Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 3/1 p. 9-14
  • Ì Jikerewo Maka Ụbọchị Jehova?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Jikerewo Maka Ụbọchị Jehova?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ha Tụrụ Anya Ihe Dị Ukwuu
  • Ụbọchị Jehova na Ọnụnọ Jisọs
  • Ha Dịrị Njikere
  • “Na-echenụ Nche”
  • Ọrụ Dị Nsọ Dị Oké Mkpa
  • Ịnọ Na Nche Anyị Adịkwuo Ngwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Okwukwe Noa Na-ama Ụwa Ikpe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ihe Mere Chineke Ji Nwee Mmasị n’Ebe Noa Nọ—Ihe Mere O Ji Gbasa Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ụwa nke E Bibiri n’Oge Gara Aga
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 3/1 p. 9-14

Ì Jikerewo Maka Ụbọchị Jehova?

“Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.”—ZEFANAỊA 1:14.

1. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si akọwa ụbọchị Jehova?

“ỤBỌCHỊ ahụ dị ukwuu dịkwa egwu” nke Jehova ga-abịakwasị ajọ usoro ihe a n’isi nso. Akwụkwọ Nsọ na-akọwa ụbọchị Jehova dị ka nke ọgụ, ọchịchịrị, ọnụma, ahụhụ, nhụjuanya, egwu, na ịtọgbọrọ n’efu. Ma, a ga-enwe ndị ga-alanarị, n’ihi na “onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya.” (Joel 2:30-32; Emọs 5:18-20) Ee, mgbe ahụ Chineke ga-ebibi ndị iro ya ma zọpụta ndị ya.

2. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee echiche ịdị ngwa banyere ụbọchị Jehova?

2 Ndị amụma Chineke nwere echiche ịdị ngwa banyere ụbọchị Jehova. Dị ka ihe atụ, Zefanaịa dere, sị: “Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.” (Zefanaịa 1:14) Ọnọdụ ahụ dị ngwa taa karị n’ihi na Onye Bụ Isi Na-eme Ihe Chineke Kpere n’Ikpe, bụ́ Eze Jisọs Kraịst, agala ‘ike mma agha ya n’úkwù ya ma nọkwasị n’elu ịnyịnya n’ihi eziokwu, umeala n’obi, na ezi omume.’ (Abụ Ọma 45:3, 4) Ì jikerewo maka ụbọchị ahụ?

Ha Tụrụ Anya Ihe Dị Ukwuu

3. Atụmanya dịgasị aṅaa ka ụfọdụ ndị Kraịst bụ́ ndị Tesalọnaịka nwere, n’ihi ihe abụọ dịkwa aṅaa ka ha hiere ụzọ?

3 Ọtụtụ enweworị atụmanya a na-emezughị emezu banyere ụbọchị Jehova. Ụfọdụ ndị Kraịst oge mbụ nọ na Tesalọnaịka kwuru, sị, ‘Ụbọchị Onyenwe anyị dị ugbu a!’ (2 Ndị Tesalọnaịka 2:2) Ma e nwere ihe abụọ bụ isi mere o ji ghara ịdị nso. N’izo otu n’ime ndị a aka, Pọl onyeozi ekwuworị, sị: “Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:1-6) Na “mgbe ọgwụgwụ” a, anyị onwe anyị na-echere mmezu nke okwu ndị ahụ. (Daniel 12:4) Ndị Tesalọnaịka enweghịkwa ihe àmà ọzọ na oké ụbọchị Jehova abịaworị, n’ihi na Pọl gwara ha, sị: “Ọ gaghị adị, ma ọ bụrụ na [ndapụ n’ezi ofufe, NW] ahụ ebughị ụzọ bịa.” (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3) Mgbe Pọl dere okwu ndị ahụ (n’ihe dị ka 51 O.A.), “ndapụ n’ezi ofufe” ahụ pụọ n’ezi Iso Ụzọ Kraịst ebilitebeghị kpam kpam. Taa, anyị na-ahụ ya ka ọ na-etolite nke ọma na Krisendọm. Otú ọ dị, n’agbanyeghị atụmanya ha a na-emezughị emezu, ndị ahụ e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi nọ na Tesalọnaịka, bụ́ ndị nọgidere na-ejere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, mesịrị nata ụgwọ ọrụ eluigwe. (Mkpughe 2:10) A ga-akwụkwa anyị ụgwọ ọrụ ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ka anyị na-echere ụbọchị Jehova.

4. (a) Gịnị ka e jikọrọ ya na ụbọchị Jehova ná 2 Ndị Tesalọnaịka 2:1, 2? (b) Echiche dịgasị aṅaa ka ndị ahụ a na-akpọ Ndị Nna Chọọchị nwere banyere nlọghachi Kraịst na okwu ndị ọzọ metụtara ya?

4 Bible na-ejikọ “oké ụbọchị Jehova” na “[ọnụnọ, NW] nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (2 Ndị Tesalọnaịka 2:1, 2) Ndị ahụ a kpọrọ Ndị Nna Chọọchị nwere echiche dị iche iche banyere nlọghachi Kraịst, ọnụnọ ya, na Ọchịchị Puku Afọ ya. (Mkpughe 20:4) Na narị afọ nke abụọ O.A., Papias nke Hierapọlis tụrụ anya ike mmepụta ihe dị ịtụnanya nke ala n’Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst. Justin Martyr kwuru banyere ọnụnọ Jisọs mgbe mgbe ma tụọ anya ka Jerusalem e weghachiri eweghachi bụrụ isi nke Alaeze Ya. Irenæus nke Lyons kụziri na mgbe e bibisịrị Alaeze Ukwu Rom, Jisọs ga-apụta n’ụzọ a na-ahụ anya, kee Setan agbụ, ma chịa na Jerusalem elu ala.

5. Gịnị ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuworo banyere “Ọbịbịa nke Abụọ” nke Kraịst na Ọchịchị Narị Afọ Iri ya?

5 Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Philip Schaff kwuru na “isi ihe kasị dị ịrịba ama” n’oge dị tupu Kansụl nke Nicaea na 325 O.A. bụ “nkwenkwe nke ọchịchị a na-ahụ anya nke Kraịst na ndị senti ya bilitere n’ọnwụ ga-achị n’ebube n’elu ala ruo otu puku afọ, tupu mbilite n’ọnwụ na ikpe nke ọha mmadụ.” Akwụkwọ bụ́ A Dictionary of the Bible, nke James Hastings bụ editọ ya, na-ekwu, sị: “Tertullian, Irenæus, na Hippolytus ka na-atụ anya Ọbịbịa dị ngwa [nke Jisọs Kraịst]; ma n’ebe Ndị Nna Òtù Alexandria nọ anyị na-abanye n’ụzọ ọhụrụ nke echiche. . . . Ka Augustine jikọtasịrị Narị Afọ Iri ahụ na oge ibu agha Chọọchị, e yigharịrị Ọbịbịa nke Abụọ ahụ n’ọdịnihu dị anya.”

Ụbọchị Jehova na Ọnụnọ Jisọs

6. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji kwubie na ụbọchị Jehova dị anya?

6 Nghọtahie dị iche iche edujewo ná ndakpọ olileanya, ma ka anyị ghara iche na ụbọchị Jehova dị anya. Ọnụnọ a na-adịghị ahụ anya nke Jisọs, bụ́ nke e jikọtara ya na ya n’Akwụkwọ Nsọ, amaliteworị. Ụlọ Nche na mbipụta ndị ha na ya kwekọrọ nke Ndịàmà Jehova enyewo mgbe mgbe ihe àmà dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na ọnụnọ Kraịst malitere n’afọ 1914.a Ya mere, gịnịzi ka Jisọs kwuru banyere ọnụnọ ya?

7. (a) Olee ụfọdụ akụkụ nke ihe àmà nke ọnụnọ Jisọs na ọgwụgwụ nke usoro ihe a? (b) Olee ụzọ a pụrụ isi zọpụta anyị?

7 Ọnụnọ Jisọs ghọrọ isiokwu nkwurịta okwu nwa ntakịrị oge tupu ọnwụ ya. Mgbe ha nụsịrị ka o buru amụma mbibi ụlọ nsọ Jerusalem, ndị ozi ya bụ́ Pita, Jemes, Jọn, na Andru jụrụ, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” (Matiu 24:1-3, NW; Mak 13:3, 4) Ná nzaghachi, Jisọs buru amụma agha, ụnwụ, ala ọma jijiji, na akụkụ ndị ọzọ nke “ihe ịrịba ama” nke ọnụnọ ya na ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. O kwukwara, sị: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” (Matiu 24:13) A ga-azọpụta anyị ma ọ bụrụ na anyị ejiri ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi ruo ọgwụgwụ nke ndụ anyị na-adị ugbu a ma ọ bụ ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a.

8. Tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu, gịnị ka a gaje ịrụzu, gịnịkwa ka a na-eme banyere nke a taa?

8 Tupu ọgwụgwụ ahụ, a ga-emezu akụkụ dị ịrịba ama karịsịa nke ọnụnọ Jisọs. Banyere ya, o kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Tupu ndị Rom ebibie Jerusalem, usoro ihe ndị Juu agwụsịakwa na 70 O.A., Pọl pụrụ ikwu na ozi ọma ahụ abụrụwo nke “e kwusara n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.” (Ndị Kọlọsi 1:23) Otú ọ dị, taa, Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ nkwusa dị nnọọ ukwuu karị “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” N’afọ ole na ole gara aga, Chineke emeghewo ụzọ ka a gbaa àmà dị ukwuu n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe. Site n’ebe obibi akwụkwọ na ihe owuwu ndị ọzọ gburugburu ụwa, nzukọ Jehova ejikerewo maka ọrụ bukwuru ibu, ọbụna “n’ókèala a na-akpabeghị aka.” (Ndị Rom 15:22, 23, NW) Obi gị ọ̀ na-akpali gị ime ike gị nile n’ịgba àmà tupu ọgwụgwụ ahụ abịa? Ọ bụrụ otú ahụ, Chineke pụrụ iwusi gị ike ikere òkè na-eweta ụgwọ ọrụ n’ọrụ ahụ dị n’ihu.—Ndị Filipaị 4:13; 2 Timoti 4:17.

9. Gịnị ka Jisọs mere ka ọ pụta ìhè, dị ka e dekọrọ na Matiu 24:36?

9 A na-emezu ọrụ nkwusa Alaeze ahụ e buru amụma ya na akụkụ ndị ọzọ nke ihe àmà nke ọnụnọ Jisọs kpọmkwem ugbu a. N’ihi ya, ọgwụgwụ dị nso maka ajọ usoro ihe a. N’eziokwu, Jisọs kwuru, sị: “Ma ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị na oge hour ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara.” (Matiu 24:4-14, 36) Ma amụma Jisọs pụrụ inyere anyị aka ijikere maka “ụbọchị na oge hour ahụ.”

Ha Dịrị Njikere

10. Olee otú anyị si mara na o kwere omume ịnọgide mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ?

10 Iji lanarị oké ụbọchị Jehova, anyị aghaghị ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ ma guzosie ike maka ezi ofufe. (1 Ndị Kọrint 16:13) Anyị maara na ntachi obi dị otú ahụ ga-ekwe omume, n’ihi na ezinụlọ tụrụ egwu Chineke mere otú ahụ ma lanarị Iju Mmiri ahụ nke bibiri ndị ajọ mmadụ na 2370 T.O.A. N’ịtụnyere oge ahụ na ọnụnọ ya, Jisọs sịrị: “Dị nnọọ ka ọ dị n’ụbọchị Noa, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị. N’ihi na dị ka ha nọ n’ụbọchị ndị ahụ tupu iju mmiri ahụ, na-eri ma na-aṅụ, ndị ikom na-alụ ndị inyom, a na-enyekwa ndị inyom n’ọlụlụ, ruo ụbọchị Noa banyere n’ime ụgbọ ahụ; ha aṅaghịkwa ntị ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara ma kpochapụ ha nile, otú a ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.”—Matiu 24:37-39, NW.

11. Ụzọ dị aṅaa ka Noa chụsoro n’agbanyeghị ime ihe ike nke dịrị n’oge ya?

11 Dị ka anyị, Noa na ezinụlọ ya dịrị ndụ n’ụwa na-eme ihe ike. Ndị mmụọ ozi nupụrụ isi bụ́ “ụmụ ndị ikom nke Chineke” enwoghawo ma kpọrọ nwunye ndị ha sitere na ha mụta ndị Nefilim na-arụ arụrụala—ndị mmekpa ahụ o doro anya na ha mere ka e nwekwuo ime ihe ike. (Jenesis 6:1, 2, 4; 1 Pita 3:19, 20) Otú ọ dị, “Noa na Chineke yịkọrọ na-ejegharị” n’okwukwe. Ọ “bụ onye ezi omume, onye zuru okè n’ọgbọ ya nile”—ajọ ọgbọ nke ụbọchị ya. (Jenesis 6:9-11) Site n’iji ekpere dabere na Chineke, anyị pụrụ ime otu ihe ahụ n’ajọ ụwa a na-eme ihe ike ka anyị na-echere ụbọchị Jehova.

12. (a) E wezụga iwu ụgbọ, ọrụ dị aṅaa ka Noa rụrụ? (b) Olee otú ndị mmadụ si meghachi omume ná nkwusa Noa mere, gịnịkwa ka ọ rụpụtaara ha?

12 A maara Noa nke ọma dị ka onye wuru otu ụgbọ maka ichebe ndụ gabiga Iju Mmiri ahụ. Ọ bụkwa “onye na-ekwusa ezi omume,” ma ndị ọgbọ ya ‘aṅaghị ntị’ n’ozi Chineke nyere ya. Ha riri ihe ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ, lụọ di na nwụnye, zụlite ezinụlọ, gaakwa n’ihu na-eme ihe ndị a na-eme ná ndụ ruo mgbe Iju Mmiri ahụ kpochapụrụ ha nile. (2 Pita 2:5; Jenesis 6:14) Ha achọghị ịnụ banyere okwu na omume ziri ezi, ọbụna dị ka ajọ ọgbọ nke taa mechiri ntị ha n’ihe Ndịàmà Jehova na-ekwu banyere “nchegharị n’ebe Chineke nọ,” okwukwe na Kraịst, ezi omume, na “ikpe ahụ nke gaje ịbịa.” (Ọrụ 20:20, 21; 24:24, 25) E nweghị ihe ndekọ nke mmadụ ole dịrị ndụ n’elu ala mgbe Noa nọ na-ekwusa ozi Chineke. Ma otu ihe doro anya, e gbubilatara ndị nọ n’elu ala n’ụzọ dị oké ngwa na 2370 T.O.A.! Iju Mmiri ahụ kpochapụrụ ndị ajọ omume, na-ahapụ nanị ndị dị njikere maka ọrụ Chineke ahụ—Noa na mmadụ asaa ndị ọzọ n’ime ezinụlọ ya.—Jenesis 7:19-23; 2 Pita 3:5, 6.

13. Ná mkpebi ikpe dị aṅaa ka Noa nwere obi ike zuru ezu, oleekwa otú o si mee ihe kwekọrọ na nke a?

13 Chineke emeghị ka Noa mara banyere kpọmkwem oge na hour maka Iju Mmiri ahụ ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ. Otú ọ dị, mgbe Noa dị afọ 480, Jehova nyere iwu, sị: “Mmụọ m agaghị achị achị n’ime mmadụ ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na ya onwe ya bụkwa anụ ahụ: ma ụbọchị ya nile ga-abụ [otu narị na iri afọ abụọ].” (Jenesis 6:3) Noa nwere obi ike zuru ezu ná mkpebi ikpe a nke Chineke. Mgbe ọ gbara afọ 500, o “wee mụọ Shem, na Ham, na Jefet,” omenala nke oge ahụ na-atụkwa aro na afọ 50 ruo 60 gafere tupu ụmụ ya ndị ikom alụọ nwunye. Mgbe a gwara Noa ka o wuo ụgbọ ahụ maka nchebe gabiga Iju Mmiri ahụ, o doro anya na ụmụ ndị ikom ahụ na nwunye ha nyeere ya aka n’ọrụ ahụ. O yikarịrị ka iwu ụgbọ ahụ dabakọrọ n’ozi Noa jere dị ka “onye na-ekwusa ezi omume,” na-enye ya ihe ọ ga-arụ maka afọ 40 ruo 50 ikpeazụ tupu Iju Mmiri ahụ. (Jenesis 5:32; 6:13-22) N’afọ ndị ahụ nile, ya na ezinụlọ ya mere ihe n’okwukwe. Ka anyị gosipụtakwa okwukwe ka anyị na-ekwusa ozi ọma ahụ ma na-echere ụbọchị Jehova.—Ndị Hibru 11:7.

14. Gịnị ka Jehova mesịrị gwa Noa, n’ihi gịnịkwa?

14 Ka ọ fọrọ nke nta ka a rụchaa ụgbọ ahụ, Noa pụrụ icheworị na Iju Mmiri ahụ dị nso, ọ bụ ezie na ọ maghị kpọmkwem mgbe ọ ga-ewere ọnọdụ. Jehova mesịrị gwa ya: “Ọ fọdụrụ ụbọchị asaa, Mụ onwe m gaje ime ka mmiri zosa n’ụwa ụbọchị [iri anọ] ehihie na abalị.” (Jenesis 7:4) Nke ahụ nyere Noa na ezinụlọ ya oge zuru nnọọ ezu ịkpọba ụdị anụmanụ nile n’ime ụgbọ ahụ ma banye na ya n’onwe ha tupu Iju Mmiri ahụ amalite. Ọ dịghị anyị mkpa ịmara ụbọchị na hour maka mmalite nke mbibi usoro ihe a; e nyefeghị anyị nlanarị nke ụmụ anụmanụ n’aka, ndị mmadụ ga-alanarị ya abanyewelarị n’ụgbọ ihe atụ ahụ, paradaịs ime mmụọ nke ndị Chineke.

“Na-echenụ Nche”

15. (a) N’okwu nke gị, olee otú ị ga-esi akọwa okwu Jisọs ndị a chọtara na Matiu 24:40-44? (b) Amaghị kpọmkwem oge Jisọs ga-abịa abọ ọ́bọ̀ Chineke nwere mmetụta dị aṅaa?

15 Banyere ọnụnọ ya, Jisọs kọwara, sị: “Mgbe ahụ mmadụ abụọ ga-anọ n’ubi [na-arụ ọrụ]; e were otu, hapụkwa otu: ndị inyom abụọ ga na-egwe nri na nkume igwe nri; e were otu, hapụkwa otu. Ya mere, na-echenụ nche: n’ihi na unu amataghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. Ma unu mara nke a, na ọ bụrụ na nna nwe ụlọ matararịị oge nche onye ohi ga-abịa, ọ ga na-eche nche, ọ gaghị ekwekwa ka e gwupuo ụlọ ya. N’ihi nke a unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo: n’ihi na n’oge hour nke unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” (Matiu 24:40-44; Luk 17:34, 35) Amaghị kpọmkwem oge Jisọs ga-abịa ịbọ ọ́bọ̀ Chineke yiri ka ọ na-eme ka anyị nọrọ na nche, na-enyekwa anyị ohere kwa ụbọchị igosipụta na anyị ji ebumnobi na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị na-ejere Jehova ozi.

16. Gịnị ga-eme ndị ‘a hapụrụ’ na ndị ‘e weere’?

16 Ndị ‘a hapụụrụ’ mbibi na ndị ajọ omume ga-agụnye ndị nweburu ihe ọmụma ma bụrụ ndị ụzọ ndụ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị rikpuru. Ka anyị soro n’ime ndị ahụ ‘e weere,’ ndị raara onwe ha nye Jehova n’ụzọ zuru ezu ma nwee ekele n’ezie maka ndokwa ime mmụọ ya site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Ruo kpọmkwem n’ọgwụgwụ, ka anyị jeere Chineke ozi site ‘n’ịhụnanya sitere n’obi ọcha na ezi akọ na uche na okwukwe nke ihu abụọ na-adịghị ya.’—1 Timoti 1:5.

Ọrụ Dị Nsọ Dị Oké Mkpa

17. (a) Gịnị ka e buru amụma ya na 2 Pita 3:10? (b) Gịnị bụ ụfọdụ ibi obi nke a gbara ume ya na 2 Pita 3:11?

17 Pita onyeozi dere, sị: “Ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi; nke ọ bụ n’ime ya ka eluigwe ga-eji oké ụzụ gabiga, ihe nile dị n’eluigwe ga-agbakwa ọkụ wee laa n’iyi, ụwa na ọrụ nile a rụrụ n’ime ya ga-erechapụkwa.” (2 Pita 3:10) Eluigwe na ụwa ihe atụ ahụ agaghị alanarị iwe dị ọkụ nke Chineke. Ya mere Pita gbakwụnyere, sị: “Ebe a na-eme ka ihe ndị a nile laa n’iyi otú a, ọ̀ bụ aha mmadụ gịnị ka unu na-aghaghị ịbụ n’ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile.” (2 Pita 3:11) Ihe ndị so n’ibi obi ndị a bụ ịbịachi nzukọ ndị Kraịst anya, imere ndị ọzọ ihe ọma, na ikere òkè dị mkpa n’ikwusa ozi ọma ahụ.—Matiu 24:14; Ndị Hibru 10:24, 25; 13:16.

18. Ọ bụrụ na anyị na-azụlite mmekọrịta chiri anya n’ebe ụwa dị, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

18 ‘Ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile’ chọrọ na anyị ‘ga-edebe onwe anyị n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.’ (Jemes 1:27) Ma gịnị ma ọ bụrụ na anyị na-azụlite mmekọrịta chiri anya n’ebe ụwa a dị? Ikekwe a na-arabanye anyị n’ọnọdụ dị ize ndụ n’ihu Chineke site n’ịchọ ntụrụndụ na-adịghị ọcha ma ọ bụ ige egwú na abụ ndị na-akwalite mmụọ asọpụrụghị Chineke nke ụwa a. (2 Ndị Kọrint 6:14-18) Ọ bụrụ otú ahụ, ka anyị chọọ enyemaka Chineke n’ekpere ka anyị ghara isoro ụwa a gabiga kama bụrụ ndị a ga-anwapụta n’ihu Nwa nke mmadụ. (Luk 21:34-36; 1 Jọn 2:15-17) Ọ bụrụ na anyị ararawo onwe anyị nye Chineke, o doro anya na anyị ga-achọ ime ike anyị dum iji wulite ma jigide mmekọrịta na-ekpo ọkụ n’ebe ọ nọ ma si otú ahụ jikere maka oké ụbọchị Jehova nke na-atụ egwu.

19. N’ihi gịnị ka ìgwè ndị nkwusa Alaeze pụrụ iji tụọ anya ịdị ndụ gabiga ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a?

19 Noa na-asọpụrụ Chineke na ezinụlọ ya dịrị ndụ gabiga Iju Mmiri ahụ nke bibiri ụwa ochie ahụ. Ndị ziri ezi lanarịrị ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu na 70 O.A. Dị ka ihe atụ, Jọn onyeozi ka gbasiri ike n’ozi Chineke n’ihe dị ka 96-98 O.A., mgbe o dere akwụkwọ Mkpughe, ndekọ Oziọma ya, na akwụkwọ ozi atọ o dere site n’ike mmụọ nsọ. N’ime ọtụtụ puku ndị nakweere ezi okpukpe ahụ na Pentikọst nke 33 O.A., o yikarịrị ka ọtụtụ dịrị ndụ gabiga ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu. (Ọrụ 1:15; 2:41, 47; 4:4) Taa ìgwè nke ndị nkwusa Alaeze pụrụ inwe olileanya ịdị ndụ gabiga ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a.

20. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji bụrụ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi “na-ekwusa ezi omume”?

20 N’inwe nchebe baa n’ụwa ọhụrụ n’ihu anyị, ka anyị bụrụ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi “na-ekwusa ezi omume.” Lee ihe ùgwù ọ bụ ijere Chineke ozi na mgbe ikpeazụ a! Leekwa ihe ọṅụ ọ bụ iduzi ndị mmadụ gaa ‘n’ụgbọ’ nke oge a, paradaịs ime mmụọ nke ndị Chineke nọ na ya! Ka ọtụtụ nde ndị nọ na ya ugbu a nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ, jikerekwa maka oké ụbọchị Jehova. Ma gịnị ga-enyere anyị nile aka ịmụrụ anya?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee isi nke 10 na 11 nke akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Atụmanya ndị dị aṅaa ka ụfọdụ nweworo banyere ụbọchị Jehova na ọnụnọ Kraịst?

◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Noa na ezinụlọ ya jikeere maka Iju Mmiri ahụ?

◻ Gịnị ga-eme ndị ‘na-eche nche’ na ndị na-adịghị eche?

◻ N’ihi gịnị ka ibi obi dị nsọ ji dị oké mkpa, karịsịa ka anyị na-akpụdewe nso oké ụbọchị Jehova?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya