Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 11/15 p. 18-23
  • Ị̀ Na-arụzu Ibu Ọrụ Gị Nile N’ebe Chineke Nọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-arụzu Ibu Ọrụ Gị Nile N’ebe Chineke Nọ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Nile Hà Bụ́ Ihe Efu?
  • Nraranye na Ibu Ọrụ Anyị n’Ebe Chineke Nọ
  • Jiri Nlezianya Tụlee Mkpebi Gị
  • Ihe Ndị Na-enye Aka Icheta Onye Okike Ukwu Anyị
  • Ibu Ọrụ Anyị Nile n’Ebe Chineke Nọ
  • Rụzuo Ibu Ọrụ Gị Nile
  • “Ọrụ Mmadụ Nile”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ịrụ Ọrụ Dịịrị Anyị n’Ebe Chineke Nọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Eklisiastis
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Cheta Onye Okike Ukwu Gị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 11/15 p. 18-23

Ị̀ Na-arụzu Ibu Ọrụ Gị Nile N’ebe Chineke Nọ?

“Ọrụ ọ bụla ka Chineke ga-eme ka ọ baa n’ikpe, ya na ihe ọ bụla zoro ezo, ma ọ bụ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ.”—EKLISIASTIS 12:14.

1. Ndokwa ndị dị aṅaa ka Jehova mewooro ndị ya?

JEHOVA na-akwado ndị nọgidere na-echeta ya dị ka Onye Okike Ukwu ha. Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ na-enye ha ihe ọmụma dị mkpa iji na-eme ihe na-atọ ya ụtọ n’ụzọ zuru ezu. Mmụọ nsọ Chineke na-eduzi ha n’ime uche Chineke nakwa ‘n’ịmị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla.’ (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Ọzọkwa, Jehova na-enye nri ime mmụọ na nduzi ọchịchị Chineke site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Mgbe ahụ, n’ọtụtụ ụzọ, ndị Chineke na-enweta ngọzi sitere n’eluigwe ka ha na-ejere Jehova ozi ma na-arụ ọrụ ahụ dị mkpa bụ́ ikwusa ozi ọma Alaeze.—Mak 13:10.

2. Olee ajụjụ ndị pụrụ ibilite banyere ijere Jehova ozi?

2 Ezi ndị Kraịst na-enwe obi ụtọ ịbụ ndị mikpuru onwe ha n’ijere Jehova ozi dị nsọ. Ma, ụfọdụ pụrụ inwe nkụda mmụọ ma na-eche na mgbalị ha abaghị uru. Dị ka atụ, mgbe ụfọdụ, ndị Kraịst raara onwe ha nye pụrụ ịdị na-eche ma mgbalị ha ji akọ na uche na-eme ò kwesịrị ya n’ezie. Mgbe onyeisi ezinụlọ na-atụgharị uche n’ọmụmụ ihe ezinụlọ na ihe omume ndị ọzọ, ajụjụ ndị dị ka ndị a pụrụ ibilite n’uche ya n’ụzọ ziri ezi: ‘Ihe anyị na-eme ọ̀ na-atọ Jehova ụtọ n’ezie? Ànyị na-arụzu ibu ọrụ anyị nile n’ebe Chineke nọ?’ Okwu amamihe nke onye mkpọkọta ahụ pụrụ inye aka ịza ajụjụ ndị dị otú ahụ.

Ihe Nile Hà Bụ́ Ihe Efu?

3. N’ikwekọ n’Eklisiastis 12:8, gịnị bụ ihe efu kasịnụ?

3 Ụfọdụ pụrụ iche na okwu onye amamihe ahụ adịchaghị agba ume nye onye ọ bụla—onye na-eto eto ma ọ bụ onye agadi. “Ihe efu kachasị ihe efu nile, ka Onye mkpọkọta sịrị; ha nile bụ ihe efu.” (Eklisiastis 12:8) N’ezie, ọ bụ ihe efu kasịnụ ileghara Onye Okike Ukwu anya n’oge ntorobịa, ịka nká n’ejeghịrị ya ozi, na-enwekwa nanị ịka nká dị ka ihe a rụzuru n’ogologo ndụ. Ihe nile abụwo ihe efu, ma ọ bụ ihe tọgbọrọ chakoo, nye onye dị otú ahụ, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ n’ịbụ onye nwere akụ̀ na ụba na onye a ma ama n’ụwa a nke na-atọgbọ n’aka ajọ onye ahụ, bụ́ Setan Ekwensu.—1 Jọn 5:19.

4. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ọ bụghị ihe nile bụ ihe efu?

4 Ọ bụghị ihe nile bụ ihe efu nye ndị nile na-akpado akụ̀ n’eluigwe dị ka ndị ohu kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova. (Matiu 6:19, 20) Ha na-arụbiga ọrụ na-enye ụgwọ ọrụ nke Onyenwe anyị ókè, n’ezie, ndọgbu n’ọrụ ndị dị otú ahụ abụghịkwa ihe efu. (1 Ndị Kọrint 15:58) Ma ọ bụrụ na anyị bụ ndị Kraịst raara onwe ha nye, ànyị nọ n’ọrụ Chineke nyere na mgbe ikpeazụ a? (2 Timothy 3:1) Ka ànyị amalitela ịgbaso ụzọ ndụ ji ntakịrị ihe dị iche na nke ndị agbata obi anyị n’ozuzu ha? Ha pụrụ ịdị na-ekpe okpukpe dị iche iche, ha pụkwara nnọọ iji okpukpe kpọrọ ihe, na-ejechi ụlọ ofufe ha dị iche iche anya, na-agbalịkwa imezu ihe ụdị ofufe ha na-achọ ha n’aka. Otú ọ dị, ha abụghị ndị nkwusa nke ozi Alaeze ahụ. Ha enweghị ezi ihe ọmụma na ugbu a bụ “mgbe ọgwụgwụ,” ha enweghịkwa echiche nke ịdị ngwa banyere oge anyị na-ebi na ya.—Daniel 12:4.

5. Ọ bụrụ na nchụso ndị a na-eme ná ndụ aghọwo nchegbu anyị bụ́ isi, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

5 Jisọs Kraịst kwuru banyere oge anyị dị oké egwu, sị: “Ọ bụkwa dị ka ụbọchị Noa dịrị, otú a ka [ọnụnọ, NW] Nwa nke mmadụ ga-adị. N’ihi na dị ka ha nọ na mgbe ahụ nke bu oké iju mmiri ahụ ụzọ na-eri ihe na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-alụ nwunye, na-enyekwa n’ọlụlụ di, ruo ụbọchị Noa batara n’ụgbọ ya, ha amaghịkwa ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile; otú a ka [ọnụnọ, NW] Nwa nke mmadụ ga-adị.” (Matiu 24:37-39) Ọ bụrụ na e mebigaghị ha ókè, ọ dịghị ihe dị njọ n’iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, alụmdi na nwunye bụkwa ndokwa sitere n’aka Chineke n’onwe ya. (Jenesis 2:20-24) Ma, ọ bụrụ na anyị amata na nchụso ndị a na-enwe ná ndụ aghọwo nchegbu anyị bụ́ isi, gịnị ma anyị kpee ekpere banyere nke a? Jehova pụrụ inyere anyị aka ibute ọdịmma Alaeze ụzọ, ime ihe ziri ezi, na ịrụzu ibu ọrụ anyị n’ebe ọ nọ.—Matiu 6:33; Ndị Rom 12:12; 2 Ndị Kọrint 13:7.

Nraranye na Ibu Ọrụ Anyị n’Ebe Chineke Nọ

6. N’ụzọ dị aṅaa dị mkpa ka ụfọdụ ndị e mere baptism ji ahapụ ịrụzu ibu ọrụ ha n’ebe Chineke nọ?

6 Ọ dị ụfọdụ ndị Kraịst e mere baptism mkpa ikpesi ekpere ike n’ihi na ha anaghị arụzu ọrụ dịịrị ndị ozi bụ́ nke ha nakweere mgbe ha raara onwe ha nye Chineke. Kwa afọ, e mewo ihe karịrị nnọọ mmadụ 300,000 baptism ruo afọ ole na ole ugbu a, ma ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike n’ozuzu ha arịbeghị elu n’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ. Ụfọdụ ndị ghọrọ ndị nkwusa Alaeze akwụsịwo ịkpọsa ozi ọma ahụ. Ma, ndị mmadụ aghaghị ikere òkè buru ibu n’ozi ndị Kraịst tupu e mee ha baptism. N’ihi ya, ha maara ọrụ ahụ Jisọs nyere ụmụazụ ya nile: “Gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ọ gwụla ma ha nwere erughị eru ndị kasị pụọ iche n’ihi ahụ ike ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ha na-enweghị ike ịchịkwa, ndị e mere baptism bụ́ ndị na-adịghịzi eje ozi dị ka Ndịàmà na-arụsi ọrụ ike nke Chineke na Kraịst, anaghị arụzu ibu ọrụ ha nile n’ebe Onye Okike Ukwu anyị nọ.—Aịsaịa 43:10-12.

7. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị izukọta ọnụ mgbe nile maka ofufe?

7 Israel oge ochie bụ mba a raara nye Chineke, n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ kwa, ndị ya nwere ibu ọrụ n’ebe Jehova nọ. Di ka ihe atụ, ndị ikom nile ga-ezukọ maka ememe atọ a na-eme kwa afọ, a ‘na-ebipụkwa’ nwoke ọ bụla nke ma ụma hapụ ime Ememe Ngabiga site n’igbu ya. (Ọnụ Ọgụgụ 9:13; Levitikọs 23:1-43; Deuterọnọmi 16:16) Iji rụzuo ibu ọrụ ha n’ebe Chineke nọ dị ka ndị ya raara onwe ha nye, ụmụ Israel aghaghị izukọ maka ofufe. (Deuterọnọmi 31:10-13) Ọ dịghị ihe n’ime Iwu ahụ sịrị, ‘Mee nke a ma ọ bụrụ na ọ ga-adịrị gị mfe omume.’ N’ezie, nye ndị raara onwe ha nye Jehova ugbu a, nke a na-emesikwu okwu Pọl ike: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị, dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike; ka anyị mee karịakwa otú a, n’ụzọ hà otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Ee, isoro ndị kwere ekwe ibe ya na-ezukọchi anya bụ akụkụ nke ibu ọrụ onye Kraịst raara onwe ya nye nwere n’ebe Chineke nọ.

Jiri Nlezianya Tụlee Mkpebi Gị

8. N’ihi gịnị ka onye na-eto eto raara onwe ya nye kwesịrị iji jiri ekpere chebara ije ozi dị nsọ ọ na-eje echiche?

8 Ikekwe ị bụ onye na-eto eto raara onwe ya nye Jehova. Ngọzi bara ụba ga-abụ nke gị ma ọ bụrụ na i bute ọdịmma Alaeze ụzọ ná ndụ. (Ilu 10:22) Site n’ekpere na iji nlezianya mee atụmatụ, ị pụrụ inwe ike iji ma ọ dịkarịa ala oge ntorobịa gị jee ụdị ụfọdụ nke ozi oge nile—ụzọ dị mma isi gosipụta na ị na-echeta Onye Okike Ukwu gị. Ma ọ bụghị ya, mmasị ihe onwunwe pụrụ ịmalite iwere ihe ka ukwuu n’oge na echiche gị. Dị ka ndị mmadụ n’ozuzu ha, ị pụrụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ngwa ngwa ná ndụ ma banye n’ụgwọ iji nweta ihe onwunwe. Ọrụ na-enye ego pụrụ ịmịkọrọ ihe ka ukwuu n’oge na ikike gị. Ọ bụrụ na i nwee ụmụ, ị ghaghị ibu ibu ọrụ ezinụlọ ruo ọtụtụ iri afọ. (1 Timoti 5:8) Ọ pụrụ ịbụ na i chefubeghị Onye Okike Ukwu gị, ma ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịmata na ibu ụzọ, ma ọ bụ ebughị ụzọ, mee atụmatụ, pụrụ igosipụta ndụ ị ga-adị n’oge i toruworo ogo mmadụ. N’oge agadi, ị pụrụ ileghachi anya azụ, o wee dị gị ka ya bụrụ na, ma ọ dịghị ihe ọzọ, i ji oge ị na-akatabeghị ahụ jeere Onye Okike Ukwu anyị ozi dị nsọ n’ụzọ zuru ezu karị. Gịnị ma i jiri ekpere chebara atụmanya gị echiche ugbu a, ka i wee nweta afọ ojuju n’ozi dị nsọ i jeere Jehova n’oge ntorobịa gị?

9. Gịnị pụrụ ikwe onye metụworo agadi ma bụrụ onye butụworo ibu ọrụ dị arọ n’ọgbakọ, omume?

9 Tụlee ọnọdụ ọzọ—nke nwoke jetụworo ozi dị ka onye ọzụzụ atụrụ nke ‘ìgwè atụrụ Chineke.’ (1 Pita 5:2,3) N’ihi ihe ụfọdụ, o ji ọchịchọ obi gbahapụ ihe ùgwù ndị dị otú ahụ. N’eziokwu, o metụkwuola okenye ugbu a, ọ pụkwara ịka siere ya ike ịnọgide n’ozi Chineke. Ma ọ̀ pụrụ ịbụ na o kwesịrị ịgbalị iru eru ọzọ maka ihe ùgwù ọchịchị Chineke? Lee ngọzi nwoke dị otú ahụ nwere ike iwetara ndị ọzọ ma ọ bụrụ na o nwere ike iburukwu ibu ọrụ n’ọgbakọ! Ebe ọ bụkwa na ọ dịghị onye ọ bụla nke na-adịrị nanị onwe ya ndụ, ndị enyi na ndị hụrụ ya n’anya ga-aṅụrị ọṅụ ma ọ bụrụ na o nwee ike ịmụba ozi ya, iji nye Chineke otuto. (Ndị Rom 14:7, 8) Nke kasịnụ, Jehova agaghị echefu ihe onye ọ bụla na-eme n’ozi ya. (Ndị Hibru 6:10-12) Ya mere, gịnị pụrụ inyere anyị aka icheta Onye Okike Ukwu anyị?

Ihe Ndị Na-enye Aka Icheta Onye Okike Ukwu Anyị

10. N’ihi gịnị ka onye mkpọkọta ahụ ji nọrọ n’ọnọdụ magburu onwe ya inye ntụziaka n’ihe banyere icheta Onye Okike Ukwu anyị?

10 Onye mkpọkọta ahụ nọ n’ọnọdụ magburu onwe ya inye ntụziaka maka anyị icheta Onye Okike Ukwu anyị. Jehova azawo ekpere ya sitere n’obi site n’inye ya amamihe pụrụ iche. (1 Ndị Eze 3:6-12) Solomọn ji nlezianya nyochaa akụkụ nile nke ihe omume mmadụ. Ọzọkwa, e nyere ya ike mmụọ nsọ Chineke idetu ihe ndị ọ chọpụtara edetu iji baara ndị ọzọ uru. O dere, sị: “Ma tụkwasị nke a, n’ihi na Onye mkpọkọta maara ihe, ọ nọ na-ezi ndị ya ihe ọmụma; ọ ṅakwara ntị, wee gwupụta, mee ka ọtụtụ ilu dịzie. Onye mkpọkọta chọrọ ịchọpụta okwu nile na-atọ ụtọ, na ihe e deziri edezi, bụ́ okwu nile nke eziokwu.”—Eklisiastis 12:9, 10.

11. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nabata ndụmọdụ amamihe Solomọn?

11 Otú Septuagint Grik si sụgharịa okwu ndị a bụ: “Ọzọkwa, n’ihi na onye nkwusa ahụ maara ihe, n’ihi na ọ kụziiri ihe a kpọrọ mmadụ amamihe; ka ntị wee nwee ike ịnụ ihe dị ụtọ site n’ilu, onye nkwusa ahụ mere nnyocha siri ike chọta okwu ndị dị ụtọ na ihe odide ziri ezi—okwu nke eziokwu.” (The Septuagint Bible, nke Charles Thomson sụgharịrị) Solomọn gbalịrị iji okwu ndị dị ụtọ na isiokwu ndị na-akpali mmasị ma baa uru n’ezie ruo n’obi nke ndị na-agụ akwụkwọ ya. Ebe ọ bụ na okwu ya ndị a na-achọta n’Akwụkwọ Nsọ bụ ndị e dere site n’ike mmụọ nsọ, anyị pụrụ ịnabata nchọpụta na ndụmọdụ amamihe ya n’egbughị oge.—2 Timoti 3:16, 17.

12. N’okwu nke aka gị, olee otú ị ga-esi kwuo ihe Solomọn kwuru dị ka e dekọrọ ya n’Eklisiastis 12:11, 12?

12 N’agbanyeghị na e nweghị usoro obibi akwụkwọ nke oge a, ọtụtụ akwụkwọ dị n’oge Solomọn. Olee otú a ga-esi ele akwụkwọ ọgụgụ ndị dị otú ahụ anya? O kwuru, sị: “Okwu nile nke ndị mara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi, ọzọ, dị ka ntú a kụmiri nke ọma ka okwu nke ndị nwe nzukọ dị, bụ́ okwu e nyere site n’aka otu onye ọzụzụ atụrụ. Tụkwasịkwa n’ihe ndị a, nwa m, nara ndụmọdụ: ime ọtụtụ akwụkwọ enweghị ọgwụgwụ; ọtụtụ mmụta bụkwa ike ọgwụgwụ nke anụ ahụ.”—Eklisiastis 12:11, 12.

13. Olee otú okwu nke ndị nwere amamihe Chineke pụrụ isi dị ka ndụdụ e ji achụ ehi, ole ndị dịkwa ka “ntú a kụmiri nke ọma”?

13 Okwu nke ndị nwere amamihe Chineke na-adị ka ndụdụ e ji achụ ehi. N’ụzọ dị aṅaa? Ha na-akpali ndị na-agụ ma ọ bụ na-ege ha ntị inwe ọganihu n’ụzọ kwekọrọ n’okwu amamihe ahụ ha gụrụ ma ọ bụ nụ. Ọzọkwa, ndị na-emikpu onwe ha ‘n’okwu nke ndị nwe nzukọ,’ ma ọ bụ okwu amamihe na ndị bara uru n’ezie, yiri “ntú a kụmiri nke ọma,” ma ọ bụ a kụgidesiri ike. Nke a pụrụ ịdị otú ahụ n’ihi na okwu ọma nke ndị dị otú ahụ na-egosipụta amamihe Jehova, n’ihi ya kwa, ha pụrụ ime ka ndị na-agụ ma ọ bụ na-ege ha ntị kwụsie ike, kwadookwa ha. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna nke na-atụ egwu Chineke, ị́ gaghị agbalịsi ike ịkụnye amamihe dị otú ahụ n’uche na n’obi nke nwa gị?—Deuteronọmi 6:4-9.

14. (a) Ụdị akwụkwọ ndị dị aṅaa ka “ọtụtụ mmụta” na ha na-abaghị uru? (b) Olee akwụkwọ ọgụgụ anyị kwesịrị ịtụle n’ụzọ bụ́ isi, n’ihi gịnịkwa?

