Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Na 1 Pita 2:9, “King James Version” kpọrọ ndị Kraịst e tere mmadụ “ọgbọ a họpụtara.” Nke a ò kwesịrị imetụta echiche anyị banyere ojiji Jisọs ji “ọgbọ” nke e dekọrọ na Matiu 24:34 mee ihe?
Okwu ahụ bụ́ “ọgbọ” na-apụta ná nsụgharị nke amaokwu abụọ ahụ ná nsụgharị ụfọdụ. Dị ka King James Version si kwuo, Pita onyeozi dere, sị: “Ma unu bụ ọgbọ a họpụtara, ndị nchụàjà bụ eze, mba dị nsọ, ndị pụrụ iche; ka unu wee gosipụta otuto nile nke onye kpọpụtaworo unu n’ọchịchịrị banye n’ìhè ya dị ebube.” Jisọs bukwara amụma, sị: “N’ezie asị m unu, Ọgbọ a agaghị agafe, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme.”—1 Pita 2:9; Matiu 24:34.
N’amaokwu nke bu ụzọ, Pita onyeozi jiri okwu Grik bụ́ geʹnos mee ihe, ebe anyị na-ahụ ge·ne·aʹ n’ihe odide nke okwu Jisọs. Okwu Grik abụọ a pụrụ ịdị ka ha yiri, ha abụọ sitekwara n’otu okwu; ma, ha bụ bụ okwu abụọ dị iche, ha pụtakwara ihe ndị dị iche. New World Translation of the Holy Scriptures—With References na-ekwu ná nkọwa ala ala peji nke 1 Pita 2:9, sị: “‘Agbụrụ.’ Gr., geʹnos; nke dị iche na ge·ne·aʹ, ‘ọgbọ,’ dị ka ọ dị na Mt 24:34.” A na-achọta nkọwa ala ala peji ya na ya kwekọrọ na Matiu 24:34.
Dị ka nkọwa ala ala peji ndị ahụ na-egosi, a na-eji okwu Bekee nke pụtara “agbụrụ” asụgharị geʹnos n’ụzọ kwesịrị ekwesị, dị ka a na-ahụkarị n’ọtụtụ nsụgharị Bekee. Na 1 Pita 2:9, Pita ji amụma ahụ dị n’Aịsaịa 61:6 mee ihe n’ebe ndị Kraịst e tere mmanụ ndị nwere olileanya eluigwe nọ. E si n’ọtụtụ mba na ebo dọta ndị a, ma a na-ewezụga ebe a mụrụ ha n’anụ ahụ n’ụsọ ka ha na-aghọ akụkụ nke mba Israel ime mmụọ. (Ndị Rom 10:12; Ndị Galetia 3:28, 29; 6:16; Mkpughe 5:9, 10) Pita mere ka a mata ha dị ka ndị ghọrọ ìgwè dị iche n’echiche ime mmụọ—“agbụrụ a họpụtara, ndị nchụàjà bụ eze, mba dị nsọ, ndị bụ ihe onwunwe pụrụ iche.”—NW.
Ma n’ihe odide Grik nke okwu Jisọs ndị dị na Matiu 24:34, anyị na-ahụ okwu bụ́ ge·ne·aʹ. Ọ bụ ihe a ghọtara n’ebe nile na Jisọs na-ezo aka, ọ bụghị n’ebe “agbụrụ” ọ bụla nke mmadụ nọ, kama n’ebe ndị na-ebi n’otu oge nọ.
Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị afọ gara aga, Charles T. Russell, bụ́ onye isi oche mbụ nke Watch Tower Society, mere ka nke a doo anya, na-ede, sị: “Ọ bụ ezie na okwu bụ́ ‘ọgbọ’ na ‘agbụrụ’ bụ ndị a pụrụ ikwu na ha sitere n’otu okwu ma ọ bụ n’otu ebe, ma ha abụghị otu ihe; n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ sikwa jiri ha mee ihe okwu abụọ ahụ dị nnọọ iche. . . . N’ihe ndekọ atọ dị iche iche nke amụma a, a sị na Onyenwe anyị ji okwu Grik dị iche kpam kpam (genea) mee ihe bụ́ nke na-apụtaghị agbụrụ, kama ọ pụtara otu ihe ahụ ya na okwu Bekee anyị pụtara ọgbọ. Ojiji ndị ọzọ e ji okwu Grik nke a (genea) mee ihe na-egosi na e jighị ya mee ihe ịpụta agbụrụ, kama n’izo aka n’ebe ndị mmadụ na-ebikọ ndụ n’otu oge nọ.”—The Day of Vengeance, peji nke 602-603.
Na nso nso a karị, akwụkwọ bụ́ A Handbook on the Gospel of Matthew (1988), bụ́ nke e dere maka ndị na-asụgharị Bible, kwuru, sị: “[New International Version] sụgharịrị ọgbọ a n’ụzọ nkịtị kama nkọwa ala ala peji sochiri ya, ‘Ma ọ bụ agbụrụ.’ Otu onye ọkà mmụta Agba Ọhụrụ kwenyere na ‘Matiu ebughị nanị ọgbọ mbụ mgbe Jisọs nọsịrị n’uche kama ọgbọ nile nke okpukpe ndị Juu ndị jụrụ ya.’ Otú ọ dị, e nweghị ihe àmà ọ bụla nke asụsụ iji nwapụta nke ọ bụla n’ime nkwubi okwu ndị a, aghaghịkwa ileghara ha anya dị ka mgbalị ndị a na-eme iji zere ihe doro anya ọ pụtara. N’ọnọdụ ya mbụ, izo aka ahụ bụ nanị n’ebe ndị ha na Jisọs n’onwe ya bikọrọ ndụ nọ.”
Dị ka a tụlere na peji nke 10 ruo nke 15, Jisọs katọrọ ọgbọ ndị Juu nke oge ya, ndị ha na ya bikọrọ ndụ bụ́ ndị jụrụ ya. (Luk 9:41; 11:32; 17:25) Ọtụtụ mgbe o jiri okwu ndị na-akọwa ihe ndị dị ka “ajọ ọgbọ nke na-akwakwa iko,” “ọgbọ na-enweghị okwukwe, nke nwekwara anya uhie,” na “ọgbọ a nke na-akwa iko, nke na-emehiekwa” mee ihe n’ịkọwa ọgbọ ahụ. (Matiu 12:39; 17:17; Mak 8:38) Mgbe ikpeazụ Jisọs jiri “ọgbọ” mee ihe, ọ nọ n’elu Ugwu Olive ya na ndị ozi anọ. (Mak 13:3) Ndị ikom ahụ, ndị a na-ejibeghị mmụọ nsọ tee mmanụ nke ha na-abụkwanụ akụkụ nke ọgbakọ ndị Kraịst, n’ezie abụghị ha mejupụtara “ọgbọ” ma ọ bụ agbụrụ nke ndị mmadụ. Otú ọ dị, ha maara nke ọma ojiji Jisọs na-eji okwu bụ́ “ọgbọ” eme ihe n’izo aka n’ebe ndị ha na ya bikọrọ ndụ nọ. Ya mere n’ụzọ ezi izu dị na ya ha ga-aghọta ihe o bu n’uche mgbe ikpeazụ o kwuru “ọgbọ a.”a Ka nke ahụ gasịrị, Pita onyeozi, bụ́ onye nọ n’ebe ahụ, gbara ndị Juu ume, sị: “Zọpụtanụ onwe unu n’ọgbọ a dị mgbagọ.”—Ọrụ 2:40.
Ọtụtụ mgbe anyị ebipụtawo ihe àmà na-egosi na ọtụtụ ihe Jisọs buru n’amụma n’otu okwu a (dị ka agha, ala ọma jijiji, na ụnwụ nri) mezuru n’agbata oge o ji buo amụma ahụ na mbibi nke Jerusalem na 70 O.A. Ọtụtụ, kama ọ bụghị ha nile. Dị ka ihe atụ, e nweghị ihe àmà ọ bụla na-egosi na mgbe ndị Rom wakposịrị Jerusalem (66-70 O.A.) na “ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ” pụtara, na-akpatara “ebo nile nke ụwa” iti aka n’obi. (Matiu 24:30) Ya mere, mmezu ahụ n’agbata 33 O.A. na 70 O.A. aghaghị ịbụ nanị nke mbụ, ọ bụghị mmezu ya zuru ezu ma ọ bụ mmezu sara mbara nke Jisọs na-ezokwa aka na ya.
N’okwu mmeghe ya nke nsụgharị akwụkwọ Josephus bụ́ The Jewish War, G. A. Williamson na-ede, sị: “Ndị na-eso ụzọ ahụ, ka Matiu na-agwa anyị, ajụworị [Jisọs] ajụjụ gbara mkpị—banyere mbibi nke Ụlọ Nsọ ahụ na banyere ọbịbịa ikpeazụ nke Ya—O nyekwara ha azịza gbara mkpị, akụkụ nke mbụ bụ́ nke buru amụma n’ụzọ doro anya ihe ndị a kara aka ga-eme bụ́ ndị Josephus kọwara n’ụzọ zuru ezu.”
Ee, ná mmezu nke mbụ ya, “ọgbọ a” dị ka ihe àmà na-egosi pụtara otu ihe ahụ dịkwa ka ọ pụtara n’oge ndị ọzọ—ọgbọ ndị Juu na-ekweghị ekwe ndị biri ndụ n’otu oge. “Ọgbọ” ahụ agaghị agabiga n’ahụghị ihe Jisọs buru n’amụma. Dị ka Williamson si kwuo, nke a ghọrọ eziokwu n’ime iri afọ ndị dị tupu mbibi Jerusalem, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme nke ji anya ya hụ ihe merenụ, bụ́ Josephus, si kọwaa.
Ná mmezu nke abụọ ma ọ bụ nke ka buo ibu, “ọgbọ a” n’ụzọ ezi uche dị na ya ga-abụkwa ndị biri ndụ n’otu oge. Dị ka isiokwu ahụ malitere na peji nke 16 mere ka ọ pụta ìhè, ọ dịghị anyị mkpa ikwubi na Jisọs na-ezo aka n’ọnụ ọgụgụ afọ a kara aka ndị mejupụtara otu “ọgbọ.”
N’ụzọ dị iche na nke ahụ, a pụrụ ikwu isi ihe abụọ banyere oge ọ bụla “ọgbọ” na-ezo aka na ya. (1) A pụghị iwere otu ọgbọ nke ndị mmadụ dị ka oge nke nwere ọnụ ọgụgụ afọ a kara aka, dị ka ọ dị n’ihe banyere oge nke nwere ọnụ ọgụgụ afọ a kara aka (afọ iri ma ọ bụ narị afọ). (2) Ndị mmadụ nọ n’otu ọgbọ na-adị ndụ nanị ruo mkpirikpi oge, ọ bụghị ruo ogologo oge.
N’ihi ya, mgbe ndị ozi ahụ nụrụ ka Jisọs zoro aka n’ebe “ọgbọ a” dị, gịnị ka ha ga-eche? Ọ bụ ezie na anyị, n’ihi ịhụ ya mgbe ọ gasịworo, maara na mbibi nke Jerusalem ná “mkpagbu ukwu” ahụ bịara mgbe 37 afọ gasịrị, ndị ozi ahụ na-anụ ihe Jisọs na-ekwu apụghị ịmata nke ahụ. Kama nke ahụ, nhota o hotara “ọgbọ” gaara enyeworị ha echiche, ọ bụghị nke ogologo oge dị ukwuu, kama ndị na-ebi n’ime oge dị nanị mkpirikpi. Otu ihe ahụ bụkwa eziokwu n’ọnọdụ anyị. Mgbe ahụ, lee ka okwu Jisọs ndị sochiri si kwesị ekwesị: “Ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị na oge hour ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara. . . . N’ihi nke a unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo: n’ihi na n’oge hour nke unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.”—Matiu 24:36, 44.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’okwu ahụ bụ́ “ọgbọ a,” otu ụdị nnọchiaha na-emesi ihe ike nke bụ́ houʹtos kwekọrọ nnọọ nke ọma n’okwu Bekee pụtara “nke a.” Ọ pụrụ izo aka n’ihe dị mgbe ahụ ma ọ bụ ihe nọ n’ihu onye ahụ na-ekwu okwu. Ma ọ pụkwara ịpụta ihe ndị ọzọ. Akwụkwọ bụ́ Exegetical Dictionary of the New Testament (1991) na-ekwu, sị: “Okwu bụ́ [houʹtos] na-egosi eziokwu doro anya dị mgbe ahụ. N’ihi ya [aion houʹtos] bụ ‘ụwa nke dị ugbu a’ . . . [geneaʹ haute] bụkwa ‘ọgbọ dị ndụ ugbu a’ (dị ka ihe atụ, Mat 12:41f., 45; 24:34).” Doctor George B. Winer na-ede, sị: “Nnọchiaha bụ́ [houʹtos] na-ezo aka mgbe ụfọdụ, ọ bụghị n’ebe mkpọaha kasị dịrị nso dị, kama na nke dị anya karị, bụ́ nke, dị ka ihe bụ isi a na-ekwu maka ya, bụ nke kasị dịrị nso n’uche, nke kasị dịrị n’echiche nke onye edemede ahụ.”—A Grammar of the Idiom of the New Testament, mbipụta nke 7, 1897.