-
“Ka Alaeze Gị Bịa”Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
-
-
15, 16. Ole ndị bụ “ọgbọ a” Jizọs kwuru okwu ya?
15 Ma, olee mgbe Alaeze Chineke ga-emecha bịa? Jizọs agwaghị anyị hoo haa mgbe ọ ga-abịa. (Mat. 24:36) Ma, ọ gwara anyị ihe ndị ga-eme ka anyị mata na Alaeze Chineke dị ezigbo nso. Jizọs kwuru na Alaeze Chineke ga-abịa mgbe “ọgbọ a” o kwuru okwu ya ga-ahụ ihe ndị ahụ ga-eme n’ụwa a ga-eji mara ọgwụgwụ usoro ihe a. (Gụọ Matiu 24:32-34.) Ole ndị bụ “ọgbọ a”? Ka anyị lebakwuo anya n’ihe ahụ Jizọs kwuru.
16 “Ọgbọ a.” Ọ̀ bụ ndị na-ekweghị ekwe ka Jizọs kpọrọ ọgbọ a? Mbanụ. Ole ndị ka Jizọs gwara okwu a? Ọ bụ ndịozi ya ole na ole. Ndịozi ya ole na ole a “bịakwutere ya naanị ha.” (Mat. 24:3) A ga-eji mmụọ nsọ tee ndịozi ya mmanụ n’oge na-adịghị anya. Ihe ọzọ ga-enyekwara anyị aka ịghọta ndị Jizọs kpọrọ ọgbọ a bụ ihe ndị o kwuru tupu ya ekwuo gbasara ọgbọ a. Jizọs gwara ndịozi ya ahụ, sị: “Dị ka ihe atụ, sinụ n’osisi fig mụta isi ihe a: Ozugbo alaka ọhụrụ ya dịwara nro, o wee na-epupụta akwụkwọ, unu na-amara na oge okpomọkụ dị nso. Otú ahụkwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile, maranụ na ọ nọ nso n’ọnụ ụzọ.” Ọ bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs e tere mmanụ ga-ahụ mgbe ihe ndị ahụ Jizọs kwuru na ọ ga-eme mewere. Ihe ndị ahụ mewe, ọ bụkwa ha ga-aghọta ihe ha pụtara, ya bụ, na Jizọs “nọ nso n’ọnụ ụzọ.” Ndị na-ekweghị ekwe agaghị aghọta ihe ihe ndị ahụ pụtara. N’ihi ya, ndị Jizọs bu n’obi mgbe ọ na-ekwu gbasara “ọgbọ a,” bụ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ.
17. Gịnị ka okwu bụ́ “ọgbọ” pụtara? Gịnịkwa ka okwu bụ́ “ihe ndị a niile” pụtara?
17 “Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị ruo mgbe ihe ndị a niile mere.” Olee otú ihe a Jizọs kwuru ga-esi mee? E nwere ihe abụọ anyị kwesịrị ibu ụzọ ghọta iji nwee ike ịma otú ọ ga-esi mee. Nke mbụ bụ ịghọta ihe okwu ahụ bụ́ “ọgbọ” pụtara. Nke abụọ bụ ịghọta ihe “ihe ndị a niile” pụtara. Okwu bụ́ “ọgbọ” na-apụtakarị ndị na-abụghị ebiri, ndị nọrọ ndụ n’otu oge. Otu ọgbọ anaghị eto oké ogologo. Ọ na-agwụkwa agwụ. (Ọpụ. 1:6) “Ihe ndị a niile” Jizọs kwuru gbasara ha bụ ihe niile o kwuru ga-eme n’oge ọnụnọ ya, malite n’afọ 1914 ruo mgbe ọnụnọ ya ga-agwụ, ya bụ, mgbe a ga-enwe “oké mkpagbu.”—Mat. 24:21.
18, 19. Olee ihe anyị ghọtara “ọgbọ a” Jizọs kwuru okwu ya pụtara? Gịnịkwa ka anyị nwere ike ikwu n’ihi ihe a anyị ghọtara?
18 Oleezi ihe anyị ghọtara Jizọs bu n’obi mgbe ọ na-ekwu gbasara “ọgbọ a”? Ọgbọ ọ na-ekwu okwu ya bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ ndụ n’otu oge. Ndị nke mbụ bụ ndị hụrụ mgbe ihe ịrịba ama Jizọs kwuru gbasara ya malitere imezu n’afọ 1914. Ndị nke abụọ abụrụ ndị nke ha na ndị nke mbụ a dịkọrọ ndụ. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ndị nke abụọ ga-ahụ mgbe oké mkpagbu ahụ ga-amalite. Ndị nke mbụ ahụ na ndị nke abụọ a bụ otu ọgbọ n’ihi na ha dịkọrọ ndụ n’otu oge.c
19 Gịnị ka anyị na-ekwu? Anyị ma na ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a na-egosi na Jizọs anọrọla n’ocheeze na-achị n’eluigwe. Anyị makwa na ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị so “n’ọgbọ a” Jizọs kwuru gbasara ya, akatawala ahụ́. O dokwara anyị anya na ha niile agaghị anwụcha tupu oké mkpagbu ukwuu amalite. N’ihi ya, ihe anyị na-ekwu bụ na Alaeze Chineke dị ezigbo nso. Oge Alaeze Chineke ga-abịa chịwa ụwa a eruola. Jizọs gwara anyị ka anyị na-arịọ Jehova ‘Ka Alaeze ya bịa.’ Cheedị otú obi ga-adị gị ma ị hụ mgbe Jehova ga-aza anyị ekpere a.
-