14 Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka Solomọn ji kwuo ihe o kwuru banyere akwụkwọ? E jiri ya tụnyere Okwu Jehova, imerime akwụkwọ nke ụwa a bu echiche nkịtị nke mmadụ. Ihe dị ukwuu n’echiche ndị a na-egosipụta echiche Setan Ekwensu. (2 Ndị Kọrint 4:4) N’ihi ya, “ọtụtụ mmụta” n’akwụkwọ ọgụgụ ụwa dị otú ahụ enweghị oké abamuru ma-adịte anya ọ na-eweta. N’ezie, ihe dị ukwuu n’ime ha pụrụ ịdị na-emerụ ahụ n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka Solomọn, ka anyị na-atụgharị uche n’ihe Okwu Chineke na-ekwu banyere ndụ. Nke a ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike ma dọtakwuo anyị nso n’ebe Jehova nọ. Itinyebiga uche ókè n’akwụkwọ ndị ọzọ ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ e si enweta ntụziaka pụrụ ime ka ike gwụ anyị. Ihe odide ndị a na-adị njọ ma na-emebi okwukwe n’ebe Chineke nọ nakwa ná nzube ya karịsịa mgbe ha sitere n’echiche ụwa bụ́ nke na-emegide amamihe Chineke. Ya mere, ka anyị chetazie na ihe odide kasị baa uru n’oge Solomọn nakwa n’oge anyị bụ ndị ahụ na-egosipụta amamihe nke “otu onye ọzụzụ atụrụ” ahụ bụ́ Jehova Chineke. O nyewo akwụkwọ 66 nke Akwụkwọ Nsọ, ọ bụkwa ndị a ka anyị kwesịrị itinye uche anyị na ha n’ụzọ bụ́ isi. Bible na mbipụta ndị na-enye aka nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi” na-eme ka anyị nwee ike inweta “ihe ọmụma Chineke.”—Ilu 2:1-6.

Ibu Ọrụ Anyị Nile n’Ebe Chineke Nọ

15. (a) Olee otú ị ga-esi kwuo okwu Solomọn banyere “ọrụ mmadụ nile”? (b) Gịnị ka anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị ga-arụzu ibu ọrụ anyị n’ebe Chineke nọ?

15 N’ịchịkọta nnyocha ya nile, onye mkpọkọta ahụ, bụ́ Solomọn, na-ekwu, sị: “Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile. N’ihi na ọrụ ọ bụla ka Chineke ga-eme ka ọ baa n’ikpe, ya na ihe ọ bụla zoro ezo, ma ọ bụ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ.” (Eklisiastis 12:13, 14) Egwu ziri ezi nke, ma ọ bụ nsọpụrụ ofufe n’ebe Onye Okike Ukwu anyị nọ ga-echebe anyị, nakwa ma eleghị anya ezinụlọ anyị, pụọ n’ịgbaso ụzọ ndụ àna m anwụ anwụ nke pụrụ iwetara anyị na ndị anyị hụrụ n’anya ọtụtụ nsogbu na iru újú. Egwu ziri ezi nke Chineke dị ọcha, bụrụkwa nnọọ mmalite nke amamihe na ihe ọmụma. (Abụ Ọma 19:9; Ilu 1:7) Ọ bụrụ na anyị enwee nghọta dabeere n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ ma tinye ndụmọdụ ya n’ọrụ n’ihe nile, anyị ga na-arụzu ‘ibu ọrụ anyị nile’ n’ebe Chineke nọ. Ee e, ọ bụghị ịmalite ime ndepụta nke ibu ọrụ dị iche iche. Kama nke ahụ, ihe a chọrọ bụ ka anyị leba anya n’Akwụkwọ Nsọ mgbe anyị na-edozi nsogbu nke ndụ ma na-eme ihe mgbe nile n’ụzọ nke Chineke.

16. N’ihe banyere ikpe, gịnị ka Jehova ga-eme?

16 Anyị kwesịrị ịghọta na ọ dịghị ihe Onye Okike Ukwu anyị na-adịghị ahụ. (Ilu 15:3) “Ọrụ ọ bụla ka [Ọ] ga-eme ka ọ baa n’ikpe.” Ee, Onye Kasị Ihe Nile Elu ga-ekpe ihe nile ikpe, gụnyere ndị anya mmadụ na-adịghị ahụ. Iburu ihe ndị dị otú ahụ n’uche pụrụ ịbụ ihe mkpali idebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu. Ma ihe mkpali kasịnụ kwesịrị ịbụ ịhụnanya n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ, n’ihi na Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu: ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” (1 Jọn 5:3) Ebe ọ bụkwa na ihe ndị Chineke nyere n’iwu bụ iji kwalite ọdịmma anyị na-adịgide adịgide, n’ezie, ọ bụghị nanị na o ziri ezi kamakwa ọ bụ ihe amamihe dị na ya n’ezie idebe ha. Nke a abụghị ibu arọ nye ndị hụrụ Onye Okike Ukwu ahụ n’anya. Ha chọrọ ịrụzu ibu ọrụ ha n’ebe ọ nọ.

Rụzuo Ibu Ọrụ Gị Nile

17. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịrụzu ibu ọrụ anyị nile n’ebe Chineke nọ n’ezie?

17 Ọ bụrụ na anyị maara ihe ma chọọ n’ezie ịrụzu ibu ọrụ anyị nile n’ebe Chineke nọ, e wezụga idebe ihe ndị o nyere n’iwu, anyị ga-eji nsọpụrụ na-atụ egwu ịkpasu ya iwe. N’ezie, “mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ,” ndị na-edebekwa ihe ndị o nyere n’iwu nwere “ezi uche.” (Abụ Ọma 111:10; Ilu 1:7) Ya mere ka anyị mee omume n’ụzọ amamihe ma rubere Jehova isi n’ihe nile. Nke a dị mkpa ugbu a karịsịa, n’ihi na Eze Jisọs Kraịst nọ anọ ugbu a, ụbọchị ọ ga-ekpe ikpe dị ka Ọkàikpe Chineke họpụtara dịkwa nso.—Matiu 24:3; 25:31, 32.

18. Gịnị ka ọ ga-arụpụtara anyị ma ọ bụrụ na anyị arụzuo ibu ọrụ anyị nile n’ebe Jehova Chineke nọ?

18 Chineke na-enyocha onye ọ bụla n’ime anyị ugbu a. Ànyị nwere mmasị n’ihe ime mmụọ, ka ànyị ekwewo ka mmetụta nke ụwa mee ka mmekọrịta anyị na Chineke gharakwa isi ike? (1 Ndị Kọrint 2:10-16; 1 Jọn 2:15-17) Ma ànyị na-eto eto ma anyị emewo agadi, ka anyị mee ihe nile anyị pụrụ ime iji mee ihe na-atọ Onye Okike Ukwu anyị ụtọ. Ọ bụrụ na anyị erubere Jehova isi ma debe ihe ndị o nyere n’iwu, anyị ga-ajụ ihe efu nke ụwa ochie a na-agabiga agabiga. Mgbe ahụ, anyị pụrụ inwe olileanya nke ndụ ebighị ebi n’usoro ihe ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa. (2 Pita 3:13) Lee atụmanya dị ebube ha bụ nye ndị nile na-arụzu ibu ọrụ ha nile n’ebe Chineke nọ!

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka ị ga-eji asị na ọ bụghị ihe nile bụ ihe efu?

◻ N’ihi gịnị ka onye Kraịst na-eto eto ji kwesị iji ekpere chebara ozi dị nsọ ọ na-eje echiche?

◻ Ụdị akwụkwọ ndị dị aṅaa ka “ọtụtụ mmụta” na ha na-agaghị aba uru?

◻ Gịnị bụ “ọrụ mmadụ nile”?

[Foto dị na peeji nke 20]

Ọ bụghị ihe nile bụ ihe efu nye ndị na-ejere Jehova ozi

[Foto dị na peeji nke 23]

N’adịghị ka ọtụtụ akwụkwọ nke ụwa a, Okwu Chineke na-enye ume ọhụrụ ma baa uru

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya