Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 1/1 p. 12-22
  • Ebube Ka Ukwuu nke Ụlọ Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ebube Ka Ukwuu nke Ụlọ Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Òkè Nri” Bara Ụba
  • Iwe Ihe Ubi Gburugburu Ụwa
  • Ịnọgide Na-aga n’Ihu n’Ihu
  • Ozi Ndị Ikpeazụ nke Hagaị
  • Ka Mmadụ Nile Too Jehova!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • “Mụ Onwe M Nọnyeere Unu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ka Aka Unu Dị Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “M Ga-eme Ka Mba Niile Maa Jijiji”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 1/1 p. 12-22

Ebube Ka Ukwuu nke Ụlọ Jehova

“M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.”—HAGAỊ 2:7.

1. Olee otú e si jikọọ mmụọ nsọ n’ebe okwukwe na ọrụ dị?

KA Ọ na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, otu n’ime Ndịàmà Jehova zutere otu nwaada Pentikọstal bụ́ onye sịrị, ‘Anyị nwere mmụọ nsọ, ma ọ bụ unu na-arụ ọrụ ahụ.’ N’ụzọ akọ, a kọwaara ya na a ga-akpali onye nwere mmụọ nsọ, dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, ịrụ ọrụ Chineke. Jemes 2:17 na-asị: “Okwukwe, ma ọ bụrụ na o nweghị ọrụ, ọ bụ ihe nwụrụ anwụ n’onwe ya.” Site n’enyemaka mmụọ Jehova, Ndịàmà ya azụlitewo okwukwe siri ike, o ‘mejuwokwa ụlọ ya n’ebube’ site n’idokwa ha ịrụ ọrụ ezi omume—n’ụzọ bụ isi ‘ikwusa ozi ọma nke a nke Alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.’ Mgbe a rụzuru ọrụ a otú juru Jehova afọ, “mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:14.

2. (a) Imikpu onwe anyị n’ọrụ Jehova ga-eweta ngọzi dị aṅaa? (b) N’ihi gịnị ka obi kwesịrị iji dị anyị ụtọ banyere ihe ọ bụla yiri ‘ịla azụ’?

2 Site n’okwu Jisọs ndị a, anyị na-ahụ na ọrụ anyị taa aghaghị ilekwasị anya n’ikwusara ndị ọzọ “ozi ọma nke ebube nke Chineke dị ngọzi,” nke e nyere anyị n’aka idebe. (1 Timoti 1:11) Ka anyị ji obi ụtọ na-emikpukwu onwe anyị n’ozi Jehova, otú ahụ ka ọgwụgwụ ahụ na-eyi ka ọ na-abịakwu ọsọ ọsọ. Na Habakuk 2:2, 3, anyị na-agụ okwu Jehova: “Dee ọhụụ ahụ n’elu mbadamba ihe dị iche iche, tụọ ya akịka, ka onye na-agụ ya wee gbaa ọsọ. N’ihi na ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka, ọ na-ekusikwara ọgwụgwụ ya ume ike, ọ gaghị ekwukwa okwu ụgha: ọ bụrụ na ọ laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.” Ee, “ọhụụ ahụ” ga-emezu ọbụna “ọ bụrụ na ọ laa azụ.” N’afọ nke 83 nke a nke ịchịisi Alaeze Jisọs, ụfọdụ pụrụ iche na anyị nọ nnọọ ugbu a n’oge nke ịla azụ. Ma, ọ̀ bụ na obi ekwesịghị ịdị anyị ụtọ na ọgwụgwụ ahụ abịabeghị? N’ime iri afọ ndị nke 1990, e wepụwo ọtụtụ mgbochi nye nkwusa nke ozi ọma ahụ, ọ ga-eyi ka ọ bụ n’ụzọ ọrụ ebube, n’Ọwụwa Anyanwụ Europe, akụkụ dị iche iche nke Africa, na n’ala ndị ọzọ. Ihe ahụ yiri ‘ịla azụ’ na-enye ohere ka a chịkọtakwuo “atụrụ” site n’ókèala ndị a ka meghepụrụ ọhụrụ.—Jọn 10:16.

3. N’ihi gịnị ka nghọta ọhụrụ anyị banyere “ọgbọ a” kwesịrị iji kpalie anyị ịnọ n’ọrụ Chineke n’echiche ịdị ngwa?

3 “Ọ gaghị anọ ọdụ,” ka onye amụma ahụ na-ekwu. Jisọs sịrị na ajọ usoro ihe dị ugbu a agaghị agabiga ruo mgbe “ihe ndị a nile ga-eme.” (Matiu 24:34) Nghọta ọhụrụ anyị nke okwu ya ọ̀ pụtara na ọrụ nkwusa anyị adịchaghị ngwa?a Ihe ndị na-eme na-egosi na ihe megidere nnọọ nke ahụ bụ eziokwu! Ọgbọ anyị na-adakpu n’ọnọdụ obi ọjọọ na mmerụ na-enweghị atụ n’akụkọ ihe mere eme dum bu ụzọ. (Tụlee Ọrụ 2:40.) Anyị kwesịrị iji echiche ịdị ngwa nọrọ n’ọrụ anyị. (2 Timoti 4:2) Amụma nile banyere oge oké mkpagbu ahụ na-egosi na ọ ga-abịa na mberede, n’egbughị oge, na nzuzo—dị ka onye ohi. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:1-4; Mkpughe 3:3; 16:15) “N’ihi nke a unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo: n’ihi na n’oge hour nke unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” (Matiu 24:44) Ka ọgbọ asọpụrụghị Chineke nke a nọ nso mkpochapụ, n’ezie anyị ekwesịghị ịchọ ịtụfu olileanya anyị dị oké ọnụ ahịa nke ndụ agwụghị agwụ site n’ịlaghachi “n’ịtụrụ n’apịtị” nke ihe ndọpụ uche dị iche iche nke ụwa!—2 Pita 2:22; 3:10; Luk 21:32-36.

4. Ọnọdụ dị aṅaa meworo ka a chọọ òkè “nri n’oge ya” ka ukwuu, oleekwa ụzọ e siworo gboo mkpa a?

4 Ná mmezu amụma Jisọs, na 1914 e nwere “mmalite ihe mgbu” ka ihe a kpọrọ mmadụ na-abanye ‘n’ọgwụgwụ oge a.’ Iru újú, ọdachi, na mmebi iwu amụbawo ruo ụbọchị a. (Matiu 24:3-8, 12) N’otu oge ahụ, Jehova enyewo òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche nke e tere mmanụ ọrụ inye ezinụlọ nke Onyenwe ha, Kraịst, “ihe e ji azụ ha n’oge ya.” (Matiu 24:45-47) Site n’ocheeze ya n’eluigwe, Eze Mesaịa a na-eduzi ugbu a usoro ihe omume dị ebube nke inye nri ime mmụọ gburugburu ụwa.

“Òkè Nri” Bara Ụba

5. Ihe bụ isi ná “nri” na-enweta nlebara anya dị aṅaa?

5 Tụlee nkwadebe nke “òkè nri.” (Luk 12:42) Ihe bụ isi n’usoro nri ndị Kraịst bụ Okwu Chineke, Bible. Iji zie Bible otú dị irè, nsụgharị na-ekwe ọgụgụ, nke ziri ezi, bụ isi ihe dị mkpa. N’afọ ndị na-agafenụ e gbowo mkpa a n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu, karịsịa na-amalite na 1950 mgbe e wepụtara New World Translation of the Christian Greek Scriptures na Bekee. Ka ọ na-erule 1961 e nwewo New World Translation nke Bible dum, n’oge na-adịghị anya ọ pụtakwara n’asụsụ ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ. Mpịakọta 3 e wepụtara n’ime afọ ije ozi 1996 na-eweta ngụkọta ya na 27, nke 14 n’ime ya bụ Bible zuru ezu. Iji hụ maka ọrụ a banyere Bible, tinyere ihe enyemaka dị iche iche maka ịgụ Bible, ihe dị ka ndị Kraịst 1,174 raara onwe ha nye na-arụ ọrụ nsụgharị ugbu a oge nile ná mba 77.

6. Olee otú Society siworo na-egbo mkpa agụụ maka mbipụta ndị e ji amụ Bible?

6 Iji kwado ọrụ usuu a nke ndị nsụgharị, alaka 24 na-ebi akwụkwọ nke Watch Tower Society anọwo na-ewepụta mbipụta dị iche iche n’ọnụ ọgụgụ na-ehiwanye nne. Iji mezuo nke a, a nọgidere na-eguzobekwu ígwè obibi akwụkwọ rotary na-ebi oké ọsọ ọsọ n’alaka ndị gbara ọkpụrụkpụ. Mbipụta nke magazin Ụlọ Nche na Teta! amụbawo kwa ọnwa kwa ọnwa, na-eru ngụkọta nke 943,892,500, bụ́ ịrị elu 13.4 pasent maka afọ ahụ. Ngụkọta mbipụta Bible na akwụkwọ ndị mkpo ha siri ike na United States, Brazil, Finland, Germany, Itali, Japan, Korea, na Mexico nanị arịwo elu 40 pasent site na 1995 ruo 76,760,098 na 1996. Alaka ndị ọzọ etinyewokwa ihe dị ukwuu n’ịrị elu nile ahụ ná mbipụta akwụkwọ.

7. Olee otú Aịsaịa 54:2 si na-enwekwu echiche ịdị ngwa ugbu a?

7 Mwepụ mgbochi dị iche iche megide Ndịàmà Jehova n’Ọwụwa Anyanwụ Europe na Africa emewo ka ihe dị ukwuu n’ịrị elu ahụ dị mkpa n’afọ ndị 1990. Agụụ maka nri ime mmụọ dị ukwuu n’ebe ndị a. N’ihi ya òkù ahụ na-adawanye ọkụ ọkụ: “Mee ka ebe ụlọikwuu gị saa mbara, ka ha setịakwa ákwà nkwụba nile nke ebe obibi gị nile; egbochila: mee ka ụdọ gị nile dị ogologo, meekwa ka ntu gị nile dị ike.”—Aịsaịa 54:2.

8. Nzaghachi mmesapụ aka dị aṅaa na-enye aka inye nkwado ego?

8 Ya mere, ọ dịwo mkpa iwusawanye ihe n’ọtụtụ n’ime alaka 104 nke Society. N’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba siri ike n’ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ókèala ndị mepere ọhụrụ, a na-akwụ ụgwọ ihe dị ukwuu ná mmefu ahụ site n’onyinye ndị a na-enye maka ọrụ ụwa dum site ná mba ndị ka baa ọgaranya. Ọ bụ ihe obi ụtọ na ọgbakọ na ndị mmadụ anọwo jiri obi ha nile na-azaghachi, ná mmụọ nke Ọpụpụ 35:21: “Ha wee bịa, onye ọ bụla nke obi ya kwaliri ya, na onye ọ bụla nke mmụọ ya mere ka o nwee afọ ofufo, ha wee weta àjà mbuli Jehova, iji jee ozi.” Anyị ji ohere a na-ekele ndị nile nọworo na-ekere òkè n’inye ihe ná mmesapụ aka a.—2 Ndị Kọrint 9:11.

9. Olee otú e si na-emezu Ndị Rom 10:13, 18 taa?

9 N’afọ 1996 mbipụta ndị nke Watch Tower Society n’ezie etowo aha na nzube dị iche iche nke Jehova ruo nsọtụ nile nke ụwa. Ọ bụ nnọọ dị ka Pọl onyeozi bu ụzọ kwuo. N’ihota amụma Joel na Abụ Ọma nke 19, o dere, sị: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya. Ma asị m, Ọ̀ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ezie, n’ụwa nile ka olu ha pụrụ jezuo, ná nsọtụ nile nke elu ụwa dum mmadụ bi ka okwu ha pụwokwara jezuo.” (Ndị Rom 10:13, 18) Site n’isi otú a bulie aha dị oké ọnụ ahịa bụ́ Jehova elu, ndị ya emezuwo akụkụ dị mkpa n’iji ebube mejuo ụlọ ofufe ya. Ma, olee otú mkpọsa a siworo gaa n’ihu kpọmkwem n’ime afọ 1996? Biko tụlee chaatị na-esonụ na peji 18 ruo 21.

Iwe Ihe Ubi Gburugburu Ụwa

10. Ihe dịgasị aṅaa gbara ọkpụrụkpụ ka ị rịbara ama n’ọrụ ndị Jehova, dị ka a chịkọtara ha na chaatị dị na peji nke 18 ruo 21?

10 Ọ dịbeghị mgbe ọzọ okwu Jisọs ndị a na-ahụ na Luk 10:2 nwere ike kanụ: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole: ya mere, na-arịọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.” Ị̀ na-aza òkù ahụ? Ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa na-aza ya. A na-egosipụta nke a n’ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu bụ ndị nkwusa Alaeze 5,413,769 nyere akụkọ ozi ubi n’afọ 1996. Ọzọkwa, e mere ụmụnna ọhụrụ 366,579 bụ́ ndị nwoke na ndị nwanyị baptism. Lee ka anyị si jiri ndị a “a na-achọsi ike nke mba nile” kpọrọ oké ihe, bụ́ ndị na-ekere òkè ugbu a ‘n’imejupụta ụlọ ofufe Jehova n’ebube’!—Hagaị 2:7.

11. N’ihi gịnị ka anyị nile ji nwee ihe mere obi ga-eji jupụta anyị n’ọṅụ?

11 Akụkọ nke mgbasa n’ubi ndị mepere ọhụrụ dịkwa oké ịrịba ama. Ndị ọzọ n’ime anyị hà na-atajiri ndị na-enwe uto dị otú a ugbu a anya? N’ụzọ megidere nke ahụ, anyị so ha na-aṅụrị. Mba nile nwere mmalite dị nta. Onye amụma biri ndụ n’oge Hagaị, bụ́ Zekaraịa, dere, sị: “Ònye ledaworo ụbọchị ihe nta anya?” (Zekaraịa 4:10) Ọṅụ juru anyị obi na n’ala ebe e guzobesiri ọrụ ịgba àmà ahụ ike, e nwere ugbu a ọtụtụ nde ndị nkwusa Alaeze, a na-arụzukwa ókèala mgbe mgbe, ọbụna kwa izu n’ọtụtụ obodo ukwu. Ọ̀ dị ihe mere anyị ga-eji kụda aka ka Jehova na-agbatịpụ ohere nzọpụta n’ebe ndị nọbu n’ọnọdụ na-adịghị mma? Tụfịa! “Ubi ahụ bụ ụwa,” ka Jisọs sịrị. (Matiu 13:38) A ghaghị ịnọgide na-agba àmà zuru ezu, dị nnọọ ka ndị na-eso ụzọ mbụ gbara àmà zuru ezu n’ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu.—Ọrụ 2:40; 10:42; 20:24; 28:23.

Ịnọgide Na-aga n’Ihu n’Ihu

12. Ihe mkpali dị aṅaa ka anyị nwere iji “na-aga n’ihu”? (Leekwa igbe, “Iwe Ihe Ubi ‘Si ná Nsọtụ Ụwa.’”)

12 Ee, anyị aghaghị ịnọgide na-azọ ije, soro ụgbọ ịnyịnya eluigwe Jehova nke ndị mmụọ ozi “na-aga n’ihu.” (Ezikiel 1:12) Anyị bu n’uche okwu Pita: “Onyenwe anyị anọghị ọdụ n’ime nkwa Ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama Ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịa ruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Ka ịnụ ọkụ n’obi kwesịrị nṅomi nke ụmụnna anyị n’ala ndị dara ogbenye n’ụzọ akụ̀ na ụba kpalie anyị. Ihe ọ bụla pụrụ iyi ịnọ ọdụ ná ntiwapụ nke Amagedọn na-enye ohere ka a chịkọbata ọtụtụ narị puku mmadụ n’ala ndị a nakwa ọtụtụ n’ebe ndị a rụworo ọrụ nke ọma. Ehiela ụzọ n’okwu a: “Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.” (Zefanaịa 1:14) E kwesịrị inwe ime ngwa n’akụkụ nke anyị kwa n’ịgba àmà ikpeazụ zuru ezu!

13, 14. (a) Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere nkesa akwụkwọ n’afọ 1996? (b) Atụmatụ dịgasị aṅaa pụrụ iche ka ọgbakọ nile pụrụ ime kwa afọ, oleekwa otú i si na-eme atụmatụ ikere òkè?

13 Ọ bụ ezie na nkọwa zuru ezu apụtaghị na chaatị ije ozi ahụ, e nwewo ịrị elu dị ịrịba ama ná nkesa Bible, akwụkwọ, na magazin n’ime afọ gara aga. Dị ka ihe atụ, ntinye magazin gburugburu ụwa gosiri ịrị elu 19 pasent, na-etinye ngụkọta nke 543,667,923. Magazin anyị na-adaba n’ụdị nkwusa dị iche iche—n’okporo ámá, n’ogige ntụrụndụ, n’ebe bọs na-akwụsị, n’ebe achụmnta ego. Akụkọ na-egosi na n’ókèala ụfọdụ ebe e kwusaworo Alaeze ahụ nke ukwuu, otú magazin anyị na-adị amasịwo ndị ọkà, ha na-anakwerekwa ọmụmụ Bible.

14 Kwa afọ n’ọnwa April, ọtụtụ ọgbakọ na-ahazikarị ọrụ magazin pụrụ iche, na-enwe mkpọsa ogologo ụbọchị dum site n’ụlọ ruo n’ụlọ na n’ebe ọha dị iche iche. Ọgbakọ unu ọ̀ ga-ekere òkè na nke a n’April 1997? A kwadebewo mbipụta April ndị pụrụ iche nke Ụlọ Nche na Teta!, nkesa ha e mere n’otu oge gburugburu ụwa kwesịrị ịkpa ike n’ezie! N’àgwàetiti Saịprọs, ọgbakọ nile, n’iji okwu e ji mara ha bụ́ “iji ozi Alaeze ahụ eru onye ọ bụla a pụrụ iru” eme ihe, ọbụna jiri ọrụ magazin e mere ndokwa ya otú ahụ na-esochi kwa ọnwa, na-eru ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu bụ́ 275,359 e tinyere n’afọ ahụ, ịrị elu nke 54 pasent.

Ozi Ndị Ikpeazụ nke Hagaị

15. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji zikwuo ozi site n’ọnụ Hagaị? (b) Ihe mmụta dị aṅaa ka ozi Hagaị nke atọ kwesịrị inye anyị?

15 Jehova nyere Hagaị, ụbọchị 63 mgbe o zisịrị ozi nke abụọ ya, mkpọsa nke atọ nke anyị pụrụ iburu nnọọ n’obi taa. Hagaị kwuru okwu dị ka a ga-asị na ndị Juu na-atọ ntọala ụlọ ukwu ahụ, nke ha tọworo n’ezie afọ 17 bu ụzọ. Ọzọkwa Jehova hụrụ na o kwesịrị ekwesị ime nhicha. Ndị nchụàjà na ndị mba ahụ akụdawo aka, n’ihi ya kwa ghara ịdị ọcha n’anya Jehova. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị Jehova akụdawo aka taa, ọbụna na-etinye onwe ha n’ụzọ dị iche iche nke ụwa nke ime ihe masịrị onye na ịhụ ihe onwunwe n’anya? Ọ dị ngwa na anyị nile tụkwasịrị obi anyị “site n’ụbọchị taa na n’ihu” (NW) n’iwetara aha Jehova otuto, na-enwe obi ike ná nkwa ya: “Site n’ụbọchị taa ka M ga na-agọzi unu.”—Hagaị 2:10-19; Ndị Hibru 6:11, 12.

16. ‘Ime mkpatụ’ dị aṅaa dị nso, gịnịkwa ka ọ ga-arụpụta?

16 N’otu ụbọchị ahụ, okwu “Jehova nke usuu nile nke ndị agha” ruru Hagaị ntị nke ugboro anọ na nke ikpeazụ. O mere ka a mata ihe dị na Ya “ime ka eluigwe na ụwa . . . mee mkpatụ,” na-asị: “M ga-akwatukwa ocheeze nke alaeze nile, M ga-ekpochapụkwa ike nke alaeze nile nke mba nile; M ga-akwatukwa ụgbọala, na ndị na-anọkwasị ha; ịnyịnya na ndị na-anọkwasị ha ga-arịdakwa, onye ọ bụla site ná mma agha nwanne ya.” (Hagaị 2:6, 21, 22) ‘Ime mkpatụ’ ahụ ga-eru ọgwụgwụ ya mgbe Jehova hichasịrị ụwa kpam kpam n’Amagedọn. Mgbe ahụ “ihe a na-achọsi ike nke mba nile” ga-abịaworị, iguzobe akụkụ bụ isi nke ọha mmadụ maka ụwa ọhụrụ ahụ. Lee ihe na-akpata ọṅụ na inye Jehova otuto ha bụ!—Hagaị 2:7; Mkpughe 19:6, 7; 21:1-4.

17. Olee otú e siworo setịpụ Jisọs dị ka “mgbaaka akara”?

17 N’imechi amụma ya, Hagaị na-ede, sị: “N’ụbọchị ahụ, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta), ka M ga-ewere gị, Zerubabel . . . , mee gị ka ị dị ka mgbaaka akara: n’ihi na gị ka M họpụtaworo; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta.” (Hagaị 2:23) Kraịst Jisọs bụ ugbu a n’ụzọ ihe atụ Eze Mesaịa na Onyeisi Nchụàjà nke Jehova, na-ejikọta n’eluigwe ọkwá nke Onye Ọchịchị Zerubabel na Onyeisi Nchụàjà Joshua nọrọ iche iche na Jerusalem elu ụwa. Dị ka mgbaaka akara nke ọkwá n’aka nri Jehova, Jisọs bụ onye ghọworo “Ee” dị ka ngwá ọrụ Jehova n’imezu ọtụtụ “nkwa nke Chineke.” (2 Ndị Kọrint 1:20; Ndị Efesọs 3:10, 11; Mkpughe 19:10) Ozi amụma dum nke Bible lekwasịrị anya ná ndokwa Jehova nke Kraịst dị ka Eze na Onye Mgbapụta na-achụ àjà.—Jọn 18:37; 1 Pita 1:18, 19.

18. Olee otú “ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta” n’ikpeazụ ga-esi nwee mmezu na-enye ume ọhụrụ?

18 N’ezie n’ụbọchị anyị a, a ga-achọta ebube kasị ukwuu n’ụlọ ukwu ime mmụọ na-egbuke egbuke nke Jehova! N’isi nso kwa, mgbe Jehova zachapụrụ usoro ihe nile nke Setan, Hagaị 2:9 ga-enwekwu mmezu na-eme obi ụtọ: “N’ebe a ka M ga-enye udo; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta.” Udo n’ikpeazụ!—udo na-adịgide adịgide, n’eluigwe na ụwa, nke e mesiri ike site ná “mgbaaka akara” Jehova, Kraịst Jisọs, “Onyeisi Udo,” onye e dere banyere ya, sị: “Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onye isi Ya na udo Ya ga-agwụ . . . Ekworo Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-eme nke a.” (Aịsaịa 9:6, 7) Ruo mgbe nile ebighị ebi a ga na-egosipụta ebube nke ụlọ ofufe Jehova n’ókèala nile nke udo nke ọbụbụeze eluigwe na ala ya. Ka anyị nọgide mgbe nile n’ụlọ ahụ!—Abụ Ọma 27:4; 65:4; 84:10.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  Lee “Ndị A Zọpụtara n’Aka ‘Ajọ Ọgbọ’” na “Oge Ịmụrụ Anya” ná mbipụta Ụlọ Nche nke November 1, 1995.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ N’ụzọ dị aṅaa, taa, ka ụlọ Jehova si bụrụ nke ‘a na-emejupụta n’ebube’?

◻ N’ihi gịnị ka ọ na-enwebeghị mgbe ọ dịrị ngwa karị ikwusa ozi ọma ahụ?

◻ Ihe mkpali dị aṅaa ime nkwusa n’ụzọ dị ngwa ka Akụkọ Afọ Ije Ozi 1996 na-enye?

◻ Olee otú Kraịst si na-eje ozi dị ka “mgbaaka akara” Jehova?

[Igbe dị na peeji nke 15]

Iwe Ihe Ubi “Si ná Nsọtụ Ụwa”

N’AỊSAỊA 43:6, anyị na-agụ ihe Jehova nyere n’iwu: “Egbochila: mee ka ụmụ m ndị ikom si n’ebe dị anya bịa, gị meekwa ka ụmụ m ndị inyom si ná nsọtụ ụwa bịa.” Akụkụ akwụkwọ nsọ a na-enwe mmezu pụrụ iche taa n’Ọwụwa Anyanwụ Europe. Were dị ka ihe atụ, mba Kọmunist n’oge mbụ bụ́ Moldova. E nwere obodo nta ebe ndị ihe ruru ọkara ụba mmadụ bụ Ndịàmà ugbu a. Ha aghaghị ime ogologo njem iji chọta ókèala maka ime nkwusa, ma ha na-etinye mgbalị dị mkpa! Ọtụtụ ndị nkwusa n’ọgbakọ ndị a bụ ụmụ nne na nna ndị a chụlagara Siberia ná mmalite afọ ndị 1950. Ugbu a ezinụlọ ha dị iche iche na-ebute ụzọ n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ. N’ime ndị nkwusa 12,565, e mere 1,917 baptism n’afọ a gara aga. Iri anọ na atọ n’ime ọgbakọ ndị ahụ nwere ihe dị ka ndị nkwusa 150 n’otu n’otu, sekit ­amụbawokwa site n’anọ ruo asatọ n’afọ ije ozi ọhụrụ.

