Iji Iguzosi Ike n’Ihe Na-akwado Okwu Chineke Sitere n’Ike Mmụọ Nsọ
“Anyị jụrụ ihe nzuzo nile nke na-eweta ihere, anyị adịghị ejegharị n’aghụghọ, anyị adịghị emesokwa okwu Chineke n’ụzọ ịtụ ntụ.”—2 NDỊ KỌRINT 4:2.
1. (a) Gịnị ka a chọworo iji rụzuo ọrụ e setịpụrụ na Matiu 24:14 na 28:19, 20? (b) Ruo ókè hà aṅaa ka e nwere Bible n’asụsụ ndị mmadụ n’oge mgbe ikpeazụ malitere?
N’AMỤMA ukwu ya banyere oge ọnụnọ ya dị ka eze na ọgwụgwụ nke usoro ihe ochie, Jisọs Kraịst buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” O nyekwara ụmụazụ ya ntụziaka, sị: “Mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 24:14; 28:19, 20) Mmezu nke amụma ndị ahụ na-agụnye ọrụ dị ukwuu n’ịsụgharị na ibi Bible, n’ịkụziri ndị mmadụ ihe ọ pụtara, na n’inyere ha aka itinye ya n’ọrụ ná ndụ ha. Lee ihe ùgwù ọ bụ ikere òkè n’ọrụ dị otú ahụ! Ka ọ na-erule 1914 e bipụtaworị Bible ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ n’asụsụ 570. Ma kemgbe ahụ a tụkwasịwo ọtụtụ narị asụsụ na ire okwu ndị ọzọ, n’ọtụtụ asụsụ kwa e mewo ka e nwee ihe karịrị otu nsụgharị.a
2. Ebumnobi dị aṅaa dịgasị iche iche metụtaworo ọrụ ndị nsụgharị na ndị mbipụta Bible?
2 Ọ bụ ihe ịma aka nye onye nsụgharị ọ bụla iwere ihe dị n’otu asụsụ ma mee ka ndị na-agụ ma na-anụ asụsụ ọzọ ghọta ya. Ndị nsụgharị ụfọdụ nke Bible arụwo ọrụ ha n’ịmara nke ọma na ihe ha nọ na-asụgharị bụ Okwu Chineke. Ihe ịma aka nkà mmụta nke ọrụ ahụ abụrụwo nnọọ ihe kpaliri ndị ọzọ. Ha pụrụ ilewo ihe ndị dị na Bible anya dị ka nanị ihe nketa ọdịbendị bara uru. Nye ụfọdụ, okpukpe bụ azụmahịa ha, ibipụtakwa akwụkwọ bu aha ha dị ka ndị nsụgharị ma ọ bụ onye bipụtara ya bụkwa akụkụ nke inweta ihe e ji ebi ndụ. O doro anya na ebumnobi ha na-emetụta otú ha si arụ ọrụ ha.
3. Olee otú Kọmitii Nsụgharị Bible Ụwa Ọhụrụ siri lee ọrụ ya anya?
3 Okwu a nke Kọmitii Nsụgharị Bible Ụwa Ọhụrụ kwuru kwesịrị ịrịba ama: “Ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ pụtara itinye n’asụsụ ọzọ echiche na okwu Jehova Chineke . . . Nke ahụ bụ ihe a na-echebara nnọọ echiche. Ndị nsụgharị nke akwụkwọ a, bụ́ ndị na-atụ Chineke Dere Akwụkwọ Nsọ egwu ma hụ ya n’anya, nwere echiche ibu ọrụ pụrụ iche nye Ya idepụta echiche na okwu ya n’ụzọ ziri ezi dị ka o kwere mee. Ha nwekwara echiche ibu ọrụ n’ebe ndị na-eme nnyocha na-agụ ya nọ, bụ́ ndị na-adabere ná nsụgharị nke Okwu Chineke Kasị Ihe Nile Elu nke sitere n’ike mmụọ nsọ maka nzọpụta ebighị ebi ha. Ọ bụ n’iburu ibu ọrụ ahụ dị oké mkpa n’uche ka kọmitii a nke ndị ikom raara onwe ha nye jiworo mepụta New World Translation of the Holy Scriptures ka ọtụtụ afọ na-agafe.” Nzube nke kọmitii ahụ bụ inwe nsụgharị Bible nke ga-edo anya ma kwe nghọta, nke ga-adaberesikwa ike na Hibru na Grik mbụ nke na ọ ga-abụ ntọala maka uto na-aga n’ihu n’ezi ihe ọmụma.
Gịnị Meworo Aha Chineke?
4. Olee otú aha Chineke dịruru ná mkpa n’ime Bible?
4 Otu n’ime ebumnobi ndị bụ isi nke Bible bụ inyere ndị mmadụ aka ịbịa mara ezi Chineke ahụ. (Ọpụpụ 20:2-7; 34:1-7; Aịsaịa 52:6) Jisọs Kraịst kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere ka e ‘doo aha Nna ya nsọ,’ ka e were ya dị ka ihe e doro nsọ, ma ọ bụ mesoo ya dị ka ihe dị nsọ. (Matiu 6:9) Chineke mere ka e tinye aha ya n’ime Bible ihe karịrị ugboro 7,000. Ọ chọrọ ka ndị mmadụ mara aha ahụ na àgwà nke Onye na-aza ya.—Malakaị 1:11.
5. Olee otú ndị nsụgharị dị iche iche siworo dee aha Chineke?
5 Ọtụtụ ndị nsụgharị Bible egosiwo ezi nkwanye ùgwù maka aha Chineke, ha ejiriwokwa ya mee ihe n’ebe nile ná nsụgharị ha. Ndị nsụgharị ụfọdụ họọrọ Yahweh. Ndị ọzọ ahọrọwo ụdị aha Chineke nke kwekọrọ n’asụsụ ha ma ka bụrụ ndị kwekọrọ n’ụzọ doro anya n’ihe dị n’ihe odide Hibru, ikekwe ụdị nke a maara nke ọma site n’iji ya eme ihe eri ogologo oge. New World Translation of the Holy Scriptures ji Jehova mee ihe ugboro 7,210 n’akụkụ bụ isi nke ihe odide ya.
6. (a) N’afọ ndị na-adịbeghị anya, gịnị ka ndị nsụgharị meworo n’aka ndị e zoro n’ebe aha Chineke dị? (b) Olee ókè omume a gbasaruru?
6 N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọ bụ ezie na ndị nsụgharị Bible ewepụghị aha chi ndị na-ekpere arụsị dị ka Beal na Molek, ha nọgidekwara na-ewepụ aha aka ezi Chineke ahụ ná nsụgharị dị iche iche nke Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ. (Ọpụpụ 3:15; Jeremaịa 32:35) N’akụkụ ihe odide ndị dị ka Matiu 6:9 na Jọn 17:6, 26, otu nsụgharị Albanian e kesara n’ụzọ sara mbara sụgharịrị okwu Grik maka “aha Gị” (ya bụ, aha Chineke) dị ka nanị “gị,” dị ka a ga-asị na ọ dịghị aha akụkụ ihe odide ahụ kpọrọ. N’Abụ Ọma 83:18, The New English Bible na Today’s English Version wepụrụ ma aha aka Chineke ma aka ọ bụla a na-ezo n’eziokwu ahụ bụ na Chineke nwere aha. N’agbanyeghị na aha Chineke pụtara ná nsụgharị ndị ka ochie nke Akwụkwọ Nsọ Hibru n’ihe ka n’ọtụtụ asụsụ, ndị nsụgharị ka ọhụrụ na-ewepụkarị ya ma ọ bụ na-etinye ya n’ihe odide etiti peji. Otú ahụ ka ọ dị na Bekee, tinyekwara ọtụtụ asụsụ nke Europe, Africa, Ndịda America, India, na àgwàetiti nile nke Pacific.
7. (a) Olee otú ndị nsụgharị nke ụfọdụ Bible Africa si emeso aha Chineke? (b) Olee otú nke ahụ dị gị?
7 Ndị na-asụgharị Bible gaa n’ụfọdụ asụsụ Africa na-eme ihe karịrị nke ahụ. Kama nanị iji utu aha Akwụkwọ Nsọ kwadoro, dị ka Chineke ma ọ bụ Onyenwe anyị, na-edochi aha Chineke, ha na-edebanye aha ndị e wetara site na nkwenkwe okpukpe dị n’ógbè ha. N’ime The New Testament and Psalms in Zulu (nsụgharị 1986), e ji utu aha bụ́ Chineke (uNkulunkulu) gbanwerịta aha aka (uMvelinqangi), bụ́ nke ndị Zulu na-aghọta na ọ na-ezo aka n’ebe ‘nna ochie ukwu onye a na-esite ná ndị nna ochie bụ mmadụ enye ofufe’ nọ. Otu isiokwu dị na magazin bụ́ The Bible Translator, nke October 1992, kọrọ na n’ịkwadebe Bible Chichewa nke a gaje ịkpọ Buku Loyera, ndị nsụgharị ji Chauta na-eme ihe dị ka aha aka iji dochie anya Jehova. Chauta, ka isiokwu ahụ kọwara, bụ “Chineke nke ha maara ma na-efe ofufe mgbe nile.” Ma, ọtụtụ n’ime ndị a na-efekwa ihe ha kweere na ha bụ mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ofufe. Ọ̀ bụ eziokwu na ọ bụrụ na ndị mmadụ ekpegara “Onye Kachasị Elu” ekpere, mgbe ahụ aha ọ bụla ha ji eme ihe maka “Onye Kachasị Elu” ahụ bụ nnọọ otu ihe ahụ ya na aha aka Jehova, n’agbanyeghị ihe ọ bụla ọzọ ofufe ha pụrụ ịgụnye? Ọ bụghị ma ọlị! (Aịsaịa 42:8; 1 Ndị Kọrint 10:20) Iji ihe na-eme ka ndị mmadụ na-eche na nkwenkwe ọdịnala ha ziri nnọọ ezi edochi aha aka Chineke adịghị enyere ha aka ịbịaru ezi Chineke ahụ nso karị.
8. Gịnị mere na e tisasịbeghị nzube Chineke ime ka a mara aha ya?
8 Ihe a nile agbanwebeghị ma ọ bụ tisasịa nzube Jehova ime ka a mara aha ya. N’asụsụ ndị Europe, Africa, kọntinent ndị dị n’America, Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, na n’àgwàetiti nke oké osimiri, a ka na-ekesa ọtụtụ Bible nwere aha Chineke. E nwekwara ihe karịrị Ndịàmà Jehova 5,400,000 ná mba na ókèala 233 bụ́ ndị jikọrọ aka na-etinye ihe karịrị otu ijeri hour kwa afọ n’ịgwa ndị ọzọ banyere aha na nzube nke ezi Chineke ahụ. Ha na-ebi ma na-ekesa Bible—ndị ji aha Chineke eme ihe—n’ihe dị ka asụsụ nke 3,600,000,000 ndị bi n’ụwa na-asụ, gụnyere Bekee, Chinese, Russian, Spanish, Portuguese, French, na Dutch. Ha na-ebikwa ihe ndị na-enye aka ịmụ Bible n’asụsụ ihe ka ọtụtụ n’ime ndị nile bi n’ụwa maara. N’isi nso Chineke n’onwe ya ga-eme ihe n’ụzọ ga-emezucha okwu ya nke bụ na mba nile ‘ga-amara na ya onwe ya bụ Jehova.’—Ezikiel 38:23.
Mgbe Ihe Mmadụ Kwere na Ya Na-emetụta Nsụgharị
9. Olee otú Bible siri gosi ibu ọrụ siri ike na-adịkwasị ndị ji Okwu Chineke eme ihe?
9 Ibu ọrụ siri ike dịkwasị ndị na-asụgharị Okwu Chineke nakwa ndị na-akụzi ya. Pọl onyeozi kwuru banyere ozi ya na nke ndị ya na ha rụkọrọ ọrụ, sị: “Anyị jụrụ ihe nzuzo nile nke na-eweta ihere, anyị adịghị ejegharị n’aghụghọ, anyị adịghị emesokwa okwu Chineke n’ụzọ ịtụ ntụ; kama anyị ji ngosi nke eziokwu na-eme ka akọ na uche nke mmadụ nile n’otu n’otu mara anyị n’ihu Chineke.” (2 Ndị Kọrint 4:2) Imeso ihe n’ụzọ ịtụ ntụ pụtara imetọ ihe site n’ịgwakọta ya na ihe na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ ihe dị ala. Pọl onyeozi adịghị ka ndị ọzụzụ atụrụ Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’ụbọchị Jeremaịa bụ́ ndị Jehova baara mba n’ihi na ha kwusara echiche nke ha kama ihe Chineke kwuru. (Jeremaịa 23:16, 22) Ma gịnị meworo n’oge a?
10. (a) Olee otú ebumnobi ndị na-abụghị iguzosi ike n’ihe nye Chineke siworo metụta ụfọdụ ndị nsụgharị n’oge a? (b) Ọkwá dị aṅaa ka ha na-eweghara n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị?
10 N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, otu kọmitii nke ndị ọkà mmụta okpukpe na ndị pastọ sooro gọọmenti Nazi na Germany jikọọ aka wee mepụta “Agba Ọhụrụ” e degharịrị edegharị nke wepụrụ izo aka ọma nile e zoro n’ebe ndị Juu nọ na ihe nile na-egosi na Jisọs Kraịst sitere n’usoro ọmụmụ ndị Juu. Na nso nso a karị, ndị nsụgharị sụgharịrị The New Testament and Psalms: An Inclusive Version gara n’akụkụ dị iche, na-agbalị iwepụsị ihe nile mere a ga-eji ata ndị Juu ụta maka ọnwụ Kraịst. Ndị nsụgharị ahụ chekwara na ndị na-akwado nhata ndị ikom na ndị inyom na-agụ nsụgharị ha ga-enwe obi ụtọ karị ma ọ bụrụ na e kwuru banyere Chineke, ọ bụghị dị ka Nna, kama dị ka Nna-Nne na ma ọ bụrụ na e kwuru banyere Jisọs, ọ bụghị dị ka Ọkpara Chineke, kama dị ka Nwa ya. (Matiu 11:27) Ka ha ka nọ na nke ahụ, ha wepụrụ ụkpụrụ nke ndị nwunye ido onwe ha n’okpuru ndị bụ́ di na ụmụaka irubere ndị mụrụ ha isi. (Ndị Kọlọsi 3:18, 20) O doro anya na ndị ahụ mepụtara nsụgharị ndị ahụ enweghị otu mkpebi ahụ Pọl onyeozi nwere nke ịghara ‘imeso okwu Chineke n’ụzọ ịtụ ntụ.’ Ha na-echefu ọrụ nke onye nsụgharị, na-eweghara ọnọdụ nke onye dere akwụkwọ, na-emepụta akwụkwọ ndị ji aha Bible eme ihe dị ka ụzọ isi kwalite echiche nke aka ha.
11. Olee otú nkụzi Krisendọm si emegide ihe Bible na-ekwu banyere mkpụrụ obi na ọnwụ?
11 Chọọchị Krisendọm n’ozuzu ha na-akụzi na mkpụrụ obi mmadụ bụ mmụọ, na ọ na-ahapụ ahụ n’ọnwụ, nakwa na ọ dịghị anwụ anwụ. N’ụzọ dị iche, nsụgharị ndị ka mee ochie nke Bible n’ihe ka ọtụtụ n’ime asụsụ na-ekwu n’ụzọ doro anya na ụmụ mmadụ bụ mkpụrụ obi, na anụmanụ bụ mkpụrụ obi, nakwa na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. (Jenesis 12:5; 36:6; Ọnụ Ọgụgụ 31:28; Jemes 5:20) Nke ahụ emechuwo ndị ụkọchukwu ihu.
12. N’ụzọ dị aṅaa ka ụfọdụ nsụgharị nke oge a si ekpuchi eziokwu ndị bụ isi nke Bible?
12 Ugbu a, ụfọdụ nsụgharị ndị dị ọhụrụ karị na-ekpuchi eziokwu ndị a. N’ụzọ dị aṅaa? Ha na-ezere nnọọ ịsụgharị kpọmkwem mkpọaha Hibru ahụ bụ́ neʹphesh (mkpụrụ obi) n’akụkụ ihe odide ụfọdụ. Na Jenesis 2:7, ha pụrụ ikwu na nwoke mbụ ahụ “malitere ịdị ndụ” (kama ikwu “wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ”). Ma ọ bụ ha pụrụ izo aka n’ebe “ihe e kere eke” dị kama “mkpụrụ obi” n’ihe banyere ndụ anụmanụ. (Jenesis 1:21) N’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Ezikiel 18:4, 20, ha na-ezo aka n’ebe “onye ahụ” ma ọ bụ “mmadụ ahụ” nọ (kama ịbụ “mkpụrụ obi”) dị ka nke na-anwụ anwụ. Eleghị anya nsụgharị ndị dị otú ahụ pụrụ izi ezi nye onye nsụgharị ahụ. Ma enyemaka hà aṅaa ka ha na-enye onye ji ezi obi na-achọ eziokwu bụ́ onye nkụzi ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nke Krisendọm kpụziworo?b
13. Site n’ụzọ dị aṅaa ka ụfọdụ nsụgharị nke Bible siworo kpuchie nzube Chineke banyere ụwa?
13 Ná mgbalị ịkwado nkwenkwe ha na ndị ọma nile na-aga eluigwe, ndị nsụgharị—ma ọ bụ ndị ọkà mmụta okpukpe na-atụleghachi ọrụ ha—pụkwara ịgbalị izochi ihe Bible na-ekwu banyere nzube Chineke maka ụwa. N’Abụ Ọma 37:11, ọtụtụ nsụgharị na-agụ na ndị dị umeala n’obi ga-eketa “ala.” A pụrụ ịsụgharị okwu ahụ (ʼeʹrets) e ji mee ihe n’ihe odide Hibru ahụ ịbụ “ala.” Otú ọ dị, Today’s English Version (bụ nke bụworo ebe ndabere maka nsụgharị gaa n’asụsụ ndị ọzọ) gakwuru n’ihu. Ọ bụ ezie na nsụgharị a sụgharịrị okwu Grik bụ́ ge dị ka “ụwa” ugboro 17 n’Oziọma Matiu, na Matiu 5:5 o ji nkebi okwu bụ́ “ihe Chineke kweworo ná nkwa” dochie “ụwa.” Obi ndị chọọchị na-agakarị n’ebe eluigwe dị. E jighị obi eziokwu agwa ha na, n’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs Kraịst sịrị na ndị dị obi umeala, dị nwayọọ n’obi, ma ọ bụ dị umeala n’obi “ga-eketa ụwa.”
14. Mkpalị ọdịmma onwe onye nanị dị aṅaa ka a na-ahụ ná nsụgharị Bible ụfọdụ?
14 O doro anya na a na-ede ụfọdụ nsụgharị Akwụkwọ Nsọ ná nzube nke inyere ndị okwuchukwu aka inweta ụgwọ ọnwa dị mma. Ọ bụ ezie na Bible na-ekwu, sị: “Onye ọrụ kwesịrị ụgwọ ọrụ ya.” (1 Timoti 5:18) Ma na 1 Timoti 5:17, ebe ọ na-ekwu na ndị okenye na-edu ndú n’ụzọ dị mma “kwesịrị nsọpụrụ okpukpu abụọ,” nanị nsọpụrụ ụfọdụ n’ime ha na-ele anya dị ka nke kwesịrị ịkpọtụ aha bụ ihe banyere ego. (Tụlee 1 Pita 5:2.) N’ihi ya, The New English Bible na-ekwu na ndị okenye a “kwesịrị ka e nye ha ego mmachi akpa dị okpukpu abụọ,” Contemporary English Version na-ekwukwa na ha “kwesịrị ka a kwụọ ha ụgwọ dị okpukpu abụọ.”
Iji Iguzosi Ike n’Ihe Na-akwado Okwu Chineke
15. Olee otú anyị pụrụ isi kpebie nsụgharị Bible ndị anyị ga-ehota?
15 Gịnị ka ihe a nile pụtara nye onye na-agụ Bible na nye ndị ji Bible akụziri ndị ọzọ ihe? N’ihe ka ọtụtụ n’ime asụsụ ndị e ji eme ihe n’ụzọ sara mbara, e nwere ihe karịrị otu nsụgharị Bible nke a ga-esi na ha họrọ. Gosi nghọta ná nhọrọ nke Bible i ji eme ihe. (Ilu 19:8) Ọ bụrụ na otu nsụgharị emeghị ihe n’eziokwu banyere onye Chineke n’onwe ya bụ—na-ewepụ aha ya n’Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ n’ihi ihe ọ bụla a sị na ọ kpatara ya—ọ̀ pụrụ ịbụ na ndị nsụgharị ahụ agbanwewokwa akụkụ ndị ọzọ nke ihe e dere na Bible? Mgbe i nwere obi abụọ banyere izi ezi nke otu nsụgharị, gbalịa iji nsụgharị ndị ọzọ mere ochie karị tụlee ya. Ọ bụrụ na ị bụ onye nkụzi nke Okwu Chineke, họrọ nsụgharị ndị na-arapagidesi ike n’ihe dị n’ihe odide Hibru na Grik mbụ.
16. Olee otú anyị n’otu n’otu pụrụ isi gosipụta iguzosi ike n’ihe n’ojiji anyị ji Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ eme ihe?
16 Anyị nile n’otu n’otu kwesịrị iguzosi ike n’Okwu Chineke. Anyị na-eme nke ahụ site n’icheba echiche zuru ezu n’ihe dị n’ime ya, nke ga-eme, ọ bụrụ na o kwere omume, ka anyị tinye oge ụfọdụ kwa ụbọchị n’ịgụ Bible. (Abụ Ọma 1:1-3) Anyị na-eme ya site n’itinye n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu ihe ọ na-ekwu, na-amụta iji ụkpụrụ na ihe atụ ya eme ihe dị ka ndabere maka ime mkpebi ndị ziri ezi. (Ndị Rom 12:2; Ndị Hibru 5:14) Anyị na-egosi na anyị bụ ndị nkwado na-eguzosi ike n’ihe nke Okwu Chineke site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusara ya ndị ọzọ. Anyị na-emekwa ya dị ka ndị nkụzi site n’iji nlezianya were Bible na-eme ihe, n’agbagọghị ma ọ bụ na-agbatị ihe ọ na-ekwu ka o kwekọọ n’echiche anyị. (2 Timoti 2:15) Ihe Chineke buworo n’amụma ga-emezurịrị. Ọ na-eguzosi ike n’ihe n’imezu Okwu ya. Ka anyị na-eguzosi ike n’ihe n’ịkwado ya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Òtù United Bible Societies na 1997 depụtara asụsụ na ire okwu 2,167 ndị e bipụtaworo Bible, n’ozuzu ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ. Ọnụ ọgụgụ a na-agụnye ọtụtụ ire okwu nke ụfọdụ asụsụ.
b Ntụle a na-elekwasị anya n’asụsụ ndị nwere ike ime ka okwu ahụ doo anya bụ́ nke ndị nsụgharị họọrọ ịghara ime otú ahụ. Ìgwè okwu e nwere na-akpa ókè dị ukwuu n’ihe ndị nsụgharị pụrụ ime n’asụsụ ụfọdụ. Mgbe ahụ, ndị nkụzi okpukpe mere ihe n’eziokwu ga-akọwa na n’agbanyeghị na onye nsụgharị jiri okwu dịgasị iche iche mee ihe ma ọ bụ ọ bụrụgodị na o jiri okwu ndị na-enye echiche Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị na-eme ihe, okwu asụsụ mbụ, bụ́ neʹphesh, na-ezo aka n’ebe ma ụmụ mmadụ ma anụmanụ nọ, na-anọchitekwa anya ihe na-eku ume, na-eri ihe, nke pụkwara ịnwụ anwụ.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Ebumnobi ndị dị aṅaa metụtaworo ọrụ ndị nsụgharị Bible n’oge a?
◻ Gịnị mere na ụzọ nsụgharị ọgbara ọhụrụ si eme ihe etisasịbeghị nzube Chineke banyere aha ya?
◻ Olee otú ndị nsụgharị ụfọdụ si ekpuchi eziokwu Bible banyere mkpụrụ obi, ọnwụ, na ụwa?
◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosi na anyị ji iguzosi ike n’ihe na-akwado Okwu Chineke?
[Foto dị na peeji nke 16]
Olee nsụgharị Bible nke i kwesịrị iji mee ihe?