Ọrụ Ndị Mụbara Amụba N’oge Ọnụnọ Kraịst
“Mgbe ahụ Eze ahụ ga-asị ndị nọ n’aka nri ya, Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site ná ntọala nke ụwa.”—MATIU 25:34.
1. N’ụzọ dị aṅaa ka pa·rou·siʹa Kraịst bụworo nnọọ dị ka “ụbọchị Noa”?
ỌNỤNỌ Kraịst—ihe omume nke a nọ na-eche eri ogologo oge! Oge ahụ yiri ‘ụbọchị Noa,’ bụ́ nke Jisọs kwuru banyere ya n’ihe metụtara “ọgwụgwụ usoro ihe nke a” bịarutere n’afọ 1914. (Matiu 24:3, 37) Ma gịnị ka ọnụnọ ma ọ bụ pa·rou·siʹa Kraịst ga-apụta nye ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi”? (Matiu 24:45) Ọ bụ na ha aghaghị ịdị na-aghọwanye ndị na-arụsi ọrụ ike dị ka ndị na-enye ìhè! Ihe ndị dị ebube na-achọ ime! Ụdị ọrụ nchịkọta nke a na-enwetụbeghị ná mbụ na-aga ịmalite.
2. Ọrụ ime ka a dị ọcha dị aṅaa werewooro ọnọdụ ná mmezu nke Malakaị 3:1-5?
2 Ma, nke mbụ, ọ dị ndị Kraịst ndị a e tere mmanụ mkpa ịbụ ndị e mere ka ha dị ọcha. Dị ka Malakaị 3:1-5 buworo n’amụma, Jehova Chineke na “onye ozi ọgbụgba ndụ” ya, Jisọs Kraịst, bịara ile ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ n’oge opupu ihe ubi nke 1918. Ikpe ga-amalite “n’ụlọ Chineke.” (1 Pita 4:17) Malakaị 3:3 buru amụma, sị: “Ọ [Jehova] ga-anọdụkwa ala dị ka onye nnụcha ọlaọcha nke na-eme ka ọ dị ọcha, ọ ga-emekwa ka ụmụ Livaị dị ọcha, sichaakwa ha dị ka ọlaedo na ọlaọcha.” Ọ bụ oge nke nnụcha na ime ka a dị ọcha.
3. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa na ime ka a dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ ga-ewere ọnọdụ?
3 N’ịgabiga ikpe a, nke gwụsịrị na 1918, e mere ka ihe fọdụrụ n’òtù ohu ahụ dị ọcha pụọ ná mmerụ nke ụwa na nke okpukpe. N’ihi gịnị ka Jehova ji mee ka ha dị ọcha? N’ihi na o metụtara ụlọ nsọ ime mmụọ ya. Nke a bụ ndokwa yiri ụlọ nsọ maka ife Jehova ofufe ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs Kraịst. Jehova chọrọ ka ụlọ nsọ ya nọrọ n’ọnọdụ dị ọcha ka ọ ga-abụ na mgbe a ga-ewebata ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị na-efe ofufe, bụ́ ndị nwere olileanya elu ala n’ebe ahụ, ha ga-ahụ ebe a na-akwanyere ọkaaka eluigwe na ala ya ùgwù, ebe a na-edo aha ya kasị mma nsọ, na ebe a na-erubere iwu ezi omume ya dị iche iche isi. Otú a, ha ga-enwe ekele n’ebe Jehova nọ ma sonye n’ime ka a mara nzube ya ndị dị ebube.
Ihe Ùgwù Ndị A Tụkwasịrị
4, 5. (a) Olee otú otu ajụjụ Jisọs Kraịst jụrụ si maa onye ọ bụla so n’òtù ohu ahụ taa aka? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka a ga-aghọta okwu ndị ahụ bụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na “ezinụlọ ya”? (ch) Ọrụ dị aṅaa ka Jisọs nyere ohu ahụ?
4 Na 1919 òtù ohu ahụ e mere ka ọ dị ọcha pụrụ ilepụ anya n’ihu maka ọrụ na-abawanye ụba. Laa azụ na 1914, Jisọs Kraịst, bụ́ Onyenwe ha, anatawo Alaeze eluigwe. Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ya ịbịa leta “ezinụlọ” ya nile, e yikwasịrị ya ùgwù onyeeze, bụ́ nke ọ na-enweghị mgbe ọ nọ n’ụwa ebe a. Gịnị ka ọ hụrụ? Òtù ohu ahụ ọ̀ nọ n’ọrụ ilekọta ọdịmma nke Onyenwenụ ahụ? Dị ka e dekọrọ na Matiu 24:45-47, Jisọs jụrụ otu ajụjụ nke mara onye nke ọ bụla e tere mmanụ nke na-eso ụzọ aka inyocha nraranye nke onwe ya n’ebe Mesaịa Jehova nọ: “Ònye kwa bụ ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, nke onyenwe ya mere onye isi ezinụlọ ya, inye ha ihe e ji azụ ha n’oge ya? Ngọzi na-adịrị ohu ahụ, mgbe onyenwe ya ga-abịa, ọ ga-ahụ ya ka ọ na-eme otú a. N’ezie asị m unu, na ọ ga-eme ya onye isi ihe nile o nwere.”
5 O doro anya na nkọwa Jisọs nyere ohu a kwesịrị ntụkwasị obi ekwesịghị otu mmadụ ọ bụla. Ee e, kama ọ na-akọwa ọgbakọ kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ nke Kraịst n’ozuzu ya, dị ka otu ìgwè. Ezinụlọ ahụ bụ ụmụ azụ Kraiṣt e tere mmanụ n’otu n’otu. Jisọs maara na ya gaje iji ọbara ya zụta ndị a e tere mmanụ, ya mere n’ụzọ kwesịrị ekwesị ọ kpọrọ ha n’ozuzu ha ohu ya. Ndị Kọrint nke Mbụ 7:23 na-ekwu banyere ha, sị: “E weere ọnụ ahịa gbara unu [n’ikwu n’ozuzu ha]; unu aghọla ndị ohu mmadụ.” Jisọs nyere òtù ohu ya ọrụ ime ka ìhè ha gbukee iji dọta ma mee ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ma na-enye ezinụlọ ya ihe e ji azụ ahụ n’ụzọ na-aga n’ihu site n’inye ha nri ime mmụọ ha n’oge ya.
6. Olee otú e si nyeghachi ohu ahụ ụgwọ ọrụ dị ka ihe si ná nleta Jisọs pụta?
6 Site n’oge ọnụnọ Kraịst malitere gbadaa ruo 1918, òtù ohu ahụ anọgidewo na-achọsi ike inye ezinụlọ ahụ nri n’oge ya, n’agbanyeghị ịbụ ndị na-adịghị ọha mma, mkpagbu, na ọbụna mgbagwoju anya ụfọdụ. Nke a bụ ihe Onyenwenụ ahụ hụrụ mgbe nleta ya malitere. Obi tọrọ Onyenwenụ ahụ bụ Jisọs ụtọ, na 1919 kwa, ọ kpọkwara òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ndị dị ngọzi. Gịnị bụ ụgwọ ọrụ na-enye ọṅụ nke ohu ahụ nwetara n’ihi ime ihe Onyenwe ya nyeworo ya ime? Mbuli n’ọkwá! Ee, ibu ọrụ ndị ka ukwuu n’ime ka ọdịmma nke Onyenwe ya gaa n’ihu. Leenụ, ebe Onyenwenụ ahụ bụzi Eze ugbu a n’eluigwe, ihe ndị o nwere n’ụwa ghọwanyere ihe dị oké ọnụ.
7, 8. (a) Gịnị bụ ‘ihe nile o nwere’ nke Onyenwenụ ahụ? (b) Gịnị ka a chọrọ n’aka ohu ahụ n’ilekọta ihe onwunwe ndị a?
7 Ya mere, gịnị bụ “ihe nile o nwere”? Ndị a bụ ihe ime mmụọ nile n’ụwa bụ́ ndị ghọworo ihe onwunwe Kraịst n’ihe banyere ikike ya dị ka Eze eluigwe. Nke a n’ezie gụnyere ọrụ ime ndị na-eso ụzọ Kraịst, tinyere oké ihe ùgwù nke ije ozi dị ka ndị nnọchianya nke Alaeze Chineke ahụ e guzobeworo nye mba nile nke ụwa.
8 Mbuli n’ọkwá dị otú ahụ nke ilekọta ihe nile Onyenwenụ ahụ nwere chọrọ ka òtù ohu ahụ tinyekwuo oge na uche n’ịhụ na a rụrụ ọrụ Alaeze ahụ, nakwa, ee, iwu ụlọ ọrụ ndị ka buo ibu maka ọrụ ahụ. Ugbu a, o nwere ubi ka buo ibu ịrụ ọrụ—ụwa dum mmadụ bi.
Ịchịkọta Atụrụ Ahụ
9. Gịnị siworo ná mmụba nke ọrụ ohu ahụ pụta?
9 Mgbe ahụ, ná nrubeisi òtù ohu Kraịst nke kwesịrị ntụkwasị obi ma nweekwa uche, mụbara ọrụ ya. Gịnị si na nke a pụta? A chịkọbatara ndị ikpeazụ nke 144,000 ndị e tere mmanụ. Mgbe ahụ, ọhụụ Jọn nke e dekọrọ ná Mkpughe 7:9-17 ghọrọ ihe mere eme nke na-akpali akpali, nke na-enye obi ụtọ. Karịsịa kemgbe 1935, òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi anọgidewo na-enweta ọṅụ ná mkpughe a nọgidere na-enwe nke mmezu ọhụụ a. Site n’ụwa nile, “oké ìgwè mmadụ” nke ọtụtụ nde ndị mmadụ na-enubata n’ókèala nke ụlọ nsọ ime mmụọ Jehova dị ka ndị na-efe ya ofufe. Mmụọ ozi Jehova gwara Jọn na ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịgụta oké ìgwè mmadụ a. Nke ahụ pụtara na a kparaghị ọnụ ọgụgụ nke ndị òtù ohu ahụ ga-akpọbata n’ime ụlọ nsọ ime mmụọ Jehova ókè. Ruokwa oge nile ụzọ ahụ ka ghere oghe, ọrụ nke ịchịkọbata ha ga-anọgide na-aga n’ihu.
10. N’ọrụ ịhụnanya dị aṅaa ka ohu ahụ tinyere aka taa?
10 Òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nwere ibu ọrụ dị arọ n’ịnọgide na-elekọta ọnụ ọgụgụ na-ehiwanye nne nke “atụrụ ọzọ” ahụ, ebe ha maara na ndị a yiri atụrụ sitere ná mba nile bụ ihe a na-achọsi ike n’anya Onyenwenụ ahụ, bụ́ Jisọs. N’ezie, ha bụ ìgwè atụrụ ya. (Jọn 10:16; Ọrụ 20:28; 1 Pita 5:2-4) Ya mere, site n’ịhụnanya maka Onyenwenụ na atụrụ ahụ, òtù ohu ahụ ji obi ụtọ na-elekọta mkpa ime mmụọ nke oké ìgwè mmadụ ahụ.
11-13. Okwu kwesịrị ekwesị dị aṅaa ka onye isi oche Watch Tower Society n’oge ahụ kwuru banyere ọrụ ohu ahụ?
11 Ee, akụkụ ka ukwuu nke ọrụ inye ìhè nke ohu ahụ gụnyere ịchịkọta ndị a ga-ebi n’ụwa Alaeze Chineke ga-achị. Mgbe ọ na-ekwu banyere ọrụ na-etowanye eto nke ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, F. W. Franz, bụ́ onye isi oche Watch Tower Society n’oge ahụ, kwuru tupu ọnwụ ya na December 1992, sị:
12 “Jisọs Kraịst ejiriwo nzukọ ahụ mee ihe mgbe nile n’ụzọ na-adịwanye ịtụnanya, dị ka ahụmahụ 99 afọ nke ndụ m na-egosi. Ọ bụghị mmadụ nkịtị na-eduzi nzukọ ahụ, kama ọ ghaghị ịbụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. N’ihi na ọ gawo nke ọma n’ụzọ dị ebube ma dị ịtụnanya nke ukwuu karịa otú anyị cheworo. Taa anyị nwere nzukọ nke gbasaworo n’ụwa nile. Ọ na-aga nke ọma n’Akụkụ Ebe Ugwu Ụwa na n’Akụkụ Ebe Ndịda, n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ na n’Ebe Ọdịda Anyanwụ. Ọ bụ nanị otu onye ka mmụba nke a dị ịrịba ama pụrụ isite n’aka ya—Ọkpara Chineke, bụ́ onye na-ahụ maka òtù ohu ahụ kwsịrị ntụkwasị obi nke nwekwara uche. Ọ nọwo na-arụzu ibu ọrụ ya, ọ bụkwa nke a na-akpata mmụba nke ahụ dị ịrịba ama anyị hụworo.
13 “Ọ bụghị nanị otu onye na-arụzu ihe ahụ. Anyị nwere nzukọ nke na-agbaso usoro ọchịchị Chineke, ọ na-arụkwa ọrụ n’ụzọ nke ụkpụrụ ọchịchị Chineke, n’ụzọ nke nduzi Chineke. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla, ọbụna onye guzobere Watch Tower Bible and Tract Society, nke ga-asị, ma ọ bụ nke a pụrụ ịsị na ọ bụ ya hụrụ maka ihe a rụzuworo n’ụzọ zuru ụwa nile ọnụ. Ọ bụ nnọọ ihe dị ebube.” Ọ̀ bụ na ndị nile so n’oké ìgwè mmadụ ahụ ejighị obi ha nile kwere n’echiche ndị a nke Nwanna Franz nwụworonụ? Ee, n’ezie, ha nwere ekele dị ukwuu maka ọrụ a mụbara amụba nke ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi.
Ndị Nọ n’Okpuru Alaeze Ahụ
14, 15. (a) Gịnị ka Jisọs mara atụ ya n’ilu nke talent ndị ahụ (Matiu 25:14-30)? (b) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, gịnị na-esochi na Matiu isi nke 25?
14 Na Matiu isi 25, ilu Jisọs nke atụrụ na ewu na-akọwa oké ọrụ nke a nke ịchịkọta ndị Alaeze Chineke ga-achị n’elu ala. N’ilu nke bu ya ụzọ, nke talent ndị ahụ, Jisọs mara atụ na ndị na-eso ụzọ e tere mmanụ bụ́ ndị nwere olileanya iso ya chịa n’Alaeze eluigwe ya aghaghị ịrụ ọrụ iji mụbaa ihe ndị o nwere n’ụwa. N’ụzọ ziri nnọọ ezi, mgbe ahụ, n’ilu ya nke na-eso, Jisọs gosipụtara ihe a chọrọ n’aka ndị chọrọ ịbụ ndị Alaeze eluigwe ya ga-achị.
15 Rịba okwu ya ndị dị na Matiu 25:31-33 ama: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọkwsị n’ocheeze nke ebube ya: ma n’ihu ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ: ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu: ọ ga-edebekwa atụrụ n’aka nri ya, ma ụmụ ewu n’aka ekpe.”
16. Olee otú e si na-achịkọta mba nile, na-ekewa ndị mmadụ?
16 Jisọs bịara n’ebube ya na 1914. N’ịmalite ibu agha, ya na ndị mmụọ ozi ya nile wakwasịrị ma chụpụ ndị iro ya bụ́ ndị mmụọ ọjọọ site n’eluigwe. Ihe na-esochi n’ilu ya na-enyere anyị aka ịghọta na Jisọs ịnọdụ n’ocheeze nke ebube na-egosi ọnọdụ nke ikpe ikpe n’oge ọnụnọ ya. Nchịkọta nke mba nile n’ihu ya pụtara na Jisọs na-emeso mba nile dị ka ndị gaje ịbụ ìgwè anụ ya. Ọ bụ ìgwè anụ nke atụrụ na ewu mejupụtara. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iwe akụkụ nke otu ụbọchị iji kewapụta atụrụ site n’ewu n’ìgwè anụ nkịtị, nkewa zuru ụwa ọnụ nke ụmụ mmadụ ndị nweere onwe ha ime nhọrọ n’etiti ihe ọma na ihe ọjọọ na-ewe ogologo oge dị ukwuu karị. Nke a bụ n’ihi na nkewa ahụ na-adabere n’ụzọ omume onye ọ bụla.
17. N’ihi gịnị ka ọnọdụ ahụ ji siere mmadụ nile ike?
17 N’ilu ahụ, Eze Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ na-etinye ndị ahụ yiri atụrụ n’aka nri ya na ndị yiri ewu n’aka ekpe ya. Aka nri ahụ mesịrị bụrụ ikpe nke ga-arụpụta ihe dị mma—ndụ ebighị ebi. Akụkụ aka ekpe na-egosi ikpe ọmụma—nke mbibi ebighị ebi. Mkpebi Eze ahụ mere n’okwu a nwere ihe ndị siri ike ha metụtara.
18. N’ihi gịnị ka ọnọdụ a na-apụghị ịhụ anya nke Eze ahụ na-agaghị enye onye ọ bụla ihe ngọpụ?
18 Ịbụ onye a na-adịghị ahụ anya nke Nwa nke mmadụ na-achị achị n’oge ọnụnọ ma ọ bụ pa·rou·siʹa ya abụghị ihe ngọpụ nye onye ọ bụla. Ọnụ ọgụgụ na-ehiwanye nne nke ndị yiri atụrụ na-esonyere òtù ohu ahụ n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ụwa nile, na-eme ka ìhè ha gbukee. N’eziokwu, ịgba àmà ha eruwo n’akụkụ nile nke ụwa.—Matiu 24:14.
19. Àgwà ndị dị aṅaa nke òtù atụrụ ahụ ka a mara atụ ya n’ilu atụrụ na ewu ndị ahụ?
19 N’ihi gịnị ka Eze Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ ji nyeghachi ndị òtù atụrụ ahụ ọdịnihu dị ngọzi dị ka ụgwọ ọrụ? N’ihi nkwado ha si n’obi dum nye ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na obi ọma ha gosiri ụmụnna ya e tere mmanụ, nke Jisọs na-ewere dị ka ọ bụ ya ka e meere ya. Ya mere, Nwa nke mmadụ ahụ na-achị achị na-agwa ha, sị: “Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site ná ntọala nke ụwa.”—Matiu 25:34; 28:19, 20.
Inyere Eze ahụ Aka
20, 21. Ihe àmà dị aṅaa ka atụrụ ahụ na-enye nke na ha guzo n’akụkụ nke Alaeze ahụ?
20 Rịba ama na mgbe Eze ahụ kpọrọ atụrụ ndị a ka ha keta ógbè elu ala nke Alaeze Chineke, ha gosiri ịtụnanya. Ha na-ajụ ya, sị: ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị meere gị ihe ndị a nile?’ Ọ na-aza sị: “N’ezie asị m unu, ka ọ hà bụ́ otú unu si mee ya nye otu onye n’ime ụmụnna m ndị a, bụ́ ndị dịkarịsịrị nta, mụ ka unu mere ya nye.” (Matiu 25:40) Mgbe Jisọs gosiri onwe ya nye Meri Magdalini n’ụbọchị o biliri n’ọnwụ, o kwuru banyere ụmụnna ime mmụọ ya mgbe ọ sịrị ya: “Gakwuru ụmụnna m.” (Jọn 20:17) N’oge ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya, Jisọs nwere nanị ntakịrị ihe fọdụrụ na 144,000 ụmụnna ime mmụọ ya ndị ka nọ n’anụ ahụ n’ụwa.
21 Ebe Jisọs bu onye a na-apụghị ịhụ anya n’eluigwe, ọ bụghị kpọmkwem Jisọs ka ndị yiri atụrụ meere ihe ịhụnanya ndị a. Ha na-ahụ ya n’ocheeze ya nanị site n’anya nke okwukwe ha. Jisọs na-enwe ekele maka mgbalị nile ha na-eme n’inyere ụmụnna ime mmụọ ya aka, bụ́ ndị ga-aghọ ndị òtù ọchịchị ya n’eluigwe. Ihe e meere ụmụnna ya ka ọ na-agụ dị ka ihe e mere ya n’onwe ya. Ndị yiri atụrụ leziri anya na-emere ụmụnna Kraịst ihe ọma n’ihi na ha matara ha ndị dị otú ahụ. Ha ghọtara na ụmụnna ime mmụọ Jisọs bụ ndị nnọchianya nke Alaeze Jehova, ha chọkwara inye ihe àmà e ji n’aka na ha so ha na-ewere nguzo ha n’akụkụ Alaeze ahụ.
22. Olee otú e si enyeghachi òtù atụrụ ahụ ụgwọ ọrụ? (Tụlee Mkpughe 7:14-17.)
22 Jehova bu ụzọ hụ na òtù a nke ndị yiri atụrụ ga-apụta n’oge nke a nke ọnụnọ Ọkpara ya, o nwekwara nkwụghachi ụgwọ dị ebube o debere maka ha! Oké ìgwè mmadụ ahụ ga-eketa ngọzi nke udo n’elu ụwa ebe a n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri nke obi ụtọ nke Eze Jehova, bụ́ Jisọs Kraịst.
23. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka atụrụ ahụ si mara amara na-enyere ụmụnna Eze ahụ aka?
23 Mgbe anyị tụlere amụma Bible ndị metụtara oge ọnụnọ Kraịst, ha na ilu Jisọs nke atụrụ na ewu ahụ, gịnị ka anyị na-ahụ? Nke a: Ọ bụghị imere otu n’ime ụmụnna ime mmụọ nke Eze ahụ ihe ọma n’amaghị ama ma ọ bụ ná ndabara bụ ihe na-eme mmadụ atụrụ nke nwere ezi nguzo n’ihu Chineke na Eze ya. Ndị so n’òtù atụrụ ahụ maara ihe ha na-eme, ọ bụ ezie na ha adịghị ahụ Eze ahụ na-achị achị anya n’ụzọ nkịtị. Ha na-agbalị inyere ụmụnna nke Eze ahụ aka ọ bụghị nanị n’ụzọ anụ ahụ kama n’ụzọ ime mmụọ kwa. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’inyere ha aka ná nkwusa nke ozi ọma Alaeze Chineke na n’iduzi ọmụmụ Bible iji meere Kraịst ndị na-eso ụzọ. N’ihi ya, e nwere ihe karịrị nde anọ nke ndị nkwusa na-enye ìhè nke Alaeze Chineke.
Ọrụ Ndị Mụbara Amụba
24. Ọrụ ịhụnanya ndị dị aṅaa mere òtù ohu ahụ ndị kasị nwee obi ụtọ n’ụwa taa?
24 Ka anyị mee ndepụta nke ụfọdụ n’ime ọtụtụ ezi ọrụ nke òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Nke mbụ, e nyewo òtù ohu ahụ ọrụ ilekọta ihe nile Onyenwenụ ahụ nwere—ọdịmma Alaeze ya n’ụwa—ihe onwunwe ndị a nọgidekwara na-ehiwanye nne. Nke abụọ, ọ bụghị nanị ndị ezinụlọ ahụ e tere mmanụ ka òtù ohu ahụ na-enye nri ime mmụọ, kama, oké ìgwè mmadụ na-ehiwanye nne nke atụrụ ọzọ. Nke atọ, òtù ohu ahụ na-ebute ụzọ n’ikesa ìhè Alaeze ahụ. Nke anọ, mmụba kachasị nke ọrụ ya bụ n’ịchịkọta oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ, na-akpọbata ha n’ụlọ nsọ ime mmụọ Jehova. Nke ise, òtù ohu ahụ, site ná nkwado sitere n’ala ala obi nke ndị ahụ yiri atụrụ, na-enye ihe owuwu ndị e mere ka ha buwanye ibu maka nhazi nke alaka dị iche iche gburugburu ụwa, tinyere isi ụlọ ọrụ dị na United States. Ọrụ ịhụnanya ndị dị otú a emewo ka òtù ohu ahụ bụrụ ndị kasị nwee obi ụtọ n’ụwa taa, ha emewokwa ka ọtụtụ nde nke atụrụ ọzọ ahụ nweekwa obi ụtọ. Ndị a nile na-enye Jehova Chineke na Jisọs Kraịst ekele, bụ́ ndị duziworo ọrụ e mere ka ọ mụbaa amụba nke ohu ahụ nwere uche!
25. Olee otú atụrụ ahụ pụrụ isi nọgide na-akwado òtù ohu ahụ, na-atụ anya olileanya dị aṅaa?
25 Òtù ohu ahụ na-arụsi ọrụ ike ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ n’ọrụ ndị Chineke nyere ya. Oge fọdụrụ tupu ntiwapụ nke “mkpagbu ukwu” ahụ fọrọ nke nta ka ọ gwụ! (Matiu 24:21) Lee ka o si dị mkpa ka ndị a bụ atụrụ Chineke nọgide n’akụkụ aka nri nke ihu ọma Eze Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ! Ya mere, mgbe ahụ, ka mmadụ nile jiri ịnụ ọkụ n’obi nọgide na-akwado ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nke nwekwara uche. Ọ bụ nanị site n’ime nke a ka ndị nile yiri atụrụ ga-enwe ike ịnụ, n’otu ụbọchị nke dị ezi nso, okwu obi ụtọ ndị ahụ na-asị: “Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site ná ntọala nke ụwa.”
Ị̀ Pụrụ Ịza?
◻ Ikpe ikpe dị aṅaa nke bu ụzọ sochiri ichi Eze ahụ echichi?
◻ Olee otú Matiu 24:45-47 siworo nwee mmezu n’oge ugbu a?
◻ Banyere ọrụ ndị mụbara amụba, gịnị ka òtù ohu ahụ na oké ìgwè mmadụ ahụ nwere ekele maka ha karịsịa?
◻ Olee otú Matiu 25:34-40 siworo mezuo n’oge pa·rou·siʹa ahụ?
[Foto dị na peeji nke 16]
Onyenwenụ ahụ tinyere ihe nile o nwere n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi
[Foto dị na peeji nke 18]
Jisọs anọkwasịwo n’ocheeze ya dị ebube ikpe ihe a kpọrọ mmadụ ikpe