Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wt isi 14 p. 128-135
  • Olee Otú Jehova Si Eduzi Nzukọ Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Jehova Si Eduzi Nzukọ Ya?
  • Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmata Akụkụ Ya nke A Na-ahụ Anya
  • Nke A Haziri n’Usoro Ọchịchị Chineke
  • Nọrọ ná Nchebe Dị Ka Akụkụ nke Nzukọ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ịkwụsi Ike n’Akụkụ Kraịst na Ohu Ya Na-ekwesị Ntụkwasị Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • “Na-echetanụ Ndị Na-edu Ndú n’Etiti Unu”
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ka E Wulie Ọgbakọ Elu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
wt isi 14 p. 128-135

Isi nke Iri na Anọ

Olee Otú Jehova Si Eduzi Nzukọ Ya?

1. Ihe ọmụma dị aṅaa banyere nzukọ Jehova ka Bible na-ekpughe, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị anyị mkpa?

CHINEKE ò nwere nzukọ? Akwụkwọ Nsọ nke sitere n’ike mmụọ nsọ na-agwa anyị na o nwere. N’Okwu ya, ọ na-eme ka anyị hụtatụ akụkụ dị ebube, nke dị n’eluigwe, nke nzukọ ahụ. (Ezikiel 1:1, 4-14; Daniel 7:9, 10, 13, 14) Ọ bụ ezie na anyị apụghị ịhụ akụkụ a a na-adịghị ahụ anya, ọ na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ndị na-efe ezi ofufe taa. (2 Ndị Eze 6:15-17) Nzukọ Jehova nwekwara akụkụ a na-ahụ anya, n’ụwa. Bible na-enyere anyị aka ịghọta ihe ọ bụ na otú Jehova si na-eduzi ya.

Ịmata Akụkụ Ya nke A Na-ahụ Anya

2. Olee ọgbakọ ọhụrụ Chineke mere ka e nwee?

2 Ruo afọ 1,545, mba Izrel bụ ọgbakọ Chineke. (Ọrụ 7:38) Ma Izrel edebeghị iwu Chineke, ha jụkwara Ọkpara ya. N’ihi ya, Jehova jụrụ ọgbakọ ahụ ma gbahapụ ya. Jizọs gwara ndị Juu, sị: “Lee! A gbahapụworo unu ụlọ unu.” (Matiu 23:38) Chineke meziri ka e nwee ọgbakọ ọhụrụ, nke o so banye n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ. Ihe gaje imejupụta ọgbakọ a bụ mmadụ 144,000 Chineke họọrọ iso Ọkpara ya nọrọ n’eluigwe.—Mkpughe 14:1-4.

3. Olee ihe mere na Pentikọst 33 O.A., nke bụ́ ihe àmà doro anya na Chineke jizi ọgbakọ ọhụrụ na-eme ihe?

3 E ji mmụọ nsọ Jehova tee ndị mbụ so n’ọgbakọ ọhụrụ ahụ mmanụ na Pentikọst 33 O.A. Banyere ihe omume ahụ dị ịrịba ama, anyị na-agụ, sị: “Ka ụbọchị ememe Pentikọst na-agakwa n’ihu, ha nile nọkọrọ ọnụ n’otu ebe, na mberede e nwekwara ụzụ sitere n’eluigwe dị nnọọ ka oké ifufe nke na-efesi ike, o wee ju ụlọ ahụ dum bụ́ ebe ha nile nọ ala. Ha na-ahụkwa ire ndị dị ka nke ọkụ, bụkwa ndị e kesasịrị, otu dịkwasịkwa n’isi onye ọ bụla n’ime ha, ha nile jupụtakwara na mmụọ nsọ.” (Ọrụ 2:1-4) Mmụọ nsọ Chineke si otú a nye ihe àmà doro anya na nke a bụzi ìgwè Chineke ga-eji mezuo nzube ya n’okpuru nduzi Jizọs Kraịst, bụ́ onye nọ n’eluigwe.

4. Olee ndị taa mejupụtara nzukọ Jehova a na-ahụ anya?

4 Taa, ọ bụ nanị ihe fọdụrụ n’ime 144,000 nọ n’ụwa. Ma n’imezu amụma Bible, a kpọkọtawo “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ,” ọtụtụ nde n’ime ha, isonyere ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ. Jizọs, bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, ejikọtawo atụrụ ọzọ a na ihe ahụ fọdụrụnụ, ha wee ghọọ otu ìgwè atụrụ nke ọ na-elekọta dị ka otu Onye Ọzụzụ Atụrụ ha. (Mkpughe 7:9; Jọn 10:11, 16) Ọ bụ ha nile mejupụtara otu ọgbakọ nke dị n’otu, nzukọ Jehova a na-ahụ anya.

Nke A Haziri n’Usoro Ọchịchị Chineke

5. Ònye na-eduzi nzukọ Chineke, n’ụzọ dịkwa aṅaa?

5 Okwu ahụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ, nke bụ́ “ọgbakọ nke Chineke dị ndụ,” na-eme ka a mara n’ụzọ doro anya onye na-eduzi ya. Nzukọ ahụ bụ nke Chineke na-achị. Jehova na-enye ndị ya nduzi site n’aka Jizọs, bụ́ onye Ọ họpụtara ịbụ Onyeisi a na-adịghị ahụ anya nke ọgbakọ ahụ, nakwa site n’Okwu Ya nke sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible.—1 Timoti 3:14, 15; Ndị Efesọs 1:22, 23; 2 Timoti 3:16, 17.

6. (a) Olee otú o si pụta ìhè na e si n’eluigwe na-eduzi ọgbakọ ahụ na narị afọ mbụ? (b) Gịnị na-egosi na Jizọs ka bụ Onyeisi nke ọgbakọ ahụ?

6 Nduzi dị otú ahụ pụtara nnọọ ìhè na Pentikọst. (Ọrụ 2:14-18, 32, 33) Ọ pụtara ìhè mgbe mmụọ ozi Jehova nyere nduzi ka a gbasaa ozi ọma ahụ gaa n’Africa, mgbe olu Jizọs nyere nduzi n’oge a tọghatara Sọl nke Tasọs, nakwa mgbe Pita malitere ọrụ nkwusa ahụ n’etiti ndị Jentaịl. (Ọrụ 8:26, 27; 9:3-7; 10:9-16, 19-22) Ma, ka oge na-aga, a kwụsịrị ịnụ olu site n’eluigwe, ịhụ ndị mmụọ ozi, inye onyinye ọrụ ebube nke mmụọ nsọ. Ma, Jizọs kwere nkwa, sị: “Lee! m nọnyeere unu ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.” (Matiu 28:20; 1 Ndị Kọrint 13:8) Taa, Ndịàmà Jehova na-ekweta na ọ bụ Jizọs na-eduzi ha. E wezụga ya, ọ gaghị ekwe omume ịkpọsa ozi Alaeze ahụ ka a nọ na-ebuso ha iro n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ.

7. (a) Olee ndị mejupụtara “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” n’ihi gịnịkwa? (b) Olee ọrụ e nyere “ohu” ahụ?

7 Ntakịrị oge tupu ya anwụọ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya banyere “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” onye ya onwe ya dị ka Nna Ukwu ga-enyefe ọrụ pụrụ iche. “Ohu” ahụ ga-anọ ya mgbe Onyenwe anyị ga-agawa eluigwe, ọ ka ga-anọkwa na-arụsi ọrụ ike mgbe Kraịst ga-alaghachi n’ụzọ a na-adịghị ahụ anya n’ike Alaeze. Ọ ga-esi ike inwe otu onye nkọwa dị otú ahụ ga-ekwesị, ma o kwesịrị ọgbakọ Kraịst, nke e tere mmanụ. Ebe o ji ọbara ya zụta ya, Jizọs kpọrọ ya “ohu” ya. O nyere ndị so na ya ọrụ ime ndị na-eso ụzọ nakwa ịdị na-azụ ha n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu, na-enye ha “nri [ime mmụọ] ha n’oge kwesịrị ekwesị.”—Matiu 24:45-47; 28:19; Aịsaịa 43:10; Luk 12:42; 1 Pita 4:10.

8. (a) Ọrụ dịgasị aṅaa ka òtù ohu ahụ nwere ugbu a? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị ṅaa ntị ná ntụziaka Chineke si n’aka ohu a na-enye?

8 Ebe òtù ohu ahụ ji iguzosi ike n’ihe na-arụ ọrụ Nna ya ukwu n’oge ọ laghachiri n’ụzọ a na-adịghị ahụ anya na 1914, e nwere ihe àmà na-egosi na e nyere ya ibu ọrụ ka ukwuu na 1919. Afọ ndị gafeworonụ kemgbe ahụ abụwo oge ịgba àmà n’ụwa nile banyere Alaeze ahụ, a na-achịkọtakwa oké ìgwè mmadụ nke ndị na-efe Jehova ofufe maka ichebe ha ndụ gabiga oké mkpagbu ahụ. (Matiu 24:14, 21, 22; Mkpughe 7:9, 10) Nri ime mmụọ dịkwa ndị a mkpa, òtù ohu ahụ na-enyekwa ha ya. Ya mere, iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ, ọ dị anyị mkpa ịnara ntụziaka Jehova na-enye site n’aka ohu a na ime ihe kwekọrọ na ya.

9, 10. (a) Na narị afọ mbụ, olee ndokwa e nwere maka ịza ajụjụ ndị metụtara ozizi na inye ntụziaka banyere ikwusa ozi ọma ahụ? (b) Olee ndokwa e nwere taa maka ịhazi ọrụ ndị Jehova?

9 Mgbe ụfọdụ, ajụjụ na-ebilite banyere ozizi na usoro e si eme ihe. Mgbe ọ dị otú ahụ gịnị ka a ga-eme? Ọrụ isi 15 na-agwa anyị otú e si dozie otu okwu nke metụtara ndị Jentaịl a tọghatara atọghata. E wegaara ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem okwu ahụ, bụ́ ndị jere ozi dị ka òtù na-achị isi. Ndị ikom ahụ abụghị ndị na-adịghị eme mmehie, ma Chineke ji ha mee ihe. Ha tụgharịrị uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị metụtara okwu ahụ nakwa ihe àmà gosiri ịrụ ọrụ nke mmụọ Chineke n’imeghe ógbè ndị Jentaịl. Ha meziri mkpebi. Chineke gọziri ndokwa ahụ. (Ọrụ 15:1-29; 16:4, 5) Site n’aka òtù ahụ na-achị isi, e zipụrụ ndị mmadụ ime ka ọrụ nkwusa Alaeze ahụ gaa n’ihu.

10 N’oge anyị a, ndị mejupụtara Òtù Na-achị Isi nke nzukọ Jehova a na-ahụ anya bụ ụmụnna nwoke e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ndị si n’ala dị iche iche, ha nọkwa n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova. Ná nduzi Jizọs Kraịst, Òtù Na-achị Isi na-akwalite ofufe dị ọcha n’ala nile, na-ahazi ọrụ ime nkwusa nke Ndịàmà Jehova n’ọtụtụ iri puku ọgbakọ ha. Ndị so n’Òtù Na-achị Isi nwere echiche ahụ Pọl onyeozi nwere, bụ́ onye degaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, sị: “Ọ bụghị na anyị bụ ndị nna ukwu n’ebe okwukwe unu dị, kama anyị bụ ndị ọrụ ibe unu maka ọṅụ unu, n’ihi na ọ bụ n’okwukwe unu ka unu na-eguzo.”—2 Ndị Kọrint 1:24.

11. (a) Olee otú e si ahọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi? (b) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akwadosi ndị a họpụtara ahọpụta ike?

11 Ndịàmà Jehova n’ụwa nile na-adabere n’ebe Òtù Na-achị Isi nọ maka ịhọpụta ụmụnna nwoke ruru eru bụ́ ndị a na-enye ikike, n’aka nke ha, ịhọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi maka ilekọta ọgbakọ dị iche iche. E kwuru ihe ndị a chọrọ n’aka ndị ahụ a na-ahọpụta n’ime Bible, na-eburukwa n’uche na ndị ikom ahụ ezughị okè, ha na-emekwa mmehie. Ndị okenye, bụ́ ndị na-atụ aro maka nhọpụta tinyere ndị na-eme nhọpụta ahụ nwere ibu ọrụ dị ukwuu n’ebe Chineke nọ. (1 Timoti 3:1-10, 12, 13; Taịtọs 1:5-9) N’ihi ya, ha na-ekpe ekpere maka enyemaka nke mmụọ Chineke ma na-achọ nduzi site n’Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ. (Ọrụ 6:2-4, 6; 14:23) Ka anyị na-egosi ekele maka ndị a bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ,” ndị na-enyere anyị nile aka inweta “ịdị n’otu n’okwukwe.”—Ndị Efesọs 4:8, 11-16.

12. Olee otú Jehova si eji ndị inyom eme ihe ná ndokwa ọchịchị Chineke?

12 Akwụkwọ Nsọ nyere ntụziaka ka ọ bụrụ ndị ikom ga na-elekọta ọgbakọ. Nke a adịghị eweda ndị inyom ala, n’ihi na ụfọdụ n’ime ha bụ ndị nketa nke Alaeze eluigwe, ha na-arụkwa akụkụ dị ukwuu n’ọrụ nkwusa ahụ. (Abụ Ọma 68:11) Ọzọkwa, site n’iji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ ọrụ dịịrị ha n’ime ezinụlọ, ndị inyom na-atụnye ụtụ n’aha ọma nke ọgbakọ. (Taịtọs 2:3-5) Ma, ọ bụ ndị ikom a họpụtara ime ya na-ahụ maka izi ihe n’ime ọgbakọ.—1 Timoti 2:12, 13.

13. (a) Echiche dị aṅaa ka Bible na-agba ndị okenye ume inwe banyere ọnọdụ ha? (b) Ihe ùgwù dị aṅaa ka anyị nile pụrụ ikere òkè na ya?

13 N’ụwa, a na-ewere onye nwere ọkwá dị elu dị ka onye dị mkpa, ma ná nzukọ Chineke, ụkpụrụ a na-agbaso bụ: “Onye nke na-eme onwe ya dị ka onye ka nta n’etiti unu nile bụ onye dị ukwuu.” (Luk 9:46-48; 22:24-26) Akwụkwọ Nsọ na-adụ ndị okenye ọdụ ka ha kpachara anya ka ha ghara ime ndị bụ́ ihe nketa Chineke dị ka ọ bụ ha nwe ha, kama nke ahụ, ka ha ghọọ ihe nlereanya nye ìgwè atụrụ ahụ. (1 Pita 5:2, 3) Ọ bụghị nanị mmadụ ole na ole a họọrọ, kama Ndịàmà Jehova nile, ma nwoke ma nwanyị, nwere ihe ùgwù nke ịnọchite anya Eze eluigwe na ala, jiri ịdị umeala n’obi na-ekwu okwu n’aha ya ma na-agwa ndị mmadụ nọ n’ebe nile banyere Alaeze ya.

14. N’iji akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha eme ihe, tụlee ajụjụ ndị e depụtara ná ngwụsị paragraf a.

14 Ọ ga-adị mma ka anyị jụọ onwe anyị, sị: ‘Ènwere m ekele n’ezie n’otú Jehova si na-eduzi nzukọ ya a na-ahụ anya? Àgwà m, okwu ọnụ m, na omume m hà na-egosipụta nke ahụ?’ Ịtụgharị uche n’isi ihe ndị na-esonụ pụrụ inyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ime nnyocha dị otú ahụ.

Ọ bụrụ na m na-edo onwe m n’ezie n’okpuru Kraịst dị ka Onyeisi nke ọgbakọ, mgbe ahụ, dị ka e gosiri n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ, gịnị ka m ga na-eme? (Matiu 24:14; 28:19, 20; Jọn 13:34, 35)

Mgbe m ji ekele na-anakwere onyinye ime mmụọ ndị na-abịa site n’aka òtù ohu ahụ na Òtù Na-achị Isi ya, ònye ka m na-akwanyere ùgwù? (Luk 10:16)

Olee otú mmadụ nile n’ọgbakọ, karịsịa ndị okenye, kwesịrị isi na-emesorịta ibe ha? (Ndị Rom 12:10)

15. (a) Site n’àgwà anyị n’ebe nzukọ Jehova a na-ahụ anya dị, gịnị ka anyị na-egosipụta? (b) Ohere dịgasị aṅaa ka anyị nwere iji gosi na Ekwensu bụ onye ụgha na iji mee ka obi Jehova ṅụrịa?

15 Jehova na-eduzi anyị taa site ná nzukọ ya a na-ahụ anya nke dị n’aka Kraịst. Àgwà anyị n’ebe ndokwa a dị na-egosi ihe bụ́ echiche anyị banyere ihe iseokwu ahụ nke metụtara ọbụbụeze. (Ndị Hibru 13:17) Setan na-ekwusi ike na ihe dị anyị mkpa karịsịa bụ onwe anyị. Ma ọ bụrụ na anyị na-eje ozi n’ụzọ ọ bụla a chọrọ ma na-ezere ihe ndị na-adọta mmasị n’ebe onwe anyị nọ n’ụzọ na-enweghị isi, anyị na-eme Ekwensu onye ụgha. Ọ bụrụ na anyị hụrụ ndị na-edu ndú n’etiti anyị n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù ma jụ ‘inwe mmasị n’ihe ndị mmadụ bụ n’ihi uru nke aka anyị,’ anyị na-eme ka Jehova ṅụrịa. (Jud 16; Ndị Hibru 13:7) Site n’iguzosi ike n’ihe nye nzukọ Jehova, anyị na-egosi na Jehova bụ Chineke anyị nakwa na anyị bụ ndị dị n’otu n’ofufe anyị na-efe ya.—1 Ndị Kọrint 15:58.

Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu

• Gịnị bụ nzukọ Jehova a na-ahụ anya taa? Gịnị bụ nzube ya?

• Ònye bụ Onyeisi a họpụtara ahọpụta nke ọgbakọ ahụ, ọ̀ bụkwa site ná ndokwa dịgasị aṅaa a na-ahụ anya ka o si na-enye anyị nduzi ịhụnanya?

• Olee àgwà ọma ndị anyị kwesịrị ịzụlite n’ebe ndị nọ ná nzukọ Jehova nọ?

[Foto ndị dị na peeji nke 133]

Jehova na-eduzi anyị site ná nzukọ ya a na-ahụ anya nke dị n’okpuru Kraịst

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya