Ndụ na Ije Ozi Jisọs
Inwe Obi Ike n’Ụbọchị Ndị Ikpeazụ
KA TUESDAY, Naịsan 11, na-abịaru ná njedebe, Jisọs na ndị ozi ya nọ n’Ugwu Olive. Ọ dịbeghị anya ha hapụrụ akụkụ ebe ụlo nsọ ahụ dị bụ́ nke ha pụrụ ịhụ n’ebe dị n’okpuru ha, Jisos anọwokwa na-agwa ha okwu banyere ihe ịrịba ama nke onụnọ ya n’ike Alaeze na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a.
N’ịga n’ihu n’okwu ya, Jisọs dọrọ ha aka ná ntị banyere ịgbaso Kraịst ụgha dị iche iche. O kwuru na a ga-eme mgbalị “iduhie ọbụna ndị a họpụtara, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.” Ma, dị ka ugo nke na-ahụ ihe dị n’ebe dị anya, ndị a a họpụtara ga-ezukọ n’ebe a pụrụ ịchota ezi ihe oriri ime mmụọ, ya bụ, n’ebe ezi Kraịst ahụ nọ n’oge ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya. A gaghị eduhie ha, a gaghị achịkọtakwa ha n’ebe Kraịst ụgha nọ.
Kraịst ụgha dị iche iche ga-apụta nanị n’ebe a ga-ahụ ha anya. Ma, n’ụzo na-eyighị nke a, ọnụnọ Jisọs ga-abụ nke a na-adịghị ahụ anya. Ọ ga-ewere ọnọdụ n’oge dị oké egwu n’akụko ihe mere eme nke mmadụ, dị ka Jisos kwuru, sị: “Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya.” Ee, nke a ga-abụ oge kasị gbaa ọchịchịrị n’ịdi adị nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ ga-adị ka à ga-asi na e mewo ka anyanwụ gbaa ọchịchịrị n’oge ehihie, dịkwa ka à ga-asị na ọnwa adịghị enye ìhè ya n’anyasị.
“A ga-emekwa ka ike nile nke eluigwe mee mkpatụ,” ka Jisọs gara n’ihu ikwu. O si otú a gosi na eluigwe a na-ahụ anya ga-enwe ọdịdị na-atụ egwu. Mbara igwe agajeghị ịbụ nanị ebe obibi nke nnụnụ dị iche iche, kama ha ga-ejụpụta n’ụgbọ elu e ji ebu agha, rọketi, na ígwè nnyocha mbara igwe dị iche iche. Egwu na ime ihe ike nke ga-adị n’oge ahụ ga-akarị ihe ọ bụla a hụtụworo n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ tupu mgbe ahụ.
Jisos kwuru na n’ihi nke a, “mkpagbụ nke mba dị iche iche ga-adịkwa, ndị nọ n’obi abụo n’ihi mbigbọ nke okè osimiri na ebili mmiri; mmadụ na-atụbo site n’egwu, sitekwa n’ile anya ihe na-abịakwasị n’elu ụwa dum mmadụ bi.” N’eziokwụ, oge a kasi gbaa ọchịchịrị n’ịdị adi nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-eduje n’oge ahụ mgbe, dị ka Jisos kwuru, “ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụtakwa ìhè n’eluigwe: mgbe ahụ ka ebo nile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi.”
Ma ọ bụghị mmadụ nile ga na-eti aka n’obi mgbe ‘Nwa nke mmadụ bịara n’ike’ ibibi ajọ usoro ihe nke a. ‘Ndị ahụ a hopụtara,’ bụ́ 144,000 ndị ga-eso Kraịst kere òkè n’Alaeze eluigwe, agaghị eti aka n’obi, ndị enyi ha. bụ́ ndị ahụ Jisos kpọwororịị “atụrụ ọzọ” nke ya agaghị etikwa aka n’obi. N’agbanyeghị na ha na-ebi n’ime oge kasị gbaa ọchịchịrị n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, ndị a na-anakwere agbamume Jisọs nke bụ:
“Mgbe ihe ndị a malitere ime, leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.”
Ka ndị na-eso ụzọ ya, ndị ga-adị ndụ n’oge mgbe ikpeazụ wee nwee ike ịmata ịdị nso nke ọgwụgwụ ahụ, Jisọs nyere ihe atụ nke a: “Leenụ osisi fig, na osisi nile: mgbe ọ bụla ha puru epu ugbu a, unu hụrụ ya marakwa n’onwe unu na mgbe okpomọkụ dị nso ugbu a. Otú a unu onwe unu kwa, mgbe ọ bụla ụnu ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-apụta maranụ na alaeze Chineke dị nso. N’ezie asị m unu, Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe nile ga-eme.”
Otú a, mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ọtụtụ akụkụ dị iche iche nke ihe ịrịba ama ahụ ka ha na-emezu, ha kwesịrị ịghọta na ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a dị nso, na Alaeze Chineke gajekwa ikpochapụ ajọ omume nile n’oge na-adịghị anya. N’eziokwu, ọgwụgwụ ahụ ga-abịa n’oge ndị hụrụ mmezụ nke ihe ndị ahụ nile Jisọs buru n’amụma ka dị ndụ! Mgbe ọ na-enye ndị ahụ na-eso ụzọ, bụ́ ndị ga-adị ndụ n’oge ikpeazụ ndị a dị okè mkpa ndụmodụ, Jisọs sịrị:
“[Lezienụ onwe unu anya, NW], ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe okè, na ịṅụbiga mmanya okè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ wee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà: n’ihi na otú a ka o ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile. Ma mụrụnụ anya n’oge ọ bụla, na-arịọ arịrịọ, ka unu wee [nwee ihe ịga nke ọma, NW] ịgbanarị ihe nile ndị a nke gaje ime, na iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.” Matiu 24:23-51; Mak 13:21-37; Luk 21:25-36; Mkpughe 14:1, 3; Jọn 10:16.
◆ Ọnọdụ ụwa dịgasị aṅaa na-aka ọnụnọ Kraịst akara?
◆ Olee mgbe ‘ebo nile nke ụwa ga-eti aka n’obi,’ ma gịnị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst ga-anọ na-eme?
◆ Ihe atụ dị aṅaa ka Jisọs nyere ịji nyere ndị gaje ịbụ ndị na-eso ụzọ ya n’ọdịnihu aka ịghọta mgbe ọgwụgwu ahu dịrị nso?
◆ Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị ga-adị ndụ n’ime mgbe ikpeazụ ahụ?