Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 8/1 p. 30-31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jizọs Buru Amụma Ga-emetụta Ụwa Dum
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Ndịozi Jizọs Ajụọ Ya Ihe Ga-abụ Ihe Ịrịba Ama
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Mata na Amagedọn Dị Nso
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Nna ahụ, Ọkpara ahụ, na Mmụọ Nsọ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 8/1 p. 30-31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Jisọs ọ̀ maara ugbu a oge Amagedọn ga-abịa?

O yiri nnọọ ihe ezi uche dị na ya ikweta na ọ maara.

Ụfọdụ pụrụ ịdị na-eche ihe mere ajụjụ a ji ọbụna bilite. O yiri ka ọ bụ n’ihi okwu Jisọs nke dị na Matiu 24:36: “Banyere ụbọchị na oge hour ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara.” Rịba nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ “Ọkpara ahụ amataghịkwa,” ama.

Amaokwu a bụ akụkụ nke azịza Jisọs nye ajụjụ ndị ozi ahụ: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” (Matiu 24:3, NW) N’amụma ya a ma ama ugbu a banyere ihe àmà ndị mejupụtara “ihe ịrịba ama” ahụ, o buru amụma banyere agha, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, mkpagbu nke ezi ndị Kraịst, na ihe ndị ọzọ ga-eme n’ụwa bụ́ ndị ga-egosi ọnụnọ ya. Site n’ihe ịrịba ama a ụmụazụ ya pụrụ ịmata na ọgwụgwụ ahụ dị nso. O ji oge mgbe osisi na-amalite ipu akwụkwọ ndị ọhụrụ, bụ́ nke na-egosi na oge okpomọkụ dị nso wee mee ihe atụ nke njikọ a. O kwukwasịrị: “Otú a unu onwe unu kwa, mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a nile, maranụ na Ọ nọ nso, n’ọnụ ụzọ.”—Matiu 24:33.

Ma Jisọs ekwughị kpọmkwem mgbe ọgwụgwụ ahụ ga-abịa. Kama nke ahụ, o kwuru ihe anyị na-agụ na Matiu 24:36. Nke ahụ bụ otú ọ dị na Bible Nsọ nke Union Version, ọ dịkwa otú ahụ n’ọtụtụ Bible ọgbara ọhụrụ. Ma, nsụgharị ụfọdụ meworo ochie karị enweghị “Ọkpara ahụ amataghịkwa.”

Dị ka ihe atụ, Douay Version nke ndị Katọlik na-agụ, sị: “Ma banyere ụbọchị na hour ahụ ọ dịghị onye manụ, ọ bụghị ndị mmụọ ozi nke eluigwe, kama nanị Nna m.” E dekwara ya otú ahụ na King James Version. N’ihi gịnị ka e ji wepụ “Ọkpara ahụ amataghịkwa,” ọ bụ ezie na ọ dị na Mak 13:32? N’ihi na laa azụ ná mmalite nke narị afọ nke 17 mgbe e dere nsụgharị abụọ ndị ahụ, okwu ahụ adịghị n’ihe odide nke ndị nsụgharị ahụ ji rụọ ọrụ. Ma, ka ọ dịgodị ugbu a, a chọpụtawo ọtụtụ ihe odide Grik ndị mere ochie karị. Ndị a, ndị dị nso karị n’oge e ji dee ihe odide mbụ nke Matiu, nwere “Ọkpara ahụ amataghịkwa” na Matiu 24:36.

N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Jerusalem Bible nke ndị Katọlik nwere nkebi ahịrịokwu ahụ, na nkọwa ala ala peji nke na-ekwu na Vulgate nke Latin wepụrụ okwu ahụ “ikekwe n’ihi ihe ndị metụtara nkà mmụta okpukpe.” Eenụ! Ndị nsụgharị ma ọ bụ ndị ndepụtagharị ihe ndị kwere n’Atọ n’Ime Otu pụrụ ịbụ ndị a nwara ọnwụnwa iwepụ nkebi ahịrịokwu nke gosiri na Jisọs enweghị ihe ọmụma nke Nna ya nwere. Olee otú Jisọs pụrụ isi ghara ịma otu eziokwu ma ọ bụrụ na ma ya ma Nna ya bụcha akụkụ nke Chi atọ?

N’otu aka ahụ, akwụkwọ bụ́ A Textual Commentary on the Greek New Testament, nke B. M. Metzger dere, na-asị: “Okwu bụ́ ‘Ọkpara ahụ amataghịkwa’ adịghị n’ihe ka ọtụtụ n’ime [ihe odide] akaebe nke Matiu, gụnyere ihe odide Byzantine e dere n’ikpeazụ. N’aka nke ọzọ, ndị nnọchiteanya kasị mma nke ụdị ihe odide Alexandria, nke Ebe Ọdịda Anyanwụ, na nke Siza nwere nkebi ahịrịokwu ahụ. Mwepụ nke okwu ndị ahụ n’ihi ihe isi ike ozizi nke ha na-eweta yikarịrị ka ọ bụ ihe merenụ kama ha ịbụ mgbakwụnye ihe na” Mak 13:32.—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.

Ndị ‘nnọchiteanya ahụ kasị mma’ nke ihe odide ndị ka mee ochie na-akwado otú ahụ e si dee ya bụ́ nke na-esetịpụ ọganihu ezi uche dị na ya n’ihe banyere ihe ọmụma. Ndị mmụọ ozi amaghị hour nke oge ọgwụgwụ ahụ; Ọkpara ahụ amaghịkwa; kama ọ bụ nanị Nna ahụ. Nke a kwekọkwara n’okwu Jisọs ndị dị na Matiu 20:23, bụ́ ebe o kwetara na ya enweghị ikike inye ọnọdụ ndị pụrụ iche n’Alaeze ahụ, ma Nna ya nwere.

N’ihi ya, okwu Jisọs n’onwe ya na-egosi na n’elu ala ọ maghị ụbọchị maka ‘ọgwụgwụ ụwa.’ Ọ̀ matawo ya kemgbe ahụ?

Mkpughe 6:2 na-akọwa Jisọs dị ka onye nọkwasịrị n’ịnyịnya ọcha ma na-aga n’ihu “na-emeri, ya na ka O wee merie.” Ihe sochiri bụ ndị ịnyịnya na-anọchite anya agha, ụnwụ nri, na ihe otiti, ndị dị ka ndị anyị hụworo kemgbe Agha Ụwa Mbụ malitere na 1914. Ndịàmà Jehova kwenyere na 1914, e mere ka Jisọs nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze nke Alaeze eluigwe Chineke, onye ga-edu ndú n’agha na-abịanụ megide ajọ omume n’ụwa. (Mkpughe 6:3-8; 19:11-16) Ebe e nyeworo Jisọs ike ugbu a dị ka onye ga-emeri n’aha Chineke, o yiri ihe ezi uche dị na ya na Nna ya agwawo ya mgbe ọgwụgwụ ahụ ga-abịa, mgbe ọ ‘ga-emerizu.’

A gwabeghị anyị bụ́ ndị nọ n’ụwa ụbọchị ahụ, ya mere okwu Jisọs ka na-emetụta anyị: “Lezienụ anya, mụrụnụ anya, na-ekpekwanụ ekpere: n’ihi na unu amataghị mgbe oge ahụ bụ. . . . Okwu M na-agwa unu ka M na-agwa mmadụ nile, Na-echenụ nche.”—Mak 13:33-37.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya