Ndị Olileanya Na-eme Ka Ha Kwụsie Ike, Ndị Ịhụnanya Na-akwali
“Okwukwe, olileanya, ịhụnanya, ihe atọ ndị a, na-anọgide; ma nke kachasị n’ihe ndị a bụ ịhụnanya.”—1 NDỊ KỌRINT 13:13.
1. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Pọl onyeozi na-enye anyị?
PỌL onyeozi na-adọ anyị aka ná ntị na, dị ka ụgbọ mmiri, okwukwe anyị pụrụ ikpu. Ọ na-ekwu banyere ‘inwe okwukwe na ezi akọ na uche; nke ụfọdụ nupụrụ n’ebe ha nọ, ụgbọ ha wee kpuo n’ebe okwukwe ha dị.’ (1 Timoti 1:19) Na narị afọ mbụ O.A., e ji osisi ewu ụgbọ mmiri. Ha iru eru ise n’osimiri dabeere n’ọdịdị nke osisi ha nakwa ná nkà iwu ụgbọ mmiri.
2. N’ihi gịnị ka a na-aghaghị iji rụọ ụgbọ nke okwukwe anyị nke ọma, gịnịkwa ka nke a na-achọ n’aka anyị?
2 Ihe a pụrụ ịkpọ ụgbọ nke okwukwe anyị aghaghị ịnọgide na-ese n’elu osimiri na-ekwo ekwo nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Aịsaịa 57:20; Mkpughe 17:15) Ya mere a ghaghị iwu ya nke ọma, nke a dịkwa anyị n’aka. Mgbe “osimiri” nke ógbè ndị Juu na ndị Rom malitere ịdị njọ karịsịa nye ndị Kraịst oge mbụ, Jud dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, n’iwuli onwe unu elu dị ka ụlọ n’elu okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ, n’ikpekwa ekpere n’ime Mmụọ Nsọ, debe onwe unu n’ịhụnanya Chineke, na-eche ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ruo ndụ ebighị ebi.” (Jud 20, 21) Ebe Jud kwukwara okwu banyere ịgba mgba maka “okwukwe ahụ nke e nyere ndị nsọ n’aka,” okwu ahụ bụ́ ‘okwukwe dịkarịsịrị nsọ’ pụrụ izo aka n’ozizi nile nke ndị Kraịst, gụnyere ozi ọma nke nzọpụta. (Jud 3) Kraịst bụ ntọala nke okwukwe ahụ. A chọrọ okwukwe siri ike ma ọ bụrụ na anyị ga-arapagidesi ike n’ezi okwukwe ndị Kraịst.
Ịnagide Ntiwapụ nke “Ụjọ Òtù Nzuzo”
3. Olee otu ụfọdụ si eji “ụjọ òtù nzuzo” eme ihe?
3 N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e nwewo ọtụtụ akụkọ ndị jọgburu onwe ha nke ìgwè mmadụ igbu onwe ha, igbu ọchụ, na mwakpo nke ndị na-eyi ọha egwu nke ndị ajọ òtù nzuzo mere. O kwere nghọta na ọtụtụ ndị mmadụ, gụnyere ndị ọchịchị nwere ezi nzube, egosiwo nchegbu banyere ichebe ndị aka ha dị ọcha, karịsịa ụmụaka, pụọ n’òtù nzuzo ndị dị ize ndụ dị otù ahụ. N’ihi ya, “chi nke oge a,” nke obi abụọ na-adịghị ya na ọ bụ ya na-akpata ajọ mpụ ndị a, emewo ka e nwee ihe ụfọdụ mmadụ na-akpọ ụjọ òtù nzuzo, ọ na-ejikwa nke a eme ihe megide ndị Jehova. (2 Ndị Kọrint 4:4; Mkpughe 12:12) Ụfọdụ ejiriwo ọnọdụ a mee ihe iji kpalie mmegide n’ebe ọrụ anyị dị. Ná mba ụfọdụ, ha amalitewo mkpọsa nke o yiri ka e zubere iji ya chebe ndị mmadụ pụọ “n’òtù nzuzo ndị dị ize ndụ” ma jiri ihie ụzọ na-akpọtụ Ndịàmà Jehova aha wee si otú ahụ jiri ụzọ aghụghọ na-ebo anyị ebubo. Nke a emewo ka ịgba àmà ụlọ n’ụlọ sie ike ná mba ụfọdụ nke Europe, o mewokwa ka ụfọdụ ndị na-esobu anyị amụ Bible kwụsị ọmụmụ ihe ha. N’aka nke ya, nke a enwewo mmetụta na-adịghị mma n’ebe ụfọdụ ụmụnna anyị nọ.
4. N’ihi gịnị ka mmegide na-ekwesịghị iji mee ka anyị kụdaa aka?
4 Otú ọ dị, kama ịkụda anyị aka, mmegide kwesịrị ime ka anyị kwenyesie ike na anyị na-agbaso ezi Iso Ụzọ Kraịst. (Matiu 5:11, 12) E boro ndị Kraịst oge mbụ ebubo ịbụ ịrọ òtù na-agba ọchịchị mgba okpuru, ‘e kwugidekwara’ ha n’ebe nile. (Ọrụ 24:5; 28:22) Ma Pita onyeozi mesighachiri ndị kwere ekwe ibe ya obi ike, na-ede, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu echela echiche banyere ọnwụnwa ọkụ ahụ nke dị n’etiti unu, nke na-abịakwasị unu ịnwa unu, na ọ bụ ihe a na-ahụghị mgbe ọ bụla, dị ka a ga-asị na ọ bụ ihe a na-ahụghị mgbe ọ bụla na-adakwasị unu: kama ebe unu nwekọrọ ahụhụ nke Kraịst, na-aṅụrịnụ ọṅụ; ka unu wee werekwa obi na-atọ ụtọ nke ukwuu ṅụrịa n’ime mkpughe nke ebube Ya.” (1 Pita 4:12, 13) N’otu aka ahụ, onye so n’òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ dere, sị: “Gụọnụ ya n’ọṅụ nile, ụmụnna m, mgbe ọ bụla unu dabara n’ọnwụnwa dị iche iche; ebe unu maara na nnwapụta nke okwukwe unu na-arụpụta ntachi obi. Ma ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya, ka unu wee tozuo okè dịzuokwa mma, bụrụ ndị ọ dịghị ihe ọ bụla fọdụrụ nke unu na-enweghị.” (Jemes 1:2-4) Dị nnọọ ka oké ifufe na-anwale ma ụgbọ mmiri ò ruru eru ise n’osimiri, oké ifufe nke mmegide na-ekpughe adịghị ike ọ bụla ụgbọ nke okwukwe anyị nwere.
Mkpagbu Na-arụpụta Ntachi Obi
5. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na okwukwe anyị kwụ chịm n’okpuru mkpagbu?
5 Ndị Kraịst pụrụ ijide ntachi obi ha na ịkwụsị ike nke okwukwe ha n’aka nanị mgbe ha nagidesịworo oké ifufe nke mkpagbu. Ntachi obi anyị ‘ga-arụzu ọrụ ya’ n’osimiri oké ifufe na-ebugharị nanị ma ọ bụrụ na anyị ‘etozuo okè, dịzuokwa mma, bụrụ ndị ọ na-adịghị ihe ọ bụla fọdụrụ nke anyị na-enweghị,’ gụnyere okwukwe siri ike. Pọl dere, sị: “N’ihe nile anyị na-eme ka mmadụ mara anyị, dị ka ndị na-ejere Chineke ozi, n’ime oké ntachi obi, n’ime mkpagbu, n’ime mkpa, n’ime oké mkpa.”—2 Ndị Kọrint 6:4.
6. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji ‘na-anya isi n’ime mkpagbu anyị nile,’ oleekwa otú nke a si eme ka olileanya anyị sikwuo ike?
6 Anyị kwesịrị ile oké ifufe nke mkpagbu ndị anyị pụrụ inweta mgbe ụfọdụ anya dị ka ohere iji gosi na ụgbọ nke okwukwe anyị dị mma ma kwụrụ chịm. Nye ndị Kraịst nọ na Rom, Pọl dere, sị: “[Ka] anyị na-anyakwa isi n’ime mkpagbu anyị nile: ebe anyị matara na mkpagbu na-arụta ntachi obi; ntachi obi ahụ na-arụtakwa ọnwụnwa; ọnwụnwa ahụ na-arụtakwa olileanya: olileanya ahụ emeghịkwa ka ihere mee anyị.” (Ndị Rom 5:3-5) Iguzosi ike n’ule na-ewetara anyị nnwapụta Jehova. N’aka nke ya, nke a na-eme ka olileanya anyị sikwuo ike.
Ihe Mere Ụgbọ Ụfọdụ Ndị Ji Ekpu
7. (a) Dị ka okwu Pọl na-egosi, olee otú ụgbọ ụfọdụ ndị siworo kpuo n’ụzọ ime mmụọ? (b) Olee otú ụfọdụ ndị taa siworo si n’eziokwu ahụ kpafuo?
7 Mgbe Pọl dọrọ aka ná ntị banyere ịbụ ndị ‘ụgbọ ha kpuru,’ ndị o bu n’uche bụ ụfọdụ ndị “nupụrụ” ezi akọ na uche ha wee tụfuo okwukwe ha. (1 Timoti 1:19) Ndị so n’ime ha bụ Haịmeniọs na Aleksanda bụ́ ndị si n’ezi ofufe dapụ, na-akpafu site n’eziokwu ahụ, na-ekwukwa okwu nkwutọ. (1 Timoti 1:20, nkọwa ala ala peji nke NW; 2 Timoti 2:17, 18) Taa, ndị si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ ndị si n’eziokwu ahụ kpafuo, na-eji okwu ọnụ eti “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ihe, wee si otú ahụ bụrụ nwa mgbei puru ezé ma tagbuo onye nọworo na-azụ ya n’ụzọ ime mmụọ. Ụfọdụ yiri “ohu ọjọọ” ahụ, na-ekwu hoo haa, sị, “Onyenwe m na-anọ ọdụ dị anya.” (Matiu 24:44-49; 2 Timoti 4:14, 15) Ha na-ekwu na ọgwụgwụ nke usoro ihe a adịghị nso ma na-akatọ òtù ohu ahụ mụ anya n’ụzọ ime mmụọ maka ịnọgide na-eme ka echiche nke ịdị ngwa dị n’etiti ndị Jehova. (Aịsaịa 1:3) Ndị dị otú ahụ si n’ezi ofufe dapụ na-enwe ihe ịga nke ọma ‘n’ikpu okwukwe mmadụ ụfọdụ ihu,’ na-akpata ụgbọ okpukpu ime mmụọ.—2 Timoti 2:18.
8. Gịnị meworo ka ụfọdụ ndị kpuo ụgbọ nke okwukwe ha?
8 Ndị Kraịst ọzọ raara onwe ha nye ekpuwo ụgbọ nke okwukwe ha site n’inupụ akọ na uche ha ma na-emikpu onwe ha n’ịchọ ihe ụtọ a na-achịkwaghị achịkwa nke ụwa a nakwa mmekọahụ ya rụrụ arụ. (2 Pita 2:20-22) Ma ndị ọzọ na-ekpu ụgbọ nke okwukwe ha n’ihi na n’echiche ha, ebe dị nchebe nke usoro ihe ọhụrụ ahụ eyighị ka ọ̀ dịla nso. N’ịbụ ndị na-enweghị ike ịgụkọ oge banyere mmezu nke amụma ụfọdụ, nakwa n’ịtụpụ “ụbọchị Onyenwe anyị” n’ihu n’uche ha, ha na-agbahapụ ezi ofufe. (2 Pita 3:10-13; 1 Pita 1:9) N’oge na-adịghị anya, ha na-achọta onwe ha n’ime mmiri ruru unyi, na-amali amali nke usoro ihe dị ugbu a. (Aịsaịa 17:12, 13; 57:20) Ụfọdụ ndị kwụsịworo iso ọgbakọ ndị Kraịst na-akpakọrịta ka kwere na ọ bụ ezi okpukpe. Otú ọ dị, ihe àmà na-egosi na ha enweghị ndidi na ntachi obi a chọrọ iji chere ụwa ọhụrụ ahụ Jehova Chineke kwere ná nkwa. Ndụ n’ime Paradaịs abịaghị nnọọ ngwa ngwa nye ha.
9. Gịnị ka ndị Kraịst ole na ole raara onwe ha nye na-eme, gịnịkwa ka eziokwu ndị a kwesịrị iduga anyị ịtụle?
9 Ndị Kraịst ole na ole raara onwe ha nye bụ́ ndị nọ n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa yiri ka hà akwụsịlatatụla ụgbọ nke okwukwe ha. Ụgbọ mmiri ahụ ka na-ese n’elu mmiri, ma kama isere gaa n’ihu n’okwukwe zuru ezu, ha na-esezi ike ọgwụgwụ ike ọgwụgwụ. N’ịbụ ndị olileanya nke “Paradaịs ga-abịa n’isi nso” dọtara, ụfọdụ dị njikere itinye mgbalị nile iji banye ya—na-anụ ọkụ n’obi n’ọrụ nkwusa, na-agachikwa nzukọ nile na mgbakọ dị iche iche anya. N’ịbụ ndị na-echezi na mmezu nke olileanya ha dị anya karịa ka ha tụrụ anya ya, ha adịghịzi njikere itinye mgbalị dị ukwuu otú ahụ. Nke a na-apụta ìhè n’ọrụ nkwusa e belatara ebelata, agachighị nzukọ anya, nakwa n’ịdị njikere ịhapụ akụkụ ụfọdụ nke usoro ihe omume mgbakọ dị iche iche. Ndị ọzọ na-etinye oge ka ukwuu ná ntụrụndụ na n’inweta ntụsara ahụ n’ụzọ ihe onwunwe. Eziokwu ndị a na-eduga anyị ịtụle ihe kwesịrị ịdị na-akwali anyị ná ndụ n’ikwekọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova. Ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere n’ozi ya ò kwesịrị ịdabere n’olileanya nke “Paradaịs ga-abịa n’isi nso”?
E Ji Olileanya Tụnyere Arịlịka
10, 11. Gịnị ka Pọl ji tụnyere olileanya anyị, n’ihi gịnịkwa ka ntụnyere a ji kwesị ekwesị?
10 Pọl kwuru na Jehova ekwewo nkwa ngọzi ga-abịa site n’Abraham. Onyeozi ahụ kọwaziri, sị: “Chineke . . . weere ịṅụ iyi gboo okwu: ka anyị wee were ihe abụọ na-adịghị agha agha [okwu ya na iyi ya], nke Chineke na-apụghị ikwu okwu ụgha n’ime ha, nwee nkasi obi siri ike, anyị, bụ́ ndị gbabara ijidesi olileanya ahụ ike, bụ́ nke e debere n’ihu anyị; bụ́ olileanya nke anyị nwere dị ka arịlịka nke mkpụrụ obi, nke bụ́ ihe ntụkwasị obi na ihe na-eguzosi ike.” (Ndị Hibru 6:17-19; Jenesis 22:16-18) Olileanya nke ndị Kraịst e tere mmanụ nwere bụ nke ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. Taa, ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị ohu Jehova nwere olileanya magburu onwe ya nke ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Luk 23:43) Ma olileanya dị otú ahụ adịghị, mmadụ apụghị inwe okwukwe.
11 Arịlịka bụ ngwá ọrụ nchebe dị ike, bụ́ nke dị oké mkpa maka ijigide ụgbọ mmiri n’otu ebe, na-egbochikwa ya inupu. Ọ dịghị onye ọkwọ ụgbọ mmiri ọ bụla ga-anwa anwa esi n’ọdụ ụgbọ mmiri pụọ n’ejighị arịlịka. Ebe ọ bụ na ụgbọ mmiri Pọl nọ na ya ekpuwo ọtụtụ ugboro, ọ maara site n’ahụmahụ onwe onye na ndụ nke ndị na-eme njem n’osimiri daberekarịrị n’arịlịka ụgbọ mmiri ha. (Ọrụ 27:29, 39, 40; 2 Ndị Kọrint 11:25) Na narị afọ mbụ, ụgbọ mmiri enweghị injin iji mee ka onyeisi ụgbọ mmiri nwee ike iduzi ya otú ọ chọrọ. E wezụga ụgbọ mmiri agha ndị e ji ụmara anya, ụgbọ mmiri dabekarịịrị n’ifufe n’ụzọ bụ́ isi maka isere gaa n’ihu. Ọ bụrụ na ụgbọ onyeisi ụgbọ mmiri nọ n’ihe ize ndụ nke ịbanye na nkume, nanị ihe ọ ga-eme bụ ịtụda arịlịka ya ma lanarị oké ifufe ahụ, na-enwe ntụkwasị obi na arịlịka ahụ ga-anọgidesi ike n’ala mmiri. N’ihi ya, Pọl ji olileanya onye Kraịst tụnyere “arịlịka nke mkpụrụ obi, nke bụ́ ihe ntụkwasị obi na ihe na-eguzosi ike.” (Ndị Hibru 6:19) Mgbe oké ifufe nke mmegide wakporo anyị ma ọ bụ anyị enweta ọnwụnwa ndị ọzọ, olileanya anyị dị ebube yiri arịlịka nke na-eme ka anyị kwụsie ike dị ka mkpụrụ obi dị ndụ, ka ụgbọ nke okwukwe anyị wee ghara itinye isi n’ala mmiri nke inwe obi abụọ ma ọ bụ na nkume ndị na-akpata ọdachi bụ́ ndapụ n’ezi ofufe.—Ndị Hibru 2:1; Jud 8-13.
12. Olee otú anyị pụrụ isi zere iwezụga onwe anyị n’ebe Jehova nọ?
12 Pọl dọrọ ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ obi nke ekweghị ekwe ghara ịdị n’ime onye ọ bụla n’etiti unu ma eleghị anya, n’iwezụga onwe ya n’ebe Chineke dị ndụ nọ.” (Ndị Hibru 3:12) N’ihe odide Grik, ‘iwezụga onwe’ pụtara n’ụzọ nkịtị “ịnọpụ iche,” ya bụ, isi n’ezi ofufe dapụ. Ma anyị pụrụ izere oké ụgbọ okpukpu dị otú ahụ. Okwukwe na olileanya ga-enyere anyị aka ịrapagidesi ike n’ebe Jehova nọ ọbụna n’oge oké ifufe nke ule kasị njọ. (Deuterọnọmi 4:4; 30:19, 20) Okwukwe anyị agaghị adị ka ụgbọ mmiri nke ifufe ozizi nke ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ebugharị. (Ndị Efesọs 4:13, 14) N’inwekwa olileanya dị ka arịlịka anyị, anyị ga-enwe ike ịnagide oké ifufe nile nke ndụ dị ka ndị ohu Jehova.
Ndị Ịhụnanya na Mmụọ Nsọ Na-akwali
13, 14. (a) N’ihi gịnị ka arịlịka nke olileanya anyị ji bụrụ ihe na-ezughị ezu n’onwe ya? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ ihe na-akwali anyị n’ijere Jehova ozi dị nsọ, ọ bụkwa n’ihi gịnị?
13 Onye Kraịst agaghị enwe ọganihu ruo n’ịba n’usoro ihe ọhụrụ ahụ ma ọ bụrụ na ebumnobi ya maka ife Jehova bụ nanị olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Ka ọ na-ejigide arịlịka nke olileanya ya dị ka isi ihe na-eme ka ọ kwụsie ike ná ndụ, ọ dị ya mkpa ịtụkwasị ikike mkpali bụ́ ịhụnanya n’elu ya nakwa n’okwukwe ya. Pọl mesiri eziokwu a ike mgbe o dere, sị: “Okwukwe, olileanya, ịhụnanya, ihe atọ ndị a, na-anọgide; ma nke kachasị n’ihe ndị a bụ ịhụnanya.”—1 Ndị Kọrint 13:13.
14 Ihe na-akwali anyị ije ozi dị nsọ kwesịrị ịbụ ịhụnanya sitere n’obi anyị nwere n’ebe Jehova nọ, ná mmeghachi omume nye ịhụnanya na-enweghị atụ o nwere n’ebe anyị nọ. Jọn onyeozi dere, sị: “Onye na-adịghị ahụ n’anya amaghị Chineke; n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya. N’ime nke a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ime anyị, na Chineke ewerewo Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya zite n’ụwa, ka anyị wee dị ndụ site n’aka Ya. Anyị onwe anyị na-ahụ n’anya, n’ihi na Ya onwe ya buru ụzọ hụ anyị n’anya.” (1 Jọn 4:8, 9, 19) N’ihi ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ, nchegbu anyị bụ́ isi ekwesịghị ịbụ inweta nzọpụta onwe onye, kama ịhụ ka e doro aha nsọ ya nsọ na ka e wepụrụ ọbụbụeze ezi omume ya n’ụta.
15. Olee otú ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ si emetụta ọbụbụeze ya?
15 Jehova chọrọ ka anyị na-ejere ya ozi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, ọ bụghị nanị n’ihi Paradaịs. Akwụkwọ nkà ihe ọmụma Bible bụ́ Insight on the Scripturesa na-ekwu, sị: “Jehova na-enwe obi ụtọ n’eziokwu bụ́ na ọbụbụeze ya na nkwado nke ihe ndị o kere eke na-akwado ọbụbụeze ahụ dabeere n’ịhụnanya n’ụzọ bụ́ isi. Ọ na-achọ nanị ndị hụrụ ọbụbụeze ya n’anya n’ihi àgwà ọma ya nakwa n’ihi na ọ bụ nke ezi omume, ndị họọrọ ọbụbụeze ya karịa nke ọ bụla ọzọ. (1Kọ 2:9) Ha na-ahọrọ ije ozi n’okpuru ọbụbụeze ya kama ịnwa inwere onwe ha—na-eme nke a n’ihi ihe ọmụma ha nwere banyere ya na n’ihi ịhụnanya, ikpe ziri ezi, na amamihe ya, bụ́ nke ha ghọtara na ọ karịrị nnọọ nke ha. (Ọma 84:10, 11)”—Mpịakọta nke 2, peji nke 275.
16. Olee otú ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jisọs nọ si bụrụ ikike na-akwali anyị ná ndụ?
16 Dị ka ndị Kraịst, anyị na-egosipụtakwa ịhụnanya n’ebe Jisọs nọ ná mmeghachi omume nye ịhụnanya o nwere n’ebe anyị nọ. Pọl tụgharịrị uche, sị: “Ịhụnanya Kraịst na-arụgide anyị; ebe anyị na-atụle nke a, na otu Onye nwụrụ n’ọnọdụ mmadụ nile, ya mere mmadụ nile nwụrụ; Ọ nwụkwara n’ọnọdụ mmadụ nile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị Onye ahụ ndụ, bụ́ Onye nwụrụ n’ọnọdụ ha, e meekwa ka O si n’ọnwụ bilie.” (2 Ndị Kọrint 5:14, 15) Kraịst bụ kpọmkwem ntọala e wukwasịrị ndụ ime mmụọ anyị, okwukwe anyị, na olileanya anyị. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Kraịst Jisọs nọ na-eme ka olileanya anyị sie ike, na-emekwa ka okwukwe anyị kwụrụ chịm, karịsịa n’oge ule ndị yiri oké ifufe.—1 Ndị Kọrint 3:11; Ndị Kọlọsi 1:23; 2:6, 7.
17. Ikike dị ebube dị aṅaa ka Jehova na-enye anyị, oleekwa otú e si gosi ịdị mkpa ya n’Ọrụ Ndị Ozi 1:8 nakwa ná Ndị Efesọs 3:16?
17 Ọ bụ ezie na ọ bụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na Ọkpara ya nọ bụ isi ihe na-akwali anyị ná ndụ dị ka ndị Kraịst, Jehova na-enye ihe ọzọ na-akwali anyị, na-enye anyị ike, na-enyekwa anyị ume iji gaa n’ihu n’ozi ya. Ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ, ma ọ bụ mmụọ nsọ ya. Okwu Hibru na okwu Grik ndị a sụgharịrị ịbụ “mmụọ” na-ezo aka n’ụzọ bụ́ isi ná mfegharị dị ike nke ikuku, dị ka ifufe. Ụgbọ mmiri ndị nwere ákwà ifufe dị ka ndị ahụ Pọl banyere, dabeere n’ikike a na-adịghị ahụ anya nke ifufe iji ruo ebe ha na-aga. N’otu aka ahụ, ịhụnanya na ihe omume nke ike Chineke nọ n’ọrụ nke a na-adịghị ahụ anya dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na ụgbọ nke okwukwe anyị ga-eburu anyị na-aga n’ihu n’ozi Jehova.—Ọrụ 1:8; Ndị Efesọs 3:16.
Ịga n’Ihu Ruo Ebe Anyị Na-aga!
18. Gịnị ga-eme ka anyị nwee ike ịtachi obi n’ule okwukwe ọ bụla ga-abịara anyị n’ọdịnihu?
18 A pụrụ ịnwale okwukwe na ịhụnanya anyị n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ tupu anyị eruo usoro ihe ọhụrụ ahụ. Ma Jehova enyewo anyị arịlịka “nke bụ́ ihe ntụkwasị obi na ihe na-eguzosi ike”—olileanya anyị dị ebube. (Ndị Hibru 6:19; Ndị Rom 15:4, 13) Mgbe mmegide ma ọ bụ ọnwụnwa ndị ọzọ mekpọrọ anyị ọnụ, anyị pụrụ ịtachi obi ma ọ bụrụ na olileanya anyị na-eme ka anyị kwụsie ike. Mgbe otu oké ifufe dajụlatasịrị ma tupu ọzọ etiwapụ, ka anyị kpebisie ike ime ka olileanya anyị na okwukwe anyị sikwuo ike.
19. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ụgbọ nke okwukwe anyị nọgide na-ese ese wee ruo n’ebe dị nchebe nke ụwa ọhụrụ Chineke?
19 Tupu Pọl akpọtụ “arịlịka nke mkpụrụ obi” aha, ọ sịrị: “Ọ na-agụ anyị agụụ ka unu nile n’otu n’otu wee na-egosi otu ịnụ ọkụ n’obi ahụ [“mee ngwa,” nkọwa ala ala peji nke NW] ka unu wee nwezuo olileanya anyị ruo ọgwụgwụ ihe nile: ka unu wee ghara ịghọ ndị umengwụ, kama ka unu wee bụrụ ndị na-eṅomi ndị ahụ ndị ji okwukwe na ogologo ntachi obi na-eketa nkwa ahụ.” (Ndị Hibru 6:11, 12) N’ịbụ ndị ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova na Ọkpara ya nọ na-akwali nakwa ndị mmụọ nsọ na-enye ike, ka anyị mee ka ụgbọ nke okwukwe anyị nọgide na-ese ese ruo mgbe anyị ruru n’ebe dị nchebe nke ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ná Ntụleghachi
◻ Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Pọl nyere anyị banyere okwukwe anyị?
◻ Olee otú ụgbọ ụfọdụ ndị siworo kpuo n’ụzọ ime mmụọ, oleekwa otú ndị ọzọ si ala azụ?
◻ Àgwà dị aṅaa nke Chineke ka ọ dị mkpa ka anyị tụkwasị n’okwukwe anyị?
◻ Gịnị ga-enyere anyị aka iru n’ebe dị nchebe nke ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ụgbọ nke okwukwe anyị aghaghị ịbụ nke e wuru nke ọma iji nagide oké ifufe nke ndụ
[Foto dị na peeji nke 17]
Okwukwe anyị pụrụ ikpu dị ka ụgbọ mmiri
[Foto dị na peeji nke 18]
Olileanya bụ arịlịka dịịrị ndụ anyị dị ka ndị Kraịst