Jisọs anwụọ, ndị ozi ya jụrụ ya, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” (Matiu 24:3, NW) Jisọs buru amụma banyere oké ihe omume ndị ga-ewere ọnọdụ n’ụwa tupu ‘ọgwụgwụ ahụ eruo.’ Ntakịrị oge tupu ọgwụgwụ ahụ eruo, mba nile “ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe n’ike na oké ebube.”—Matiu 24:14, 29, 30.

      21 Otú ọ dị, olee otú ihe ga-adịrị ndị nọ ná mba ndị ahụ mgbe Nwa nke mmadụ bịara n’ebube ya? Ka anyị chọpụta site n’ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ, nke ji okwu ndị a malite: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka Ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya: ma n’ihu Ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ.”—Matiu 25:31, 32.

      22, 23. Isi ihe ndị dị aṅaa na-egosi na ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ amaliteghị mmezu ya na 1914?

      22 Ilu nke a ò mezuru mgbe Jisọs nọdụrụ ala n’ike eze na 1914, dị ka anyị nọworo na-aghọta eri ogologo oge? Ọ dị mma, Matiu 25:34 na-ekwu banyere ya dị ka Eze, ya mere n’ụzọ ezi ìzù dị na ya ilu ahụ na-enwe mmezu ya kemgbe Jisọs ghọrọ Eze na 1914. Ma ikpe ikpe dị aṅaa ka o kpere ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị? Ọ bụghị ikpe “mba nile” ikpe. Kama nke ahụ, o chere ihu ya n’ebe ndị ahụ na-azọrọ na ha bụ ‘ụlọ Chineke’ dị. (1 Pita 4:17) N’ikwekọ na Malakaị 3:1-3, Jisọs, dị ka onye ozi nke Jehova, nyochara ndị Kraịst e tere mmanụ fọdụrụ n’elu ala n’ụzọ ikpe ikpe. Ọ bụkwa oge ịma Krisendọm ikpe, bụ́ ndị zọọrọ n’ụzọ ụgha ịbụ ‘ụlọ Chineke.’c (Mkpughe 17:1, 2; 18:4-8) Ma ọ dịghị ihe na-egosi na n’oge ahụ, ma ọ bụkwanụ, eri oge ahụ, na Jisọs nọdụrụ ala ikpe ndị nke mba nile ikpe n’ikpeazụ dị ka atụrụ ma ọ bụ ụmụ ewu.

      23 Ọ bụrụ na anyị enyochaa ọrụ Jisọs n’ilu ahụ, anyị na-ahụ ya ka ọ na-ekpe mba nile ikpe n’ikpeazụ. Ilu ahụ adịghị egosi na ikpe ikpe dị otú ahụ ga-aga n’ihu ruo ogologo oge nke ọtụtụ afọ, dị ka a ga-asị na onye ọ bụla nke na-anwụ n’ime afọ iri ndị a gara aga bụ onye e kpebiri na o ruru eru inweta ọnwụ ebighị ebi ma ọ bụ ndụ ebighị ebi. O yiri ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị nwụworo n’ime afọ iri ndị na-adịbeghị anya agaala n’ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Mkpughe 6:8; 20:13) Otú ọ dị, ilu ahụ na-egosi oge mgbe Jisọs ga-ekpe ndị nke “mba nile” ikpe bụ́ ndị nọ ndụ mgbe ahụ ma na-eche mmezu nke amamikpe ya ihu.

      24. Olee mgbe ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ gaemezu?

      24 N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ilu ahụ na-ezo aka n’ọdịnihu mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya. Ọ ga-anọdụ ala ikpe ndị dị ndụ n’oge ahụ ikpe. Mkpebi ikpe ya ga-adabere n’ihe ha gosipụtaworo na ha bụ n’onwe ha. N’oge ahụ, a ga-emeworị ka “ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu” pụta ìhè. (Malakaị 3:18) A ga-emezu ịma ikpe ahụ na mmezu ya kpọmkwem n’ime mkpirikpi oge. Jisọs ga-enye mkpebi ikpe ndị ziri ezi dabere n’ihe ndị pụtaworo ìhè banyere ndị mmadụ n’otu n’otu.—Leekwa 2 Ndị Kọrint 5:10.

      25. Gịnị ka Matiu 25:31 na-egosi n’ikwu banyere Nwa nke mmadụ ịnọkwasị n’ocheeze ebube?

      25 Nke a pụtaziri na Jisọs ‘ịnọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya’ maka ikpe ikpe, bụ́ nke e hotara na Matiu 25:31, ga-emezu n’ọdịnihu mgbe Eze a dị ike ga-anọdụ ala ịma mba nile ikpe na imezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ ha. Ee, ọnọdụ ikpe ahụ metụtara Jisọs nke dị na Matiu 25:31-33, 46 bụ nke a pụrụ iji tụnyere ọnọdụ dị na Daniel isi nke 7, bụ́ ebe Eze ahụ na-achị achị, Onye Ochie ahụ, nọdụrụ ala ịrụ ọrụ ya dị ka Onye Ikpe.

      26. Nkọwa ọhụrụ dị aṅaa nke ilu ahụ na-apụta ìhè?

      26 Ịghọta ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ n’ụzọ dị otú a na-egosi na inye mkpebi ikpe banyere atụrụ na ụmụ ewu ahụ bụ n’ọdịnihu. Ọ ga-ewere ọnọdụ mgbe “mkpagbu” ahụ e hotara na Matiu 24:29, 30 tiwapụsịrị, Nwa nke mmadụ ‘bịakwa n’ebube ya.’ (Tụlee Mak 13:24-26.) Mgbe ahụ, ebe ajọ usoro ihe dum bịaworo ná njedebe ya, Jisọs ga-enwe nnọkọ ikpe ma nye mkpebi ikpe, mezuokwa ha.—Jọn 5:30; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:7-10.

  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?
    Ụlọ Nche—1995 | Ọktoba 15
    • 3. Ná mmalite okwu ya, gịnị ka Jisọs kwuru ga-eme ngwa ngwa mkpagbu ukwu ahụ malitesịrị?

      3 Jisọs buru amụma ihe omume ndị dị ịrịba ama ndị ga-abịa “ngwa ngwa” mkpagbu ukwu ahụ tiwapụsịrị, bụ́ ihe omume ndị anyị na-echere. Ọ sịrị na mgbe ahụ ka “ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ” ga-apụta. Nke a ga-emetụta “ebo nile nke ụwa” n’ụzọ dị ukwuu bụ́ ndị ga-ahụ “Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’elu igwe ojii nke eluigwe n’ike na oké ebube.” Nwa nke mmadụ na “ndị mmụọ ozi Ya” ga-eso. (Matiu 24:21, 29-31)a Gịnị banyere ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ? Bible ndị nke oge a na-etinye ya n’isi nke 25, ma, ọ bụ akụkụ nke nzaghachi Jisọs, na-enyekwu nkọwa banyere ọbịbịa ya n’ebube ma na-elekwasị anya na ya ikpe “mba nile” ikpe.—Matiu 25:32.

      Ndị Dị n’Ilu Ahụ

      4. Nhota dị aṅaa ka e hotara Jisọs ná mmalite nke ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ, oleekwa onye ọzọ e hotara?

      4 Jisọs malitere ilu ahụ site n’ikwu, sị: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa.” Ikekwe ị maara onye “Nwa nke mmadụ” ahụ bụ. Ndị dere Oziọma ahụ jiri okwu ahụ mee ihe ọtụtụ mgbe n’ebe Jisọs nọ. Ọbụna Jisọs n’onwe ya mere otú a, n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na-eburu n’uche ọhụụ Daniel banyere “otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ” nke na-abịakwute Onye Ochie ahụ ịnata “ọchịchị, na ebube, na alaeze.” (Daniel 7:13, 14; Matiu 26:63, 64; Mak 14:61, 62) Ọ bụ ezie na ọ bụ Jisọs bụ onye bụ isi n’ilu a, ọ nọghị nanị ya. Ná mmalite ntụle nke a, dị ka e hotara na Matiu 24:30, 31, ọ sịrị na mgbe Nwa nke mmadụ ‘ga-abịa n’ike na oké ebube,’ ndị mmụọ ozi ya ga-arụ ọrụ dị mkpa. N’otu aka ahụ, ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ na-egosi ka Jisọs na ndị mmụọ ozi nọ mgbe ọ ‘na-anọdụ n’ocheeze ebube ya’ ikpe ikpe. (Tụlee Matiu 16:27.) Ma Onye Ikpe ahụ na ndị mmụọ ozi ya nọ n’eluigwe, ọ̀ bụ otu ihe ahụ banyere ndị mmadụ e kwuru maka ha n’ilu ahụ?

  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?
    Ụlọ Nche—1995 | Ọktoba 15
    • RỊBA AMA MYIRỊTA NDỊ AHỤ

      Matiu 24:29-31 Matiu 25:31-33

      Mgbe mkpagbu ukwuu ahụ malitesịrị, Nwa nke mmadụ abịa

      Nwa nke mmadụ abịa

  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?
    Ụlọ Nche—1995 | Ọktoba 15
    • n’ocheeze ya nke ebube

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya