Mgbukepụ nke Ìhè—Ndị Ukwu na Ndị Nta Akụkụ nke Mbụ
“Okporo ụzọ ndị ezi omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.”—ILU 4:18.
1. N’ihi gịnị ka e jiworo were nwayọọ nwayọọ kpughee eziokwu ahụ?
Ọ BỤ nnwapụta nke amamihe Chineke na mkpughe nke eziokwu ime mmụọ ewerewo ọnọdụ nwayọọ nwayọọ site ná mgbukepụ nke ìhè, n’ikwekọ n’Ilu 4:18. N’isiokwu bu ụzọ, anyị hụrụ ụzọ e si mezuo akụkụ akwụkwọ nsọ a n’oge ndị ozi. A sị na e kpughere nchịkọta nile buru ibu nke eziokwu Akwụkwọ Nsọ otu mgbe, ọ gaara achachi anya ma na-agbagwoju anya—dị nnọọ ka ọ ga-adị isi n’ime ọgba gbara ọchịchịrị pụta wee banye n’ime anyanwụ na-achasi ike. Ọzọkwa, eziokwu ndị e ji nwayọọ nwayọọ kpughee na-eme ka okwukwe nke ndị Kraịst sie ike n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu. Ọ na-emewanye ka olileanya ha na-enwuwanye enwu ma na-eme ka ìhè na-adịwanye n’okporo ụzọ ha ga-eje ije n’ime ya.
“Ohu ahụ Kwesịrị Ka A Tụkwasị Ya Obi, nke Nwekwara Uche”
2. Ònye ka Jisọs gosiri na ọ ga-eji mee ihe iwetara ndị na-eso ụzọ ya ìhè ime mmụọ, ole ndị ka ihe ọrụ ahụ gụnyere?
2 N’oge ndị ozi, Jisọs Kraịst hụrụ ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị iji ike karịrị nke mmadụ mee ihe n’inye ndị na-eso ụzọ ya mgbukepụ nke ìhè ndị mbụ mbụ. Anyị nwere ihe atụ abụọ banyere nke a: Pentikọst 33 O.A. na ntọghata nke Kọniliọs na 36 O.A. Mgbe nke ahụ gasịrị, Kraịst ahụwo ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị iji ihe ọrụ bụ́ mmadụ mee ihe, ọbụna dị ka o buru n’amụma: “Ònye kwa bụ ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, nke onyenwe ya mere onye isi ezinụlọ ya, inye ha ihe e ji azụ ha n’oge ya? Ngọzi na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-abịa, ọ ga-ahụ ya ka ọ na-eme otú a. N’ezie asị m unu, na ọ ga-eme ya onye isi ihe nile o nwere.” (Matiu 24:45-47) Ohu nke a apụghị ịbụ nanị otu onye n’ihi na ọ gaje inye nri site na mgbe ọgbakọ ndị Kraịst malitere na Pentikọst ruo mgbe Onyenwenụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, bịara ime mpịazi. Ihe ndị mere eme na-egosi na òtù ohu nke a kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, na-agụnye ndị Kraịst nile e tere mmanụ dị ka otu ìgwè n’elu ụwa n’oge ọ bụla.
3. Olee ndị a gụnyere n’etiti ndị òtù mbụ nke òtù ohu ahụ?
3 Ole ndị ka a gụnyere n’etiti ndị ìgwè mbụ nke òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche? Otu bụ Pita onyeozi, onye gere ntị n’iwu Jisọs bụ́: “Na-enye atụrụ m nri.” (Jọn 21:17) Ndị ọzọ so ná ndị òtù mbụ nke òtù ohu ahụ gụnyere Matiu, onye dere Oziọma ahụ nke a kpọkwasịrị aha ya, na Pọl, Jemes, na Jud, bụ́ ndị dere akwụkwọ ozi ndị sitere n’ike mmụọ nsọ. Jọn onyeozi, bụ́ onye dekọrọ akwụkwọ Mkpughe, Oziọma ya, na akwụkwọ ozi ya dị iche iche, bụkwa onye òtù nke òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche. Ndị ikom ndị a dere ihe n’ikwekọ n’ọrụ Jisọs nyere.
4. Olee ndị bụ ndị “ezinụlọ” ahụ?
4 Ọ bụrụ na ndị nile e tere mmanụ dị ka otu òtù, n’agbanyeghị ebe ha bi n’elu ụwa, bụ ndị òtù nke òtù ohu ahụ, olee ndị bụ “ezinụlọ” ahụ? Ha bụ otu ndị ahụ e tere mmanụ ma e lee ya anya n’ụzọ dị iche—dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu. Ee, dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu ha ga-abụ ndị so ‘n’ohu’ ahụ ma ọ bụ ha ga-abụ “ezinụlọ” ahụ, na-adabere na ma hà na-ekesa nri ime mmụọ ma ọ bụ ma hà na-eri ya. Iji mee ihe atụ: Dị ka e dekọrọ na 2 Pita 3:15, 16, Pita onyeozi na-ezo aka n’akwụkwọ ndị Pọl dere. Mgbe ọ na-agụ ha, Pita ga-adị ka otu n’ime ndị ezinụlọ ahụ nke na-eri nri ime mmụọ ahụ si n’aka Pọl dị ka onye nnọchianya nke òtù ohu ahụ.
5. (a) Gịnị mere ohu ahụ n’ime narị afọ ndị ahụ mgbe oge ndị ozi gasịrị? (b) Olee ihe omume ndị weere ọnọdụ n’ọkara nke ikpeazụ nke narị afọ nke 19?
5 Banyere nke a, akwụkwọ bụ́ God’s Kingdom of a Thousand Years Has Approached kwuru, sị: “Banyere nnọọ otú ‘ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche’ si dịrị ma jee ozi n’ime narị afọ dị iche iche mgbe ọnwụ ndị ozi nke Onyenwenụ ahụ bụ́ Jisọs Kraịst gasịrị, anyị enweghị ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme doro anya. N’ụzọ doro anya otu ọgbọ nke òtù ‘ohu’ ahụ nyere ọgbọ ọzọ na-esonụ nri. (2 Timoti 2:2) Ma n’ọkara nke ikpeazụ nke narị afọ nke iri na itoolu e nwere ụmụ mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị hụrụ nri ime mmụọ nke Bible Nsọ n’anya na ndị nwere ọchịchọ iri ya . . . E guzobere klas ọmụmụ Bible dị iche iche . . . ma nwee ọganihu ná nghọta nke eziokwu ndị bụ isi nke Akwụkwọ Nsọ. Ndị nwere obi eziokwu na-adịghị achọ ọdịmma onwe ha nanị n’etiti ndị mmụta Bible ndị a nwere ọchịchọ isoro ndị ọzọ kerịta akụkụ ndị a dị mkpa nke nri ime mmụọ. Ha nwere mmụọ ikwesị ntụkwasị obi nke ‘ohu’ ahụ a họpụtara inye ‘ezinụlọ’ ahụ ‘nri’ ime mmụọ dị mkpa ‘n’oge ya.’ Ha ‘nwere uche’ n’ịghọta na ọ bụ mgbe ahụ bụ oge ziri ezi na nke kwesịrị ekwesị na ihe bụ ụzọ kasị mma isi kesaa nri ahụ. Ha gbalịrị ikesa ya.”—Peji nke 344-345.a
Mgbukepụ Ìhè Ndị Mbụ n’Oge A
6. Eziokwu dị aṅaa na-eguzopụta ìhè n’ihe banyere mkpughe gara nwayọọ nwayọọ nke eziokwu?
6 Otu eziokwu pụtara ìhè nke ọma n’ihe banyere ndị Jehova jiri mee ihe iweta ịba ụba nke a nke ìhè ime mmụọ na-abịa nwayọọ nwayọọ bụ na ha enyeghị onwe ha otuto. Omume C. T. Russell, onye isi oche mbụ nke Watch Tower Society, bụ na ọ masịrị Onyenwe anyị iji onyinye nkịtị ha mee ihe. Banyere okwu ọjọọ ndị ọ ga-amasị ndị iro ya iji mee ihe, n’ụzọ siri ike Nwanna Russell mere ka a mara na o zutebeghị “onye na-eso ụzọ Russell” na ọ dịghị ihe dị ka “iso ụzọ Russell.” Otuto nile gaara Chineke.
7. Ihe àmà dị aṅaa ka Nwanna Russell na ndị ọrụ ibe ya nyere na n’ezie ha nwere ihe jikọrọ ha na ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche?
7 Ikpebi site n’ihe ndị si na ya pụta, ihe ịrụ ụka apụghị ịdị ya na mmụọ nsọ Jehova na-eduzi mgbalị nile nke Nwanna Russell na ndị ya na ha kpakọrịtara. Ha nyere ihe àmà nke ịbụ ndị ha na ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwere uche na-agakọ. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ụkọchukwu nke oge ahụ kwuru na ha kwere na Bible bụ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, na Jisọs bụkwa Ọkpara Chineke, ha kwadoro ozizi ụgha nke Babilọn, dị ka Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ, na ntaramahụhụ ebighị ebi. N’ikwekọ ná nkwa Jisọs, ọ bụ n’ezie n’ihi mmụọ nsọ ka mgbalị obi umeala nke Nwanna Russell na ndị ya na ha kpakọrịtara jiri mee ka eziokwu nwupụta nke ọma karịa ka ọ dịworo mgbe ọ bụla. (Jọn 16:13) Ndị Mmụta Bible ahụ e tere mmanụ nyere ihe nnwapụta na ha bụ n’ezie akụkụ nke ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, onye ọ bụ ọrụ ya inye ndị ezinụlọ nke Onyenwenụ ahụ nri ime mmụọ. Mgbalị ha bụ ihe enyemaka dị ukwuu n’ịchịkọta ndị ahụ e tere mmanụ.
8. Eziokwu ndị dị aṅaa bụ isi banyere Jehova, Bible, Jisọs Kraịst, na mmụọ nsọ ka Ndị Mmụta Bible ghọtara n’ụzọ doro anya?
8 Ọ bụ ihe dị ịrịba ama ịhụ ụzọ dị ukwuu Jehova, site na mmụọ nsọ ya, si meere Ndị Mmụta Bible mbụ a amara inweta mgbukepụ ìhè. Iji malite, ha gosipụtara n’ụzọ siri ike na Onye Okike dị adị, na o nwekwara aha pụrụ iche bụ́ Jehova. (Abụ Ọma 83:18; Ndị Rom 1:20) Ha hụrụ na Jehova nwere àgwà anọ ndị bụ isi—ike, ikpe ziri ezi, amamihe, na ịhụnanya. (Jenesis 17:1; Deuterọnọmi 32:4; Ndị Rom 11:33; 1 Jọn 4:8) Ndị Kraịst ndị a e tere mmanụ gosipụtara n’ụzọ pụtara ìhè na Bible bụ Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ ma bụrụ eziokwu. (Jọn 17:17; 2 Timoti 3:16, 17) Ọzọkwa, ha kwere na e kere Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst eke, na o nyekwara ndụ ya dị ka ihe mgbapụta maka ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Matiu 20:28; Ndị Kọlọsi 1:15) A hụrụ na mmụọ nsọ bụ ike ọrụ Chineke, ọ bụghị ma ọlị onye nke atọ n’Atọ n’Ime Otu.—Ọrụ 2:17.
9. (a) Eziokwu ndị dị aṅaa ka Ndị Mmụta Bible ghọtara n’ụzọ doro anya banyere ọdịdị nke mmadụ na ọdịnihu ndị e setịpụrụ n’ime Bible? (b) Eziokwu ndị ọzọ dị aṅaa ka ndị ohu Jehova hụrụ nke ọma?
9 Ndị Mmụta Bible hụrụ n’ụzọ pụtara ìhè na mmadụ enweghị mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ kama ọ bụ mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. Ha ghọtara na “ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ,” ọ bụghị ntaramahụhụ ebighị ebi, ebe a na-enweghị ebe dị ka hell na-enwu ọkụ. (Ndị Rom 5:12; 6:23; Jenesis 2:7; Ezikiel 18:4) Ọzọkwa, ha hụrụ n’ụzọ doro anya na ozizi evolushọn abụghị nanị na Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ya kama o nweghị ma ọlị ihe ndabere ọ bụla bụ nke eziokwu. (Jenesis, isi nke 1 na 2) Ha ghọtakwara na Bible nwere olileanya abụọ a pụrụ inweta—nke eluigwe maka 144,000 ndị e tere mmanụ na-agbaso nzọụkwụ Kraịst na elu ala bụ paradaịs maka “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” a na-akpọghị ọnụ ọgụgụ ha aha. (Mkpughe 7:9; 14:1; Jọn 10:16) Ndị Mmụta Bible mbụ ahụ ghọtara na ụwa na-adịru ebighị ebi, a gaghịkwa esure ya n’ọkụ, dị ka ọtụtụ okpukpe na-akụzi. (Eklisiastis 1:4; Luk 23:43) Ha mụtakwara na nlọghachi Kraịst ga-abụ nke anya na-adịghị ahụ na mgbe ahụ ọ ga-emezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ mba nile ma weta elu ala nke bụ paradaịs.—Ọrụ 10:42; Ndị Rom 8:19-21; 1 Pita 3:18.
10. Eziokwu ndị dị aṅaa ka Ndị Mmụta Bible mụtara banyere baptism, ọdịiche dị n’etiti ndị ụkọchukwu na ndị aghasa chọọchị, na Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst?
10 Ndị Mmụta Bible mụtara na baptism nke Akwụkwọ Nsọ na-akwado abụghị okwu banyere ifesa ụmụntakịrị mmiri n’isi kama n’ikwekọ ná ndụmọdụ Jisọs nke dị na Matiu 28:19, 20, ọ bụ imikpu ndị kwere ekwe e ziworo ihe ná mmiri. Ha bịara hụ na ọ dịghị ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ dịnụ maka inwe nkewa n’etiti ndị ụkọchukwu na ndị aghasa chọọchị. (Matiu 23:8-10) N’ụzọ megidere nke ahụ, ndị Kraịst nile kwesịrị ịbụ ndị na-ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 1:8) Ndị Mmụta Bible ghọtara na e kwesịrị ime Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst nanị otu ugbo kwa afọ, na Nisan 14. Ọzọkwa, ha hụrụ na Ista bụ ụbọchị ezumike ndị ọgọ mmụọ. Tụkwasị na nke ahụ, ndị ahụ e tere mmanụ nwere obi ike na Chineke na-akwado ọrụ ha nke na ọ dịghị mgbe ọ bụla ha nakọtara ụtụ. (Matiu 10:8) Site n’oge mbụ mbụ, ha ghọtara na ndị Kraịst aghaghị ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ dị iche iche nke Bible, bụ́ nke na-agụnye ịzụlite mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke.—Ndị Galetia 5:22, 23.
Mgbukepụ Ìhè nke Na-aba Ụba
11. Ìhè dị aṅaa mụkwasịrị n’ọrụ ndị Kraịst na n’ilu Jisọs banyere atụrụ na ụmụ ewu?
11 Karịsịa kemgbe 1919 ndị ohu Jehova abụrụwo ndị e ji mgbukepụ ìhè na-aba ụba gọzie. Lee mgbukepụ ìhè na-enwu nke ọma nwupụtara ná mgbakọ Cedar Point e mere na 1922 ka J. F. Rutherford, onye isi oche nke abụọ nke Watch Tower Society, mere ka isi ihe ahụ pụta ìhè nke ọma na ibu ọrụ bụ isi nke ndị ohu Jehova nwere bụ ‘ịkpọsa, ịkpọsa, ịkpọsa, Eze ahụ na alaeze ya’! Na kpọmkwem afọ na-esochi ya, ìhè na-enwu nke ọma mụkwasịrị ilu nke atụrụ na ụmụ ewu. A hụrụ na a ga-emezu amụma nke a n’ụbọchị Onyenwe anyị nke dị ugbu a, ọ bụghị n’ọdịnihu n’ime Narị Afọ Iri ahụ dị ka e cheburu. N’ime Narị Afọ Iri ahụ, ụmụnna Kraịst agaghị arịa ọrịa, a gaghịkwa atụ ha mkpọrọ. E wezụgakwa nke ahụ, n’ọgwụgwụ nke Narị Afọ Iri ahụ, Jehova Chineke, ọ bụghị Jisọs Kraịst, ga-ekpe ikpe ahụ.—Matiu 25:31-46.
12. Mgbukepụ ìhè dị aṅaa ka e nwere banyere Amagedọn?
12 Na 1926 mgbukepụ ìhè ọzọ nke na-enwu nke ọma kpughere na agha Amagedọn agajeghị ịbụ mgbanwe ga-eme n’ọha mmadụ, dị ka Ndị Mmụta Bible chere n’otu oge. Kama nke ahụ, ọ ga-abụ agha nke ọ bụ n’ime ya ka Jehova ga-egosipụta ike ya n’ụzọ doro anya nke ukwuu nke na ọ ga-edo ndị nile anya na ọ bụ Chineke.—Mkpughe 16:14-16; 19:17-21.
Krismas—Ụbọchị Ezumike Ndị Ọgọ Mmụọ
13. (a) Ìhè dị aṅaa ka a mụkwasịrị n’ememe Krismas? (b) N’ihi gịnị ka a na-adịghịzi eme ememe ụbọchị ọmụmụ? (Tinye ntụaka ala ala peji.)
13 N’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị, mgbukepụ nke ìhè mere ka Ndị Mmụta Bible kwụsị ime ememe Krismas. Tupu oge ahụ, Ndị Mmụta Bible anọwo mgbe nile na-eme ememe Krismas gburugburu ụwa, ememe ya n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn bụ oge oké erimeri. Ma mgbe ahụ a ghọtara na ememe nke December 25 bụ n’ezie ihe ndị ọgọ mmụọ ma bụrụ nke Krisendọm dapụrụ n’ezi ofufe họọrọ iji mee ka ọ dịrị mfe ịtọghata ndị ọgọ mmụọ. Ọzọkwa, a chọpụtara na a pụghị ịmụworị Jisọs n’oge oyi, ebe ọ bụ na n’oge ọmụmụ ya, ndị ọzụzụ atụrụ na-enye ìgwè atụrụ ha nri n’ubi—ihe ha na-agaghị adị na-eme n’abalị ná ngwụsị December. (Luk 2:8) Kama nke ahụ, Akwụkwọ Nsọ na-egosi na a mụrụ Jisọs n’ihe dị ka October 1. Ndị Mmụta Bible ghọtakwara na ndị ahụ a sị na ha bụ ndị amamihe bụ́ ndị letara Jisọs ihe dị ka afọ abụọ mgbe a mụsịrị ya bụ ndị na-agọ mmụọ na-agụ kpakpando.b
Aha Ọhụrụ
14. N’ihi gịnị ka aha ahụ bụ Ndị Mmụta Bible ji ghara ikwesị ndị Jehova?
14 Na 1931 mgbukepụ nke ìhè eziokwu na-enwu nke ọma kpugheere Ndị Mmụta Bible ahụ aha kwesịrị ekwesị nke dị n’Akwụkwọ Nsọ. Ndị Jehova aghọtawo na ha apụghị ịnakwere nke ọ bụla n’ùtú aha ndị ọzọ nyeworo ha, dị ka ndị na-eso ụzọ Russell, Ndị Chi Ọbụbọ nke Puku Afọ, na “ndị na-ekweghị na hell.”c Ma ha malitekwara ịghọta na aha ahụ nke ha onwe ha werewooro—Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile—ekwesịchaghị ha. Ha bụ ihe dị ukwuu karịa nnọọ ndị mmụta Bible. E wezụgakwa nke ahụ, e nwere ọtụtụ ndị ọzọ bụ ndị mmụta Bible ma bụrụ ndị na-eyitụghị Ndị Mmụta Bible.
15. Aha dị aṅaa ka Ndị Mmụta Bible nakweere na 1931, n’ihi gịnịkwa ka o ji kwesị ekwesị?
15 Olee otú Ndị Mmụta Bible si bịa nwee aha ọhụrụ? Ruo ọtụtụ afọ Ụlọ Nche anọwo na-eme ka a mara aha Jehova. N’ihi ya, ọ bụ ihe kasị kwesị ekwesị na Ndị Mmụta Bible kwesịrị ịnabata aha ahụ a na-ahụ n’Aịsaịa 43:10: “Unu onwe unu bụ ndị àmà m, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, na ohu m nke M họpụtara: ka unu wee mara, kwere m, ghọta na Mụ onwe m bụ Onye ahụ: ọ dịghị chi ọzọ e buru Mụ onwe m ụzọ kpụọ, ọ dịghịkwa nke ga-eso m n’azụ.”
Mwepụ n’Ụta na “Oké Ìgwè Mmadụ” Ahụ
16. N’ihi gịnị ka amụma ndị ahụ nke mweghachi na-apụghị ịbụ banyere nlọghachi nke ndị Juu anụ ahụ na Palestine, ma ole ndị ka ha na-emetụta?
16 Ná mpịakọta nke abụọ nke akwụkwọ Vindication, nke Watch Tower Society bipụtara na 1932, mgbukepụ nke ìhè kpughere na amụma mweghachi ndị ahụ e dekọrọ n’Aịsaịa, Jeremaịa, Ezikiel, na ndị amụma ndị ọzọ abụghị (dị ka e chere n’otu mgbe) banyere ndị Juu anụ ahụ, bụ́ ndị na-alọghachi na Palestine n’ekweghị ekwe ma bụru ndị nwere nkwali nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Kama nke ahụ, amụma mweghachi ndị a, bụ́ ndị nwere mmezu dị nta mgbe ndị Juu lọghachiri site ná ndọta n’agha na Babilọn na 537 T.O.A., nwere mmezu ha ka ukwuu ná nnapụta na mweghachi nke Israel ime mmụọ malite na 1919 nakwa n’ịba ụba ọ rụpụtara n’ime paradaịs ime mmụọ nke ezi ndị ohu Jehova na-enwe taa.
17, 18. (a) Ka oge na-aga, site na mgbukepụ nke ìhè, gịnị ka e gosiri na ọ bụ nzube bụ isi nke Jehova? (b) Mgbukepụ ìhè dị aṅaa banyere Mkpughe 7:9-17 weere ọnọdụ na 1935?
17 Ka oge na-aga, mgbukepụ nke ìhè kpughere na nzube bụ isi nke Jehova bụ, ọ bụghị nzọpụta nke ihe e kere eke, kama iwepụ ịchịisi ya n’ụta. A hụrụ na isiokwu kasị mkpa nke Bible abụghị ihe mgbapụta ahụ kama Alaeze ahụ, n’ihi na ọ ga-ewepụ ịchịisi Jehova n’ụta. Lee mgbukepụ ìhè nke ahụ bụ! Ihe bụ mkpa ndị Kraịst raara onwe ha nye abụchaghịzi ịga eluigwe.
18 Na 1935 mgbukepụ ìhè na-enwu nke ọma kpughere na oké ìgwè mmadụ ahụ a kpọtụrụ aha ná Mkpughe 7:9-17 abụghị ndị òtù eluigwe nke nọ n’ọkwá nke abụọ. E chewo na ndị ahụ a kpọtụrụ aha n’amaokwu ndị ahụ bụ ụfọdụ n’ime ndị ahụ e tere mmanụ, bụ́ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’ụzọ zuru ezu, n’ihi ya kwa na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ kama ịnọdụ ala n’ocheeze ndị ahụ soro Jisọs Kraịst na-achị achị dị ka ndị eze na ndị nchụàjà. Ma ọ dịghị nnọọ ihe dị ka ikwesị ntụkwasị obi na-ezughị ezu. Mmadụ pụrụ ịbụ onye kwesịrị ntụkwasị obi ma ọ bụ onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Ya mere a hụrụ na amụma nke a zoro aka n’ebe oké ìgwè mmadụ ahụ a na-apụghị ịgụta ọnụ nọ, bụ́ ndị sitere ná mba nile, ndị a na-achịkọta ugbu a, ndị olileanya ha bụ nke elu ala. Ha bụ “atụrụ” nke Matiu 25:31-46 na “atụrụ ọzọ” nke Jọn 10:16.
Obé—Ọ Bụghị Ihe Oyiyi Ndị Kraịst
19, 20. N’ihi gịnị ka obé na-apụghị iji bụrụ ihe oyiyi nke ezi Iso Ụzọ Kraịst?
19 Ruo ọtụtụ afọ Ndị Mmụta Bible mere ka obé bụrụ ihe a ma ama dị ka ihe oyiyi Iso Ụzọ Kraịst. Ọbụna ha nwere “obé na okpueze” a na-adụnye n’efe. Dị ka ọ dị na King James Version, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha bulie “obé” ha, ọtụtụ ndị kwa wee kwere na a kpọgburu ya n’elu obé. (Matiu 16:24; 27:32) Ruo ọtụtụ afọ ihe oyiyi nke a pụtakwara n’ihu magazin Ụlọ Nche.
20 Akwụkwọ bụ́ Riches, nke Society bipụtara na 1936, mere ka ọ pụta ìhè na e gburu Jisọs Kraịst, ọ bụghị n’elu obé, kama n’elu osisi kwụ ọtọ, ma ọ bụ ógwè osisi. Dị ka otu onye ọnụ na-eru n’okwu kwuru, okwu Grik ahụ bụ́ (stau·rosʹ) nke a sụgharịrị ịbụ “obé” na King James Version “na-egosi n’ụzọ bụ isi, osisi kwụ ọtọ ma ọ bụ ógwè osisi. [Ọ] dị iche n’ebe ụdị nke chọọchị nke obé nwere ógwè osisi abụọ. . . . Nke ikpeazụ a nwere mmalite ya na Kaldea oge ochie, e jikwa ya mee ihe dị ka ihe oyiyi nke chi Tammuz.” N’abụghị ma ọlị ihe a ga-efe ofufe dị ka chi, ihe ahụ a kpọgburu Jisọs n’elu ya kwesịrị ka e jiri ịkpọasị lee ya anya.
21. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
21 E nwere ihe atụ ndị ọzọ ma nke oké mgbukepụ nke ìhè na ndị ahụ a pụrụ ile anya na ha dị ntakịrị. Maka ntụle nke ihe ndị a, biko lee isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Ka oge na-aga, a hụrụ na ọ bụrụ na a pụghị ime ememe ọmụmụ nwa kasị mkpa werewooro ọnọdụ, anyị ekwesịghị ime ememe ụbọchị ọmụmụ ọ bụla. E wezụgakwa nke ahụ, ma ndị Israel ma ndị Kraịst oge mbụ emeghị ememe ụbọchị ọmụmụ. Bible na-akpọtụ aha nanị ememe ụbọchị ọmụmụ abụọ, otu bụ nke Fero, nke ọzọ bụ nke Herọd Antipas. Igbu mmadụ mebiri ememe nke ọ bụla. Ndịàmà Jehova adịghị eme ememe ụbọchị ọmụmụ n’ihi na ememe ndị a malitere n’aka ndị ọgọ mmụọ, na-ejekwa ozi ibuli ndị ahụ nwe ụbọchị ọmụmụ ahụ elu.—Jenesis 40:20-22; Mak 6:21-28.
c Nke a bụ otu mmehie ihe ọtụtụ òtù okpukpe nke Krisendọm mere. Lutheran bụ ùtú aha ndị iro Martin Luther nyere ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị mesịrị nakwere ya. N’otu aka ahụ, ndị Baptist nakweere ùtú aha ahụ ndị na-abụghị ndị òtù ha nyere ha n’ihi na ha na-ekwusa baptism site n’imikpu ná mmiri. N’ụzọ yiri nnọọ nke ahụ, ndị Methodist nakweere aha onye na-abụghị onye òtù ha nyere ha. Banyere otú òtù Society of Friends si bụrụ ndị a na-akpọ ndị Quaker, akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Okwu ahụ bụ́ Quaker bụ na mbụ okwu mkparị maka Fox [onye guzobere ya], bụ́ onye gwara onye England bụ́ ọkà ikpe ka ọ ‘maa jijiji n’ihi Okwu nke Onyenwe anyị.’ Ọkà ikpe ahụ kpọrọ Fox ‘quaker’ (ọma jijiji).”
Ị̀ Na-echeta?
◻ Ònye bụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” olee ndị bụkwa ndị “ezinụlọ” ahụ?
◻ Gịnị bụ ụfọdụ mgbukepụ ìhè ndị mbụ n’oge a?
◻ N’ihi gịnị ka aha ọhụrụ ahụ, bụ́ Ndịàmà Jehova, ji kwesị ekwesị?
◻ Eziokwu ndị dị aṅaa na-adọrọ mmasị ka e kpughere na 1935?
[Foto dị na peeji nke 17]
C. T. Russell na ndị òtù ya gbasara ìhè ime mmụọ, ma otuto nile gaara Jehova