Mmụba e nwere n’Albania dịkwa ịrịba ama. N’ebe ahụ Ndịàmà ole na ole na-anọgidesi ike n’ihe tachiri obi n’ọchịchị aka ike ndị kasị njọ n’ihe dị ka afọ 50. E gburu ụfọdụ n’ime ha. Nke a na-echetara anyị nkwa Jisọs: “Atụla ahụhụ nile ị gaje ịhụ egwu: lee, ekwensu gaje ịtụba ụfọdụ n’etiti unu n’ime ụlọ mkpọrọ, ka e wee nwaa unu . . . Gosi onwe gị onye kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, M ga-enyekwa gị okpueze ahụ, bụ́ ndụ.” (Mkpughe 2:10; leekwa Jọn 5:​28, 29; 11:​24, 25.) Gịnị ka anyị na-ahụ ugbu a n’Albania? N’ezie mmezu dị ịrịba ama nke nkwa Jehova a na-ahụ n’Aịsaịa 60:22: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku]”! Na 1990 nanị otu onye nkwusa nyere akụkọ ozi n’Albania. Otú ọ dị, “ndị ọrụ” ọzọ site n’Itali na ala ndị ọzọ zara òkù Jisọs kpọrọ: “Gaanụ, mee . . . ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism.” (Matiu 28:19; Luk 10:2) Ka ọ na-erule oge Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs na 1996, 773 ndị nkwusa na-arụ ọrụ n’ubi ahụ, ndị a chịkọtakwara mmadụ 6,523 ná nzukọ Ememe Ncheta ha, ihe karịrị okpukpu asatọ nke ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa! E nwetara ọnụ ọgụgụ ndị na-atụ n’anya site n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ. Ọ bụ ezie na e nweghị ndị nkwusa ọ bụla bi ebi n’ebe ahụ, obodo Kukës na Divjakë nwere mmadụ 192 na 230 bịara n’otu n’otu. Krujë, nke nwere nanị otu onye nkwusa, nwere 212 nọ ya. Ndị nkwusa 30 na Korçë natara ụlọ ná ngo maka ihe ruru mmadụ 300. Mgbe ọnụ ọgụgụ ahụ jupụtaworo ime ụlọ ahụ, a ghaghị igbochi mmadụ 200 ọzọ ebe ọ bụ na e nwekwaghị ohere. N’ezie ọ bụ ubi chaworo maka owuwe ihe ubi!

Na Romania ka akụkọ nke a si bịa: “Ka anyị na-arụ ọrụ ụlọ n’ụlọ, anyị zutere otu onye sịrị na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova ma biri n’otu obodo nta ebe, dị ka anyị maara, a na-enweghị Ndịàmà ọ bụla. Ọ gwara anyị na e wezụga ya e nwere mmadụ 15 ọzọ nọworo ruo ọtụtụ afọ na-enwe nzukọ na Thursday na Sunday nakwa na ha amalitewo ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’echi ya anyị gara n’obodo ahụ. Ndị nọ na-eche anyị n’ọnụ ụlọ abụọ bụ ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka 15, bụ́ ndị naara akwụkwọ 20 na magazin 20 kasị ọhụrụ. Anyị gosiri ha otú e si eduzi ọmụmụ Bible. Anyị bụkọrọ abụ ma zaa ajụjụ ha ndị kasị mkpa. Onye nke na-edu ndú n’etiti ìgwè ahụ kwupụtara, sị: ‘Ụbọchị ole na ole gara aga, eji m anya mmiri kpegara Jehova ekpere ka o zitere anyị onye ọzụzụ atụrụ, a zawokwa ekpere m.’ Obi tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu, mgbe anyị lawakwara, dị ka nwa mgbei nke mesịrị chọta nna, ọ sịrị: ‘Biko unu echezọla anyị. Bịanụ leta anyị ọzọ!’ Anyị mere nke ahụ, ugbu a kwa a na-eduzi ọmụmụ Bible asaa n’obodo ahụ. N’ọtụtụ ókèala a na-akpabeghị aka, ọrụ ahụ na-eji akwụkwọ Bible, nke a na-enwe ekele dị ukwuu maka ha, amalite n’ụzọ dị ịtụnanya, nke a na-egosikwa na ọrụ a sitere n’aka Chineke.”

[Chaatị dị na peeji nke 18-21]

AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 1996 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE

(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

A na-achịkọbata “ihe a na-achọsi ike nke mba nile” n’Àgwàetiti nile nke Oké Osimiri (1), Ndịda America (2), Africa (3), Esia (4), Ugwu America (5), na Europe (6)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya