Ihe Mere Ndịàmà Jehova Ji Anọgide ná Nche
“Na-echenụ nche: n’ihi na unu amataghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.”—MATIU 24:42.
1. Ònye ka okwu ịdọ aka ná ntị ahụ bụ́ “na-echenụ nche” na-atụ aka?
NYE ohu ọ bụla nke Chineke—ma ọ bụ onye na-eto eto ma ọ bụ onye kataworo ahụ ná mmadụ, ma ọ bụ onye raara onwe ya nye ọhụrụ ma ọ bụ onye jeworo ozi ruo ogologo oge—okwu ịdọ aka ná ntị Bible ahụ dị irè: “Na-echenụ nche”! (Matiu 24:42) N’ihi gịnị ka nke a ji dị mkpa?
2, 3. (a) Ihe ịrịba ama dị aṅaa ka Jisọs kọwara n’ụzọ doro anya, gịnịkwa ka mmezu nke amụma gosiworo? (b) Ọnọdụ dị aṅaa a kpọtụrụ uche na Matiu 24:42 na-anwale izi ezi nke okwukwe anyị, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?
2 Ka ọ na-eru ngwụsị nke ozi ya n’elu ụwa, Jisọs buru amụma banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya n’ike Alaeze. (Matiu, isi 24 na 25) N’ụzọ doro anya ọ kọwara na oge ọnụnọ ya nke ọbụbụeze—na ihe omume dị iche iche ná mmezu nke amụma na-egosi na e mere ka ọ nọkwasị n’oche dị ka Eze n’eluigwe na 1914. O zokwara aka n’ọnọdụ nke ga-emesịa nwalee izi ezi nke okwukwe anyị. Nke a na-ezo aka n’oge ahụ mgbe ọ ga-amalite ọrụ dị ka Onye Mbibi ibibi usoro ihe ọjọọ dị ugbu a n’oge oké mkpagbu ahụ nke Jisọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị na oge hour ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara.” Ọ bụ n’ibu nke ahụ n’uche ka ọ sịrị: “Ya mere, na-echenụ nche: n’ihi na unu amataghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.”—Matiu 24:36, 42.
3 Anyị amataghị ụbọchị na oge hour mgbe oké mkpagbu ahụ ga-amalite na-achọ na ọ bụrụ na anyị na-azọrọ ịbụ ndị Kraịst, anyị kwesịrị ibi ndụ dị ka ezi ndị Kraịst kwa ụbọchị. Ụzọ isi e ji ndụ gị eme ihe ọ̀ ga-arụpụta nnwapụta Onyenwenụ ahụ mgbe oké mkpagbu ahụ rutere? Ma ọ bụ ọ bụrụ na ọnwụ eburu ụzọ bịa, ọ̀ ga-echeta gị dị ka onye ji iguzosi ike n’ihe jeere Jehova ozi ruo ọgwụgwụ nke ndụ gị ugbu a?—Matiu 24:13; Mkpughe 2:10.
Ndị Mbụ Na-eso Ụzọ Gbalịsiri Ike Ịnọ ná Nche
4. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ Jisọs nke ịnọ ná nche ime mmụọ?
4 Jisọs Kraịst n’onwe ya setịpụrụ ihe nlereanya kasị mma nke ịnọ ná nche ime mmụọ. O kpekuru Nna ya ekpere ugboro ugboro site n’obi ya. (Luk 6:12; 22:42-44) Mgbe ule dị iche iche chere ya ihu, ọ dabesiri ike ná nduzi dị n’ime Akwụkwọ Nsọ. (Matiu 4:3-10; 26:52-54) O kweghị ka a dọpụ uche ya n’ọrụ Jehova kenyeworo ya. (Luk 4:40-44; Jọn 6:15) Ndị lere onwe ha anya dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs hà ga-anọ na nche n’otu aka ahụ?
5. (a) N’ihi gịnị ka ndị ozi Jisọs ji nwee nsogbu n’ịnọgide n’ezi nguzo n’ime mmụọ? (b) Enyemaka dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị ozi ya mgbe mbilite n’ọnwụ ya gasịrị?
5 N’oge ụfọdụ, ọbụna ndị ozi Jisọs sụrụ ngọngọ. Dị ka ihe si n’ịnụbiga ọkụ n’obi ókè na echiche ndị na-ezighị ezi pụta, ha aghaghị iche mmechuihu ihu. (Luk 19:11; Ọrụ 1:6) Tupu ha amụta ịdabere kpam kpam na Jehova, ule mberede dị iche iche etigharịwo ha anya. Otú a, mgbe e jidesịrị Jisọs, ndị ozi ya gbalagara. E mesịa n’abalị ahụ, Pita, n’ihi ụjọ, gọnarịrị ọbụna ịma onye Kraịst bụ ugboro ugboro. Ndị ozi ahụ etinyebeghị n’obi ndụmọdụ Jisọs: “Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere.” (Matiu 26:41, 55, 56, 69-75) Mgbe mbilite n’ọnwụ ya gasịrị Jisọs jiri Akwụkwọ Nsọ mee ka okwukwe ha sie ike. (Luk 24:44-48) Mgbe o yikwara ka ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ n’ime ha ga-etinye ozi ahụ e tinyeworo n’aka ha n’ọnọdụ nke abụọ, Jisọs mesiri obi mkpali ha ike ịtụkwasị uche n’ọrụ ahụ dị mkpa karị.—Jọn 21:15-17.
6. Megide ọnyà abụọ dị aṅaa ka Jisọs bu ụzọ dọọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị?
6 Tupu mgbe ahụ, Jisọs adọwo ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị na ha agaghị abụ akụkụ nke ụwa. (Jọn 15:19) Ọ dụwokwa ha ọdụ ka ha ghara ime ibe ha ka ha bụ ndị nwe ha kama ka ha na-ejekọ ozi dị ka ụmụnna. (Matiu 20:25-27; 23:8-12) Hà ṅara ntị ná ndụmọdụ ya? Hà tinyere ọrụ ahụ o nyere ha n’ọnọdụ mbụ?
7, 8. (a) Olee otú ihe ndekọ nke ndị Kraịst nke narị afọ mbụ si gosi na ha nabatara okwu ịdọ aka ná ntị Jisọs? (b) N’ihi gịnị ka ịnọgide ná nche ime mmụọ ji dị mkpa?
7 Ruo oge nile ndị ozi ahụ dịrị ndụ, ha chebere ọgbakọ ahụ. Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ndị Kraịst oge mbụ etinyeghị aka n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Alaeze Ukwu Rom, ha enweghịkwa òtù ndị ụkọchukwu e buliri elu. N’aka nke ọzọ, ha bụ ndị nkwusa na-arụsi ọrụ ike nke Alaeze Chineke. Mgbe ọ na-erule ọgwụgwụ nke narị afọ nke mbụ, ha agbawo àmà gburugburu Alaeze Ukwu Rom, na-eme ndị na-eso ụzọ n’Esia, Europe, na Ebe Ugwu Africa.—Ndị Kọlọsi 1:23.
8 Otú ọ dị, ihe ndị ahụ a rụzuru n’ime nkwusa apụtaghị na ọ dịzighị mkpa ịnọ ná nche n’ụzọ ime mmụọ. Ọbịbịa Jisọs ahụ e buru n’amụma gaje iwere ọnọdụ n’ọdịnihu dị anya. Ka ọgbakọ ahụ banyekwara na narị afọ nke abụọ O.A., ọnọdụ dị iche iche bilitere, bụ́ ndị tinyere ọnọdụ ime mmụọ nke ndị Kraịst n’ihe ize ndụ. N’ụzọ dị aṅaa?
Ndị Kwụsịrị Ịnọ ná Nche
9, 10. (a) Mgbe ọnwụ ndị ozi ahụ gasịrị, ihe omume ndị dị aṅaa gosiri na ọtụtụ ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst anọgideghị ná nche? (b) Olee akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a kpọtụrụ uche na paragraf nke a gaara enyeworo ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraiṣt aka ịkwụsi ike n’ime mmụọ?
9 Ụfọdụ ndị batara n’ọgbakọ ahụ malitere ikwupụta ihe ha kwere na ya n’ụzọ kwekọrọ ná nkà ihe ọmụma ndị Gris, iji mee ka ihe ha na-ekwusa bụrụ ihe ndị ụwa na-anara karị. Nwayọọ nwayọọ, ozizi ndị ọgọ mmụọ, dị ka Atọ n’Ime Otu na anwụghị anwụ ebumpụta ụwa nke mkpụrụ obi, ghọrọ akụkụ nke ụdị Iso Ụzọ Kraịst e metọrọ emetọ. Nke a dugara n’ịgbahapụ olileanya nke narị afọ iri ahụ. N’ihi gịnị? Ndị nakweere ozizi nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi kwubiri na mkpụrụ obi ga-alanarị ahụ nke mmadụ ga-enweta ngọzi dị iche iche nke ọchịchị Kraịst n’ógbè ndị bụ mmụọ. Ya mere ha ahụghị mkpa nke ịnọ ná nche maka ọnụnọ Kraịst n’ike Alaeze.—Tụlee Ndị Galetia 5:7-9; Ndị Kọlọsi 2:8; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:21.
10 Ihe ndị ọzọ biliterenụ mesiri ọnọdụ nke a ike. Ụfọdụ ndị zọọrọ na ha bụ ndị nlekọta nke ndị Kraịst malitere iji ọgbakọ ha dị iche iche na-eme ihe dị ka ụzọ ha si abụ ndị a ma ama. Ha ji ụzọ aghụghọ mee ka uche na ozizi nke aka ha nwee ike hà ka nke Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ ọbụna karịa ya. Mgbe ohere ya bilitere, chọọchị nke a dapụrụ n’ezi ofufe wepụtara onwe ya ijere ọdịmma nke mba ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ ozi.—Ọrụ 20:30; 2 Pita 2:1, 3.
Ihe Ndị Si n’Ịnọkwu ná Nche Pụta
11, 12. N’ihi gịnị ka Mgbanwe Ndị Protestant na-ejighị kaa akara nlaghachi nke ezi ofufe?
11 Mgbe ọtụtụ narị afọ nke iji ike mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi n’akụkụ nke Chọọchị Roman Katọlik gasịrị, ụfọdụ ndị Na-eme Mgbanwe kwupụtara okwu na narị afọ nke 16. Ma nke a akaghị nlaghachi gaa n’ezi ofufe akara. N’ihi gịnị?
12 Ọ bụ ezie na ọtụtụ òtù Protestant kewapụrụ onwe ha site n’ike Rom, ha buuru ọtụtụ n’ime ozizi na omume ndị bụ isi nke ndapụ n’ezi ofufe ahụ—echiche nke ndị ụkọchukwu na ndị aghasa chọọchị, nakwa nkwenye n’Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, na ahụhụ ebighị ebi mgbe a nwụsịrị. Dịkwa ka Chọọchị Roman Katọlik, ha nọgidere na-abụ akụkụ nke ụwa, na-enwe mmekọrịta chiri anya nke ha na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ya mere ha jụkwara atụmanya ọ bụla nke ọbịbịa Kraịst dị ka Eze.
13. (a) Gịnị na-egosi na ụfọdụ ndị n’ezie weere Okwu Chineke n’ihe dị oké ọnụ ahịa? (b) N’ime narị afọ nke 19, ihe omume dị aṅaa ghọrọ ihe mmasị pụrụ iche nye ụfọdụ ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst? (ch) N’ihi gịnị ka ọtụtụ ji nwee mmechuihu?
13 Ma, Jisọs ebụwo amụma na mgbe ọnwụ ndị ozi ahụ gasịrị, ezi ndị nketa nke Alaeze ahụ (ndị o ji tụnyere ọka) ga-anọgide soro ndị Kraịst ụgha ahụ (ma ọ bụ, ata) na-etokọ ruo oge owuwe ihe ubi. (Matiu 13:29, 30) Taa anyị apụghị idetu kpọmkwem ndị nile Onyenwenụ ahụ lere anya dị ka ọka. Ma ọ bụ ihe e kwesịrị ịrịba ama na n’ime narị afọ nke 14, 15, na 16, e nwere ndị ikom ndị tinyere ndụ na nnwere onwe ha n’ihe ize ndụ iji tinye Bible n’asụsụ nke ndị nkịtị. Ọ bụghị nanị na ndị ọzọ nakweere Bible dị ka Okwu Chineke kamakwa ha jụrụ Atọ n’Ime Otu dị ka nke na-adịghị n’Akwụkwọ Nsọ. Ụfọdụ jụrụ ozizi nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na ntaramahụhụ n’ọkụ ala mmụọ dị ka nke na-ekwekọghị ma ọlị n’Okwu Chineke. Ọzọ, n’ime narị afọ nke 19, dị ka ihe sitere n’ọmụmụ ihe mụbara amụba nke Bible, ìgwè dị iche iche na United States, Germany, England, na Russia malitere ikwupụta ihe ido anya ha nwere na oge maka nlọghachi Kraịst dị nso. Ma ihe ka n’ihe ndị ha tụrụ anya ha dugara na mmechuihu. N’ihi gịnị? Ruo ókè dị ukwuu, ọ bụ n’ihi na ha dabeere nke ukwuu n’ebe ndị mmadụ nọ, ọ bụghịkwa n’ụzọ zuru ezu n’ebe Akwụkwọ Nsọ dị.
Ụzọ Ndị A Si Nwapụta Ịnọ ná Nche
14. Kọwaa ụzọ ọmụmụ Bible nke C. T. Russell na ndị òtù ya jiri mee ihe.
14 Mgbe ahụ, na 1870, Charles Taze Russell na ụfọdụ ndị òtù ya guzobere otu ìgwè maka ọmụmụ Bible n’Allegheny, Pennsylvania. Ha abụghị ndị mbụ ghọtara ọtụtụ n’ime eziokwu nke Bible ha nakweere, ma mgbe ha na-amụ ihe, ha na-eme ka ọ bụrụ omume ha iji nlezianya nyochaa akụkụ akwụkwọ nsọ nile n’ajụjụ ọ bụla.a Ihe bụ nzube ha abụghị ịchọpụta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-akwado echiche ha bu ụzọ nwee, kama ọ bụ iji jide n’aka na ha nwere nkwubi okwu ndị kwekọrọ n’ihe nile Bible kwuru n’okwu ahụ.
15. (a) Olee ihe ndị ọzọ ma e wezụga Nwanna Russell mesịrị ghọta? (b) Gịnị kara Ndị Mmụta Bible akara dị ka ndị dị iche site na ndị a?
15 Ole na ole ndị ọzọ tupu oge ha aghọtawo na Kraịst ga-alọghachi n’ụzọ a na-adịghị ahụ anya, dị ka mmụọ. Ụfọdụ ahụwo na nzube nke nlọghachi Kraịst abụghị isure ụwa n’ọkụ ma bipụ ndụ mmadụ nile, ma, kama nke ahụ, ọ bụ iji gọzie ezinụlọ nile nke ụwa. Ọbụna na e nwere mmadụ ole na ole ndị ghọtara na afọ ahụ bụ́ 1914 ga-aka akara ọgwụgwụ nke Oge Ndị Jentaịl. Ma nye Ndị Mmụta Bible ha na Nwanna Russell na-emekọ ihe, ihe ndị a karịrị isi ihe ndị a ga-atụle n’ụzọ nkà mmụta okpukpe. Ha wukwasịrị ndụ ha gburugburu eziokwu ndị a ma kpọsaa ha n’ụwa nile n’ókè a na-ahụtụbeghị na mbụ n’oge ahụ.
16. N’afọ 1914, n’ihi gịnị ka Nwanna Russell ji dee, sị: “Anyị nọ n’oge ule”?
16 N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị ha mkpa ịnọgide ná nche. N’ihi gịnị? Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na ha maara na 1914 bụ nke amụma Bible kara akara, ha ejighị n’aka kpọmkwem ihe ga-eme n’afọ ahụ. Nke a chere ha ule n’ihu. N’Ụlọ Nche (Bekee) nke November 1, 1914, Nwanna Russell dere, sị: “Ka anyị cheta na anyị nọ n’oge ule. . . . Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọ bụla ga-eduba onye ọ bụla n’ịhapụ okwukwe o kwere n’Onyenwe anyị na n’Eziokwu Ya na ịkwụsị ịchụ àjà maka Ụzọ nke Onyenwe anyị, mgbe ahụ ọ bụghị nanị ịhụnanya dị n’obi maka Chineke bụ nke kpaliworo mmasị n’ime Onyenwe anyị, kama ọ bụ ihe ọzọ; ma eleghị anya olileanya nke na oge ahụ dị mkpụmkpụ; odido nsọ ahụ bụ nanị maka ruo oge ụfọdụ.”
17. Olee otú A. H. Macmillan, na ndị ọzọ dị ka ya, si nọgide n’ezi nguzo ime mmụọ?
17 Ụfọdụ gbahapụrụ ozi Jehova n’oge ahụ. Ma A. H. Macmillan bụ otu onye nke na-agbahapụghị ya. Ọtụtụ afọ n’ikpeazụ, o kwetara n’eziokwu, sị: “Mgbe ụfọdụ ihe ndị anyị tụrụ anya ha maka otu oge bụ ihe karịrị ihe Akwụkwọ Nsọ nyere ohere ya.” Mgbe ahụ gịnị nyeere ya aka iguzosi ike n’ime mmụọ? Dị ka o kwuru, ọ ghọtara na “mgbe ihe ndị ahụ a tụrụ anya ha na-emezughị, nke ahụ agbanweghị nzube nile nke Chineke.” O kwukwara, sị: “M mụtara na anyị kwesịrị ịnakwere mmehie ihe anyị ma nọgide na-enyocha Okwu Chineke maka inwetakwu ihe ọmụma.”b N’obi umeala, Ndị Mmụta Bible mbụ ahụ kwere ka Okwu Chineke gbanwee echiche ha.—2 Timoti 3:16, 17.
18. Olee otú ịnọ ná nche ndị Kraịst si mịpụta abamuru na-aga n’ihu n’ihe banyere abụghị akụkụ nke ụwa?
18 N’ime afọ ndị sochirinụ, mkpa ọ dị ịnọ ná nche ebelataghị. Ha maara nnọọ na ndị Kraịst agajeghị ịbụ akụkụ nke ụwa. (Jọn 17:14; Jemes 4:4) N’ikwekọ na nke ahụ, ha esonyereghị Krisendọm n’ịkwado òtù League of Nations dị ka ngosipụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Alaeze Chineke. Ma ọ bụ nanị mgbe o ruru na 1939 ka ha hụrụ n’ụzọ doro anya okwu banyere nnọpụiche ndị Kraịst.—Lee Ụlọ Nche (Bekee), November 1, 1939.
19. Uru ndị dị aṅaa ná nlekọta nke ọgbakọ ka a rụpụtaworo n’ihi na nzukọ ahụ nọgidere na nche?
19 Ha enweghị òtù ndị ụkọchukwu, ọ bụ ezie na ndị okenye ụfọdụ e ji ntụli aka elu họpụta chere na nanị ihe e kwesịrị ịtụ anya n’aka ha bụ ime nkwusa n’ime ọgbakọ. Otú ọ dị, site n’inwe ezi ọchịchọ n’ikwekọ n’Akwụkwọ Nsọ, nzukọ ahụ tụleghachiri ọrụ nke ndị okenye dị ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ si dị, na-eme nke a ugboro ugboro site na kọlụm dị iche iche nke Ụlọ Nche. E mere mgbanwe nke nhazi n’ikwekọ n’ihe Akwụkwọ Nsọ gosipụtara.
20-22. Olee otú e siworo kwadebe nzukọ ahụ n’ụzọ na-aga n’ihu ná iji rụzuo ọrụ nkwusa Alaeze ahụ nke e buru amụma ya gburugburu ụwa?
20 Nzukọ ahụ dum na-akwadebe maka ịrụzu ọrụ ahụ nke Okwu Chineke kwuru na a ga-arụ n’ụbọchị anyị. (Aịsaịa 61:1, 2) Ruo ókè hà aṅaa ka a ga-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụbọchị anyị? Jisọs sịrị: “A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa ozi ọma nke m n’ihu mba nile.” (Mak 13:10) N’ụzọ mmadụ si ele ihe anya, ọrụ ahụ eyiwo ihe na-apụghị ikwe omume ọtụtụ ugbo.
21 Ma, n’inwe obi ike n’ebe Kraịst nọ dị ka Isi nke ọgbakọ ahụ, òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na nke nwere uche agawo n’ihu. (Matiu 24:45) N’ikwesị ntụkwasị obi na n’ụzọ siri ike ha emewo ka ọ pụta ìhè nye ndị Jehova ọrụ nke ọ dị mkpa ka a rụọ. Malite 1919 gaa n’ihu, e mesiwo okwu ike n’ụzọ na-arị elu n’ebe ozi ubi dị. Nye ọtụtụ ndị, ọ bụghị ihe dị mfe ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-agwa ndị a na-amaghị okwu. (Ọrụ 20:20) Ma isiokwu ndị dịịrị ọmụmụ dị ka “Ndị A Gọziri Agọzi Ka Ndị Na-adịghị Atụ Egwu Bụ” (na 1919) na “Nwee Obi Ike” (na 1921) nyeere ụfọdụ ndị aka ịmalite ọrụ ahụ, na-atụkwasị Jehova obi.
22 Òkù ahụ, na 1922, bụ́ “kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na alaeze ya” nyere ihe nkwali dị mkpa iji nye ọrụ a ọnọdụ pụtara ìhè dị ka o kwesịrị. Malite na 1927 gaa n’ihu, e wepụrụ ndị okenye ahụ na-anaraghị ibu ọrụ nke Akwụkwọ Nsọ. N’ihe dị ka n’oge ahụ, e kenyere ndị nnọchiteanya Society na-ejegharị ejegharị, ndị pilgrim, ọrụ ịbụ ndị nduzi ije ozi ógbè, na-enye ndị nkwusa ntụziaka onwe onye n’ozi ubi. Ọ bụghị mmadụ nile pụrụ ịsụ ụzọ, ma ná ngwụsị izu ọtụtụ na-etinye ụbọchị dum n’ije ozi, na-amalite n’isi ụtụtụ na-akwụsị nanị ná mkpirikpi ịta achịcha e tinyere anụ n’ime ma gaa n’ihu n’ozi ahụ ruo mgbe oge gasịrị n’uhuruchi. Ndị ahụ bụ oge ndị dị mkpa ná ntolite nke ọchịchị Chineke, anyị na-eritekwa uru nke ukwuu site n’ịtụleghachi ụzọ Jehova si na-edu ndị ya. Ọ nọgidewo na-eme otú ahụ. Sitekwa ná ngọzi ya, ọrụ nkwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ e guzobeworo ga-abịaru ọgwụgwụ nwere ihe ịga nke ọma.
Ị̀ Na-anọgide ná Nche?
23. N’ihe banyere ịhụnanya na nnọpụiche ndị Kraịst site n’ụwa, olee otú anyị n’otu n’otu pụrụ isi gosipụta na anyị na-anọgide ná nche?
23 N’ịnara nduzi Jehova, nzukọ ya nọgidere na-eme ka anyị mara omume na àgwà dị iche iche ga-eme ka a mata anyị dị ka ndị bụ akụkụ nke ụwa, n’ihi ya bụrụ ndị nọ n’ihe ize ndụ iso ya gabiga. (1 Jọn 2:17) N’aka nke anyị, ọ dị mkpa ka anyị n’otu n’otu nọrọ ná nche site n’ịnara nduzi Jehova. Jehova na-enyekwa anyị ntụziaka n’ibikọ na ịrụkọ ọrụ ọnụ. Nzukọ ya enyeworo anyị aka ito eto ná nghọta nke ihe ịhụnanya ndị Kraịst pụtara n’ezie. (1 Pita 4:7, 8) Anyị ịnọgide ná nche chọrọ anyị n’aka ịgbalịsi ike itinye ndụmọdụ nke a n’ọrụ, n’agbanyeghị ezughị okè nke mmadụ.
24, 25. N’akụkụ ndị dị aṅaa dị mkpa ka anyị kwesịrị ịnọ ná nche, na-eburu olileanya dị aṅaa n’uche?
24 Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche anọgidewo na-echetaghachiri anyị, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala ná nghọta gị.” (Ilu 3:5) “Na-ekpenụ ekpere n’ewepụghị aka.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) A dụwo anyị ọdụ ịmụta ime ka mkpebi anyị nile dabere n’Okwu Chineke, iji mee ka okwu a bụrụ ‘oriọna dịịrị ụkwụ anyị na ìhè dịịrị okporo ụzọ anyị.’ (Abụ Ọma 119:105) N’ụzọ ịhụnanya, a gbawo anyị ume idebe ọrụ nkwusa ozi ọma Alaeze Chineke, bụ́ ọrụ Jisọs buru amụma ya maka oge anyị a, n’ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị.—Matiu 24:14.
25 Ee, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na nke nwere uche na-eche nche n’ezie. Ọ dịkwa mkpa ka anyị n’otu n’otu na-eche nche. Dị ka ihe ga-esi n’ime otú ahụ pụta, ka a hụta anyị n’etiti ndị ga-eguzo n’ihu Nwa nke mmadụ dị ka ndị a nwapụtaworo mgbe ọ bịara imezu ihe e kpere n’ikpe.—Matiu 24:30; Luk 21:34-36.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Faith on the March, nke A. H. Macmillan, Prentice-Hall, Inc., 1957, peji nke 19-22.
b Lee Ụlọ Nche (Bekee), August 15, 1966, peji nke 504-510.
Ná Ntụleghachi
◻ Dị ka e gosiri na Matiu 24:42, n’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ịnọgide ná nche?
◻ Olee otú Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na narị afọ mbụ si nọgide ná nche ime mmụọ?
◻ Kemgbe 1870, ihe ndị dị aṅaa meworo n’ihi na ndị ohu Jehova anọgidewo ná nche?
◻ Gịnị ga-enye ihe àmà nke na anyị n’otu n’otu na-anọ ná nche?
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Jisọs nọgidere n’ọrụ Nna ya nyere ya. O kpesikwara ekpere ike
[Foto dị na peeji nke 24]
Charles Taze Russell mgbe o meworo agadi
[Foto dị na peeji nke 25]
Ihe karịrị 4,700,000 ndị nkwusa Alaeze na-arụsi ọrụ ike n’ụwa nile